Ozi Ọma Luk Dere
1 Ọtụtụ ndị edeela ihe ndị mere eme anyị kweere na ha bụ eziokwu.+ 2 Ndị ọzọ, ndị ji anya ha hụ ihe ndị a+ ma kwusaa ozi Chineke,+ gwara anyị ha. 3 N’ihi ya, Tiofilọs+ onye ukwu, enyochaala m ihe ndị a niile, kpebiekwa idetara gị ha n’usoro ha si mee, 4 ka obi wee sie gị ezigbo ike na ihe niile a kụziiri gị bụ eziokwu.+
5 N’oge Herọd*+ bụ eze Judia, e nwere otu onye nchụàjà aha ya bụ Zekaraya nke so n’òtù ndị nchụàjà a na-akpọ Abaịja.+ Nwunye ya si n’ezinụlọ Erọn. Aha ya bụ Elizabet. 6 Ha abụọ bụ ndị ezi omume n’anya Chineke. Ha na-edebe iwu Jehova* na ntụziaka ya niile n’enweghị ntụpọ. 7 Ma ha amụtaghị nwa, n’ihi na Elizabet bụ nwaanyị aga. Ha abụọ emeekwala agadi.
8 Ka Zekaraya onye nchụàjà nọ na-arụ ọrụ ya n’oge ndị òtù ya ketara ije ozi+ n’ihu Chineke, 9 dị ka ndị nchụàjà na-eme, o ruuru ya ịmụnye insens* ọkụ+ mgbe ọ banyere n’ụlọ nsọ Jehova.*+ 10 Ìgwè mmadụ nọkwa na-ekpe ekpere n’èzí n’oge e ji amụnye insens* ọkụ. 11 Mmụọ ozi Jehova* pụtara n’ihu ya guzoro n’aka nri ebe ịchụàjà insens.* 12 Ma ihe Zekaraya hụrụ mapụrụ ya obi, ezigbo ụjọ ejide ya. 13 Ma, mmụọ ozi ahụ sịrị ya: “Zekaraya, atụla egwu, n’ihi na a nụla arịrịọ ị na-arịọ. Elizabet nwunye gị ga-amụtara gị nwa nwoke, ị ga-agụkwa ya Jọn.+ 14 Ị ga-enwekwa ọṅụ na ezigbo obi ụtọ. Ọtụtụ ndị ga-aṅụrịkwa ọṅụ n’ihi na a mụrụ ya.+ 15 N’ihi na ọ ga-abụ onye ukwu n’anya Jehova.*+ Ma, ọ gaghị aṅụ mmanya ma ọ bụ ihe ọ bụla na-aba n’anya.+ Chineke ga-enyekwa ya mmụọ nsọ malite mgbe ọ ka nọ n’afọ nne ya.+ 16 Ọ ga-eme ka ọtụtụ ndị Izrel laghachikwuru Jehova* bụ́ Chineke ha.+ 17 Chineke ga-emekwa ka nwa gị jiri ụdị obi na ike Ịlaịja nwere butere ya ụzọ,+ iji mee ka obi ndị nna dịrị ka nke ụmụ,*+ meekwa ka ndị na-enupụ isi kpawa àgwà ka ndị ma ihe na ndị ezi omume, iji kwadebere Jehova* otu ndị.”+
18 Zekaraya wee gwa mmụọ ozi ahụ, sị: “Olee otú m ga-esi mara na ihe a ga-eme? N’ihi na akaala m nká, nwunye m emeekwala agadi.” 19 Mmụọ ozi ahụ wee sị ya: “Abụ m Gebriel,+ onye na-eguzo n’ihu Chineke.+ E zitere m ka m gwa gị okwu ma zie gị ozi ọma a. 20 Ma, ị ga-ada ogbi, ị gaghịkwa ekwu okwu ruo ụbọchị ihe ndị a ga-eme, n’ihi na i kweghị ihe m kwuru nke ga-emezu mgbe oge ya ruru.” 21 Ka nke a na-eme, mmadụ niile nọ na-eche Zekaraya, o jukwara ha anya na ọ nọrọ ọdụ n’ụlọ nsọ ahụ. 22 Mgbe ọ pụtara, o nweghị ike ịgwa ha okwu. O jizi aka na-agwa ha okwu n’ihi na ọ daala ogbi. Mgbe ha hụrụ ihe a, ha ghọtara na ọ hụrụ ihe dị ebube* n’ụlọ nsọ ahụ. 23 Ma, mgbe ụbọchị o ji eje ozi dị nsọ* zuru, ọ lara n’ụlọ ya.
