Ọpụpụ
25 Jehova wee gwa Mosis, sị: 2 “Gwa ndị Izrel ka ha wetara m onyinye. Ọ bụ onye ọ bụla ji obi ya wetara m onyinye ka unu ga-anata onyinye m.+ 3 Ihe a bụ onyinye unu ga-anata ha: ọlaedo,+ ọlaọcha,+ ọla kọpa,+ 4 eri na-acha anụnụ anụnụ, ajị anụ na-acha pọpụl,* eri na-acha uhie uhie, ezigbo eri linin, ajị ewu, 5 akpụkpọ ebule e sijiri ọbara ọbara, akpụkpọ anụ sil, osisi akeshịa,+ 6 mmanụ a ga na-agbanye n’ọkụ,*+ mmanụ balsam a ga-eji na-ete mmadụ mmanụ+ ma jirikwa na-eme insens na-esi ísì ọma,+ 7 na nkume ọnịks na nkume ndị ọzọ a ga-akwụnye n’efọd+ nakwa ndị a ga-akwụnye n’akpa a na-anya n’obi.+ 8 Ha ga-arụrụ m ebe a ga-anọ na-efe m, m ga-ebinyekwara ha.+ 9 Ị ga-arụ ụlọikwuu ahụ na ihe niile ga-adị n’ime ya ka ha dị nnọọ ka ihe atụ m na-egosi gị.+
10 “Ha ga-eji osisi akeshịa rụọ igbe nke ga-adị kubit* abụọ na ọkara n’ogologo, otu kubit na ọkara n’obosara, nakwa otu kubit na ọkara n’ịdị elu.+ 11 Ị ga-ejizi ọlaedo a na-agwaghị agwa machie ya.+ Ị ga-amachi ya ime na azụ, ị ga-ejikwa ọlaedo kpụọ ihe ịchọ mma gburugburu ọnụ ya.+ 12 Ị ga-eji ọlaedo kpụọ ihe anọ dị okirikiri ga-adị na ya ma kwụnye ha n’elu ebe ụkwụ ya anọ ga-adị. Abụọ ga-adị n’otu akụkụ ya, abụọ adịrị n’akụkụ ya nke ọzọ. 13 Ị ga-eji osisi akeshịa rụọ okporo osisi abụọ ma jiri ọlaedo machie ha.+ 14 Ị ga-etinye okporo osisi ndị ahụ n’ihe ndị ahụ dị okirikiri a kwụnyere n’akụkụ Igbe ahụ, ka e jiri ha na-ebu Igbe ahụ. 15 Okporo osisi ndị ahụ ga na-adị n’ihe ndị ahụ dị okirikiri a kwụnyere n’Igbe ahụ. A gaghị na-ewepụ ha ewepụ na ha.+ 16 Ị ga-etinye Ihe Àmà m ga-enye gị n’ime Igbe ahụ.+
17 “Ị ga-eji ọlaedo a na-agwaghị agwa rụọ okwuchi ya, nke ga-adị kubit abụọ na ọkara n’ogologo nakwa otu kubit na ọkara n’obosara.+ 18 Ị ga-eji ọlaedo rụọ cherob abụọ. Ị ga-eji hama kụọ ha. Ha ga-adị na nsọtụ abụọ nke okwuchi igbe ahụ.+ 19 Rụọ cherob ndị ahụ ka otu dịrị n’otu nsọtụ, otu adịrị na nsọtụ nke ọzọ n’elu okwuchi igbe ahụ. 20 Cherob ndị ahụ ga-achịli nku ha abụọ elu, sachie okwuchi igbe ahụ,+ ha ga-echekwa ibe ha ihu. Ihu cherob ndị ahụ ga-ekpudo n’okwuchi igbe ahụ. 21 Ị ga-eji okwuchi Igbe ahụ+ kwuchie ya, ị ga-etinyekwa Ihe Àmà m ga-enye gị n’ime Igbe ahụ. 22 M ga-apụta n’ihu gị n’ebe ahụ wee si n’elu okwuchi igbe ahụ+ gwa gị okwu. M ga-esi n’agbata cherob abụọ ahụ dị n’elu igbe ọgbụgba ndụ* ahụ mee ka ị mara ihe niile m ga-enye gị n’iwu ka ị gwa ndị Izrel.
23 “Ị ga-eji osisi akeshịa rụọ otu tebụl+ nke ga-adị kubit abụọ n’ogologo, otu kubit n’obosara nakwa otu kubit na ọkara n’ịdị elu.+ 24 Ị ga-eji ọlaedo a na-agwaghị agwa machie ya ma jiri ọlaedo kpụọ ihe ịchọ mma gburugburu ọnụ ya. 25 Ị ga-arụnye ihe obosara ya hà ka uhiè ọbụ aka mmadụ* gburugburu ọnụ tebụl ahụ, jirikwa ọlaedo kpụọ ihe ịchọ mma gburugburu ihe a ị ga-arụnye n’ọnụ ya. 26 Ị ga-eji ọlaedo kpụọ ihe anọ dị okirikiri ma kwụnye ha n’akụkụ anọ nke tebụl ahụ, n’ebe a ga-arụnye ụkwụ ya anọ. 27 Ihe ndị ahụ dị okirikiri ga-adị nso n’ihe ahụ a ga-arụnye n’ọnụ tebụl ahụ ka ọ bụrụ ebe a ga-etinye okporo osisi ndị a ga-eji na-ebu tebụl ahụ. 28 Ị ga-eji osisi akeshịa rụọ okporo osisi ndị ahụ ma jiri ọlaedo machie ha. A ga-eji okporo osisi ndị ahụ na-ebu tebụl ahụ.
29 “Ị ga-akpụ efere ya, iko ya, nakwa ihe mmiri ya na ọkwá ya bụ́ ndị ha ga-eji na-awụsa àjà mmanya. Ị ga-eji ọlaedo a na-agwaghị agwa+ kpụọ ha. 30 Ị ga na-edosa achịcha a na-enye m n’elu tebụl ahụ mgbe niile.+
31 “Ị ga-eji ọlaedo a na-agwaghị agwa rụọ ihe e ji adọsa ọkụ.*+ Ị ga-eji hama kụọ ihe a e ji adọsa ọkụ. Ọ ga-enwe ụkwụ n’ala ala ya, nwee okporo, alaka, iko, isi, na ifuru. Ha niile ga-abụ otu ihe e ji hama kụọ.+ 32 Ihe ahụ e ji adọsa ọkụ* ga-enwe alaka isii n’akụkụ ya abụọ, alaka atọ ga-adị n’otu akụkụ ya, alaka atọ adịrị n’akụkụ ya nke ọzọ. 33 Iko atọ ndị yiri okooko almọnd ga-adị n’alaka nke ọ bụla dị n’otu akụkụ, otu isi na otu ifuru adịrị n’agbata otu iko na iko ibe ya. Iko atọ ndị yiri okooko almọnd ga-adịkwa n’alaka nke ọ bụla dị n’akụkụ ya nke ọzọ, otu isi na otu ifuru adịrịkwa n’agbata otu iko na iko ibe ya. Ọ bụ otú a ka a ga-esi rụọ alaka isii ahụ ka ha si n’okporo ihe ahụ e ji adọsa ọkụ* pụta. 34 A ga-enwe iko anọ yiri okooko almọnd n’okporo ihe ahụ e ji adọsa ọkụ,* otu isi na otu ifuru ga-adịkwa n’agbata otu iko na iko ibe ya. 35 Otu isi ga-adị n’okpuru alaka abụọ mbụ ga-esi n’okporo ahụ apụta, otu isi ga-adịkwa n’okpuru alaka abụọ ọzọ na-eso ha, otu isi adịrịkwa n’okpuru alaka abụọ ọzọ na-eso ha, ya bụ, alaka isii ndị ga-esi n’okporo ihe ahụ e ji adọsa ọkụ* apụta. 36 Ọ bụ otu ọlaedo a na-agwaghị agwa ka a ga-eji rụọ isi ya niile na alaka ya niile na ihe niile ga-adị n’ihe ahụ e ji adọsa ọkụ.* Ha niile ga-abụ otu ihe e ji hama kụọ.+ 37 Ị ga-arụrụ ya ọkụ* asaa. A mụnye ha ọkụ, ha ga na-enye ìhè n’ihu ebe a dọsara ya.+ 38 A ga-eji ọlaedo a na-agwaghị agwa rụọ mkpà ndị e ji ejide owu na ihe ndị a ga-eji na-agụnye owu a mụrụ amụ.+ 39 A ga-eji otu talent* ọlaedo a na-agwaghị agwa rụọ ihe ahụ e ji adọsa ọkụ* na arịa ndị a niile. 40 Hụ na ị rụrụ ha ka ha dị ka ihe ndị e gosiri gị n’ugwu.+