116 Ịhụnanya juru m obi n’ihi na Jehova na-anụ+
Olu m na arịrịọ m.+
2 N’ihi na ọ tọworo m ntị n’ala,+
M ga-akpọku ya ụbọchị ndụ m niile.+
3 Ụdọ ọnwụ gbara m gburugburu,+
Anọ m n’ọnọdụ ọjọọ dị ka à ga-asị na m nọ na Shiol.+
M nọ na-enwe ahụhụ na iru uju.+
4 Ma m kpọkuru aha Jehova, sị:+
“Biko, Jehova, meere mkpụrụ obi m ụzọ mgbapụ!”+
5 Jehova na-eme amara, bụrụkwa onye ezi omume;+
Chineke anyị bụkwa Onye na-eme ebere.+
6 Jehova na-echebe ndị na-amaghị ihe.+
Ike gwụrụ m, o wee zọpụta m.+
7 Mkpụrụ obi m, laghachi n’ebe izu ike gị,+
N’ihi na Jehova emesowo gị ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị.+
8 Ị napụtawo mkpụrụ obi m n’ọnwụ,+
Napụtakwa anya m n’anya mmiri, napụtakwa ụkwụ m ka ọ ghara ịkpọ n’ihe.+
9 M ga-eje ije+ n’ihu Jehova n’ala ndị dị ndụ.+
10 Ekwuru m okwu+ n’ihi na m nwere okwukwe.+
E mekpara m ahụ́ nke ukwuu.
11 Mgbe ụjọ tụwara m, mụ onwe m sịrị:+
“Mmadụ niile bụ ndị ụgha.”+
12 Gịnị ka m ga-eji kwụọ Jehova ụgwọ+
Uru niile ọ na-eme ka m rite?+
13 M ga-eburu iko nke oké nzọpụta,+
M ga-akpọkukwa aha Jehova.+
14 M ga-emezu nkwa niile m kwere Jehova,+
Ee, m ga-emezu ha n’ihu ndị ya niile.
15 Ọnwụ ndị na-eguzosi ike n’ebe Jehova nọ
Dị oké ọnụ ahịa n’anya ya.+
16 Biko, Jehova,+
N’ihi na abụ m ohu gị.+
Abụ m ohu gị, nwa ohu gị nwaanyị.+
Ị tọpụwo agbụ e kere m.+
17 Ọ bụ gị ka m ga-achụrụ àjà ekele,+
Ọ bụkwa aha Jehova ka m ga-akpọku.+
18 M ga-emezu nkwa niile m kwere Jehova,+
Ee, m ga-emezu ha n’ihu ndị ya niile,+
19 N’ogige ụlọ Jehova,+
N’ime gị, Jeruselem.+
Toonụ Jaa!+