Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • nwt 1 Pita 1:1-5:14
  • 1 Pita

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • 1 Pita
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
1 Pita

PITA NKE MBỤ

1 Mụnwa, bụ́ Pita, onyeozi+ Jizọs Kraịst, na-edetara unu akwụkwọ, unu ndị bi nwa oge n’ụwa a, ndị bi ebe dị iche iche na Pọntọs, Galeshia, Kapadoshia,+ Eshia, na Bitinia. Unu bụ ndị Chineke họọrọ. 2 Ọ bụ ya bụ Nna anyị. Ọ họọrọ unu maka na ọ bụ ihe o bu n’obi ime kemgbe.+ O ji mmụọ nsọ doo unu nsọ,+ ka unu wee na-erubere ya isi, dịkwa ọcha n’ihi ọbara Jizọs Kraịst.+

Ka Chineke meere unu amara, meekwa ka udo dịrị unu.

3 Ka e too Chineke bụ́ Nna nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst. Ọ bụ maka nnukwu ebere o meere anyị mere o ji mụọ anyị ọzọ+ ka anyị nwee ezigbo olileanya+ maka na a kpọlitere Jizọs Kraịst n’ọnwụ.+ 4 Olileanya a bụ inweta ndụ* a na-enweghị ike ịla n’iyi, nke a na-emerụghị emerụ, nke na-anaghịkwa emebi emebi.+ E doweere unu ya n’eluigwe.+ 5 Chineke ji ike ya na-echebe unu maka na unu nwere okwukwe. Ọ na-echebe unu ka ọ zọpụta unu. A ga-eme ka a mata ihe niile gbasara nzọpụta a n’oge ikpeazụ. 6 Ihe ndị a mere unu ji na-aṅụrị ezigbo ọṅụ, n’agbanyeghị na unu ataala ahụhụ obere oge ugbu a n’ihi ọnwụnwa dị iche iche bịaara unu.+ 7 Ihe mere ọnwụnwa ndị a ji bịara unu bụ ka a mara na okwukwe unu siri ezigbo ike.+ Ụdị okwukwe a bara uru karịa ọlaedo nke na-ala n’iyi n’agbanyeghị na e ji ọkụ nụchaa ya. Ọ ga-emekwa ka e too unu, sọpụrụ unu, unu adịkwa ebube mgbe a ga-ekpughe Jizọs Kraịst.+ 8 Ọ bụ eziokwu na unu ahụtụbeghị Kraịst, ma unu hụrụ ya n’anya. Ọ bụ eziokwu na unu anaghị ahụ ya anya ugbu a, ma unu kweere na ya, na-aṅụrịkwa ezigbo ọṅụ, ọṅụ nke ọnụ na-agaghị akọwali, nke dịkwa ebube. 9 N’ihi na o doro unu anya na okwukwe unu ga-eme ka a zọpụta unu.*+

10 Ndị amụma, ndị buru amụma banyere amara Chineke meere unu, jụsiri ajụjụ ike gbasara nzọpụta a, chọsiekwa ike ịmata gbasara ya.+ 11 Chineke ji mmụọ nsọ gwa ha na Kraịst ga-ata ahụhụ+ nakwa na ọ ga-emecha dịrị ebube. Ọ bụ ya mere ha ji na-agba mbọ ka ha chọpụta ihe ga-eme Kraịst na mgbe ihe ahụ ga-eme ya.+ 12 Chineke mere ka ha ghọta na ọ bụghị onwe ha ka ha na-ejere ozi, kama, na ọ bụ unu ka ha na-ejere ozi. Ọ bụ ha dere gbasara ihe ndị ahụ e kwusaara unu. Ọ bụkwa mmụọ nsọ e si n’eluigwe zite nyeere ndị zisaara unu ozi ọma aka.+ Ọ na-agụsikwa ndị mmụọ ozi ike ịma gbasara ihe ndị a.

13 N’ihi ya, keenụ ájị̀ n’ume maka ọrụ.+ Na-echenụ echiche nke ọma n’ihe niile.+ Nweenụ olileanya na Chineke ga-emere unu amara mgbe Jizọs Kraịst ga-egosi ike ya. 14 Unu bụzi ụmụ Chineke, ndị na-erubere ya isi. Kwụsịnụ ịna-eme ihe ọjọọ na-agụ unu agụụ oge ahụ unu na-amaghị ihe ọ bụla gbasara Chineke. 15 Kama ịna-eme ihe ọjọọ, dịrịnụ nsọ n’ihe niile unu na-eme,+ otú ahụ onye kpọrọ unu dị nsọ. 16 N’ihi na e dere, sị: “Unu ga-adị nsọ, n’ihi na adị m nsọ.”+

17 Ọ bụrụkwa na unu na-arịọ Nna anyị arịrịọ, onye na-ekpe onye ọ bụla ikpe maka otú o si kpaa àgwà, onye na-anaghịkwa ele mmadụ anya n’ihu,+ na-akpanụ àgwà otú na-egosi na unu na-atụ egwu Chineke+ n’oge unu bi nwa oge n’ụwa a. 18 N’ihi na unu ma na ọ bụghị ihe ndị nwere ike imebi emebi, dị ka ọlaọcha ma ọ bụ ọlaedo, ka e ji napụta unu,*+ unu akwụsị ibi ndụ na-enweghị isi na ọdụ nna nna unu hà kụziiri unu. 19 Kama ihe e ji napụta unu bụ ọbara+ Kraịst,+ nke pụrụ iche, nke dị ka nke nwa atụrụ a na-emerụghị emerụ, nke na-enweghịkwa ntụpọ.+ 20 N’eziokwu, Chineke ahọpụtala Kraịst tupu a tọọ ntọala ụwa,+ ma e mere ka a mara gbasara ya n’ọgwụgwụ oge a n’ihi unu.+ 21 A kpọlitere ya n’ọnwụ,+ meekwa ka ọ dịrị ebube.+ Unu sikwa n’aka ya kwere na Chineke.+ N’ihi ya, nweenụ okwukwe ma chere Chineke.

22 N’ihi otú unu si na-eme ihe okwu Chineke bụ́ eziokwu kwuru, unu asachaala onwe unu,* unu hụkwara nnọọ ibe unu n’anya ka ụmụnne.+ Ugbu a, jirikwanụ obi unu niile hụ ibe unu n’anya.+ 23 N’ihi na a mụọla unu ọzọ.+ E si ná mkpụrụ na-enweghị ike ịnwụ anwụ* mụọ unu, ọ bụghị mkpụrụ nwere ike ịnwụ anwụ.+ E ji okwu Chineke, onye dị ndụ, onye na-adịkwa ndụ ruo mgbe ebighị ebi, mụọ unu.+ 24 N’ihi na “mmadụ* niile dị ka ahịhịa. Ebube ha niile dịkwa ka ifuru ahịhịa. Ahịhịa na-akpọnwụ, okooko ya na-adapụkwa, 25 ma okwu Jehova* na-adịru mgbe ebighị ebi.”+ Ọ bụ “okwu” a bụ ozi ọma e zisaara unu.+

2 N’ihi ya, wepụnụ aka n’ihe ọjọọ niile,+ n’aghụghọ niile, nakwa n’ikwu okwu azụ niile. Unu abụla ndị ihu abụọ, unu emekwarala ndị ọzọ anyaụfụ. 2 Ka okwu Chineke, nke dị ka mmiri ara a na-agwaghị agwa, na-agụ unu agụụ otú ahụ ọ na-agụ ụmụ ọhụrụ+ agụụ ịṅụ ara nne ha. Ọ ga-eme ka unu tozuo etozuo, a zọpụtakwa unu,+ 3 n’ihi na unu ma nke ọma na Onyenwe anyị dị obiọma.

4 Ndị mmadụ ajụla onye bụ́ nkume dị ndụ,+ ma Chineke ahọrọla ya, ọ pụkwara iche n’anya ya.+ Mgbe unu kweere na ya, 5 unu ghọrọ nkume dị ndụ. A na-ejikwa mmụọ nsọ arụ unu ka ụlọ,+ ka unu bụrụ ndị nchụàjà dị nsọ, ka mmụọ nsọ duzie unu ịchụ àjà+ Chineke ga-esi n’aka Jizọs Kraịst nabata.+ 6 N’ihi na e dere n’Akwụkwọ Nsọ, sị: “Ana m adọnye otu nkume na Zayọn. Ọ bụ nkume a họọrọ, nkume ji ụlọ, nke dị oké ọnụ e ji tọọ ntọala. E nweghịkwa onye nwere okwukwe na ya a ga-emechu ihu.”*+