24 Ka ụbọchị ole na ole gara, Elizabet nwunye ya bịara dịrị ime, wee nọrọ n’ụlọ ọnwa ise n’apụtaghị apụta. Ọ sịrị: 25 “Nke a bụ otú Jehova* si mesoo m. O cheela ihu ebe m nọ iji wepụ nkọcha ndị mmadụ na-akọcha m.”+
26 Mgbe ime ya ruru ọnwa isii, Chineke zipụrụ mmụọ ozi Gebriel+ ka ọ gaa Nazaret nke dị na Galili, 27 gakwuru nwa agbọghọ na-amaghị nwoke+ nke otu nwoke aha ya bụ Josef kwere nkwa ịlụ. Nwoke a si n’ezinụlọ Devid. Aha nwa agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke bụ Meri.+ 28 Mgbe mmụọ ozi ahụ ruru, ọ sịrị ya: “Ndeewo, onye e meere amara dị ukwuu. Jehova* nọnyeere gị.” 29 Ma ihe o kwuru gbara ya gharịị, ya ana-achọ ịghọta ihe mere o ji si otú ahụ kelee ya. 30 N’ihi ya, mmụọ ozi ahụ sịrị ya: “Meri, atụla egwu, n’ihi na Chineke emeerela gị amara. 31 Ị ga-adị ime, mụọ nwa nwoke.+ Ị ga-agụkwa ya Jizọs.+ 32 Onye a ga-abụ onye ukwu,+ a ga-akpọkwa ya Ọkpara nke Onye Kacha Elu.+ Jehova* bụ́ Chineke ga-enyekwa ya ocheeze nna ya bụ́ Devid.+ 33 Ọ ga-achị ezinụlọ Jekọb ruo mgbe ebighị ebi, Alaeze ya agaghịkwa agwụ agwụ.”+
34 Ma Meri sịrị mmụọ ozi ahụ: “Olee otú ihe a ga-esi mee, ebe ọ bụ na mụ na nwoke ọ bụla enwetụbeghị mmekọahụ?”+ 35 Mmụọ ozi ahụ asị ya: “Mmụọ nsọ ga-arụ ọrụ n’ime gị,+ ike nke Onye Kacha Elu ga-ekpuchikwa gị. N’ihi ya kwa, a ga-akpọ onye ahụ a ga-amụ onye nsọ,+ Ọkpara Chineke.+ 36 Elizabet onye ikwu gị, onye a sị na ọ bụ nwaanyị aga, adịla ime nwa nwoke n’agadi ya. Nke a bụkwa ọnwa isii ya. 37 N’ihi na o nweghị ihe Chineke kwuru nke ọ na-agaghị emeli.”+ 38 Meri wee sị: “Abụ m ohu Jehova.* Ka ihe i kwuru meere m.” Mmụọ ozi ahụ wee si n’ebe ọ nọ pụọ.
39 N’oge ahụ, Meri gawara ngwa ngwa n’ala bụ́ ugwu ugwu, n’otu obodo dị na Juda. 40 Ọ banyere n’ụlọ Zekaraya ma kelee Elizabet. 41 Ka Elizabet nụrụ ekele Meri, nwa o bu n’afọ maliri elu, Elizabet jupụtakwara na mmụọ nsọ 42 wee tie mkpu, sị: “Onye a gọziri agọzi ka ị bụ n’ime ụmụ nwaanyị niile. Ihe a gọziri agọzi ka mkpụrụ nke afọ gị bụkwa! 43 Ònye ka m bụ na nne nke Onyenwe m bịara ileta m? 44 N’ihi na ozugbo m nụrụ ekele gị, obi tọrọ nwa m bu n’afọ ụtọ, ya amalie elu. 45 Nwaanyị nke kweere na-enwekwa obi ụtọ n’ihi na ihe ndị ahụ Jehova* gwara ya ga-emezucha.”
46 Meri wee sị: “Mkpụrụ obi m* na-eto Jehova,*+ 47 agaghịkwa m akwụsị ịṅụrị ọṅụ n’ime Chineke bụ́ Onye Nzọpụta m,+ 48 n’ihi na o chetala ohu ya nwaanyị, onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya.+ N’ihi na si ugbu a gawa, ọgbọ niile ga na-asị na m bụ onye a gọziri agọzi,+ 49 n’ihi na Chineke, Onye dị ike, emeerela m ọtụtụ ihe dị ebube, aha ya dịkwa nsọ.+ 50 Sikwa n’ọgbọ ruo n’ọgbọ, ọ na-emere ndị na-atụ egwu ya ebere.+ 51 O ji aka ya dị ike mee ihe a niile. Ọ chụsasịala ndị mpako.+ 52 Ọ kwatuola ndị na-achị achị,+ buliekwa ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha elu.+ 53 O jirila ihe ọma nyejuo ndị agụụ na-agụ afọ,+ meekwa ka ndị nwere akụ̀ gbara aka laa. 54 Ọ gbatarala Izrel bụ́ ohu ya ọsọ enyemaka, si otú a gosi na o chetara nkwa o kwere.+ 55 O kwere nkwa na ya ga-emere Ebreham na ụmụ* ya ebere ruo mgbe ebighị ebi,+ ọ bụkwa ihe a ka ọ gwara nna nna anyị hà.” 56 Meri nọnyeere ya ruo ihe dị ka ọnwa atọ, ya alaghachi n’ụlọ ya.
57 Mgbe o ruru ka Elizabet mụọ nwa, ọ mụrụ nwa nwoke. 58 Ndị agbata obi ya na ndị ikwu ya nụkwara na Jehova* emeerela ya ebere na-enweghị atụ, ha esoro ya na-aṅụrị ọṅụ.+ 59 N’ụbọchị nke asatọ, ha bịara ibi nwatakịrị ahụ úgwù,+ ha chọkwara ịgụ ya aha nna ya, bụ́ Zekaraya. 60 Ma nne ya sịrị: “Mba, a ga-agụ ya Jọn.” 61 Mgbe o kwuru ihe a, ha sịrị ya: “E nweghị onye ikwu gị na-aza aha a.” 62 Ha wee jiri aka jụọ nna ya aha ọ chọrọ ka a gụọ ya. 63 Ya asị ka e nye ya ihe e ji ede ihe,* ya edee, “Jọn bụ aha ya.”+ O wee ju ha niile anya. 64 Ọnụ ya meghere ozugbo, ire ya emegharịwakwa, ya amalite ikwu okwu,+ na-eto Chineke. 65 Egwu wee jide ndị agbata obi ha niile. A malitekwara ịkọsa ihe a niile n’ala Judia niile. 66 Ndị niile nụrụ ya wee buru ya n’obi, na-asị: “Gịnị ka nwatakịrị a ga-aghọ?” N’ihi na Jehova* nọnyeere ya.*
67 Chineke nyere Zekaraya bụ́ nna nwa ahụ mmụọ nsọ, ya ebuo amụma, sị: 68 “Ka e too Jehova* bụ́ Chineke Izrel,+ n’ihi na o chetala ndị ya wee napụta ha.+ 69 O meekwala ka e nwee onye nzọpụta dị ike*+ n’ụlọ ohu ya Devid,+ 70 dị ka o si n’ọnụ ndị amụma ya dị nsọ kwuo n’oge ochie.+ 71 O kwuru banyere ịzọpụta anyị n’aka ndị iro anyị nakwa n’aka ndị niile kpọrọ anyị asị.+ 72 Ọ ga-emezu nkwa o kwere nna nna anyị hà, meekwara ha ebere. Ọ ga-echetakwa ọgbụgba ndụ ya dị nsọ,+ 73 nke bụ́ iyi ọ ṅụụrụ Ebreham nna nna anyị.+ 74 Mgbe Chineke napụtachara anyị n’aka ndị iro anyị, ọ ga-eme ka anyị na-efe ya n’atụghị egwu, 75 ka anyị jisie ya aka ike, bụrụkwa ndị ezi omume n’anya ya n’oge niile anyị dị ndụ. 76 Ma gịnwa, bụ́ nwatakịrị, a ga-akpọ gị onye amụma nke Onye Kacha Elu, n’ihi na ị ga-ebutere Jehova* ụzọ iji kwadebe ụzọ ya,+ 77 iji mee ka ndị ya mata na otú Chineke ga-esi zọpụta ha bụ ịgbaghara mmehie ha+ 78 n’ihi obi ebere ya. N’ihi ebere a, Chineke ga-eme ka anyị hụ ìhè dị ka mgbe chi bọrọ, 79 ka ìhè wee nwuoro ndị nọ ọdụ n’ọchịchịrị nakwa ndị nọ n’ebe ọnwụ dị ka ọchịchịrị nke kpuchiri ha.+ Ìhè ahụ ga-emekwa ka anyị mata ihe anyị ga-eme iji nwee udo.”
80 Nwatakịrị ahụ wee too, na-eme nke ọma.* Ọ nọgidekwara n’ọzara ruo ụbọchị ọ pụtara n’ihu ọha gosi Izrel onwe ya.