Abụ Ọma
Abụ, abụ olu ụtọ ụmụ Kora. Ntụziaka e nyere onye nduzi nke Mehalat maka iji na-abụ abụ. Maskil nke Himan+ onye Zira.
4 A gụnyewo m ná ndị na-agbada n’olulu;+
Adịzi m ka dimkpa nke ume na-adịkwaghị,+
5 Dị ka à ga-asị na m nọ n’etiti ndị nwụrụ anwụ, adị m ka onye nweere onwe ya,+
Dị ka ndị e gburu egbu bụ́ ndị tọgbọrọ n’ili,+
Ndị ị na-adịkwaghị echeta,
Ndị na-adịkwaghị enweta enyemaka gị.+
8 I mewo ka ndị mụ na ha ma nọrọ m n’ebe dị anya;+
I mewo ka m bụụrụ ha oké ihe arụ.+
E jichiri m ejichi, enweghị m ike ịpụ.+
9 Anya m adịkwaghị ahụcha ụzọ n’ihi mmekpa ahụ́ m.+
Jehova, akpọkuwo m gị ogologo ụbọchị dum;+
Agbasapụworo m gị ọbụ aka m.+
10 Ọ̀ bụ ndị nwụrụ anwụ ka ị ga-emere ihe dị ịtụnanya?+
Ka ndị na-adịghị ndụ hà ga-ebili,+
Hà ga-eto gị?+ Sila.
12 À ga-anọ n’ọchịchịrị mata ihe ịtụnanya ị na-eme,+
Ka à ga-anọ n’ala nke ndị e chefuru echefu mata ezi omume gị?+
13 Ma, ọ bụ gị, Jehova, ka mụ onwe m na-etiku maka enyemaka,+
Ekpere m na-abịakwutekwa gị kwa ụtụtụ.+
15 Malite n’oge m bụ nwata, anọ m n’ahụhụ, ọ fọkwara nke nta ka m kubie ume;+
Ediwo m ọtụtụ ihe na-emenye ụjọ ndị si n’aka gị.+