Joshụa
10 O wee ruo na ozugbo Adonaị-zidek bụ́ eze Jeruselem nụrụ na Jọshụa ewegharawo E-aị+ ma bibie ya,+ nakwa na o mewo Jeriko+ na eze ya+ ihe o mere E-aị na eze ya,+ nakwa na ndị Gibiọn emewo ka ha na Izrel+ dịrị n’udo nakwa na ha bi n’etiti ha, 2 egwu tụrụ ya nke ukwuu,+ n’ihi na Gibiọn bụ nnukwu obodo, dị ka otu n’ime obodo ndị eze, nakwa n’ihi na ọ ka E-aị ukwuu,+ ndị ikom ya niile bụkwa ndị dike. 3 Adonaị-zidek bụ́ eze Jeruselem+ wee zie ozi zigara Hoham eze Hibrọn+ na Paịram eze Jamọt+ na Jefaya eze Lekish+ na Diba eze Eglọn,+ sị, 4 “Bịanụ nyere m aka ka anyị bibie Gibiọn, n’ihi na o mewo ka ya na Jọshụa na ụmụ Izrel dịrị n’udo.”+ 5 Ha wee zukọta ma gaa, ya bụ, ndị eze ise nke ndị Amọraịt,+ eze Jeruselem, eze Hibrọn, eze Jamọt, eze Lekish, eze Eglọn, ndị a na ndị agha ha niile, ha wee maa ụlọikwuu imegide Gibiọn na ibuso ya agha.
6 Ndị Gibiọn wee zigara Jọshụa ozi n’ebe ha mara ụlọikwuu ha na Gilgal,+ sị: “Ewepụla aka gị n’ahụ́ ndị ohu gị.+ Bịakwute anyị ọsọ ọsọ zọpụta anyị ma nyere anyị aka, n’ihi na ndị eze niile nke ndị Amọraịt bụ́ ndị bi n’ógbè bụ́ ugwu ugwu ezukọtawo ibuso anyị agha.” 7 Jọshụa wee si Gilgal gbagoo, ya na ndị agha ya+ niile na ndị dike ya niile bụ́ dimkpa.+
8 Jehova wee sị Jọshụa: “Atụla ha egwu,+ n’ihi na m nyefewo ha n’aka gị.+ Ọ dịghị otu onye n’ime ha ga-eguzogide gị.”+ 9 Jọshụa wee bịa ibuso ha agha na mberede. Ọ gara njem abalị ahụ dum wee si Gilgal gbagoo. 10 Jehova wee tinye ha n’ọgba aghara n’ihu Izrel,+ ha wee sụọ ha akwụ na Gibiọn+ ma si n’ụzọ e si agbago Bet-horọn chụrụ ha gawa, gburukwa ha ruo Azika+ na Makida.+ 11 O wee ruo na ka ha si n’ihu Izrel na-agba ọsọ ma nọrọ ná mkpọda obodo Bet-horọn, Jehova mere ka nnukwu akụ́ mmiri ígwé+ si n’eluigwe na-adagbu ha ruo Azika. Ndị akụ́ mmiri ígwé ahụ gburu dị ọtụtụ karịa ndị ụmụ Izrel ji mma agha gbuo.
12 Ọ bụ mgbe ahụ ka Jọshụa gwara Jehova okwu n’ụbọchị Jehova nyefere ndị Amọraịt n’aka ụmụ Izrel, o wee kwuo n’ihu Izrel, sị:
“Anyanwụ,+ guzoro otu ebe n’elu Gibiọn,+
Gị ọnwa, guzorokwa n’elu ndagwurugwu Aịjalọn.”+
13 Anyanwụ wee guzo otu ebe, ọnwa akwụrụkwa otu ebe, ruo mgbe mba ahụ bọrọ ọbọ n’ahụ́ ndị iro ya.+ Ọ̀ bụ na e deghị ya n’akwụkwọ Jesha?+ Anyanwụ wee kwụrụ otu ebe n’etiti eluigwe, ọ daghịkwa ngwa ngwa ruo ihe dị ka otu ụbọchị zuru ezu.+ 14 Ọ dịtụbeghịkwa ụbọchị yiri nke ahụ, tupu mgbe ahụ ma ọ bụ mgbe ọ gasịrị, na Jehova gere ntị n’olu mmadụ,+ n’ihi na Jehova nọ na-eburu Izrel agha.+
15 E mesịa, Jọshụa na Izrel dum lọghachiri n’ebe ha mara ụlọikwuu na Gilgal.+
16 Ka ọ dị ugbu a, ndị eze ise a gbara ọsọ+ gaa zoo n’ọgba dị na Makida.+ 17 E wee kọọrọ Jọshụa, sị: “A hụwo ndị eze ise ahụ n’ebe ha zoro n’ọgba dị na Makida.”+ 18 Jọshụa wee sị: “Kwaranụ nnukwu nkume kwachie ọnụ ọgba ahụ, debekwanụ ndị ikom n’ebe ahụ ka ha na-eche ha nche. 19 Ma unu onwe unu, unu eguzokwala otu ebe. Chụwanụ ndị iro unu, unu ga-esikwa n’azụ gbuo ha.+ Unu ekwela ka ha banye n’obodo ha, n’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu enyefewo ha n’aka unu.”+
20 O wee ruo na ozugbo Jọshụa na ụmụ Izrel sụchara ha akwụ, ruo mgbe ha gwụchara,+ ndị fọrọ ndụ n’ime ha agbaakwa ọsọ wee banye n’obodo ndị e wusiri ike,+ 21 ndị agha ahụ niile malitere ịlaghachi n’ebe ha mara ụlọikwuu ha, ka ha lakwuru Jọshụa, n’obodo Makida n’udo. Ọ dịghị nwoke ọ bụla kwuru pịm megide ụmụ Izrel.+ 22 Jọshụa wee sị: “Megheenụ ọnụ ọgba ahụ ma si n’ọgba ahụ kpọpụtara m ndị eze ise ahụ.” 23 Ha wee mee otú ahụ wee si n’ọgba ahụ kpọpụtara ya ndị eze ise ahụ, ya bụ, eze Jeruselem,+ eze Hibrọn,+ eze Jamọt, eze Lekish,+ eze Eglọn.+ 24 O wee ruo na ozugbo ha kpọtaara Jọshụa ndị eze ahụ, Jọshụa kpọrọ ndị ikom niile nke Izrel wee gwa ndị ọchịagha nke ndị agha so ya gaa agha, sị: “Bịanụ nso. Zọkwasịnụ ụkwụ n’azụ olu ndị eze a.”+ Ha wee bịa nso ma zọkwasị ụkwụ n’azụ olu ha.+ 25 Jọshụa wee sị ha: “Egwu atụla unu, ụjọ atụkwala unu.+ Nweenụ obi ike, dịkwanụ ike, n’ihi na ọ bụ otú a ka Jehova ga-eme ndị iro unu niile bụ́ ndị unu na-ebuso agha.”+
26 E mesịa, Jọshụa gburu ha wee kwụwa ha n’elu osisi ise, ha kwụgidere n’elu osisi ndị ahụ ruo ná mgbede.+ 27 O wee ruo mgbe anyanwụ dara na Jọshụa nyere iwu, ha wee butuo ha n’osisi ndị ahụ,+ tụba ha n’ime ọgba ahụ ha zoro. Ha wee buru nnukwu nkume kwachie ọnụ ọgba ahụ ruo taa.
28 Jọshụa wee weghara Makida+ n’ụbọchị ahụ ma were ihu mma agha bibie ya.+ O gbukwara eze ya na mkpụrụ obi ọ bụla nọ na ya. Ọ hapụghị onye ọ bụla ndụ. O wee mee eze Makida+ ihe o mere eze Jeriko.
29 Jọshụa na Izrel dum wee si na Makida gaa Libna wee buso Libna agha.+ 30 Jehova wee nyefeekwa ya na eze ya n’aka Izrel, ha wee jiri ihu mma agha bibie ya, ma gbuo mkpụrụ obi ọ bụla nọ na ya. Ha ahapụghị onye ọ bụla ndụ n’ime ya. Ha wee mee eze ya ihe ha mere eze Jeriko.+
31 Jọshụa na Izrel dum sikwa na Libna gaa Lekish,+ wee maa ụlọikwuu megide ya wee buso ya agha. 32 Jehova wee nyefee Lekish n’aka Izrel, ha wee weghara ya n’ụbọchị nke abụọ, ha wee jiri ihu mma agha+ bibie ya na mkpụrụ obi ọ bụla nọ n’ime ya, dị ka ha mere Libna.
33 Ọ bụ mgbe ahụ ka Horam eze Giza+ gara inyere Lekish aka. Jọshụa wee gbuo ya na ndị ya ruo mgbe ọ na-enweghị onye ọ hapụrụ ka ọ fọdụrụ ya ndụ.+
34 Jọshụa na Izrel dum wee si na Lekish gaa Eglọn,+ maakwa ụlọikwuu megide ya wee buso ya agha. 35 Ha wee weghara ya n’ụbọchị ahụ, malite iji ihu mma agha bibie ya, ha wee gbuo mkpụrụ obi ọ bụla nọ n’ime ya n’ụbọchị ahụ, dị ka ha mere Lekish.+
36 Jọshụa na Izrel dum wee si n’Eglọn gbagoo Hibrọn,+ malitekwa ibuso ya agha. 37 Ha wee weghara ya ma jiri ihu mma agha bibie ya na eze ya na obodo ya niile nakwa mkpụrụ obi ọ bụla nọ n’ime ya. Ọ hapụghị onye ọ bụla ndụ, dị ka ihe o mere Eglọn. O wee bibie ya na mkpụrụ obi ọ bụla nọ n’ime ya.+
38 N’ikpeazụ, Jọshụa na Izrel dum lọghachiri Diba+ wee malite ibuso ya agha. 39 O wee weghara ya na eze ya na obodo ya niile, ha wee were ihu mma agha bibie ha, bibiekwa mkpụrụ obi ọ bụla nọ n’ime ya.+ Ọ hapụghị onye ọ bụla ndụ.+ O mere Diba na eze ya ihe o mere Hibrọn, nke bụkwa ihe o mere Libna na eze ya.+
40 Jọshụa wee bibie ala dum dị n’ógbè bụ́ ugwu ugwu,+ bibiekwa Negeb+ na Shefila+ na ebe ndị dị ná mkpọda+ nakwa eze ha niile. Ọ hapụghị onye ọ bụla ndụ, ihe niile na-eku ume+ ka o bibiri,+ dị ka Jehova bụ́ Chineke Izrel nyere n’iwu.+ 41 Jọshụa wee si na Kedesh-bania+ bibiri ha ruo Geza+ na ala Goshen+ dum, ruokwa Gibiọn.+ 42 Jọshụa wee nwụde eze ndị a niile na ala ha n’otu mgbe,+ n’ihi na ọ bụ Jehova bụ́ Chineke Izrel bụ onye na-eburu Izrel agha.+ 43 E mesịa, Jọshụa na Izrel dum laghachiri n’ebe ha mara ụlọikwuu ha na Gilgal.+