Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • 1 Samuel 11:15
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 15 Ndị Izrel niile wee gaa Gilgal, ha wee mee Sọl eze n’ebe ahụ n’ihu Jehova n’ime Gilgal. Ha wee chụọ àjà udo n’ebe ahụ n’ihu Jehova,+ n’ebe ahụkwa ka Sọl na ndị Izrel niile nọ na-aṅụrị ọṅụ nke ukwuu.+

  • 1 Samuel 13:13
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 13 Samuel wee sị Sọl: “I zuzuru nzuzu.+ I debeghị ihe Jehova bụ́ Chineke gị nyere gị n’iwu,+ nke ọ gwara gị mee,+ n’ihi na, ọ bụrụ na i debere ya, Jehova gaara eme ka alaeze gị n’Izrel guzosie ike ruo mgbe a na-akaghị aka.

  • 1 Samuel 15:26
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 26 Ma Samuel sịrị Sọl: “Agaghị m eso gị laghachi, n’ihi na ị jụwo okwu Jehova, Jehova ajụwokwa gị ka ị ghara ịbụkwa eze Izrel.”+

  • 1 Samuel 16:23
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 23 O wee ruo na mgbe mmụọ Chineke dakwasịrị Sọl, Devid na-ewere ụbọ akwara, jiri aka ya kpọọ ya; ahụ́ na-adajụ Sọl, ahụ́ na-adịkwa ya mma, mmụọ ahụ na-adịghị mma na-esikwa n’ahụ́ ya pụọ.+

  • 1 Samuel 28:7
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 7 N’ikpeazụ, Sọl sịrị ndị na-ejere ya ozi: “Chọọrọnụ m nwaanyị mgbaasị,+ m ga-agakwuru ya jụọ ya ase.” Ndị na-ejere ya ozi wee sị ya: “Lee! E nwere nwaanyị mgbaasị nọ n’En-dọọ.”+

  • 1 Samuel 31:4
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 4 Sọl wee sị onye na-eburu ya ihe agha: “Mịrị mma agha gị+ maa m, ka ndị a a na-ebighị úgwù+ ghara ịbịa were mma agha ha magbuo m ma mee m ihe na-adịghị mma.” Ma obi ekweghị onye na-eburu ya ihe agha ime ya,+ n’ihi na egwu ji ya nke ukwuu. Sọl wee mịrị mma agha dakwasị na ya.+

  • 2 Samuel 1:23
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 23 Sọl na Jọnatan,+ ndị a hụrụ n’anya, ndị bụkwa ndị ọma n’oge ha dị ndụ,

      E kewaghịkwa ha n’ọnwụ.+

      Ha na-efe ọsọ karịa ugo,+

      Ha dị ike karịa ọdụm.+

  • Ọrụ Ndịozi 13:21
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 21 Ma malite n’oge ahụ gaa n’ihu, ha kwuru ka e nye ha eze,+ Chineke wee nye ha Sọl nwa Kish, nwoke si n’ebo Benjamin,+ ruo afọ iri anọ.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya