Akwụkwọ Ozi E Degaara Ndị Hibru
7 N’ihi na Melkizedek a, eze Selem, onye bụ́kwa onye nchụàjà Chineke Onye Kacha Elu, zutere Ebreham mgbe Ebreham gbuchara ndị eze lọtawa, o wee gọzie Ebreham.+ 2 Ebreham nyere ya otu ụzọ n’ụzọ iri n’ihe niile ọ kwatara n’agha. Aha nwoke a pụtara “Eze Ezi Omume.” Ọ bụkwa eze Selem, ya bụ, “Eze Udo.” 3 A maghị onye bụ́ nna ya na onye bụ́ nne ya nakwa agbụrụ o si. A maghịkwa mgbe a mụrụ ya na mgbe ọ nwụrụ. Ma, ebe e mere ka ọ dị ka Ọkpara Chineke, ọ bụ onye nchụàjà mgbe niile.+
4 Nwoke a, onye Ebreham onyeisi ezinụlọ anyị* nyere otu ụzọ n’ụzọ iri n’ihe ndị kacha mma ọ kwatara n’agha, bụ nnukwu mmadụ.+ 5 N’eziokwu, Iwu* kwuru na ụmụ Livaị+ ndị ga-abụ ndị nchụàjà ga na-anata ndị ọzọ,+ ya bụ, ụmụnne ha, otu ụzọ n’ụzọ iri, n’agbanyeghị na ụmụnne ha bụ ụmụ Ebreham.* 6 Ma nwoke a, onye na-esighị n’ezinụlọ Livaị, natara Ebreham otu ụzọ n’ụzọ iri ma gọzie Ebreham, onye Chineke kwere nkwa.+ 7 O doro anya na ọ bụ onye ukwu na-agọzi onye nta. 8 Ụmụ Livaị ndị na-anata otu ụzọ n’ụzọ iri na-anwụ anwụ, ma a gbara àmà na nwoke a na-adị ndụ.+ 9 E nwedịrị ike ikwu na Livaị, onye na-anata otu ụzọ n’ụzọ iri, si n’aka Ebreham kwụọ otu ụzọ n’ụzọ iri, 10 n’ihi na nna nna ya Ebreham amụbeghị ya* mgbe Melkizedek zutere Ebreham.+
11 Ọ bụrụ na ọrụ nchụàjà ndị Livaị na-arụ ga-emeli ka mmadụ zuo okè+ (n’ihi na ọrụ a so n’Iwu ahụ* e nyere ha), ọ̀ ka ga-adị mkpa ka e nwee onye nchụàjà ọzọ, onye e kwuru na ọ dị ka Melkizedek,+ ọ bụghị ka Erọn? 12 Ebe ọ bụ na a na-agbanwe ndị nchụàjà, e kwesịkwara ịgbanwe Iwu ahụ.*+ 13 N’ihi na nwoke a na-ekwu ihe ndị a gbasara ya si n’ebo ọzọ, nke a na-enwebeghị onye si na ya rụrụla ọrụ n’ebe ịchụàjà.+ 14 O doro anya na Onyenwe anyị si n’ebo Juda,+ ma e nweghị mgbe Mosis kwuru na ndị nchụàjà ga-esi n’ebo ahụ.
15 Ihe a edokwuola anyị anya ugbu a ebe ọ bụ na e nweela onye nchụàjà ọzọ,+ onye dị ka Melkizedek,+ 16 onye ghọrọ onye nchụàjà, ọ bụghị n’ihi ebo o si otú iwu kwuru, kama n’ihi na o nwere ike nke na-enye ya ndụ a na-enweghị ike ibibi ebibi.+ 17 N’ihi na a gbara àmà banyere ya, sị: “Ị bụ onye nchụàjà dị ka Melkizedek, ị ga-abụkwa onye nchụàjà ruo mgbe ebighị ebi.”+
18 N’ihi ya, a kagburu iwu mbụ ahụ maka na ọ rụzuchaghị ihe a chọrọ ka ọ rụọ, ọ bakwaghị oké uru.+ 19 N’ihi na Iwu ahụ* emeghị ka ihe ọ bụla zuo okè,+ ma olileanya ka mma+ anyị nwere ugbu a mere ka ihe zuo okè. Anyị sikwa na ya na-abịaru Chineke nso.+ 20 Ebe ọ bụ na Chineke ṅụrụ iyi mgbe ọ họpụtara Jizọs ka ọ bụrụ onye nchụàjà 21 (n’ihi na e nwere ndị nchụàjà Chineke na-aṅụghị iyi tupu e mee ha ndị nchụàjà, ma tupu onye a abụrụ onye nchụàjà, Chineke ṅụrụ iyi banyere ya, sị: “Jehova* aṅụọla iyi, ọ gaghịkwa agbanwe obi ya,* ‘Ị bụ onye nchụàjà ruo mgbe ebighị ebi’”),+ 22 Jizọs bụzi onye a ga-esi n’aka ya mee ka ọgbụgba ndụ ka mma nwee isi.+ 23 Ọtụtụ ndị ghọkwara ndị nchụàjà, onye pụọ ibe ya anọchie,+ maka na ọnwụ ekweghị ka ha nọgide na-arụ ọrụ ha. 24 Ma, ebe ọ bụ na ọ na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi,+ e nweghị onye ga-anọchi ya n’ọrụ nchụàjà ọ na-arụ. 25 N’ihi ya, ọ ga-azọpụtali ndị si n’aka ya na-abịakwute Chineke, ebe ọ bụ na ọ na-adị ndụ mgbe niile ịrịọrọ ha arịrịọ.+
26 N’ihi na ọ bụ ụdị nnukwu onye nchụàjà a ka anyị kwesịrị inwe, onye jisiri Chineke aka ike, onye aka ya dị ọcha, onye a na-emerụghị emerụ,+ onye dị iche ná ndị mmehie, onye e mekwara ka ọ dị elu karịa eluigwe.+ 27 Ọ dịghị ka nnukwu ndị nchụàjà ahụ, ndị na-achụ àjà kwa ụbọchị,+ ha buru ụzọ chụọ maka mmehie nke ha, ha achụzie maka mmehie ndị ọzọ.+ Ọ chụrụ àjà a naanị otu ugboro mgbe o nyefere onwe ya.+ 28 N’ihi na ndị Iwu ahụ* na-ahọpụta ka ha bụrụ nnukwu ndị nchụàjà bụ ndị na-eme mmehie,+ ma iyi a ṅụrụ+ mgbe e nwechara Iwu ahụ* họpụtara otu Ọkpara, onye e mere ka o zuo okè+ ruo mgbe ebighị ebi.