Aịzaya
7 O wee ruo n’ụbọchị Ehaz+ nwa Jotam nwa Ọzaya, bụ́ eze Juda, na Rizin+ eze Siria na Pika+ nwa Remalaya eze Izrel gbagotere Jeruselem ibuso ya agha, ma ha enweghị ike ibuso ya agha.+ 2 E wee kọọrọ ụlọ Devid, sị: “Siria na Ifrem ejikọwo aka.”+
Obi wee malite ịma ya na ndị ya jijiji otú osisi dị n’ọhịa si ama jijiji n’ihi ifufe.+
3 Jehova wee sị Aịzaya: “Biko, gị na Shia-jeshọb+ nwa gị nwoke gaa zute Ehaz n’isi isi okpo mmiri+ nke ọdọ mmiri mgbago, nke dị n’akụkụ okporo ụzọ gafere n’ala ebe ndị ọsụ ákwà na-anọ asụ ákwà.+ 4 Sị ya, ‘Lezie anya, echegbula onwe gị.+ Atụla egwu, ka obi gharakwa ịlọ gị mmiri+ n’ihi mkpirisi nkụ abụọ a refọrọ erefọ, bụ́ ndị na-akwụ anwụrụ, n’ihi iwe dị ọkụ nke Rizin na Siria na nwa Remalaya+ na-ewe, 5 n’ihi na Siria na Ifrem na nwa Remalaya emewo atụmatụ ime gị ihe ọjọọ, sị: 6 “Ka anyị gbagoo buso Juda agha, dọrie ya, nwetakwa ya site n’ịwaba n’ime ya; ka anyị meekwa onye ọzọ, bụ́ nwa Tabiel,+ eze ka ọ chịwa n’ime ya.”
7 “‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Ọ gaghị enwe isi, ọ gaghịkwa eme.+ 8 N’ihi na isi Siria bụ Damaskọs, onyeisi Damaskọs bụkwa Rizin; tupu afọ iri isii na ise agafee, a ga-akụrisị Ifrem ka ọ ghara ịbụkwa mba.+ 9 Isi Ifrem bụ Sameria,+ onyeisi Sameria bụ nwa Remalaya.+ Ọ bụrụ na unu enweghị okwukwe, unu agaghị adịte ndụ aka.”’”+
10 Jehova wee gwa Ehaz ọzọ, sị: 11 “Rịọ Jehova bụ́ Chineke gị ka o nye gị ihe ịrịba ama,+ ka o mee ka o mie emi ka Shiol, ma ọ bụ ka ọ dị elu ka ógbè ndị dị n’ugwu.” 12 Ma Ehaz sịrị: “Agaghị m arịọ, agaghịkwa m ele Jehova ule.”
13 O wee sị: “Biko, geenụ ntị, unu ụlọ Devid. Ọ̀ bụ ntakịrị ihe n’anya unu na unu na-eme ka ike gwụ ndị mmadụ, nke na unu ga-emekwa ka ike gwụ Chineke m?+ 14 Ya mere, Jehova ga-enye unu ihe ịrịba ama: Lee! Nwa agbọghọ ahụ+ ga-atụrụ ime,+ ọ ga-amụkwa nwa nwoke,+ ọ ga-agụ ya Ịmanuel. 15 Mgbe ọ ga-amụta ịjụ ihe ọjọọ na ịhọrọ ihe ọma,+ ọ ga-amaliteworị iri mmiri ara ehi rahụrụ arahụ na mmanụ aṅụ. 16 N’ihi na tupu nwa okoro ahụ amụta ịjụ ihe ọjọọ na ịhọrọ ihe ọma,+ a ga-agbahapụ ala nke ndị eze abụọ ahụ kpamkpam, bụ́ ndị ị na-atụ ụjọ nke ukwuu.+ 17 Jehova ga-eme ka ụbọchị a na-enwetụbeghị ụdị ya bịakwasị gị+ na ndị gị na ụlọ nna gị, bụ́ ụbọchị a na-enwetụbeghị ụdị ya kemgbe Ifrem kewapụrụ onwe ya n’ebe Juda nọ,+ ya bụ, eze Asiria.+
18 “Ọ ga-erukwa n’ụbọchị ahụ na Jehova ga-afụrụ ijiji ndị nọ na nsọtụ ọwa mmiri niile nke Naịl Ijipt mkpọrọhịhị, fụọkwara aṅụ+ ndị nọ n’ala Asiria+ mkpọrọhịhị ka ha bịa, 19 ha niile ga-abatakwa biri ebiri na ndagwurugwu iyi ndị kpọdara akpọda nakwa n’ebe ndị gbawara agbawa na nkume dị elu nakwa n’elu osisi ogwu niile nakwa n’elu ebe niile mmiri na-ede.+
20 “N’ụbọchị ahụ, Jehova ga-eji agụba e goro ọrụ nke dị n’ógbè Osimiri Yufretis,+ bụ́ eze Asiria,+ kpụọ gị isi na ajị ụkwụ, ọ ga-akpụkwa ọbụna ajị agba gị.+
21 “Ọ ga-erukwa n’ụbọchị ahụ na mmadụ ga-echebe nwa ehi nke si n’ìgwè ehi nakwa atụrụ abụọ ndụ.+ 22 Ọ ga-erukwa na n’ihi mmiri ara ehi ịgbapụta n’ụba, ọ ga na-eri mmiri ara ehi rahụrụ arahụ; n’ihi na ọ bụ mmiri ara ehi rahụrụ arahụ na mmanụ aṅụ+ ka ndị niile fọdụrụ n’ala ahụ ga na-eri.
23 “Ọ ga-erukwa n’ụbọchị ahụ na ebe ọ bụla a na-enwebu otu puku osisi vaịn, ndị ọnụ ahịa ha bụ otu puku mkpụrụ ego ọlaọcha,+ osisi ogwu na ahịhịa ga na-adị na ya.+ 24 Mmadụ ga-ejikwa akụ́ na ụta bịa ebe ahụ,+ n’ihi na osisi ogwu na ahịhịa ga-ejupụta n’ala ahụ dum. 25 Ugwu niile a na-ejibu ọ́gụ̀ abọ ahịhịa ya—ị gaghị aba n’ebe ahụ n’ihi egwu ị na-atụ osisi ogwu na ahịhịa; ọ ga-aghọkwa ebe a na-atọpụ ehi nakwa ebe atụrụ na-azọtọ.”+