ABỤ SOLOMỌN
1 Abụ kacha abụ niile. Ọ bụ Solomọn dere abụ a:+
Aha gị dị ka mmanụ na-esi ísì ọma a na-awụpụta awụpụta.+
Ọ bụ ya mere ụmụ agbọghọ ji hụ gị n’anya.
Eze akpọbatala m n’ime ime ụlọ ya.
Ka anyị ṅụrịa ọṅụ ma mee onwe anyị obi ụtọ.
Ka anyị kwuo banyere otú i si egosi m na ị hụrụ m n’anya karịa ikwu banyere mmanya.
Ka a sịkwa ihe mere ha* ji hụ gị n’anya.
5 Ụmụ nwaanyị Jeruselem, adị m oji, ma m mara mma.
M dị ka ụlọikwuu ndị Kida,+ m dịkwa ka ákwà ụlọikwuu+ Solomọn.
6 Unu elela m anya maka na m dị oji,
N’ihi na anyanwụ agbajiela m.
Ụmụnne m ndị nwoke wesara m iwe.
Ha nyere m ọrụ ilekọta ubi vaịn,
Ma elekọtaghị m ubi vaịn nke m.
7 Onye m hụrụ n’anya nke ukwuu,
Gwa m ebe ị nọ na-azụ ìgwè atụrụ gị,+
Ebe ị na-edu ha aga ka ha makpuru ala n’etiti ehihie.
Gwa m, ka m ghara ịna-agagharị n’ebe ìgwè atụrụ ndị enyi gị nọ
Ka nwaanyị ji ákwà kpuchie ihu ya.”
8 “Gị nwaanyị kacha ụmụ nwaanyị niile mma, ọ bụrụ na ị maghị ebe ọ nọ,
Soro ụzọ ebe ìgwè atụrụ si aga
Duru ìgwè ewu gị gaa n’ebe ndị na-azụ atụrụ mara ụlọikwuu, ka ha taa ahịhịa.”
9 “Onye m hụrụ n’anya, ị mara mma ka nne ịnyịnya* nke so n’ịnyịnya ndị na-adọkpụ ụgbọ ịnyịnya Fero.+
10 Ọla ndị e ji achọ mma i yi* mere ka ntì gị maa mma,
Ákà* ndị ị nya n’olu mekwara ka olu gị maa mma.
11 Anyị ga-eji ọlaedo rụọrọ gị ọla e ji achọ mma,
Jirikwa ọlaọcha chọọ ha mma.”
15 “Onye m hụrụ n’anya, ị mara mma.
Ị mara ezigbo mma. Anya gị dị ka anya nduru.”+
16 “Onye m hụrụ n’anya, ị mara mma.* Ị mara ezigbo mma.+
Anyị na-edina ala n’akwụkwọ ndụ.
2 “Otú ahụ okooko lili na-adị n’etiti ahịhịa ogwu,
Ka onye m hụrụ n’anya dị n’etiti ụmụ nwaanyị.”
3 “Otú ahụ osisi apụl na-adị n’etiti osisi ndị dị n’oké ọhịa,
Ka onye m hụrụ n’anya dị n’etiti ụmụ nwoke.
Ọ na-agụsi m ike ka m nọrọ na ndò ya,
Mkpụrụ osisi ya na-atọkwa m ụtọ.
5 Nyenụ m achịcha mkpụrụ vaịn na apụl ka m taa;+
Ka obi dị m ụtọ, ka m wee nweta ume,
N’ihi na anaghị m enweta onwe m maka na onye m hụrụ n’anya anọghị m nso.
7 Ụmụ nwaanyị Jeruselem, eji m ele+ na nne mgbada bi n’ọhịa
Na-arịọ unu ka unu ṅụọrọ m iyi
Na unu agaghị eme ka m hụ onye ọ bụla n’anya ebe ọ bụ na ọ dịbeghị m n’obi.+
8 Anụrụ m olu onye m hụrụ n’anya.
Lee, ọ bịawala.
