Abụ Ọma
Maskil. Abụ ọma Itan onye Zira.+
89 M ga-abụ abụ banyere obiọma* Jehova ọbụna ruo mgbe ebighị ebi.+
M ga-eji ọnụ m mee ka a mara ikwesị ntụkwasị obi gị site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ.+
2 N’ihi na m sịrị: “Obiọma ga-adịgide ọbụna ruo mgbe ebighị ebi;+
Ị ga-emekwa ka ikwesị ntụkwasị obi gị guzosie ike n’eluigwe.”+
3 “Mụ na onye m họọrọ agbawo ndụ;+
Aṅụworo m ohu m Devid iyi, sị,+
4 ‘M ga-eme ka mkpụrụ gị guzosie ike ọbụna ruo mgbe ebighị ebi,+
M ga-emekwa ka ocheeze gị dịrị+ site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ.’” Sila.
5 Jehova, eluigwe ga-eto ọrụ gị dị ịtụnanya,+
Ee, ọ ga-etokwa ikwesị ntụkwasị obi gị n’ime ọgbakọ nke ndị nsọ.
7 A ga na-atụ egwu Chineke n’etiti ìgwè ndị nsọ ndị na-akpachi anya;+
Ọ dị ukwuu, bụrụkwa onye a na-atụ egwu karịa ndị niile gbara ya gburugburu.+
8 Jehova Chineke nke ụsụụ ndị agha,+
Ònye dị ike ka gị, Jaa?+
Ikwesị ntụkwasị obi gị gbara gị gburugburu.+
10 Gị onwe gị egwepịawo Rehab,+ ọbụna dị ka onye e gburu egbu.+
I jiriwo ogwe aka gị dị ike chụsasịa ndị iro gị.+
19 N’oge ahụ, ị gwara ndị na-eguzosi ike n’ebe ị nọ okwu n’ọhụụ,+
I wee sị:
“Enyeworo m onye dị ike aka;+
Ebuliwo m onye a họọrọ n’etiti ndị mmadụ elu.+
20 Ahọrọwo m Devid bụ́ ohu m;+
Etewo m ya mmanụ m dị nsọ,+
21 Bụ́ onye aka m ga-akwadosi ike,+
Onye ogwe aka m ga-emekwa ka ọ dị ike.+
28 M ga-eme ka obiọma m nwere n’ebe ọ nọ dịruo mgbe ebighị ebi,+
A gaghị emebi ọgbụgba ndụ mụ na ya.+
29 M ga-eme ka mkpụrụ ya nọruo mgbe ebighị ebi,+
Meekwa ka ocheeze ya dịgide dị ka ụbọchị niile nke eluigwe.+
30 Ọ bụrụ na ụmụ ya ahapụ iwu m,+
Ọ bụrụkwa na ha ejeghị ije ná mkpebi ikpe m,+
31 Ọ bụrụ na ha emebie ụkpụrụ m,
Gharakwa idebe ihe niile m nyere n’iwu,
32 M ga-eji ụtarị lebara mmebi iwu ha anya,+
Jirikwa apịpịa lebara njehie ha anya.+
37 Ọ ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi dị ka ọnwa,
Ọ ga-adịgidekwa dị ka onye akaebe kwesịrị ntụkwasị obi nke nọ na mbara igwe.” Sila.
46 Jehova, ruo ole mgbe ka ị ga-ezonahụ m onwe gị? Ọ̀ bụ ruo mgbe ebighị ebi?+
Ọnụma gị ọ̀ ga na-ere ka ọkụ?+
48 Olee dimkpa dị ndụ nke na-agaghị anwụ anwụ?+
Ọ̀ pụrụ imere mkpụrụ obi ya ụzọ ọ ga-esi gbanahụ Shiol?+ Sila.
49 Jehova, olee ebe obiọma niile ị na-egosibu anyị dị,
Bụ́ nke i ji ikwesị ntụkwasị obi gị ṅụọrọ Devid n’iyi?+
50 Jehova, cheta nkọcha a na-akọcha ndị ohu gị,+
Chetakwa otú m si buru nkọcha nke ndị niile dị iche iche n’obi uwe m,+
51 Jehova, biko, cheta otú ndị iro gị si na-akọcha nzọụkwụ nke onye i tere mmanụ,+
Otú ha si na-akọcha nzọụkwụ ya.+
52 Ka Jehova bụrụ onye a gọziri agọzi ruo mgbe ebighị ebi. Amen na Amen.+