AKWỤKWỌ OZI E DEGAARA NDỊ GALESHIA
1 Mụnwa bụ́ Pọl onyeozi na-edetara unu akwụkwọ ozi. Ọ bụghị mmadụ ma ọ bụ ndị mmadụ họpụtara m ka m bụrụ onyeozi, kama ọ bụ Jizọs Kraịst+ na Chineke Nna,+ onye si n’ọnwụ kpọlite ya. 2 Mụ na ụmụnna niile mụ na ha nọ na-edetara unu, ọgbakọ ndị dị na Galeshia, akwụkwọ ozi:
3 Ka amara na udo si n’aka Chineke Nna anyị nakwa n’aka Onyenwe anyị Jizọs Kraịst dịrị unu. 4 Kraịst nyere onwe ya maka mmehie anyị+ ka o wee napụta anyị n’oge* ọjọọ e nwere ugbu a+ otú Chineke anyị, bụ́ Nna anyị, chọrọ.+ 5 Ka otuto dịrị Chineke ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.
6 O juru m anya na unu ji ọsọ na-ahapụ Onye si n’amara Kraịst kpọọ unu ma na-aṅa ntị n’ụdị ozi ọma ọzọ.+ 7 Ọ bụghị na e nwere ozi ọma ọzọ; kama e nwere ụfọdụ ndị na-akpatara unu nsogbu+ ma na-achọ imebi ozi ọma banyere Kraịst. 8 Ma, ọ bụrụgodị na onye ọ bụla n’ime anyị ma ọ bụ mmụọ ozi nke si n’eluigwe ezie unu ozi ọma karịrị nke anyị ziri unu, a ga-abụ ya ọnụ. 9 Ana m ekwu ya ọzọ ugbu a otú anyị kwuburu ya, sị, Onye ọ bụla nke na-ezi unu ozi ọma karịrị ihe unu nabatara, a ga-abụ ya ọnụ.
10 Ọ̀ bụ mmadụ ka m na-agbalị ugbu a ka m meta mma, ka ọ̀ bụ Chineke? Ka m̀ na-agbalị ka m mee ihe dị ndị mmadụ mma? Ọ bụrụ na m ka na-eme ihe dị ndị mmadụ mma, agaghị m abụ ohu Kraịst. 11 Ụmụnna m, m chọrọ ka unu mara na ozi ọma m ziri unu esighị n’aka ụmụ mmadụ;+ 12 n’ihi na anataghị m ya mmadụ. Ọ bụghịkwa mmadụ kụziiri m ya, kama ọ bụ Jizọs Kraịst kpugheere m ya.
13 Ama m na unu nụrụ àgwà m kpara n’oge gara aga mgbe m na-ekpe okpukpe ndị Juu,+ na m nọ na-akpagbusi ọgbakọ Chineke ike ma na-agbalị ka m bibie ya.+ 14 M nọkwa na-eme nke ọma n’okpukpe ndị Juu karịa ọtụtụ ndị ọgbọ m ná mba anyị, n’ihi na m na-anụrụ omenala nna nna m hà ọkụ n’obi nke ukwuu.+ 15 Ma mgbe Chineke, bụ́ onye mere ka m si n’afọ nne m pụta ma kpọọ m n’ihi amara ya,+ chọrọ 16 ka o si n’aka m kpughee Ọkpara ya, ka m wee zie ndị mba ọzọ ozi ọma banyere ya,+ e nweghị mmadụ* ọ bụla m gakwuuru ozugbo ka m jụta ya ihe ọ bụla. 17 Agbagoghịkwa m Jeruselem ka m jụta ndị bu m ụzọ bụrụ ndịozi ihe, kama m gawara Arebia, mechaa lọghachi Damaskọs.+
18 Mgbe afọ atọ gachara, m gbagoro Jeruselem+ ka m hụ Sifas,*+ mụ na ya nọkwara ụbọchị iri na ise. 19 Ma ahụghị m ndịozi ndị ọzọ ma e wepụ Jems,+ nwanne Onyenwe anyị. 20 Ma ana m agwa unu n’ihu Chineke na ihe m na-edetara unu n’akwụkwọ ozi a abụghị ụgha ka m na-agha.
21 M mechara gawa n’ógbè ndị dị na Siria na Silishia.+ 22 Ma ọgbakọ ndị dị na Judia, bụ́ ndị ha na Kraịst dị n’otu, ahụtụbeghị m. 23 Naanị ihe ha na-anụ bụ: “Nwoke ahụ nke kpagburu anyị n’oge gara aga+ na-ezisazi ozi ọma banyere okwukwe ahụ ọ gbaburu mbọ ka o bibie.”+ 24 N’ihi ya, ha malitere ito Chineke n’ihi m.
2 Mgbe afọ iri na anọ gachara, m gaghachiri Jeruselem, mụ na Banabas,+ m kpọkwa Taịtọs.+ 2 Ihe mere m ji gaa bụ maka na e kpugheere m ka m gaa. M kọkwaara ụmụnna a na-akwanyere ùgwù banyere ozi ọma m na-ekwusa ná mba dị iche iche. Ma, ọ bụ naanị ụmụnna ahụ a na-akwanyere ùgwù ka m kọọrọ ya maka na m chọrọ ijide n’aka na ọsọ m na-agba ma ọ bụ nke m gbarala agba abụghị n’efu. 3 Ma, e nweghịdị onye siri ọnwụ ka e bie Taịtọs+ onye mụ na ya so úgwù,+ n’agbanyeghị na ọ bụ onye Grik. 4 Ma ihe meziri okwu ahụ ji bido bụ na e nwere ụmụnna ụgha e ji nwayọọ kpọbata,+ ndị gbebatara ka ha mee ka anyị gharazie inwere onwe anyị+ otú anyị nweere onwe anyị maka na anyị na Kraịst Jizọs dị n’otu, ka ha wee mee ka anyị bụrụ ndị ohu.+ 5 Anyị emeghị ihe ha chọrọ,+ anyị emeghịdị ya ma otu,* ka unu wee jisie eziokwu nke ozi ọma ahụ aka ike.
6 Ma gbasara ndị ahụ yiri ka è nwere ihe ha bụ,+ e nweghị ihe ọhụrụ ọ bụla ndị ahụ a na-akwanyere ezigbo ùgwù kụziiri m. Ụdị ndị ọ sọkwara ha bụrụ n’oge gara aga, ọ gbasaghị m, n’ihi na ihe Chineke na-ele abụghị otú mmadụ dị n’elu ahụ́. 7 Ma, mgbe ha hụrụ na e nyere m ọrụ izi ndị a na-ebighị úgwù ozi ọma,+ otú e nyere Pita ọrụ izi ndị e biri úgwù ozi ọma, 8 (n’ihi na ọ bụ onye mere ka Pita bụrụ onyeozi ndị e biri úgwù mekwara ka mụnwa bụrụ onyeozi ndị mba ọzọ)+ 9 mgbe ha ghọtakwara amara Chineke meere m,+ Jems+ na Sifas* na Jọn, bụ́ ndị e weere ka idé ji ọgbakọ, kwere mụ na Banabas n’aka+ iji gosi na anyị na ha ga na-arụkọ ọrụ, ka anyị wee gakwuru ndị mba ọzọ, hanwa agakwuru ndị e biri úgwù. 10 Naanị ihe ha gwara anyị bụ ka anyị na-echeta ndị ogbenye. Ana m agbasikwa mbọ ike ime ihe a ha kwuru.+
11 Ma mgbe Sifas*+ bịara Antiọk,+ agwara m ya okwu ihu na ihu n’ihi na o mere ihe jọgburu onwe ya. 12 N’ihi na tupu ndị Jems+ zitere abịa, ọ na-esobu ndị mba ọzọ eri ihe.+ Ma mgbe ha bịarutere, ọ kwụsịrị iso ha eri ihe na iso ha akpa, maka na ọ na-atụ egwu ndị ahụ e biri úgwù.+ 13 Ndị Juu ndị ọzọ sokwaara ya mewe ihu abụọ ahụ. Banabas sodịịrị ha mewe ihu abụọ ahụ ha mere. 14 Ma mgbe m hụrụ na ha anaghị eme ihe bụ́ eziokwu a kụziiri unu mgbe e ziri unu ozi ọma,+ m nọ n’ihu ha niile gwa Sifas,* sị: “Ọ bụrụ na gịnwa bụ́ onye Juu na-ebi ndụ ka ndị mba ọzọ kama ibi ndụ ka ndị Juu, gịnịzi mere i ji chọọ ime ka ndị mba ọzọ mewe omenala ndị Juu?”+
15 Anyịnwa bụ ndị Juu mgbe a mụrụ anyị. Anyị abụghị ndị mba ọzọ bụ́ ndị na-eme mmehie. 16 Anyị ghọtara na ọ bụghị mmadụ ime ihe e kwuru n’iwu ga-eme ka a kpọọ ya onye ezi omume, kama ọ bụ naanị ma onye ahụ nwee okwukwe+ na Jizọs Kraịst.+ N’ihi ya, anyị nwere okwukwe na Kraịst Jizọs ka e wee kpọọ anyị ndị ezi omume maka na anyị nwere okwukwe na Kraịst, ọ bụghị maka na anyị na-eme ihe e kwuru n’iwu, n’ihi na e nweghị onye* a ga-akpọ onye ezi omume maka na ọ na-eme ihe e kwuru n’iwu.+ 17 Ma, ọ bụrụ na e wekwaara anyị ka ndị mmehie maka na anyị na-agbalị ka a kpọọ anyị ndị ezi omume n’ihi okwukwe anyị nwere na Kraịst, ọ̀ pụtara na Kraịst na-ejere mmehie ozi? Mbanụ! 18 Ọ bụrụ na m na-arụghachi ihe ndị m kwatuburu, m na-egosi na m na-emebi iwu. 19 N’ihi na m nwụrụ anwụ ma a bịa n’idebe iwu,+ ka m wee dị ndụ jewere Chineke ozi. 20 A kpọgidere mụ na Kraịst n’osisi.+ Ọ bụghịzi mụnwa dị ndụ,+ kama Kraịst dị ndụ, mụ na ya dịkwa n’otu. N’eziokwu, otú m si ebi ndụ ugbu a dabara n’okwukwe m nwere n’Ọkpara Chineke,+ onye hụrụ m n’anya ma nyefee ndụ ya n’ihi m.+ 21 Anaghị m ajụ amara Chineke,+ n’ihi na ọ bụrụ na ime ihe e kwuru n’iwu na-eme ka a kpọọ mmadụ onye ezi omume, ọ pụtara na Kraịst nwụrụ n’efu.+
3 Unu ndị Galeshia na-enweghị uche, ònye ghọgburu unu,+ unu ndị e mere ka o doo anya na a kpọgidere Jizọs Kraịst n’osisi?+ 2 Otu ihe a ka m chọrọ ịjụ* unu: Ùnu nwetara mmụọ nsọ maka na unu na-eme ihe e kwuru n’iwu, ka ọ̀ bụ maka na unu nwere okwukwe n’ihe unu nụrụ?+ 3 Na unu enweghị uche ọ̀ bụzi nke otú a? Ná mmalite, unu nọ na-eme ihe dị mmụọ Chineke mma. Ma ugbu a, ùnu na-agbalịzi ime ihe dị mmadụ mma ka unu nweta ihe unu na-achọ?+ 4 Ahụhụ niile unu tara ọ̀ bụ n’efu? N’eziokwu, ama m na ọ bụghị n’efu. 5 N’ihi ya, onye ahụ nke na-enye unu mmụọ nsọ ma na-arụ ọrụ ebube n’etiti unu,+ ọ̀ na-eme ya maka na unu na-eme ihe e kwuru n’iwu, ka ọ̀ bụ maka na unu nwere okwukwe n’ihe unu nụrụ? 6 Ọ̀ bụ na ọ bụghị eziokwu na Ebreham “nwere okwukwe na Jehova,* e wee kpọọ ya onye ezi omume”?+
7 N’eziokwu, unu ma na ọ bụ ndị nwere okwukwe bụ ụmụ Ebreham.+ 8 Ma ebe ọ bụ na Chineke kwuru n’Akwụkwọ Nsọ n’ogologo oge gara aga na a ga-akpọ ndị mba ọzọ ndị ezi omume maka na ha nwere okwukwe, o bu ụzọ zie Ebreham ozi ọma, sị: “A ga-esi n’aka gị gọzie mba niile.”+ 9 N’ihi ya, a na-agọzi ndị nwere okwukwe otú a gọziri Ebreham, onye nwere okwukwe.+
10 Ndị niile tụkwasịrị obi ná mbọ ha na-agba ka ha debe iwu, a ga-abụ ha ọnụ, n’ihi na e dere, sị: “Onye ọ bụla na-anaghị eme ihe niile e dere n’akwụkwọ mpịakọta Iwu ahụ* mgbe niile, a ga-abụ ya ọnụ.”+ 11 O dokwara anya na Chineke anaghị akpọ onye ọ bụla onye ezi omume maka na ọ na-eme ihe e kwuru n’iwu,+ n’ihi na “onye ezi omume ga-adị ndụ maka na o nwere okwukwe.”+ 12 Ma ọ bụghị okwukwe ka e ji edebe Iwu ahụ.* Kama, “onye ọ bụla na-eme ihe ndị a ga-adị ndụ maka na ọ na-eme ha.”+ 13 Kraịst zụtara anyị,+ tọhapụ anyị+ n’ọnụ Iwu ahụ* bụrụ anyị wee bụrụ onye a bụrụ ọnụ kama anyịnwa ga-abụ ndị a bụrụ ọnụ, n’ihi na e dere, sị: “Onye ọ bụla a kwụwara n’osisi bụ onye a bụrụ ọnụ.”+ 14 E mere ihe a ka ngọzi e kwere Ebreham ná nkwa wee si n’aka Jizọs Kraịst ruo ndị mba ọzọ aka,+ ka okwukwe anyị nwere wee mee ka anyị nweta mmụọ nsọ+ e kwere ná nkwa.
15 Ụmụnna m, eji m ihe ndị mmadụ na-eme amara unu atụ: A gbahaala ndụ, kachie ya, ọ bụrụgodị nke mmadụ gbara, e nweghị onye na-akagbu ya ma ọ bụ tụkwasị ihe na ya. 16 Ọ bụ Ebreham na nwa* ya ka e kwere nkwa ndị ahụ.+ Ihe e kwuru abụghị, “na ụmụ gị,”* ka à ga-asị na a na-ekwu banyere ọtụtụ ụmụ. Kama, a sịrị “na nwa gị,”* ya bụ, otu onye, bụ́ Kraịst.+ 17 M na-ekwukwa, sị: Iwu ahụ* nke malitere mgbe narị afọ anọ na iri atọ (430) gachara+ akagbughị ọgbụgba ndụ ahụ Chineke gbara, o meghịkwa ka nkwa ahụ ghara inwe isi. 18 N’ihi na ọ bụrụ na ọ bụ iwu mere o ji keta ihe ahụ, ọ bụghịzi n’ihi nkwa e kwere ya. Ma Chineke ji obiọma kenye Ebreham ihe ahụ n’ihi nkwa o kwere Ebreham.+
19 Gịnịzi mere e ji nye Iwu ahụ?* E nyere ya ka a mata ihe ọjọọ ndị mmadụ na-eme+ ruo mgbe nwa* ahụ ga-abịa,+ bụ́ onye e kwere nkwa ahụ. E nyere ya ndị mmụọ ozi,+ ha esi n’aka onye ogbugbo nyeruo ya.+ 20 A naghị enwe onye ogbugbo mgbe ọ bụ naanị otu onye kwere nkwa. Ma, ọ bụ naanị Chineke kwere nkwa a. 21 N’ihi ya, Iwu ahụ* ò megidere nkwa Chineke? Mbanụ! N’ihi na ọ bụrụ na e nyere iwu nke ga-emeli ka mmadụ dị ndụ, ime ihe e nyere n’iwu gaara eme ka anyị bụrụ ndị ezi omume. 22 Ma Akwụkwọ Nsọ mere ka ihe niile dịrị n’okpuru mmehie, ka ndị nwere okwukwe na Jizọs Kraịst wee nweta nkwa Chineke kwere ndị nwere okwukwe.
23 Ma tupu okwukwe ahụ erute, iwu nọ na-edu anyị, anyị nọkwa n’okpuru ya, na-atụ anya okwukwe ahụ a ga-ekpughe n’oge na-adịghị anya.+ 24 N’ihi ya, Iwu ahụ* ghọrọ onye na-edu anyị agakwuru Kraịst,+ ka e wee kpọọ anyị ndị ezi omume n’ihi okwukwe.+ 25 Ma ebe ọ bụ na okwukwe ahụ erutela,+ anyị anọghịzi n’okpuru onye nduzi.+
26 N’eziokwu, unu niile bụ ụmụ Chineke+ maka na unu nwere okwukwe na Kraịst Jizọs.+ 27 N’ihi na unu niile ndị e mere baptizim ka unu na Kraịst dịrị n’otu eyirila Kraịst ka uwe.+ 28 E nweghị onye Juu ma ọ bụ onye Grik.+ E nweghị ohu ma ọ bụ onye nweere onwe ya.+ E nweghịkwa nwoke ma ọ bụ nwaanyị,+ n’ihi na unu niile bụ otu, unu na Kraịst Jizọs dịkwa n’otu.+ 29 Ọ bụrụkwa na unu bụ nke Kraịst, unu bụ ụmụ* Ebreham n’eziokwu,+ ndị ga-eketa+ ihe e kwere ná nkwa.+
4 Ma m na-agwa unu na ọ bụrụhaala na onye ga-eketa ihe nna ya ka bụ nwata, e nweghị ihe dị iche ya na ohu, n’agbanyeghị na ọ bụ ya nwe ihe niile. 2 Kama ọ na-anọ n’okpuru ndị na-elekọta ya nakwa n’okpuru ndị na-elekọta ụlọ ruo ụbọchị nna ya kara aka. 3 Otú ahụ ka ọ dịkwa anyị. Mgbe anyị bụ ụmụntakịrị, anyị bụ ndị ohu maka na anyị nọ na-ele ihe anya otú ụwa si ele ya.*+ 4 Ma mgbe oge a kara aka ruru, Chineke zitere Ọkpara ya, bụ́ onye nwaanyị mụrụ,+ onye nọkwa n’okpuru iwu,+ 5 ka o wee zụrụ ndị nọ n’okpuru iwu ma tọhapụ ha,+ ka e wee mee ka anyị bụrụ ụmụ Chineke.+
6 Ebe ọ bụ na unu bụ ụmụ, Chineke etinyela mmụọ+ nke Ọkpara ya n’obi anyị.+ Mmụọ ahụ na-etikwa mkpu, sị: “Aba,* Nna!”+ 7 N’ihi ya, onye ọ bụla n’ime unu abụghịzi ohu, kama ọ bụ nwa. Ọ bụrụkwa na ọ bụ nwa, o sorola ná ndị Chineke mere ka ha bụrụ ndị ga-eketa ihe.+
8 Ma mgbe unu na-amaghị Chineke, unu nọ na-agbara chi ụgha dị iche iche ohu. 9 Ma ugbu a unu matarala Chineke, ma ọ bụkwanụ ugbu a Chineke matarala unu, gịnịzi mere unu ji na-alaghachi n’ihe ndị na-enweghị isi+ na ihe ndị na-abaghị uru dị n’ụwa ma na-achọ ka unu gbawara ha ohu ọzọ?+ 10 Unu na-agbasi mbọ ike na-edebe ụbọchị na ọnwa+ na oge a kara aka na afọ. 11 Egwu na-atụ m, n’ihi na ọ dị ka mbọ niile m gbara n’isi unu efuola ọhịa.
12 Ụmụnna m, ana m arịọ unu ka unu dịrị ka m, n’ihi na e nwekwara mgbe m dị ka unu.+ Unu emeghị m ihe ọjọọ ọ bụla. 13 Ma unu ma na ọ bụ ọrịa m rịara mere m ji nweta ohere mbụ m ji zie unu ozi ọma. 14 N’agbanyeghị na ọrịa m bụụrụ unu ọnwụnwa, unu eledaghị m anya ma ọ bụ sọwa m oyi.* Kama unu nabatara m ka à ga-asị na m bụ mmụọ ozi Chineke ma ọ bụkwanụ Kraịst Jizọs. 15 Oleezi ihe mere na obi adịkwaghị unu ụtọ? N’ihi na o doro m anya na ọ bụrụ na o kwere unu omume, unu gaara aghụpụta anya unu nye m.+ 16 M̀ ghọziela onye iro unu maka na m na-agwa unu eziokwu? 17 Ihe mere ha ji agbasi mbọ ike ka ha nweta unu abụghị na ha buuru unu ihe ọma n’obi, kama ha chọrọ ime ka mụ na unu kwụsị ịdị ná mma, ka unu wee sosiwe ha ike. 18 Ma, ọ bụghị ihe ọjọọ ma mmadụ gbasiwe mbọ ike ka o nweta unu, ọ bụrụhaala na o buuru unu ihe ọma n’obi. O kwesịghịkwa ịbụ naanị mgbe mụ na unu nọ, kama o kwesịrị ịbụ n’oge niile. 19 Ụmụntakịrị m,+ otú ahụ́ si afụ nwaanyị ụfụ mgbe ọ na-amụ nwa ka ahụ́ na-afụ m ụfụ ọzọ n’ihi unu. Ọ ga na-afụ m ụfụ ruo mgbe unu ga-akpawa àgwà ka Kraịst. 20 Ọ dị m ka ya bụrụ na mụ na unu nọ ugbu a ka m si otú ọzọ gwa unu okwu, n’ihi na ihe unu na-eme gbagwojuru m anya.
21 Gwanụ m, unu ndị chọrọ ka iwu na-achị unu, ọ̀ bụ na unu amaghị ihe Iwu ahụ* na-ekwu? 22 Dị ka ihe atụ, e dere na Ebreham mụtara ụmụ abụọ. Nwa agbọghọ na-ejere ya ozi mụụrụ ya otu,+ nwaanyị nke nweere onwe ya amụọrọ ya otu.+ 23 Ma a mụrụ nwa nke nwa agbọghọ ahụ na-eje ozi otú e si amụ ụmụaka ndị ọzọ,+ mụọ nwa nke nwaanyị ahụ nweere onwe ya n’ihi nkwa e kwere.+ 24 E nwere ike iwere ihe ndị a ka ihe atụ nke nwere ihe ọ pụtara; n’ihi na ụmụ nwaanyị ndị a pụtara ọgbụgba ndụ abụọ. Nke a gbara n’Ugwu Saịnaị+ bụ Hega. Ụmụ niile ọ na-amụ bụ ndị ohu. 25 Hega pụtara Saịnaị,+ bụ́ ugwu dị n’Arebia. Ọ nọchiri anya Jeruselem dị ugbu a, n’ihi na Jeruselem na ụmụ ya bụ ndị ohu. 26 Ma Jeruselem nke dị n’elu nweere onwe ya, ọ bụkwa ya bụ nne anyị.
27 N’ihi na e dere, sị: “Nwaanyị aga, ṅụrịa ọṅụ. Nwaanyị ime na-emetụbeghị, tie mkpu ọṅụ; n’ihi na ụmụ nke nwaanyị di ya jụrụ* dị ọtụtụ karịa ụmụ nke nwaanyị nwere di.”+ 28 Ụmụnna m, unu bụ ụmụ a mụrụ n’ihi nkwa e kwere, otú Aịzik bụ.+ 29 N’oge ahụ, nke a mụrụ otú e si amụ ụmụaka ndị ọzọ malitere ịkpagbu nke e si n’ike mmụọ nsọ mụọ.+ Otú ahụ ka ọ dịkwa taa.+ 30 Ma, gịnị ka e kwuru n’Akwụkwọ Nsọ? “Chụpụ nwa agbọghọ ahụ na-eje ozi na nwa ya, n’ihi na nwa nwa agbọghọ ahụ na-eje ozi agaghị eso nwa nke nwaanyị ahụ nweere onwe ya keta akụnụba gị.”+ 31 N’ihi ya, ụmụnna m, anyị bụ ụmụ nwaanyị ahụ nweere onwe ya. Anyị abụghị ụmụ nwa agbọghọ na-eje ozi.
5 Ọ bụ ka anyị nwere onwe anyị otú a mere Kraịst ji tọhapụ anyị. N’ihi ya, nọgidenụ na-abụ ndị nweere onwe ha.+ Unu ekwekwala ka e mee ka unu bụrụ ndị ohu ọzọ.+
2 Mụnwa bụ́ Pọl na-agwa unu na ọ bụrụ na e bie unu úgwù, e nweghị uru Kraịst ga-abara unu.+ 3 Ana m echetakwara onye ọ bụla e biri úgwù na o kwesịrị ịna-edebe Iwu ahụ* niile.+ 4 Unu na Kraịst adịghịzi n’otu, unu ndị na-agbalị ka a kpọọ unu ndị ezi omume maka na unu na-edebe iwu.+ Unu emeela ka amara ya gharazie ịna-eru unu aka. 5 Ma, ebe mmụọ Chineke na-edu anyị, anyị na-echeresi ike ma na-atụ anya na a ga-ewere anyị ka ndị ezi omume n’ihi okwukwe anyị nwere. 6 N’ihi na e nweghị uru ibi úgwù ma ọ bụ ebighị úgwù baara ndị ha na Kraịst Jizọs dị n’otu,+ kama ihe ka mkpa bụ okwukwe ha nwere nke ha na-egosi n’ịhụ ndị ọzọ n’anya.
7 Unu na-agbabu ọsọ nke ọma.+ Ole ndị mere ka unu kwụsị irubere eziokwu isi? 8 Ụdị ihe a ha na-akụziri unu esighị n’aka Onye ahụ na-akpọ unu. 9 Obere ihe iko achịcha na-eme ka ntụ ọka niile a gwakọtara agwakọta koo.+ 10 Obi siri m ike na unu ndị ha na Onyenwe anyị dị n’otu+ agaghị eche ihe dị iche n’ihe m chere. Ma a ga-ata onye ọ bụla na-akpatara unu nsogbu+ ahụhụ kwesịịrị ya, onye ọ sọkwara ya bụrụ. 11 Ụmụnna m, ọ bụrụ na m ka na-akụzi na e kwesịrị ibi mmadụ úgwù, gịnị mere a ka ji na-akpagbu m? Ọ pụtara na ihe m na-akụzi banyere ọnwụ Jizọs nwụrụ n’osisi ịta ahụhụ*+ agaghịzi abụ ihe mkpọbi ụkwụ. 12 Ọ dị m ka ya bụrụ na ndị na-agba mbọ ime ka unu daa ga-ebepụ onwe ha ihe ha ji bụrụ nwoke.*
13 Ụmụnna m, a kpọrọ unu ka unu nwere onwe unu. Ma unu ejila maka na unu nweere onwe unu na-eme ihe na-agụ ahụ́ unu agụụ,+ kama ka ịhụnanya mee ka unu na-agbara ibe unu ohu.+ 14 N’ihi na e mezuola* Iwu ahụ* niile n’otu iwu, ya bụ: “Hụ onye agbata obi gị n’anya otú ị hụrụ onwe gị.”+ 15 Ma, ọ bụrụ na unu ana-emerụ ibe unu ahụ́ ma na-emegbu ibe unu,+ kpacharanụ anya ka unu ghara ibibi ibe unu.+
16 Ma m na-agwa unu, sị, Na-ekwenụ ka mmụọ nsọ na-edu unu,+ unu agaghịkwa eme ihe ọ bụla na-agụ ahụ́ unu agụụ.+ 17 N’ihi na ihe na-agụ ahụ́ agụụ na-eme ka ahụ́ na-emegide mmụọ nsọ, mmụọ nsọ ana-emegidekwa ahụ́. Ha na-emegide ibe ha. Ọ bụ ya mere na unu anaghị eme ihe ndị unu chọrọ ime.+ 18 Ọ bụrụkwa na mmụọ nsọ na-edu unu, iwu agaghị na-achị unu.
19 Ọrụ ndị e ji mara anụ ahụ́ doro anya. Ha bụ ịkwa iko,*+ adịghị ọcha, ime ihe ọjọọ n’asọghị anya,*+ 20 ikpere arụsị, ime mgbaasị,*+ ibu iro, esemokwu, ekworo, iwe ọkụ, ndị kwe na ndị ekweghị, nkewa, inwe òtù, 21 anyaụfụ, ịṅụ oké mmanya,+ oriri oké mkpọtụ, na ihe ndị yiri ha.+ Ana m adọ unu aka ná ntị banyere ihe ndị a otú m dọburu unu aka ná ntị, na ndị na-eme ụdị ihe ndị a agaghị eketa Alaeze Chineke.+
22 Ma mkpụrụ nke mmụọ nsọ bụ ịhụnanya, ọṅụ, udo, ndidi,* obiọma, ịdị mma,+ okwukwe, 23 ịdị nwayọọ, mmadụ ijide onwe ya.+ E nweghị iwu na-emegide ụdị ihe ndị a. 24 Ndị bụ́ ndị nke Kraịst Jizọs akpọgidekwala ahụ́ ha na ihe ọjọọ niile na-agụsi ahụ́ ha agụụ ike n’osisi.+
25 Ọ bụrụ na mmụọ nsọ na-edu anyị, ka anyị na-ebi ndụ otú na-egosi na mmụọ nsọ na-edu anyị.+ 26 Ka anyị ghara ikwe ka onwe anyị na-ebu anyị isi,+ ghara ịna-amarịta aka,+ gharakwa ịna-enwere ibe anyị anyaụfụ.
6 Ụmụnna m, ọ bụrụgodị na mmadụ azọhiewala ụkwụ tupu ya amata ihe ọ na-eme, unu ndị mmụọ Chineke na-edu, gbalịanụ jiri obi nwayọọ nyere onye ahụ aka.*+ Ma, ka onye ọ bụla n’ime unu na-eleru onwe ya anya+ maka na e nwekwara ike ịnwa ya.+ 2 Na-eburịtanụ ibu arọ ibe unu.+ Unu ga-esi otú ahụ na-erubere iwu Kraịst isi.+ 3 N’ihi na ọ bụrụ na mmadụ chere na e nwere ihe ọ bụ mgbe ọ na-enweghị ihe ọ bụ,+ ọ na-aghọgbu onwe ya. 4 Ma, ka onye ọ bụla na-eleru ihe ọ na-eme anya,+ ka o wee na-enwe ọṅụ maka ihe ọ na-eme ma ghara ịna-eji onwe ya atụnyere onye ọzọ.+ 5 N’ihi na onye ọ bụla ga-ebu ibu nke ya.+
6 Ka onye ọ bụla a na-akụziri okwu Chineke na onye na-akụziri ya ihe na-enyerịta ibe ha ihe ọma niile.+
7 Unu ekwela ka e duhie unu: Chineke abụghị onye a ga-aghọgbuli.* N’ihi na mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha ka ọ ga-aghọrọ;+ 8 n’ihi na onye na-agha mkpụrụ otú ahụ́ ya chọrọ ga-esi n’ahụ́ ya ghọrọ mbibi, ma onye na-agha mkpụrụ otú mmụọ nsọ chọrọ ga-esi ná mmụọ nsọ ghọrọ ndụ ebighị ebi.+ 9 N’ihi ya, ka ike ime ihe dị mma ghara ịgwụ anyị, n’ihi na mgbe oge ruru, anyị ga-aghọrọ mkpụrụ ya ma ọ bụrụ na ike agwụghị anyị.+ 10 N’ihi ya, ọ bụrụhaala na anyị nwere ike ime ya, ka anyị na-emere mmadụ niile ihe ọma, ma karịchaa, ndị bụ́ ụmụnna anyị n’okwukwe.
11 Eji m aka m detara unu akwụkwọ ozi a. Unu ahụla na m ji mkpụrụ akwụkwọ okpotokpo dee ya.
12 Ọ bụ ndị niile chọrọ ka otú ha dị n’ahụ́ masị ndị mmadụ na-agbalị ka ha manye unu ka unu bie úgwù. Ihe mere ha ji eme ya bụ naanị na ha achọghị ka a kpagbuo ha n’ihi osisi ịta ahụhụ* Kraịst. 13 N’ihi na ndị ahụ a na-ebi úgwù anaghịdị edebe Iwu ahụ,*+ kama ha na-achọ ka e bie unu úgwù ka ha wee jiri ihe e mere ahụ́ unu na-anya isi. 14 Ma, ka a ghara inwe mgbe m ga-anya isi, ọ gwụla ma ọ̀ bụ iji Onyenwe anyị Jizọs Kraịst,+ onye nwụrụ n’osisi ịta ahụhụ, nyaa isi. N’ihi ọnwụ ọ nwụrụ, ụwa dị m ka ihe nwụrụ anwụ, mụ adịrị ụwa ka onye nwụrụ anwụ. 15 N’ihi na ibi úgwù enweghị ihe ọ bụ, ebighị úgwù enweghịkwa ihe ọ bụ,+ ma ihe e kere ọhụrụ nwere ihe ọ bụ.+ 16 Ka udo na ebere dịrị ndị niile na-eso ntụziaka a, ya bụ, Izrel nke Chineke.+
17 Malite ugbu a gawa, ka onye ọ bụla ghara inye m nsogbu, n’ihi na ebu m apa ndị na-egosi na m bụ ohu Jizọs n’ahụ́ m.+
18 Ụmụnna m, ka Onyenwe anyị Jizọs Kraịst meere unu amara n’ihi àgwà ọma unu na-akpa. Amen.
Gụọ Nkọwa Okwu, “Oge a.”
Na Grik, “anụ ahụ́ na ọbara.”
A na-akpọkwa ya Pita.
Na Grik, “otu awa.”
A na-akpọkwa ya Pita.
A na-akpọkwa ya Pita.
A na-akpọkwa ya Pita.
Na Grik, “anụ ahụ́.”
Na Grik, “ịmata n’aka.”
Gụọ A5.
Ya bụ, Iwu Mosis.
Ya bụ, Iwu Mosis.
Ya bụ, Iwu Mosis.
Na Grik, “mkpụrụ.”
Na Grik, “mkpụrụ gị dị iche iche.”
Na Grik, “mkpụrụ gị.”
Ya bụ, Iwu Mosis.
Ya bụ, Iwu Mosis.
Na Grik, “mkpụrụ.”
Ya bụ, Iwu Mosis.
Ya bụ, Iwu Mosis.
Ma ọ bụ “nwa.” Na Grik, “mkpụrụ.”
Na Grik, “anyị nọ na-agbara ihe ndị mbụ nke ụwa ohu.”
Aba bụ okwu Hibru ma ọ bụ Arameik. Ọ pụtara “Nna!”
Ma ọ bụ “gbụọ m asọ mmiri.”
Ya bụ, Iwu Mosis.
Ma ọ bụ “nwaanyị aga.”
Ya bụ, Iwu Mosis.
Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “ga-apị onwe ha amụ; ga-aghọ ndị ọnaozi,” nke ga-eme ka ha ghara iru eru ime ihe iwu ha na-agbachitere kwuru.
O nwere ike ịbụ, “a chịkọtara.”
Ya bụ, Iwu Mosis.
Grik, por·nei′a. Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “ime ihe ọjọọ n’emeghị ihere.” Grik, a·sel′gei·a. Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “ịgwọ ọgwụ; ịgba afa.”
Ma ọ bụ “ogologo ntachi obi.”
Na Grik, “gbazie onye ahụ.”
Na Grik, “onye a ga-akwa emo.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Ya bụ, Iwu Mosis.