7 N’ihi ya, ọ pụrụ iche n’anya unu maka na unu kweere na ya. Ma ọ pụghị iche n’anya ndị na-ekweghị na ya. Akwụkwọ Nsọ kwuru na “nkume ndị na-arụ ụlọ jụrụ+ aghọọla nkume ji ụlọ”+ 8 na “nkume na-akpọbi ha ụkwụ nakwa oké nkume na-akpasu ha iwe.”*+ Ha na-ada n’ihi na ha anaghị eme ihe okwu Chineke kwuru. Ọdịda a ha na-ada bụkwa ụgwọ ọrụ ha. 9 Ma unu bụ “ndị a họọrọ, ndị eze bụ́kwa ndị nchụàjà, mba dị nsọ,+ ndị pụrụ iche Chineke họọrọ,+ ka unu wee kwusaa n’ebe niile na Chineke dị mma.”+ Ọ kpọpụtara unu n’ọchịchịrị ma kpọba unu n’ìhè ya dị ebube.+ 10 N’ihi na o nwere mgbe unu na-abụghị ndị Chineke, ma ugbu a, unu bụ ndị ya.+ Unu bụbu ndị Chineke na-emereghị ebere, ma ugbu a, o meerela unu ebere.+

11 Ndị m hụrụ n’anya, unu dị ka ndị mba ọzọ na ndị bi nwa oge n’ụwa a.+ M na-agba unu ume ka unu na-agbara ihe ọjọọ+ ndị unu* na ha na-alụ ọgụ+ ọsọ. 12 Na-akpanụ àgwà dị mma mgbe unu na ndị mba ọzọ nọ,+ ka ọ ga-abụ, ha na-asịgodị na unu bụ ndị ọjọọ, ha enwee ike ịhụ ihe dị mma unu na-eme+ wee too Chineke n’oge ọ ga-enyocha ndị mmadụ.

13 Jirinụ maka Onyenwe anyị na-erubere ndị niile ụmụ mmadụ họpụtara isi,+ ma eze,+ n’ihi na ọ karịrị unu, 14 ma ndị gọvanọ, n’ihi na eze họpụtara ha ka ha na-ata ndị ọjọọ ahụhụ ma na-aja ndị ọma mma.+ 15 N’ihi na Chineke chọrọ ka unu na-eme ihe dị mma ka unu nwee ike imechi ọnụ ndị na-anaghị ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị, ndị na-ekwu okwu ọjọọ gbasara unu n’ihi na ha dị nzuzu.+ 16 Na-ebinụ ndụ ka ndị nweere onwe ha.+ Ma, unu ejikwala maka na unu nweere onwe unu na-eme ihe ọjọọ,+ kama na-ebinụ ndụ ka ndị ohu Chineke.+ 17 Sọpụrụnụ ụdị mmadụ niile.+ Hụnụ ụmụnna niile n’anya.+ Tụọnụ egwu Chineke.+ Sọpụrụnụ onye eze.+

18 Ka ndị ohu na-erubere ndị nwe ha isi, na-akwanyekwara ha ùgwù,+ ma ndị nwe ha hà bụ ezigbo mmadụ, na-elekwa ihe anya otú kwesịrị ekwesị, ma hà bụ ndị ọ na-esi ike imete mma. 19 N’ihi na ọ bụrụ na mmadụ na-edi ahụhụ ọ na-ata mgbe a na-akpagbu ya maka na ọ na-agba mbọ ka akọnuche ya na-arụ ọrụ otú Chineke chọrọ,+ ihe ya ga na-amasị Chineke. 20 Olee uru ọ bara na unu na-atachi obi mgbe a na-ata unu ahụhụ maka ihe ọjọọ unu mere?+ Ma, ọ bụrụ na unu na-atachi obi mgbe a na-ata unu ahụhụ maka na unu mere ihe dị mma, ọ na-amasị Chineke.+

21 N’eziokwu, Chineke họọrọ unu ka unu na-eme otú a, n’ihi na Kraịst n’onwe ya tara ahụhụ maka unu.+ O gosiri unu ihe unu ga na-eme ka unu na-esosi nzọụkwụ ya ike.*+ 22 O meghị mmehie ọ bụla,+ o kwughịkwa ihe ga-eduhie onye ọ bụla.+ 23 Mgbe a na-akparị ya,*+ ọ naghị akparịgwara.*+ Mgbe ọ na-ata ahụhụ,+ o nweghị onye ọ baara mba, kama ọ hapụrụ okwu niile n’aka Chineke, onye na-ekpe ikpe+ ziri ezi. 24 O buuru mmehie anyị+ n’ahụ́ ya mgbe a kpọgidere ya n’osisi,+ ka anyị wee sepụ aka ná mmehie ma na-eme ihe dị mma. “Ahụ́ e merụrụ ya mekwara ka a gwọọ unu.”+ 25 N’ihi na unu dị ka atụrụ kpafuru akpafu.+ Ma ugbu a, unu alaghachikwurula onye ọzụzụ atụrụ+ na onye na-elekọta mkpụrụ obi* unu.

3 Ndị nwunye, sikwanụ otú ahụ na-edo onwe unu n’okpuru ndị di unu,+ ka ọ ga-abụ, ndị nke na-anaghị eme ihe okwu Chineke kwuru hụ otú unu si akpa àgwà, ha nwere ike mewe ya+ n’agbanyeghị na unu ezighị ha ozi ọma, 2 ebe ọ bụ na ha hụrụ àgwà ọma unu na-akpa+ nakwa otú unu si na-akwanyere ha ezigbo ùgwù. 3 Ka ihe kacha unu mkpa ghara ịbụ ịchọ mma elu ahụ́, ya bụ, ịkpa isi na iyi ihe ndị e ji ọlaedo mee+ ma ọ bụ iyi uwe mara mma. 4 Kama ka ọ bụrụ ịchọ obi unu* mma nakwa ịgba mbọ ka unu bụrụ ndị obi ruru ala na ndị dị nwayọọ.+ Ọ bụ ya ka Chineke na-anaghị eji egwu egwu. Ụdị ịchọ mma a anaghịkwa emebi emebi. 5 Otú ahụ ka ụmụ nwaanyị ndị dị nsọ n’oge ochie, ndị tụkwasịrị Chineke obi, si chọọ onwe ha mma, na-erubekwara ndị di ha isi. 6 Otú ahụ ka Sera si na-erubere Ebreham isi, na-akpọkwa ya “onyenwe m.”+ Unu bụ ụmụ Sera ma ọ bụrụhaala na unu ana-eme ihe dị mma, gharakwa ịtụ egwu.+

7 Ndị di, na-emesonụ ndị nwunye unu ihe otú na-egosi na unu na-echebara ha echiche. Ebe unu na ha ga-eketa+ ndụ Chineke na-enye ndị o meere amara, na-akwanyerenụ ha ùgwù+ maka na ha dị ka arịa na-esighị ike. Ma ọ́ bụghị ya, Chineke agaghị na-anụ ekpere unu.

8 N’ikpeazụ, unu niile nwee otu obi.+ Ka ihe banyere ibe unu na-emetụ unu n’obi. Hụnụ ibe unu n’anya ka ụmụnne. Na-enwenụ obi ebere,+ dịrịkwanụ umeala n’obi.+ 9 Unu ejila ihe ọjọọ akwụ ụgwọ ihe ọjọọ,+ unu ejikwala mkparị akwụ ụgwọ mkparị.+ Kama, na-agọzinụ ndị mmadụ,+ n’ihi na Chineke họọrọ unu ka unu na-agọzi ndị ọzọ, ka yanwa wee gọzie unu.

10 N’ihi na “onye chọrọ ịdị ndụ, chọọkwa ịna-enwe obi ụtọ ná ndụ, ekwesịghị iji ọnụ* ya na-ekwu ihe ọjọọ+ ma ọ bụ jiri ọnụ* ya na-aghọ aghụghọ. 11 Ya hapụ ihe ọjọọ,+ mewe ezi ihe.+ Ya na-achọ udo ma gbalịa na-eme udo.+ 12 N’ihi na anya Jehova* dị n’ebe ndị ezi omume nọ, ntị ya na-anụkwa arịrịọ ha na-arịọsi ya ike.+ Ma Jehova* na-ajụ ndị na-eme ihe ọjọọ.”+

13 N’eziokwu, ònye ga-emerụ unu ahụ́ ma unu jiri obi unu niile na-eme ihe dị mma?+ 14 Ma ọ bụrụgodị na unu ataa ahụhụ n’ihi na unu na-eme ihe dị mma, unu ga-enwe obi ụtọ.+ Ma, ka ihe na-atụ ndị ọzọ egwu ghara ịtụ unu egwu,* obi amapụkwala unu.+ 15 Kama jirinụ obi unu kweta na Kraịst bụ Onyenwe anyị nakwa na ọ dị nsọ. Jikerekwanụ mgbe niile ịza mmadụ ajụjụ gbasara ihe mere unu ji nwee olileanya unu nwere. Ma medanụ obi ma unu zawa ya onye ahụ,+ kwanyekwaranụ ya ezigbo ùgwù.+

16 Na-agbanụ mbọ ka unu nwee ezigbo akọnuche,+ ka ọ ga-abụ, ndị mmadụ kwuwe okwu ọjọọ gbasara unu, ihere emee ha+ maka àgwà ọma unu na-akpa n’ihi na unu na-eso ụzọ Kraịst.+ 17 Ọ bụrụ na Chineke ekwe ka unu taa ahụhụ maka na unu na-eme ihe dị mma,+ ọ dị mma karịa na unu na-ata ahụhụ maka na unu na-eme ihe ọjọọ.+ 18 Kraịst, bụ́ onye ezi omume, nwụrụ naanị otu ugboro n’ihi ndị mmehie+ ka o duga unu ebe Chineke nọ.+ Ọ bụ mmadụ mgbe ọ nwụrụ,+ ma ọ bụ mmụọ mgbe e mere ka ọ dị ndụ.+ 19 Ọ bụkwa mmụọ mgbe ọ gara gwa ndị mmụọ ozi a tụrụ mkpọrọ ikpe a mara ha.+ 20 Ndị mmụọ ozi a nupụrụ isi n’oge Noa.+ N’oge ahụ, Chineke nwere ndidi, cherekwa mgbe a nọ na-arụ ụgbọ+ Noa. E ji ụgbọ ahụ buru mmadụ ole na ole, ya bụ, mkpụrụ obi asatọ,* gafee mmiri ahụ n’enweghị ihe mere ha.+

21 Baptizim, nke ya na ihe a yiri, na-azọpụtakwa unu ugbu a n’ihi na a kpọlitere Jizọs Kraịst n’ọnwụ. Baptizim abụghị ịsachapụ unyi dị n’ahụ́, kama ọ bụ arịrịọ mmadụ na-arịọ Chineke ka o mee ka o nwee ezigbo akọnuche.+ 22 Jizọs gara eluigwe. Ọ nọ ugbu a n’aka nri Chineke.+ Chineke mekwara ka ọ kara ndị mmụọ ozi na ndị na-achị achị na ndị dị ike.+

4 Ebe Kraịst tara ahụhụ mgbe ọ bụ mmadụ,+ jikerekwanụ ịna-eche echiche otú Kraịst si eche, n’ihi na onye tarala ahụhụ ewepụla aka ná mmehie.+ 2 Ọ ga-eme ka onye ahụ na-eme uche Chineke+ mgbe ọ dị ndụ, ma kwụsị ịna-eme ihe na-agụ mmadụ agụụ.+ 3 N’ihi na n’oge gara aga, unu ji nnukwu oge bie ndụ otú ndị mba ọzọ na-achọ.+ Mgbe ahụ, ihe ọjọọ na-agụ unu agụụ, unu ana-eme ihe ọjọọ n’asọghị anya,* na-aṅụ oké mmanya, na-eme oriri oké mkpọtụ, unu na ibe unu ana-ama aka onye ga-aṅụkarị ibe ya ná mmanya, unu ana-ekpekwara arụsị.+ 4 Ugbu a, ọ na-eju ha anya na unu esoghịzi ha na-ebi ụdị ndụ ọjọọ a, ọ bụ ya mere ha ji ekwutọ unu.+ 5 Ma, ha ga-aza Kraịst ajụjụ n’ihi na ọ bụ ya ga-ekpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe.+ 6 N’eziokwu, ọ bụ ihe a mere e ji zisaara ndị nwụrụ anwụ ozi ọma.+ N’agbanyeghị na e kpere ha ikpe otú ụmụ mmadụ si ekpe ikpe,* ha ga-adị ndụ ma mmụọ Chineke na-edu ha.

7 Ma ọgwụgwụ ihe niile adịla nso. N’ihi ya, na-elenụ ihe anya otú dị mma,+ na-ekpekwanụ ekpere mgbe niile.*+ 8 Nke ka nke, jirinụ obi unu niile hụ ibe unu n’anya,+ n’ihi na onye hụrụ ndị ọzọ n’anya na-adị njikere mgbe niile ịgbaghara ha ma ha mejọọ ya.+ 9 Na-elenụ ibe unu ọbịa n’atamughị ntamu.+ 10 Ka onye ọ bụla n’ime unu jiri onyinye Chineke nyere ya na-ejere ibe ya ozi, ebe unu bụ ezigbo ndị ohu Chineke ji ihe akpọrọ ihe,* ndị Chineke meere amara n’ụzọ dị iche iche.+ 11 Onye na-ekwu okwu, ya kwuo ihe Chineke kwuru. Onye na-ejere ndị ọzọ ozi, ya jiri ike Chineke na-eje ya,+ ka ọ ga-abụ na n’ihe niile, a ga-esi n’aka Jizọs Kraịst too Chineke.+ Ọ dị ebube, dịrịkwa ike ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.

12 Ndị m hụrụ n’anya, ka ọnwụnwa ndị dị ka ọkụ na-abịara unu+ ghara iju unu anya, dị ka à ga-asị na ọ bụ ihe unu na-ahụtụbeghị na-abịara unu. 13 Kama, na-aṅụrịnụ ọṅụ,+ ebe ọ bụ na ihe mere unu ji ata ahụhụ bụkwa ihe mere Kraịst ji taa ahụhụ,+ ka obi wee bụrụ unu sọ aṅụrị mgbe a ga-eme ka a hụ ebube ya.+ 14 Ọ bụrụ na a na-akọcha* unu n’ihi aha Kraịst, unu ga na-enwe obi ụtọ,+ n’ihi na mmụọ dị ebube, ya bụ, mmụọ Chineke, dị n’ime unu.

15 Ma, achọghị m ka onye ọ bụla n’ime unu taa ahụhụ maka na o gburu mmadụ ma ọ bụ na o zuru ohi ma ọ bụ na ọ bụ onye ọjọọ, ma ọ bụkwanụ na ọ na-etinye anya n’ihe na-agbasaghị ya.+ 16 Ma ọ bụrụ na mmadụ na-ata ahụhụ maka na ọ bụ Onye Kraịst, ka ihere ghara ime ya,+ kama ka ọ na-ebi ndụ ka Onye Kraịst, si otú ahụ na-eto Chineke. 17 N’ihi na oge a kara aka eruola ka e si n’ụlọ Chineke+ malite ikpe ikpe. Ma ọ bụrụ na ọ ga-eji anyị malite,+ gịnịzi ga-eme ndị na-anaghị erube isi n’ozi ọma Chineke?+ 18 “Ọ bụrụkwa na onye ezi omume ga-agbasi mbọ ike tupu Chineke azọpụta ya, gịnịzi ga-eme onye na-anaghị asọpụrụ Chineke na onye mmehie?”+ 19 N’ihi ya, ka ndị na-ata ahụhụ maka na ha na-eme ihe dị Chineke mma mere ihe dị mma+ na-aga. Ka ha nyefeekwa Chineke onwe ha.* Ọ bụ ya kere anyị, anyị kwesịkwara ịtụkwasị ya obi.

5 Ebe mụnwa bụkwa okenye, na-agbakwa àmà gbasara ahụhụ Kraịst tara, sorokwa ná ndị a ga-eme ka a hụ na ha dị ebube,+ ana m agba ndị bụ́ okenye n’ime unu ume, sị: 2 Ebe unu bụ ndị nlekọta, na-azụnụ ìgwè atụrụ Chineke+ ndị e nyefere unu n’aka ka unu na-elekọta. Unu azụla ha ka à manyere unu amanye, kama jirinụ obi unu niile na-azụ ha otú ga-amasị Chineke.+ Unu azụkwala ha ka unu rigbuo ha,+ kama ka ịzụ ha na-anụ unu ọkụ n’obi. 3 Unu emekwala ka ọ̀ bụ unu nwe ndị Chineke,+ kama na-akpanụ àgwà ìgwè atụrụ Chineke ga na-eṅomi.+ 4 Mgbe a ga-eme ka onyeisi ndị ọzụzụ atụrụ+ pụta ìhè, unu ga-enweta ihe nrite* dị ebube nke na-enweghị ike imebi emebi.+

