JỌN NKE MBỤ
1 Anyị na-ede gbasara onye wetara okwu na-enye ndụ,+ onye si ná mmalite dịrị, onye anyị nụrụ ihe o kwuru, onye anyị ji anya anyị hụ, onye anyị leruru anya ma metụ aka. 2 (N’eziokwu, e mere ka ndụ ahụ pụta ìhè. Anyị ahụla ya ma na-agba àmà ya,+ na-akọkwara unu banyere ndụ ebighị ebi ahụ+ nke si n’aka Nna anyị, nke e mere ka ọ pụta ìhè n’ebe anyị nọ.) 3 Ọ bụ ihe anyị hụrụ na ihe anyị nụrụ ka anyị na-akọrọ unu,+ ka anyị na unu wee dịrị n’otu. Ọ bụkwa otú ahụ ka anyị na Nna anyị na Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst, dị n’otu.+ 4 Anyị na-ede ihe ndị a ka ọṅụ anyị wee zuo ezuo.
5 Ihe a bụ ozi anyị nụrụ n’ọnụ ya, anyị na-ezikwa ya unu: Chineke bụ ìhè,+ e nweghịkwa ihe ọ bụla jikọrọ ya na ọchịchịrị.* 6 Ọ bụrụ na anyị asị, “Anyị na ya dị n’otu,” ma anyị ana-eje ije n’ọchịchịrị,* anyị na-agha ụgha, ndụ anyị na-ebi adabaghịkwa n’ihe bụ́ eziokwu.+ 7 Ma ọ bụrụ na anyị na-eje ije n’ìhè* otú yanwa nọ n’ìhè, anyị na ibe anyị dị n’otu, ọbara Jizọs bụ́ Ọkpara ya na-asachapụkwa anyị mmehie niile.+
8 Ọ bụrụ na anyị asị, “Anyị anaghị eme mmehie,” anyị na-aghọgbu onwe anyị,+ eziokwu adịghịkwa anyị n’ime. 9 Ọ bụrụ na anyị ekwupụta mmehie anyị, ọ ga-agbaghara anyị mmehie anyị, sachapụkwa anyị ajọ omume niile+ n’ihi na ọ bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi, bụrụkwa onye ezi omume. 10 Ọ bụrụ na anyị asị, “Anyị emetụbeghị mmehie,” anyị na-eme ya onye ụgha, okwu ya adịghịkwa n’obi anyị.
2 Ụmụntakịrị m, m na-edere unu ihe ndị a ka unu ghara ime mmehie. Ma, ọ bụrụ na onye ọ bụla emee mmehie, anyị nwere onye na-enyere anyị aka, onye ya na Nna anyị nọ, ya bụ, Jizọs Kraịst,+ onye ezi omume.+ 2 Ọ bụ àjà a chụrụ maka mmehie anyị+ ka anyị na Chineke wee dị n’udo,+ ma ọ bụghị naanị maka mmehie anyị, kama ọ bụkwa maka mmehie ụwa niile.+ 3 Ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe ndị o nyere n’iwu, anyị ga-eji ya mara na anyị amatala ya. 4 Onye na-asị: “Amatala m ya,” ma ọ naghị eme ihe ndị o nyere n’iwu bụ onye ụgha, eziokwu adịghịkwa ya n’ime. 5 Ma ọ bụrụ na mmadụ na-eme ihe o kwuru, ọ ga-edo anya na onye ahụ hụrụ Chineke n’anya n’eziokwu.+ Ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe a, anyị ga-amata na anyị na ya dị n’otu.+ 6 Onye na-asị na ya na ya dị n’otu kwesịrị ịna-ebi ndụ otú onye ahụ biri.*+
7 Ndị m hụrụ n’anya, ihe m na-edere unu abụghị iwu ọhụrụ, kama ọ bụ iwu ochie unu nụrụ ná mmalite.+ Iwu ochie a bụ okwu ahụ unu nụrụ. 8 M na-edekwara unu iwu ọhụrụ, bụ́ iwu o debere, nke ununwa debekwara, n’ihi na ọchịchịrị alawala, ezigbo ìhè amalitela inwu.+
9 Onye na-asị na ya nọ n’ìhè, ma ya akpọọ nwanna ya asị+ ka nọ n’ọchịchịrị.+ 10 Onye hụrụ nwanna ya n’anya nọsiri ike n’ìhè,+ e nweghịkwa ihe ga-eme ka o mehie.* 11 Ma onye kpọrọ nwanna ya asị nọ n’ọchịchịrị, ọ na-ejekwa ije n’ọchịchịrị,+ ọ maghịkwa ebe ọ na-aga,+ n’ihi na ọchịchịrị emeela ka o kpuo ìsì.
12 Ụmụntakịrị, m na-edere unu ihe a n’ihi na a gbagharala unu mmehie unu n’ihi aha ya.+ 13 Ndị bụ́ nna, m na-edere unu ihe a n’ihi na unu amatala onye ahụ si ná mmalite dịrị. Ụmụ okorobịa, m na-edere unu ihe a n’ihi na unu emeriela ajọ onye ahụ.+ Ụmụntakịrị, m na-edere unu ihe a n’ihi na unu amatala Nna anyị.+ 14 Ndị bụ́ nna, m na-edere unu ihe a n’ihi na unu amatala onye ahụ si ná mmalite dịrị. Ụmụ okorobịa, m na-edere unu ihe a n’ihi na unu siri ike,+ okwu Chineke dịkwa n’ime unu,+ unu emeriekwala ajọ onye ahụ.+
15 Unu ahụla ụwa ma ọ bụ ihe ndị dị n’ụwa n’anya.+ Ọ bụrụ na onye ọ bụla hụrụ ụwa n’anya, ịhụnanya Nna anyị adịghị ya n’ime;+ 16 n’ihi na ihe niile dị n’ụwa, ya bụ, ihe na-agụ anụ ahụ́ agụụ+ na ihe na-agụ anya agụụ+ na mmadụ igosi ihe ndị o nwere,* esighị n’ebe Nna anyị nọ, kama o si n’ụwa. 17 Ụwa na-agafe agafe, ya na ihe na-agụ ya agụụ,+ ma onye na-eme uche Chineke ga-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.+
18 Ụmụntakịrị, ihe a bụ awa ikpeazụ. Unu nụrụ na onye na-emegide Kraịst na-abịa.+ E nweedịla ọtụtụ ndị na-emegide Kraịst ugbu a.+ Ọ bụ ya mere anyị ji mara na ihe a bụ awa ikpeazụ. 19 Ha si n’ebe anyị nọ pụọ, ma anyị na ha abụghị otu;+ n’ihi na a sị na anyị na ha bụ otu, ha gaara eso anyị nọrọ. Ma ha pụrụ ka e wee gosi na anyị na mmadụ niile abụghị otu.+ 20 Onye nsọ ahụ tekwara unu mmanụ,+ unu niile makwa ihe. 21 M na-edere unu ihe a, ọ bụghị maka na unu amaghị eziokwu,+ kama ọ bụ maka na unu ma ya, nakwa maka na e nweghị okwu ụgha na-esi n’eziokwu apụta.+
22 Ọ̀ bụ na ọ bụghị onye na-asị na Jizọs abụghị Kraịst bụ onye ụgha?+ Ọ bụ ya bụ onye na-emegide Kraịst,+ onye na-agọnahụ Nna anyị na Ọkpara ya. 23 Onye ọ bụla nke na-agọnahụ Ọkpara ahụ, ya na Nna anyị adịghị n’otu.+ Ma, onye ọ bụla nke na-ekwupụta na ya kweere n’Ọkpara ahụ,+ ya na Nna anyị dịkwa n’otu.+ 24 Ma ununwa, ka ihe unu nụrụ ná mmalite dịgide n’ime unu.+ Ọ bụrụ na ihe unu nụrụ ná mmalite adịgide n’ime unu, unu na Ọkpara ahụ ga na-adị n’otu, unu na Nna anyị ga na-adịkwa n’otu. 25 Ihe a bụkwa ihe o kwere anyị ná nkwa, ya bụ, ndụ ebighị ebi.+
26 M na-edere unu ihe ndị a banyere ndị na-agbalị ka ha duhie unu. 27 Ma ununwa, mmụọ nsọ o ji tee unu mmanụ+ ka dị n’ime unu, ọ dịghịkwa unu mkpa ka onye ọ bụla na-akụziri unu ihe. Ma mmụọ ahụ o ji tee unu mmanụ na-akụziri unu ihe niile,+ ọ bụkwa eziokwu, ọ bụghị ụgha. Unu na ya dịrị n’otu+ otú mmụọ ahụ kụziiri unu. 28 N’ihi ya, ụmụntakịrị, unu na ya dịrị n’otu, ka anyị wee jiri obi ike kwuo okwu+ mgbe a ga-eme ka ọ pụta ìhè, gharakwa ikwe ka ihere mee ka anyị hapụ ya n’oge ọnụnọ ya. 29 Ọ bụrụ na unu ma na ọ bụ onye ezi omume, unu makwa na onye ọ bụla na-eme ezi omume bụ nwa ya.+
3 Nna anyị hụrụ anyị n’anya nke ukwuu+ wee kwe ka a kpọọ anyị ụmụ Chineke.+ Ọ bụkwa ihe anyị bụ. Ma ụwa amaghị anyị+ n’ihi na ụwa amatabeghị ya.+ 2 Ndị m hụrụ n’anya, anyị bụ ụmụ Chineke ugbu a,+ ma e mebeghị ka ihe anyị ga-abụ pụta ìhè.+ Anyị ma na mgbe a ga-eme ka onye ahụ pụta ìhè, anyị ga-adị ka ya n’ihi na anyị ga-ahụ ya otú ọ dị. 3 Onye ọ bụla nke nwere olileanya a n’ebe ọ nọ na-eme onwe ya ka ọ dị ọcha+ ebe ọ bụ na onye ahụ dị ọcha.
4 Onye ọ bụla nke na-eme mmehie na-emebi iwu, mmehie bụkwa mmebi iwu. 5 Unu makwa na e mere ka onye ahụ pụta ìhè ka e wee wepụ mmehie anyị,+ mmehie ọ bụla adịghịkwa ya n’ime. 6 Onye ọ bụla nke ya na ya dị n’otu anaghị anọgide na-eme mmehie.+ Onye ọ bụla nke nọgidere na-eme mmehie ahụbeghị ya, ọ matabeghịkwa ya. 7 Ụmụntakịrị, unu ekwela ka onye ọ bụla duhie unu. Onye na-eme ezi omume bụ onye ezi omume, otú onye ahụ bụkwa onye ezi omume. 8 Onye na-eme mmehie si n’Ekwensu n’ihi na Ekwensu si ná mmalite* na-eme mmehie.+ Ọ bụ ya mere e ji mee ka Ọkpara Chineke pụta ìhè, ka o bibie ọrụ Ekwensu.+
9 Onye ọ bụla bụ́ nwa Chineke anaghị anọgide na-eme mmehie+ n’ihi na mmụọ* Chineke dị n’ime onye ahụ, o nweghịkwa ike ịnọgide na-eme mmehie n’ihi na ọ bụ nwa Chineke.+ 10 Ọ bụ ihe a ka e ji amata ndị bụ́ ụmụ Chineke na ndị bụ́ ụmụ Ekwensu: Onye ọ bụla na-anaghị eme ezi omume esighị na Chineke, onye na-ahụghị nwanna ya n’anya esighịkwa na ya.+ 11 N’ihi na ihe a bụ ozi unu nụrụ ná mmalite, na anyị kwesịrị ịhụ ibe anyị n’anya.+ 12 Anyị ekwesịghị ịdị ka Ken, onye si n’ajọ onye ahụ, onye gbukwara nwanne ya.+ Gịnị mere o ji gbuo ya? Ọ bụ maka na ọrụ ya jọrọ njọ,+ ma ọrụ nwanne ya dị mma.+
13 Ụmụnna m, ya ejula unu anya na ụwa kpọrọ unu asị.+ 14 Anyị ma na ọ dịbu ka ànyị nwụrụ anwụ, ma anyị dị ndụ ugbu a,+ n’ihi na anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya.+ Onye na-ahụghị ụmụnna ya n’anya dị ka onye nwụrụ anwụ.+ 15 Onye ọ bụla nke kpọrọ nwanna ya asị bụ ogbu mmadụ,+ unu makwa na e nweghị ogbu mmadụ ga-enweta ndụ ebighị ebi.+ 16 Anyị si otú a mata ihe bụ́ ịhụnanya, n’ihi na onye ahụ nyere ndụ* ya n’ihi anyị,+ anyị kwesịkwara inye ndụ* anyị n’ihi ụmụnna anyị.+ 17 Ma onye ọ bụla nke nwere akụ̀ nke ụwa a ma ya ahụ na e nwere ihe na-akpa nwanna ya, ma o kweghị emetere ya ebere,* olee otú ọ ga-esi ekwu na ya hụrụ Chineke n’anya?+ 18 Ụmụntakịrị, anyị kwesịrị ịhụ ụmụnna anyị n’anya, ọ bụghị n’okwu ọnụ ma ọ bụ n’ire,+ kama n’omume+ nakwa n’eziokwu.+
19 Anyị ga-eji ihe a mata na anyị si n’eziokwu, anyị ga-emekwa ka obi sie anyị ike na Chineke hụrụ anyị n’anya 20 n’agbanyeghị ihe ọ bụla nwere ike ime ka obi anyị na-ama anyị ikpe, n’ihi na Chineke karịrị obi anyị, marakwa ihe niile.+ 21 Ndị m hụrụ n’anya, ọ bụrụ na obi anyị anaghị ama anyị ikpe, obi ga-esi anyị ike ịgwa Chineke okwu.+ 22 Anyị na-enweta ihe ọ bụla anyị rịọrọ ya+ maka na anyị na-eme ihe o nyere n’iwu, na-emekwa ihe dị mma n’anya ya. 23 N’eziokwu, ihe a bụ ihe o nyere n’iwu: ka anyị nwee okwukwe n’aha Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst+ ma hụ ibe anyị n’anya,+ otú o nyere anyị n’iwu. 24 Ya na onye na-eme ihe o nyere n’iwu dị n’otu, onye ahụ na yanwa dịkwa n’otu.+ Anyị makwa na anyị na ya dị n’otu n’ihi mmụọ nsọ o nyere anyị.+
4 Ndị m hụrụ n’anya, unu ekwerela okwu niile yiri ka hà si n’aka Chineke,*+ kama chọpụtanụ ma hà si n’aka Chineke n’eziokwu,+ n’ihi na ọtụtụ ndị amụma ụgha abanyela n’ụwa.+
2 Otú a ka unu ga-esi mata okwu si n’aka Chineke: Okwu ọ bụla nke na-egosi na Jizọs Kraịst bụ mmadụ mgbe ọ bịara n’ụwa* bụ okwu si n’aka Chineke.+ 3 Ma okwu ọ bụla nke yiri ka ò si n’aka Chineke, nke na-anaghị egosi na Jizọs bụ mmadụ mgbe ọ bịara n’ụwa, esighị n’aka Chineke.+ Ọ bụkwa ya bụ okwu si n’aka onye na-emegide Kraịst, onye unu nụrụ na ọ na-abịa.+ Ugbu a, ọ nọrọla anọrọ n’ụwa.+
4 Ụmụntakịrị, unu si na Chineke, unu emeriekwala ha,+ n’ihi na onye unu na ya dị n’otu+ karịrị onye ya na ụwa dị n’otu.+ 5 Ha si n’ụwa.+ Ọ bụ ya mere ha ji na-ekwu ihe si n’ụwa, ụwa na-egekwa ha ntị.+ 6 Anyị si na Chineke. Onye ọ bụla nke ma Chineke na-ege anyị ntị.+ Onye ọ bụla na-esighị na Chineke anaghị ege anyị ntị.+ Ọ bụ otú a ka anyị si amata okwu nke bụ́ eziokwu na nke bụ́ ụgha.+
7 Ndị m hụrụ n’anya, ka anyị na-ahụ ibe anyị n’anya,+ n’ihi na ịhụnanya si n’aka Chineke. Onye ọ bụla nke hụrụ ndị ọzọ n’anya bụ nwa Chineke, ọ makwa Chineke.+ 8 Onye ọ bụla na-anaghị ahụ ndị ọzọ n’anya amaghị Chineke, n’ihi na Chineke bụ ịhụnanya.+ 9 Ọ bụ otú a ka e si mee ka anyị mata na Chineke hụrụ anyị n’anya: Chineke zitere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya+ n’ụwa ka anyị wee si n’aka ya nweta ndụ.+ 10 Otú a ka ịhụnanya a dị: Ọ bụghị na ọ bụ anyị hụrụ Chineke n’anya, kama ọ bụ ya hụrụ anyị n’anya wee zite Ọkpara ya ka ọ bụrụ àjà maka mmehie anyị+ nke ga-eme ka anyị na ya dị n’udo.+
11 Ndị m hụrụ n’anya, ọ bụrụ otú a ka Chineke si hụ anyị n’anya, anyị kwesịkwara ịna-ahụ ibe anyị n’anya.+ 12 E nweghị onye hụtụrụla Chineke mgbe ọ bụla.+ Ọ bụrụ na anyị anọgide na-ahụ ibe anyị n’anya, Chineke ga-anọgide n’ime anyị, a ga-emekwa ka ịhụnanya ya zuo okè n’ime anyị.+ 13 Otú anyị si mara na anyị na ya ka dị n’otu, yanwa na anyịnwa adịrịkwa n’otu, bụ maka na o nyela anyị mmụọ ya. 14 Anyị ahụkwala ma na-agba àmà na Nna anyị zitere Ọkpara ya ka ọ bụrụ onye ga-azọpụta ụwa.+ 15 Onye ọ bụla nke kwetara na Jizọs Kraịst bụ Ọkpara Chineke,+ Chineke na onye ahụ ga na-adị n’otu, onye ahụ na Chineke ga na-adịkwa n’otu.+ 16 Anyị amatakwala ma kwere na Chineke hụrụ anyị n’anya.+
Chineke bụ ịhụnanya.+ Onye nọgidere na-ahụ ndị ọzọ n’anya, ya na Chineke ga na-adị n’otu, Chineke na onye ahụ ga na-adịkwa n’otu.+ 17 Otú a ka e si mee ka ịhụnanya zuo okè n’ime anyị, ka anyị wee jiri obi ike kwuo okwu+ n’ụbọchị ikpe, n’ihi na ọ bụ otú onye ahụ dị ka anyịnwa dị n’ụwa a. 18 Egwu ọ bụla adịghị n’ịhụnanya,+ kama ịhụnanya nke zuru okè na-achụpụ egwu, n’ihi na egwu na-egbochi anyị ime ihe anyị ga-emeli. N’eziokwu, e mebeghị ka onye na-atụ egwu zuo okè n’ịhụnanya.+ 19 Anyị na-ahụ ndị ọzọ n’anya n’ihi na o bu ụzọ hụ anyị n’anya.+
20 Ọ bụrụ na onye ọ bụla asị: “Ahụrụ m Chineke n’anya,” ma ya akpọọ nwanna ya asị, ọ bụ onye ụgha.+ N’ihi na onye na-ahụghị nwanna ya n’anya,+ bụ́ onye ọ na-ahụ anya, agaghị ahụli Chineke n’anya, bụ́ onye ọ na-anaghị ahụ anya.+ 21 Ọ bụkwa ihe a ka o nyere anyị n’iwu, na onye ọ bụla hụrụ Chineke n’anya kwesịkwara ịhụ nwanna ya n’anya.+
5 Onye ọ bụla nke kweere na Jizọs bụ Kraịst bụ nwa Chineke,+ onye ọ bụla nke hụkwara Chineke n’anya hụrụ ụmụ Chineke n’anya. 2 Ọ bụrụ na anyị ahụ Chineke n’anya ma na-eme ihe o nyere n’iwu, anyị ga-eji ya amata na anyị hụrụ ụmụ Chineke n’anya.+ 3 N’ihi na ịhụ Chineke n’anya pụtara ịna-eme ihe ndị o nyere n’iwu,+ ihe ndị o nyere n’iwu esighịkwa oké ike,*+ 4 maka na onye* ọ bụla bụ́ nwa Chineke na-emeri ụwa.+ Ọ bụkwa okwukwe anyị ka anyị ji merie ụwa.+
5 Ònye ga-emerili ụwa?+ Ọ̀ bụ na ọ bụghị onye nwere okwukwe na Jizọs bụ Ọkpara Chineke?+ 6 Ọ bụ onye a bụ onye ji mmiri na ọbara bịa, ya bụ, Jizọs Kraịst. Ọ bụghị naanị mmiri ka o ji,+ kama o ji mmiri na ọbara.+ Mmụọ nsọ na-agbakwa àmà,+ n’ihi na mmụọ nsọ bụ eziokwu ahụ. 7 N’ihi na e nwere ihe atọ na-agba àmà: 8 mmụọ nsọ+ na mmiri+ na ọbara;+ ha atọ na-ekwekọrịtakwa.
9 Anyị na-anabata àmà ndị mmadụ na-agba, ma àmà Chineke na-agba ka nke ha. N’ihi na àmà Chineke na-agba bụ àmà ọ gbara banyere Ọkpara ya. 10 Onye nwere okwukwe n’Ọkpara Chineke ejirila obi ya nabata àmà a gbaara ya. Onye na-enweghị okwukwe na Chineke emeela ya onye ụgha,+ n’ihi na o nweghị okwukwe n’àmà Chineke gbara banyere Ọkpara ya. 11 Ihe a bụ àmà ahụ a gbara, na Chineke nyere anyị ndụ ebighị ebi,+ anyị sikwa n’aka Ọkpara ya enweta ndụ a.+ 12 Onye ya na Ọkpara Chineke dị n’otu* nwere ndụ a. Onye ya na Ọkpara ahụ na-adịghị n’otu* enweghị ndụ a.+
13 M na-edere unu ihe ndị a ka unu wee mara na unu nwere ndụ ebighị ebi,+ unu ndị nwere okwukwe n’aha Ọkpara Chineke.+ 14 Obi ike anyị nwere n’ebe ọ nọ*+ bụ na ihe ọ bụla anyị rịọrọ ya nke dabara n’uche ya, ọ na-anụ olu anyị.+ 15 Ebe ọ bụ na anyị ma na ọ na-anụ ihe ọ bụla anyị na-arịọ ya, anyị ma na anyị ga-enweta ihe anyị na-arịọ, ebe ọ bụ ya ka anyị rịọrọ ihe ndị ahụ.+
16 Ọ bụrụ na onye ọ bụla ahụ nwanna ya ka ọ na-eme mmehie na-anaghị akpata ọnwụ, ọ ga-arịọrọ ya arịrịọ, Chineke ga-enyekwa ya ndụ,+ ya bụ, ndị na-anaghị eme mmehie na-akpata ọnwụ.+ Ma, e nwere mmehie na-akpata ọnwụ. Ọ bụghị mmehie a ka m na-agwa ya ka ọ rịọ arịrịọ maka ya. 17 Ajọ omume niile bụ mmehie,+ ma e nwere mmehie na-anaghị akpata ọnwụ.
18 Anyị ma na onye ọ bụla bụ́ nwa Chineke anaghị anọgide na-eme mmehie, kama onye ahụ bụ́ nwa Chineke* na-eche ya nche, ajọ onye ahụ agaghịkwa ejideli ya.*+ 19 Anyị ma na anyị si na Chineke, ma ụwa niile dị n’aka ajọ onye ahụ.+ 20 Ma anyị ma na Ọkpara Chineke abịala,+ o meekwala ka anyị nwee ikike ịghọta ihe, ka anyị wee mara onye ahụ bụ́ ezigbo onye. Anyị na ezigbo onye ahụ esikwala n’aka Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst dị n’otu.+ Ọ bụ onye a bụ ezi Chineke na ndụ ebighị ebi.+ 21 Ụmụntakịrị, kpacharanụ anya ka unu ghara ikpere arụsị.+
Ma ọ bụ “ọchịchịrị ọ bụla adịghị n’ime ya.”
Ya bụ, ịna-eme ihe ọjọọ.
Ya bụ, ịna-eme ihe Chineke kwuru.
Na Grik, “ije ije otú onye ahụ jere.”
Na Grik, “ọ daa.”
Ma ọ bụ “mmadụ iji ihe ndị o nwere etu ọnụ.”
Ma ọ bụ “si na mgbe ọ malitere.”
Na Grik, “mkpụrụ.” Ya bụ, mkpụrụ nke na-amịpụta ihe.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “enwere ya ọmịiko.”
Na Grik, “ekwerela mmụọ ọ bụla.”
Na Grik, “Kraịst bịara n’anụ ahụ́.”
Na Grik, “adịghịkwa arọ.”
Na Grik, “ihe.”
Na Grik, “Onye nwere Ọkpara ahụ.”
Na Grik, “Onye na-enweghị Ọkpara Chineke.”
Ma ọ bụ “Ihe mere anyị ji agwa ya okwu n’atụghị ụjọ.”
Ya bụ, Jizọs Kraịst, Ọkpara Chineke.
Ma ọ bụ “agaghịkwa emeli ya ihe ọ bụla.”