Ezikiel
32 O wee ruo n’afọ nke iri na abụọ, n’ọnwa nke iri na abụọ, n’abalị mbụ n’ọnwa ahụ, na okwu Jehova ruru m ntị, sị: 2 “Nwa nke mmadụ, bụọ abụ iru uju banyere Fero eze Ijipt, sị ya, ‘A lawo gị n’iyi dị ka nwa ọdụm tojuru etoju nke mba dị iche iche.+
“‘Ị dị ka nnukwu anụ mmiri nke nọ n’oké osimiri,+ ị na-amapụtakwa n’ime osimiri gị, jiri ụkwụ gị na-agbarụ mmiri ma na-emebi osimiri.’
3 “Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘M ga-eme ka ìgwè ndị dị iche iche jiri ụgbụ m kpuchie gị,+ ha ga-ejikwa ụgbụ m dọta gị.+ 4 M ga-agbahapụkwa gị n’elu ala. M ga-atụda gị n’ala.+ Ọ bụkwa n’elu gị ka m ga-eme ka anụ ufe niile nke eluigwe biri, ọ bụkwa gị ka m ga-eme ka anụ ọhịa nke ụwa dum rie rijuo afọ.+ 5 M ga-atụsa anụ gị n’elu ugwu, meekwa ka ozu gị jupụta na ndagwurugwu.+ 6 M ga-emekwa ka ala ṅụọ ihe ga-agbapụta gị n’ahụ́, bụ́ ọbara gị,+ n’elu ugwu; a ga-emekwa ka ihe si gị n’ahụ́ jupụta n’ọwa mmiri dị iche iche.’
7 “‘Mgbe a ga-emenyụ gị dị ka ọkụ, m ga-ekpuchi eluigwe, meekwa ka kpakpando ya gbaa ọchịchịrị. M ga-ejikwa ígwé ojii kpuchie anyanwụ, ọnwa agaghịkwa enwupụta ìhè ya.+ 8 M ga-eme ka ihe niile na-enye ìhè n’eluigwe gbaa ọchịchịrị n’ihi gị. M ga-emekwa ka ọchịchịrị gbaa n’ala gị,’ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.
9 “‘M ga-eme ka iwe ju ọtụtụ ndị obi mgbe m ga-eme ka e si n’ime gị dọrọ ndị mmadụ n’agha laa ná mba dị iche iche, n’ala ị na-amaghị.+ 10 M ga-emekwa ka ị bụrụ ihe ga-eme ka egwu jide ọtụtụ ndị.+ Ndị eze ha ga-amakwa jijiji n’egwu n’ihi gị mgbe m ga-efegharị mma agha m n’ihu ha,+ ha ga-amakwa jijiji n’oge ọ bụla, onye ọ bụla maka mkpụrụ obi ya, n’ụbọchị ị ga-ada.’+
11 “N’ihi na nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Mma agha eze Babịlọn ga-abịakwasị gị.+ 12 M ga-eme ka ndị dike niile, bụ́ ndị ọchịchị aka ike nke mba dị iche iche, were mma agha gbuo ndị gị;+ ha ga-ebukọrọkwa ihe Ijipt ji anya isi, a ga-alakwa ndị ya niile n’iyi.+ 13 M ga-ebipụ anụ ụlọ ya niile nọ n’akụkụ ọtụtụ mmiri,+ ụkwụ mmadụ agakwaghị agbarụ+ ha, ọbụna akpụkpọ ụkwụ anụ ụlọ agaghị agbarụ ha.’
14 “‘N’oge ahụ, m ga-eme ka mmiri ha dị ọcha, m ga-emekwa ka osimiri ha na-asọ dị ka mmanụ,’ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.
15 “‘Mgbe m ga-eme ka ala Ijipt tọgbọrọ n’efu, m ga-ekpochapụkwa ihe niile dị n’ala ahụ.+ Mgbe m ga-egbu ndị niile bi na ya, ha ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova.+
16 “‘Nke a bụ abụ iru uju, ndị mmadụ ga-abụ ya. Ọbụna ndị inyom nke mba dị iche iche ga-abụ ya; ha ga-abụrụ ya Ijipt na ndị ya niile,’+ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.”
17 O wee ruo n’afọ nke iri na abụọ, n’abalị iri na ise n’ọnwa ahụ, na okwu Jehova ruru m ntị, sị: 18 “Nwa nke mmadụ, kwaara ndị Ijipt ákwá arịrị, meekwa ka ha gbadaa,+ ha na ndị si ná mba ukwu dị iche iche, ee, ka ha gbadaa n’ime ala,+ ha na ndị na-agbada n’olulu.+
19 “‘Ònye ka ị ka mma?+ Gbadaa n’ala, a ga-elikọta gị na ndị a na-ebighị úgwù!’+
20 “‘Ha ga-ada n’etiti ndị e ji mma agha gbuo.+ E nyefewo ya n’aka mma agha. Kpụrụnụ ya na ndị ya niile pụọ.
