Ezikiel
46 “Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Ọnụ ụzọ ámá nke ogige dị n’ime nke chere ihu n’ebe ọwụwa anyanwụ+ ga-emechi emechi+ ruo ụbọchị isii a na-arụ ọrụ.+ A ga-emeghe ya n’ụbọchị izu ike, megheekwa ya n’ụbọchị ememme ọnwa ọhụrụ.+ 2 Onyeisi ga-esi n’ụzọ e si aga n’ihe owuwu ụzọ mbata nke ọnụ ụzọ ámá bata,+ site n’èzí, guzokwa n’akụkụ awara ọnụ ụzọ ámá;+ ndị nchụàjà ga-achụ àjà ya a na-esurecha n’ọkụ na àjà udo ya, ọ ga-akpọkwa isiala n’ebe e si abata n’ọnụ ụzọ ámá,+ ọ ga-apụkwa, ma ọnụ ụzọ ámá ahụ ga-eghere oghe ruo anyasị. 3 Ndị ala a ga-akpọ isiala n’ihu Jehova n’ọnụ ụzọ ámá ahụ n’ụbọchị izu ike nakwa n’ụbọchị ememme ọnwa ọhụrụ.+
4 “‘Àjà a na-esurecha n’ọkụ nke onyeisi ga-achụrụ Jehova n’ụbọchị izu ike ga-abụ ụmụ ebule isii ahụ́ dị mma na otu ebule ahụ́ dị mma.+ 5 Àjà ọka* ya ga-abụ otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ efa maka otu ebule,+ ọ ga-enyekwa ihe a ga-eji achụrụ ya àjà ọka maka ụmụ ebule ndị ahụ dị ka ọ ga-enyeli.+ Mmanụ ọ ga-enyekwa bụ otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ hin maka otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ efa.+ 6 N’ụbọchị ememme ọnwa ọhụrụ,+ ọ ga-enye nwa oké ehi, nke si n’ìgwè ehi, nke ahụ́ dị mma, nyekwa ụmụ ebule isii na otu ebule; ha ga-abụ ndị ahụ́ dị mma.+ 7 Ọ ga-enyekwa otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ efa maka nwa oké ehi nakwa otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ efa maka ebule iji chụọ àjà ọka. Ọ ga-enyekwa ihe ọ bụla ọ ga-enyeli maka ụmụ ebule ndị ahụ; mmanụ ọ ga-enye ga-abụ otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ hin maka otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ efa.+
8 “‘Mgbe onyeisi+ chọrọ ịbata, ọ ga-esi n’ụzọ e si aga n’ihe owuwu ụzọ mbata nke ọnụ ụzọ ámá bata, ọ ga-esikwa n’ụzọ ahụ pụọ.+ 9 Mgbe ndị ala a batara n’ihu Jehova n’oge ememme,+ onye ọ bụla nke si n’ọnụ ụzọ ámá dị n’ebe ugwu+ bata ịkpọ isiala ga-esi n’ọnụ ụzọ ámá ndịda+ pụọ. Onye ọ bụla nke si n’ọnụ ụzọ ámá ndịda bata ga-esi n’ọnụ ụzọ ámá dị n’ebe ugwu pụọ. Ọ dịghị onye ga-esi n’ụzọ o si bata pụọ, n’ihi na ọ ga-elegide anya n’ihu wee pụọ. 10 Ma onyeisi nke nọ n’etiti ha ga-abata mgbe ha batara; ha pụọ, ya apụọ.+ 11 Mgbe a na-eme ememme+ nakwa n’oge e ji eme ememme, ihe ọ ga-eji chụọ àjà ọka bụ otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ efa maka nwa oké ehi, otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ efa maka ebule, na ihe ọ ga-enyeli maka ụmụ ebule ndị ahụ; mmanụ ọ ga-enye bụ otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ hin maka otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ efa.+
12 “‘Ọ bụrụ na onyeisi achụọ àjà a na-esurecha n’ọkụ+ dị ka àjà afọ ofufo, ma ọ bụ chụọrọ Jehova àjà udo dị ka àjà afọ ofufo, a ga-emeghere ya ọnụ ụzọ ámá chere ihu n’ebe ọwụwa anyanwụ,+ ọ ga-ewetakwa àjà ya a na-esurecha n’ọkụ nakwa àjà udo ya dị nnọọ ka ọ na-eme n’ụbọchị izu ike.+ Ọ ga-apụ. A ga-emechikwa ọnụ ụzọ ámá ahụ ma ọ pụọ.+
13 “‘Kwa ụbọchị, ị ga na-eweta nwa ebule ahụ́ dị mma, nke na-agafebeghị otu afọ, a ga-eji na-achụrụ Jehova àjà a na-esurecha n’ọkụ.+ Ị ga na-eweta ya kwa ụtụtụ. 14 Ihe ị ga na-eweta nke a ga-eji na-achụ àjà ọka kwa ụtụtụ bụ otu ụzọ n’ụzọ isii nke otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ efa, mmanụ ị ga na-eweta bụ otu ụzọ n’ụzọ atọ nke otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ hin nke a ga na-efesa ná ntụ ọka e gwere nke ọma.+ Àjà ọka a na-achụrụ Jehova bụ ụkpụrụ ga-adịru mgbe a na-akaghị aka, nke a ga na-achụ mgbe niile. 15 Ha ga-ewetakwa nwa ebule na ihe a ga-eji na-achụ àjà ọka nakwa mmanụ kwa ụtụtụ ka ọ bụrụ àjà a na-esurecha n’ọkụ mgbe niile.’
16 “Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Ọ bụrụ na onyeisi enye nwa ya nke ọ bụla onyinye ka ọ bụrụ ihe nketa ya, ọ ga-abụ ala nke ụmụ ya. Ọ bụ ala ha ketara eketa. 17 Ọ bụrụkwa na o si n’ihe nketa ya nye otu n’ime ndị na-ejere ya ozi onyinye, ọ ga-abụ nke onye ahụ ruo afọ nnwere onwe;+ ọ ga-alaghachiri onyeisi ahụ. Ọ bụ naanị ụmụ ya ga-eketa ala ya ka ọ bụrụ nke ha mgbe niile. 18 Onyeisi agaghị anara ndị m ihe nketa ọ bụla iji chụpụ ha n’ala ha.+ Ọ ga-esi n’ala ya nye ụmụ ya ihe nketa, ka ndị m wee ghara isi n’ala ha gbasasịa.’”+
19 O wee si n’ụzọ mbata+ dị n’akụkụ ọnụ ụzọ ámá kpọbata m n’ụlọ dị nsọ ebe ndị nchụàjà na-anọ eri ihe, bụ́ ndị chere ihu n’ebe ugwu,+ ma, lee! e nwere ebe dị n’azụ azụ n’ebe ọdịda anyanwụ. 20 O wee sị m: “Ọ bụ ebe a ka ndị nchụàjà ga-esi anụ e ji chụọ àjà ikpe ọmụma+ na àjà mmehie,+ ọ bụkwa n’ebe a ka ha ga-eghe ọka e ji chụọ àjà ọka,+ ka e wee ghara ibupụ ihe ọ bụla n’ogige dị ná mpụta wee mee ka ndị mmadụ dị nsọ.”+
21 O wee kpọpụta m n’ogige dị ná mpụta wee duru m gaa n’isi nkuku anọ nke ogige ahụ, ma, lee! e nwere ogige dị n’otu isi nkuku nke ogige ahụ, ogige ọzọ dịkwa n’isi nkuku nke ọzọ nke ogige ahụ. 22 E nwere obere ogige ndị dị n’isi nkuku anọ nke ogige ahụ. Ha dị kubit iri anọ n’ogologo, dịrịkwa kubit iri atọ n’obosara. Ha anọ, bụ́ ndị e wuru ihe n’isi nkuku ha, hà nhata. 23 Otu ahịrị okwute gbara ha gburugburu, ya bụ, gburugburu ha anọ. E nwekwara ebe dị iche iche a na-esi ihe,+ bụ́ ndị a rụrụ n’okpuru ahịrị okwute ndị ahụ gbaa gburugburu. 24 O wee sị m: “Ndị a bụ ụlọ ndị na-esi ihe, ebe ndị na-eje ozi n’Ụlọ ahụ na-esi anụ ndị mmadụ ji chụọ àjà.”+