22 Devid wee gwa Jehova okwu ndị dị n’abụ+ a n’ụbọchị Jehova napụtara ya n’ọbụ aka ndị iro+ ya niile nakwa n’ọbụ aka Sọl;+ 2 o wee sị:
“Jehova bụ nkume m dị elu+ na ebe m e wusiri ike+ na Onye na-emere m ụzọ mgbapụ.+
3 Chineke m bụ oké nkume m.+ M ga-agbaba n’ime ya,
Ọta+ m na mpi+ nzọpụta m, bụ́ ebe m dị elu nke e wusiri ike,+
Na ebe mgbaba m,+ Onye Nzọpụta m;+ ị na-azọpụta m n’ihe ike.+
4 M ga-akpọku Jehova, bụ́ Onye e kwesịrị inye otuto,+
A ga-azọpụtakwa m n’aka ndị iro m.+
5 N’ihi na ebili mmiri nke na-egbu mmadụ gbara m gburugburu;+
E nwere oké idei mmiri nke ndị na-abaghị n’ihe nke nọ na-emenye m ụjọ.+
6 Ụdọ Shiol gbara m gburugburu;+
Ọnyà ọnwụ chere m ihu.+
7 N’oge m nọ n’ahụhụ, m nọ na-akpọku Jehova,+
Ọ bụkwa Chineke m ka m nọ na-akpọku.+
O wee nọrọ n’ụlọ nsọ ya nụ olu m,+
Mkpu enyemaka m tiri rukwara ya ntị.+
8 Ụwa wee malite ịṅagharị na ịma jijiji;+
Ntọala eluigwe wee maa jijiji,+
Ha wee na-aṅagharị n’ihi na a kpasuwo ya iwe.+
9 Anwụrụ ọkụ wee si n’oghere imi ya kwụgoo, ọkụ nke si ya n’ọnụ nọkwa na-erepịa ihe;+
Icheku ọkụ sikwa n’ebe ọ nọ na-apụta.+
10 O wee bịada eluigwe rịdata;+
Oké ọchịchịrị dịkwa n’okpuru ụkwụ ya.+
11 Ọ nọ n’elu cherọb+ gbara bịa, ferekwa efe bịa;
E wee hụ ya n’elu nku otu mmụọ.+
12 O wee mee ka ọchịchịrị gbaa ya gburugburu dị ka ụlọ ndò,+
Meekwa ka mmiri rujuru eruju na ígwé ojii+ gbaa ya gburugburu.
13 Icheku ọkụ si n’ìhè dị n’ihu ya na-enwu.+
14 Jehova si n’eluigwe malite ibigbọ,+
Onye Kasị Elu malitekwara ime ka a nụ olu ya.+
15 O wee na-agbapụ akụ́, ka o wee chụsaa ha;+
Meekwa ka àmụ̀mà gbuo, ka o wee tinye ha n’ọgba aghara.+
16 A hụrụ ala oké osimiri,+
E kpughere ntọala nke elu ala,+
Mgbe Jehova bara mba, site n’ume nke si n’oghere imi ya.+
17 O si n’elu matịa aka ya kpọrọ m,+
Ọ dọpụtara m ná nnukwu mmiri.+
18 Ọ napụtara m n’aka onye iro m dị ike,+
N’aka ndị kpọrọ m asị; n’ihi na ha ka m ike.+
19 Ha nọ na-emegide m n’ụbọchị m nwere ọdachi,+
Ma Jehova ghọrọ onye na-akwado m.+
20 O wee kpọpụta m kpọba m n’ebe sara mbara;+
Ọ napụtara m, n’ihi na ihe m masịrị ya.+
21 Jehova na-akwụ m ụgwọ dị ka ezi omume m si dị:+
Ọ bụkwa dị ka aka m si dị ọcha ka ọ na-akwụ m ụgwọ.+
22 N’ihi na edebewo m ụzọ Jehova,+
Emeghị m omume ọjọọ nke bụ́ ịhapụ Chineke m.+
23 N’ihi na mkpebi ikpe+ ya niile dị m n’ihu;
Agaghịkwa ahapụ ụkpụrụ ya.+
24 M ga-abụ onye na-enweghị ntụpọ+ n’ebe ọ nọ,
Mụ onwe m ga-ezerekwa njehie.+
25 Ka Jehova kwụọ m ụgwọ dị ka ezi omume m si dị,+
Dị ka m si dị ọcha n’ihu ya.+
26 Onye na-eguzosi ike n’ihe ka ị ga-eji iguzosi ike n’ihe meso ihe;+
Ị ga-emeso onye na-enweghị ntụpọ, bụ́ dike, ihe n’ụzọ na-enweghị ntụpọ;+
