PITA NKE ABỤỌ
1 Abụ m Saịmọn Pita, ohu Jizọs Kraịst na onyeozi ya. M na-edetara unu akwụkwọ, unu ndị a kụziiri ọmarịcha eziokwu a kụzikwaara anyịnwa* maka na Chineke na Jizọs Kraịst, Onye Nzọpụta anyị, bụ ndị ezi omume.
2 Ka Chineke meere unu amara, meekwa ka udo dịrị unu n’ihi na unu amatala ya na Onyenwe anyị Jizọs nke ọma.+ 3 N’ihi otú a anyị si mata ha nke ọma, Chineke enyela anyị ike ya, nyekwa anyị ihe niile anyị kwesịrị inwe iji na-efe ya. Ọ kpọrọ anyị+ maka na ọ dị ebube, nweekwa obiọma. 4 Ọ bụkwa ya mere o ji mee ka anyị mara ọmarịcha nkwa ndị na-enweghị atụ o kwere,+ ka anyị wee dịrị ike otú ọ dị+ n’ihi nkwa ndị ahụ o kwere anyị maka na anyị anaghị eme omume ọjọọ ndị ụwa na-eme, nke agụụ ihe ọjọọ na-akpata.
5 N’ihi ya, na-agbasinụ mbọ ike+ ka unu nwee okwukwe, na-akpakwa àgwà ọma.+ Na-agbasikwanụ mbọ ike ka unu mara ihe,+ 6 na-ejide onwe unu,+ na-atachi obi, na-efekwa Chineke otú ọ chọrọ.+ 7 Na-agbasikwanụ mbọ ike ka unu hụ ụmụnna niile n’anya ka ụmụnne. Hụkwanụ mmadụ niile n’anya.+ 8 Ọ bụrụ na unu ana-eme ihe ndị a, na-emekwa ha mgbe niile, unu ga-eji ihe unu ma nke ọma gbasara Onyenwe anyị Jizọs Kraịst na-arụ ihe dị mma, unu agaghịkwa anọ nkịtị.+
9 Ma, onye ọ bụla na-anaghị eme ihe ndị a kpuru ìsì. O mechiri anya ya ka ọ ghara ịhụ ìhè,*+ chefuokwa na Chineke asachapụla mmehie ndị o mere+ n’oge gara aga. 10 N’ihi ya, ụmụnna m, gbalịsienụ ike ka unu ghara ịkwụsị ịna-efe Chineke, ebe ọ kpọrọ unu,+ họrọkwa unu. Ọ bụrụ na unu ana-eme ihe ndị a, unu agaghị akwụsị ife Chineke.+ 11 N’eziokwu, ọ bụrụ na unu ana-eme ihe ndị a, a ga-agọzi unu otú na-enweghị atụ, ya bụ, unu ga-abanye n’Alaeze ga-adịru ebighị ebi+ nke Onyenwe anyị na Onye Nzọpụta anyị bụ́ Jizọs Kraịst.+
12 N’ihi ya, m chọrọ ịna-echetara unu ihe ndị a mgbe niile n’agbanyeghị na unu ma ha, bụrụkwa a kwaa a kwụrụ n’eziokwu a na-akụziri anyị. 13 Ma, ebe ọ bụ na m ka dị ndụ n’anụ ahụ́,*+ echere m na ọ dị mma ichetara unu ihe ndị a.+ 14 O doro m anya na anụ ahụ́* m agaghịzi adịte aka, otú Onyenwe anyị Jizọs Kraịst gwara m.+ 15 M ga na-eme ike m mgbe niile otú ọ ga-abụ mgbe m na-anọghịzi, unu ga-enwe ike ịna-echeta ihe ndị a n’onwe unu.
16 Ihe anyị gwara unu gbasara ike Onyenwe anyị Jizọs Kraịst na ọnụnọ ya abụghị akụkọ ụgha ndị mmadụ chepụtara iji duhie ibe ha, kama ọ bụ ihe anyị ji anya anyị hụ gbasara ebube ya.+ 17 N’ihi na Chineke bụ́ Nna mere ka ọ dị ebube, meekwa ka a na-asọpụrụ ya. Chineke, onye ebube na-enweghị atụ na-esi n’aka ya, mere ihe a mgbe o kwuru gbasara ya, sị: “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya. Ihe ya masịrị m.”+ 18 N’eziokwu, anyị nụrụ olu si n’eluigwe kwuo ihe a mgbe anyị na ya nọ n’ugwu nsọ.
19 Ọ bụ ya mere obi ji sie anyị ike na amụma ndị Chineke buru ga-emezu. Ọ dị mma na unu na-echebara amụma ndị a echiche. N’ime obi unu, ha ga-adị ka ọkụ*+ na-enwu n’ebe gbara ọchịchịrị, nke na-enwugide ruo mgbe chi bọrọ, kpakpando ụtụtụ+ apụta. 20 N’ihi na unu bu ụzọ mara na o nweghị amụma dị n’Akwụkwọ Nsọ nke bụ́ echiche mmadụ. 21 N’ihi na o nwetụbeghị mgbe e si n’uche mmadụ buo amụma,+ kama mmụọ nsọ nọ na-edu ndị mmadụ, ha ana-ekwu ihe Chineke chọrọ ka ha kwuo.+
2 Ma, e nwekwara ndị amụma ụgha n’Izrel otú ahụ ụfọdụ n’ime unu ga-abụkwa ndị nkụzi ụgha.+ Ha ga-eji nwayọọ malite òtù dị iche iche ga-eme ka unu kwụsị inwe okwukwe. Ha ga-agọnahụkwa onye gbapụtara ha.*+ A ga-ebibikwa ha ngwa ngwa n’ihi ihe a ha ga-eme. 2 Ọtụtụ ndị ga-emewekwa ihe ọjọọ n’asọghị anya*+ otú ha na-eme. Ha ga-emekwa ka ndị mmadụ malite ịkatọ eziokwu a na-akụziri anyị.+ 3 Ha ga na-aghakwara unu ụgha ka ha ghọgbuo unu n’ihi na ha dị anyaukwu. Ma, oge a ga-ata ha ahụhụ Chineke kpebiri ịta ha kemgbe oge ochie+ ji ọsọ na-abịa.+
4 N’eziokwu, Chineke tara ndị mmụọ ozi mehierenụ ahụhụ,+ tụba ha n’ime Tatarọs,*+ keekwa ha agbụ* ka ha nọrọ n’ebe gbara oké ọchịchịrị ruo mgbe ọ ga-eme ha ihe o kpebiri ime ha.+ 5 Ọ takwara ụwa oge ochie ahụhụ.+ Ma o chebere Noa, onye nọ na-ekwusa ihe bụ́ ezi omume,+ chebekwa mmadụ asaa ndị ọzọ,+ mgbe o ji mmiri bibie ụwa ndị na-anaghị asọpụrụ Chineke juru.+ 6 Ọ makwara obodo Sọdọm na Gọmọra ikpe, gbaa ha ọkụ, ha aghọọ ntụ.+ O si otú ahụ mee ka ndị na-anaghị asọpụrụ Chineke mara ihe ga-eme ha n’ọdịnihu.+ 7 Ma, ọ napụtara Lọt, onye ezi omume,+ onye obi nọ na-agbawa maka ihe ọjọọ ndị na-enweghị ihe ha ji iwu kpọrọ na-eme n’asọghị anya.* 8 N’eziokwu, mgbe onye ezi omume a na-ahụ otú ndị o bi n’obodo ha si ebi ndụ jọgburu onwe ya, na-anụkwa ihe ndị ha na-ekwu, obi* na-ajọ ya ezigbo njọ kwa ụbọchị. 9 Ihe ndị a gosiri na Jehova* ma otú o si anapụta ndị ji obi ha niile na-efe ya n’ọnwụnwa.+ Ọ makwa otú ọ ga-esi hapụ ndị ajọ omume ruo mgbe a ga-ebibi ha n’ụbọchị ikpe,+ 10 karịchaa, ndị na-achọ idina ndị ọzọ ka ha mebie ha+ nakwa ndị na-elelị ndị isi.+
Ụjọ anaghị atụ ndị a ikwutọ ndị dị ebube n’ihi na ha dị ezigbote isi ike. 11 Ma, ùgwù ndị mmụọ ozi na-akwanyere Jehova*+ mere ka ha ghara ịna-agwa ha okwu ọjọọ, ọ bụ eziokwu na ndị mmụọ ozi ka ha nwee ume, karakwa ha ike. 12 Ma, ndị a na-ekwu okwu ọjọọ gbasara ihe ha na-amaghị.+ A ga-ebibi ha n’ihi ihe ọjọọ ha na-eme. Ha dị ka anụmanụ na-anaghị eche echiche, ndị a na-amụ, e mechaa e jide ha gbuo. 13 A ga-ata ha ahụhụ maka ihe ọjọọ ha na-eme.
Ibi ndụ okomoko na-atọ ha ụtọ,+ ma n’oge ehihie. Ha dị ka uwe nwere ntụpọ na ọnyá dị mmadụ n’ihu. Obi na-atọ ha ezigbo ụtọ iji ụgha ha na-akụzi eduhie ndị ọzọ mgbe unu na ha nọ n’oriri.+ 14 Ịkwa iko na-agụsi ha agụụ ike.+ Ha enweghị ike isepụ aka ná mmehie. Ha na-aratakwa ndị* na-akwụsighị ike. Ihe juru n’obi ha bụ anyaukwu.* Chineke ga-ama ha ikpe. 15 E duhiela ha n’ihi na ha hapụrụ ezigbo ụzọ. Ha esorola ụzọ Belam+ nwa Biọ, onye mere ihe ọjọọ maka na obi ya dị nnọọ n’ụgwọ a ga-akwụ ya.+ 16 A baara ya mba maka ihe ọjọọ o mere.+ Jakị na-anaghị ekwu okwu kwuru okwu otú mmadụ si ekwu iji gbochie onye amụma ahụ ime ka onye nzuzu.+
17 Ndị a bụ isi iyi nke mmiri na-adịghị na alụlụụ nke oké ifufe mmiri na-ebugharị. E doweere ha ebe gbara oké ọchịchịrị ha ga-anọ.+ 18 Ha na-ekwu okwu na-abaghị uru nke na-atọ ụtọ ná ntị. Ha na-eme ihe ọjọọ n’asọghị anya,* na-emekwa ka ihe ọjọọ na-agụ ndị chegharịrịnụ agụụ ọzọ,+ na-arata ha ka ha mewe ihe ọjọọ ndị ha kwụsịrịla ime.+ 19 Ndị nkụzi ụgha a na-ekwe ha nkwa na ha ga-enwere onwe ha, ma hanwa bụ ndị ohu mmehie.+ N’ihi na onye ọ bụla onye ọzọ meriri bụ ohu onye ahụ.*+ 20 N’eziokwu, ọ bụrụ na ha hapụrụ ime ihe ọjọọ ndị a na-eme n’ụwa+ maka na ha amatala nke ọma banyere Onyenwe anyị na Onye Nzọpụta anyị bụ́ Jizọs Kraịst, ma mechaa mewe ihe ọjọọ ndị ahụ ọzọ, ihe ndị ahụ ana-achị ha, ikpeazụ ha akala mmalite ha njọ.+ 21 Ọ gaara akara ha mma na ha amaghị nke ọma gbasara otú mmadụ si ebi ndụ dị mma, karịa na mgbe ha matachara ya, ha ahapụ iwu dị nsọ e nyere ha.+ 22 Ilu a a tụrụ emezuola n’isi ha: “Nkịta alaghachila n’agbọ ọ gbọrọ, nne ézì a sara ahụ́ agaakwala na-adagharị n’apịtị.”+
3 Ndị m hụrụ n’anya, akwụkwọ ozi a bụ nke abụọ m na-edetara unu. Achọrọ m ichetara unu ka unu gbaa mbọ na-eche echiche nke ọma otú m gwara unu n’akwụkwọ ozi nke mbụ.+ 2 M na-ede ihe a ka unu cheta okwu ndị amụma dị nsọ kwuru n’oge gara aga na ihe Onyenwe anyị na Onye Nzọpụta anyị kụziri, nke ndịozi* kụziiri unu. 3 Ihe unu kwesịrị ibu ụzọ mara bụ na n’oge ikpeazụ, a ga-enwe ndị na-achị ihe dị mma ọchị, ndị na-emekwa ihe ọjọọ na-agụ ha agụụ.+ 4 Ha ga na-asị: “O kwere unu nkwa na ọ ga-abịa, gịnị mere na ọ bịabeghị?+ Leenụ, o nwebeghị ihe gbanwerenụ kemgbe nna nna anyị hà nwụrụ.* Ihe niile ka dị nnọọ otú ha dị kemgbe Chineke kere mmadụ.”+
5 Ha kpachaara anya na-eme ka ọ̀ bụ na ha amaghị na eluigwe dị kemgbe oge ochie nakwa na Chineke kwuru okwu, ala esi na mmiri pụta ma dịrị n’etiti mmiri.+ 6 E jikwa mmiri bibie ụwa nke oge ahụ mgbe mmiri tojuru ebe niile n’ụwa.+ 7 Ọ bụkwa ihe Chineke kwuru ga-eme ka a hapụ eluigwe na ụwa dị ugbu a ruo mgbe a ga-eji ọkụ bibie ha n’ụbọchị a ga-ama ndị na-anaghị asọpụrụ Chineke ikpe ma bibie ha.+
8 Ma, ndị m hụrụ n’anya, unu echezọla na otu ụbọchị n’anya Jehova* dị ka otu puku afọ, otu puku afọ dịkwa ka otu ụbọchị n’anya ya.+ 9 Jehova* anaghị egbu oge imezu nkwa ya,+ dị ka ụfọdụ ndị chere. Kama, ọ na-enwere unu ndidi n’ihi na o nweghị onye ọ chọrọ ka e bibie, kama ọ chọrọ ka mmadụ niile chegharịa.+ 10 Ma, ụbọchị Jehova*+ ga-abịa otú onye ohi si abịa.+ N’ụbọchị ahụ, eluigwe ga-eji oké ụzụ laa n’iyi.+ Ihe ndị dị n’eluigwe na n’ụwa ga-adịkwa oké ọkụ wee gbazee. A ga-agbakwa ụwa na ọrụ ndị a rụrụ n’ime ya ọkụ.*+
11 Ebe a ga-esi otú a gbazee ihe ndị a niile, chebaranụ ụdị mmadụ unu kwesịrị ịbụ echiche. Unu kwesịrị ịna-akpa àgwà dị nsọ, na-efe Chineke, 12 na-echere ụbọchị Jehova,* burukwa ya n’uche.+ N’ụbọchị ahụ ka a ga-agba eluigwe ọkụ,+ ya agbazee, ihe ndị dị n’eluigwe na n’ụwa ga-adịkwa oké ọkụ wee gbazee. 13 Ma e nwere eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ o kwere ná nkwa anyị na-atụ anya ha.+ Ezi omume ga-adịkwa* na ha.+
14 N’ihi ya, ndị m hụrụ n’anya, ebe unu na-echere ihe ndị a, gbalịsienụ ike ka Chineke hụ n’ikpeazụ na unu dị ọcha, na unu anaghị akpa àgwà ọjọọ ọ bụla nakwa na unu na ya dị ná mma.+ 15 Werekwanụ ndidi Onyenwe anyị na-enwere unu ka nzọpụta, otú ahụ Pọl, nwanna anyị anyị hụrụ n’anya, detaara unu n’akwụkwọ ozi n’ihi amamihe e nyere ya.+ 16 N’eziokwu, o deela banyere ihe ndị a n’akwụkwọ ozi ndị o detaara unu. Ma, ụfọdụ ihe o dere siri ike nghọta, ndị na-aghọtaghịkwa ha na ndị na-akwụsighị ike n’okwukwe na-agbagọ ihe ndị ahụ otú ha na-agbagọkwa ihe ndị ọzọ e dere n’Akwụkwọ Nsọ. A ga-ebibi ha maka ihe a ha na-eme.
17 N’ihi ya, ndị m hụrụ n’anya, ebe unu matarala ihe ndị a, kpacharanụ anya ka mmehie ndị na-enweghị ihe ha ji iwu kpọrọ na-eme ghara idufu unu, unu agharazie isi ike n’okwukwe.+ 18 Kama na-amụtakwunụ gbasara Onyenwe anyị na Onye Nzọpụta anyị bụ́ Jizọs Kraịst, na-agbakwanụ mbọ ka ọ na-emekwuru unu amara. Ka a na-eto ya si ugbu a ruo mgbe ebighị ebi. Amen.
Ma ọ bụ “unu ndị nwere okwukwe pụrụ iche anyịnwa nwekwara.”
O nwere ike ịbụ, “ka o kpuo ìsì, ghara ịhụcha ụzọ.”
Na Grik, “m ka nọ n’ụlọikwuu a.”
Na Grik, “ụlọikwuu.”
Ma ọ bụ “oriọna.”
Na Grik, “onye nwe ha,” ya bụ, Jizọs.
Ma ọ bụ “n’emeghị ihere.” Grik, a·sel′gei·a. Gụọ Nkọwa Okwu.
Gụọ Nkọwa Okwu.
O nwere ike ịbụ, “tụbakwa ha n’olulu.”
Ma ọ bụ “n’emeghị ihere.” Grik, a·sel′gei·a. Gụọ Nkọwa Okwu.
Gụọ Nkọwa Okwu, “mkpụrụ obi.”
Gụọ A5.
Gụọ A5.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “Ha zụrụ obi ha ka ọ dị anyaukwu.”
Ma ọ bụ “n’emeghị ihere.” Grik, a·sel′gei·a. Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “onye ọ bụla ihe ọzọ meriri bụ ohu ihe ahụ.”
Na Grik, “ndịozi unu.”
Na Grik, “hiri ụra ọnwụ.”
Gụọ A5.
Gụọ A5.
Gụọ A5.
Ma ọ bụ “n’anwụ.”
Gụọ A5.
Na Grik, “ga-ebikwa.”