5 Ụmụ okorobịa, na-edokwanụ onwe unu n’okpuru ndị okenye.+ Ma unu niile, dịrịnụ umeala n’obi* n’otú unu si emeso ibe unu ihe, n’ihi na ihe ndị mpako anaghị amasị Chineke, ma ọ na-emere ndị dị umeala n’obi amara.+

6 N’ihi ya, wedanụ onwe unu ala otú Chineke, onye dị ike, chọrọ,* ka o bulie unu elu mgbe oge ruru.+ 7 Na-akọrọnụ ya* ihe niile na-echegbu unu,+ n’ihi na ihe banyere unu na-emetụ ya n’obi.+ 8 Na-echenụ echiche nke ọma, na-echekwanụ nche.+ Ekwensu, bụ́ onye iro unu, na-ejegharị ka ọdụm na-agbọ ụja, na-achọ onye ọ ga-eri.+ 9 Ma na-alụsonụ ya ọgụ,+ siekwanụ ike n’okwukwe, ebe unu ma na ụmụnna unu niile ndị nọ n’ụwa na-ata ụdị ahụhụ a unu na-ata.+ 10 Ma mgbe unu tatụchara ahụhụ, Chineke, onye na-eme amara n’ụzọ niile, onye kpọrọ unu ka unu na Kraịst dịrị n’otu nakwa ka unu dịrị ebube ruo mgbe ebighị ebi,+ ga-azụru unu n’isi. Ọ ga-eme ka unu kwụsie ike.+ Ọ ga-eme ka unu sie ike,+ meekwa ka unu kwụrụ chịm. 11 Ọ bụ ya nwe ike ruo mgbe ebighị ebi. Amen.

12 Ọ bụ Silvenọs,*+ nwanna e kwesịrị ịtụkwasị obi, nyeere m aka dee akwụkwọ ozi a dị nkenke. Edetaara m ya unu iji gbaa unu ume na iji mee ka unu mara ezigbote amara Chineke meere unu. Jirikwanụ amara a kpọrọ ihe. 13 Nwanna nwaanyị ahụ nke nọ na Babịlọn, onye a họọrọ otú a họọrọ unu, na-ekele unu. Mak+ nwa m na-ekelekwa unu. 14 Susuonụ ibe unu ọnụ mgbe unu na-ekele ibe unu* iji gosi na unu hụrụ ha n’anya.

Ka udo dịrị unu niile ndị ha na Kraịst dị n’otu.

Na Grik, “ihe nketa.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi unu.”

Na Grik, “gbapụta unu.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi unu.”

Ya bụ, mkpụrụ nke na-eme ka a dị ndụ.

Na Grik, “anụ ahụ́.”

Gụọ A5.

Na Grik, “a ga-emenye ihere.”

Ma ọ bụ “oké nkume nke na-eme ka ha daa.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi unu.”

Ma ọ bụ “ka unu na-eme nnọọ ka ya.”

Ma ọ bụ “a na-ekwujọ ya.”

Ma ọ bụ “ekwujọgwara.”

Ma ọ bụ “na-elekọta ndụ.”

Ma ọ bụ “ụdị mmadụ unu bụ.”

Na Grik, “ire.”

Na Grik, “egbugbere ọnụ.”

Gụọ A5.

Gụọ A5.

O nwere ike ịbụ, “unu atụla ụjọ maka ụjọ ha na-achọ imenye unu.”

Ma ọ bụ “mmadụ asatọ.”

Ma ọ bụ “unu na-eme ihe ọjọọ n’emeghị ihere.” N’asụsụ Grik, a·sel′gei·a. Gụọ Nkọwa Okwu.

Ma ọ bụ “otú ndị nọ n’anụ ahụ́ si ekpe ikpe.”

Ma ọ bụ “mụrụkwanụ anya n’okwu gbasara ekpere.”

Ma ọ bụ “ezigbo ndị na-elekọta ụlọ.”

Ma ọ bụ “a na-akparị.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ha.”

Na Grik, “okpueze.”

Ma ọ bụ “yirinụ umeala n’obi ka uwe.”

Na Grik, “wedanụ onwe unu ala n’okpuru aka dị ike nke Chineke.”

Ma ọ bụ “Nyefeenụ ya.”

Aha ya ọzọ bụ Saịlas.

Otú e si ekele mmadụ n’oge ahụ bụ isusu ya ọnụ, dị ka isusu ya ọnụ na ntì.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya