Jeremaya
38 Shefataya nwa Matan na Gedalaya nwa Pash-họ na Jukal+ nwa Shelemaya na Pash-họ nwa Malkaịja+ wee nụ ihe Jeremaya nọ na-agwa mmadụ niile,+ na-asị: 2 “Nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘Onye ọ bụla nke nọgidere n’obodo a, mma agha,+ ụnwụ+ na ọrịa na-efe efe+ ga-egbu ya. Ma onye ọ bụla nke gakwuuru ndị Kaldia ga-anọ ndụ, mkpụrụ obi ya ga-abụrụ ya ihe nkwata, ọ ga-adịkwa ndụ.’+ 3 Nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘A ghaghị inyefe obodo a n’aka ndị agha eze Babịlọn, ọ ga-ewegharakwa ya.’”+
4 Ndị isi wee gwa eze, sị: “Biko, ka e gbuo nwoke a,+ n’ihi na ọ na-akụda ndị agha fọdụrụ n’obodo a aka, tinyere mmadụ niile, site n’ịgwa ha ihe ndị a ọ na-agwa ha.+ N’ihi na nwoke a achọghị ka ndị a nwee udo kama ọ bụ ka ọdachi dakwasị ha.” 5 Eze Zedekaya wee sị: “Lee! Ọ nọ n’aka unu. N’ihi na ọ dịghị ihe ọ bụla eze pụrụ igbochi unu ime.”+
6 Ha wee kpọrọ Jeremaya tụba ya n’olulu Malkaịja+ nwa eze, nke dị n’Ogige Ndị Nche.+ Ha wee were ụdọ seda Jeremaya n’olulu ahụ. Mmiri adịghị n’olulu ahụ, kama ọ bụ apịtị dị ya; Jeremaya wee mikpuo n’apịtị ahụ.+
7 Ibed-melek nwoke Itiopia,+ bụ́ ọnaozi nke bi n’ụlọ eze, wee nụ na ha atụbawo Jeremaya n’olulu; eze nọ ọdụ n’Ọnụ Ụzọ Ámá Benjamin.+ 8 Ibed-melek wee si n’ụlọ eze pụta gaa gwa eze, sị: 9 “Onyenwe m eze, ọ bụ ihe ọjọọ ka ndị a mere n’ihe niile ha mere Jeremaya onye amụma, bụ́ onye ha tụbara n’olulu, ka ụnwụ+ wee gbuo ya n’ebe ahụ ọ nọ.+ N’ihi na nri adịkwaghị n’obodo a.”
10 Eze wee nye Ibed-melek onye Itiopia iwu, sị: “Si ebe a kpọrọ mmadụ iri atọ, gaa kpọpụta Jeremaya onye amụma n’olulu ahụ tupu ya anwụọ.”+ 11 Ibed-melek wee kpọrọ ndị ikom ahụ a kpọnyere ya banye n’ụlọ eze, gaa n’okpuru ebe a na-edebe akụ̀,+ wee chịrị nkịrịka ákwà na iberibe ákwà kara nkà n’ebe ahụ ma kegide ha n’ụdọ wee sedara ya Jeremaya n’olulu ahụ.+ 12 Ibed-melek onye Itiopia wee gwa Jeremaya, sị: “Nkịrịka ákwà ndị a na iberibe ákwà ndị a e kegidere n’ụdọ a, biko, tinye ha na mkpaabụ gị abụọ.” Jeremaya wee mee otú ahụ.+ 13 N’ikpeazụ, ha ji ụdọ ahụ dọpụta Jeremaya n’olulu ahụ. Jeremaya wee biri n’Ogige Ndị Nche.+
14 Eze Zedekaya wee zie ozi, e wee kpọtara ya Jeremaya onye amụma+ n’ụzọ mbanye nke atọ,+ nke dị n’ụlọ Jehova.+ Eze wee gwa Jeremaya, sị: “Ọ dị ihe m ga-ajụ gị. Ezorola m ihe ọ bụla.”+ 15 Jeremaya wee gwa Zedekaya, sị: “Ọ bụrụ na mụ agwa gị, ị́ gaghị egbu m? Ọ bụrụ na mụ enye gị ndụmọdụ, ị gaghị ege m ntị.”+ 16 Eze Zedekaya wee nọrọ n’ebe zoro ezo ṅụọrọ Jeremaya iyi, sị: “Dị nnọọ ka Jehova dị ndụ, bụ́ onye nyere anyị ndụ a anyị dị,+ agaghị m egbu gị, agaghịkwa m enyefe gị n’aka ndị a na-achọ mkpụrụ obi gị.”+
17 Jeremaya wee gwa Zedekaya, sị: “Nke a bụ ihe Jehova, Chineke nke ụsụụ ndị agha,+ bụ́ Chineke Izrel,+ kwuru, ‘Ọ bụrụ na ị gakwuru ndị ahụ eze Babịlọn mere ndị isi,+ mkpụrụ obi gị ga-adịrị ndụ, a gaghịkwa agba obodo a ọkụ, gị onwe gị kwa na ezinụlọ gị ga-adịrị ndụ.+ 18 Ma ọ bụrụ na ị gakwurughị ndị ahụ eze Babịlọn mere ndị isi, a ga-enyefe obodo a n’aka ndị Kaldia, ha ga-agbakwa ya ọkụ,+ gị onwe gị agaghị agbapụ n’aka ha.’”+
19 Eze Zedekaya wee gwa Jeremaya, sị: “M na-atụ ndị Juu gbakwuuru ndị Kaldia ụjọ,+ n’ihi na ha pụrụ inyefe m n’aka ha, ha ewee mee m ihe na-adịghị mma.”+ 20 Ma Jeremaya sịrị: “Ha agaghị enyefe gị n’aka ha. Biko, rube isi n’ihe Jehova kwuru bụ́ nke m na-agwa gị, ihe ga-agaziri gị,+ mkpụrụ obi gị ga-adịrị ndụ. 21 Ma ọ bụrụ na ị jụ ịgakwuru ha,+ nke a bụ ihe Jehova mere ka m hụ: 22 Lee! a na-akpọpụtara ndị eze Babịlọn+ mere ndị isi ndị inyom niile fọdụrụ n’ụlọ eze Juda,+ ha na-asịkwa,
‘Ndị gị na ha dị ná mma aratawo gị+ wee merie gị.+
Ha emewo ka ụkwụ gị mikpuo n’apịtị; ha agbaghachiwo azụ.’+
23 “Ha na-akpọpụta ndị nwunye gị niile na ụmụ gị kpọnye ndị Kaldia, gị onwe gị agaghị agbapụ n’aka ha,+ kama, aka eze Babịlọn ga-akpara gị, a ga-agbakwa obodo a ọkụ n’ihi gị.”+
24 Zedekaya wee gwa Jeremaya, sị: “Agwakwala onye ọ bụla ihe ndị a, ka ị ghara ịnwụ. 25 Ọ bụrụ na ndị isi+ anụ na mụ na gị kwurịtara okwu, ha wee bịakwute gị, sị gị, ‘Biko, gwa anyị, Gịnị ka ị gwara eze? Ezorola anyị ihe ọ bụla, anyị agaghị egbu gị. Gịnị ka eze gwara gị?’ 26 Sị ha, ‘M nọ na-arịọ eze arịrịọ ka o meere m amara, ka ọ ghara ịkpọghachi m n’ụlọ Jehọnatan+ ka m nwụọ n’ebe ahụ.’”
27 E mesịa, ndị isi niile bịakwutere Jeremaya wee malite ịjụ ya ajụjụ. O wee gwa ha ihe niile eze nyere ya n’iwu ka o kwuo.+ Ya mere, ha agwaghị ya ihe ọ bụla, n’ihi na ha anụghị ihe ha kwurịtara. 28 Jeremaya wee biri n’Ogige Ndị Nche+ ruo ụbọchị e weghaara Jeruselem.+ O mezuru kpọmkwem mgbe e weghaara Jeruselem.+