Ilu
3 Nwa m, echefula iwu m,+ ka obi gị debekwa ihe m nyere n’iwu,+ 2 n’ihi na ogologo ndụ na ọtụtụ afọ ndụ+ na udo ka a ga-atụkwasịrị gị.+ 3 Ka obiọma* na eziokwu ghara ịhapụ gị.+ Kee ha gburugburu olu gị.+ Dee ha n’elu mbadamba nkume nke bụ́ obi gị,+ 4 ka i wee nweta ihu ọma na ezi nghọta n’anya Chineke na mmadụ.+ 5 Jiri obi gị dum tụkwasị Jehova obi,+ adaberekwala ná nghọta gị.+ 6 N’ụzọ gị niile, mara ya,+ ya onwe ya ga-emekwa ka ụzọ gị kwụrụ ọtọ.+
7 Abụla onye maara ihe n’anya onwe gị.+ Tụọ egwu Jehova, hapụkwa ihe ọjọọ.+ 8 Ka ọ bụrụ ihe na-agwọ+ otubo gị, bụrụkwa ihe na-eme ka i nwee ume n’ọkpụkpụ gị.+
9 Jiri ihe gị ndị dị oké ọnụ ahịa sọpụrụ Jehova,+ tinyere mkpụrụ mbụ nke ihe ubi gị dum.+ 10 Mgbe ahụ, ụlọ nkwakọba ihe gị ga-ejupụta n’ọtụtụ ihe;+ olulu nzọchapụta mmanya gị ga-ejubigakwa ókè.+
11 Nwa m, ajụla ịdọ aka ná ntị Jehova;+ akpọkwala ịba mba ya asị,+ 12 n’ihi na onye Jehova hụrụ n’anya ka ọ na-abara mba,+ ọbụna dị ka nna si abara nwa ya nke ihe ya dị ya mma mba.+
13 Obi ụtọ na-adịrị onye chọtaworo amamihe,+ na onye nwetara nghọta,+ 14 n’ihi na ọ dị mma inweta ya dị ka uru karịa inweta ọlaọcha dị ka uru, inweta ya dị ka ihe mmadụ rụpụtara dịkwa mma karịa inweta ọlaedo.+ 15 Ọ dị oké ọnụ ahịa karịa nkume kọral,+ ọ dịghịkwa ihe ọ bụla ọzọ na-atọ gị ụtọ nke pụrụ ịha ka ya. 16 Ogologo ndụ dị n’aka nri ya;+ akụnụba na ùgwù dịkwa n’aka ekpe ya.+ 17 Ụzọ ya bụ ụzọ obi ụtọ, okporo ụzọ ya niile bụkwa udo.+ 18 Ọ bụụrụ ndị na-ejide ya aka osisi nke ndụ,+ ndị na-ejidesikwa ya aka ike+ ka a ga-akpọ ndị obi ụtọ.+
19 Jehova ji amamihe tọọ ntọala ụwa.+ O jikwa nghọta mee ka eluigwe guzosie ike.+ 20 Ọ bụ ihe ọmụma ya ka o ji kewaa ogbu mmiri dị iche iche,+ mmiri na-esikwa n’ígwé ojii na-ezo ntakịrị ntakịrị.+ 21 Nwa m, ka ihe ndị a ghara ịpụ n’anya gị.+ Chekwaa ezi amamihe na ikike iche echiche,+ 22 ha ga-abụkwara mkpụrụ obi gị ndụ,+ bụkwaara olu gị ihe ịchọ mma.+ 23 Mgbe ahụ, ị ga na-eje ije n’ụzọ gị n’obi iru ala,+ ọbụna ụkwụ gị agaghị akpọ n’ihe ọ bụla.+ 24 Mgbe ọ bụla i dinara ala, ụjọ agaghị atụ gị;+ ị ga-edinakwa ala, ụra gị ga-atọkwa gị ụtọ.+ 25 Ị gaghị atụ egwu ihe mberede ọ bụla nke na-emenye ụjọ,+ ị gaghịkwa atụ egwu oké ifufe mmiri nke na-abịakwasị ndị ajọ omume, n’ihi na ọ na-abịa.+ 26 N’ihi na Jehova ga-abụ obi ike gị,+ ọ ga-echebekwa ụkwụ gị ka a ghara ịnwụde ya.+
27 Ajụla imere ha ihe ọma bụ́ ndị e kwesịrị imere ya,+ mgbe ọ dị n’ike aka gị ime ya.+ 28 Asịla mmadụ ibe gị: “Lawa, bịaghachi, m ga-enyekwa gị ya echi,” mgbe ọ dị ihe i nwere.+ 29 Akparala mmadụ ibe gị nkata ihe ọjọọ ọ bụla,+ mgbe o chere na gị na ya bi n’udo.+ 30 Gị na mmadụ esela okwu n’efu,+ ma ọ bụrụ na ọ dịghị ihe ọjọọ o mere gị.+
31 Enwerela onye na-eme ihe ike anyaụfụ,+ ahọrọkwala ụzọ ya ọ bụla.+ 32 N’ihi na onye aghụghọ+ bụ ihe arụ n’anya Jehova,+ ma ya na ndị na-eme ihe n’eziokwu na-enwe mmekọrịta chiri anya.+ 33 Ọbụbụ ọnụ Jehova na-adịkwasị ụlọ onye ajọ omume,+ ma ebe obibi nke ndị ezi omume ka ọ na-agọzi.+ 34 Ọ bụrụ ndị na-akwa emo,+ ọ ga-akwa ha emo;+ ma ọ ga-emere ndị dị umeala n’obi amara.+ 35 Nsọpụrụ ka ndị maara ihe ga-enweta,+ ma ndị nzuzu na-enye ihe ihere otuto.+