Hosia
13 “Ndị mmadụ mara jijiji mgbe Ifrem kwuru okwu; ọ bụ onye a ma ama n’Izrel.+ Ma ikpe mara ya n’ihe metụtara Bel,+ o wee nwụọ.+ 2 Ugbu a, ha na-emekwu mmehie, jirikwa ọlaọcha ha na-emere onwe ha ihe oyiyi a wụrụ awụ,+ bụ́ arụsị dị iche iche,+ dị ka nghọta ha si dị, ha niile bụ aka ọrụ ndị omenkà.+ Ha na-agwa ha, sị, ‘Ka ụmụ mmadụ ndị na-achụ àjà susuo ụmụ ehi ọnụ.’+ 3 Ya mere, ha ga-adị ka ígwé ojii ụtụtụ,+ dịkwa ka igirigi nke na-ekusa ngwa ngwa; ha dị ka igbogbo ọka nke oké ifufe na-ebupụ n’ebe nzọcha mkpụrụ,+ dịkwa ka anwụrụ ọkụ nke si n’oghere dị n’uko ụlọ na-ekupụsị.
4 “Ma abụ m Jehova bụ́ Chineke gị malite n’ala Ijipt,+ ọ dịghị Chineke ọzọ ị maara ma e wezụga m; e nweghịkwa onye nzọpụta ma e wezụga m.+ 5 Mụ onwe m maara gị n’ala ịkpa,+ n’ala ahụ́ ọkụ.+ 6 Mgbe ha tara nri n’ebe ịta nri ha, afọ juru ha.+ Ha rijuru afọ, obi ha wee fụlie ha elu.+ Ọ bụ ya mere ha ji chefuo m.+ 7 M ga-adị ka nwa ọdụm nye ha.+ M ga na-ele anya dị ka agụ owuru nọ n’akụkụ ụzọ.+ 8 M ga-ezute ha dị ka anụ ọhịa bea nke na-ahụkwaghị ụmụ ya,+ m ga-adọwa obi ha. M ga-eri ha n’ebe ahụ dị ka ọdụm;+ anụ ọhịa ga-adọrisị ha.+ 9 Ọ ga-ebibi gị,+ Izrel, n’ihi na ọ bụ m, bụ́ onye na-enyere gị aka, ka i megidere.+
10 “Oleezi ebe eze gị nọ, ka o wee napụta gị n’obodo gị niile,+ oleekwa ebe ndị ikpe gị nọ, bụ́ ndị i kwuru banyere ha, sị, ‘Nye m eze na ndị isi’?+ 11 M wee jiri iwe nye gị eze,+ m ga-ejikwa oké iwe wepụ ya.+
12 “E kechiela njehie Ifrem ihe, e debewo mmehie ya.+ 13 Ime nke na-eme nwaanyị na-amụ nwa ga-eme ya.+ Ọ bụ nwa na-amaghị ihe,+ n’ihi na mgbe oge ruru, ọ gaghị anọ n’ebe ụmụ si apụta n’akpa nwa.+
14 “M ga-agbapụta ha n’aka Shiol;+ m ga-agbapụta ha n’aka ọnwụ.+ Ọnwụ, olee ebe ihe i ji agba mmadụ dị?+ Shiol,+ olee ebe mbibi ị na-eweta dị? A ga-ezopụ ọmịiko n’anya m.+
15 “Ọ bụrụ na ya onwe ya, dị ka nwa ahịhịa amị, amịa mkpụrụ,+ ifufe si n’ebe ọwụwa anyanwụ, bụ́ ifufe Jehova, ga-abịa.+ O si n’ala ịkpa na-abịa, ọ ga-amịkpọ olulu mmiri ya, mịkọrọkwa mmiri dị n’isi iyi ya.+ Onye ahụ ga-akwakọrọ akụ̀ dị oké ọnụ ahịa, bụ́ ihe niile a na-achọsi ike.+
16 “A ga-ama Sameria ikpe,+ n’ihi na ọ na-enupụrụ Chineke ya isi.+ A ga-eji mma agha gbuo ha.+ A ga-akụri ụmụ ha,+ a ga-abọwakwa ndị inyom ha dị ime afọ.”+