Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Diuterọnọmi 28
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Diuterọnọmi

      • Ihe ọma ndị ga-abịara ndị rubere isi (1-14)

      • Ihe ọjọọ ndị ga-eme ndị nupụrụ isi (15-68)

Diuterọnọmi 28:1

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 26:18, 19

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    12/15/1995, p. 26

Diuterọnọmi 28:2

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 26:3, 4; Ilu 10:22; Aịz 1:19

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    12/15/2010, p. 19-20

    9/15/2010, p. 7-8

    9/15/2001, p. 10

Diuterọnọmi 28:3

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 11:14

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    6/15/1996, p. 15

Diuterọnọmi 28:4

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “mkpụrụ nke afọ.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 26:9; Ọm 127:3; 128:3
  • +Di 7:13

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    6/15/1996, p. 15-16

Diuterọnọmi 28:5

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ya bụ, na ọka ga na-adị na nkata ha, ntụ ọka ga na-adịkwa n’efere ha ji agwọ ntụ ọka.

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 26:2
  • +Ọp 23:25

Diuterọnọmi 28:7

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 32:30; Jos 10:11
  • +Di 7:23; 2Ih 14:13

Diuterọnọmi 28:8

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 26:10; Ilu 3:9, 10; Mal 3:10

Diuterọnọmi 28:9

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 7:6
  • +Ọp 19:6

Diuterọnọmi 28:10

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Aịz 43:10; Da 9:19; Ọrụ 15:17
  • +Ọg 22:3; Di 11:25; Jos 5:1

Diuterọnọmi 28:11

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Je 15:18
  • +Di 30:9; Ọm 65:9

Diuterọnọmi 28:12

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 26:4; Di 11:14
  • +Di 15:6

Diuterọnọmi 28:13

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 4:21

Diuterọnọmi 28:14

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 5:32; Jos 1:7; Aịz 30:21
  • +Le 19:4

Diuterọnọmi 28:15

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 26:16, 17; Da 9:11

Diuterọnọmi 28:16

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 17:1

Diuterọnọmi 28:17

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 26:2
  • +Le 26:26

Diuterọnọmi 28:18

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “mkpụrụ nke afọ.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ákw 2:11, 19; 4:10
  • +Le 26:20, 22

Diuterọnọmi 28:20

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “m.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Jos 23:16

Diuterọnọmi 28:21

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 26:25; Jer 24:10

Diuterọnọmi 28:22

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 26:16
  • +Le 26:33
  • +Em 4:9

Diuterọnọmi 28:23

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ya bụ, mmiri agaghị ezo.

  • *

    Ya bụ, ala ga-akpọ nkụ.

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 26:19; Di 11:17; 1Ez 17:1

Diuterọnọmi 28:25

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 26:14, 17; 1Sa 4:10
  • +Jer 29:18; Lu 21:24

Diuterọnọmi 28:26

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Jer 7:33

Diuterọnọmi 28:28

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 4:11

Diuterọnọmi 28:29

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Aịz 59:10
  • +Ikp 3:14; 6:1-5; Neh 9:27

Diuterọnọmi 28:30

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Aịz 5:9; Ákw 5:2
  • +Em 5:11; Maị 6:15

Diuterọnọmi 28:32

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ih 29:9

Diuterọnọmi 28:33

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Neh 9:37; Aịz 1:7

Diuterọnọmi 28:36

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 17:6; 25:7; 2Ih 33:11; 36:5, 6
  • +Jer 16:13

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Amụma Daniel, p. 71-72

Diuterọnọmi 28:37

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “ga-eji unu na-atụ ilu.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 9:8; 2Ih 7:20; Jer 24:9; 25:9

Diuterọnọmi 28:38

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Aịz 5:10; Hag 1:6

Diuterọnọmi 28:39

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Zef 1:13

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    6/15/2006, p. 18

Diuterọnọmi 28:41

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 24:14; Jer 52:15, 30

Diuterọnọmi 28:44

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ilu 22:7
  • +Ezr 9:7

Diuterọnọmi 28:45

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 28:15; 29:27
  • +2Ez 17:20; Jer 24:10
  • +Di 11:26-28

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    1/15/1995, p. 15-16

Diuterọnọmi 28:46

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Kọ 10:11

Diuterọnọmi 28:47

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “jeere ya ozi.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 12:7; Neh 9:35

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    1/15/1995, p. 15-16

Diuterọnọmi 28:48

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ih 12:8, 9; Jer 5:19
  • +Jer 44:27

Diuterọnọmi 28:49

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Jer 6:22; Hab 1:6
  • +Jer 4:13; Ho 8:1
  • +Jer 5:15

Diuterọnọmi 28:50

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ih 36:17; Aịz 47:6; Lu 19:44

Diuterọnọmi 28:51

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 26:26; Jer 15:13

Diuterọnọmi 28:52

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 17:5; 25:1; Lu 19:43

Diuterọnọmi 28:53

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “mkpụrụ nke afọ.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 6:28; Ákw 4:10; Ezi 5:10

Diuterọnọmi 28:55

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Jer 52:6

Diuterọnọmi 28:56

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ákw 4:5

Diuterọnọmi 28:58

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 24:7; Di 31:26
  • +Di 10:17; Ọm 99:3
  • +Ọp 3:15; 6:3; 20:2; Ọm 83:18; 113:3; Aịz 42:8

Diuterọnọmi 28:59

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 26:21; Da 9:12

Diuterọnọmi 28:62

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 10:22
  • +Di 4:27

Diuterọnọmi 28:64

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 26:33; Neh 1:8; Lu 21:24
  • +Di 4:27, 28

Diuterọnọmi 28:65

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Em 9:4
  • +Ezi 12:19
  • +Le 26:16, 36

Baịbụl Ndị Ọzọ ọ gbara

Pịa amaokwu nke ọ bụla ka o bupụtara gị amaokwu Baịbụl ndị ọzọ yiri ya.

Amaokwu ndị Ọzọ

Diut. 28:1Di 26:18, 19
Diut. 28:2Le 26:3, 4; Ilu 10:22; Aịz 1:19
Diut. 28:3Di 11:14
Diut. 28:4Le 26:9; Ọm 127:3; 128:3
Diut. 28:4Di 7:13
Diut. 28:5Di 26:2
Diut. 28:5Ọp 23:25
Diut. 28:7Di 32:30; Jos 10:11
Diut. 28:7Di 7:23; 2Ih 14:13
Diut. 28:8Le 26:10; Ilu 3:9, 10; Mal 3:10
Diut. 28:9Di 7:6
Diut. 28:9Ọp 19:6
Diut. 28:10Aịz 43:10; Da 9:19; Ọrụ 15:17
Diut. 28:10Ọg 22:3; Di 11:25; Jos 5:1
Diut. 28:11Je 15:18
Diut. 28:11Di 30:9; Ọm 65:9
Diut. 28:12Le 26:4; Di 11:14
Diut. 28:12Di 15:6
Diut. 28:131Ez 4:21
Diut. 28:14Di 5:32; Jos 1:7; Aịz 30:21
Diut. 28:14Le 19:4
Diut. 28:15Le 26:16, 17; Da 9:11
Diut. 28:161Ez 17:1
Diut. 28:17Di 26:2
Diut. 28:17Le 26:26
Diut. 28:18Ákw 2:11, 19; 4:10
Diut. 28:18Le 26:20, 22
Diut. 28:20Jos 23:16
Diut. 28:21Le 26:25; Jer 24:10
Diut. 28:22Le 26:16
Diut. 28:22Le 26:33
Diut. 28:22Em 4:9
Diut. 28:23Le 26:19; Di 11:17; 1Ez 17:1
Diut. 28:25Le 26:14, 17; 1Sa 4:10
Diut. 28:25Jer 29:18; Lu 21:24
Diut. 28:26Jer 7:33
Diut. 28:28Ọp 4:11
Diut. 28:29Aịz 59:10
Diut. 28:29Ikp 3:14; 6:1-5; Neh 9:27
Diut. 28:30Aịz 5:9; Ákw 5:2
Diut. 28:30Em 5:11; Maị 6:15
Diut. 28:322Ih 29:9
Diut. 28:33Neh 9:37; Aịz 1:7
Diut. 28:362Ez 17:6; 25:7; 2Ih 33:11; 36:5, 6
Diut. 28:36Jer 16:13
Diut. 28:371Ez 9:8; 2Ih 7:20; Jer 24:9; 25:9
Diut. 28:38Aịz 5:10; Hag 1:6
Diut. 28:39Zef 1:13
Diut. 28:412Ez 24:14; Jer 52:15, 30
Diut. 28:44Ilu 22:7
Diut. 28:44Ezr 9:7
Diut. 28:45Di 28:15; 29:27
Diut. 28:452Ez 17:20; Jer 24:10
Diut. 28:45Di 11:26-28
Diut. 28:461Kọ 10:11
Diut. 28:47Di 12:7; Neh 9:35
Diut. 28:482Ih 12:8, 9; Jer 5:19
Diut. 28:48Jer 44:27
Diut. 28:49Jer 6:22; Hab 1:6
Diut. 28:49Jer 4:13; Ho 8:1
Diut. 28:49Jer 5:15
Diut. 28:502Ih 36:17; Aịz 47:6; Lu 19:44
Diut. 28:51Le 26:26; Jer 15:13
Diut. 28:522Ez 17:5; 25:1; Lu 19:43
Diut. 28:532Ez 6:28; Ákw 4:10; Ezi 5:10
Diut. 28:55Jer 52:6
Diut. 28:56Ákw 4:5
Diut. 28:58Ọp 24:7; Di 31:26
Diut. 28:58Di 10:17; Ọm 99:3
Diut. 28:58Ọp 3:15; 6:3; 20:2; Ọm 83:18; 113:3; Aịz 42:8
Diut. 28:59Le 26:21; Da 9:12
Diut. 28:62Di 10:22
Diut. 28:62Di 4:27
Diut. 28:64Le 26:33; Neh 1:8; Lu 21:24
Diut. 28:64Di 4:27, 28
Diut. 28:65Em 9:4
Diut. 28:65Ezi 12:19
Diut. 28:65Le 26:16, 36
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Gụọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ (bi12)
  • 1
  • 2
  • 3
  • 4
  • 5
  • 6
  • 7
  • 8
  • 9
  • 10
  • 11
  • 12
  • 13
  • 14
  • 15
  • 16
  • 17
  • 18
  • 19
  • 20
  • 21
  • 22
  • 23
  • 24
  • 25
  • 26
  • 27
  • 28
  • 29
  • 30
  • 31
  • 32
  • 33
  • 34
  • 35
  • 36
  • 37
  • 38
  • 39
  • 40
  • 41
  • 42
  • 43
  • 44
  • 45
  • 46
  • 47
  • 48
  • 49
  • 50
  • 51
  • 52
  • 53
  • 54
  • 55
  • 56
  • 57
  • 58
  • 59
  • 60
  • 61
  • 62
  • 63
  • 64
  • 65
  • 66
  • 67
  • 68
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Diuterọnọmi 28:1-68

Diuterọnọmi

28 “Ọ bụrụ na unu egee ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke unu ma lezie anya na-edebe iwu ya niile m na-enye unu taa, Jehova bụ́ Chineke unu ga-eme ka unu ka mba ndị ọzọ niile dị n’ụwa.+ 2 A ga-agọzi unu nke ukwuu, ihe ọma niile a ga-abịakwara unu+ maka na unu na-ege ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke unu:

3 “A ga-agọzi unu n’obodo, gọziekwa unu n’ubi.+

4 “A ga-agọzi ụmụ* unu+ na ihe ala unu na-emepụta nakwa ụmụ anụ ụlọ unu, ya bụ, ehi unu na atụrụ unu.+

5 “A ga-agọzi nkata unu+ na efere unu ji agwọ ntụ ọka.*+

6 “A ga-agọzi unu mgbe unu na-abata abata, gọziekwa unu mgbe unu na-apụ apụ.

7 “Jehova ga-eme ka unu merie ndị iro unu na-alụso unu agha.+ Ha ga-esi n’otu ụzọ bịa ịlụso unu agha, ma ha ga-esi n’ụzọ asaa gbapụ n’ihu unu.+ 8 Jehova ga-agọzi ebe unu na-akwasa ihe,+ gọziekwa ihe ọ bụla unu na-eme. Ọ ga-agọzi unu n’ala ahụ Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu. 9 Jehova ga-eme ka unu bụrụ ndị ya dị nsọ,+ otú ọ ṅụụrụ unu n’iyi,+ maka na unu na-edebe ihe Jehova bụ́ Chineke unu nyere n’iwu ma na-eme uche ya. 10 Ndị niile bi n’ụwa ga-ahụ na unu na-aza aha Jehova,+ ha ga-atụkwa unu egwu.+

11 “Jehova ga-eme ka unu nwee ọtụtụ ụmụ na ọtụtụ anụ ụlọ, meekwa ka ala ahụ Jehova ṅụụrụ nna nna unu hà iyi na ọ ga-enye unu+ na-emepụta ihe n’ụba.+ 12 Jehova ga-emepere unu eluigwe ya otú mmadụ si emepe ebe ọ kwasara ezigbo ihe ma mee ka mmiri zoo n’ala unu n’oge ya,+ gọziekwa ihe niile unu na-eme. Unu ga-agbazinye ọtụtụ mba ihe, ma e nweghị ihe ga-eme ka unu gbaziri ihe.+ 13 Jehova ga-eme ka unu bụrụ ndị isi, ọ bụghị ndị ọdụ. Unu ga-anọ n’elu,+ ọ bụghị n’ala, ma ọ bụrụ na unu ana-erube isi n’iwu Jehova bụ́ Chineke unu, bụ́ ndị m na-enye unu taa ka unu na-edebe ma na-eme. 14 Unu anwala anwa hapụ ihe niile m na-enye unu n’iwu taa gaa mewe ihe ọzọ,+ ka unu wee soro chi ọzọ dị iche iche ma fewe ha ofufe.+

15 “Ma ọ bụrụ na unu egeghị ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke unu ma lezie anya na-edebe iwu ya niile, na-emekwa ihe ndị o kpebiri bụ́ ndị m na-agwa unu taa, a ga-abụrịrị unu ọnụ, ihe ọjọọ a niile ga-emekwa unu:+

16 “A ga-abụ unu ọnụ n’obodo, bụọkwa unu ọnụ n’ubi.+

17 “A ga-abụ nkata unu+ na efere unu ji agwọ ntụ ọka ọnụ.+

18 “A ga-abụ ụmụ* unu+ na ihe ala unu na-emepụta ọnụ, bụọkwa ụmụ ehi unu na atụrụ unu ọnụ.+

19 “A ga-abụ unu ọnụ mgbe unu na-abata abata, bụọkwa unu ọnụ mgbe unu na-apụ apụ.

20 “Jehova ga-abụ unu ọnụ, mee ka unu nọrọ n’ọgba aghara, taakwa unu ahụhụ n’ihe ọ bụla unu na-eme ruo mgbe e bibiri unu, unu ewee laa n’iyi n’egbughị oge, n’ihi omume ọjọọ unu nakwa n’ihi na unu hapụrụ ya.*+ 21 Jehova ga-eme ka unu rịawa ọrịa na-anaghị ala ala ruo mgbe o bibichara unu n’ala ahụ unu na-aga iweghara.+ 22 Jehova ga-eme ka unu rịawa ụkwara nta, oké ahụ́ ọkụ,+ ahụ́ ọzịza, na oké okpomọkụ. Ọ ga-eme ka a lụso unu agha,+ meekwa ka ihe unu kụrụ kpọnwụọ nakwa ka ha maa ebù.+ Ihe ndị a ga-emegide unu ruo mgbe unu ga-anwụcha. 23 Mbara igwe unu ga-adị ka ọla kọpa,* ala unu ga-adịkwa ka ígwè.*+ 24 Jehova ga-eme ka ntụ na uzuzu si n’eluigwe na-ezo n’ala unu ka mmiri ruo mgbe unu lara n’iyi. 25 Jehova ga-eme ka ndị iro unu merie unu.+ Unu ga-esi n’otu ụzọ gaa ịlụso ha agha, ma unu ga-esi n’ụzọ asaa gbapụ n’ihu ha. Alaeze niile dị n’ụwa ga-atụ ụjọ mgbe ha ga-ahụ ihe ọjọọ ndị na-eme unu.+ 26 Ozu unu ga-abụrụ nnụnụ niile na-efe n’eluigwe na anụmanụ ndị na-agagharị n’ala ihe oriri, e nweghịkwa onye ga-achụpụ ha.+

27 “Jehova ga-eme ka etuto toro ndị Ijipt too unu, meekwa ka ọkpụ ikè, ụ́gwọ̀, na ọkọ, bụ́ ndị a na-agaghị agwọ agwọ, mee unu. 28 Jehova ga-eme ka ara gbaa unu, mee ka unu kpuo ìsì,+ meekwa ka uche ghara ịkpakọ unu ọnụ. 29 Unu ga na-asọgharị ìsì n’ehihie otú onye ìsì si asọgharị ìsì n’ọchịchịrị,+ e nweghịkwa ihe unu na-eme ga-agara unu nke ọma. A ga na-erigbu unu mgbe niile, na-ezu unu ohi, e nweghịkwa onye ga-azọpụta unu.+ 30 Unu ga-ekwe nwaanyị nkwa na unu ga-alụ ya, ma nwoke ọzọ ga-edina ya n’ike. Unu ga-arụ ụlọ, ma unu agaghị ebi na ya.+ Unu ga-akọ ubi vaịn, ma unu agaghị amalite iri mkpụrụ ya.+ 31 A ga-egbu ehi unu n’ihu unu, ma unu agaghị eri anụ ya ọ bụla. A ga-ezuru jakị unu n’ihu unu, ma a gaghị akpọghachiri ya unu. A ga-akpụnye ndị iro unu atụrụ unu, ma e nweghị onye ga-azọpụta unu. 32 Unu ga na-ele anya a kpọrọ ụmụ unu ndị nwoke na ụmụ unu ndị nwaanyị kpọnye ndị ọzọ.+ Agụụ ịhụ ha ga na-agụ unu mgbe niile, ma e nweghị ihe unu ga-emeli. 33 Ndị unu na-amaghị ga-eri ihe ala unu mepụtara na ihe niile unu rụtara.+ A ga na-erigbu unu mgbe niile, na-echikwa unu ọnụ n’ala. 34 Ihe unu ga-eji anya unu ahụ ga-agbaka unu isi.

35 “Jehova ga-eme ka etuto na-afụ ụfụ nke a na-anaghị agwọta agwọta too unu n’ikpere nakwa n’ụkwụ, malite n’ọbụ ụkwụ unu ruo n’opu isi unu. 36 Jehova ga-achụga unu na onye unu ga-eme eze ná mba unu na nna nna unu hà na-amaghị.+ Unu ga-efe chi ọzọ dị iche iche n’ebe ahụ, chi ndị e ji osisi na nkume mee.+ 37 Ihe ndị ga-eme unu ga-emenye ndị bi n’ebe niile Jehova ga-achụga unu ụjọ. Ha ga-eji unu mere ihe ọchị,* ha agaghịkwa eji unu kpọrọ ihe.+

38 “Unu ga-agha ọtụtụ mkpụrụ n’ubi, ma ihe unu ga-eweta ga-adị ole na ole,+ n’ihi na igurube ga-erichapụ ha. 39 Unu ga-akọ ubi vaịn, lekọtakwa ya, ma unu agaghị aṅụ mmanya ọ bụla, unu agaghịkwa aghọta ihe ọ bụla,+ n’ihi na ọtị ga-erichapụ ya. 40 Unu ga-enwe osisi oliv n’ala unu niile, ma unu agaghị ete mmanụ ọ bụla n’ahụ́, n’ihi na mkpụrụ oliv unu ga-adapụcha. 41 Unu ga-amụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị, ma ha agaghị abụ nke unu, n’ihi na a ga-adọrọ ha n’agha.+ 42 Ụmụ ahụhụ dị iche iche ga-eju n’osisi unu niile nakwa n’ihe ala unu mepụtara. 43 Onye mbịarambịa nke binyeere unu ga na-adị ike karịa unu, ma ike ga na-agwụkwu unu. 44 Ọ ga-agbazinye unu ihe, ma unu agaghị agbazinye ya ihe.+ Ọ ga-abụ onyeisi, ma unu ga-abụ ndị ọdụ.+

45 “A ga-abụrịrị unu ọnụ,+ ihe ọjọọ niile a ga-emekwa unu ruo mgbe unu lara n’iyi,+ n’ihi na unu egeghị ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke unu, unu edebeghị iwu ya ma soro ntụziaka ndị o nyere unu.+ 46 Unu na ụmụ unu ga na-abụ ndị a bụrụ ọnụ. Ọnụ ahụ a bụrụ unu ga-abụkwa ihe àmà ga-adịgide adịgide na ihe ịdọ aka ná ntị,+ 47 n’ihi na unu ejighị ọṅụ na obi ụtọ fee Jehova bụ́ Chineke unu* mgbe unu nwejuru ihe niile enweju.+ 48 Jehova ga-eme ka ndị iro unu bịa lụso unu agha, unu ga-ejekwara ha ozi.+ N’oge ahụ, agụụ ga na-agụ unu,+ mmiri ga na-agụkwa unu, unu agaghị eyi ezigbo ákwà, ihe niile ga-akọkwa unu. Ọ ga-anyawa unu yok ígwè n’olu ruo mgbe ọ lara unu n’iyi.

49 “Jehova ga-eme ka mba dị n’ebe dị anya si n’ebe ụwa sọtụrụ bịa lụso unu agha.+ Ọ ga-alụso unu agha n’ike otú ugo si efekwasị n’ihe ọ chọrọ iburu.+ Ọ ga-abụ mba unu na-agaghị aghọta asụsụ ha,+ 50 mba nke na-emenye mmadụ ụjọ, nke na-agaghị akwanyere agadi ùgwù ma ọ bụ meere onye na-eto eto ebere.+ 51 Ha ga-eri ụmụ anụ ụlọ unu na ihe ala unu mepụtara ruo mgbe e kpochapụrụ unu. Ha agaghị ahapụrụ unu ọka* ọ bụla, mmanya ọhụrụ ma ọ bụ mmanụ ọ bụla, ụmụ ehi ma ọ bụ ụmụ atụrụ ọ bụla ruo mgbe ha bibiri unu.+ 52 Ha ga-anọchibido unu, ghara ikwe ka unu si n’obodo niile dị n’ala unu pụta, ruo mgbe mgbidi ndị dị elu unu rụsiri ike, bụ́ ndị unu tụkwasịrị obi, ga-ada. N’eziokwu, ha ga-anọchibido unu n’obodo niile dị n’ala unu nke Jehova bụ́ Chineke unu nyere unu.+ 53 N’ihi otú ihe ga-esi siere unu ike mgbe ndị iro unu ga-anọchibido unu nakwa otú ha ga-esi na-echi unu ọnụ n’ala, unu ga-eri ụmụ* unu, ya bụ, anụ ụmụ unu ndị nwoke na ụmụ unu ndị nwaanyị,+ bụ́ ụmụ Jehova bụ́ Chineke unu nyere unu.

54 “Nwoke nke na-eme nwayọọ nwayọọ, nke ihe kacha emetụ n’ahụ́ n’ime unu, agaghịdị emetere nwanne ya nwoke ma ọ bụ nwunye ya ọ hụrụ n’anya ma ọ bụ ụmụ ya ndị fọrọ afọ ebere. 55 Ọ gaghịkwa enyetụ ha anụ nwa ya nke ọ bụla ọ ga-eri, n’ihi na e nweghị ihe ọ bụla ọzọ o nwere n’ihi otú ihe ga-esi siere unu ike mgbe ndị iro unu ga-anọchibido unu nakwa otú ha ga-esi na-echi unu ọnụ n’ala.+ 56 Nwaanyị nke na-eme nwayọọ nwayọọ, nke ihe na-emetụkwa n’ahụ́, nke na-agaghịdị eche echiche ịzọ ụkwụ ya n’ala maka na ọ na-eme nwayọọ nwayọọ+ agaghị emetere di ya ọ hụrụ n’anya ma ọ bụ nwa ya nwoke ma ọ bụ nwa ya nwaanyị ebere. 57 Ọ gaghịdị enyetụ ha ihe ọ bụla na-esi n’ahụ́ ya apụta mgbe ọ mụchara nwa nakwa anụ ụmụ ndị ọ ga-amụ. Ọ ga-eri ha na nzuzo n’ihi otú ihe ga-esi siere unu ike mgbe ndị iro unu ga-anọchibido unu nakwa n’ihi otú ha ga-esi na-echi unu ọnụ n’ala.

58 “Ọ bụrụ na unu elezighị anya mee ihe niile e kwuru n’Iwu a, bụ́ ndị e dere n’akwụkwọ a,+ gharakwa ịtụ egwu aha a dị ebube ma dị egwu,+ ya bụ, aha Jehova+ Chineke unu, 59 Jehova ga-ata unu na ụmụ unu ezigbo ahụhụ, nnukwu ahụhụ na-agaghị ebi ebi,+ meekwa ka unu rịawa ajọ ọrịa ndị na-anaghị ala ala. 60 Ọ ga-eme ka unu rịa ọrịa niile ndị Ijipt rịara, bụ́ ọrịa ndị unu na-atụ egwu, ndị na-agaghịkwa ala ala. 61 Jehova ga-emedị ka unu rịa ọrịa ọ bụla a na-edeghị n’akwụkwọ Iwu a, taakwa unu ahụhụ ọ bụla a na-edeghị n’akwụkwọ Iwu a ruo mgbe unu lara n’iyi. 62 N’agbanyeghị na unu adịla ọtụtụ ka kpakpando ndị dị n’eluigwe,+ unu ga-afọ mmadụ ole na ole+ maka na unu egeghị ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke unu.

63 “Otú ahụ obi dị Jehova mma ime ka ihe gaziere unu nakwa ka unu mụbaa ka obi ga-adịkwa Jehova mma ibibi unu na ịla unu n’iyi. A ga-ekpochapụkwa unu n’ala ahụ unu na-aga iweghara.

64 “Jehova ga-achụsasị unu ná mba niile, malite n’otu nsọtụ ụwa ruo na nsọtụ ya nke ọzọ.+ N’ebe ahụ, unu ga-efe chi dị iche iche e ji osisi na nkume mee, chi ndị unu na nna nna unu hà na-amaghị.+ 65 Obi agaghị eru unu ala ná mba ndị ahụ,+ unu agaghịkwa ahụ ebe ụkwụ unu ga-ezu ike. Kama, Jehova ga-eme ka obi koro unu n’elu,+ ka ike gwụ anya unu, nakwa ka unu daa mbà n’obi.+ 66 Ihe ndị ga-ata isi unu ga-agba unu gburugburu, ụjọ ga na-atụkwa unu abalị na ehihie. Unu agaghị eji ndụ unu n’aka. 67 N’ụtụtụ, unu ga-asị, ‘A sị nnọọ na ọ bụ mgbede!’ Ná mgbede, unu ga-asịkwa, ‘A sị nnọọ na ọ bụ ụtụtụ!’ n’ihi na unu ga-achị obi unu n’aka nakwa n’ihi ihe anya unu ga-ahụ. 68 Jehova ga-eji ụgbọ mmiri bughachi unu n’Ijipt, bụ́ ebe m gwara unu banyere ya, sị, ‘Unu agaghị ahụ ya ọzọ.’ N’ebe ahụ, unu ga-achọ ka unu resị ndị iro unu onwe unu ka unu bụrụ ohu ha ndị nwoke na ohu ha ndị nwaanyị, ma e nweghị onye ga-azụrụ unu.”

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya