Ilu
6 Nwa m, ọ bụrụ na ị nawo mmadụ ibe gị n’ibé,+ ọ bụrụ na gị na ọbụna onye ị na-amaghị ekwewo n’aka iji nwee nkwekọrịta,+ 2 ọ bụrụ na okwu ọnụ gị mere ka ị ma n’ọnyà,+ ọ bụrụ na okwu ọnụ gị mere ka e jide gị, 3 mee ihe a, nwa m, ma napụta onwe gị, n’ihi na ị dabawo n’ọbụ aka mmadụ ibe gị:+ Gaa daa n’ala, rịọsiekwa mmadụ ibe gị arịrịọ ike.+ 4 Ekwela ka ụra gaa gị n’anya ma ọlị, ekwekwala ka anya gị nke na-enwu gbaa roo ụra.+ 5 Napụta onwe gị dị ka nne mgbada n’aka dinta nakwa dị ka nnụnụ n’aka onye na-achụ nta nnụnụ.+
6 Gakwuru ndanda,+ gị onye umengwụ;+ hụ ụzọ ya wee mara ihe. 7 Ọ bụ ezie na o nweghị ọchịagha, onyeisi ma ọ bụ onye na-achị achị, 8 ọ na-akwadebe ihe oriri ya n’ọkọchị;+ ọ chịkọtawo ihe oriri ya n’oge owuwe ihe ubi. 9 Gị onye umengwụ, ị̀ ga-edinara ala ruo ole mgbe?+ Olee mgbe ị ga-esi n’ụra gị bilie?+ 10 Ihitụkwu ụra, irotụkwu ụra, ịkụkụkọtakwu aka nke nta wee dinara ala,+ 11 ịda ogbenye gị ga-abịa dị ka onye na-apụnara mmadụ ihe,+ ụkọ gị ga-abịakwa dị ka onye bu ihe agha.+
12 Onye na-abaghị n’ihe,+ nke bụkwa onye na-eme ihe ọjọọ, na-ejegharị na-ekwu okwu gbagọrọ agbagọ,+ 13 ọ na-atabiri mmadụ anya,+ jiri ụkwụ ya na-enye ihe àmà, jiri mkpịsị aka ya na-ekwu okwu.+ 14 Ihe rụrụ arụ dị n’obi ya.+ Ọ na-akpa nkata ihe ọjọọ mgbe niile.+ Ihe ọ na-ezipụ bụ naanị esemokwu.+ 15 Ọ bụ ya mere ọdachi ya ga-eji bịa na mberede;+ a ga-agbaji ya n’otu ntabi anya, ngwọta agaghịkwa adị.+
16 E nwere ihe isii Jehova kpọrọ asị;+ ee, ihe asaa bụụrụ mkpụrụ obi ya ihe arụ:+ 17 anya dị elu,+ ire na-agha ụgha,+ na aka na-awụfu ọbara nke na-emeghị ihe ọjọọ,+ 18 obi nke na-echepụta ihe ọjọọ,+ ụkwụ nke na-eme ngwa ịgbaga n’ihe ọjọọ,+ 19 onye akaebe ụgha nke na-ekupụ okwu ụgha dị ka ume,+ na onye ọ bụla nke na-ezisa esemokwu n’etiti ụmụnne.+
20 Nwa m, debe ihe nna gị nyere n’iwu,+ ahapụkwala iwu nne gị.+ 21 Kegide ha n’obi gị mgbe niile;+ nyara ha n’olu gị.+ 22 Mgbe ị na-ejegharị, ọ ga na-edu gị;+ mgbe i dinara ala, ọ ga na-eche gị nche;+ mgbe i tetakwara, ọ ga na-eche banyere gị. 23 N’ihi na ihe e nyere n’iwu bụ oriọna,+ iwu ahụ bụkwa ìhè,+ ịba mba nke ịdọ aka ná ntị bụkwa ụzọ ndụ,+ 24 iji chebe gị ka ị ghara ịdaba n’aka nwaanyị ọjọọ,+ ka ire ụtọ nke nwaanyị na-akwa iko* ghara inweta gị.+ 25 Achọsila ịma mma ya ike n’obi gị,+ ekwekwala ka o jiri anya ya nke na-arata mmadụ nweta gị,+ 26 n’ihi na nwaanyị akwụna na-eme ka mmadụ daa ogbenye wee nwee naanị otu ogbe achịcha;+ ma nwunye nwoke ọzọ na-achụ nta mkpụrụ obi nke dị oké ọnụ ahịa.+ 27 Mmadụ ọ̀ pụrụ ịgụnye ọkụ n’obi ya, uwe ya aghara ire ọkụ?+ 28 Ka mmadụ ọ̀ pụrụ ije ije n’elu icheku ọkụ, ọkụ aghara ịhụ ya n’ụkwụ? 29 Otú ahụ ka ọ dị onye ọ bụla ya na nwunye mmadụ ibe ya na-enwe mmekọahụ,+ ọ dịghị onye na-emetụ nwaanyị ahụ aka nke na-agaghị anata ntaramahụhụ.+ 30 Ndị mmadụ adịghị eleda onye ohi anya ma ọ bụrụ na o zuru ohi iji mee ka afọ ju mkpụrụ obi ya mgbe agụụ na-agụ ya. 31 Ma mgbe e jidere ya, ọ ga-akwụ ụgwọ ya okpukpu asaa; ihe niile dị n’ụlọ ya ka ọ ga-enye.+ 32 Onye ọ bụla ya na nwaanyị na-akwa iko enweghị uche;+ onye na-eme ya na-ala mkpụrụ obi ya n’iyi.+ 33 Ihe otiti na ihe ihere ka ọ ga-enweta,+ a gaghịkwa ehichapụ nkọcha ya.+ 34 N’ihi na ọnụma nwoke bụ ekworo,+ ọ gaghịkwa enwe ọmịiko n’ụbọchị ịbọ ọbọ.+ 35 Ọ gaghị eletụdị ụdị ihe mgbapụta ọ bụla anya, ọ gaghịkwa amasị ya, n’agbanyeghị otú i mere ka onyinye ahụ buruo n’ibu.