27 Ị ga-egosi onye na-edebe onwe ya ọcha na gị onwe gị dị ọcha,+
Ị ga-emesokwa onye gbagọrọ agbagọ ihe dị ka à ga-asị na ị dị iberiibe.+
28 Ị ga-azọpụtakwa ndị dị umeala n’obi;+
Ma ị na-ele ndị mpako anya ọjọọ, ka i wee weda ha ala.+
29 N’ihi na ị bụ oriọna m, Jehova,+
Ọ bụkwa Jehova na-eme ka ìhè nwuo n’ọchịchịrị m.+
30 N’ihi na site n’enyemaka gị, m pụrụ ịchụ ìgwè ọ lụọ ọ gbalaga ọsọ;+
Site n’enyemaka Chineke m, m pụrụ ịrị mgbidi.+
31 Ezi Chineke, ụzọ ya zuru okè;+
Okwu Jehova bụ okwu a nụchara anụcha.+
Ọ bụ ọta nye ndị niile na-agbaba n’ime ya.+
32 N’ihi na ònye bụ Chineke ma e wezụga Jehova,+
Ònyekwa bụ oké nkume ma e wezụga Chineke anyị?+
33 Ezi Chineke bụ ebe m e wusiri ike,+
Ọ ga-emekwa ka ụzọ m zuo okè,+
34 Mee ka ụkwụ m na-awụ ọsọ dị ka ụkwụ nne ele;+
Ọ na-emekwa ka m guzoro n’ebe dịịrị m elu.+
35 Ọ na-akụziri aka m otú e si ebu agha;+
Ogwe aka m ekwewo ụta ọla kọpa.+
36 Ị ga-enyekwa m ọta nzọpụta gị,+
Ọ bụkwa ịdị umeala n’obi gị na-eme ka m dị ukwuu.+
37 Ị ga-eme ohere sara mbara nke ga-aba ụkwụ m;+
Nkwonkwo ụkwụ m agaghịkwa ama jijiji.+
38 M ga-achụ ndị iro m ọsọ, ka m wee laa ha n’iyi,
Agaghị m alaghachi azụ ruo mgbe e kpochapụrụ ha.+
39 M ga-ekpochapụ ha ma tipịasịa ha,+ ka ha wee ghara ibili;+
Ha ga-adakwa, mụ azọọ ha ụkwụ.+
40 Ị ga-eke m ike n’úkwù maka ibu agha;+
Ị ga-eme ka ndị na-ebili imegide m daa n’okpuru m.+
41 Ị ga-eme ka ndị iro m gbaa ọsọ;+
M ga-ebibikwa ndị kpọrọ m oké asị.+
42 Ha na-eti mkpu enyemaka, ma ọ dịghị onye na-azọpụta ha;+
Ha na-etiku Jehova, ma ọ dịghị aza ha.+
43 M ga-asụri ha ka ha dị ka uzuzu dị n’ala;
M ga-egweri ha ka ha dị ka apịtị dị n’okporo ámá;+
M ga-akụ ha ka ha dị mbadamba.
44 Ị ga-emere m ụzọ m ga-esi gbanahụ nkatọ nke ndị m na-akatọ m.+
Ị ga-echebe m ka m bụrụ onyeisi nke mba dị iche iche;+
Ndị m na-amaghị ga-ejere m ozi.+
45 Ndị mba ọzọ ga-eji egwu bịakwute m;+
Nrubeisi ga-eme ka ntị ha nụrụ okwu m.+
46 Ike ga-agwụ ndị mba ọzọ,
Ha ga-amarakwa jijiji si ná mgbidi ha siri ike pụta.+
47 Jehova dị ndụ;+ ka Oké Nkume+ m bụrụ onye a gọziri agọzi;
Ka e buliekwa Chineke bụ́ oké nkume nke nzọpụta m elu.+
48 Ezi Chineke bụ Onye na-abọrọ m ọbọ+
Na Onye na-ewetu ndị dị iche iche n’okpuru m,+
49 Nakwa Onye na-akpọpụta m n’aka ndị iro m.+
Ị ga-ebulikwa m elu ka m karịa ndị na-ebili imegide m;+
Ị ga-anapụta m n’aka onye na-eme ihe ike.+
50 Ọ bụ ya mere m ga-eji kelee gị, Jehova, n’etiti mba dị iche iche;+
M ga-abụkukwa aha gị abụ olu ụtọ:+
51 Onye na-eme ka eze ya nwee nzọpụta dị ukwuu,+
Na-egosikwa onye o tere mmanụ,+ bụ́ Devid, na mkpụrụ ya, obiọma,
Ruo mgbe ebighị ebi.”+