AKWỤKWỌ OZI MBỤ E DEGAARA TIMOTI
1 Chineke bụ́ Onye Nzọpụta anyị nakwa Kraịst Jizọs, onye mere ka anyị nwee olileanya,+ nyere mụnwa bụ́ Pọl ikike ka m bụrụ onyeozi Kraịst Jizọs. 2 M na-edetara gịnwa bụ́ Timoti*+ akwụkwọ ozi a. Ị bụ ezigbo nwa m+ nke mụ na ya kweere n’Onyenwe anyị.
Ka Chineke bụ́ Nna nakwa Kraịst Jizọs Onyenwe anyị meere gị amara na ebere, meekwa ka udo dịrị gị.
3 Otú ahụ m gwara gị ka ị nọrọ n’Efesọs mgbe m chọrọ ịgawa Masedonia, ka m na-agwakwa gị ugbu a ka ị ka nọrọ ebe ahụ iji gwasie ụfọdụ ndị ike ka ha ghara izi ozizi dị iche, 4 ka ha gharakwa ịṅa ntị n’akụkọ ụgha+ nakwa n’okwu gbasara usoro ọmụmụ dị iche iche. O nweghị uru ọ bụla ihe ndị a bara,+ kama, ihe ha na-akpata bụ ịrụ ụka na-enweghị isi. Ha esoghịkwa n’ihe Chineke ji eme ka okwukwe anyị sie ike. 5 N’eziokwu, ihe mere m ji kwuo ihe ndị a bụ ka anyị jiri obi dị ọcha,+ akọnuche na-arụ ọrụ nke ọma, na okwukwe+ na-abụghị nke ihu abụọ hụ ndị ọzọ n’anya. 6 Ụfọdụ ndị ajụla ịna-eme ihe ndị a, malitezie ịna-ekwu okwu na-enweghị isi na ọdụ.+ 7 Ha na-achọ ka ha bụrụ ndị na-akụzi+ iwu Chineke,* ma, ihe ndị ha na-ekwu na ihe ndị ọnụ na-aka ha ịkụzi edoghị ha anya.
8 Anyị ma na Iwu Chineke dị mma ma ọ bụrụ na mmadụ ana-edebe ya otú kwesịrị ekwesị. 9 Ihe ọzọ bụkwa na ọ bụghị n’ihi onye ezi omume ka Chineke ji nye iwu ndị o nyere, kama, ọ bụ n’ihi ndị na-emebi iwu+ na ndị isi ike, ndị na-anaghị asọpụrụ Chineke na ndị mmehie, ndị na-agharịpụ ndị ọzọ* na ndị na-emerụ ihe dị nsọ, ndị na-egbu nne ha, nna ha, ma ọ bụ ndị ọzọ, 10 ndị na-akwa iko,* ụmụ nwoke ndị na-edina ụmụ nwoke ibe ha,* ndị na-atọrọ mmadụ, ndị ụgha, ndị na-aṅụ iyi ụgha, na ihe ọ bụla ọzọ dị iche n’eziokwu a na-akụziri anyị,+ 11 nke bụ́ ozi ọma dị ebube a họpụtara m ka m na-ezisa.+ Ozi ọma a si n’aka Chineke, onye obi ụtọ.
12 Ana m ekele Kraịst Jizọs Onyenwe anyị, onye nyere m ike, gwakwa m ka m na-ejere ya ozi, n’ihi na ọ gụrụ m n’onye a tụkwasịrị obi,+ 13 ọ bụ eziokwu na n’oge gara aga, ana m ekwulu Chineke, na-akpagbu ndị mmadụ, na-akparịkwa ndị mmadụ.+ Ma, e meere m ebere, n’ihi na amaghị m ihe mgbe ahụ, emekwara m ihe ndị ahụ n’ihi na enweghị m okwukwe. 14 Ma, Onyenwe anyị meere m amara na-enweghị atụ. Enwekwara m okwukwe, hụkwa ndị ọzọ n’anya n’ihi na m bụ onye na-eso ụzọ Kraịst Jizọs. 15 Kraịst Jizọs bịara n’ụwa a ka ọ zọpụta ndị mmehie.+ Ihe a m na-ekwu bụ eziokwu, anyị kwesịkwara iji obi anyị niile nabata ya. N’ime ndị mmehie a niile, ọ bụ m kacha bụrụ onye mmehie.+ 16 Ma, ihe mere e ji meere m ebere bụ ka Kraịst Jizọs si n’aka mụnwa kacha bụrụ onye mmehie gosi ndị ga-enwe okwukwe na ya otú o nweruru ndidi, ka ha wee nweta ndụ ebighị ebi.+
17 Ka Eze mgbe ebighị ebi,+ onye na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi,+ onye a na-enweghị ike ịhụ anya,+ onye naanị ya bụ Chineke,+ bụrụ onye a na-asọpụrụ na onye a na-eto ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.
18 Timoti nwa m, ihe ndị a m na-agwa gị dabara n’ihe ndị amụma kwuru banyere gị. Ana m agwa gị ha ka i nwee ike na-alụ agha a dị mma anyị na-alụ.+ 19 Akwụsịla inwe okwukwe na akọnuche na-arụ ọrụ nke ọma,+ nke ụfọdụ na-enweghịzi, okwukwe ha ekpuo ka ụgbọ. 20 Haịmeniọs+ na Alegzanda so ná ndị a. Enyefeekwala m ha n’aka Setan+ ka ha jiri maka aka ná ntị a dọrọ ha kwụsị ịna-ekwulu Chineke.
2 Ihe mbụ m na-agwa unu bụ ka unu na-ekpe ekpere maka ụdị mmadụ niile, na-ekele Chineke maka ha, na-arịọsikwa ya arịrịọ ike ka o nyere ha aka. 2 Na-ekpekwanụ ekpere a maka ndị eze na ndị niile nọ n’ọkwá ukwu,+ ka ahụ́ wee ruo anyị ala, anyị ebirikwa n’udo, jiri obi anyị niile na-efe Chineke.+ 3 Ihe a dị mma n’anya Chineke, Onye Nzọpụta anyị.+ Ọ na-anabatakwa ya. 4 Ọ bụ uche ya ka a zọpụta ụdị mmadụ niile,+ ka ha marakwa eziokwu nke ọma. 5 E nwere otu Chineke,+ nweekwa otu onye ogbugbo+ n’etiti Chineke na mmadụ,+ ya bụ, Kraịst Jizọs.+ 6 O ji ndụ ya chụọ àjà, si otú ahụ nye ihe dabara adaba a ga-eji agbapụta mmadụ niile.*+ Ndị mmadụ ga-ekwukwa gbasara ihe a mgbe oge ya ruru. 7 Chineke họpụtara m ka m na-ezisa ihe a,+ bụrụkwa onyeozi.+ Ọ họpụtakwara m ka m kụziere ndị mba ọzọ gbasara eziokwu a+ nakwa inwe okwukwe na Chineke. Ihe a m na-ekwu bụ eziokwu, ọ bụghị ụgha.
8 N’ihi ya, achọrọ m ka ọ bụrụ ụmụ nwoke ga na-ekpe ekpere n’ebe niile unu zukọrọ,* na-eweli aka ha dị nsọ elu,+ n’eweghị iwe,+ n’arụghịkwa ibe ha ụka.+ 9 M chọkwara ka ụmụ nwaanyị na-eji ejiji dị mma, nke na-egosi na ha na-emeru ihe n’ókè ma na-ele ihe anya otú dị mma,* ọ bụghị ịkpawa ụdị isi dị iche iche na iji ọlaedo ma ọ bụ nkume pel na-achọ onwe ha mma ma ọ bụkwanụ iyi uwe dị ezigbo oké ọnụ.+ 10 Kama ha kwesịrị ịna-eme ihe dị mma otú ụmụ nwaanyị ndị na-efe Chineke kwesịrị ịna-eme, si otú ahụ na-achọ onwe ha mma.+
11 Mgbe a na-akụzi ihe, ka ụmụ nwaanyị nọrọ jụụ,* na-erubere ụmụ nwoke isi.+ 12 Enyeghị m nwaanyị ikike izi ihe ma ọ bụ ịchị nwoke, kama ka ọ na-agbachi nkịtị.*+ 13 N’ihi na e bu ụzọ kee Adam tupu e kee Iv.+ 14 Ọ bụghịkwa Adam ka a ghọgburu, kama, ọ bụ Iv ka a ghọgburu kpamkpam,+ ya emebie iwu Chineke. 15 Ma, ịmụ nwa ga-abara nwaanyị uru maka na ọ ga-eme ka ọ ghara ime ihe ọjọọ,+ ma ọ bụrụhaala na o* nwere okwukwe, hụ ndị ọzọ n’anya, dị nsọ, na-elekwa ihe anya otú dị mma.*+
3 E kwesịrị ịtụkwasị okwu a obi: Ọ bụrụ na onye ọ bụla na-agbalị ka o ruo eruo ịbụ onye nlekọta,+ ịrụ ezigbo ọrụ na-agụ ya. 2 Onye nlekọta kwesịrị ịbụ onye ndị mmadụ na-agaghị enwe ihe ha ga-eji kwujọọ ya, di otu nwaanyị, onye na-emeru ihe n’ókè, onye na-ele ihe anya otú dị mma,*+ onye na-eme ihe n’usoro, onye na-ele ọbịa,+ onye ruru eru ịkụzi ihe.+ 3 O kwesịghị ịbụ onye aṅụrụma,+ onye tigbuo zọgbuo,* onye okwu na ụka,+ ma ọ bụ onye hụrụ ego n’anya.+ Kama, o kwesịrị ịbụ onye na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị,+ 4 onye na-elekọta ezinụlọ ya nke ọma, onye ụmụ ya na-akpa àgwà ọma, na-erubekwara ya isi.+ 5 (N’ihi na ọ bụrụ na mmadụ amaghị otú ọ ga-esi na-elekọta ezinụlọ ya, oleezi otú ọ ga-esi na-elekọta ọgbakọ Chineke?) 6 O kwesịghị ịbụ onye chegharịrị ọhụrụ,+ ka ọ ghara ịdị mpako, a maa ya otu ikpe ahụ a mara Ekwensu. 7 O kwesịkwara ịbụ onye ndị na-anọghị n’ọgbakọ na-ekwu okwu ọma gbasara ya,+ ka ndị mmadụ ghara ịkọcha ya,* ya adaba n’ọnyà Ekwensu.
8 Ndị ohu na-eje ozi kwesịkwara ịbụ ndị na-eji ihe akpọrọ ihe. Ha agaghị abụ ndị ire abụọ,* ndị na-aṅụ oké mmanya, ma ọ bụ ndị ji anyaukwu achọ ihe ga-abara naanị ha uru.+ 9 Ha kwesịrị ịbụ ndị akọnuche ha na-anaghị ama ikpe,+ ndị na-ahapụghị ihe nzuzo dị nsọ gbasara okwukwe Ndị Kraịst.
10 E kwesịrị ibu ụzọ nwalee ha iji mara ma hà ruru eru. Ọ bụrụkwa na e nweghị ihe ọ bụla a ga-asị na ha mere,+ ka a họpụta ha ka ha bụrụ ndị ohu na-eje ozi.
11 Ụmụ nwaanyị kwesịkwara ịbụ ndị na-eji ihe akpọrọ ihe, ndị na-emeru ihe n’ókè, na ndị e kwesịrị ịtụkwasị obi n’ihe niile.+ Ha ekwesịghị ịna-ekwutọ ndị mmadụ.+
12 Ohu na-eje ozi kwesịrị ịbụ di otu nwaanyị. O kwesịrị ịna-elekọta ụmụ ya na ezinụlọ ya nke ọma. 13 N’ihi na ndị na-eje ozi nke ọma na-emere onwe ha ezigbo aha, ọnụ na-akakwa ha ikwu gbasara okwukwe ha nwere na Kraịst Jizọs.
14 Agụụ ịhụ gị na-agụsi m ike. Ma, ihe mere m ji na-edetara gị akwụkwọ ozi a bụ a dịghị ama ama mụ egbuo oge tupu mụ abịa hụ gị, 15 ka ị mara otú i kwesịrị isi na-akpa àgwà n’ezinụlọ Chineke,+ nke bụ́ ọgbakọ Chineke dị ndụ. Ọgbakọ a bụ ogidi na ihe na-akwado eziokwu. 16 N’eziokwu, ihe nzuzo dị nsọ, nke dịkwa egwu, gbasara ife Chineke otú ọ chọrọ, bụ: ‘Jizọs bụ mmadụ mgbe ọ bịara n’ụwa.+ A kpọrọ ya onye ezi omume mgbe ọ bụ mmụọ.+ Ndị mmụọ ozi hụrụ ya.+ E zisaara ndị mba ọzọ gbasara ya.+ Ndị mmadụ kweere na ya n’ụwa.+ A kpọgoro ya n’eluigwe, meekwa ka ọ dị ebube.’
4 Ma, Chineke ji mmụọ nsọ ya kwuo hoo haa na n’ọdịnihu, ụfọdụ ga-adapụ n’okwukwe, na-aṅa ntị n’ihe ndị na-abụghị eziokwu yiri ka ọ̀ bụ Chineke kwuru ha,+ na-aṅakwa ntị n’ihe ndị mmụọ ọjọọ na-akụzi. 2 Ha ga-aṅakwa ntị n’ụgha ndị ihu abụọ na-agha,+ ndị akọnuche ha nwụrụla ka ihe a dara ígwè ọkụ. 3 Ndị a ga-agwa ndị mmadụ ka ha ghara ịlụ di ma ọ bụ ịlụ nwaanyị,+ gwakwa ha ka ha ghara iri nri ụfọdụ.+ Ma, Chineke kere nri ndị a ka ndị nwere okwukwe,+ marakwa eziokwu nke ọma, na-eri ha+ ma na-ekele ya. 4 N’ihi na ihe niile Chineke kere dị mma.+ Ọ dịghịkwa ihe e kwesịrị ịjụ.+ E kwesịrị ikele Chineke, riekwa ha, 5 n’ihi na e ji okwu Chineke na ekpere doo ha nsọ.
6 Ọ bụrụ na ị na-agwa ụmụnna ihe ndị a, ị ga-abụ ezigbo onye ozi Kraịst Jizọs na onye ji ihe ndị na-eme ka okwukwe mmadụ sie ike na-azụ onwe ya, onye jikwa ọmarịcha ihe Chineke na-akụziri anyị, ndị i jisiri aka ike, na-azụ onwe ya.+ 7 Egekwala akụkọ ụgha na-enweghị isi,+ ụdị ahụ ụfọdụ ndị agadi nwaanyị na-akọ. Kama, na-azụ onwe gị ka ị bụrụ onye na-efe Chineke. 8 N’ihi na mmadụ ịzụ ahụ́ ya* bara obere uru. Ma, ife Chineke otú ọ chọrọ bara uru n’ihe niile, n’ihi na ọ bara uru ná ndụ anyị dị ugbu a. Ọ ga-abakwara anyị uru ná ndụ anyị ga-adị n’ọdịnihu.+ 9 Ihe a m na-ekwu bụ eziokwu, mmadụ kwesịkwara iji obi ya niile nabata ya. 10 Ọ bụ ya mere anyị ji na-arụsi ọrụ ike, na-agbasikwa mbọ ike n’ihe niile anyị na-eme,+ n’ihi na anyị tụkwasịrị Chineke dị ndụ obi, onye bụ́ Onye Nzọpụta+ nke ụdị mmadụ niile,+ karịchaa, ndị ji obi ha niile na-efe ya.
11 Na-akụzi ihe ndị a, na-agwakwa ha ndị mmadụ. 12 Emela ihe ga-eme ka onye ọ bụla lelịa gị anya maka na ị bụ nwata. Kama nke ahụ, ka otú i si ekwu okwu, otú i si akpa àgwà, otú i si hụ ndị ọzọ n’anya, otú i si nwee okwukwe, na otú i si ebi ndụ dị ọcha bụrụ ihe ndị ji obi ha niile na-efe Chineke ji ama atụ. 13 Tupu mụ abịa, na-agbasi mbọ ike n’ịgụpụta ihe n’ihu ọha,+ n’ịdụ ndị ọzọ ọdụ,* nakwa n’izi ihe. 14 Elegharala onyinye Chineke nyere gị anya. O nyere gị onyinye a mgbe e buru amụma gbasara gị, ndị okenye ebikwasịkwa gị aka n’isi.+ 15 Na-echebara ihe ndị a echiche.* Ka obi gị niile dịrịkwa na ha, ka mmadụ niile wee hụ na ị na-eme nke ọma n’ọgbakọ. 16 Na-eme ike gị niile ka ị bụrụ onye e ji ama atụ nakwa onye na-akụzi ihe nke ọma.*+ Na-eme ihe ndị a, n’ihi na ọ ga-eme ka ị zọpụta onwe gị, zọpụtakwa ndị na-ege gị ntị.+
5 Ejila iwe agwa okenye okwu.+ Kama, na-agwa ya okwu otú i si agwa nna gị, na-agwakwa ụmụ okorobịa okwu otú i si agwa ụmụnne gị ndị nwoke. 2 Na-agwakwa ụmụ nwaanyị merela agadi okwu otú i si agwa ndị nne, na-agwakwa ụmụ agbọghọ okwu otú i si agwa ụmụnne gị ndị nwaanyị, n’ebughị ihe ọjọọ ọ bụla n’obi.
3 Na-akwanyere ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ, ndị nọ ná mkpa,* ùgwù, na-elekọtakwa ha.+ 4 Ma ọ bụrụ na nwaanyị ọ bụla di ya nwụrụ mụrụ ụmụ ma ọ bụ na o nwere ụmụ ụmụ, ha buru ụzọ lekọta ndị ezinụlọ ha+ iji gosi na ha na-efe Chineke. Ha kwesịrị ịna-emere ndị nne na nna ha na ndị nne nne ha na ndị nna nna ha ihe ha kwesịrị imere ha.+ Ọ na-amasị Chineke ma ha na-eme otú a.+ 5 Ma nwaanyị isi mkpe, nke nọ ná mkpa n’eziokwu, atụkwasịla Chineke obi.+ Ọ na-arịọsikwa ya arịrịọ ike, na-ekpe ekpere ehihie na abalị.+ 6 Ma nwaanyị isi mkpe, nke na-eme ihe na-agụ ahụ́ ya agụụ,* nwụrụ anwụ, ọ bụ eziokwu na ọ dị ndụ. 7 N’ihi ya, na-akụziri ha ihe ndị a, ka a ghara ịna-ekwujọ ha. 8 N’eziokwu, ọ bụrụ na mmadụ anaghị egboro ndị nke ya mkpa ha, nke ka nke, ndị ezinụlọ ya, onye ahụ ajụla Chineke, jọkarịakwa onye na-ekweghị na Chineke ná njọ.+
9 Ka nwaanyị dị afọ iri isii gbagowe, nke di ya nwụrụ, soro ná ndị a ga-agụnye na ha nọ ná mkpa. Ọ ga-abụkwa onye na-agbaghị n’èzí mgbe di ya nọ ndụ.* 10 O kwesịkwara ịbụ onye e ji ịrụ ọrụ ọma mara,+ onye zụrụ ụmụ ya nke ọma,+ onye lere ọbịa,+ onye sara ụkwụ ndị nsọ,+ onye nyeere ndị nọ n’ahụhụ aka,+ onye jikwa ụdị ọrụ ọma niile kpọrọ ihe.
