Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ọnụ Ọgụgụ 29
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Ọnụ Ọgụgụ

      • Otú a ga-esi na-achụ àjà dị iche iche (1-40)

        • Ụbọchị a ga-afụ opi (1-6)

        • Ụbọchị Ikpuchi Mmehie (7-11)

        • Ememme Ụlọ Ndò (12-38)

Ọnụ Ọgụgụ 29:1

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 23:24, 25
  • +Ọg 10:2; Ọm 81:3

Ọnụ Ọgụgụ 29:2

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”

Ọnụ Ọgụgụ 29:6

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 28:11-13
  • +Ọg 28:3, 5
  • +Ọg 28:6, 7

Ọnụ Ọgụgụ 29:7

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

  • *

    “Mmadụ imekpa onwe ya ahụ́” pụtara na onye ahụ agaghị emere onwe ya ihe ndị o kwesịrị imere onwe ya. Ibu ọnụ so na ya.

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 16:29
  • +Le 23:27-31

Ọnụ Ọgụgụ 29:8

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 1:3; 22:22; Di 15:21; 17:1

Ọnụ Ọgụgụ 29:11

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 16:3

Ọnụ Ọgụgụ 29:12

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 23:16; Le 23:34-36; Di 16:13-15; Neh 8:14-18

Ọnụ Ọgụgụ 29:13

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ezr 3:4
  • +Le 22:22; Di 17:1

Ọnụ Ọgụgụ 29:16

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 28:3-8

Ọnụ Ọgụgụ 29:17

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 22:22; Di 17:1

Ọnụ Ọgụgụ 29:19

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 28:3-8

Ọnụ Ọgụgụ 29:20

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 22:22; Di 17:1

Ọnụ Ọgụgụ 29:22

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 28:3-8

Ọnụ Ọgụgụ 29:23

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 22:22; Di 17:1

Ọnụ Ọgụgụ 29:25

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 28:3-8

Ọnụ Ọgụgụ 29:26

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 15:21; 17:1

Ọnụ Ọgụgụ 29:28

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 28:3-8

Ọnụ Ọgụgụ 29:29

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 22:22; Di 17:1

Ọnụ Ọgụgụ 29:31

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 28:3-8

Ọnụ Ọgụgụ 29:32

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 22:22; Di 17:1

Ọnụ Ọgụgụ 29:34

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 28:3-8

Ọnụ Ọgụgụ 29:35

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 23:36, 39

Ọnụ Ọgụgụ 29:36

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 22:22; Di 17:1

Ọnụ Ọgụgụ 29:38

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 28:3-8

Ọnụ Ọgụgụ 29:39

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 23:2; Di 16:16
  • +Di 12:5, 6
  • +Le 7:16; 22:21
  • +Le 1:3
  • +Le 2:1
  • +Ọg 15:5
  • +Le 3:1

Baịbụl Ndị Ọzọ ọ gbara

Pịa amaokwu nke ọ bụla ka o bupụtara gị amaokwu Baịbụl ndị ọzọ yiri ya.