Ọ na-arị ugwu ukwu, na-awụkwa ọsọ n’ugwu nta.
9 Onye m hụrụ n’anya yiri ele. O yiri oké mgbada.+
Lee, o guzo n’azụ mgbidi anyị.
O si na windo na-ele anya.
O si na mpio ụlọ na-enyobata anya.
10 Onye m hụrụ n’anya kwuru okwu. Ọ sịrị m:
‘Ọdị m n’obi, bilie.
Asampete m, bịa ka anyị pụọ.
Mmiri akwụsịla izo, mmiri alaala.
13 Mkpụrụ mbụ osisi fig mịrị achaala.+
Osisi vaịn amaala ifuru, na-esikwa ísì ọma.
Onye m hụrụ n’anya, bilie.
Asampete m, bịa ka anyị pụọ.
14 Nduru m, ka m hụ gị ma nụ olu gị+
N’ebe zoro ezo ná nnukwu nkume,+
N’ebe zoro ezo n’ọnụ ọnụ ugwu,
N’ihi na olu gị dị ụtọ, ị makwara mma.’”+
15 “Jiderenụ anyị nkịta ọhịa,
Ụmụ nkịta ọhịa ndị na-emebisị ubi vaịn,
N’ihi na ubi vaịn anyị amaala ifuru.”
16 “Onye m hụrụ n’anya bụ nke m, abụkwa m nke ya.+
Ọ na-azụ atụrụ+ n’ebe okooko lili dị.+
17 Tupu oge ikuku ji eku eruo,* tupu onyinyo alakpuo,
Onye m hụrụ n’anya, lọta ọsọ ọsọ
Ka ele+ ma ọ bụ oké mgbada+ nke nọ n’ugwu ndị dị n’agbata anyị abụọ.*
M tụrụ anya ya, ma ahụghị m ya.+
2 M ga-ebili gagharịa n’obodo.
M ga-achọ onye m hụrụ n’anya
N’okporo ámá nakwa n’ámá obodo.
M chọrọ ya, ma ahụghị m ya.
3 Ndị nche ndị na-agagharị n’obodo hụrụ m.+
M jụrụ ha, sị, ‘Ùnu hụrụ onye m hụrụ n’anya?’
4 Ozugbo m gafere ha,
M hụrụ onye m hụrụ n’anya.
M jidere ya aka. Ekweghị m ahapụ ya
Ruo mgbe m kpọbatara ya n’ụlọ nne m,+
N’ime ime ụlọ nwaanyị mụrụ m.
5 Ụmụ nwaanyị Jeruselem, eji m ele na nne mgbada bi n’ọhịa
Na-arịọ unu ka unu ṅụọrọ m iyi
Na unu agaghị eme ka m hụ onye ọ bụla n’anya ebe ọ bụ na ọ dịbeghị m n’obi.”+
6 “Gịnị bụ ihe a si n’ala ịkpa na-abịa nke yiri anwụrụ ọkụ,
Nke e ji mea na frankinsens
Na ihe dị iche iche na-esi ísì ọma onye ahịa na-ere mee ka ọ na-esi ísì ọma?”+
7 “Lee, ọ bụ ihe e ji ebu Solomọn.
Ndị dike iri isii n’ime ndị dike Izrel
Gbara ya gburugburu.+
8 Ha niile ji mma agha.
Ha niile bụ ndị agha a zụrụ nke ọma.
Onye ọ bụla kere mma agha ya n’úkwù
Ka ha jiri ya chebe ya, ka ihe ọ bụla ghara imenye ya ụjọ n’abalị.”
9 “Ọ bụ ihe e ji ebu* Eze Solomọn.
O ji osisi si Lebanọn rụọrọ ya onwe ya.+
E ji ajị anụ na-acha pọpụl rụọ ebe a na-anọ ọdụ na ya.