11 Ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ, bụ́ ndị na-emebeghị agadi, esoghị ná ndị a ga-agụnye na ha nọ ná mkpa, n’ihi na ịlụ di na-abụ mkpa ha mgbe agụụ mmekọahụ chịwara ha, kama ijere Kraịst ozi. 12 A ga-ama ha ikpe n’ihi na ha emeghịzi ihe ha kwere ná nkwa na mbụ. 13 Ha na-anọkwa nkịtị, na-epiogharị n’ụlọ dị iche iche. Ọ bụghị naanị na ha na-anọ nkịtị, ha na-agbakwa asịrị, na-etinye ọnụ n’ihe na-agbasaghị ha,+ na-ekwukwa ihe ndị ha na-ekwesịghị ikwu. 14 N’ihi ya, achọrọ m ka ụmụ nwaanyị na-emebeghị agadi, ndị di ha nwụrụ, lụọ di.+ Ka ha mụọkwa ụmụ,+ na-elekọta ezinụlọ ha, ka a ghara inwe ihe ndị na-emegide anyị ga-eji kwujọọ anyị. 15 N’eziokwu, ụfọdụ ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ akwụsịla ife Chineke, sorozie Setan. 16 Ọ bụrụ na nwaanyị ọ bụla bụ́ Onye Kraịst nwere ndị ikwu bụ́ ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ, ya nyere ha aka, ka ọgbakọ ghara ibu ibu ha. Ọ ga-eme ka ọgbakọ nwee ike ịna-enyere ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ nọ ná mkpa aka.*+
17 E kwesịrị ịna-akwanyere ndị okenye na-arụ ọrụ ha nke ọma+ ùgwù okpukpu abụọ,+ karịchaa, ndị na-agbasi mbọ ike n’ikwu okwu na n’ịkụzi ihe.+ 18 N’ihi na Akwụkwọ Nsọ sịrị, “Ekechila ọnụ ehi mgbe ọ na-azọcha ọka.”*+ Ọ sịkwara, “E kwesịrị ịkwụ onye ọrụ ụgwọ ọrụ ya.”+ 19 Ekwetala ebubo e boro okenye, ọ gwụla ma è nwere mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ gbara akaebe ya.+ 20 Nọrọ n’ihu mmadụ niile dọọ ndị na-eme mmehie+ aka ná ntị,+ ka ụjọ ime mmehie wee tụọ ndị ọzọ. 21 Ana m agwasi gị ike n’ihu Chineke, na n’ihu Kraịst Jizọs, na n’ihu ndị mmụọ ozi Chineke họọrọ, ka i lezie anya na-eme ihe ndị a n’eleghị onye ọ bụla anya n’ihu.+
22 Ebikwasịla onye ọ bụla aka n’isi ngwa ngwa.*+ Aka gị adịkwala ná mmehie ndị ọzọ. Debe onwe gị ọcha.
23 Aṅụzila mmiri ọzọ,* kama na-aṅụ ntakịrị mmanya n’ihi afọ gị na ọrịa ị na-arịakarị.
24 E nwere ụfọdụ ndị mmehie ha na-agba n’anwụ ozugbo, ya emee ka a maa ha ikpe. Ma, mmehie ndị nke ọzọ na-agba n’anwụ ka oge na-aga.+ 25 Otú ahụkwa ka ndị mmadụ na-ama mgbe a rụrụ ọrụ ọma.+ A gaghịkwa ezochili ọrụ ọma ọ bụla ndị mmadụ na-amaghị mgbe a rụrụ ya.+
6 Ka ndị ohu jiri obi ha niile na-akwanyere ndị nna ha ukwu ùgwù,+ ka a ghara ikwu okwu ọjọọ gbasara ihe Chineke na-akụziri anyị nakwa gbasara aha ya.+ 2 Ka ndị ohu ghara iji maka na ndị nna ha ukwu bụ ụmụnna hapụ ịna-akwanyere ha ùgwù. Kama, ka ha jiri obi ha niile na-agbara ha ohu, n’ihi na ọ bụ ụmụnna na ndị ha hụrụ n’anya ka ohu ha na-agba na-abara uru.
Na-akụziri ha ihe ndị a, na-agbakwa ha ume ka ha na-eme ha. 3 Ọ bụrụ na onye ọ bụla na-akụzi ihe dị iche n’ihe a, ọ bụrụkwa na onye ahụ ekwereghị eziokwu a na-akụziri anyị,*+ nke si n’aka Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, ma ọ bụ na o kwereghị ihe a na-akụziri anyị gbasara otú anyị kwesịrị isi na-efe Chineke,+ 4 ọ dị mpako, ọ naghịkwa aghọta ihe ọ bụla.+ Ihe ọ na-emekwa mgbe niile bụ ise okwu na ịrụ ụka.+ Ihe ndị a na-eme ka mmadụ na-eme anyaụfụ, na-ese okwu, na-ekwutọ ndị ọzọ,* na-enyokwa ha enyo. 5 Ọ na-emekwa ka ndị obi ha na-adịghị ọcha,+ ndị jụkwarala eziokwu, na-esekarị okwu n’ihi ihe ndị na-abaghị uru. Naanị ihe mere ụdị ndị a ji na-achọ ife Chineke bụ uru ha ga-erite.+ 6 N’eziokwu, ọ bụrụ na mmadụ na-efe Chineke, ihe o nwere ejukwa ya afọ, ọ ga-erite ọtụtụ uru.+ 7 N’ihi na mgbe a mụrụ anyị n’ụwa a, ọ dịghị ihe anyị wetara. Anyị nwụọkwa, ọ dịghị ihe anyị na-ewere.+ 8 N’ihi ya, ihe oriri na uwe* anyị nwere kwesịrị iju anyị afọ.+
9 Ma, a ga-anwata ndị kpebisiri ike ịba ọgaranya, ha ga-amakwa n’ọnyà.+ Ihe ọjọọ ga na-agụ ha agụụ. Ha ga na-akpakwa àgwà ka ndị na-amaghị ihe. A ga-ejikwa maka ihe ndị a bibie ha, laakwa ha n’iyi.+ 10 N’ihi na ịhụ ego n’anya bụ mgbọrọgwụ ụdị ihe ọjọọ niile. O meela ka ụfọdụ ndị dapụ n’okwukwe, meekwa ka ahụ́ niile na-afụ ha ụfụ ka ndị mara onwe ha mma aghara aghara.+
11 Ma gịnwa, onye nke Chineke, gbaara ihe ndị a ọsọ. Gbaa mbọ ka ị na-eme ezi omume, na-efe Chineke, nwee okwukwe, hụ ndị ọzọ n’anya, na-atachi obi, dịrịkwa nwayọọ n’obi.+ 12 Lụọ ezigbo ọgụ Ndị Kraịst na-alụrụ okwukwe ha. Jidesie ndụ ebighị ebi aka ike, nke Chineke họọrọ gị ka i nweta, nke ị kọọrọ ọtụtụ ndị gbasara ya.
13 Ana m agwasi gị ike n’ihu Chineke, onye na-eme ka ihe niile dịrị ndụ na-aga, nakwa n’ihu Kraịst Jizọs, onye nọ n’ihu Pọntiọs Paịlet+ gbaa ezigbo àmà, 14 ka ị na-edebe iwu otú ga-egosi na aka gị dị ọcha, otú ndị mmadụ na-agaghịkwa ahụ ihe ha ga-eji kwujọọ gị, ruo mgbe Onyenwe anyị Jizọs Kraịst ga-egosi ebube ya.*+ 15 Ọ bụ onye obi ụtọ, naanị ya bụkwa Eze Ukwu. Ọ ga-egosi ebube ya n’oge a kara aka. Ọ bụ Eze ndị eze na Onyenwe ndị nna ukwu niile.+ 16 N’ime ha niile, naanị ya bụ onye na-enweghị ike ịnwụ anwụ.+ O bikwa n’ìhè nke a na-enweghị ike ịbịa nso.+ Mmadụ ọ bụla ahụtụbeghị ya. Mmadụ ọ bụla agaghịkwa ahụli ya.+ Ka a na-asọpụrụ ya, ka ọ dịkwa ike ruo mgbe ebighị ebi. Amen.