21 “‘Ndị kasị ike n’etiti ndị dike ga-esi n’ime Shiol gwa ya okwu, ya na ndị na-enyere ya aka.+ Ha ga-agbada n’ala;+ ha ga-atọgbọrọ n’ala dị ka ndị a na-ebighị úgwù, ndị e ji mma agha gbuo. 22 N’ebe ahụ ka Asiria na ndị ya niile nọ.+ Ebe e liri ndị ya gbara ya gburugburu. E gburu ha niile egbu, bụ́ ndị e ji mma agha gbuo.+ 23 N’ihi na ebe a na-eli ozu n’ime ya dị n’ime ime olulu.+ Ndị ya niile gbakwara ili ya gburugburu. E gburu ha niile egbu. E ji mma agha gbuo ha, n’ihi na ha emewo ka a na-atụ egwu n’ala ndị dị ndụ.
24 “Ilam+ na ndị ya niile gbara ili ya gburugburu. E gburu ha niile egbu. Ha bụ ndị e ji mma agha gbuo, ndị gbadaworo n’ime ala n’ebighị úgwù, ndị meworo ka a na-atụ ha egwu n’ala ndị dị ndụ. Ha ga-eburukwa mmechuihu ha, ha na ndị na-agbada n’olulu.+ 25 N’etiti ndị e gburu egbu ka ha debeere ya ihe ndina+ n’etiti ndị ya niile. Ebe a na-eli ozu n’ime ya gbara ya gburugburu. Ha niile bụ ndị a na-ebighị úgwù, ndị e ji mma agha gbuo,+ n’ihi na e mere ka a na-atụ ha egwu n’ala ndị dị ndụ. Ha ga-eburukwa mmechuihu ha, ha na ndị na-agbada n’olulu. E debewo ya n’etiti ndị e gburu egbu.
26 “‘N’ebe ahụ ka Mishek+ na Tubal+ na ndị ya niile nọ. Ebe a na-eli ozu n’ime ya gbara ya gburugburu. Ha niile bụ ndị a na-ebighị úgwù, ndị e ji mma agha magbuo, n’ihi na ha emewo ka a na-atụ ha egwu n’ala ndị dị ndụ. 27 Ọ̀ bụ na ha na ndị dike agaghị atọgbọrọ otu ebe,+ bụ́ ndị nwụrụ n’etiti ndị a na-ebighị úgwù, ndị gbadaworo na Shiol, ha na ngwá agha ha? Ha ga-edebe mma agha ha n’okpuru isi ha, njehie ha ga-adịkwasịkwa n’ọkpụkpụ ha,+ n’ihi na ndị dike na-eme ka egwu dịrị n’ala ndị dị ndụ.+ 28 Ma gị onwe gị, n’etiti ndị a na-ebighị úgwù ka a ga-agbaji gị, gị na ndị e ji mma agha gbuo ga-atọgbọkọkwa.
29 “‘N’ebe ahụ ka Idọm+ na ndị eze ya na ndị isi ya niile nọ, bụ́ ndị a tụkọtara ozu ha na ndị e ji mma agha gbuo,+ n’agbanyeghị na ha dị ike; ha na ndị a na-ebighị úgwù+ na ndị na-agbada n’olulu ga-atọgbọkọ.
30 “‘N’ebe ahụ ka ndị isi nke ebe ugwu nọ, ha niile, nakwa ndị Saịdọn niile,+ ndị ha na ndị e gburu egbu nwụkọrọ ọnwụ ihere, n’agbanyeghị na ha dị egwu n’ihi ịdị ike ha. Ha ga-atọgbọrọ n’ebighị úgwù, ha na ndị e ji mma agha gbuo, ha na ndị na-agbada n’olulu ga-ebukwa mmechuihu ha.+
31 “‘Ndị a bụ ndị Fero ga-ahụ, a ga-akasikwa ya obi maka ndị ya niile.+ A ga-eji mma agha gbuo Fero na ndị agha ya niile,’ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.
32 “‘N’ihi na o mewo ka a na-atụ ya egwu n’ala ndị dị ndụ,+ a ga-atọgbọkwa ya n’etiti ndị a na-ebighị úgwù, ya na ndị e ji mma agha gbuo, ya bụ, Fero na ndị ya niile,’ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.”