Abụ Ọma
Ntụziaka e nyere onye nduzi. Abụ ọma Devid, bụ́ ohu Jehova, bụ́ onye gwara Jehova okwu dị n’abụ a n’ụbọchị Jehova napụtara ya n’ọbụ aka ndị iro ya niile nakwa n’aka Sọl.+ O wee sị:
18 M ga-ahụ gị n’anya nke ukwuu, Jehova bụ́ ike m.+
2 Jehova bụ nkume m dị elu na ebe m e wusiri ike na Onye na-emere m ụzọ mgbapụ.+
Chineke m bụ oké nkume m. M ga-agbaba n’ime ya,+
Ọta m na mpi nzọpụta m, bụ́ ebe m dị elu nke e wusiri ike.+
6 N’oge m nọ n’ahụhụ, m nọ na-akpọku Jehova,
Ọ bụkwa Chineke m ka m nọ na-etiku maka enyemaka.+
O wee nọrọ n’ụlọ nsọ ya nụ olu m,+
Mkpu enyemaka m tiri n’ihu ya wee ruo ya ntị.+
7 Ụwa wee malite ịṅagharị na ịma jijiji,+
Ntọala nke ugwu dị iche iche mekwara mkpatụ,+
Ha nọkwa na-aṅagharị ihu na azụ n’ihi na a kpasuru ya iwe.+
8 Anwụrụ ọkụ si n’oghere imi ya kwụgoo, ọkụ nke si ya n’ọnụ nọkwa na-erepịa ihe;+
Icheku ọkụ sikwa n’ebe ọ nọ na-apụta.
11 O wee mee ka ọchịchịrị bụrụ ebe ọ na-ezo,+
Meekwa ka mmiri rujuru eruju na ígwé ojii
Gbaa ya gburugburu dị ka ụlọ ndò ya.+
12 Ígwé ojii ya sikwa n’ìhè dị n’ihu ya gafere,+
Akụ́ mmiri ígwé na icheku ọkụ sikwa n’ígwé ojii zoo.+
13 Jehova wee nọrọ n’eluigwe malite ibigbọ,+
Onye Kasị Elu malitekwara ime ka a nụ olu ya,+
Akụ́ mmiri ígwé na icheku ọkụ wee na-ezo.
14 O wee na-agbapụ akụ́ ya, ka o wee chụsaa ha;+
O mekwara ka àmụ̀mà gbuo, ka o wee tinye ha n’ọgba aghara.+
15 E wee malite ịhụ ala mmiri anya,+
E kpughekwara ntọala nke elu ala+
Site n’ịba mba gị, Jehova, site n’ume nke si n’oghere imi gị.+
20 Jehova na-akwụ m ụgwọ dị ka ezi omume m si dị;+
Ọ bụkwa dị ka aka m si dị ọcha ka ọ na-akwụ m ụgwọ.+
25 Onye na-eguzosi ike n’ihe ka ị ga-eji iguzosi ike n’ihe meso ihe;+
Ị ga-emeso onye na-enweghị ntụpọ, bụ́ dimkpa, ihe n’ụzọ na-enweghị ntụpọ;+
26 Ị ga-egosi onye na-edebe onwe ya ọcha na ị dị ọcha;+
Ị ga-egosikwa onye gbagọrọ agbagọ na ị dị akọ;+
27 N’ihi na gị onwe gị ga-azọpụta ndị nọ n’ahụhụ;+
Ma ị ga-eweda anya dị mpako ala.+
28 N’ihi na gị onwe gị, Jehova, ga-amụnye oriọna m;+
Ọ bụ Chineke m ga-eme ka ìhè nwuo n’ọchịchịrị m.+
29 N’ihi na site n’enyemaka gị, m pụrụ ịchụ ìgwè ọ lụọ ọ gbalaga ọsọ;+
Site n’enyemaka Chineke m, m pụrụ ịrịgo mgbidi.+
30 Ezi Chineke, ụzọ ya zuru okè;+
Okwu Jehova bụ okwu a nụchara anụcha.+
Ọ bụụrụ ndị niile na-agbaba n’ime ya ọta.+
32 Ọ bụ ezi Chineke kere m ike n’úkwù,+
Ọ ga-emekwa ka ụzọ m zuo okè,+
33 Meekwa ka ụkwụ m na-awụ ọsọ dị ka ụkwụ nne ele,+
Ọ na-emekwa ka m guzoro n’ebe dịịrị m elu.+
35 Ị ga-enyekwa m ọta nzọpụta gị,+
Aka nri gị ga-akwado m,+
Ịdị umeala n’obi gị ga-emekwa ka m dị ukwuu.+
43 Ị ga-emere m ụzọ m ga-esi gbanahụ nkatọ ndị mmadụ.+
Ị ga-eme m onyeisi nke mba dị iche iche.+
Ndị m na-amaghị ga-ejere m ozi.+
46 Jehova dị ndụ,+ ka Oké Nkume m+ bụrụ onye a gọziri agọzi,
Ka e buliekwa Chineke nke nzọpụta m elu.+
48 Ọ na-eme ka m gbapụ n’aka ndị iro m iwe ji;+
Ị ga-ebulikwa m elu ka m karịa ndị na-ebili imegide m,+
Ị ga-anapụta m n’aka onye na-eme ihe ike.+