Levitikọs
18 Jehova wee gaa n’ihu ịgwa Mozis, sị: 2 “Gwa ụmụ Izrel okwu, sị ha, ‘Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.+ 3 Unu emela otú ala Ijipt, bụ́ ebe unu biri, na-eme;+ unu emekwala otú ala Kenan, bụ́ ebe m na-akpọbata unu, na-eme;+ unu ejekwala ije n’ụkpụrụ ha. 4 Unu ga-edebe mkpebi ikpe m niile,+ debekwa ụkpụrụ m niile+ iji na-eje ije na ha.+ Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu. 5 Unu ga-edebe ụkpụrụ m na mkpebi ikpe m. Ọ bụrụ na mmadụ edebe ha, ha ga-eme ka ọ dị ndụ.+ Abụ m Jehova.+
6 “‘Onye ọ bụla n’ime unu abịarula onye ikwu ya ọ bụla nke ya na ya bụ otu ọbara nso iji kpughee ọtọ ya.+ Abụ m Jehova. 7 Ekpughela ọtọ nna gị+ na ọtọ nne gị. Ọ bụ nne gị. Ekpughela ọtọ ya.
8 “‘Ekpughela ọtọ nwunye nna gị.+ Ọ bụ ọtọ nna gị.
9 “‘Ekpughela ọtọ nwanne gị nwaanyị, bụ́ nwa nwaanyị nke nna gị mụrụ ma ọ bụ nwa nwaanyị nne gị mụrụ, ma à mụrụ gị na ya n’otu ezinụlọ ma à mụrụ ya n’ebe ọzọ.+
10 “‘Ekpughela ọtọ nwa nwaanyị nke nwa gị nwoke mụrụ ma ọ bụ nwa nwaanyị nke nwa gị nwaanyị mụrụ, n’ihi na ha bụ ọtọ gị.
11 “‘Ekpughekwala ọtọ nwa nwunye nna gị, bụ́ nwa nna gị mụrụ, n’ihi na ọ bụ nwanne gị nwaanyị.
12 “‘Ekpughela ọtọ nwanne nna gị nke nwaanyị. Ya na nna gị bụ otu ọbara.+
13 “‘Ekpughela ọtọ nwanne nne gị nke nwaanyị, n’ihi na ya na nne gị bụ otu ọbara.
14 “‘Ekpughela ọtọ nwanne nna gị nke nwoke. Abịarula nwunye ya nso. Ọ bụ nwunye nwanne nna gị.+
15 “‘Ekpughela ọtọ nwunye nwa gị.+ Ọ bụ nwunye nwa gị nwoke. Ekpughela ọtọ ya.
16 “‘Ekpughela ọtọ nwunye nwanne gị nwoke.+ Ọ bụ ọtọ nwanne gị nwoke.
17 “‘Ekpughela ọtọ nwaanyị na nwa ya nwaanyị.+ Akpọrọla nwa nwaanyị nke nwa ya nwoke mụrụ nakwa nwa nwaanyị nke nwa ya nwaanyị mụrụ iji kpughee ọtọ ha. Ha niile bụ otu ọbara. Ọ bụ omume rụrụ arụ.+
18 “‘Alụla nwaanyị lụọkwa nwanne ya ka ya na ya bụrụ nwunye di+ iji kpughee ọtọ ya, ya bụ, n’oge nwanne ya nwaanyị ka nọ ndụ.
19 “‘Abịarukwala nwaanyị nso iji kpughee ọtọ+ ya n’oge ọ nọ n’adịghị ọcha nke ịhụ nsọ ya.+
20 “‘Gị na nwunye mmadụ ibe gị enwela mmekọahụ* wee bụrụ onye na-adịghị ọcha site n’ime otú ahụ.+
21 “‘Ekwela ka e were nwa gị ọ bụla nye+ Molek.+ Emerụla+ aha Chineke gị n’ụzọ dị otú ahụ. Abụ m Jehova.+
22 “‘Gị na nwoke edinala+ otú gị na nwaanyị+ si edina. Ọ bụ ihe arụ.
23 “‘Gị na anụmanụ ọ bụla edinala,*+ i wee bụrụ onye na-adịghị ọcha site n’ime otú ahụ, nwaanyị agaghịkwa eguzo n’ihu anụmanụ ka ya na ya nwee mmekọ.+ Ọ bụ ime ihe arụ.
24 “‘Unu emela onwe unu ka unu bụrụ ndị na-adịghị ọcha site na nke ọ bụla n’ime ihe ndị a, n’ihi na ọ bụ ihe ndị a niile ka mba ndị m na-achụpụ n’ihu unu ji mee onwe ha ka ha bụrụ ndị na-adịghị ọcha.+ 25 N’ihi ya, ala ha bụ ihe na-adịghị ọcha, m ga-enyekwa ya ntaramahụhụ n’ihi njehie ya, ala ahụ ga-agbọpụkwa ndị bi n’ime ya.+ 26 Unu onwe unu ga-edebe ụkpụrụ m na mkpebi ikpe m,+ unu emekwala nke ọ bụla n’ihe arụ ndị a niile, ma ọ bụ nwa afọ ma ọ bụ mbịarambịa nke bi dị ka ọbịa n’etiti unu.+ 27 N’ihi na ihe arụ ndị a niile ka ndị bi n’ala a tupu unu abịa mere,+ ala a wee bụrụ nke na-adịghị ọcha. 28 Mgbe ahụ, ala a agaghị agbọpụ unu n’ihi imebi ya otú ahụ ọ ga-agbọpụ mba ndị bi n’ebe ahụ tupu unu abịa.+ 29 Ọ bụrụ na e nwee onye mere nke ọ bụla n’ihe arụ ndị a niile, a ga-ebipụ mkpụrụ obi mere ya n’etiti ndị ya.+ 30 Unu ga-arụzukwa ọrụ dịịrị unu n’ebe m nọ wee ghara ime nke ọ bụla n’omenala rụrụ arụ ndị e meworo tupu unu abịa,+ ka unu wee ghara iji ha mee onwe unu ka unu bụrụ ndị na-adịghị ọcha. Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.’”