Mak
9 Ọ gakwara n’ihu ịsị ha: “N’ezie, ana m asị unu, E nwere ụfọdụ n’ime ndị guzo n’ebe a bụ́ ndị na-agaghị edetụ ọnwụ ire ma ọlị ruo mgbe ha bu ụzọ hụ ka alaeze Chineke ji ike bịa.”+ 2 Ya mere, mgbe ụbọchị isii gasịrị, Jizọs kpọọrọ naanị Pita na Jems na Jọn ma kpọgote ha n’ugwu dị oké elu. O wee nwoghaa n’ihu ha,+ 3 uwe elu ya wee na-egbuke egbuke, na-enwu gbaa karịa ka onye ọ bụla nke na-asụ ákwà n’ụwa pụrụ ime ka ha dị ọcha.+ 4 Ịlaịja na Mozis pụtakwara n’ihu ha, ha na Jizọs wee na-akparịta ụka.+ 5 Pita wee sị Jizọs: “Rabaị, ọ dị mma na anyị nọ n’ebe a, ya mere, ka anyị maa ụlọikwuu atọ, otu maka gị, otu maka Mozis, otu maka Ịlaịja.”+ 6 N’eziokwu, ọ maghị ihe ọ ga-ekwu, n’ihi na egwu ji ha. 7 Ígwé ojii wee gbachie, kpuchie ha, otu olu+ sikwa n’ígwé ojii ahụ kwuo, sị: “Onye a bụ Ọkpara m,+ onye m hụrụ n’anya; geenụ ya ntị.”+ 8 Otú ọ dị, na mberede, ha lere anya gburugburu ma hụ na ọ dịkwaghị onye ha na ya nọ, ma e wezụga naanị Jizọs.+
9 Ka ha si n’ugwu ahụ na-arịdata, o nyere ha iwu n’ụzọ doro anya ka ha ghara ịkọrọ+ onye ọ bụla ihe ha hụrụ, ruo mgbe Nwa nke mmadụ si ná ndị nwụrụ anwụ bilie.+ 10 Ha wee buru okwu ahụ n’obi, ma kwurịta n’etiti onwe ha ihe isi ná ndị nwụrụ anwụ bilie nke a pụtara. 11 Ha wee malite ịjụ ya ajụjụ, sị: “Gịnị mere ndị odeakwụkwọ ji ekwu na Ịlaịja+ ga-ebu ụzọ bịa?”+ 12 Ọ sịrị ha: “Ịlaịja ga-ebu ụzọ bịa, meekwa ka ihe niile dị otú ha dị na mbụ;+ ma gịnị mere e ji dee na Nwa nke mmadụ ga-ata ọtụtụ ahụhụ,+ e mesookwa ya dị ka onye na-abaghị uru?+ 13 Ma ana m agwa unu na, n’eziokwu, Ịlaịja+ abịawo, ha mekwara ya ọtụtụ ihe dị ka ha chọrọ, dị nnọọ ka e dere banyere ya.”+
14 Mgbe ha bịakwutere ndị na-eso ụzọ ya ndị ọzọ, ha hụrụ ka oké ìgwè mmadụ gbara ha gburugburu nakwa ka ndị odeakwụkwọ na-arụ ha ụka.+ 15 Ma ozugbo ìgwè mmadụ ahụ dum hụrụ ya, o juru ha anya, ha wee gbakwuru ya, malite ikele ya. 16 O wee jụọ ha, sị: “Gịnị ka unu na ha na-arụrịta ụka ya?” 17 Otu onye n’ime ìgwè mmadụ ahụ zara ya, sị: “Onye Ozizi, m kpọtaara gị nwa m nwoke n’ihi na o nwere mmụọ na-eme ka mmadụ ghara ikwu okwu;+ 18 ebe ọ bụla o jidere ya, ọ na-akụ ya n’ala, ọ na-agbọpụtakwa ụfụfụ, na-atakwa ikikere ezé, ọ dịkwaghị enwe ume. M wee gwa ndị na-eso ụzọ gị ka ha chụpụ ya, ma ha enweghị ike ịchụpụ ya.”+ 19 Ọ zara ha, sị: “Unu ọgbọ na-enweghị okwukwe,+ ruo ole mgbe ka mụ na unu ga-anọ? Ruo ole mgbe ka m ga na-edi ihe unu na-eme? Kpọtaranụ m ya.”+ 20 Ha wee kpọtara ya nwa ahụ. Ma mgbe ọ hụrụ ya, ozugbo ahụ, mmụọ ahụ mere ka ihe ọdụdọ dọwa nwa ahụ, mgbe ọ dara n’ala, ọ nọ na-atụrụgharị, na-agbọpụta ụfụfụ.+ 21 O wee jụọ nna ya, sị: “Olee mgbe ihe a malitere ime ya?” Ọ zara, sị: “Ọ malitere kemgbe ọ bụ nwata; 22 mgbe mgbe, ọ na-atụba ya ma n’ime ọkụ ma n’ime mmiri ka o wee laa ya n’iyi.+ Ma ọ bụrụ na ị pụrụ ime ihe ọ bụla, nwee ọmịiko n’ebe anyị nọ ma nyere anyị aka.” 23 Jizọs sịrị ya: “Okwu ahụ bụ́, ‘Ọ bụrụ na ị pụrụ’! N’ezie, ihe niile pụrụ ikwe mmadụ omume ma ọ bụrụ na mmadụ enwee okwukwe.”+ 24 Nna nwatakịrị ahụ tiri mkpu ozugbo, sị: “Enwere m okwukwe! Nyere m aka n’ebe okwukwe dị m mkpa!”+
25 Mgbe Jizọs hụrụ na ìgwè mmadụ na-agbakọta n’ebe ha nọ, ọ baara mmụọ ahụ na-adịghị ọcha mba,+ sị ya: “Gị mmụọ na-eme ka mmadụ ghara ikwu okwu ma ghara ịnụ ihe, ana m enye gị iwu, si n’ime ya pụọ, abanyekwala n’ime ya ọzọ.” 26 Mgbe o tisịrị mkpu, ihe ọdụdọ adọọkwa ya ọtụtụ ugboro, ọ pụtara;+ o wee dị ka onye nwụrụ anwụ, nke mere na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ha nọ na-asị: “Ọ nwụọla!” 27 Ma Jizọs seere ya n’aka dọlite ya, o wee bilie.+ 28 Mgbe ọ banyesịrị n’ime ụlọ, ndị na-eso ụzọ ya wee jụọ ya n’ebe naanị ha nọ, sị: “Gịnị mere na anyị achụpụlighị ya?”+ 29 O wee sị ha: “Ọ dịghị ihe ọ bụla pụrụ ime ka ụdị a pụọ ma e wezụga ekpere.”+
30 Ha si n’ebe ahụ pụọ wee si Galili gafere gawa, ma ọ chọghị ka onye ọ bụla mara banyere ya. 31 N’ihi na ọ nọ na-akụziri ndị na-eso ụzọ ya ihe ma na-asị ha: “A ga-enyefe Nwa nke mmadụ n’aka ndị mmadụ, ha ga-egbukwa ya,+ ma, n’agbanyeghị na a ga-egbu ya, ọ ga-ebili mgbe ụbọchị atọ gasịrị.”+ 32 Otú ọ dị, ha aghọtaghị okwu ahụ, egwu na-atụkwa ha ịjụ ya ajụjụ.+
33 Ha wee bata n’ime Kapaniọm. Mgbe ọ nọkwa n’ime ụlọ, ọ jụrụ ha, sị: “Gịnị ka unu na-arụ ụka ya n’okporo ụzọ?”+ 34 Ha gbachiri nkịtị, n’ihi na n’okporo ụzọ, ha rụrụ ụka n’etiti onwe ha banyere onye ka ukwuu.+ 35 O wee nọdụ ala ma kpọọ mmadụ iri na abụọ ahụ, sị ha: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ ịbụ onye mbụ, ọ ga-abụ onye ikpeazụ n’ebe mmadụ niile nọ na onye na-ejere mmadụ niile ozi.”+ 36 O wee kpọrọ otu nwatakịrị, mee ka o guzoro n’etiti ha, tụkwasịkwa ya aka n’ubu wee sị ha:+ 37 “Onye ọ bụla nke na-anabata otu n’ime ụmụntakịrị dị otú a n’aha m na-anabata m; onye ọ bụla nke na-anabatakwa m na-anabata, ọ bụghị naanị m, kamakwa onye ahụ nke zitere m.”+
38 Jọn sịrị ya: “Onye Ozizi, anyị hụrụ otu nwoke nke ji aha gị na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ, anyị gbalịkwara igbochi ya,+ n’ihi na ọ dịghị eso anyị.”+ 39 Ma Jizọs sịrị: “Unu anwala igbochi ya, n’ihi na ọ dịghị onye ọ bụla nke ga-arụ ọrụ dị ike n’aha m nke ga-enwe ike ikwujọ m ọsọ ọsọ;+ 40 n’ihi na onye na-adịghị emegide anyị dịnyeere anyị.+ 41 N’ihi na onye ọ bụla nke kunyere unu otu iko+ mmiri ka unu ṅụọ n’ihi na unu bụ ndị na-eso ụzọ Kraịst,+ n’ezie, ana m asị unu, ọ ga-anata ụgwọ ọrụ ya. 42 Ma onye ọ bụla nke mere ka otu n’ime ndị a dị nta kwere ekwe sụọ ngọngọ, ọ ga-akara ya mma ma ọ bụrụ na e konye nkume igwe nri, dị ka nke ịnyịnya ibu na-akwagharị, n’olu ya wee tụba ya nnọọ n’ime oké osimiri.+
43 “Ọ bụrụkwa na aka gị emee ka ị sụọ ngọngọ, gbupụ ya; ọ kaara gị mma ibu nkwarụ nweta ndụ kama inwe aka abụọ banye na Gehena,* n’ọkụ nke a na-apụghị imenyụ emenyụ.+ 44* —— 45 Ọ bụrụkwa na ụkwụ gị emee ka ị sụọ ngọngọ, gbupụ ya; ọ kaara gị mma inwe otu ụkwụ+ wee nweta ndụ kama inwe ụkwụ abụọ e wee tụba gị n’ime Gehena.+ 46 —— 47 Ọ bụrụkwa na anya gị emee ka ị sụọ ngọngọ, tụfuo ya,+ ọ kaara gị mma ibu otu anya banye n’alaeze Chineke kama inwe anya abụọ e wee tụba gị n’ime Gehena,+ 48 bụ́ ebe ikpuru ha na-adịghị anwụ anwụ, a dịghị emenyụkwa ọkụ ya emenyụ.+
49 “N’ihi na a ga-agha onye ọ bụla nnu+ nke bụ́ ọkụ. 50 Nnu dị mma; ma ọ bụrụ na o nwee ka nnu si ghara ịdịkwa ụtọ, gịnị ka unu ga-eji mee ka ọ dị ụtọ?+ Nweenụ nnu+ n’ime onwe unu, unu na ibe unu dị n’udo.”+