Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Abụ Ọma 45:okwu mmeghe-17
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • Ntụziaka e nyere onye nduzi nke Okooko Lili. Abụ ọma nke ụmụ Kora. Maskil.

      Abụ banyere ndị inyom a hụrụ n’anya.

      45 Okwu ọma akpaliwo obi m.+

      Ana m asị: “M na-abụ abụ banyere eze.”+

      Ka ire m bụrụ mkpịsị+ nke ọkà n’idepụta ihe.+

       2 Ị mara mma karịa ụmụ mmadụ.+

      A wụsawo ịma mma n’egbugbere ọnụ gị.+

      Ọ bụ ya mere Chineke ji gọzie gị ruo mgbe ebighị ebi.+

       3 Kee mma agha gị+ n’úkwù, gị onye dị ike,+

      Keekwa ebube gị na ịma mma gị n’úkwù.+

       4 N’ịma mma gị, nwee ihe ịga nke ọma;+

      Gbaa ịnyịnya n’ihi eziokwu na ịdị umeala n’obi na ezi omume,+

      Aka nri gị ga-ezikwa gị ihe dị iche iche dị egwu.+

       5 Akụ́ gị dị nkọ ga-abanye n’obi ndị iro eze+—

      Ndị dị iche iche ga na-ada n’okpuru gị.+

       6 Chineke bụ ocheeze gị ruo mgbe ebighị ebi, ọbụna ruo mgbe niile ebighị ebi;+

      Mkpanaka nke ọbụbụeze gị bụ mkpanaka nke izi ezi.+

       7 Ị hụrụ ezi omume n’anya,+ ị kpọkwara ajọ omume asị.+

      Ọ bụ ya mere Chineke bụ́ Chineke gị+ ji were mmanụ aṅụrị+ tee+ gị karịa ndị ibe gị.+

       8 Uwe gị niile na-esi ísì ụtọ dị ka mea na alo na kashịa;+

      Ụda ụbọ akwara nke na-adapụta ná nnukwu obí eze e ji ọdụ́ rụọ+ emewo ka ị ṅụrịa ọṅụ.

       9 Ndị inyom+ ndị eze mụrụ so ná ndị inyom ị hụrụ n’anya.

      Nwunye eze+ eyiriwo ọlaedo nke si Ofa+ guzoro n’aka nri gị.

      10 Ada, gee ntị, lee anya, tọọ ntị n’ala;

      Chefuokwa ndị gị nakwa ụlọ nna gị.+

      11 Ịma mma gị ga-agụkwa eze agụụ,+

      N’ihi na ọ bụ onyenwe gị,+

      Ya mere, gbuoro ya ikpere n’ala.+

      12 Ada bụ́ Taya jikwa onyinye bịa+—

      Ndị bụ́ ọgaranya n’etiti ndị mmadụ ga-eme ka obi gị jụrụ.+

      13 Ada eze nke nọ n’ime ụlọ bụ sọ mma;+

      E ji ọlaedo chọọ uwe ya mma.

      14 Ọ ga-eyi uwe a kpara akpa mgbe a ga-akpọrọ ya bịakwute eze.+

      A na-akpọbatara gị ụmụ agbọghọ ibe ya na-amaghị nwoke bụ́ ndị so ya.+

      15 A ga-eji obi ụtọ na ọṅụ kpọbata ha;

      Ha ga-abata n’obí eze.

      16 Ụmụ gị ndị ikom+ ga-anọchi nna nna gị hà,+

      Ị ga-ahọpụta ha ịbụ ndị isi n’ụwa dum.+

      17 M ga na-akpọ aha gị n’ọgbọ niile na-abịa.+

      Ọ bụ ya mere ndị dị iche iche ga-eji too gị ruo mgbe ebighị ebi, ọbụna ruo mgbe niile ebighị ebi.

  • Matiu 22:2
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 2 “Alaeze eluigwe dị ka otu nwoke, bụ́ eze, nke meere nwa ya nwoke oriri alụmdi na nwunye.+

  • 2 Ndị Kọrịnt 11:2
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 2 N’ihi na ana m ekworo unu ekworo yiri ekworo Chineke,+ n’ihi na mụ onwe m kwere unu nkwa na otu di+ ga-alụ unu+ ka m wee chee unu n’ihu Kraịst+ dị ka nwa agbọghọ na-amaghị nwoke nke a na-emerụghị emerụ.+

  • Mkpughe 19:7
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 7 Ka anyị ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ nke ukwuu, ka anyị nyekwa ya otuto,+ n’ihi na ọlụlụ nwunye+ nke Nwa Atụrụ ahụ eruwo,+ nwunye ya ejikerewokwa.+

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya