1 Samuel
2 Hana wee malite ikpe ekpere,+ sị:
“Obi m na-aṅụrị ọṅụ n’ime Jehova,+
E buliwo mpi m elu n’ezie n’ime Jehova.+
Ọnụ m emeghewo megide ndị iro m,
N’ihi na m na-aṅụrị ọṅụ ná nzọpụta nke si n’aka gị.+
2 Ọ dịghị onye dị nsọ nke dị ka Jehova, n’ihi na ọ dịghị onye ọzọ ma e wezụga gị;+
Ọ dịghịkwa oké nkume nke dị ka Chineke anyị.+
3 Unu ejikwala oké mpako na-ekwu okwu,
Unu etukwala ọnụ,+
N’ihi na Jehova bụ Chineke nke nwere ihe ọmụma,+
Ọ bụkwa ya na-atụ omume n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ n’ụzọ ziri ezi.+
5 Ndị afọ juru ga-arụ ọrụ ngo iji nweta nri,+
Ma agụụ akwụsịwo ịgụ ndị agụụ ji.+
Ọbụna nwaanyị aga amụwo ụmụ asaa,+
Ma nwaanyị nke nwere ọtụtụ ụmụ agbarawo aka nwa.+
7 Jehova bụ Onye na-eme ka a daa ogbenye+ na Onye na-eme ka a baa ọgaranya,+
Onye na-eweda mmadụ ala nakwa Onye na-ebuli mmadụ elu,+
8 Onye na-esi n’ájá eweli onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya;+
Ọ na-esi n’olulu ntụ akpọpụta onye dara ogbenye,+
Ime ka ha soro ndị a ma ama nọdụ; ọ na-enyekwa ha ocheeze dị ebube+ ka ọ bụrụ ihe onwunwe ha.+
N’ihi na ọ bụ Jehova nwe ihe niile ji ụwa,+
Ọ bụ n’elu ha ka ọ dọkwasịrị elu ala.
9 Ụkwụ nke ndị na-eguzosi ike n’ebe ọ nọ ka ọ na-eche nche;+
Ma a na-ala ndị ajọ omume n’iyi n’ọchịchịrị,+
N’ihi na ọ bụghị site n’ike ka mmadụ na-aka ike.+
10 Ma ndị na-alụso Jehova ọgụ ka a ga-emenye ụjọ;+
Ọ ga-esi n’eluigwe baara ha mba.+
Jehova ga-ekpe ebe niile ụwa sọtụrụ ikpe,+
Ka o wee mee ka eze ya dị ike,+
Ka o wee bulie mpi nke onye o tere mmanụ.”+
11 Elkena wee laa n’ụlọ ya nke dị na Rema; ma nwa okoro ahụ ghọrọ onye ozi+ Jehova n’ihu Ilaị onye nchụàjà.
12 Ụmụ Ilaị bụ ndị ikom na-abaghị n’ihe;+ ha amaghị Jehova.+ 13 A bịa n’ihe ruuru ndị nchụàjà n’ihe ndị mmadụ na-eweta,+ mgbe ọ bụla onye ọ bụla na-achụ àjà, onye na-ejere onye nchụàjà ozi na-eji ndụdụ nwere ezé atọ n’aka bịa, mgbe a ka na-esi anụ esi,+ 14 wee dụnye ndụdụ ahụ n’efere ma ọ bụ n’ite e ji esi nri nke nwere aka abụọ ma ọ bụ n’ite e ji esi mmiri ma ọ bụ n’ite e ji esi nri nke nwere otu aka. Ihe ọ bụla ndụdụ ahụ dụtara ka onye nchụàjà na-ewere. Otú ahụ ka ha na-eme ndị Izrel niile na-abịa n’ebe ahụ,+ ya bụ, na Shaịlo. 15 Tupu ha esuree abụba anụ n’ọkụ,+ onye na-ejere onye nchụàjà ozi na-abịa gwa nwoke na-achụ àjà, sị: “Weta anụ a ga-ahụrụ onye nchụàjà, ọ bụ anụ ndụ ka ọ ga-anara gị, ọ bụghị nke e siri esi.”+ 16 Mgbe nwoke ahụ sịrị ya: “Ka ha burugodị ụzọ hụ na ha surere abụba anụ n’ọkụ.+ Mgbe ahụ, were ihe ọ bụla nke na-agụ mkpụrụ obi gị,”+ ọ ga-asị: “Ee e, weta ya ugbu a; ma ọ́ bụghị ya, m ga-ewere ya n’ike!”+ 17 Mmehie nke ndị ahụ na-eje ozi wee dị nnọọ ukwuu n’ihu Jehova;+ n’ihi na ndị ikom ahụ na-elelị àjà a na-achụrụ Jehova.+
18 Samuel nọ na-eje ozi+ n’ihu Jehova mgbe ọ bụ nwa okoro. Ọ na-eyi efọd e ji ákwà linin mee.+ 19 Nne ya na-akwakwara ya obere uwe elu na-enweghị aka, ọ na-achịrị ya chịtara ya kwa afọ mgbe ya na di ya na-agbagote ịchụ àjà a na-achụ kwa afọ.+ 20 Ilaị wee gọzie+ Elkena na nwunye ya, sị: “Ka Jehova site na nwaanyị a nye gị nwa a ga-eji dochie ihe a gbazinyere agbazinye, nke a gbazinyere Jehova.”+ Ha wee laa n’obodo ha. 21 Jehova wee chee ihu ya n’ebe Hana nọ,+ o wee tụrụ ime, mụọ ụmụ nwoke atọ na ụmụ nwaanyị abụọ.+ Nwa okoro ahụ bụ́ Samuel wee na-eto n’ebe Jehova nọ.+
22 Ilaị emewo nnọọ agadi, ọ nụkwara+ ihe niile ụmụ ya nọ na-eme+ Izrel dum nakwa otú ha na ndị inyom+ na-eje ozi n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute si edina.+ 23 Ọ na-asịkwa ha:+ “Gịnị mere unu ji na-eme ụdị ihe ndị a?+ N’ihi na ihe m na-anụ n’ọnụ mmadụ niile banyere unu dị njọ.+ 24 Ee e,+ ụmụ m, n’ihi na akụkọ m na-anụ, nke ndị Jehova na-akọsa, adịghị mma.+ 25 Ọ bụrụ na mmadụ emehie mmadụ,+ Chineke ga-ekpechite ọnụ ya;+ ma ọ bụrụ na ọ bụ Jehova ka mmadụ mehiere,+ ònye ga-ekpechitere ya ekpere?”+ Ma ha egeghị nna ha ntị,+ n’ihi na ọ masịrị Jehova ugbu a igbu ha.+ 26 N’oge ahụ niile, nwa okoro ahụ bụ́ Samuel nọ na-eto, ihe ya wee na-adịwanye ma Jehova ma mmadụ mma.+
27 Otu onye nke Chineke+ wee bịakwute Ilaị, sị ya: “Nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘Ọ̀ bụ na mụ emeghị ka ụlọ nna nna gị mata m mgbe ha ka nọ n’Ijipt dị ka ndị ohu n’ụlọ Fero?+ 28 E wee si n’ebo Izrel dum họpụtara m ya,+ ịrụ ọrụ dị ka onye nchụàjà nakwa ịgbago n’elu ebe ịchụàjà m+ isure ihe nsure ọkụ, iyi efọd n’ihu m, ka m wee nye ụlọ nna nna gị àjà niile ụmụ Izrel na-esure n’ọkụ.+ 29 Gịnị mere unu ji na-agba àjà m na onyinye m ụkwụ,+ bụ́ nke m nyere n’iwu n’ebe obibi m,+ i wee na-asọpụrụ ụmụ gị karịa mụ onwe m site n’iji onyinye ọ bụla kasị mma nke ndị m bụ́ Izrel na-enye+ na-eme ka unu maa abụba?+
30 “‘Ya mere, nke a bụ ihe Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru: “Ekwuru m n’ezie, sị, Ụlọ gị na ụlọ nna nna gị ga na-eje ije n’ihu m ruo mgbe a na-akaghị aka.”+ Ma ugbu a, nke a bụ ihe Jehova kwuru: “Tụfịakwa! Agaghị m eme ya, n’ihi na ndị na-asọpụrụ m+ ka m ga-akwanyere ùgwù,+ ndị na-eleda m anya ga-abụkwa ihe efu.”+ 31 Lee! Ụbọchị na-abịa mgbe m ga-egbupụ ogwe aka gị na ogwe aka nke ụlọ nna nna gị, nke na a gaghị enwe agadi ọ bụla n’ụlọ gị.+ 32 Mgbe m ga na-emere Izrel ihe ọma, ihe ị ga-ahụ bụ naanị onye iro n’ebe obibi m;+ ọ dịghịkwa mgbe a ga-enwe agadi n’ụlọ gị. 33 Ma e nwere onye si n’ahụ́ gị nke m na-agaghị ebipụ n’ebe ịchụàjà m ka m wee mee ka anya gị ghara ịhụkwa ụzọ, ka m wee meekwa ka ike gwụ mkpụrụ obi gị; kama a ga-eji mma agha nke mmadụ gbuo ihe ka ọtụtụ n’ime ndị ezinụlọ gị.+ 34 Nke a ga-abụkwara gị ihe ịrịba ama nke ga-abịakwasị ụmụ gị abụọ, bụ́ Họfnaị na Finihas:+ N’otu ụbọchị ka ha abụọ ga-anwụ.+ 35 M ga-emekwa ka onye nchụàjà kwesịrị ntụkwasị obi biliere m.+ Ọ ga-eme ihe dị m mma n’obi nakwa ihe dị mkpụrụ obi m mma; m ga-ewukwara ya ụlọ na-adịgide adịgide, ọ ga na-ejekwa ije mgbe niile n’ihu onye m tere mmanụ.+ 36 Ọ ga-erukwa na onye ọ bụla nke fọdụrụ+ n’ụlọ gị ga-abịa kpọọrọ ya isiala ka e wee kwụọ ya ụgwọ ma nye ya otu ogbe achịcha, ọ ga-asịkwa: “Biko, nye m ihe m ga na-arụ n’ọrụ ndị nchụàjà ka m wee na-eritụ achịcha.”’”+