-
Ezikiel 6:13Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
-
-
13 Unu ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova,+ mgbe ndị ha e gburu egbu ga-atọgbọrọ n’etiti arụsị ha ndị na-asọ oyi ka nsị,+ gburugburu ebe ịchụàjà ha,+ n’elu ugwu ọ bụla dị elu,+ n’elu ugwu ukwu niile+ nakwa n’okpuru osisi ọ bụla jupụtara n’akwụkwọ ndụ+ nakwa n’okpuru nnukwu osisi ọ bụla nwere alaka,+ ebe ha nọ sureere arụsị ha niile ndị na-asọ oyi ka nsị ihe na-esi ísì ụtọ.+
-
-
Ezikiel 20:28Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
-
-
28 M wee kpọbata ha n’ala+ nke m weliri aka m ṅụọ iyi na m ga-enye ha.+ Mgbe ha hụrụ ugwu ọ bụla dị elu+ na osisi ọ bụla wara alaka, ha na-amalite ịchụ àjà ha n’ebe ahụ+ ma na-enye onyinye ha nke na-akpasu iwe n’ebe ahụ, na-esurekwa ihe na-esi ísì ụtọ n’ebe ahụ+ ma na-awụsa àjà ihe ọṅụṅụ n’ebe ahụ.+
-