Ọpụpụ
5 E mesịa, Mozis na Erọn gara wee gwa Fero,+ sị: “Nke a bụ ihe Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru, ‘Hapụ ndị m ka ha gaa meere m ememme n’ala ịkpa.’”+ 2 Ma Fero sịrị: “Ònye bụ Jehova,+ nke mere m ga-eji rube isi n’ihe o kwuru wee hapụ ndị Izrel ka ha laa?+ Amaghị m onye Jehova bụ ma ọlị,+ agaghịkwa m ahapụ ndị Izrel ka ha laa.”+ 3 Otú ọ dị, ha gara n’ihu ịsị: “Chineke ndị Hibru agwawo anyị okwu.+ Biko, anyị chọrọ ịga njem ga-ewe ụbọchị atọ n’ala ịkpa ka anyị wee chụọrọ Jehova bụ́ Chineke anyị àjà;+ ma ọ́ bụghị ya, ọ pụrụ iji ọrịa na-efe efe ma ọ bụ mma agha tie anyị ihe otiti.”+ 4 Eze Ijipt wee sị ha: “Mozis na Erọn, gịnị mere unu ji na-eme ka ndị unu hapụ ọrụ ha?+ Gaanụ buwe ibu arọ unu!”+ 5 Fero gara n’ihu ịsị: “Lee! Ndị a adịla ọtụtụ n’ala a,+ unu na-emekwa ka ha kwụsị ibu ibu arọ ha.”+
6 Ngwa ngwa n’ụbọchị ahụ, Fero nyere ndị na-amanye ndị Izrel ịrụ ọrụ nakwa ndị isi ha+ iwu, sị: 7 “Kwụsịnụ ikpokọta ahịhịa ọka* na-enye ndị Izrel dị ka unu na-emebu ka ha jiri ya na-akpụ brik.+ Ha jiri aka ha gaa kpokọtara onwe ha ahịhịa ọka. 8 Unu ga na-amanyekwa ha ịkpụ brik ole a chọrọ ka ha na-akpụ, dị ka ha na-akpụbu. Unu esepụrụla ha ihe ọ bụla, n’ihi na ha dị umengwụ.+ Ọ bụ ya mere ha ji na-eti mkpu, na-asị: ‘Anyị chọrọ ịla, anyị chọrọ ịchụrụ Chineke anyị àjà!’+ 9 Meenụ ka ọrụ ndị ikom ahụ na-arụ dị arọ, ka ha rụọkwa ya, ka ha ghara ịṅa ntị n’okwu ụgha.”+
10 Ndị na-amanye ndị Izrel ịrụ ọrụ+ na ndị isi ha wee gaa gwa ndị Izrel, sị: “Nke a bụ ihe Fero kwuru, ‘Agakwaghị m na-enye unu ahịhịa ọka. 11 Gaanụ jiri aka unu kpota ahịhịa ọka n’ebe ọ bụla unu nwere ike inweta ya, n’ihi na a gaghị esepụrụ unu ihe ọ bụla n’ihe unu na-arụ.’”+ 12 N’ihi ya, ndị Izrel gasasịrị n’ala Ijipt dum ịga kpokọta okporo ọka ha ga-eji mere ahịhịa ọka. 13 Ndị na-amanye ha ịrụ ọrụ nọ na-enye ha nsogbu,+ sị: “Rụchaanụ ọrụ unu, onye ọ bụla rụchaa ọrụ dịịrị ya n’ụbọchị, dị nnọọ ka mgbe a na-enye unu ahịhịa ọka.”+ 14 E mesịa, a pịara+ ndị isi+ ụmụ Izrel ihe, bụ́ ndị ndị isi ọrụ Fero mere ndị isi ha, na-asị: “Gịnị mere unu akpụchaghị brik+ ole e kenyere unu dị ka unu na-akpụbu, ma ụnyaahụ ma taa?”+
15 N’ihi ya, ndị isi+ ụmụ Izrel gara wee malite ịkwasara Fero ákwá, na-asị: “Gịnị mere i ji emeso ndị ohu gị otú a? 16 E nyeghị ndị ohu gị ahịhịa ọka, ma ha na-asị, ‘Kpụọnụ brik!’ lee, a na-apịa ndị ohu gị ihe, ọ bụ ezie na ọ bụ ndị gị ka ụta dịịrị.”+ 17 Ma ọ sịrị: “Unu dị umengwụ, unu dị umengwụ!+ Ọ bụ ya mere unu ji asị, ‘Anyị chọrọ ịla, anyị chọrọ ịchụrụ Jehova àjà.’+ 18 Gaanụ rụwa ọrụ! Ọ bụ ezie na a gaghị enye unu ahịhịa ọka, ma unu ga-akpụ brik ole a gwara unu.”+
19 Ndị isi ụmụ Izrel wee hụ na ha nọ n’ọnọdụ ọjọọ n’okwu ahụ+ bụ́: “Unu esepụla ihe ọ bụla na brik ole onye ọ bụla na-akpụ kwa ụbọchị.”+ 20 E mesịa, ha zutere Mozis na Erọn,+ bụ́ ndị guzo n’ebe ahụ izute ha mgbe ha hụchara Fero wee na-apụta. 21 Ozugbo ahụ, ha sịrị ha: “Ka Jehova lee unu anya wee kpee unu ikpe,+ ebe ọ bụ na unu emewo ka anyị sie ísì ọjọọ+ n’ihu Fero nakwa n’ihu ndị na-ejere ya ozi iji nye ha mma agha ka ha gbuo anyị.”+ 22 Mozis wee chigharịkwuru Jehova,+ sị: “Jehova, gịnị mere i ji kpatara ndị a ihe ọjọọ?+ Gịnị mere i ji ziga m?+ 23 N’ihi na malite n’oge m gara n’ihu Fero ikwu okwu n’aha gị,+ o mewo ndị a ihe ọjọọ,+ ị napụtaghịkwa ndị gị ma ọlị.”+