Ụmụ nwaanyị Jeruselem mere ka ime ya
Maa ezigbote mma.”
11 “Ụmụ nwaanyị Zayọn, gaanụ
Kirie Eze Solomọn
Ka o kpu okpu nne ya+ kpaara ya
N’ụbọchị ọ lụrụ nwaanyị,
N’ụbọchị obi bụ ya sọ aṅụrị.”
4 “Onye m hụrụ n’anya, ị mara mma.
Ị mara ezigbo mma.
Anya gị, nke i kpuchiri ákwà, dị ka anya nduru.
Ntutu isi gị dị ka ìgwè ewu
Ndị si n’ugwu ndị dị na Gilied na-agbadata.+
2 Ezé gị dị ọcha ka ìgwè nne atụrụ a ka kpachara ajị ọhụrụ,
Ndị si n’ebe a sara ha ahụ́ na-apụta.
Ha niile na-amụ ejima ejima.
E nwebeghị nke ọ bụla n’ime ha nwa ya nwụrụ.
3 Egbugbere ọnụ gị dị ka eri na-acha uhie uhie,
Ihe ị na-ekwu dịkwa ụtọ.
Ntì gị abụọ, nke i kpuchiri ákwà,
Dị ka pomigranet a pịwara abụọ.
4 Olu gị+ dị ka ụlọ elu Devid,+
Nke e ji nkume ndị kwụ n’ahịrị rụọ,
Bụ́ ebe e kokwasịrị otu puku ọta,
Ya bụ, ọta niile dị okirikiri nke ndị dike.+
5 Ara gị abụọ yiri ụmụ ele abụọ,
Bụ́ ụmụ ejima nne ele mụrụ,+
Ndị na-ata ahịhịa n’ebe okooko lili juru.”
6 “Tupu oge ikuku ji eku eruo,* tupu onyinyo alakpuo,
M ga-aga n’ugwu mea dị
Nakwa n’ugwu frankinsens dị.”+
7 “Onye m hụrụ n’anya, ị bụ sọ mma.+
I nweghị ntụpọ.
Si n’elu ugwu Amana gbadata.
Si n’ọnụ ọnụ ugwu Sina, n’ọnụ ọnụ ugwu Hemọn,+
N’ọgba ọdụm nakwa n’ugwu agụ owuru, gbadata.
9 Nwanne m nwaanyị, nwaanyị m ga-alụ, i nwetala obi m.+
Naanị otu anya i lere m na otu ihe i konyere n’ihe olu gị
Emeela ka obi m dịrị n’ebe ị nọ.
10 Nwanne m nwaanyị, nwaanyị m ga-alụ, otú i si egosi m na ị hụrụ m n’anya enweghị atụ.+
Otú i si egosi m na ị hụrụ m n’anya na-atọ m ụtọ karịa mmanya.+
Mmanụ gị na-esi ísì ọma karịa ihe ọ bụla na-esi ísì ọma.+
11 Nwaanyị m ga-alụ, ezigbo mmanụ aṅụ si n’egbugbere ọnụ gị na-atasị.+
Mmanụ aṅụ na mmiri ara ehi dịkwa n’okpuru ire gị.+
Ísì ọma nke na-esipụta n’uwe gị dịkwa ka ísì ọhịa Lebanọn.
12 Nwanne m nwaanyị, nwaanyị m ga-alụ, ị dị ka ubi a gbara ogige,
Ubi a kpọchiri akpọchi, isi iyi a gbachiri ogige.
13 Ihe na-amị n’ubi gị mere ka ubi gị* dị ka paradaịs* nke osisi pomigranet juru,
Ya na mkpụrụ osisi ndị kacha mma, na okooko osisi hena, na ahịhịa spaịknad na-esi ísì ọma,
14 Ahịhịa spaịknad+ na okooko safrọn, okpete na-esi ísì ọma+ na sinamọn,+
Ya na ụdị osisi frankinsens niile, mea, na alo,+
Nakwa ihe niile kacha esi ísì ọma.+
15 Ị dị ka isi iyi dị n’ubi, olulu mmiri ezigbo mmiri dị na ya,
Ị dịkwa ka iyi ndị na-asọ asọ si Lebanọn.+
16 Ifufe nke si n’ebe ugwu, teta.
Ifufe nke si n’ebe ndịda, fere bata.
Jiri nwayọọ fee n’ubi m.
Ka ísì ọma ya kusaa.”
“Ka onye m hụrụ n’anya bata n’ubi ya
Ma taa ọmarịcha mkpụrụ osisi ya.”
Ewetala m mea na ahịhịa na-esi ísì ọma.+
Arachaala m mmanụ aṅụ m, mịchaakwa ụgbụgbọ ya.
Aṅụọla m mmanya m na mmiri ara ehi m.”+
“Ndị enyi anyị, rienụ ihe.
Ṅụọnụ mmanya, ka ịhụnanya gbuokwa unu ka mmanya.”+
2 “Ana m arahụ ụra, ma obi m na-awagharị.+
M wee nụ aka onye m hụrụ n’anya na-akụ n’ụzọ.
‘Nwanne m nwaanyị, onye m hụrụ n’anya, megheere m ụzọ,
Nduru m, onye na-enweghị ntụpọ.
N’ihi na igirigi edeela isi m.
Igirigi nke dara n’abalị edeela ntutu isi m.’+
3 Eyipụla m uwe m.
M̀ ga-eyiri ya ọzọ?
Asaala m ụkwụ m.
M̀ ga-emetọsị ya ọzọ?
4 Onye m hụrụ n’anya seere aka ya n’oghere ụzọ.
O wee gụsiwe m ike ịhụ ya.
5 M biliri ọtọ ka m megheere onye m hụrụ n’anya ụzọ;
Mmanụ mea esi n’aka m na-agụsị,
Mmanụ mea esikwa ná mkpịsị aka m na-agụsị,
Na-atasa n’ihe e ji kpọchie ụzọ.
6 M megheere onye m hụrụ n’anya ụzọ,
Ma onye m hụrụ n’anya apụọla, ọ laala.
Obi mapụrụ m mgbe ọ pụrụ.*
M chọrọ ya, ma ahụghị m ya.+
M kpọrọ ya òkù, ma ọ zaghị m.
7 Ndị nche ndị na-agagharị n’obodo hụrụ m.
Ha tiri m ihe. Ha merụrụ m ahụ́.
Ndị na-eche nche ná mgbidi dọpụrụ m ákwà m wụkwasịrị n’ahụ́.
8 “Ụmụ nwaanyị Jeruselem, ṅụọrọnụ m iyi
Na ọ bụrụ na unu ahụ onye m hụrụ n’anya
Na unu ga-agwa ya na anaghị m enweta onwe m maka na ọ nọghị m nso.”
9 “Gị nwaanyị kacha ụmụ nwaanyị niile mma,
Olee ihe onye ị hụrụ n’anya ji kara nwoke ọ bụla ọzọ mma?
Olee ihe onye ị hụrụ n’anya ji kara nwoke ọ bụla ọzọ mma
Nke mere i ji agwa anyị ka anyị ṅụọ ụdị iyi a?”
10 “Onye m hụrụ n’anya bụ sọ mma, ahụ́ ya na-egbukekwa egbuke;*
Ọ bụ ọpụrụiche n’ime puku ụmụ nwoke iri.
11 Isi ya mara mma ka ọlaedo, ka ọlaedo kacha mma.
Ntutu isi ya dị ka igu nkwụ ifufe na-ebugharị,
Ntutu isi ya dịkwa oji ka ugoloọma.
12 Anya ya yiri nduru ndị nọ n’akụkụ iyi,
Ndị na-asa ahụ́ n’ime mmiri ara ehi,
Ndị nọ n’akụkụ ọdọ mmiri nke mmiri juru.
Egbugbere ọnụ ya dị ka okooko lili, nke mmanụ mea si na ya na-atasị.+
14 Mkpịsị aka ya dị ka ọlaedo, nke e ji nkume krisolaịt chọọ mma.
Afọ ya dị ka ọdụ́ e ji safaya kpuchie.
15 Ụkwụ ya dị ka ogidi ndị e ji mabụl rụọ, ndị e jikwa ọlaedo kacha mma rụọ ebe ala ha.
Ọ mara mma ka Lebanọn. O nweghị atụ ka osisi sida.+
Ihe niile banyere ya magburu onwe ya.+
Ụmụ nwaanyị Jeruselem, ọ bụ onye a bụ onye m hụrụ n’anya. Ọ bụ ya bụ ọdị m n’obi.”
6 “Nwaanyị kacha ụmụ nwaanyị niile mma,
Olee ebe onye ị hụrụ n’anya gara?
Olee ebe onye ị hụrụ n’anya gawara?
Ka anyị soro gị chọwa ya.”
2 “Onye m hụrụ n’anya gawara n’ubi ya,
N’ebe a kụrụ ahịhịa ndị na-esi ísì ọma.
Ọ gara ka ọ zụọ atụrụ n’ubi
Nakwa ka ọ kụta okooko lili.+
Ọ na-azụ atụrụ n’ebe okooko lili dị.”+
4 “Onye m hụrụ n’anya,+ ị mara mma ka Teza.*+
Ị mara ezigbo mma ka Jeruselem.+
Ị mara nnọọ mma ka ndị agha gbakọtara ka ha gaa agha.+
Ntutu isi gị dị ka ìgwè ewu
Ndị si na Gilied na-agbadata.+
6 Ezé gị dị ọcha ka ìgwè atụrụ
Ndị si n’ebe a sara ha ahụ́ na-apụta.
Ha niile na-amụ ejima ejima.
E nwebeghị nke ọ bụla n’ime ha nwa ya nwụrụ.
7 Ntì gị abụọ i kpuchiri ákwà
Dị ka pomigranet a pịwara abụọ.
8 M nwere ndị nwunye iri isii
Na ndị iko nwaanyị iri asatọ
Na ụmụ agbọghọ ndị ọzọ a na-enweghị ike ịgụta ọnụ.+
9 Ma naanị otu onye bụ nduru m,+ onye na-enweghị ntụpọ.
Ọ bụ ọpụrụiche n’anya nne ya.
Ọ bụ ya ka onye mụrụ ya kacha hụ n’anya.
Ụmụ agbọghọ hụrụ ya kpọọ ya onye obi ụtọ.
Ndị nwunye eze na ndị iko eze jakwara ya mma.
10 ‘Ònye bụ nwaanyị a nke na-enwu* ka ìhè na-apụta mgbe chi na-abọ,
Nke mara mma ka ọnwa gbazuru agbazu,
Nke na-egbuke egbuke ka anyanwụ,
Nke makwara nnọọ mma ka ndị agha gbakọtara ka ha gaa agha?’”+
11 “Agbadara m n’ubi osisi ụkpa+
Ka m hụ ihe ndị puru ọhụrụ na ndagwurugwu,
Ka m hụ ma osisi vaịn ò puola,
Ma osisi pomigranet ọ̀ maala ifuru.
12 Tupu m mara ihe na-eme,
Agụụ ịhụ ihe ndị a mere ka m nọrọzie
N’ebe ụgbọ ịnyịnya ndị a ma ama n’obodo anyị dị.”
13 “Lọghachi, lọghachi, nwa agbọghọ Shulem!
Lọghachi, lọghachi,
Ka anyị kirie gị!”
“Gịnị mere unu ji na-ekiri nwa agbọghọ Shulem?”+
“O yiri ìgwè abụọ na-agba egwú.”*
7 “Gị nwa agbọghọ a na-akwanyere ùgwù,
Ụkwụ gị mara ezigbo mma n’akpụkpọ ụkwụ i yi.
Úkwù gị mara mma ka ihe e ji achọ mma
Nke onye na-akpụ ihe nke ọma kpụrụ.
2 Otubo gị dị ka efere dị okirikiri.
Ka mmanya a gwara agwa ghara ịkọ na ya mgbe ọ bụla.
Afọ gị dị ka ikpo ọka wit
Nke e ji okooko lili gbaa gburugburu.
4 Olu gị+ yiri ụlọ elu e ji ọdụ́ rụọ.+
Imi gị dị ka ụlọ elu Lebanọn,
Nke chere Damaskọs ihu.
Otú ogologo ntutu isi gị si awụgharị masịrị eze.
6 Nwa agbọghọ m hụrụ n’anya, ị mara ezigbo mma,
Ị mara mma karịa ihe niile na-eme ka obi tọọ mmadụ ụtọ.
8 M sịrị, ‘M ga-arịgo n’elu nkwụ
Ka m ghọrọ ụyọkọ mkpụrụ ya.’
Ka ara gị dịrị ka ụyọkọ mkpụrụ vaịn.
Ka ume ị na-ekupụ na-esi ísì ọma ka apụl.
9 Ka ọnụ* gị dịrịkwa ka ezigbo mmanya.”
“Ka o jiri nwayọọ na-agbada n’akpịrị onye m hụrụ n’anya,
Jirikwa nke nta nke nta na-abanye n’ọnụ ndị ụra na-eburu.”
11 Onye m hụrụ n’anya, bịa.
Ka anyị gaa n’ọhịa.
Ka anyị nọrọ n’ebe okooko osisi hena dị.+
12 Ka anyị bilie n’isi ụtụtụ gaa n’ubi vaịn
Ka anyị hụ ma mkpụrụ vaịn ò puola,
Ma okooko ya ọ̀ gbawaala,+
Ma osisi pomigranet ọ̀ maala ifuru.+
M ga-anọ ebe ahụ gosi gị na m hụrụ gị n’anya.+
13 Ahịhịa mandrek*+ na-esipụta ísì ọma ya.
Ụdị ọmarịcha mkpụrụ osisi ọ bụla dị n’ọnụ ụzọ anyị.+
Onye m hụrụ n’anya, m doweere gị
Ma ndị ochie ma ndị ọhụrụ.
8 “A sị nnọọ na ị bụ nwanne m nwoke,
Onye ṅụrụ ara nne m,
M ga-esusu gị ọnụ ma m hụ gị n’èzí,+
E nweghịkwa onye ga-ele m anya ọjọọ.
2 M ga-eduru gị.
M ga-akpọbata gị n’ụlọ nne m,+
Onye kụziiri m ihe.
M ga-enye gị mmanya na-esi ísì ọma ka ị ṅụọ
Nakwa mmiri pomigranet a pịpụtara ọhụrụ.
4 Ụmụ nwaanyị Jeruselem, m na-arịọ unu ka unu ṅụọrọ m iyi
Na unu agaghị eme ka m hụ onye ọ bụla n’anya ebe ọ bụ na ọ dịbeghị m n’obi.”+
5 “Ònye bụ onye a nke si n’ala ịkpa na-abịa,
Nke konyere onye ọ hụrụ n’anya aka?”
“M kpọtere gị n’okpuru osisi apụl.
Ọ bụ n’ebe ahụ ka ime gị mere nne gị.
Ọ bụ n’ebe ahụ ka ime mere nwaanyị mụrụ gị.
6 “Kanye m ka akara n’obi gị,
Kanye m ka akara n’ogwe aka gị,
N’ihi na ịhụnanya siri ike ka ọnwụ,+
Ịhụnanya nke siri ezigbo ike na-emekwa ka mmadụ ghara ịhapụ onye ọ hụrụ n’anya otú ili* na-anaghị ahapụ onye o ji.
Ụdị ịhụnanya a dị ka ọkụ na-enwusi ike, bụ́ ọkụ nke Jaa.*+
Ọ bụrụ na mmadụ enye akụ̀ niile dị n’ụlọ ya ka e wee hụ ya n’anya,
A ga-eleda ya* nnọọ anya.”
8 “Anyị nwere obere nwanne nwaanyị.+
Ọ kpụbeghị ara.
Gịnị ka anyị ga-emere nwanne anyị nwaanyị
N’ụbọchị a ga-ekwu okwu ya?”
9 “Ọ bụrụ na ọ bụ mgbidi,
Anyị ga-eji ọlaọcha chọọ elu ya mma.
Ma, ọ bụrụ na ọ bụ ibo ụzọ,
Anyị ga-eji ibé osisi sida tụbichie ya.”
10 “Abụ m mgbidi,
Ara m dịkwa ka ụlọ elu.
N’ihi ya, n’anya ya,
Abụ m onye obi ruru ala.
11 Solomọn nwere otu ubi vaịn+ na Bel-hemọn.
O nyefere ubi vaịn ahụ n’aka ndị ga na-elekọta ya.
Onye nke ọ bụla na-eweta otu puku mkpụrụ ego ọlaọcha maka mkpụrụ ubi ahụ na-amị.
12 Otu puku mkpụrụ ego ọlaọcha ahụ bụ nke gị, Solomọn,
Narị abụọ abụrụ nke ndị na-elekọta mkpụrụ ubi vain ahụ na-amị.
Ma ubi vaịn nke m bụ naanị nke m.”
Mee ka m nụ ya.”+
14 “Onye m hụrụ n’anya, mee ngwa ngwa.
Na Hibru, “Sekpụrụ m.”
Ya bụ, ụmụ agbọghọ.
Ma ọ bụ “nne ịnyịnya m.”
O nwere ike ịbụ, “Isi ị kpara.”
Ma ọ bụ “Ihe olu.”
Ma ọ bụ “ị mara mma nwoke.”
Ma ọ bụ “ọmarịcha ụlọ.”
Na Hibru, “n’ụlọ mmanya.”
Ma ọ bụ “udu mmiri.”
Na Hibru, “Tupu ụbọchị ekuwe ume.”
Ma ọ bụ “n’ugwu Beta.”
Ma ọ bụ “ihe ndina.”
Ihe a yiri oche ma ọ bụ ihe e ji edina ala e kpuchiri elu ya ekpuchi. E ji ya ebu ndị ukwu.
Ọ ga-abụ na ogidi ndị a bụ idé ndị ji elu ya.
Na Hibru, “Tupu ụbọchị ekuwe ume.”
O nwere ike ịbụ, “Akpụkpọ ahụ́ gị.”
Ma ọ bụ “ubi.”
O nwere ike ịbụ, “mgbe o kwuru okwu.”
Na Hibru, “na-acha uhie uhie.”
Na Hibru, “Okpo ọnụ.”
Ma ọ bụ “Ọmarịcha Obodo.”
Na Hibru, “nke na-eledata anya.”
Ma ọ bụ “yiri ndị na-agba egwú Mahaneyim.”
Na Hibru, “Isi gị.”
Nkwụ a bụ ụdị nkwụ a na-ahụkarị na Palestaịn.
Na Hibru, “okpo ọnụ.”
Ụmụ nwaanyị na-eri mkpụrụ ahịhịa a maka na ha chere na ọ ga-eme ka ha dị ime.
Ma ọ bụ “Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
“Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.
O nwere ike ịbụ akụ̀ ya ka a na-ekwu.