Ọpụpụ
26 “Ị ga-eji ákwà ụlọikwuu iri rụọ ụlọikwuu+ ahụ. Ị ga-eji ezigbo eri linin a kpara akpa, eri na-acha anụnụ anụnụ, ajị anụ na-acha pọpụl, na eri na-acha uhie uhie kpaa ha. Ị ga-akpa ndị cherob+ n’ákwà ndị ahụ.+ 2 Nke ọ bụla n’ime ákwà ụlọikwuu ndị ahụ ga-adị kubit* iri abụọ na asatọ n’ogologo na kubit anọ n’obosara. Ákwà ụlọikwuu niile ahụ ga-aha.+ 3 A ga-adụkọta ákwà ụlọikwuu ise ka ha bụrụ otu, dụkọtakwa ákwà ụlọikwuu ise nke ọzọ ka ha bụrụ otu. 4 Ị ga-eji eri na-acha anụnụ anụnụ dụnye oghere n’ọnụ ọnụ ákwà ụlọikwuu ise a dụkọtara ọnụ, ị ga-emekwa otu ihe ahụ n’ọnụ ọnụ ákwà ụlọikwuu nke ọzọ a dụkọtara ọnụ, n’ebe a ga-ejikọta ya na nke ọzọ. 5 Ị ga-adụnye oghere iri ise n’otu ákwà ụlọikwuu, dụnyekwa oghere iri ise n’ọnụ ọnụ ákwà ụlọikwuu nke ọzọ ka ha chee ibe ha ihu n’ebe a ga-ejikọta ha. 6 Ị ga-eji ọlaedo rụọ nko iri ise ma jiri nko ndị ahụ jikọta ákwà ụlọikwuu ndị ahụ, ka ọ bụrụ otu ụlọikwuu.+
7 “Ị ga-ejikwa ajị ewu+ kpaa ákwà a ga-eji kpuchie ụlọikwuu ahụ. Ị ga-akpa ákwà ụlọikwuu iri na otu.+ 8 Nke ọ bụla n’ime ákwà ụlọikwuu ndị ahụ ga-adị kubit iri atọ n’ogologo na kubit anọ n’obosara. Ákwà ụlọikwuu iri na otu niile a ga-aha. 9 Ị ga-adụkọta ákwà ụlọikwuu ise ọnụ, dụkọtakwa ákwà ụlọikwuu isii nke ọzọ ọnụ ma pịajie ákwà ụlọikwuu nke isii abụọ n’ebe ihu ụlọikwuu ahụ. 10 Ị ga-adụnyekwa oghere iri ise n’ọnụ ọnụ ákwà ụlọikwuu ndị ahụ a dụkọtara ọnụ, n’ákwà nke ikpeazụ ya, dụnyekwa oghere iri ise n’ọnụ ọnụ ákwà ụlọikwuu nke ọzọ n’ebe a ga-ejikọta ya na nke ọzọ. 11 Ị ga-eji ọla kọpa rụọ nko iri ise ma konye nko ndị ahụ n’oghere ndị ahụ ka ha jikọta ákwà ụlọikwuu ndị ahụ ọnụ, ha ga-abụkwa otu. 12 Ebe mafọrọ n’ákwà ụlọikwuu ahụ ga-awụdata awụdata. Ọkara ákwà ụlọikwuu ahụ mafọrọ amafọ ga-awụchi azụ ụlọikwuu ahụ. 13 Ákwà mafọrọ n’ogologo ákwà ụlọikwuu ahụ, ya bụ, otu kubit mafọrọ n’otu akụkụ na otu kubit mafọrọ n’akụkụ nke ọzọ, ga-awụdata n’akụkụ abụọ nke ụlọikwuu ahụ, kpuchie ya.
14 “Ị ga-ejikwa akpụkpọ ebule e sijiri ọbara ọbara mee ihe a ga-eji kpuchie ụlọikwuu ahụ, jirikwa akpụkpọ anụ sil mee ihe a ga-ekpukwasị n’elu ya.+
15 “Ị ga-eji osisi akeshịa rụọ frem*+ ndị ị ga-eji rụọ ụlọikwuu ahụ. Frem ndị ahụ ga-akwụcha ọtọ.+ 16 Frem nke ọ bụla ga-adị kubit iri n’ogologo na otu kubit na ọkara n’obosara. 17 Frem nke ọ bụla ga-enwe ụkwụ abụọ nọkọtara ọnụ n’okpuru ya. Otú ahụ ka ị ga-esi rụọ frem niile a ga-eji rụọ ụlọikwuu ahụ. 18 Ị ga-arụ frem iri abụọ ndị ga-adị n’akụkụ ebe ndịda ụlọikwuu ahụ, chee ihu n’ebe ndịda.
19 “Ị ga-eji ọlaọcha rụọ ntọala iri anọ ndị nwere oghere+ a ga-akwụnye frem iri abụọ ahụ na ha. Ntọala abụọ nwere oghere ga-adị n’okpuru otu frem, bụ́ ebe ụkwụ ya abụọ ga-abanye. Ntọala abụọ nwere oghere ga-adịcha n’okpuru frem ndị ọzọ, bụ́ ebe ụkwụ ha abụọ abụọ ga-abanye.+ 20 Ị ga-arụ frem iri abụọ ndị ga-adị n’akụkụ nke ọzọ nke ụlọikwuu ahụ, n’ebe ugwu, 21 jirikwa ọlaọcha rụọ ntọala iri anọ ha ndị nwere oghere. Ntọala abụọ nwere oghere ga-adị n’okpuru otu frem, ntọala abụọ nwere oghere adịrịchaa n’okpuru frem ndị ọzọ. 22 Ị ga-arụ frem isii ga-adị n’ebe azụ ụlọikwuu ahụ, n’ebe ga-eche ihu n’ebe ọdịda anyanwụ.+ 23 Ị ga-arụ frem abụọ ka ha dịrị n’azụ ụlọikwuu ahụ n’isi ngwụcha ya abụọ. 24 Ha ga-agba mkpị si n’ala ruo n’elu, ruo n’ebe ihe nke mbụ dị okirikiri dị. Otú a ka a ga-esi rụọ ha abụọ, ha ga-adịkwa n’isi ngwụcha abụọ nke ụlọikwuu ahụ. 25 A ga-enwe frem asatọ nakwa ntọala iri na isii ha nwere oghere bụ́ ndị e ji ọlaọcha rụọ. Ntọala abụọ nwere oghere ga-adị n’okpuru otu frem, ntọala abụọ nwere oghere adịrịchaa n’okpuru frem ndị ọzọ.
26 “Ị ga-eji osisi akeshịa rụọ okporo osisi. Ị ga-arụ okporo osisi ise maka frem ndị ga-adị n’otu akụkụ ụlọikwuu ahụ,+ 27 rụọkwa okporo osisi ise maka frem ndị ga-adị n’akụkụ nke ọzọ nke ụlọikwuu ahụ nakwa okporo osisi ise maka frem ndị ga-adị n’akụkụ ebe ọdịda anyanwụ ụlọikwuu ahụ, n’ebe azụ ya. 28 Okporo osisi nke ga-adị n’etiti frem ndị ahụ ga-esi n’otu isi ụlọikwuu ahụ ruo n’isi ya nke ọzọ.
29 “Ị ga-eji ọlaedo machie frem ndị ahụ,+ ị ga-ejikwa ọlaedo rụọ ihe ndị dị okirikiri ga-ejide okporo osisi ndị ahụ, jirikwa ọlaedo machie okporo osisi ndị ahụ. 30 Ị ga-ama ụlọikwuu ahụ ka ọ dị otú ahụ e gosiri gị ya n’ugwu.+
31 “Ị ga-eji eri na-acha anụnụ anụnụ, ajị anụ na-acha pọpụl, eri na-acha uhie uhie, na ezigbo eri linin a kpara akpa kpaa ákwà mgbochi.+ A ga-akpa ndị cherob na ya. 32 Ị ga-ekonye ya n’ogidi anọ e ji osisi akeshịa rụọ bụ́ ndị e ji ọlaedo machie. A ga-eji ọlaedo rụọ ihe e ji ekonye ha. A ga-akwụnye ogidi ndị ahụ na ntọala anọ nwere oghere ndị e ji ọlaọcha rụọ. 33 Ị ga-ekonye ákwà mgbochi ahụ n’okpuru nko ndị ahụ ma bubata igbe ọgbụgba ndụ*+ ahụ n’ime ebe ahụ e ji ákwà mgbochi kochie. Ákwà mgbochi ahụ ga-ekebiri unu Ebe Nsọ+ na Ebe Kacha Nsọ.+ 34 Ị ga-eji okwuchi ahụ kwuchie igbe ọgbụgba ndụ* ahụ ga-adị n’Ebe Kacha Nsọ.
35 “Ị ga-adọsa tebụl ahụ tupu ebe ahụ e ji ákwà mgbochi gebichie, dọsakwa ihe ahụ e ji adọsa ọkụ*+ n’akụkụ ebe ndịda ụlọikwuu ahụ ka o chee tebụl ahụ ihu. Ma ị ga-adọsa tebụl ahụ n’akụkụ ebe ugwu. 36 Ị ga-eji eri na-acha anụnụ anụnụ, ajị anụ na-acha pọpụl, eri na-acha uhie uhie, na ezigbo eri linin a kpara akpa kpaa ákwà ngebichi* ga-adị n’ọnụ ụzọ e si abata n’ụlọikwuu ahụ.+ 37 Ị ga-eji osisi akeshịa rụọ ogidi ise maka ákwà ngebichi* ahụ ma jiri ọlaedo machie ha. Ị ga-eji ọlaedo rụọ ihe a ga-eji ekonye ihe na ha, jirikwa ọla kọpa kpụọ ntọala ise nwere oghere a ga-akwụnye ogidi ndị ahụ na ha.