Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • nwt 1 Ndị Tesalonaịka 1:1-5:28
  • 1 Ndị Tesalonaịka

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • 1 Ndị Tesalonaịka
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
1 Ndị Tesalonaịka

AKWỤKWỌ OZI MBỤ E DEGAARA NDỊ TESALONAỊKA

1 Pọl, Silvenọs,*+ na Timoti+ na-edetara ọgbakọ ndị Tesalonaịka, ndị ha na Chineke Nna na Onyenwe anyị Jizọs Kraịst dị n’otu, akwụkwọ ozi:

Ka Chineke meere unu amara, meekwa ka udo dịrị unu.

2 Mgbe ọ bụla anyị chetara unu niile n’ekpere anyị, anyị na-ekele Chineke+ 3 n’ihi na anyị na-echeta n’ihu Chineke anyị, bụ́ Nna anyị, ọrụ niile okwukwe na ịhụnanya mere ka unu na-arụ nakwa otú unu si na-atachi obi n’ihi olileanya unu nwere+ n’Onyenwe anyị Jizọs Kraịst. 4 Ụmụnna anyị ndị Chineke hụrụ n’anya, anyị ma na Chineke họọrọ unu, 5 n’ihi na ọ bụghị naanị okwu anyị gwara unu mere ka unu nụ ozi ọma, kama mmụọ nsọ nyere aka. Obi siri anyị ike na ozi ọma anyị ziri unu bụ eziokwu, ọ kpakwara ike n’ahụ́ unu. Unu makwa ụdị ndị anyị gosiri na anyị bụ n’ihi unu mgbe anyị na unu nọ. 6 Unu na-eme ka anyị,+ na-emekwa ka Onyenwe anyị,+ ebe ọ bụ na unu ji ọṅụ, nke mmụọ nsọ na-eme ka mmadụ nwee, nabata okwu Chineke n’agbanyeghị na a kpagbusiri unu ike.+ 7 Ihe a meziri ka unu bụrụ ndị mmadụ niile kwere ekwe nọ na Masedonia nakwa n’Akeya na-amụta ihe n’aka ha.

8 N’eziokwu, ọ bụghị naanị na unu ekwusaala okwu Jehova* na Masedonia nakwa n’Akeya, kama n’ebe niile, a na-anụ banyere okwukwe unu nwere na Chineke,+ nke mere na e nweghịzi ihe anyị ga-ekwu. 9 N’ihi na ọ bụ ha na-akọ banyere mgbe mbụ anyị bịakwutere unu nakwa otú unu si hapụ arụsị ndị unu na-efe+ ka unu wee bụrụ ndị ohu ezi Chineke dị ndụ ma fewe ya 10 nakwa ka unu chere Ọkpara ya nke ga-esi n’eluigwe bịa,+ onye o si n’ọnwụ kpọlite, ya bụ, Jizọs, onye ga-anapụta anyị n’iwe na-abịanụ.+

2 Ụmụnna anyị, unu ma n’eziokwu na ọbịbịa anyị bịara na nke unu efughị ọhịa.+ 2 N’ihi na unu ma na n’agbanyeghị na anyị bu ụzọ taa ahụhụ na Filipaị,+ a kparịakwa anyị, Chineke nyeere anyị aka, anyị akata obi* zie unu ozi ọma Chineke+ n’agbanyeghị na a nọ na-akpagbu anyị nke ukwuu. 3 N’ihi na ndụmọdụ anyị na-enye esighị n’okwu ụgha ma ọ bụ n’echiche ọjọọ ma ọ bụkwanụ n’aghụghọ. 4 Kama anyị na-ekwu ihe ndị a maka na Chineke kpebiri na anyị ruru eru ka e nye anyị ọrụ ikwusa ozi ọma. Anyị anaghị ekwu ihe anyị na-ekwu ka anyị meta ndị mmadụ mma, kama anyị na-ekwu ihe ga-adị Chineke, onye na-enyocha obi anyị,+ mma.

5 N’eziokwu, unu ma na e nweghị mgbe anyị ji ire ụtọ gwa unu okwu. E nweghịkwa mgbe anyaukwu mere ka anyị mewe ka ànyị bụ ihe anyị na-abụghị.+ Chineke bụ onye akaebe anyị. 6 Anyị anọghịkwa na-achọ otuto n’aka ndị mmadụ, ma ọ̀ bụ n’aka unu ma ọ̀ bụ n’aka ndị ọzọ, n’agbanyeghị na anyị nwere ike ịbụrụ unu ibu arọ ma anyị chọọ n’ihi na anyị bụ ndịozi Kraịst.+ 7 Kama, anyị weturu obi ala mgbe anyị na unu nọ, otú nne na-enye nwa ara si ewetu obi elekọta ụmụ ya. 8 N’ihi ya, ebe ọ bụ na anyị hụrụ unu n’anya nke ukwuu, anyị kpebisiri ike* na ihe anyị ga-eme abụghị naanị izi unu ozi ọma Chineke, kama na anyị ga-enye unu onwe* anyị+ maka na anyị hụrụ unu n’anya.+

9 N’eziokwu, ụmụnna anyị, unu na-echeta otú anyị si gbaa ezigbo mbọ ma rụsie ọrụ ike. Anyị na-arụ ọrụ ma n’ehihie ma n’abalị ka anyị ghara ịbụrụ onye ọ bụla n’ime unu ibu arọ+ mgbe anyị na-ezi unu ozi ọma Chineke. 10 Unu bụ ndị akaebe anyị, Chineke bụkwa onye akaebe anyị, na otú anyị si mesoo unu ihe gosiri na anyị kwụsiri ike n’ebe unu nọ, nakwa na anyị bụ ndị ezi omume na ndị a na-enweghị ihe a ga-eji taa ha ụta. 11 Unu ma nke ọma na anyị na-adụsi onye ọ bụla n’ime unu ọdụ ike, na-akasikwa unu obi ma na-agbara unu àmà,+ otú nna+ si emere ụmụ ya, 12 ka unu wee na-ebi ndụ otú dị Chineke mma,+ bụ́ onye na-akpọ unu ka unu bata n’Alaeze ya+ nakwa ka unu nweta ebube ya.+

13 N’eziokwu, ọ bụkwa ya mere anyị ji na-ekele Chineke mgbe niile,+ n’ihi na mgbe unu nụrụ okwu Chineke nke anyị gwara unu, unu nabatara ya, ọ bụghị ka okwu ụmụ mmadụ, kama ka okwu Chineke. N’eziokwu, ọ bụ okwu Chineke, ọ na-akpakwa ike n’ime unu ndị kwere ekwe. 14 Ụmụnna anyị, unu na-eṅomi ọgbakọ Chineke ndị dị na Judia bụ́ ndị ha na Kraịst Jizọs dị n’otu, n’ihi na unu tara ahụhụ n’aka ndị obodo unu+ otú hanwa na-atakwa ahụhụ n’aka ndị Juu, 15 bụ́ ndị gbudịrị Onyenwe anyị Jizọs+ na ndị amụma ma kpagbuo anyị.+ Ha anaghịkwa eme ihe dị Chineke mma, kama ha na-eme ihe na-anaghị abara onye ọ bụla uru, 16 n’ihi na ha na-agbalị ka ha gbochie anyị ịgwa ndị mba ọzọ okwu ga-eme ka a zọpụta ha.+ Ha si otú a eme mgbe niile ka mmehie ha dịkwuo ọtụtụ. Ma ọnụma Chineke emechaala bịakwasị ha.+

17 Ma ụmụnna anyị, mgbe e mere ka anyị hapụ unu (n’anụ ahụ́, ọ bụghị n’obi anyị), anyị gbasiri mbọ ike ka anyị hụ unu ihu na ihu maka na ọ gụsiri anyị agụụ ike ịhụ unu. 18 Ọ bụ ya mere anyị ji chọọ ka anyị bịa na nke unu. N’eziokwu, mụnwa bụ́ Pọl gbalịrị ịbịa, ọ bụghị naanị otu ugboro, kama ugboro abụọ. Ma Setan nọchiiri anyị ụzọ. 19 N’ihi na gịnị bụ olileanya anyị ma ọ bụ ọṅụ anyị ma ọ bụ okpueze aṅụrị anyị n’ihu Onyenwe anyị Jizọs n’oge ọnụnọ ya? Ọ̀ bụ na ọ bụghị unu?+ 20 N’eziokwu, ọ bụ unu bụ ebube anyị na ọṅụ anyị.

3 N’ihi ya, mgbe anyị na-enweghịzi ike idi ya, anyị chere na ọ ka mma ka naanị anyị nọrọwa n’Atens.+ 2 Anyị ziteere unu Timoti,+ nwanna anyị na onye ozi Chineke* nke na-ezisa ozi ọma banyere Kraịst, ka o mee ka unu kwụsie ike* ma kasie unu obi ka okwukwe unu sie ike, 3 ka a ghara inwe onye mkpagbu ndị a ga-eme ka ọ maa jijiji. N’ihi na unu ma na anyị ga-atarịrị ụdị ahụhụ a.+ 4 N’ihi na mgbe anyị na unu nọ, anyị na-adị agwa unu tupu ya ebido ime na a ga-akpagbu anyị. Unu makwa na ihe anyị kwuru emeela.+ 5 Ọ bụ ya mere na mgbe m na-enweghịzi ike idi ya, m zitere ya ka m wee mata ma ùnu ka tụkwasịkwara Chineke obi,+ a dịghị ama ama ya abụrụ na Onye Ọnwụnwa ahụ+ anwaala unu, mbọ niile anyị gbara abụrụzie n’efu.

6 Ma Timoti ka si n’ebe unu nọ bịakwute anyị+ ugbu a ma kọọrọ anyị akụkọ ọma banyere otú unu si tụkwasị Chineke obi na otú unu si hụ ndị ọzọ n’anya. O kwuru na unu na-echeta anyị mgbe niile nakwa na ọ na-agụsi unu agụụ ike ịhụ anyị otú ọ na-agụkwa anyị ịhụ unu. 7 Ụmụnna anyị, ọ bụ ya mere na n’agbanyeghị nsogbu* niile na mkpagbu niile na-abịara anyị, obi eruola anyị ala maka na unu na-egosi na unu tụkwasịrị Chineke obi.+ 8 N’ihi na obi na-adị anyị ụtọ* ma ọ bụrụhaala na unu anọgidesie ike na-eme ka unu na Onyenwe anyị dị n’otu. 9 Oleedị otú anyị ga-esi kelee Chineke n’ihi ihe unu na-eme nakwa maka nnukwu ọṅụ anyị na-enwe n’ihu Chineke n’ihi unu? 10 Anyị ji obi anyị niile arịọsi arịrịọ ike ehihie na abalị ka anyị hụ unu ihu na ihu* nakwa ka anyị nyere unu aka mee ka okwukwe unu sikwuo ike.+

11 Ka Chineke anyị, bụ́ Nna anyị, nakwa Onyenwe anyị Jizọs mee ka anyị hụ otú anyị ga-esi abịakwute unu. 12 Ka Onyenwe anyị meekwa ka unu na-ahụkwu ibe unu n’anya ma na-ahụkwu mmadụ niile n’anya,+ otú anyị na-ahụkwu unu n’anya, 13 ka o wee mee ka obi sie unu ike, meekwa ka unu bụrụ ndị a na-enweghị ihe a ga-eji taa ha ụta na ndị dị nsọ n’ihu Chineke anyị,+ bụ́ Nna anyị, n’oge ọnụnọ Onyenwe anyị Jizọs,+ ya na ndị nsọ ya niile.

4 N’ikpeazụ, ụmụnna anyị, anyị akụzierela unu otú unu kwesịrị isi na-ebi ndụ dị Chineke mma,+ unu na-emekwa otú ahụ n’eziokwu. Ugbu a, anyị na-arịọ unu ma na-agba unu ume n’aha Onyenwe anyị Jizọs ka unu na-emekwu otú ahụ karịa ka unu na-eme. 2 N’ihi na unu ma ntụziaka* ndị anyị nyere unu n’aha Onyenwe anyị Jizọs.

3 N’ihi na ihe Chineke chọrọ bụ ka unu na-adị nsọ+ ma ghara ịna-akwa iko.*+ 4 Onye ọ bụla n’ime unu kwesịrị ịma otú ọ ga-esi na-ejide ahụ́* ya,+ ka ahụ́* ya wee dị nsọ+ ma dị ùgwù, 5 ọ bụghị ime ka mba ndị na-amaghị Chineke,+ bụ́ ndị anyaukwu na-eme ka ha ghara ijide onwe ha ma agụụ mmekọahụ gụwa ha.+ 6 Ka onye ọ bụla ghara ịrụsa nwanna ya arụrụala ma ọ bụ mee ya ihe ọjọọ n’ihe a, n’ihi na Jehova* na-ata ndị na-eme ihe ndị a niile ahụhụ. Anyị gwaburu unu ihe a ma dọsie unu aka ná ntị ike maka ya. 7 N’ihi na Chineke kpọrọ anyị ka anyị dị nsọ, ọ bụghị ka anyị biwe ndụ na-adịghị ọcha.+ 8 N’ihi ya, onye na-eleda ndụmọdụ a anya anaghị eleda mmadụ anya, kama ọ bụ Chineke,+ onye na-enye unu mmụọ nsọ ya,+ ka ọ na-eleda anya.

9 Ma, ọ dịghị mkpa ka anyị detara unu akwụkwọ ozi ka unu hụ ibe unu n’anya ka ụmụnne,+ n’ihi na Chineke na-akụziri unu ka unu na-ahụ ibe unu n’anya.+ 10 N’eziokwu, unu hụrụ ụmụnna niile nọ na Masedonia niile n’anya otú ahụ. Ma anyị na-agba unu ume, ụmụnna anyị, ka unu na-ahụkwu ibe unu n’anya karịa otú unu na-eme. 11 Gbalịanụ ka unu na-ebi n’udo,+ ghara ịna-etinye anya n’ihe na-agbasaghị unu,+ kama na-arụnụ ọrụ.+ Ọ bụ ihe anyị kụziiri unu. 12 Ime otú a ga-eme ka ndị nọ n’èzí hụ na unu na-ebi ndụ dị mma,+ a gharakwa inwe ihe na-akpa unu.

13 Ụmụnna anyị, anyị chọrọ ka unu mata ihe a ga-emere ndị nwụrụ anwụ,*+ ka unu wee ghara ịna-eru uju otú ndị na-enweghị olileanya si eru.+ 14 N’ihi na ọ bụrụ na anyị nwere okwukwe na Jizọs nwụrụ, e si n’ọnwụ kpọlite ya,+ anyị nwekwara okwukwe na Chineke ga-akpọlite ndị ha na Jizọs dị n’otu, bụ́ ndị nwụrụ anwụ.*+ 15 N’ihi na anyị na-agwa unu ihe Jehova* kwuru, na anyị ndị ga-adị ndụ n’oge ọnụnọ Onyenwe anyị agaghị ebu ndị nwụrụ anwụ* ụzọ gaa eluigwe; 16 n’ihi na Onyenwe anyị ga-esi n’eluigwe gbadata. Ọ ga-eji olu dara ụda kpọọ òkù, bụ́ olu onyeisi ndị mmụọ ozi,+ jirikwa opi Chineke. Ndị nwụrụ anwụ bụ́ ndị ha na Kraịst dị n’otu ga-ebukwa ụzọ bilie.+ 17 E mechaa, a ga-eme ka anyị ndị dị ndụ gaa n’ígwé ojii, ka anyị na ha zute Onyenwe anyị+ na mbara igwe;+ anyị na Onyenwe anyị ga-anọzi mgbe niile.+ 18 N’ihi ya, jirinụ okwu ndị a na-akasi ibe unu obi.

5 Ụmụnna anyị, ọ dịghị mkpa ka e detara unu ihe ọ bụla banyere oge na mgbe ihe ndị a ga-eme. 2 N’ihi na unu ma nke ọma na ụbọchị Jehova*+ ga-abịa nnọọ otú onye ohi si abịa n’abalị.+ 3 Mgbe ọ bụla ha na-asị, “Udo adịla, obi eruokwala anyị ala!” a ga-ebibi ha na mberede mgbe ha na-atụghị anya ya,+ otú ahụ ime si eme nwaanyị dị ime na mberede. Ha agaghị agbanahụ ya. 4 Ma ụmụnna anyị, unu anọghị n’ọchịchịrị. N’ihi ya, ụbọchị ahụ agaghị abịa unu na mberede otú chi si abọkwute ndị ohi, 5 n’ihi na unu niile bụ ụmụ nke ìhè na nke ehihie.+ Anyị abụghị ụmụ nke abalị ma ọ bụ nke ọchịchịrị.+

6 N’ihi ya, ka anyị ghara ịnọ na-ehi ụra otú ndị ọzọ na-ehi,+ kama ka anyị mụrụ anya+ ma na-eche echiche nke ọma.+ 7 N’ihi na ndị na-ehi ụra na-ehi ya n’abalị, ndị na-aṅụbigakwa mmanya ókè na-aṅụbiga ya ókè n’abalị.+ 8 Ma anyị ndị bụ́ ụmụ nke ehihie, ka anyị na-eche echiche nke ọma ma yiri ihe e ji echebe obi bụ́ okwukwe na ịhụnanya, kpurukwa okpu agha bụ́ olileanya nzọpụta+ 9 n’ihi na Chineke họọrọ anyị, ọ bụghị ka o wesa anyị iwe, kama ka o si n’aka Onyenwe anyị Jizọs Kraịst zọpụta anyị.+ 10 Jizọs nwụrụ maka anyị,+ ka anyị na ya wee dịkọọ ndụ,+ ma ànyị mụ anya ma ànyị na-ehi ụra.* 11 N’ihi ya, na-agbanụ ibe unu ume* ma na-emenụ ka ibe unu dị ike,+ otú unu na-eme n’eziokwu.

12 Ụmụnna anyị, anyị na-arịọ unu ka unu na-akwanyere ndị na-arụsi ọrụ ike n’etiti unu ùgwù, bụ́ ndị na-eduzi unu n’ọrụ Onyenwe anyị ma na-adụ unu ọdụ. 13 Anyị na-arịọkwa unu ka unu jiri ha kpọrọ ihe ma na-ahụ ha n’anya nke ukwuu n’ihi ọrụ ha.+ Unu na ibe unu na-adị n’udo.+ 14 Ma anyị na-agba unu ume, ụmụnna anyị, ka unu na-adọ ndị na-enupụ isi aka ná ntị,+ na-agụgụ ndị dara mbà, na-enyere ndị na-adịghị ike aka, na-enwekwara mmadụ niile ndidi.+ 15 Hụnụ na e nweghị onye ji ihe ọjọọ akwụ onye ọ bụla ụgwọ ihe ọjọọ,+ kama na-emerenụ ibe unu na ndị ọzọ niile ihe ọma mgbe niile.+

16 Na-aṅụrịnụ ọṅụ mgbe niile.+ 17 Na-ekpenụ ekpere mgbe niile.+ 18 Na-ekelenụ Chineke maka ihe niile.+ Ihe a bụ ihe Chineke chọrọ ka unu na-eme ebe unu bụ ndị na-eso ụzọ Kraịst Jizọs. 19 Unu akwụsịla ọrụ mmụọ nsọ na-arụ n’ime unu.*+ 20 Unu eledala amụma anya.+ 21 Na-achọpụtanụ nke bụ́ eziokwu n’ihe niile;+ jidesienụ ihe dị mma aka ike. 22 Gbaaranụ ụdị ajọ omume niile ọsọ.+

23 Ka Chineke nke udo mee ka unu dị nsọ otú zuru ezu. Ụmụnna anyị, ka e meekwa ka àgwà ọma* unu na ndụ* unu na ahụ́ unu ghara inwe ntụpọ ọ bụla n’oge ọnụnọ Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.+ 24 Onye na-akpọ unu na-emezu ihe o kwuru. N’eziokwu, ọ ga-eme ya.

25 Ụmụnna anyị, na-ekperenụ anyị ekpere.+

26 Susuonụ ụmụnna niile ọnụ mgbe unu na-ekele ha.*

27 Eji m aha Onyenwe anyị na-agwasi unu ike ka unu hụ na a gụụrụ ụmụnna niile akwụkwọ ozi a.+

28 Ka Onyenwe anyị Jizọs Kraịst meere unu amara.

A na-akpọkwa ya Saịlas.

Gụọ A5.

Ma ọ bụ “ejiri obi ike.”

Na Grik, “ọ masịrị anyị.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

O nwere ike ịbụ, “onye ya na Chineke na-arụkọ ọrụ.”

Ma ọ bụ “ka ọ gbaa unu ume.”

Na Grik, “mkpa anyị.”

Na Grik, “N’ihi na anyị na-adị ndụ.”

Na Grik, “hụ ihu unu.”

Ma ọ bụ “iwu.”

Grik, por·nei′a. Gụọ Nkọwa Okwu.

Na Grik, “arịa.”

Na Grik, “arịa.”

Gụọ A5.

Na Grik, “mata banyere ndị na-ehi ụra ọnwụ.”

Na Grik, “ndị na-ehi ụra ọnwụ.”

Gụọ A5.

Na Grik, “ndị na-ehi ụra ọnwụ.”

Gụọ A5.

Ma ọ bụ “na-ehi ụra ọnwụ.”

Ma ọ bụ “na-akasinụ ibe unu obi.”

Na Grik, “Unu emenyụla ọkụ nke mmụọ nsọ.”

Na Grik, “mmụọ.”

Na Grik, “mkpụrụ obi.”

Otú e si ekele mmadụ n’oge ahụ bụ isusu ya ọnụ, dị ka isusu ya ọnụ na ntì.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya