Abụ Ákwá
א [Alef]
3 Abụ m dimkpa nke nọ n’ahụhụ+ n’ihi mkpanaka nke oké iwe ya.
2 Ọ bụ m ka o duuru wee mee ka m na-eje ije n’ọchịchịrị, ọ bụghị n’ìhè.+
3 N’ezie, ọ bụ m ka ọ tụgharịrị aka ya ugboro ugboro megide ogologo ụbọchị dum.+
ב [Bet]
4 O mewo ka anụ ahụ́ m na akpụkpọ ahụ́ m laa n’iyi.+ Ọ gbajisịala ọkpụkpụ m.+
5 O wuola mgbidi iji nọchibido m,+ ka o wee jiri ahịhịa na-egbu mmadụ+ nakwa ihe isi ike gbaa m gburugburu.
6 O mewo ka m nọdụ n’ebe gbara ọchịchịrị+ dị ka ndị nwụrụ kemgbe.+
ג [Gimel]
7 O jiriwo nkume wuchibido m mgbidi, ka m ghara ịpụ.+ Ọ tụwo m ịgà dị aro ndị e ji ọla kọpa mee.+
8 Mgbe ọ bụla m kpọrọ òkù ka o nyere m aka, tiekwa mkpu enyemaka, ọ naghị ekwe ka ekpere m ruo ya ntị.+
9 O jiriwo nkume a wara awa dochie n’ụzọ m.+ Ọ gbagọọla okporo ụzọ m.+
ד [Dalet]
10 N’ebe m nọ, ọ dị ka anụ ọhịa bea nke gara zoo chebiri m,+ dịrịkwa ka ọdụm nọ n’ebe zoro ezo.+
11 O meghasịala ụzọ m, o mewokwa ka m tọgbọrọ nkịtị. O mewo m ka m bụrụ ihe tọgbọrọ n’efu.+
12 O kwewo ụta+ ya wee tụgide m akụ́ ya.+
ה [Hee]
13 Ọ gbawo akụ́ niile dị n’akpa akụ́ ya n’akụrụ m.+
14 Ndị niile na-emegide m na-achị m ọchị,+ ha na-eji m agụ egwú ogologo ụbọchị dum.+
15 O mewo ka m rijuo ihe ilu afọ.+ O mewo ka m tajuo ahịhịa ilu afọ.+
ו [Wọọ]
16 Ọ na-eme ka m taa ajịrịja nkume tajisịa ezé.+ O mewo ka m tụrụọ ná ntụ.+
17 Ị jụwokwa m wee mee ka mkpụrụ obi m ghara inwe udo. Echefuola m ihe dị mma.+
18 M nọ na-asị: “Ịma mma m alawo n’iyi, ihe m na-atụ anya inweta n’aka Jehova alawokwa n’iyi.”+
ז [Zayin]
19 Cheta na m nọ ná mmekpa ahụ́, na enweghị m ebe obibi.+ Chetakwa na m na-ata ahịhịa ilu na ahịhịa na-egbu mmadụ.+
20 Mkpụrụ obi gị aghaghị icheta m wee hulata n’ebe m nọ.+
21 Nke a bụ ihe m ga-echeta.+ Ọ bụ ya mere m ga-eji chere.+
ח [Het]
22 Ọ bụ obiọma*+ Jehova mere na anyị anwụchabeghị,+ n’ihi na ebere ya agaghị agwụ agwụ.+
23 Ha na-adị ọhụrụ kwa ụtụtụ.+ Ikwesị ntụkwasị obi gị bara ụba.+
24 Mkpụrụ obi m kwuru, sị, “Jehova bụ òkè m,+ ọ bụ ya mere m ga-eji chere ya.”+
ט [Tet]
25 Jehova dị mma nye onye nwere olileanya n’ebe ọ nọ,+ nye mkpụrụ obi nke na-achọ ya.+
26 Ọ dị mma ka mmadụ gba nkịtị+ chere+ nzọpụta Jehova.+
27 Ọ dị mma ka nwoke buru yok ya n’oge ọ bụ okorobịa.+
י [Yod]
28 Ya nọrọ ọdụ naanị ya gbachie nkịtị,+ n’ihi na o bowo ya ibu arọ.+
29 Ya sọnye ọnụ n’ájá.+ Ma eleghị anya, olileanya dị.+
30 Ya cheziere onye na-ama ya ụra ntì ya.+ Ka nkọcha ju ya afọ.+
כ [Kaf]
31 N’ihi na Jehova agaghị ajụ anyị ruo mgbe ebighị ebi.+
32 N’ihi na ọ bụ ezie na ọ kpatara iru uju,+ ọ ga-emekwa ebere dị ka obiọma ya si dị ukwuu.+
33 N’ihi na ahụhụ ọ na-enye ụmụ mmadụ na uju ọ na-eme ka ha ruo esighị ya n’obi.+
ל [Lamed]
מ [Mem]
37 Ònye kwuru ka ihe mee mgbe Jehova na-enyeghị iwu ka o mee?+
38 Ihe ọjọọ na ihe ọma anaghị esi n’ọnụ Onye Kasị Elu apụta.+
39 Gịnị mere mmadụ dị ndụ, bụ́ dimkpa mmadụ, ga-eji na-eme mkpesa+ n’ihi mmehie ya?+
נ [Nun]
40 Ka anyị chọọ ụzọ anyị, nyochaakwa ya,+ ka anyị laghachikwuru Jehova.+
41 Ka anyị gbasapụrụ Chineke bi n’eluigwe obi anyị na ọbụ aka anyị,+ sị:
42 “Anyị onwe anyị emebiwo iwu, anyị enupụwokwa isi.+ Gị onwe gị agbagharaghị.+
ס [Samek]
43 I jiriwo iwe gị gbochie anyị ịbịakwute gị,+ ị na-achụpụkwa anyị.+ I gbuwo ndị mmadụ n’enweghị ọmịiko.+
44 I jiriwo ígwé ojii gbochie anyị ịbịakwute gị,+ ka ekpere ghara ịgafe ya.+
45 I mere ka anyị bụrụ ihe a wụfuru awụfu na ihe e kpofuru ekpofu n’etiti ndị dị iche iche.”+
פ [Pee]
46 Ndị iro anyị niile ekwuwo okwu megide anyị.+
47 Ụjọ na olulu abụrụwo nke anyị,+ tinyere ntọgbọrọ n’efu na mbibi.+
48 Anya mmiri si m n’anya na-asọpụta dị ka iyi n’ihi mbibi e bibiri ada bụ́ ndị m.+
ע [Ayin]
49 Anya mmiri na-awụpụta m n’anya n’akwụsịghị akwụsị,+
50 Ruo mgbe Jehova si n’eluigwe ledata anya wee hụ anyị.+
51 Anya m emesiwo mkpụrụ obi m ike,+ n’ihi obodo nta niile nke obodo m.+
צ [Sadee]
52 Ndị iro m na-achụ nta m dị ka à ga-asị na m bụ nnụnụ,+ n’enweghị ihe m mere ha.+
53 Ha alawo ndụ m n’iyi n’ime olulu,+ ha nọkwa na-atụ m nkume.
54 Mmiri asọfewo m n’isi.+ Asịwo m: “A ga-ebipụrịrị m!”+
ק [Kof]
55 Jehova, esiwo m n’ime ime olulu kpọkuo aha gị.+
56 Nụrụ olu m.+ Ewepụla ntị gị wee ghara ịnapụta m, wee ghara ịnụ mkpu enyemaka m na-eti.+
57 Ị bịakwutere m n’ụbọchị m kpọkuru gị.+ Ị sịrị: “Atụla egwu.”+
ר [Resh]
58 Jehova, i kpechiteworo mkpụrụ obi m ọnụ ya.+ Ị gbapụtawo ndụ m.+
59 Jehova, ị hụwo ihe ọjọọ e mere m.+ Biko, kpeere m ikpe.+
60 Ị hụwo ọbọ niile ha bọrọ, bụ́ ihe niile ha na-eche n’echiche megide m.+
ש [Sin] ma ọ bụ [Shin]
61 Jehova, ị nụwo nkọcha ha na-akọcha m, ihe niile ha na-eche n’echiche megide m,+
62 Ị nụkwara okwu na-esi n’egbugbere ọnụ nke ndị na-ebili megide m+ nakwa izu ha na-agba megide m ogologo ụbọchị dum.+
63 Hụrụ mgbe ha nọdụrụ ala na mgbe ha biliri ọtọ.+ Ha ji m agụ egwú.+
ת [Tọọ]
64 Jehova, ị ga-emeso ha dị ka ọrụ aka ha si dị.+
65 Ị ga-eme ka obi ha dị nganga,+ bụ́ ọnụ ị bụrụ ha.+
66 Jehova, ị ga-eji iwe chụọ ha ọsọ wee kpochapụ ha+ n’okpuru eluigwe gị.+