Ndị Ikpe
18 N’oge ahụ, e nweghị eze n’Izrel.+ N’oge ahụkwa, ebo Dan+ nọ na-achọgharị ala ha ga-ebi; n’ihi na ruo n’ụbọchị ahụ, ha enwetabeghị ihe nketa n’etiti ebo niile nke Izrel.+
2 E mesịa, ụmụ Dan si na Zora+ na Eshtaọl+ zipụ ndị ikom ise n’ezinụlọ ha, bụ́ ndị ikom si n’etiti ha, ndị ikom bụ́ dike, ka ha gaa ledo+ ala ahụ ma chọpụta otú ọ dị. Ha wee sị ha: “Gaanụ, chọpụta otú ala ahụ dị.” Ka oge na-aga, ha bịarutere n’ógbè Ifrem bụ́ ugwu ugwu,+ wee rute n’ụlọ Maịka+ ma rahụ n’ebe ahụ. 3 Mgbe ha nọ nso n’ụlọ Maịka, ha matara olu nwa okorobịa ahụ, bụ́ onye Livaị, ha wee banye ebe ahụ. Ha wee sị ya: “Ònye kpọtara gị ebe a, gịnị ka ị na-arụ ebe a, gịnịkwa ka ị chọtara ebe a?” 4 O wee sị ha: “Lekwa lekwa ihe Maịka meere m ka o wee goo m ọrụ,+ ka m wee ghọọrọ ya onye nchụàjà.+ 5 Ha wee sị ya: “Biko, jụọ+ Chineke+ ase ka anyị mara ma ànyị ga-enwe ihe ịga nke ọma n’ihe anyị na-aga.” 6 Onye nchụàjà ahụ wee sị ha: “Gaanụ n’udo. Ọ bụ n’ihu Jehova ka ụzọ unu na-aga dị.”
7 Ndị ikom ise ahụ wee na-aga ma bịarute Leyish+ wee hụ otú ndị bi n’ime ya si biri n’adabereghị n’ebe ndị ọzọ nọ, dị ka omenala ndị Saịdọn si dị, nọrọkwa jụụ, tụsara ahụ́,+ ọ dịghịkwa onye obi ọjọọ na-enye ihe ọ bụla nsogbu n’ala ahụ. Ha ebighịkwa ndị Saịdọn+ nso, ọ dịghịkwa ihe ha na ndị mmadụ nwekọrọ.
8 E mesịa, ha bịakwutere ụmụnne ha na Zora+ na Eshtaọl,+ ụmụnne ha wee malite ịsị ha: “Olee otú unu si gaa?” 9 Ha wee sị: “Bilienụ ka anyị gaa buso ha agha; n’ihi na anyị ahụwo ala ahụ, ma, lee! ọ dị mma nke ukwuu.+ Unu egbula oge. Unu adịla umengwụ ịbanye nweta ala ahụ.+ 10 Ọ bụrụ na unu abanye, unu ga-agakwuru ndị tụsaara ahụ́,+ ala ahụ sakwara nnọọ mbara; n’ihi na Chineke enyefewo ya n’aka unu,+ bụ́ ebe ọ na-enweghị ihe ọ bụla dị n’ụwa nke kọrọ ya.”+
11 Narị ndị ikom isii ndị kere ngwá agha ha n’úkwù, ndị si n’ezinụlọ ebo Dan,+ wee si n’ebe ahụ, ya bụ, Zora na Eshtaọl,+ kwapụ. 12 Ha wee gbagoo maa ụlọikwuu ha na Kiriat-jierim+ nke dị na Juda. Ọ bụ ya mere ha ji akpọ ebe ahụ Mehane-dan+ ruo taa. Lee! Ọ dị n’ebe ọdịda anyanwụ nke Kiriat-jierim. 13 Ha wee si n’ebe ahụ gawa wee banye n’ógbè Ifrem bụ́ ugwu ugwu ma rute n’ụlọ Maịka.+
14 Ndị ikom ise ahụ, bụ́ ndị gara ledo+ ala Leyish,+ wee sị ụmụnne ha: “Ùnu maara na e nwere efọd na terafim+ na ihe oyiyi a pịrị apị+ na ihe oyiyi a wụrụ awụ+ n’ụlọ ndị a? Maranụ ihe unu kwesịrị ime.”+ 15 Ha wee banye ebe ahụ, bịarute n’ụlọ nwa okorobịa ahụ bụ́ onye Livaị,+ n’ụlọ Maịka, wee malite ịjụ ya otú o mere.+ 16 N’ime oge ahụ, narị ndị ikom isii ahụ ndị kere ngwá agha+ ha n’úkwù, bụ́ ndị si n’etiti ụmụ Dan,+ guzo n’ọnụ ụzọ ámá. 17 Ndị ikom ise ahụ ndị gara ledo ala ahụ+ wee gbagoo, ka ha banye n’ebe ahụ buru ihe oyiyi ahụ a pịrị apị+ na efọd+ ahụ na terafim+ ahụ na ihe oyiyi ahụ a wụrụ awụ.+ (Onye nchụàjà+ ahụ guzokwa n’ọnụ ụzọ ámá, ya na narị ndị ikom isii ahụ ndị kere ngwá agha n’úkwù.) 18 Ha wee banye n’ụlọ Maịka, buru ihe oyiyi ahụ a pịrị apị, efọd na terafim ahụ na ihe oyiyi ahụ a wụrụ awụ.+ Onye nchụàjà+ ahụ wee sị ha: “Gịnị ka unu na-eme?” 19 Ma ha sịrị ya: “Mechie ọnụ. Kpuchie aka n’ọnụ gị, soro anyị gaa ka ị ghọọrọ anyị nna+ na onye nchụàjà.+ Olee nke kaara gị mma, ịbụ onye nchụàjà nke ụlọ otu+ onye ka ọ̀ bụ ịbụ onye nchụàjà nke otu ebo na otu ezinụlọ n’Izrel?”+ 20 Obi wee tọọ onye nchụàjà ahụ ụtọ,+ o wee were efọd ahụ na terafim ahụ na ihe oyiyi ahụ a pịrị apị+ soro ha.
21 Ha wee tụgharịa gawa, mee ka ụmụntakịrị ha na anụ ụlọ na ihe ndị dị oké ọnụ ahịa nọrọ ha n’ihu.+ 22 Ha agaruwo ebe dị anya n’ụlọ Maịka mgbe a kpọkọtara ndị ikom nọ n’ụlọ ndị dị ụlọ Maịka+ nso, ha wee gbalịa ịchụkwuru ụmụ Dan. 23 Mgbe ha nọ na-akpọ ụmụ Dan n’olu dara ụda, ha tụgharịrị sị Maịka: “Gịnị na-eme gị,+ nke mere i ji kpọkọta ndị a?” 24 O wee sị: “Unu ewerewo chi m +bụ́ ndị m mere,+ kpọrọkwa onye nchụàjà m,+ lawa, gịnị ọzọ ka m nwere?+ Gịnịzi mere unu ji na-asị m, ‘Gịnị na-eme gị?’” 25 Ụmụ Dan wee sị ya: “Ekwela ka olu gị darute n’ebe anyị nọ ka ndị ihe na-ewute ná mkpụrụ obi+ ghara ịwakpo unu, i wee tụfuo mkpụrụ obi gị na mkpụrụ obi ezinụlọ gị.” 26 Ụmụ Dan wee na-aga ebe ha na-aga; Maịka wee hụ na ha ka ya ike,+ o wee tụgharịa laghachi n’ụlọ ya.
27 Ma ha buuru ihe ahụ Maịka mere, kpọrọkwa onye nchụàjà+ ahụ nke bụ́ onye nchụàjà ya, ha wee na-aga Leyish,+ ka ha gaa buso ndị nọ jụụ ma tụsara ahụ́ agha.+ Ha wee jiri ihu mma agha+ gbuo ha, gbaakwa obodo ha ọkụ.+ 28 Ha enweghịkwa onye nnapụta, n’ihi na obodo ahụ dị anya na Saịdọn,+ ọ dịghịkwa ihe ha na ndị mmadụ nwekọrọ; ebe ahụ dịkwa na ndagwurugwu Bet-rihọb.+ Ha wee wuo obodo ahụ, birikwa n’ime ya.+ 29 Ha gụkwara obodo ahụ Dan, nke bụ́ aha nna ha Dan,+ onye a mụụrụ Izrel.+ Otú ọ dị, ọ bụ Leyish bụ aha obodo ahụ na mbụ.+ 30 E mesịa, ụmụ Dan guzobeere onwe ha ihe oyiyi ahụ a pịrị apị;+ Jọnatan+ nwa Geshọm,+ nwa Mozis, na ụmụ ya wee ghọọrọ ebo Dan ndị nchụàjà ruo ụbọchị a dọọrọ ala ahụ n’agha.+ 31 Ha wee guzobere onwe ha ihe oyiyi ahụ a pịrị apị, nke Maịka mere, ruo ụbọchị niile ụlọ+ ezi Chineke dị na Shaịlo.+