Abụ Ọma
Ntụziaka e nyere onye nduzi. Abụ olu ụtọ Devid.
31 Jehova, agbabawo m n’ime gị.+
Biko, ekwela ka ihere mee m ma ọlị.+
Meere m ụzọ mgbapụ n’ihi ezi omume gị.+
6 M kpọrọ ndị ji arụsị efu na-abaghị uru kpọrọ ihe asị;+
Ma mụ onwe m, ọ bụ Jehova ka m tụkwasịrị obi.+
7 M ga-aṅụrị ọṅụ, nweekwa obi ụtọ n’obiọma* gị,+
N’ihi na ị hụwo mmekpa ahụ́ m;+
Ị marawo ahụhụ mkpụrụ obi m na-ata,+
8 I nyefeghị m n’aka onye iro.+
I mewo ka ụkwụ m guzoro n’ebe sara mbara.+
9 Meere m amara, Jehova, n’ihi na anọ m n’oké ihe isi ike.+
Anya m adịkwaghị ahụcha ụzọ n’ihi iru uju,+ ike agwụla mkpụrụ obi m, gwụkwa afọ m.+
10 N’ihi na iru uju egbuwo m,+
Afọ ndụ m agwụla n’ịsụ ude.+
Ike agwụla m n’ihi njehie m,+
Ọkpụkpụ m esikwaghị ike.+
11 Aghọwo m onye a na-akọcha+ n’anya ndị niile na-ebuso m iro,+
Otú ahụkwa ka m dị n’anya ndị agbata obi m,+
Abụkwa m onye ndị mụ na ha ma na-atụ ụjọ.+
Mgbe ha hụrụ m n’èzí, ha na-agbara m ọsọ.+
12 E chezọwo m dị ka onye nwụrụ anwụ nke a na-adịghị echetakwa;+
Adịzi m ka arịa kụwara akụwa;+
13 N’ihi na anụwo m akụkọ ọjọọ nke ọtụtụ ndị na-akọ,+
Ụjọ dịkwa n’ebe niile.+
Mgbe ha gbakọtara dị ka otu onye imegide m,+
Ọ bụ iwepụ mkpụrụ obi m ka ha na-eme atụmatụ ya.+
17 Jehova, biko, ekwela ka ihere mee m, n’ihi na ọ bụ gị ka m na-akpọku.+
Ka ihere mee ndị ajọ omume;+
Ka ha mechie ọnụ n’ime Shiol.+
18 Ka egbugbere ọnụ nke na-ekwu okwu ụgha daa ogbi,+
Bụ́ egbugbere ọnụ nke na-emepe ọnụ jiri mpako na nlelị+ na-ekwu okwu megide onye ezi omume.+
19 Lee ka ịdị mma gị si dị ukwuu,+ nke i debeere ndị na-atụ egwu gị!+
Nke i gosiri ndị na-agbaba n’ime gị,
N’ihu ụmụ mmadụ.+
21 Ka Jehova bụrụ onye a gọziri agọzi,+
N’ihi na o gosiwo m obiọma na-enweghị atụ+ n’ime obodo nke nọ n’ihe isi ike.+
22 Ma mụ onwe m, mgbe ụjọ tụwara m,+ asịrị m:
“A ga-ekpochapụ m n’ihu gị.”+
Ị nụwo olu arịrịọ m mgbe m tikuru gị maka enyemaka.+