AKWỤKWỌ OZI E DEGAARA NDỊ EFESỌS
1 Mụnwa bụ́ Pọl, onye ọ bụ uche Chineke ka ọ bụrụ onyeozi Kraịst Jizọs, na-edetara ọgbakọ dị n’Efesọs akwụkwọ ozi a. Unu bụ ndị nsọ,+ na ndị e kwesịrị ịtụkwasị obi, nakwa ndị ha na Kraịst Jizọs dị n’otu.
2 Ka Chineke Nna anyị nakwa Onyenwe anyị Jizọs Kraịst meere unu amara, meekwa ka udo dịrị unu.
3 Ka e too Chineke, bụ́ Nna nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, n’ihi na o si n’eluigwe jiri mmụọ nsọ gọzie anyị n’ụzọ niile n’ihi na anyị na-eso ụzọ Kraịst.+ 4 Ọ họọrọ anyị ka anyị na Kraịst dịrị n’otu tupu a tọọ ntọala ụwa, ka anyị nwee ike hụ ya n’anya, dị nsọ, gharakwa iji ihe ọ bụla merụọ onwe anyị+ n’anya ya. 5 N’ihi na o kpebiri tupu oge eruo+ na a ga-esi n’aka Jizọs Kraịst mee ka anyị bụrụ ụmụ ya,+ maka na ọ dị ya mma, bụrụkwa uche ya,+ 6 ka e wee too ya maka otú o si jiri Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya+ meere anyị amara na-enweghị atụ.+ 7 E si n’aka Ọkpara ya gbapụta anyị, jirikwa n’ihi ọbara ya+ na-agbaghara anyị mmehie anyị.+ N’eziokwu, amara Chineke meere anyị enweghị atụ.
8 Amara a o meere anyị emeela ka anyị mara ihe nke ọma, meekwa ka anyị na-aghọta ihe nke ọma. 9 O mekwara ka anyị mara ihe nzuzo dị nsọ+ gbasara uche ya. Ihe nzuzo a dị ya mma. Ọ bụkwa ihe mere o ji zube ime 10 ka e nwee otú a ga-esi na-elekọta ihe. Ihe a ga-emekwa mgbe oge ọ kara aka zuru, ka o wee chịkọta ihe niile dị n’eluigwe na ihe niile dị n’ụwa, ka ha nọrọ n’okpuru Kraịst.+ N’eziokwu, a ga-achịkọta ihe niile n’okpuru onye 11 anyị na ya dị n’otu. Chineke kpebiri tupu oge eruo na anyị ga-eketa ihe o kwere anyị ná nkwa.+ O kpebiri ihe a maka na ọ bụ nzube ya, ọ na-emekwa ihe niile o kpebiri bụ́ uche ya. 12 Anyị bụ ndị mbụ kweere na Kraịst. Chineke kpebikwara tupu oge eruo na anyị ga na-aja ya mma ma na-eto ya. 13 Ma unu kwekwaara na Kraịst mgbe unu nụrụ eziokwu ahụ, ya bụ, ozi ọma gbasara otú Chineke ga-esi zọpụta unu. Mgbe unu kweere na ya, Chineke si n’aka ya jiri mmụọ nsọ o kwere ná nkwa kaa unu akara.+ 14 Mmụọ nsọ a bụ ihe na-eme ka obi sie anyị ike na anyị ga-eketa ihe Chineke kwere anyị ná nkwa.+ Chineke mere ihe a iji gbapụta+ ndị ya,+ nke ga-eme ka a na-aja ya mma, na-etokwa ya.
15 Ọ bụ ya mere na kemgbe m nụrụ gbasara okwukwe unu nwere n’Onyenwe anyị Jizọs nakwa otú unu si eme ihe gosiri na unu hụrụ ndị nsọ niile n’anya, 16 akwụsịbeghị m ikele Chineke maka unu. M na-echetakwa unu n’ekpere mgbe niile, 17 ka Chineke, Nna dị ebube, Chineke nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, nye unu ike ga-eme ka unu mara ihe ma ghọta ihe ndị ọ na-agwa unu nke ọma gbasara onwe ya.+ 18 Chineke emegheela obi unu ka unu nwee ike ịma ihe o mere ka unu na-atụ anya ya, ka unu nweekwa ike ịma ihe ọma ndị dị ebube o kwere nkwa inye ndị nsọ,+ 19 marakwa gbasara ike na-enweghị atụ ọ kpara n’ime anyị bụ́ ndị kweere na ya.+ A hụrụ na ike ya dị egwu 20 mgbe ọ kpọlitere Kraịst n’ọnwụ ma nye ya oche n’aka nri ya+ n’eluigwe, 21 n’ebe dị elu karịa ọchịchị niile na ndị niile nwere ikike na ndị niile dị ike na ndị niile na-edu ndú na aha ọ bụla,+ ọ bụghị naanị n’oge a,* kamakwa n’ọdịnihu. 22 O dowekwala ihe niile n’okpuru ya,*+ meekwa ya onyeisi nke ihe niile gbasara ọgbakọ ya,+ 23 nke bụ́ ahụ́ ya.+ Ihe gbasara ya jukwara n’ọgbakọ a. Ọ na-emekwa ka ihe niile ju eju.
2 N’ihi mmehie unu, unu dịbu ka ndị nwụrụ anwụ. Ma, Chineke mere ka unu dị ndụ.+ 2 E nwere mgbe unu na-eme otú ụwa a* si eme,+ na-emekwa ihe onye ikuku nke ụwa a dị n’aka chọrọ.+ Ikuku a bụ ụdị echiche*+ nke na-akpa ike ugbu a n’ime ndị nnupụisi. 3 N’eziokwu, n’oge gara aga, anyị niile mere omume otú ha si eme, n’ihi na anyị na-eme ihe ọ bụla anụ ahụ́ anyị chọrọ ka anyị mee.+ Anyị na-eme ihe ọ bụla na-atọ anụ ahụ́ anyị ụtọ, na-emekwa ihe ọ bụla batara anyị n’echiche.+ Kemgbe a mụrụ anyị, anyị bụ ndị Chineke kwesịrị iwesa iwe+ otú ndị ọzọ bụ. 4 Ma, n’ihi ebere Chineke na-enweghị atụ+ na otú o si hụ anyị n’anya hie nne,+ 5 o mere ka anyị dịrị ndụ, anyị na Kraịst adịrịkwa n’otu, n’agbanyeghị na anyị dị ka ndị nwụrụ anwụ n’ihi mmehie anyị.+ N’eziokwu, ọ zọpụtala unu n’ihi amara ya. 6 Chineke emeekwala ka anyị dịrị ndụ, nyekwa anyị ebe anyị ga-anọ ọdụ n’eluigwe n’ihi na anyị na Kraịst Jizọs dị n’otu.+ 7 Ihe mere Chineke ji mee ihe a bụ ka o gosi na amara ya enweghị atụ mgbe ọ ga-emere anyị ihe ọma n’oge na-abịa abịa, n’ihi na anyị na Kraịst Jizọs dị n’otu.
8 N’ihi amara Chineke, a zọpụtala unu, ndị nwere okwukwe.+ A zọpụtaghị unu n’ihi mbọ unu gbara, kama ọ bụ onyinye Chineke. 9 A zọpụtaghị unu n’ihi ọrụ ndị unu rụrụ,+ ka onye ọ bụla ghara inwe ihe ọ ga-eji na-anya isi. 10 Anyị bụ ọrụ aka Chineke. Ebe ọ bụ na anyị bụ ndị na-eso ụzọ Kraịst Jizọs,+ e kere anyị+ ka anyị na-arụ ọrụ ọma, nke Chineke dị mbụ kpebie ka anyị na-arụ.
11 N’ihi ya, chetanụ na unu abụghị ndị Juu. Ndị ụmụ mmadụ biri úgwù na-akpọ unu ndị a na-ebighị úgwù. 12 Unu amaghị Kraịst n’oge ahụ. Unu na ndị Izrel anaghị emekọ ihe ọ bụla, unu esoghịkwa n’ọgbụgba ndụ Chineke ji kwe nkwa.+ Unu bi n’ụwa, ma unu enweghị olileanya, unu amaghịkwa Chineke.+ 13 Ma ugbu a, ebe unu bụ ndị na-eso ụzọ Kraịst Jizọs, unu ndị na-amabughị Chineke, abịala mara ya n’ihi ọbara Kraịst. 14 N’ihi na Kraịst emeela ka anyị dịrị n’udo,+ meekwa ka ìgwè abụọ ahụ bụrụ otu,+ kwatuokwa mgbidi kewara ha.+ 15 O mechara mee ka ha bụrụ otu ìgwe,+ ha adịrịkwa n’udo. N’eziokwu, ìgwè abụọ ahụ bụcha ndị na-eso ụzọ ya. N’ihi ahụ́ ya o ji chụọ àjà, o mere ka a kwụsị ịna-edebe Iwu Mosis. Ọ bụ Iwu a mere ka ìgwè abụọ ahụ dịrị n’iro. 16 N’ihi ọnwụ ọ nwụrụ n’osisi ịta ahụhụ,*+ o mekwara ka Chineke na ìgwè abụọ ahụ dịrị n’ezigbo mma, ka ha nwee ike ịbụ otu ahụ́ maka na o jirila onwe ya mee ka ha ghara ịbụkwa ndị iro.+ 17 Ọ bịakwara zisaara unu ndị na-amaghị Chineke ozi ọma nke udo, zisaakwara ndị ma ya. 18 N’ihi na àjà o ji ndụ ya chụọ emeela ka anyị niile nọ n’ìgwè abụọ a nwee ike ịna-abịa Nna anyị nke eluigwe nso maka na ọ na-enye anyị niile mmụọ nsọ.
19 N’ihi ya, unu abụghịzi ndị mbịarambịa na ndị mba ọzọ,+ kama unu na ndị nsọ bụ ụmụ amaala,+ unu sokwa n’ezinụlọ Chineke.+ 20 A rụkwasịkwara unu n’elu ntọala, nke bụ́ ndịozi na ndị amụma,+ ebe Kraịst Jizọs bụ nkume ji ụlọ e ji tọọ ntọala.+ 21 E jikọkwara akụkụ ụlọ ahụ niile ọnụ. Ebe ọ bụ na ụlọ ahụ na Kraịst dị n’otu,+ ọ na-aghọrọ Jehova* ụlọ nsọ.+ 22 Ebe ọ bụ na unu na Kraịst dịkwa n’otu, Chineke emeela ka unu na ndị ọzọ bụrụ ụlọ o bi, n’ihi na mmụọ ya dị ebe ahụ.+
3 Ihe mere e ji tụọ mụnwa, bụ́ Pọl, mkpọrọ+ bụ n’ihi na m na-eso ụzọ Kraịst Jizọs, na-enyekwara ununwa bụ́ ndị mba ọzọ aka. 2 N’eziokwu, ama m na unu anụla na e nyere m ọrụ inyere unu aka+ ka amara Chineke baara unu uru. 3 Chineke mere ka m mata ihe nzuzo dị nsọ. Edere m gbasara ya ná nkenke n’akwụkwọ ozi m detaara unu n’oge gara aga. 4 N’ihi ya, unu gụchaa ihe a m na-ede, ọ ga-edo unu anya na aghọtala m ihe nzuzo ahụ dị nsọ+ gbasara Kraịst. 5 N’ọgbọ ndị gara aga, Chineke emeghị ka ụmụ mmadụ mara ihe nzuzo a otú o si mee ka ndịozi ya dị nsọ na ndị amụma ya mara ya ugbu a.+ 6 Ihe nzuzo ahụ bụ na ndị mba ọzọ, ndị ha na Kraịst Jizọs dị n’otu, ga-eketa ihe o ketara, sorokwa n’ahụ́ ya.+ Ha ga-enwetakwa otu ihe ahụ Chineke ji maka ozi ọma anyị na-ezisa kwe anyị ná nkwa. 7 M ghọrọ onye na-ezisa gbasara ihe nzuzo a dị nsọ n’ihi amara Chineke. O nyere m onyinye a n’efu mgbe o nyere m ike ya.+
8 Chineke meere mụnwa, bụ́ onye kacha ndị nsọ niile nta,+ amara,+ ka m zisaara ndị mba ọzọ ozi ọma banyere ihe ọma ndị na-enweghị atụ si n’aka Kraịst 9 ma mee ka ụmụ mmadụ hụ otú Chineke, onye kere ihe niile, si mezuo ihe nzuzo ya dị nsọ,+ nke o zoro kemgbe ogologo oge gara aga. 10 Nke a bụ ka e wee mee ugbu a ka ọchịchị na ikike ndị dị n’eluigwe si n’aka ọgbakọ+ mata na Chineke si n’ụzọ dị iche iche egosi amamihe ya.+ 11 Ihe a dabara ná nzube Chineke nke na-adịru ebighị ebi. O kpebiri isi n’aka Kraịst+ Jizọs Onyenwe anyị mezuo ya. 12 N’ihi okwukwe anyị nwere na Jizọs, ọnụ na-aka anyị ikwu okwu, obi ana-esikwa anyị ike ịna-abịa Chineke nso.+ 13 N’ihi ya, m na-arịọ unu ka unu ghara ịda mbà maka ahụhụ m na-ata n’ihi unu, n’ihi na ahụhụ m na-ata ga-eme ka e too unu.+
14 Ọ bụ ya mere m ji na-egburu Nna anyị ikpere n’ala, 15 onye mere ka ezinụlọ niile n’eluigwe na n’ụwa dịrị.* 16 Ekpere m bụ ka Chineke, onye dị ebube, jiri mmụọ nsọ ya gbaa unu ume, meekwa ka obi sie unu ike.+ 17 M na-arịọkwa ya ka okwukwe unu nwere mee ka Kraịst dịrị unu n’obi, ka unu hụkwa ndị ọzọ n’anya,+ ka unu kwụsie ike, gbanyesiekwa mgbọrọgwụ ike+ na ntọala okwukwe unu.+ 18 Ọ ga-eme ka unu na ndị nsọ nwee ike ịghọta nke ọma otú eziokwu si dị obosara, dị ogologo, dị elu, dịkwa omimi. 19 Ọ ga-emekwa ka unu mara na otú Kraịst si hụ unu n’anya+ dị mkpa karịa mmadụ ịma ihe, ka unu wee na-akpa àgwà niile Chineke na-enyere mmadụ aka ịna-akpa.
20 Chineke, onye na-enye anyị ike,+ ga-emeliri anyị ihe mmaji kwuru mmaji karịa ihe niile anyị na-arịọ ma ọ bụ ihe niile anyị na-eche n’echiche.+ 21 Ka a na-eto ya n’ọgbọ niile ruo mgbe niile ebighị ebi n’ihi ihe o sirila n’aka ọgbakọ nakwa n’aka Kraịst Jizọs rụọ. Amen.
4 N’ihi ya, mụnwa a tụrụ mkpọrọ+ maka Onyenwe anyị na-arịọ unu ka unu na-eje ije otú kwesịrị+ òkù ahụ a kpọrọ unu. 2 Dịrịnụ umeala n’obi.+ Na-adịnụ nwayọọ mgbe niile. Na-enwenụ ndidi.+ Na-edirinụ ibe unu ihe n’ihi na unu hụrụ ha n’anya.+ 3 Unu na ibe unu dịrị n’udo, na-agbasikwanụ mbọ ike ka unu na-adị n’otu otú mmụọ nsọ mere ka unu dịrị.+ 4 E nwere otu ahụ́,+ nweekwa otu mmụọ nsọ,+ otú ahụ e nwere otu olileanya+ a kpọrọ unu ka unu nwee. 5 E nwekwara otu Onyenwe anyị,+ otu okwukwe, otu baptizim, 6 otu Chineke na Nna mmadụ niile, onye bụ́ onyeisi mmadụ niile na onye na-esi n’aka mmadụ niile arụ ọrụ, na-ejikwa ike ya arụ ọrụ n’ime mmadụ niile.
7 Chineke meere onye ọ bụla n’ime anyị amara. Ọ bụ ya mere Kraịst ji nye anyị niile onyinye dị iche iche n’efu.+ 8 N’ihi na Akwụkwọ Nsọ sịrị: “Mgbe ọ rịgooro n’elu, ọ kpọọrọ ụmụ nwoke a dọọrọ n’agha, jiri ha nye onyinye.”+ 9 Ma gịnị ka okwu ahụ bụ́ “ọ rịgooro” pụtara? Ọ pụtara na e nwere mgbe ọ rịdatara n’ụwa. 10 Onye ahụ rịdatara n’ụwa bụkwa ya rịgooro+ ebe dị elu karịa eluigwe niile,+ ka o wee mezuo ihe niile.
11 O nyere ụfọdụ ka ha bụrụ ndịozi,+ nye ụfọdụ ka ha bụrụ ndị amụma,+ nye ụfọdụ ka ha bụrụ ndị na-ezisa ozi ọma,+ nyekwa ụfọdụ ka ha bụrụ ndị ọzụzụ atụrụ na ndị na-akụzi ihe,+ 12 ka ha na-agbazi* ndị nsọ, na-eje ozi, na-emekwa ka ahụ́ Kraịst sie ike.*+ 13 Ha ga na-eme ihe ndị a ka anyị niile kwere otu ihe, marakwa Ọkpara Chineke nke ọma. Anyị ga-esi otú ahụ bụrụ ndị dimkpa,+ tozuokwa okè ka Kraịst. 14 N’ihi ya, anyị ekwesịghịzi ịbụ ụmụaka, maka na ọ bụrụ na mmadụ ekwere ihe na-abụghị eziokwu ndị aghụghọ na-akụzi,+ onye ahụ yiri ụgbọ dị n’oké osimiri nke ifufe na ebili mmiri na-ebugharị. 15 Kama ka anyị na-ekwu eziokwu, ka ịhụnanya mee ka anyị tozuo etozuo n’ụzọ niile, na-ebikwa ndụ otú Kraịst bụ́ onyeisi anyị biri.+ 16 E si n’aka ya jikọọ ahụ́+ niile ọnụ nke ọma, ihe nke ọ bụla dị n’ahụ́ na-enyekwara ibe ya aka ịrụ ọrụ ya otú ga-abara ahụ́ niile uru. Ọ bụrụ na ihe nke ọ bụla dị n’ahụ́ na-arụ ọrụ ya nke ọma, ahụ́ ga na-eto eto, gbasiekwa ike n’ihi na ihe nke ọ bụla dị n’ahụ́ hụrụ ibe ya n’anya.+
17 N’ihi ya, ihe m ji aha Onyenwe anyị na-agwa unu ma na-agba unu ume bụ ka unu kwụsị ịna-eje ije otú ndị mba ọzọ na-eje,+ n’ihi na ha na-ebi ndụ otú echiche ha na-abaghị uru na-agwa ha.+ 18 Uche ha gbara ọchịchịrị, ha enweghịkwa olileanya ịdị ndụ Chineke ga-eme ka anyị dịrị, n’ihi na ha amaghị ihe, ihe anaghịkwa emetụ ha n’obi.* 19 Ebe ọ bụ na mmehie ha anaghịzi ewute ha, ha wepụtara onwe ha na-eme ihe ọjọọ n’asọghị anya,*+ jirikwa anyaukwu na-eme ụdị omume niile na-adịghị ọcha.
20 Ma unu ma na Kraịst adịghị otú ahụ, 21 ebe ọ bụ na unu nụrụ ihe o kwuru, a kụzikwaara unu eziokwu ọ kụziri. 22 A kụziiri unu ka unu yipụ àgwà* ochie unu+ n’ihi na ha rụrụ arụ, ọ bụkwa ọchịchọ unu duhiere unu.+ 23 Unu kwesịkwara ịna-eme ka otú unu si eche echiche dị ọhụrụ,*+ 24 kwesịkwa iyiri àgwà* ọhụrụ+ nke Chineke chọrọ. Àgwà ọhụrụ a pụtara ezi omume na ịkwụsi ike n’ihe ziri ezi.
25 N’ihi ya, ebe unu hapụrụla aghụghọ, ka onye ọ bụla n’ime unu na-agwa onye agbata obi ya eziokwu,+ n’ihi na anyị bụ akụkụ dị iche iche nke otu ahụ́.+ 26 Weenụ iwe, ma unu emehiela.+ Unu anọkwala na-ewe iwe ruo mgbe anyanwụ dara.+ 27 Unu enyekwala Ekwensu ohere.+ 28 Ka onye na-ezu ohi kwụsị izu ohi. Kama, ka ọ na-arụsi ọrụ ike, jiri aka ya na-arụ ọrụ dị mma,+ ka o wee nwee ihe ọ ga-enye onye nọ ná mkpa.+ 29 Ka okwu rere ure ghara isi unu n’ọnụ pụta,+ kama, na-ekwunụ naanị okwu dị mma n’oge dabara adaba, nke ga-abara ndị nụrụ ya uru, meekwa ka okwukwe ha sikwuo ike.+ 30 Unu adịkwala na-eme ihe ga-ewute mmụọ nsọ Chineke.+ Ọ bụ ya ka e ji kaa unu akara+ maka ụbọchị a ga-eji ihe mgbapụta gbapụta unu.+
31 Kwụsịnụ inwe ụdị obi ilu+ ọ bụla, iwe, ọnụma, iti mkpu, ịkparị mmadụ,+ na ihe ọjọọ niile.+ 32 Ma na-enwerenụ ibe unu obiọma, na-enwekwanụ obi ebere.+ Na-agbagharanụ ibe unu kpamkpam dị ka Chineke sikwa n’aka Kraịst gbaghara unu kpamkpam.+
5 N’ihi ya, na-emenụ ka* Chineke,+ maka na unu bụ ụmụ ya ọ hụrụ n’anya. 2 Hụkwanụ ndị ọzọ n’anya mgbe niile,+ otú ahụ Kraịst hụrụ anyị* n’anya+ ma jiri onwe ya chụọrọ Chineke àjà na-esi ísì ọma maka anyị.*+
3 Unu ekwesịghịdị ịna-ekwurịta gbasara ịkwa iko* na ụdị adịghị ọcha niile ma ọ bụ anyaukwu,+ n’ihi na ndị nsọ ekwesịghị ịna-eme otú ahụ.+ 4 Unu emekwala omume na-eme ihere ma ọ bụ kwuo okwu nzuzu ma ọ bụ okwu njakịrị rụrụ arụ,+ n’ihi na ha ekwesịghị ekwesị. Kama ime ihe ndị a, na-ekelenụ Chineke.+ 5 N’ihi na unu ma, ya edookwa unu anya, na o nweghị onye na-akwa iko*+ ma ọ bụ onye na-adịghị ọcha ma ọ bụ onye anyaukwu,+ nke pụtara onye na-ekpere arụsị, ga-eketa Alaeze Kraịst na nke Chineke.+
6 Unu ekwela ka onye ọ bụla jiri okwu na-enweghị isi ghọgbuo unu, n’ihi na ọ bụ ụdị ihe a mere Chineke ga-eji wesa ndị na-enupụrụ ya isi iwe. 7 N’ihi ya, ka a ghara inwe ihe ọ bụla ga-ejikọ unu na ha, 8 n’ihi na unu nọbu n’ọchịchịrị, ma unu nọzi n’ìhè+ maka na unu na Onyenwe anyị dị n’otu.+ Na-akpanụ àgwà ka ụmụ nke ìhè. 9 N’ihi na onye nọ n’ìhè ahụ ga na-adị obiọma n’ihe niile, na-eme ezi omume, na-akpakwa àgwà dị mma.+ 10 Na-achọpụtanụ ihe dị Onyenwe anyị mma.+ 11 Unu esola ha eme ihe ndị na-enweghị isi ha na-eme, nke e ji mara ndị nọ n’ọchịchịrị.+ Kama na-agbanụ ha n’anwụ. 12 N’ihi na ọ na-eme anyị ihere ịkọ ihe ndị ha na-eme na nzuzo. 13 Ìhè na-agba ihe niile n’anwụ. N’ihi ya, ihe niile a gbara n’anwụ apụtala ìhè. 14 Ọ bụ ya mere Akwụkwọ Nsọ ji sị: “Gị onye na-arahụ ụra, teta, sikwa n’ọnwụ bilie,+ Kraịst ga-emekwa ka ị nọrọ n’ìhè.”+
15 N’ihi ya, kpacharanụ nnọọ anya ka unu ghara ịna-akpa àgwà ka ndị na-amaghị ihe, kama na-akpanụ àgwà ka ndị ma ihe. 16 Na-ejinụ oge unu eme ihe kacha mkpa,*+ n’ihi na oge a anyị bi na ya jọrọ njọ. 17 N’ihi ya, kwụsịnụ ịna-ele ihe anya otú na-ekwesịghị ekwesị, kama, gbalịanụ na-aghọta ihe Jehova* chọrọ ka unu na-eme.+ 18 Unu aṅụbigakwala mmanya ókè,+ n’ihi na ọ na-eme ka mmadụ na-ebi ndụ ịla n’iyi, kama jupụtanụ na mmụọ nsọ. 19 Jirinụ abụ ọma na abụ e ji eto Chineke nakwa abụ e ji efe ya na-agba ibe unu ume. Jirinụ obi unu niile na-abụku Jehova* abụ.+ 20 Na-ekelenụ Chineke bụ́ Nna anyị mgbe niile+ maka ihe niile n’aha Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.+
21 Na-edonụ onwe unu n’okpuru ibe unu+ n’ihi ezigbo ùgwù unu na-akwanyere Kraịst. 22 Ka ndị nwunye na-edo onwe ha n’okpuru ndị di ha+ otú ha si edo onwe ha n’okpuru Onyenwe anyị, 23 n’ihi na di bụ onyeisi nwunye ya+ dị ka Kraịst bụkwa onyeisi ọgbakọ ya,+ ya bụ, ahụ́ ya, nke ọ bụkwa onye nzọpụta ya. 24 N’eziokwu, ndị nwunye kwesịrị ịna-edo onwe ha n’okpuru ndị di ha n’ihe niile, otú ahụ ọgbakọ si edo onwe ya n’okpuru Kraịst. 25 Ndị bụ́ di, hụnụ nwunye unu n’anya+ otú ahụ Kraịst hụkwara ọgbakọ ya n’anya ma nwụọ maka ya,+ 26 iji doo ya nsọ, jirikwa mmiri nke okwu Chineke saa ya, ya adị ọcha.+ 27 O mere ihe ndị a ka ọgbakọ maa mma n’anya ya, ghara inwe ntụpọ ma ọ bụ nkwarụ ma ọ bụ ihe ọ bụla yiri ya,+ kama ka ọ dị nsọ, gharakwa inwe ihe ga-emerụ ya.+
28 Ndị bụ́ di kwesịkwara isi otú ahụ hụ nwunye ha n’anya otú ha si hụ ahụ́ nke ha n’anya. Onye hụrụ nwunye ya n’anya hụrụ onwe ya n’anya. 29 N’ihi na ọ dịghị mmadụ ọ bụla kpọtụrụla ahụ́* ya asị, kama ọ na-azụ ahụ́ ya, na-elekọtakwa ya, dị ka Kraịst na-emekwara ọgbakọ ya, 30 n’ihi na anyị bụ ihe ndị dị n’ahụ́ ya.+ 31 “N’ihi ya, nwoke ga-ahapụ nne ya na nna ya ma rapara n’ahụ́ nwunye ya,* ha abụọ ga-abụkwa otu anụ ahụ́.”+ 32 Ihe nzuzo a dị nsọ+ dị ezigbo mkpa. Ana m ekwu gbasara Kraịst na ọgbakọ ya.+ 33 Ma, ka onye ọ bụla n’ime unu hụ nwunye ya n’anya+ otú ọ hụrụ onwe ya. Nwunye kwesịkwara ịna-akwanyere di ya ezigbo ùgwù.+
6 Ụmụ, na-eruberenụ ndị mụrụ unu isi+ otú dị Onyenwe anyị mma, n’ihi na ọ bụ ihe Chineke chọrọ. 2 “Sọpụrụ nne gị na nna gị”+ bụ iwu mbụ e nyere nke ga-eme ka i nweta ngọzi a: 3 “Ka ihe wee gaziere gị, gị adịkwa ogologo ndụ n’ụwa.” 4 Ndị nna, unu akpasula ụmụ unu iwe,+ kama na-azụnụ ha,+ na-agbazikwanụ ha* otú Jehova* chọrọ.+
5 Ndị ohu, na-akwanyerenụ ndị nna unu ukwu ezigbo ùgwù,+ jirikwanụ obi unu niile na-erubere ha isi, dị ka ọ̀ bụ Kraịst ka unu na-erubere isi. 6 Ka ọ ghara ịbụ naanị mgbe ndị ọzọ na-ahụ unu ka unu ga na-erube isi, naanị ka unu mee ndị mmadụ obi ụtọ.+ Kama na-erubenụ isi ka ndị ohu Kraịst, jirikwanụ obi* unu niile na-eme uche Chineke.+ 7 Jirinụ obi unu niile na-ejere ndị nna unu ukwu ozi, dị ka ọ̀ bụ Jehova* ka unu na-ejere ozi,+ ọ bụghị mmadụ. 8 N’ihi na unu ma na Jehova* ga-akwụ ma ohu ma onye nweere onwe ya ụgwọ ihe ọma ọ bụla ha mere.+ 9 Ndị nna ukwu, burukwanụ ihe a n’obi mgbe unu na-emeso ndị ohu unu ihe. Unu emela ka ha na-atụ unu ụjọ, n’ihi na unu ma na Nna Ukwu unu na ha nọ n’eluigwe,+ ọ naghịkwa ele mmadụ anya n’ihu.
10 N’ikpeazụ, ka Onyenwe anyị jiri ike ya dị ukwuu mee ka unu dị ike.+ 11 Yirinụ ekike agha zuru ezu+ nke Chineke nyere unu, ka Ekwensu ghara iji aghụghọ ya mata unu n’ọnyà. 12 N’ihi na ndị anyị na ha na-alụ ọgụ+ abụghị ndị mmadụ, kama ọ bụ anyị na ndị ọchịchị, ndị isi, ndị na-achị ụwa a nọ n’ọchịchịrị, nakwa ìgwè ndị mmụọ ọjọọ+ nọ n’eluigwe. 13 N’ihi ya, chịrịnụ ekike agha zuru ezu nke Chineke nyere unu,+ ka unu nwee ike imeri onye iro n’oge ọ ga-abịa ọgụ, unu akwụrụkwa chịm mgbe unu mechara ihe niile unu kwesịrị ime.
14 N’ihi ya, kwụrụnụ chịm. Werenụ eziokwu kee úkwù unu.+ Yirinụ ezi omume ka ihe e ji echebe obi,+ 15 yirikwanụ akpụkpọ ụkwụ n’ụkwụ unu iji jikere maka izisa ozi ọma nke udo.+ 16 E wezụgakwa ihe a niile, burunụ nnukwu ọta bụ́ okwukwe,+ nke unu ga-eji nwee ike imenyụ akụ́ niile na-ere ọkụ nke ajọ onye ahụ na-agba.+ 17 Kpurunụ okpu agha bụ́ nzọpụta,+ jirikwanụ mma agha nke mmụọ nsọ n’aka unu, ya bụ, okwu Chineke.+ 18 Ka mmụọ nsọ na-edukwa unu+ ka unu na-ekpe ụdị ekpere ọ bụla+ n’oge niile, nakwa ka unu na-esi n’ụzọ dị iche iche arịọsi Chineke arịrịọ ike n’oge niile. N’ihi ya, mụrụnụ anya mgbe niile, na-arịọsikwanụ Chineke arịrịọ ike maka ndị nsọ niile. 19 Na-ekpekwanụ ekpere maka m, ka m nwee ike ịna-ekwu okwu, katakwa obi na-eme ka a mara ihe nzuzo dị nsọ gbasara ozi ọma m na-ezisa.+ 20 Abụ m onye nnọchiteanya Chineke.+ Ana m ezi ozi ọma e ji maka ya kee m agbụ ígwè. Na-ekpenụ ekpere ka m nwee ike ịna-ezi ozi ọma a n’atụghị egwu, otú m kwesịrị ịna-eme.
21 Tikikọs+ ga-eme ka unu mara ihe niile m na-eme na otú m mere. Ọ bụ nwanna anyị hụrụ n’anya na onye ozi e kwesịrị ịtụkwasị obi n’ihe gbasara Onyenwe anyị.+ 22 M na-ezitere ya unu ka ọ gwa unu otú anyị mere, kasiekwa unu obi.
23 Ka Chineke bụ́ Nna nakwa Onyenwe anyị Jizọs Kraịst mee ka udo dịrị ụmụnna anyị, ka ha hụ ndị ọzọ n’anya, nweekwa okwukwe. 24 Ka Chineke meere ndị niile ji obi ha niile hụ Onyenwe anyị Jizọs Kraịst n’anya amara.
Gụọ Nkọwa Okwu, “Oge a.”
Na Grik, “n’okpuru ụkwụ ya.”
Ma ọ bụ “ndị oge a.” Gụọ Nkọwa Okwu, “Oge a.”
Na Grik, “mmụọ.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Gụọ A5.
Na Grik, “onye ezinụlọ niile n’eluigwe na n’ụwa si n’aka ya nweta aha ha.”
Ma ọ bụ “na-azụ.”
Na Grik, “na-ewuli ahụ́ nke Kraịst elu.” Ahụ́ Kraịst a na-ekwu bụ ọgbakọ ya.
Na Grik, “obi ha anaghịkwa arụ ọrụ.”
Ma ọ bụ “ime ihe ọjọọ n’emeghị ihere.” Grik, a·sel′gei·a. Gụọ Nkọwa Okwu.
Na Grik, “mmadụ.”
Ma ọ bụ “ime ka ike nke na-eduzi uche unu dị ọhụrụ.” Na Grik, “ka unu dị ọhụrụ na mmụọ nke uche unu.”
Na Grik, “mmadụ.”
Ma ọ bụ “na-eṅominụ.”
O nwere ike ịbụ, “unu.”
O nwere ike ịbụ, “unu.”
Grik, por·nei′a. Gụọ Nkọwa Okwu.
Gụọ Nkọwa Okwu, “Ịkwa iko.”
Na Grik, “Na-azụtaranụ onwe unu oge.”
Gụọ A5.
Gụọ A5.
Na Grik, “anụ ahụ́.”
Ma ọ bụ “ya na nwunye ya anọrọ.”
Ma ọ bụ “na-akụzikwaranụ ha ihe; na-eduzinụ ha.”
Gụọ A5.
Gụọ Nkọwa Okwu, “mkpụrụ obi.”
Gụọ A5.
Gụọ A5.