10O wee ruo na ozugbo Adonaị-zidek bụ́ eze Jeruselem nụrụ na Jọshụa ewegharawo E-aị+ ma bibie ya,+ nakwa na o mewo Jeriko+ na eze ya+ ihe o mere E-aị na eze ya,+ nakwa na ndị Gibiọn emewo ka ha na Izrel+ dịrị n’udo nakwa na ha bi n’etiti ha,
8 Ha nọ nso ná nnukwu nkume dị na Gibiọn,+ Amesa+ wee bịa izute ha. Joab kere ihe n’úkwù, yirikwa uwe; o kekwara mma agha nke dị n’ọbọ ya n’úkwù. Ya onwe ya wee pụta, mma ahụ wee dapụ.
3 Sọlọmọn na ọgbakọ ahụ dum ya na ha nọ wee gaa n’ebe dị elu nke dị na Gibiọn;+ n’ihi na ọ bụ n’ebe ahụ ka ụlọikwuu nzute+ nke ezi Chineke dị, bụ́ nke Mozis ohu+ Jehova wuru n’ala ịkpa.
21 N’ihi na Jehova ga-ebili dị ka o biliri n’Ugwu Perezim,+ ọ ga-ewe iwe dị ka o were na ndagwurugwu nke dị nso na Gibiọn,+ ka o wee mee ihe ọ na-eme, ihe ọ na-eme dị ịtụnanya, ka o wee rụọ ọrụ ya, ọrụ ya na-eju anya.+