17 Na-agwa ndị bara ọgaranya n’oge a* ka ha ghara ịdị mpako, ka ha gharakwa ịtụkwasị akụnụba a na-ejighị n’aka obi,+ kama, ka ha tụkwasị Chineke obi, onye na-enye anyị ihe niile na-akpa anyị mmaji kwuru mmaji.+ 18 Gwakwa ha ka ha na-eme ihe ọma, na-arụ ọtụtụ ọrụ ọma, na-emesapụ aka, na-enyekwa ndị ọzọ ihe.+ 19 Ha ga-esi otú ahụ na-akpakọta akụ̀ n’ebe Chineke nọ, na-atọkwa ezigbo ntọala maka ọdịnihu,+ ka ha nwee ike ijidesi ndụ nke bụ́ ezigbo ndụ aka ike.+
20 Timoti, ahapụkwala ihe i si n’aka Chineke nweta.+ Egekwala okwu na-enweghị isi ndị e ji ekwulu Chineke nakwa ihe ndị chere na ha ma ihe na-echepụta, ma ihe ha ma abụghị* eziokwu.+ 21 Ụfọdụ na-eji ihe a ndị mmadụ na-echepụta akpa nganga, ya emee ka ha dapụ n’okwukwe.
Ka Chineke meere unu amara.
Timoti pụtara “Onye Na-asọpụrụ Chineke.”
Na Grik, “ndị na-akụzi iwu.”
Ma ọ bụ “ndị na-anaghị egosi ịhụnanya pụrụ iche.”
Gụọ Nkọwa Okwu, “Ịkwa iko.”
Ma ọ bụ “ụmụ nwoke ndị ha na ụmụ nwoke na-enwe mmekọahụ.”
Ma ọ bụ “ụdị mmadụ niile.”
Na Grik, “n’ebe niile.”
Ma ọ bụ “na-eche echiche nke ọma.”
Ma ọ bụ “nọrọ nwayọọ.”
Ma ọ bụ “ka ọ na-anọ nwayọọ.”
Na Grik, “ha.”
Ma ọ bụ “na-echekwa echiche nke ọma.”
Ma ọ bụ “onye na-eche echiche nke ọma.”
Ma ọ bụ “onye na-eti mmadụ ihe.”
Ma ọ bụ “imenye ya ihere.”
Ma ọ bụ “ndị na-aghọgbu ndị ọzọ.”
Ma ọ bụ “mmadụ imega ahụ́.”
Ma ọ bụ “n’ịgba ndị ọzọ ume.”
Ma ọ bụ “Na-atụgharị uche n’ihe ndị a.”
Ma ọ bụ “Na-elezi onwe gị na ozizi gị anya mgbe niile.”
Ndị a na-ekwu ebe a bụ ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ, bụ́ ndị na-enweghị onye na-elekọta ha.
O nwere ike ịbụ agụụ mmekọahụ ka a na-ekwu ebe a.
Na Grik, “nwunye nke otu di.”
Ndị a na-ekwu ebe a bụ ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ, ma o nweghị onye na-elekọta ha.
Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
Ya bụ, ahọpụtala onye ọ bụla ọkụ ọkụ.
Ma ọ bụ “Aṅụla naanị mmiri.”
Ma ọ bụ “ihe bara uru a na-akụziri anyị.”
Ma ọ bụ “na-akparị ndị ọzọ.”
O nwere ike ịbụ, “ụlọ.” Na Grik, “ihe e ji ekpuchi ahụ́.”
Na Grik, “ga-apụta ìhè.”
Gụọ Nkọwa Okwu, “Oge a.”
Ma ọ bụ “na-emegide.”