Matiu
25 “Mgbe ahụ, alaeze eluigwe ga-adị ka ụmụ agbọghọ iri na-amaghị nwoke ndị buuru oriọna+ ha gaa izute nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ.+ 2 Mmadụ ise n’ime ha dị nzuzu,+ ma ise nwere uche.+ 3 N’ihi na ndị nzuzu ahụ buuru oriọna ha, ma ha ejighị mmanụ ọ bụla, 4 ma ndị ahụ nwere uche ji mmanụ ha gbanyere n’ihe ha ji agbanye mmanụ, jirikwa oriọna ha. 5 Mgbe nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ na-egbu oge, ha niile hulatara isi wee malite ihi ụra.+ 6 N’etiti abalị, e tiri mkpu, sị,+ ‘Nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ abịala! Pụtanụ ka unu zute ya.’ 7 Mgbe ahụ, ụmụ agbọghọ ahụ niile na-amaghị nwoke biliri wee dozie oriọna ha.+ 8 Ndị nzuzu ahụ gwara ndị ahụ nwere uche, sị, ‘Nyetụnụ anyị mmanụ unu,+ n’ihi na oriọna anyị agawala ịnyụ.’ 9 Ndị ahụ nwere uche+ zara, sị, ‘Ma eleghị anya, ọ gaghị ezuru anyị na unu. Kama nke ahụ, gakwurunụ ndị na-ere ya zụrụ nke unu.’ 10 Mgbe ha na-aga ịzụta mmanụ, nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ bịarutere, ụmụ agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke, bụ́ ndị dị njikere, sooro ya banye n’oriri alụmdi na nwunye ahụ;+ e wee mechie ụzọ. 11 N’ikpeazụ, ndị fọdụrụ n’ime ụmụ agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke bịakwara, sị, ‘Nna anyị ukwu, nna anyị ukwu, megheere anyị ụzọ!’+ 12 O wee zaa, sị, ‘Ana m agwa unu eziokwu, amaghị m unu.’+
13 “Ya mere, na-echenụ nche,+ n’ihi na unu amaghị ụbọchị ma ọ bụ oge awa ọ ga-abụ.+
14 “N’ihi na ọ dị nnọọ ka mgbe nwoke+ nke na-achọ ije mba ọzọ+ kpọkọtara ndị ohu ya ma nyefee ha ihe ndị o nwere.+ 15 O nyere otu onye talent ise, nye onye nke ọzọ abụọ, nyekwa onye nke ọzọ otu, onye ọ bụla dị ka ike ya hà,+ o wee jee mba ọzọ. 16 Ozugbo ahụ, onye natara talent ise gara jiri ya zụọ ahịa ma rite ise ọzọ n’uru.+ 17 Otú ahụkwa, onye natara abụọ ritere abụọ ọzọ n’uru. 18 Ma onye natara naanị otu gara gwuo ala zoo ego ọlaọcha nke nna ya ukwu.
19 “Mgbe ogologo oge gasịrị,+ nna ukwu nke ndị ohu ahụ lọtara, ya na ha wee mee mpịazi.+ 20 Ya mere, onye natara talent ise bịara weta talent ise ọzọ, sị, ‘Nna m ukwu, i nyere m talent ise; lee, eritere m talent ise ọzọ n’uru.’+ 21 Nna ya ukwu wee sị ya, ‘I mere nke ọma, ezi ohu kwesịrị ntụkwasị obi!+ I kwesịrị ntụkwasị obi+ n’ilekọta ihe ole na ole. M ga-eme gị onye na-elekọta ọtụtụ ihe.+ Soro nna gị ukwu ṅụrịa ọṅụ.’+ 22 E mesịa, onye natara talent abụọ bịara wee sị, ‘Nna m ukwu, i nyere m talent abụọ; lee, eritere m talent abụọ ọzọ n’uru.’+ 23 Nna ya ukwu sịrị ya, ‘I mere nke ọma, ezi ohu kwesịrị ntụkwasị obi! I kwesịrị ntụkwasị obi n’ilekọta ihe ole na ole.+ M ga-eme gị onye na-elekọta ọtụtụ ihe. Soro nna gị ukwu ṅụrịa ọṅụ.’+
24 “N’ikpeazụ, onye natara otu talent bịara+ wee sị, ‘Nna m ukwu, amaara m na ị bụ onye aka ike, nke na-aghọrọ mkpụrụ n’ebe ọ na-akụghị mkpụrụ, onye na-ekpokọtakwa mkpụrụ n’ebe ọ na-afụchaghị mkpụrụ. 25 Ya mere, atụrụ m egwu,+ m wee gaa zoo talent gị n’ala. Wekwara ihe gị.’ 26 Nna ya ukwu zara ya, sị, ‘Ajọ ohu dị umengwụ, ị̀ na-ekwu na ị maara na m na-aghọrọ mkpụrụ n’ebe m na-akụghị mkpụrụ, na-ekpokọtakwa mkpụrụ n’ebe m na-afụchaghị mkpụrụ? 27 Ebe ọ dị otú ahụ, ị gaara etinye ego ọlaọcha m n’aka ndị na-echekwa ego, mgbe m lọtara, m gaara anata ihe m, ya na ọmụrụ nwa ya.+
28 “‘Ya mere, napụtanụ ya talent ahụ nye onye ahụ nke nwere talent iri.+ 29 N’ihi na onye ọ bụla nke nwere, a ga-enyekwu ya, ọ ga-enwekwa ihe n’ụba; ma onye nke na-enweghị, a ga-anapụ ya ọbụna ihe o nwere.+ 30 Tụpụkwanụ ohu a na-abaghị uru ọ bụla n’ọchịchịrị dị n’èzí. N’ebe ahụ ka ọ ga-akwa ákwá ma taa ikikere ezé.’+
31 “Mgbe Nwa nke mmadụ+ ga-abịa n’ebube ya, ya na ndị mmụọ ozi ya niile,+ mgbe ahụ ka ọ ga-anọkwasị n’ocheeze ya dị ebube.+ 32 A ga-emekwa ka mba niile zukọta n’ihu ya,+ ọ ga-ekewapụkwa+ ndị mmadụ n’ebe ibe ha nọ,+ dị nnọọ ka onye ọzụzụ atụrụ si ekewapụ atụrụ n’ebe ewu nọ. 33 Ọ ga-edebe atụrụ n’aka nri ya,+ ma debe ewu n’aka ekpe ya.+
34 “Mgbe ahụ, eze ahụ ga-asị ndị nọ n’aka nri ya, ‘Bịanụ, unu ndị Nna m gọziri agọzi,+ ketanụ+ alaeze+ ahụ a kwadebeere unu malite mgbe a tọrọ ntọala ụwa.+ 35 N’ihi na agụụ gụrụ m, unu wee nye m ihe ka m rie;+ akpịrị kpọrọ m nkụ, unu wee nye m ihe ka m ṅụọ. Abụ m onye ọbịa, unu wee nabata m nke ọma;+ 36 agba m ọtọ,+ unu wee yiwe m uwe. Adara m ọrịa, unu wee lekọta m. Anọ m n’ụlọ mkpọrọ,+ unu wee bịakwute m.’ 37 Mgbe ahụ, ndị ezi omume ga-aza ya, sị, ‘Onyenwe anyị, olee mgbe anyị hụrụ ka agụụ na-agụ gị wee nye gị nri, ma ọ̀ bụ ka akpịrị na-akpọ gị nkụ,+ wee nye gị ihe ka ị ṅụọ?+ 38 Olee mgbe anyị hụrụ gị ka ị bụ onye ọbịa wee nabata gị nke ọma, ma ọ̀ bụ ka ị gba ọtọ, wee yiwe gị uwe? 39 Olee mgbe anyị hụrụ gị ka ị na-arịa ọrịa ma ọ̀ bụ ka ị nọ n’ụlọ mkpọrọ, anyị wee bịakwute gị?’ 40 Eze+ ahụ ga-aza ha, sị, ‘N’ezie, ana m asị unu, Ihe niile unu meere otu n’ime ndị kasị nta+ n’ime ụmụnna m ndị a,+ ọ bụ m ka unu meere ya.’+
41 “Mgbe ahụ, ọ ga-asị ndị nọ n’aka ekpe ya, ‘Sinụ n’ebe m nọ pụọ,+ unu ndị a bụrụ ọnụ, banyenụ n’ọkụ ebighị ebi+ nke a kwadebeere Ekwensu na ndị mmụọ ozi ya.+ 42 N’ihi na agụụ gụrụ m, ma ọ dịghị ihe unu nyere m ka m rie,+ akpịrị kpọkwara m nkụ,+ ma ọ dịghị ihe unu nyere m ka m ṅụọ. 43 Abụ m onye ọbịa, ma unu anabataghị m nke ọma; agba m ọtọ, ma unu eyiweghị m uwe;+ arịara m ọrịa, nọrọkwa n’ụlọ mkpọrọ,+ ma unu elekọtaghị m.’ 44 Mgbe ahụ, ha ga-aza ya, sị, ‘Onyenwe anyị, olee mgbe anyị hụrụ ka agụụ na-agụ gị ma ọ̀ bụ ka akpịrị na-akpọ gị nkụ ma ọ̀ bụ ka ị bụ onye ọbịa ma ọ̀ bụ ka ị gba ọtọ ma ọ̀ bụ ka ị na-arịa ọrịa ma ọ̀ bụ ka ị nọ n’ụlọ mkpọrọ ma ghara ijere gị ozi?’ 45 Mgbe ahụ, ọ ga-aza ha, sị, ‘N’ezie, ana m asị unu, Ebe unu na-emeghịrị ya otu n’ime ndị a kasị nta,+ unu emeghịrị+ m ya.’+ 46 Ndị a ga-anwụ ọnwụ ebighị ebi,+ ma ndị ezi omume ga-enweta ndụ ebighị ebi.”+