Amaokwu ndị Ọzọ

Ọnụ Ọgụ. 29:1Le 23:24, 25
Ọnụ Ọgụ. 29:1Ọg 10:2; Ọm 81:3
Ọnụ Ọgụ. 29:6Ọg 28:11-13
Ọnụ Ọgụ. 29:6Ọg 28:3, 5
Ọnụ Ọgụ. 29:6Ọg 28:6, 7
Ọnụ Ọgụ. 29:7Le 16:29
Ọnụ Ọgụ. 29:7Le 23:27-31
Ọnụ Ọgụ. 29:8Le 1:3; 22:22; Di 15:21; 17:1
Ọnụ Ọgụ. 29:11Le 16:3
Ọnụ Ọgụ. 29:12Ọp 23:16; Le 23:34-36; Di 16:13-15; Neh 8:14-18
Ọnụ Ọgụ. 29:13Ezr 3:4
Ọnụ Ọgụ. 29:13Le 22:22; Di 17:1
Ọnụ Ọgụ. 29:16Ọg 28:3-8
Ọnụ Ọgụ. 29:17Le 22:22; Di 17:1
Ọnụ Ọgụ. 29:19Ọg 28:3-8
Ọnụ Ọgụ. 29:20Le 22:22; Di 17:1
Ọnụ Ọgụ. 29:22Ọg 28:3-8
Ọnụ Ọgụ. 29:23Le 22:22; Di 17:1
Ọnụ Ọgụ. 29:25Ọg 28:3-8
Ọnụ Ọgụ. 29:26Di 15:21; 17:1
Ọnụ Ọgụ. 29:28Ọg 28:3-8
Ọnụ Ọgụ. 29:29Le 22:22; Di 17:1
Ọnụ Ọgụ. 29:31Ọg 28:3-8
Ọnụ Ọgụ. 29:32Le 22:22; Di 17:1
Ọnụ Ọgụ. 29:34Ọg 28:3-8
Ọnụ Ọgụ. 29:35Le 23:36, 39
Ọnụ Ọgụ. 29:36Le 22:22; Di 17:1
Ọnụ Ọgụ. 29:38Ọg 28:3-8
Ọnụ Ọgụ. 29:39Le 23:2; Di 16:16
Ọnụ Ọgụ. 29:39Di 12:5, 6
Ọnụ Ọgụ. 29:39Le 7:16; 22:21
Ọnụ Ọgụ. 29:39Le 1:3
Ọnụ Ọgụ. 29:39Le 2:1
Ọnụ Ọgụ. 29:39Ọg 15:5
Ọnụ Ọgụ. 29:39Le 3:1
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Gụọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ (bi12)
  • 1
  • 2
  • 3
  • 4
  • 5
  • 6
  • 7
  • 8
  • 9
  • 10
  • 11
  • 12
  • 13
  • 14
  • 15
  • 16
  • 17
  • 18
  • 19
  • 20
  • 21
  • 22
  • 23
  • 24
  • 25
  • 26
  • 27
  • 28
  • 29
  • 30
  • 31
  • 32
  • 33
  • 34
  • 35
  • 36
  • 37
  • 38
  • 39
  • 40
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Ọnụ Ọgụgụ 29:1-40

Ọnụ Ọgụgụ

29 “‘N’abalị mbụ n’ọnwa nke asaa, unu ga-enwe mgbakọ dị nsọ. Unu arụla ọrụ ọ bụla siri ike.+ Ọ bụ ụbọchị unu ga-afụ opi.+ 2 Unu ga-eji otu oké ehi, otu ebule, na ụmụ ebule asaa ndị gbara otu afọ otu afọ chụọrọ Jehova àjà a na-esu ọkụ, ka ọ bụrụ àjà na-esi ísì ọma.* Ha niile ga-abụ ndị ahụ́ dị mma. 3 Unu ga-achụkọta ha na àjà ọka ha, ya bụ, ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ. Ụzọ atọ n’ụzọ iri nke otu efa ga-abụ maka oké ehi ahụ, ụzọ abụọ n’ụzọ iri abụrụ maka ebule ahụ, 4 otu ụzọ n’ụzọ iri abụrụ maka nwa ebule nke ọ bụla n’ime ụmụ ebule asaa ahụ. 5 Unu ga-achụkwa otu nwa mkpi n’àjà ka ọ bụrụ àjà mmehie a ga-eji kpuchiere unu mmehie. 6 Unu ga-achụ ihe ndị a n’àjà, ha na àjà a na-esu ọkụ a na-achụ kwa ọnwa na àjà ọka ya na ya na-agakọ,+ chụọkwa àjà a na-esu ọkụ mgbe niile na àjà ọka ya na ya na-agakọ.+ Unu ga-achụkọta ha na àjà mmanya ha+ otú e nyere iwu ka e si na-achụ ha, ka ha bụrụ àjà na-esi ísì ọma,* àjà a na-esu ọkụ a na-achụrụ Jehova.

7 “‘N’abalị iri n’ọnwa asaa ahụ, unu ga-enwe mgbakọ dị nsọ.+ Unu ga-emekpa onwe* unu ahụ́.* Unu arụla ọrụ ọ bụla.+ 8 Unu ga-eji otu oké ehi, otu ebule, na ụmụ ebule asaa ndị gbara otu afọ otu afọ chụọrọ Jehova àjà a na-esu ọkụ, ka ọ bụrụ àjà na-esi ísì ọma.* Ha niile ga-abụ ndị ahụ́ dị mma.+ 9 Unu ga-achụkwa ha na àjà ọka ha, ya bụ, ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ. Ụzọ atọ n’ụzọ iri ga-abụ maka oké ehi ahụ, ụzọ abụọ n’ụzọ iri abụrụ maka ebule ahụ, 10 otu ụzọ n’ụzọ iri abụrụ maka nwa ebule nke ọ bụla n’ime ụmụ ebule asaa ahụ. 11 Unu ga-achụkwa otu nwa ewu n’àjà ka ọ bụrụ àjà mmehie, ya na àjà mmehie a ga-eji kpuchiere unu mmehie,+ chụọkwa àjà a na-esu ọkụ a na-achụ mgbe niile na àjà ọka ya na ya na-agakọ nakwa àjà mmanya ha na ha na-agakọ.

12 “‘N’abalị iri na ise n’ọnwa nke asaa, unu ga-enwe mgbakọ dị nsọ. Unu arụla ọrụ ọ bụla siri ike. Unu ga-emekwara Jehova ememme ruo ụbọchị asaa.+ 13 Unu ga-eji oké ehi iri na atọ, ebule abụọ, na ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ otu afọ chụọrọ Jehova àjà a na-esu ọkụ,+ ka ọ bụrụ àjà na-esi ísì ọma.* Ha niile ga-abụ ndị ahụ́ dị mma.+ 14 Unu ga-achụkwa ha na àjà ọka ha, ya bụ, ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ. Ụzọ atọ n’ụzọ iri ga-abụ maka oké ehi nke ọ bụla n’ime oké ehi iri na atọ ahụ, ụzọ abụọ n’ụzọ iri abụrụ maka nke ọ bụla n’ime ebule abụọ ahụ, 15 otu ụzọ n’ụzọ iri abụrụ maka nwa ebule nke ọ bụla n’ime ụmụ ebule iri na anọ ahụ. 16 Unu ga-achụkwa otu nwa ewu n’àjà ka ọ bụrụ àjà mmehie, ya na àjà a na-esu ọkụ a na-achụ mgbe niile na àjà ọka ya na ya na-agakọ, nakwa àjà mmanya ya na ya na-agakọ.+

17 “‘N’ụbọchị nke abụọ, unu ga-eji oké ehi iri na abụọ, ebule abụọ, ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ otu afọ, chụọ àjà. Ha niile ga-abụ ndị ahụ́ dị mma.+ 18 Ọ bụ ole oké ehi, ebule, na ụmụ ebule ndị ahụ dị ka unu ga-eji mara otú àjà ọka na àjà mmanya unu ga-achụ ga-aha. Unu ga-achụ ha otú e nyere n’iwu ka e si na-achụ ha. 19 Unu ga-achụkwa otu nwa ewu n’àjà ka ọ bụrụ àjà mmehie, ya na àjà a na-esu ọkụ a na-achụ mgbe niile na àjà ọka ya na ya na-agakọ, nakwa àjà mmanya ha na ha na-agakọ.+

20 “‘N’ụbọchị nke atọ, unu ga-eji oké ehi iri na otu, ebule abụọ, ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ otu afọ, chụọ àjà. Ha niile ga-abụ ndị ahụ́ dị mma.+ 21 Ọ bụ ole oké ehi, ebule, na ụmụ ebule ndị ahụ dị ka unu ga-eji mara otú àjà ọka na àjà mmanya unu ga-achụ ga-aha. Unu ga-achụ ha otú e nyere n’iwu ka e si na-achụ ha. 22 Unu ga-achụkwa otu ewu n’àjà ka ọ bụrụ àjà mmehie, ya na àjà a na-esu ọkụ a na-achụ mgbe niile na àjà ọka ya na ya na-agakọ, nakwa àjà mmanya ya na ya na-agakọ.+

23 “‘N’ụbọchị nke anọ, unu ga-eji oké ehi iri, ebule abụọ, ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ otu afọ, chụọ àjà. Ha niile ga-abụ ndị ahụ́ dị mma.+ 24 Ọ bụ ole oké ehi, ebule, na ụmụ ebule ndị ahụ dị ka unu ga-eji mara otú àjà ọka na àjà mmanya unu ga-achụ ga-aha. Unu ga-achụ ha otú e nyere n’iwu ka e si na-achụ ha. 25 Unu ga-achụkwa otu nwa ewu n’àjà ka ọ bụrụ àjà mmehie, ya na àjà a na-esu ọkụ a na-achụ mgbe niile na àjà ọka ya na ya na-agakọ, nakwa àjà mmanya ya na ya na-agakọ.+

26 “‘N’ụbọchị nke ise, unu ga-eji oké ehi itoolu, ebule abụọ, ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ otu afọ, chụọ àjà. Ha niile ga-abụ ndị ahụ́ dị mma.+ 27 Ọ bụ ole oké ehi, ebule, na ụmụ ebule ndị ahụ dị ka unu ga-eji mara otú àjà ọka na àjà mmanya unu ga-achụ ga-aha. Unu ga-achụ ha otú e nyere n’iwu ka e si na-achụ ha. 28 Unu ga-achụkwa otu ewu n’àjà ka ọ bụrụ àjà mmehie, ya na àjà a na-esu ọkụ a na-achụ mgbe niile na àjà ọka ya na ya na-agakọ, nakwa àjà mmanya ya na ya na-agakọ.+

29 “‘N’ụbọchị nke isii, unu ga-eji oké ehi asatọ, ebule abụọ, ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ otu afọ, chụọ àjà. Ha niile ga-abụ ndị ahụ́ dị mma.+ 30 Ọ bụ ole oké ehi, ebule, na ụmụ ebule ndị ahụ dị ka unu ga-eji mara otú àjà ọka na àjà mmanya unu ga-achụ ga-aha. Unu ga-achụ ha otú e nyere n’iwu ka e si na-achụ ha. 31 Unu ga-achụkwa otu ewu n’àjà ka ọ bụrụ àjà mmehie, ya na àjà a na-esu ọkụ a na-achụ mgbe niile na àjà ọka ya na ya na-agakọ, nakwa àjà mmanya ha na ya na-agakọ.+

32 “‘N’ụbọchị nke asaa, unu ga-eji oké ehi asaa, ebule abụọ, ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ otu afọ, chụọ àjà. Ha niile ga-abụ ndị ahụ́ dị mma.+ 33 Ọ bụ ole oké ehi, ebule, na ụmụ ebule ndị ahụ dị ka unu ga-eji mara otú àjà ọka na àjà mmanya unu ga-achụ ga-aha. Unu ga-achụ ha otú e nyere n’iwu ka e si na-achụ ha. 34 Unu ga-achụkwa otu ewu n’àjà ka ọ bụrụ àjà mmehie, ya na àjà a na-esu ọkụ a na-achụ mgbe niile na àjà ọka ya na ya na-agakọ, nakwa àjà mmanya ya na ya na-agakọ.+

35 “‘N’ụbọchị nke asatọ, unu ga-enwe nzukọ pụrụ iche. Unu arụla ọrụ ọ bụla siri ike.+ 36 Unu ga-eji otu oké ehi, otu ebule, na ụmụ ebule asaa ndị gbara otu afọ otu afọ chụọrọ Jehova àjà a na-esu ọkụ, ka ọ bụrụ àjà na-esi ísì ọma.* Ha niile ga-abụ ndị ahụ́ dị mma.+ 37 Ọ bụ ole oké ehi, ebule, na ụmụ ebule ndị ahụ dị ka unu ga-eji mara otú àjà ọka na àjà mmanya unu ga-achụ ga-aha. Unu ga-achụ ha otú e nyere n’iwu ka e si na-achụ ha. 38 Unu ga-achụkwa otu ewu n’àjà ka ọ bụrụ àjà mmehie, ya na àjà a na-esu ọkụ a na-achụ mgbe niile na àjà ọka ya na ya na-agakọ, nakwa àjà mmanya ya na ya na-agakọ.+

39 “‘Unu ga na-achụrụ Jehova ihe ndị a n’àjà mgbe unu na-eme ememme unu na-eme n’oge dị iche iche,+ ha na onyinye ndị unu kwere ná nkwa+ na onyinye ndị si unu n’obi,+ ka ha bụrụ àjà unu a na-esu ọkụ+ na àjà ọka unu+ na àjà mmanya unu+ na àjà udo unu.’”+ 40 Mosis gwara ndị Izrel ihe niile Jehova nyere ya n’iwu.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya