Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • nwt Ndị Filipaị 1:1-4:23
  • Ndị Filipaị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị Filipaị
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Ndị Filipaị

AKWỤKWỌ OZI E DEGAARA NDỊ FILIPAỊ

1 Pọl na Timoti, ndị ohu Kraịst Jizọs, na-edetara unu ndị nsọ niile ha na Kraịst Jizọs dị n’otu, bụ́ ndị nọ na Filipaị,+ akwụkwọ ozi, nakwa ndị nlekọta na ndị ohu na-eje ozi:+

2 Ka Chineke Nna anyị na Onyenwe anyị Jizọs Kraịst meere unu amara, meekwa ka udo dịrị unu.

3 Ana m ekele Chineke m mgbe niile ma m cheta unu 4 n’arịrịọ niile m na-arịọsi ya ike. M na-eji ọṅụ arịọ ya arịrịọ ọ bụla m na-arịọsi ya ike maka unu niile+ 5 n’ihi ihe ndị unu merela ka ozi ọma wee na-aga n’ihu malite n’ụbọchị mbụ ruo ugbu a. 6 N’ihi na obi siri m ike na onye malitere ọrụ ọma n’ime unu ga-arụzu ya+ ruo n’ụbọchị Kraịst Jizọs.+ 7 Ebe ọ bụ na unu dị m n’obi, ọ dị mma na m na-echere unu niile ụdị ihe a. Unu so m enweta amara Chineke meere m n’ihi na unu nyeere m aka na mkpọrọ a tụrụ m,+ nyekwara m aka n’ịgbachitere ozi ọma nakwa n’ịgbalị iji ihe iwu kwuru kwado izisa ozi ọma.+

8 N’ihi na Chineke ga-agbara m akaebe na agụụ ịhụ unu na-agụsi m ike n’ihi na m hụrụ unu n’anya otú Kraịst Jizọs hụrụ unu n’anya. 9 Ihe m na-ekpekwa n’ekpere bụ ka ịhụnanya unu na-abakwu ụba,+ ka unu na-amatakwu uche Chineke nke ọma+ ma na-aghọtacha uche ya;+ 10 ka unu na-achọpụta ihe ndị ka mkpa,+ ka unu wee bụrụ ndị na-enweghị ntụpọ ma ghara ịna-eme ka ndị ọzọ zọhie ụkwụ*+ ruo ụbọchị Kraịst; 11 nakwa ka Jizọs Kraịst nyere unu aka ka unu na-amịju mkpụrụ ezi omume amịju,+ ka e wee nye Chineke otuto ma jaa ya mma.

12 Ụmụnna m, achọrọ m ka unu mara na ihe mere m emeela ka e kwusakwuo ozi ọma, 13 nke mere na ndị niile bụ́ Ndị Nche Eze Rom nakwa ndị ọzọ niile amarala+ na a tụrụ m mkpọrọ+ n’ihi Kraịst. 14 Mkpọrọ a tụrụ m emeela ka ọtụtụ ụmụnna ndị na-ejere Onyenwe anyị ozi nwee obi ike. Obi na-esikwu ha ike ikwu okwu Chineke n’atụghị egwu.

15 N’eziokwu, ọ bụ anyaụfụ na ekworo mere ụfọdụ ndị ji na-ekwusa ozi ọma gbasara Kraịst, ma ndị ọzọ ji ezi obi na-ekwusa ya. 16 Ọ bụ ịhụnanya mere ndị nke nwere ezi obi ji na-ekwusa gbasara Kraịst, n’ihi na ha ma na a họpụtara m ka m gbachitere ozi ọma.+ 17 Ma ndị nke ọzọ na-eme ya n’ihi esemokwu. Ha ejighị obi ọcha na-ekwusa ya n’ihi na ha chọrọ ịkpatara m nsogbu na mkpọrọ a tụrụ m. 18 Gịnị meziri? Otú ọ bụla e si na-ekwusa ya, ma è ji aghụghọ na-ekwusa ya ma è ji ezi obi na-ekwusa ya, ihe bụ́ isi bụ na a na-ekwusa gbasara Kraịst. Ana m aṅụrịkwa ọṅụ na a na-ekwusa ya. N’eziokwu, m ga na-aṅụrị ọṅụ, 19 n’ihi na ama m na a ga-azọpụta m n’ihi arịrịọ unu na-arịọsi ike+ nakwa n’ihi na mmụọ Jizọs Kraịst na-enyere anyị aka.+ 20 Obi siri m ike, enwekwara m olileanya na a gaghị eme ka ihere mee m n’ụzọ ọ bụla. Ma ebe ọ bụ na ụjọ ikwu okwu anaghị atụ m, m* ga-eto Kraịst ugbu a otú m na-emebu mgbe niile, ma m̀ dị ndụ ma m̀ nwụrụ anwụ.+

21 N’ihi na ọ bụrụ na m dị ndụ, ọ bụ Kraịst ka m na-adịrị ya,+ ọ bụrụkwa na m nwụọ, ọ baara m uru.+ 22 Ọ bụrụ na m ka dịrị ndụ n’ụwa a,* m ga-arụkwuru Kraịst ọrụ. Ma, agaghị m ekwu nke m ga-ahọrọ. 23 Amaghị m nke m ga-ahọrọ na ha abụọ n’ihi na m chọkwara ka a tọhapụ m ka m gakwuru Kraịst,+ n’ihi na o doro m anya na ọ bụ ya bụ nke ka mma.+ 24 Ma, ihe ga-akacha abara unu uru bụ ka m ka dịrị ndụ n’ụwa. 25 N’ihi ya, ebe ọ bụ na obi siri m ike n’ihe a, ama m na m ka ga-anọ ndụ ma nọnyere unu niile ka unu wee na-emekwu nke ọma ma na-enwe ọṅụ n’ihi okwukwe unu, 26 ka ọ ga-abụ mgbe mụ na unu ga-anọ ọzọ, unu ga-enwe nnọọ ezigbo ọṅụ maka na unu na-eso ụzọ Kraịst Jizọs.

27 Na-akpanụ àgwà* otú kwesịrị ozi ọma gbasara Kraịst,+ ka ọ ga-abụ, ma m̀ bịara hụ unu ma ọ bụ na anọghị m ya, ka m nụ banyere unu na unu kwụsiri ike, nwee otu obi,* dị n’otu,*+ na-arụkọ ọrụ ọnụ ka unu na-enwe okwukwe n’ozi ọma, 28 gharakwa ikwe ka ndị na-emegide unu na-emenye unu ụjọ. Ihe a na-egosi na a ga-ebibi+ ha, ma ọ na-egosi na a ga-azọpụta unu.+ Ihe a si n’aka Chineke. 29 N’ihi na e meere unu ihe ọma a, ọ bụghị naanị ka unu nwee okwukwe na Kraịst, kamakwa ka unu taa ahụhụ n’ihi ya.+ 30 N’ihi na ihe ndị unu na ha na-alụ bụkwa ihe ndị unu hụrụ mụ na ha na-alụ,+ unu nụkwara ugbu a na mụ na ha ka na-alụ.

2 Ọ bụrụ na e nwere agbamume ọ bụla unu ga-enye maka na unu na Kraịst dị n’otu, ọ bụrụ na e nwere okwu nkasi obi ọ bụla ịhụnanya ga-eme ka unu kwuo, ọ bụrụ na unu na-eche banyere ibe unu, ọ bụrụ na unu hụrụ ibe unu n’anya ma na-emetere ibe unu ebere,* 2 na-emenụ ihe ndị a ka m nwekwuo ọṅụ. M ga-enwekwu ọṅụ ma unu na-enwe otu obi na otu ịhụnanya, na-adị n’otu ma na-enwe otu echiche.+ 3 Unu esela okwu+ n’ihe ọ bụla unu na-eme ma ọ bụ kwe ka onwe unu na-ebu unu isi,+ kama dịrịnụ umeala n’obi, na-ewerekwanụ na ndị ọzọ ka unu.+ 4 Unu achọla ihe ga-adị naanị onwe unu mma,+ kama na-achọkwanụ ihe ga-adị ndị ọzọ mma.+

5 Na-echenụ echiche otú a ka Kraịst Jizọs.+ 6 N’agbanyeghị na ọ dịrị ka Chineke,+ o cheghịdị echiche ka ọ gbalịwa ka ya na Chineke hara.+ 7 Mba, kama ọ hapụrụ ihe niile ọ bụ ma dịrị ka ohu,+ wee bụrụ mmadụ.*+ 8 Mgbe ọ ghọrọ mmadụ, o weturu onwe ya ala ma rube isi ruo ọnwụ,+ ya bụ, ọnwụ ọ nwụrụ n’osisi ịta ahụhụ.*+ 9 Ọ bụ ya mere Chineke ji bugoo ya n’ọkwá ka elu,+ jirikwa obiọma nye ya aha karịrị aha ọ bụla ọzọ,+ 10 ka ikpere niile wee gbuo n’ala n’aha Jizọs, ma nke ndị nọ n’eluigwe ma nke ndị nọ n’ụwa ma nke ndị nọ n’ime ala,*+ 11 ka ire ọ bụla wee kwupụtakwa na Jizọs Kraịst bụ Onyenwe anyị,+ ka e wee nye Chineke Nna otuto.

12 Ndị m hụrụ n’anya, unu na-erube isi mgbe niile, ọ bụghị naanị mgbe m nọ ya, ma karịchaa ugbu a m na-anọghị ya. N’ihi ya, jirinụ egwu na ịma jijiji na-eme ihe ga-eme ka a zọpụta unu. 13 N’ihi na ọ bụ Chineke na-enye unu ume maka na ọ dị ya ezigbo mma ime otú ahụ. Ọ na-eme ka unu nwee mmasị ime ihe, na-enyekwa unu ike unu ji eme ya. 14 Unu atamula ntamu+ ma ọ bụ na-arụrịta ụka+ n’ihe ọ bụla unu na-eme, 15 ka unu wee bụrụ ndị a na-anaghị ata ụta na ndị aka ha dị ọcha, ụmụ Chineke+ ndị na-emerụghị onwe ha n’ọgbọ a jọgburu onwe ya, nke rụkwara arụ.+ Ma unu na-enwu ka ìhè n’etiti ha n’ụwa a,+ 16 unu na-ejisikwa okwu na-enye ndụ aka ike.+ N’ihi ya, m ga-enwe ihe mere m ga-eji ṅụrịa ọṅụ n’ụbọchị Kraịst, ebe m ma na agbaghị m ọsọ n’efu ma ọ bụ rụsie ọrụ ike n’efu. 17 Ma, ọ bụrụgodị na a na-awụsa m ka àjà mmanya+ n’elu àjà unu na-achụ+ nakwa n’ozi dị nsọ* nke okwukwe mere ka unu na-eje, obi dị m ụtọ, esokwa m unu niile na-aṅụrị ọṅụ. 18 Na-enwekwanụ obi ụtọ otú m na-enwe, sorokwanụ m na-aṅụrị ọṅụ.

19 Enwere m olileanya na m ga-ezitere unu Timoti+ n’oge na-adịghị anya ma ọ bụrụ uche Onyenwe anyị Jizọs, ka e wee gbaa m ume mgbe m ga-anụ gbasara unu. 20 N’ihi na enweghị m onye ọzọ nwere ụdị obi o nwere, onye ga-eji obi ya niile lebara mkpa unu anya. 21 N’ihi na ndị ọzọ niile na-achọ ihe ga-adị ha mma, ọ bụghị ihe ga-adị Jizọs Kraịst mma. 22 Ma unu ma na o gosiri ụdị onye ọ bụ, na dị ka nwata+ ya na nna ya nọ, o so m gbasie mbọ ike n’ikwusakwuru ndị ọzọ ozi ọma. 23 N’ihi ya, ọ bụ ya ka m nwere olileanya izitere unu ozugbo m hụrụ otú ihe si dịrị m. 24 N’eziokwu, obi siri m ike na m ga-abịakwa n’oge na-adịghị anya+ ma ọ bụrụ uche Onyenwe anyị.

25 Ma ka ọ dị ugbu a, echere m na m kwesịrị izitere unu Epafrọdaịtọs, nwanna m na onye ọrụ ibe m na onye agha ibe m, nakwa onye ozi unu zitere ka o gbooro m mkpa m,+ 26 ebe ọ bụ na ọ na-agụsi ya agụụ ike ịhụ unu niile, ebe ọ bụkwa na o wutere ya na unu nụrụ na ọ rịara ọrịa. 27 N’eziokwu, ọ rịara ọrịa nke na ọ fọrọ obere ka ọ nwụọ; ma Chineke meere ya ebere. N’eziokwu, ọ bụghị naanị yanwa ka o meere ebere, o mekwaara mụnwa ebere, ka m wee ghara iruwe uju ọzọ n’elu nke m na-eru. 28 N’ihi ya, m na-ezite ya ngwa ngwa, ka unu wee ṅụrịa ọṅụ ọzọ mgbe unu ga-ahụ ya, mụnwa akwụsịtụkwa ichegbu onwe m. 29 N’ihi ya, nabatanụ ya otú unu si anabata ndị na-eso ụzọ Onyenwe anyị, jirikwanụ ụdị ndị a kpọrọ ihe,+ 30 n’ihi na ọ fọrọ obere ka ọ nwụọ n’ihi ọrụ Kraịst,* o mekwara ihe gaara ata isi ya,* ka o wee jeere m ozi unu gaara ejere m ma a sị na unu nọ n’ebe a.+

3 N’ikpeazụ, ụmụnna m, na-aṅụrịnụ ọṅụ maka na unu na Onyenwe anyị dị n’otu.+ Idetara unu ihe ndị m detabuuru unu n’akwụkwọ ozi abụrụghị m nsogbu, kama m na-edetara ya unu ka unu ghara ịba ná nsogbu.

2 Kpacharanụ anya maka ndị dị ka nkịta. Kpacharanụ anya maka ndị na-emerụ ndị ọzọ ahụ́. Kpacharanụ anya maka ndị na-ebepụ ahụ́.*+ 3 N’ihi na ọ bụ anyị bụ ndị e biri ezigbo úgwù,+ anyị ndị mmụọ Chineke mere ka anyị na-eje ozi dị nsọ, ndị ji Kraịst Jizọs anya isi,+ ndị na-atụkwasịghịkwa obi n’anụ ahụ́, 4 n’agbanyeghị na mụnwa nwere ihe mere m ga-eji tụkwasị obi n’anụ ahụ́, ma a sị na e nwere onye nwere ihe mere ọ ga-eji tụkwasị obi na ya.

Ọ bụrụ na e nwere onye ọzọ chere na ya nwere ihe mere ọ ga-eji tụkwasị obi n’anụ ahụ́, mụnwa nwere karịa ya: 5 E biri m úgwù n’ụbọchị nke asatọ.+ Abụ m onye Izrel. Esi m n’ebo Benjamin. Abụ m onye Hibru, onye ndị Hibru mụrụ.+ A bịa n’idebe iwu, abụ m onye Farisii.+ 6 A bịa n’ịnụ ọkụ n’obi, m kpagburu ọgbakọ.+ A bịa n’ime ezi omume otú iwu kwuru, e nweghị ihe a ga-eji taa m ụta. 7 Ma, ihe niile m webuuru ka nnukwu ihe, m weziiri ha ka ihe na-abaghị uru* n’ihi Kraịst.+ 8 N’eziokwu, m wekwaara ihe niile ka ihe na-abaghị uru n’ihi otú ihe m mụtara banyere Kraịst Jizọs Onyenwe m si baara m ezigbo uru. Ahapụla m ihe niile n’ihi Kraịst, m wekwaara ha ka ihe e kpofuru ekpofu,* ka m wee rite uru dị n’iso ụzọ ya, 9 ka mụ na ya wee dịrị n’otu. Ọ bụghị na m na-asị na m bụ onye ezi omume maka na m na-edebe Iwu.* Kama ọ bụ maka na m nwere okwukwe na Kraịst+ mere e ji were m ka onye ezi omume.+ N’eziokwu, Chineke weere ndị nwere okwukwe ka ndị ezi omume.+ 10 Ihe m bu n’obi bụ ka m mata ya, matakwa ike ahụ nke mere ka o bilite n’ọnwụ+ nakwa ka m taa ahụhụ otú ọ tara+ ma kweta ịnwụ ụdị ọnwụ ọ nwụrụ,+ 11 ka m mara ma è nwere otú m ga-esi soro ná ndị a ga-ebu ụzọ kpọlite n’ọnwụ.+

12 Ọ bụghị na mụ enwetala ihe m na-atụ anya ya ma ọ bụ na e meela ka m zuo okè, kama m na-agbalịsi ike+ ka m mara ma m̀ ga-enweta ihe ahụ mere Kraịst Jizọs ji họrọ m.+ 13 Ụmụnna m, ewerebeghị m onwe m ka onye nwetarala ya. Ma e nwere otu ihe m na-eme: Ana m echefu ihe ndị garala aga,*+ na-agbalịsi ike ka m nweta ihe ndị na-abịa n’ihu.+ 14 Ana m agbasi mbọ ike ka m nweta ihe m na-atụ anya ya, nke bụ́ ịdị ndụ n’eluigwe.+ Ọ bụ ya bụ ụgwọ ọrụ+ Chineke ga-enye anyị ndị o si n’aka Kraịst Jizọs kpọọ. 15 N’ihi ya, ka anyị niile ndị tozuru etozu+ na-eche echiche otú a. Ma, ọ bụrụ na unu anaghị eche echiche otú m kwuru, Chineke ga-enyere unu aka ka unu chewe echiche otú ahụ. 16 Ma, otú ọ bụla anyị merurula nke ọma, ka anyị si otú ahụ mere nke ọma na-aga.

17 Ụmụnna m, mewenụ ka m,+ lekwasịkwanụ anya ná ndị na-ebi ndụ otú unu hụrụ anyị si ebi. 18 N’ihi na e nwere ọtụtụ ndị m na-agwakarị unu banyere ha. Ma ugbu a, eji m anya mmiri na-agwa unu banyere ha maka na ha na-eleda ọnwụ Kraịst nwụrụ n’osisi ịta ahụhụ* anya. 19 Ihe na-echere ha bụ mbibi. Chi ha bụ afọ ha. Ihe ha ji anya isi bụ ihe kwesịrị ịna-eme ha ihere, uche ha dịkwa n’ihe ndị dị n’ụwa.+ 20 Ma anyị bụ ụmụ amaala+ eluigwe,+ anyị na-echeresikwa onye nzọpụta nọ n’ebe ahụ ike, bụ́ Onyenwe anyị Jizọs Kraịst,+ 21 onye ga-eji ike dị ukwuu o nwere, nke o ji eme ka ihe niile dịrị n’okpuru ya,+ gbanwee ahụ́ anyị na-adịghị ike ka ọ dị ka ahụ́ ya dị ebube.+

4 N’ihi ya, ụmụnna m m hụrụ n’anya, agụụ ịhụ unu na-agụsi m ike, unu bụkwa ọṅụ m na okpueze m.+ Unu ndị m hụrụ n’anya, kwụsienụ ike+ otú a ka unu wee na-eme ka unu na Onyenwe anyị dị n’otu.

2 M na-agba Yuodia na Sintiki ume ka ha nwee otu obi n’ozi ha na-ejere Onyenwe anyị.+ 3 Ana m arịọkwa gị, ezigbo onye mụ na ya na-arụkọ ọrụ,* ka ị na-enyere ụmụ nwaanyị ndị a aka. N’eziokwu, mụ na ha na Klement nakwa ndị ọzọ gbakọrọ mbọ ọnụ n’izisa ozi ọma. Aha ha niile dị n’akwụkwọ nke ndụ.+

4 Na-aṅụrịnụ ọṅụ mgbe niile n’ihi Onyenwe anyị. Ana m asị ọzọ, Na-aṅụrịnụ ọṅụ.+ 5 Meenụ ka mmadụ niile mara na unu na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị.+ Onyenwe anyị nọ nso. 6 Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọ bụla,+ kama n’ihe niile, na-ekpenụ ekpere, na-arịọsikwanụ Chineke arịrịọ ike ma na-ekele ya. Ọ bụ otú unu ga-esi mee ka ọ mara ihe unu na-arịọ.+ 7 Udo+ Chineke na-enye, nke karịrị nghọta mmadụ, ga-esi n’aka Kraịst Jizọs chee obi unu+ na echiche* unu nche.

8 N’ikpeazụ, ụmụnna m, ihe ọ bụla bụ́ eziokwu, ihe ọ bụla dị ezigbo mkpa,* ihe ọ bụla ziri ezi, ihe ọ bụla dị ọcha, ihe ọ bụla na-eme ka mmadụ hụ ibe ya n’anya, ihe ọ bụla a na-ekwu okwu ọma banyere ya, ihe ọ bụla bụ́ omume ọma, na ihe ọ bụla kwesịrị otuto, na-echebaranụ ihe ndị a echiche.+ 9 Na-emenụ ihe ndị unu mụtara n’aka m na ihe ndị unu nabatara nakwa ihe ndị unu nụrụ m kwuru na ihe ndị unu hụrụ m na-eme,+ Chineke nke udo ga-anọnyekwara unu.

10 Ana m aṅụrị ọṅụ nke ukwuu n’ihi Onyenwe anyị, na unu amalitekwala iche banyere m ugbu a.+ Ọ bụ eziokwu na unu na-echebu banyere m, ma unu ahụghị otú unu ga-esi gosi ya. 11 Anaghị m ekwu ihe a maka na mkpa na-akpa m, n’ihi na amụtala m otú ihe m nwere ga-esi na-eju m afọ* n’agbanyeghị otú ihe si dịrị m.+ 12 Ama m otú e si ebi ndụ mgbe ihe na-adịchaghị,+ marakwa otú e si ebi ndụ mgbe ihe juru eju. N’ihe niile nakwa otú ọ bụla ihe si dị, amụtala m otú ihe m nwere ga-esi na-eju m afọ, ma mgbe m na-eriju afọ ma mgbe m nọ agụụ, ma mgbe m nwejuru ihe enweju ma mgbe m na-enweghị ihe ọ bụla. 13 N’ihe niile, onye ahụ nke na-eme ka m dị ike na-enye m ike.+

14 Ma, unu mere nke ọma nyere m aka ná mkpagbu a na-akpagbu m. 15 N’eziokwu, unu ndị Filipaị makwa na mgbe mbụ unu nụrụ ozi ọma, mgbe m hapụkwara Masedonia gawa ebe ọzọ, e nweghị ọgbakọ ọ bụla nyeere m aka ma ọ bụ kwe ka m nyere ha aka, ma e wepụ naanị unu.+ 16 N’ihi na, mgbe m nọ na Tesalonaịka, unu ziteere m ihe, ọ bụghị naanị otu ugboro kama ugboro abụọ, ka m jiri gboo mkpa m. 17 Ọ bụghị na m na-achọ ka e nye m onyinye, kama m na-achọ ka unu na-arụ ọrụ ọma ndị ga-abakwuru unu uru. 18 Ma, enwere m ihe niile zuuru m, nweekwa karịa. E nweghịzi ihe kọrọ m ugbu a m natarala Epafrọdaịtọs+ ihe unu zitere, nke dị ka ihe na-esi ísì ọma,+ bụ́ àjà Chineke na-anabata, nke dị ya mma. 19 N’ihi ya, Chineke m, onye nwejuru akụ̀ enweju, ga-esi n’aka Kraịst Jizọs nyezuo unu ihe niile na-akpa unu.+ 20 Ka otuto dịrị Chineke anyị, bụ́ Nna anyị, ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.

21 Keleerenụ m onye nsọ ọ bụla ya na Kraịst Jizọs dị n’otu. Ụmụnna ndị mụ na ha nọ na-ekele unu. 22 Ndị nsọ niile, ma karịchaa, ndị ezinụlọ Siza,+ na-ekele unu.

23 Ka Onyenwe anyị Jizọs Kraịst meere unu amara n’ihi àgwà ọma unu na-akpa.

Na Grik, “daa.”

Na Grik, “ahụ́ m.”

Na Grik, “n’anụ ahụ́.”

Ma ọ bụ “Na-emenụ ka ụmụ amaala.”

Na Grik, “otu mmụọ.”

Na Grik, “nwee otu mkpụrụ obi.”

Ma ọ bụ “na-enwere ibe unu ọmịiko.”

Na Grik, “dịrị n’ụdị ụmụ mmadụ.”

Gụọ Nkọwa Okwu.

Ya bụ, ndị nwụrụ anwụ a ga-akpọlite n’ọnwụ.

Ma ọ bụ “ozi a na-ejere ọhaneze.”

O nwere ike ịbụ, “ọrụ Onyenwe anyị.”

Ma ọ bụ “o tinyekwara mkpụrụ obi ya n’ihe ize ndụ.”

Ya bụ, ndị na-agwa ndị mmadụ ka ha bie úgwù.

O nwere ike ịbụ, “m ji obi m hapụ ha niile.”

Ma ọ bụ “unyi; ahịhịa.”

Ya bụ, Iwu Mosis.

Na Grik, “dị n’azụ.”

Gụọ Nkọwa Okwu.

Na Grik, “onye mụ na ya na-anya yok.”

Ma ọ bụ “uche; ike iche echiche.”

Ma ọ bụ “ihe ọ bụla e kwesịrị iji kpọrọ ihe.”

Ma ọ bụ “na-ezuru m.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya