Akwụkwọ Ozi E Degaara Ndị Kọlọsi
4 Ndị nna ukwu, na-emesonụ ndị ohu unu otú ziri ezi na otú dị mma, ebe unu ma na unu nwekwara Nna Ukwu n’eluigwe.+
2 Na-ekpenụ ekpere mgbe niile.+ Unu echefukwala ịna-ekpe ya. Na-ekelekwanụ Chineke.+ 3 Na-ekpekwanụ ekpere maka anyị+ ka Chineke megheere anyị ụzọ ka anyị na-ekwusa okwu ya na ihe nzuzo dị nsọ gbasara Kraịst, nke mere e ji tụọ m mkpọrọ.+ 4 Na-ekpekwanụ ekpere ka m na-ekwusa ya otú ndị mmadụ ga na-aghọta ya, dị ka m kwesịrị isi na-ekwusa ya.
5 Mgbe unu na ndị na-abụghị ụmụnna nọ, na-akpanụ àgwà otú na-egosi na unu ma ihe. Na-ejinụ oge unu eme ihe kacha mkpa.*+ 6 Ka okwu unu na-atọ ụtọ mgbe niile ka ihe e tinyere nnu.+ Ọ ga-eme ka unu mara otú unu ga-esi azaghachi onye ọ bụla.+
7 Tikikọs+ ga-agwa unu ihe niile gbasara m. Ọ bụ nwanna m m hụrụ n’anya na onye ozi a tụkwasịrị obi na ohu ibe m n’ihe gbasara Onyenwe anyị. 8 M na-ezitere ya unu ka ọ gwa unu otú anyị mere, kasiekwa unu obi. 9 M na-ezite ya na Onesịmọs+ nwanna m, onye a tụkwasịrị obi, onye m hụrụ n’anya, onye obodo unu. Ha ga-agwa unu ihe niile na-eme ebe a.
10 Arịstakọs,+ onye mkpọrọ ibe m, na-ekele unu. Mak,+ onye ikwu* Banabas, na-ekelekwa unu. (Mak a bụ onye m gwara unu ka unu nabata+ ma ọ bịa ịhụ unu.) 11 Jizọs, onye a na-akpọ Jọstọs, na-ekelekwa unu. Ndị a niile bụ ndị Juu.* Naanị ndị a bụ ndị ọrụ ibe m maka Alaeze Chineke. Ha na-akasikwa m nnọọ obi.* 12 Epafras,+ onye unu na ya nọbu, ohu Kraịst Jizọs, na-ekele unu. Ọ na-ekpesi ekpere ike mgbe niile maka unu, ka unu wee kwụrụ chịm n’ikpeazụ ka ndị tozuru etozu, na-ekwenyesikwa ike n’ihe niile gbasara uche Chineke. 13 M na-agba akaebe na ọ na-agba ezigbo mbọ maka unu nakwa maka ndị nọ na Leodisia na ndị nọ na Haịrapọlis.
14 Luk,+ onye anyị hụrụ n’anya, onye na-agwọ ọrịa, na-ekele unu. Dimas+ na-ekelekwa unu. 15 Keleerenụ m ụmụnna ndị nọ na Leodisia. Keleekwaranụ m Nimfa na ọgbakọ na-ezukọ n’ụlọ ya.+ 16 Unu gụchaa akwụkwọ ozi a, zigaranụ ya ọgbakọ ndị Leodisia ka ha gụọ.+ Gwakwanụ ha ka ha zitere unu nke m zigaara ha ka ununwa gụọ. 17 Gwakwanụ Akịpọs,+ sị: “Na-agba mbọ ka ị rụchaa ọrụ Onyenwe anyị gwara gị rụọ.”
18 Mụnwa bụ́ Pọl na-ekele unu. Ọ bụ m ji aka m na-ede+ ekele a. Burunụ mkpọrọ a tụrụ m+ n’uche. Ka Chineke meere unu amara.