AKWỤKWỌ OZI JEMS DERE
1 Mụnwa bụ́ Jems,+ ohu Chineke na ohu Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, na-edetara ebo iri na abụọ bi n’ebe dị iche iche akwụkwọ:
Ana m ekele unu.
2 Ụmụnna m, ṅụrịanụ ọṅụ mgbe ọnwụnwa dị iche iche bịaara unu,+ 3 n’ihi na unu ma na unu merie ọnwụnwa ndị ahụ, okwukwe unu ga-esikwu ike, unu enwekwuokwa ike ịna-atachi obi ma ọnwụnwa bịa.+ 4 Ọ bụrụkwa na unu ana-atachi obi mgbe niile, ọ ga-eme ka unu zụọ onwe unu nke ọma, nwee ike izu ezu, na-emekwa nke ọma n’ihe niile, n’enweghị ihe ọ bụla kọrọ unu.+
5 Ọ bụrụkwa na e nwere onye n’ime unu chọrọ amamihe,* ya na-arịọ Chineke+ n’ihi na Chineke na-emesapụrụ mmadụ niile aka. Ọ gaghị ewesa ya iwe,*+ kama ọ ga-emere ya ihe ọ rịọrọ.+ 6 Ma, o kwesịrị inwe okwukwe mgbe ọ na-arịọ ya.+ O kwesịghị inwe obi abụọ ọ bụla.+ N’ihi na onye nwere obi abụọ dị ka ebili mmiri nke oké osimiri, nke ifufe na-akwagharị, na-enugharịkwa. 7 N’eziokwu, onye dị otú ahụ ekwesịghị iche na ọ ga-anata ihe ọ bụla n’aka Jehova.* 8 Ọ bụ onye na-amaghị ihe ọ ga-eme eme,+ ọ naghịkwa akwụsi ike n’ihe niile ọ na-eme.
9 Ka nwanna ọ na-enweghị ka ọ hà ya na-enwe aṅụrị* n’ihi elu e buliri ya.+ 10 Ka onye bara ọgaranya nweekwa aṅụrị n’ihi ala e wedara ya,+ n’ihi na ọ ga-ala n’iyi ka okooko osisi. 11 N’ihi na ọ na-abụ anwụ chawa, e nwee oké okpomọkụ, ahịhịa ndụ akpọnwụọ, okooko ya adapụsịa, mma ọ mara alaakwa n’iyi. Otú ahụkwa ka ọgaranya ga-akpọnwụ ka ọ na-achụ akụnụba.+
12 Onye na-atachi obi n’ọnwụnwa na-enwe obi ụtọ,+ n’ihi na o dichaa ọnwụnwa ahụ, Jehova* ga-enye ya ndụ,+ nke bụ́ ụgwọ ọrụ o kwere nkwa ịkwụ* ndị na-akwụsịghị ịhụ ya n’anya.+ 13 Ka onye ọnwụnwa bịaara ghara ịsị: “Ọ bụ Chineke na-anwa m.” N’ihi na o nweghị onye nwere ike iji ihe ọjọọ nwaa Chineke, Chineke anaghịkwa eji ihe ọjọọ anwa onye ọ bụla. 14 Kama ọ bụ ihe na-agụ mmadụ agụụ na-anwa onye ahụ, nwata ya.+ 15 Mgbe ihe ahụ na-agụsi onye ahụ ike, ọ na-eme ka o mehie.* O mechaa mmehie, ya akpatara ya ọnwụ.+
16 Ụmụnna m m hụrụ n’anya, unu ekwela ka e duhie unu. 17 Ọ bụ n’eluigwe ka anyị si enweta onyinye ọ bụla dị mma, nke zukwara okè.+ Ọ na-esi n’aka Chineke, bụ́ Nna kere ìhè na-esi n’eluigwe, abịa.+ Chineke adịghị ka onyinyo na-anaghị anọ otu ebe, nke na-agbanwekwa agbanwe.+ 18 O ji okwu ya bụ́ eziokwu mee ka anyị dịrị ndụ n’ihi na ọ bụ uche ya.+ Ihe mere o ji mee ya bụ ka anyị bụrụ ndị mbụ ọ họọrọ n’ime ndị niile o kere.+
19 Ụmụnna m m hụrụ n’anya, maranụ ihe a: Onye ọ bụla kwesịrị ịbụ onye na-anụ ihe ngwa ngwa, onye na-anaghị ekwu okwu ngwa ngwa,+ na onye na-anaghị ewe iwe ngwa ngwa,+ 20 n’ihi na onye na-ewe iwe anaghị eme ezi omume Chineke chọrọ ka anyị na-eme.+ 21 N’ihi ya, hapụnụ àgwà niile jọgburu onwe ha na ụdị ihe ọjọọ ọ bụla.+ Dịrịnụ umeala n’obi, kwerekwanụ ka Chineke kụọ okwu ya dị ka mkpụrụ n’ime unu. Okwu ya nwere ike ịzọpụta unu.*
22 Ma, na-emenụ ihe Chineke kwuru.+ Unu abụla ndị na-anụ naanị ọnụnụ, ndị na-aghọgbu onwe ha. 23 N’ihi na ọ bụrụ na onye ọ bụla na-anụ okwu Chineke, ma ọ naghị eme ya eme,+ ọ dị ka onye lere ihu ya n’enyo, 24 leekwa onwe ya n’enyo, ma ozugbo ọ pụrụ, ya echefuo otú ọ dị. 25 Ma onye na-enyocha iwu Chineke, nke zuru okè,+ nke na-eme ka mmadụ nwere onwe ya, onye na-emekwa ihe o kwuru, abụghị onye na-echefu ihe ọ nụrụ. Ọ bụ onye na-arụ ọrụ Chineke sị ka a rụọ. Ọ ga-enwekwa obi ụtọ ma ọ na-arụ ya.+
26 Ọ bụrụ na mmadụ chere na ya na-efe Chineke, ma ọ naghị ejide ire ya,+ ọ na-aghọgbu onwe* ya, ofufe ọ na-efe Chineke abaghịkwa uru ọ bụla. 27 Ofufe* dị ọcha, nke a na-emerụghịkwa emerụ n’anya Chineke Nna anyị bụ: mmadụ inyere ụmụ na-enweghị nne na nna+ na ụmụ nwaanyị isi mkpe+ na-ata ahụhụ aka,+ nakwa mmadụ ịhụ na ụwa a emebighị ya.+
2 Ụmụnna m, ebe ọ bụ na unu nwere okwukwe n’Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, onye dị ebube, gịnị mere unu ji na-ele mmadụ anya n’ihu?+ 2 Ka e were ya na mmadụ gbajuru ọla e ji ọlaedo mee ná mkpịsị aka ya, yirikwa ákwà mara mma, bata ebe unu zukọrọ, otu ogbenye nke yi ákwà ruru unyi abatakwa. 3 Ùnu na-aka akwanyere onye nke yi ákwà mara mma ùgwù wee sị ya, “Nọdụ ala n’ebe a mara mma,” ma sị onye ogbenye ahụ, “Enyi, guzoro ọtọ,” ma ọ bụ, “Nọrọ ọdụ n’ala ebe ahụ”?+ 4 Ọ bụrụ ihe unu na-eme, ọ pụtara na unu na-ewere na otu onye ka ibe ya mma,+ unu aghọọkwala ndị ikpe na-ekpe ikpe mkpegbu.+
5 Ụmụnna m m hụrụ n’anya, geenụ ntị. Ọ̀ bụ na Chineke ahọrọghị ndị ụwa weere na ha dara ogbenye ka ha bụrụ ndị bara ọgaranya n’okwukwe?+ N’eziokwu, ọ bụ ha ka ọ họọrọ ka ha keta Alaeze ya, nke o kwere nkwa inye ndị hụrụ ya n’anya.+ 6 Ma, unu menyere ogbenye ahụ ihere. Ọ́ bụghị ndị bara ọgaranya na-emegbu unu,+ na-akpụpụkwa unu ụlọikpe? 7 Ọ́ bụghị ha na-ekwulu aha pụrụ iche unu na-aza? 8 Ọ bụrụ na unu na-edebe iwu a eze nyere, nke e dere n’Akwụkwọ Nsọ, sị: “Hụ onye agbata obi gị n’anya otú ị hụrụ onwe gị,”+ unu na-agba nnọọ mbọ. 9 Ma ọ bụrụ na unu na-ele mmadụ anya n’ihu,+ unu na-eme mmehie, iwu ahụ na-emekwa ka o doo anya na unu na-emebi iwu.+
10 N’ihi na ọ bụrụ na mmadụ na-edebe Iwu niile ma daa otu n’ime ha, ọ daala ha niile.+ 11 N’ihi na ọ bụ onye sịrị, “Akwala iko,”+ sịkwara, “Egbula mmadụ.”*+ N’ihi ya, ọ bụrụ na ị naghị akwa iko ma ị na-egbu mmadụ, ị na-ada iwu. 12 Ka otú unu si ekwu okwu na otú unu si akpa àgwà na-egosi na unu nweere onwe unu, nakwa na a ga-eji iwu e nyere unu kpee unu ikpe.+ 13 N’ihi na a ga-ekpe onye na-anaghị eme ebere ikpe n’emereghị ya ebere.+ Ma, e kpewe onye na-eme ebere ikpe, a ga-emere ya ebere.*
14 Ụmụnna m, olee uru ọ bara ma mmadụ sị na ya nwere okwukwe ma ọ naghị eme ihe dị mma?+ Okwukwe ahụ ọ̀ ga-azọpụtali ya?+ 15 Ọ bụrụ na e nwere nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwaanyị na-enweghị uwe* na ihe oriri ga-ezuru ya n’ụbọchị, 16 ma otu onye n’ime unu asị ya: “Ya dịrị gị ná mma, nwetakwa uwe ị ga-eyi na nri ga-ezuru gị n’ụbọchị,” ma unu enyeghị ya ihe ahụ́ ya chọrọ, olee uru ọ bara?+ 17 Ọ bụkwa otú ọ dị n’ihe gbasara okwukwe. Ọ bụrụ na mmadụ anaghị eme ihe dị mma, okwukwe ya abaghị uru ọ bụla.*+
18 Ma, otu onye ga-asị: “I nwere okwukwe, mụnwa ana-eme ihe dị mma. Olee otú ị ga-esi gosi m na i nwere okwukwe ma ọ bụrụ na ị naghị eme ihe dị mma? M ga-eji ihe dị mma m na-eme gosi gị na m nwere okwukwe.” 19 Ọ̀ kwa i kwere na e nwere otu Chineke? Ị na-agbalị. Ma, ndị mmụọ ọjọọ kwekwara ma kụja.+ 20 Ma, gị onye nzuzu, ị́ maghị na ọ baghị uru mmadụ inwe okwukwe ma ọ bụrụ na ọ naghị eme ihe dị mma? 21 Ihe mere e ji kpọọ nna anyị Ebreham onye ezi omume ọ́ bụghị maka ihe dị mma o mere? Ọ bụ mgbe ọ gbatịchara Aịzik nwa ya n’elu ebe ọ ga-eji ya chụọ àjà ka a kpọrọ ya onye ezi omume.+ 22 Ọ̀ kwa ị hụrụ na ọ bụ ihe dị mma o mere ka o ji gosi na o nwere okwukwe, nke mere ka okwukwe ya zuo okè?+ 23 Ọ bụ ya mere Akwụkwọ Nsọ ji sị: “Ebreham nwere okwukwe na Jehova,* ya ejiri maka ya kpọọ ya onye ezi omume,”+ a kpọwakwa ya enyi Jehova.*+
24 Ihe a na-egosi unu na ihe e ji agụ mmadụ n’onye ezi omume bụ ihe dị mma ọ na-eme, ọ bụghị naanị n’ihi okwukwe o nwere. 25 Otú ahụ ka Chineke sikwa gụọ Rehab bụ́ nwaanyị akwụna n’onye ezi omume n’ihi ihe dị mma o mere. Ọ nabatara ndị bịara inyopụta otú obodo ha dị,* nyekwara ha aka ha esi n’ụzọ ọzọ laa.+ 26 N’eziokwu, otú ahụ ahụ́ nwụrụ anwụ ma ọ bụrụ na ọ naghị eku ume*+ ka okwukwe anyị na-abaghị uru ma ọ bụrụ na anyị anaghị eme ihe dị mma.+
3 Ụmụnna m, ọ bụghị unu niile kwesịrị ịbụ ndị nkụzi, n’ihi na unu ma na Chineke ga-enyocha anyị nke ọma maka ihe anyị kụziri, kpeekwa anyị ikpe maka ya.+ 2 N’ihi na anyị niile na-emejọ ihe* ọtụtụ ugboro.+ Ọ bụrụ na onye ọ bụla anaghị emejọ ma o kwuwe okwu, ọ bụ onye zuru okè, onye nwere ike ịtụrụ ahụ́ ya niile ụka. 3 Ọ bụrụ na anyị ekee eriri e ji eduzi ịnyịnya n’ọnụ ya ka ọ na-erubere anyị isi, anyị na-eduzikwa ahụ́ ya niile. 4 Ọ bụkwa otú ọ dị n’ihe gbasara ụgbọ mmiri. Ọ bụ eziokwu na ọ na-ebu ezigbo ibu, oké ifufe na-enugharịkwa ya, ma, a na-eji obere ụmara na-akwọ ya ka ọ gaa ebe onye nọ n’isi ụgbọ chọrọ ka ọ gaa.
5 Ire bụkwa ntakịrị ihe dị n’ahụ́ anyị, ma anyị na-eji ya etu ọnụ. Ntakịrị ọkụ nwekwara ike ịgba oké ọhịa ọkụ. 6 Ire dị ka ọkụ.+ Ọ bụ ihe dị anyị n’ahụ́, nke na-eme ihe ọjọọ, na-emerụkwa ahụ́ niile.+ O nwere ike ịla ndụ mmadụ n’iyi. Ọ dịkwa ka Gehena* n’ihi na ọ na-ala ihe n’iyi. 7 E nwere ike ịzụ ụdị anụ ọhịa niile na nnụnụ na anụ ndị na-arị arị na anụ ndị bi n’oké osimiri. Ụmụ mmadụ azụọkwala ha. 8 Ma ọ dịghị mmadụ ọ bụla ga-azụli ire. Ire dị njọ. Mmadụ anaghị ejideli ya. Ihe juru na ya bụkwa nsí na-egbu mmadụ.+ 9 Anyị na-eji ya eto Jehova* Nna anyị. Anyị na-ejikwa ya abụ ụmụ mmadụ ọnụ, ndị e kere ha “adịrị ka Chineke.”+ 10 N’otu ọnụ ahụ ka ngọzi na ịbụ ọnụ si apụta.
Ụmụnna m, ihe ndị a ekwesịghị ịna-eme.+ 11 Mmiri dị mma ọṅụṅụ* na mmiri na-atọ nnu nnu* hà na-esi n’otu isi mmiri asọpụta? 12 Ụmụnna m, osisi fig ò nwere ike ịmị mkpụrụ oliv, ka osisi vaịn ò nwere ike ịmị mkpụrụ fig?+ Mmiri nnu enweghịkwa ike ịgbapụta mmiri dị mma ọṅụṅụ.
13 Ò nwere onye n’ime unu ma ihe, na-aghọtakwa ihe? Ya na-akpa àgwà ọma, dịrịkwa nwayọọ. Ọ bụ ya ga-egosi na ọ ma ihe. 14 Ma ọ bụrụ na unu na-enwere ibe unu anyaụfụ,+ na-esekwa okwu,*+ unu etula ọnụ+ na unu ma ihe. Ọ bụrụ na unu na-eme otú a, unu na-agha ụgha. 15 Ụdị amamihe a esighị n’eluigwe. Kama ọ bụ nke ụwa,+ nke ndị anụ ahụ́ na-achị, nakwa nke ndị mmụọ ọjọọ. 16 N’ihi na n’ebe ọ bụla e nwere anyaụfụ na esemokwu,* ọgba aghara na ụdị ihe ọjọọ niile na-adị ebe ahụ.+
17 Ma amamihe nke si n’eluigwe na-ebu ụzọ eme ka obi mmadụ dị ọcha.+ Ọ na-emekwa ka onye ahụ na-eme udo,+ na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị,+ na-eji obi ya niile erube isi, na-emetere ndị ọzọ ebere, na-eme ihe dị mma,*+ ghara ịna-ele mmadụ anya n’ihu,+ gharakwa ịdị ihu abụọ.+ 18 Ndị na-eme ka ha na ndị ọzọ dịrị ná mma+ na-eme ka udo dịrị na-aga,+ ọ na-emekwa ka ha na-eme ihe dị mma.
4 Gịnị kpatara okwu unu na-ese na ọgụ unu na-alụ? Ọ́ bụghị maka na ihe na-achị unu bụ ihe na-agụ anụ ahụ́ unu agụụ?+ 2 Ọ bụ ya mere unu ji na-achọ inweta ihe, ma unu anaghị enweta ya. Unu kpọrọ ibe unu asị.* Ihe ndị ọzọ nwe na-agụkwa unu agụụ, ma unu agaghị enweta ihe ọ bụla. Unu na-alụ ọgụ, na-alụkwa agha.+ Unu enweghị ihe n’ihi na unu anaghị arịọ ihe ọ bụla. 3 Ọ bụrụkwa na unu arịọ, unu anaghị arịọta n’ihi na ihe unu na-arịọ maka ya bụ ihe na-agụ anụ ahụ́ unu agụụ na ihe unu ga-eji mee ihe ọjọọ.
4 Ndị na-akwa iko,* ọ̀ bụ na unu amaghị na mmadụ bụrụ enyi ụwa, ọ ghọọla onye iro Chineke? N’ihi ya, onye ọ bụla nke chọrọ ịbụ enyi ụwa na-eme onwe ya onye iro Chineke.+ 5 Ka ùnu chere na o nweghị ihe mere Akwụkwọ Nsọ ji sị: “Ọ bụ maka na anyị nwere ike inwere ndị ọzọ anyaụfụ mere agụụ inweta ihe dị iche iche ji agụ anyị mgbe niile”?+ 6 Ma, amara Chineke na-emere anyị na-enyere anyị aka ka ihe ndị ahụ kwụsị ịna-agụ anyị agụụ. Ọ bụ ya mere Akwụkwọ Nsọ ji sị: “Ihe ndị mpako anaghị amasị Chineke,+ ma ọ na-emere ndị dị umeala n’obi amara.”+
7 N’ihi ya, na-eruberenụ Chineke isi.*+ Ma na-alụsonụ Ekwensu ọgụ.+ Ọ ga-esikwa ebe unu nọ gbapụ.+ 8 Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.+ Ndị mmehie, meenụ ka aka unu dị ọcha.+ Ndị na-amaghị ihe ha ga-eme eme, meenụ ka obi unu dị ọcha.+ 9 Ruonụ uju, beekwanụ ákwá.+ Unu ekwesịghị ịna-achị ọchị, kama unu kwesịrị ịna-eru uju. Unu ekwesịghịkwa ịna-aṅụrị ọṅụ, kama obi kwesịrị ịna-ajọ unu njọ. 10 Wedanụ onwe unu ala otú Jehova* chọrọ.+ Ọ ga-ebulikwa unu elu.+
11 Ụmụnna m, kwụsịnụ ikwutọ ibe unu.+ Onye ọ bụla nke na-ekwutọ nwanna ya ma ọ bụ na-ekpe nwanna ya ikpe na-ekwutọ iwu Chineke, na-asịkwa na ọ dịghị mma. Ma ọ bụrụ na ị na-asị na iwu Chineke adịghị mma, ị naghị edebe ya, kama ị bụ onyeikpe. 12 E nwere naanị otu onye, bụ́ Onye na-enye iwu na Onyeikpe,+ onye nwere ike ịzọpụta mmadụ, nweekwa ike ibibi mmadụ.+ Ma, ònye ka ị bụ mere ị ga-eji na-ekpe onye agbata obi gị ikpe?+
13 Ugbu a, geenụ ntị, unu ndị na-asị: “Taa ma ọ bụ echi, anyị ga-eje obodo dị otú a, nọọ otu afọ ebe ahụ, zụọ ahịa, ritekwa uru,”+ 14 ma unu amaghị ihe ndụ unu ga-abụ echi.+ N’ihi na unu dị ka alụlụụ nke ọ na-abụ, ya pụta, obere oge a gaghịzi ahụ ya.+ 15 Kama ikwu otú ahụ, unu kwesịrị ịsị: “Ọ bụrụ uche Jehova,*+ anyị ga-adị ndụ mee nke a ma ọ bụ nke ọzọ.” 16 Ma ugbu a, unu na-akpa nganga, na-etukwa ọnụ. Ụdị ọnụ a unu na-etu adịghị mma. 17 N’ihi ya, ọ bụrụ na mmadụ ma otú ọ ga-esi mee ihe dị mma ma o meghị ya, o mehiela.+
5 Ugbu a, geenụ ntị, unu ndị ọgaranya, beenụ ákwá, besiekwanụ ya ike n’ihi ahụhụ unu ga-ata.+ 2 Akụnụba unu alaala n’iyi,* egu* ataakwala uwe unu.+ 3 Ọlaedo unu na ọlaọcha unu ataala nchara. Nchara a ha tara ga-egosi ihe ọjọọ unu na-eme. Ọ ga-alakwa unu n’iyi. Ihe unu kpakọtara ga-adịkwa ka ọkụ n’oge ikpeazụ.+ 4 Ndị ọrụ ndị weere unu ihe ubi na-ebe ákwá maka na unu akwụbeghị ha ụgwọ. Jehova* nke ụsụụ ndị agha anụkwala ákwá ha na-ebe ka e nyere ha aka.+ 5 Unu ebiela ndụ okomoko n’ụwa, unu emeekwala ihe na-atọ anụ ahụ́ unu ụtọ. Unu eriela ihe, buokwa ibu ka ehi na-eche ụbọchị a ga-egbu ya.+ 6 Unu amaala onye ezi omume ikpe, gbuokwa ya. Ihe unu anaghị amasị ya.*
7 N’ihi ya, ụmụnna m, nweenụ ndidi ruo n’oge ọnụnọ Onyenwe anyị.+ Onye ọrụ ubi na-echere mkpụrụ dị ezigbo mkpa ọ kụrụ n’ala. Ọ na-enwe ndidi bido mgbe mmiri malitere izo ruo n’ụla mmiri.+ 8 Na-enwekwanụ ndidi otú ahụ.+ Ka obi kaakwa unu, n’ihi na oge ọnụnọ Onyenwe anyị adịla nso.+
9 Ụmụnna m, unu atamula ntamu* maka ihe ibe unu mere, ka a ghara ikpe unu ikpe.+ Onyeikpe ga-abịa n’oge na-adịghị anya.* 10 Ụmụnna m, na-emenụ ka ndị amụma ndị kwuru okwu n’aha Jehova,*+ ndị diri ọtụtụ ahụhụ a tara ha.+ 11 Anyị na-asị na ndị tachiri obi+ na-enwe obi ụtọ.* Unu anụla otú Job si tachie obi,+ hụkwa ihe Jehova* mechara mee.+ Unu ejirikwala ya mata na ihe gbasara onye ọzọ na-emetụ Jehova* n’obi, nakwa na ọ na-eme ebere.+
12 Karịchaa, ụmụnna m, kwụsịnụ ịṅụ iyi. Unu ejila eluigwe ma ọ bụ ụwa ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ ṅụọ iyi. Kama ka “Ee” unu kwuru bụrụ ee, ka “Ee e” unu kwuru bụrụkwa ee e,+ ka Chineke wee ghara ikpe unu ikpe.
13 È nwere onye n’ime unu ihe na-esiri ike? Ya na-ekpe ekpere.+ È nwere onye obi dị ụtọ? Ya bụọ abụ e ji eto Chineke.+ 14 È nwere onye n’ime unu na-arịa ọrịa?* Ya kpọọ ndị okenye+ ọgbakọ, ka ha kpeere ya ekpere, teekwa ya mmanụ*+ n’aha Jehova.* 15 Ekpere e ji okwukwe kpee ga-eme ka ahụ́ dị onye ọrịa ahụ* mma, Jehova* ga-emekwa ka ọ gbakee. Ọ bụrụkwa na o mere mmehie, Chineke ga-agbaghara ya.
16 N’ihi ya, na-ekwupụtaranụ ibe unu mmehie unu,+ na-ekpekwaranụ ibe unu ekpere ka Chineke gwọọ unu. Ekpere onye ezi omume na-ekpesi ike na-akpa ezigbo ike.+ 17 Ịlaịja bụ mmadụ ibe anyị, ma o kpesiri ekpere ike ka mmiri ghara izo. Mmiri ezoghịkwa ruo afọ atọ na ọnwa isii.+ 18 O kpekwara ekpere ọzọ, mmiri ezoo, ala emeekwa nri.+
19 Ụmụnna m, ọ bụrụ na mmadụ emee ka onye ọ bụla n’ime unu hapụ eziokwu, onye ọzọ emeekwa ka ọ lọghachite, 20 maranụ na onye a, nke mere ka ọ hapụ ihe ọjọọ ndị ọ na-eme,+ na-anapụta ya* ka ọ ghara ịnwụ. Chineke ga-agbagharakwa onye ahụ mehierenụ.+
Ma ọ bụ “amamihe kọrọ.”
Ma ọ bụ “Ọ gaghị asị na onye ahụ mejọrọ ihe.”
Gụọ A5.
Na Grik, “na-akpa nganga.”
Gụọ A5.
Ma ọ bụ “nke bụ́ okpueze o kwere nkwa inye.”
Na Grik, “Mgbe ihe ahụ na-agụsi ya ike tụụrụ ime, ya amụọ mmehie.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi unu.”
Na Grik, “obi.”
Ma ọ bụ “Okpukpe.”
Ma ọ bụ “Egbula ọchụ.”
Na Grik, “ebere na-emeri ikpe.”
Na Grik, “gba ọtọ.”
Na Grik, “okwukwe ya nwụrụ anwụ.”
Gụọ A5.
Gụọ A5.
Na Grik, “Ọ nabatara ndị ozi.”
Na Grik, “o nweghị mmụọ.”
Na Grik, “na-ada.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Gụọ A5.
Na Grik, “Mmiri na-atọ ụtọ.”
Na Grik, “mmiri na-elu ilu.”
O nwere ike ịbụ, “na-achọkwa ihe ga-abara naanị onwe unu uru.”
O nwere ike ịbụ, “na ndị na-achọ ihe ga-abara naanị onwe ha uru.”
Ma ọ bụ “na-amị ọtụtụ ezigbo mkpụrụ.”
Na Grik, “na-egbu ọchụ.”
Ma ọ bụ “Ndị na-anaghị erubere Chineke isi.”
Ma ọ bụ “na-edonụ onwe unu n’okpuru Chineke.”
Gụọ A5.
Gụọ A5.
Na Grik, “ereela.”
N’ala Izrel, ụdị egu a na-atakasị ákwà. Ọ na-emecha nwee nku anọ, yizie urukurubụba.
Gụọ A5.
O nwere ike ịbụ, “Ihe unu anaghị amasị Chineke.”
Ma ọ bụ “emela mkpesa.” Na Grik, “asụla ude.”
Na Grik, “guzo n’ọnụ ụzọ.”
Gụọ A5.
Ma ọ bụ “na-enweta ngọzi.”
Gụọ A5.
Gụọ A5.
Ọ ga-abụ na onye a na-ekwu okwu ya ebe a bụ onye na-esighị ike n’okwukwe.
Ọ ga-abụ na ite onye ahụ mmanụ pụtara iji Okwu Chineke nyere ya aka.
Gụọ A5.
O nwere ike ịbụ, “onye ahụ ike gwụrụ.”
Gụọ A5.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ya.”