AKWỤKWỌ OZI E DEGAARA NDỊ KỌLỌSI
1 Mụnwa bụ́ Pọl, onye ọ bụ uche Chineke ka m bụrụ onyeozi Kraịst Jizọs, na Timoti+ nwanna anyị, 2 na-edetara ọgbakọ dị na Kọlọsi akwụkwọ ozi a. Unu bụ ndị nsọ na ụmụnna a tụkwasịrị obi, ndị ha na Kraịst dị n’otu.
Ka Chineke Nna anyị meere unu amara, meekwa ka udo dịrị unu.
3 Mgbe ọ bụla anyị na-ekpe ekpere maka unu, anyị na-ekele Chineke bụ́ Nna nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst. 4 Ihe mere anyị ji ekele ya bụ na anyị nụrụ na unu kweere na Kraịst Jizọs, hụkwa ndị nsọ niile n’anya, 5 n’ihi na unu nwere olileanya inweta ihe e doweere unu n’eluigwe.+ Unu matara banyere olileanya a mgbe e ziri unu ozi ọma bụ́ eziokwu. 6 Ozi ọma a unu nụrụ na-amị mkpụrụ, na-agbasakwa n’ụwa niile,+ otú ahụ ọ na-amị mkpụrụ n’ime unu malite n’ụbọchị unu nụrụ nke bụ́ eziokwu gbasara amara Chineke, matakwa ya nke ọma. 7 Onye kụziiri unu eziokwu a bụ Epafras,+ ohu ibe anyị anyị hụrụ n’anya, onye ozi Kraịst a tụkwasịrị obi, onye na-anọchitekwa anya anyị. 8 Ọ gwakwara anyị na mmụọ nsọ na-enyere unu aka ịna-ahụ ndị ọzọ n’anya.
9 Ọ bụ ya mere na malite n’ụbọchị anyị nụrụ ya, anyị akwụsịbeghị ikpe ekpere maka unu,+ na-arịọ ka unu mara uche Chineke nke ọma,+ nweekwa amamihe, nakwa ka mmụọ nsọ na-eme ka unu na-aghọta ihe.+ 10 Anyị na-arịọkwa ka unu na-eme ihe otú ndị na-efe Jehova* kwesịrị ịna-eme iji na-eme ya obi ụtọ, ka unu na-eme ihe ọ bụla dị mma ma na-amụtakwu eziokwu gbasara Chineke.+ 11 Ihe ọzọ anyị na-arịọ bụ ka Chineke jiri ike ya dị ebube mee ka unu dị ike,+ ka unu wee na-atachi obi n’ihe niile, jirikwa ọṅụ na-edi ihe niile. 12 Ekpere anyị bụkwa ka unu na-ekele Nna anyị, onye mere ka unu ruo eruo inweta ihe o kwere ndị nsọ nọ n’ìhè ná nkwa.+
13 Ọ kpọpụtara anyị n’ọchịchịrị*+ ma kpọga anyị n’alaeze Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya, 14 onye e si n’aka ya jiri ihe mgbapụta gbapụta anyị, nke pụtara na a gbagharala anyị mmehie anyị.+ 15 Onye a yiri Chineke, onye a na-enweghị ike ịhụ anya.+ Ọ bụkwa onye e bu ụzọ kee n’ime ihe niile e kere eke.+ 16 N’ihi na e si n’aka ya kee ihe ndị ọzọ niile dị ma n’eluigwe ma n’ụwa, ihe ndị e nwere ike ịhụ anya na ihe ndị a na-enweghị ike ịhụ anya,+ ma ọ̀ bụ ocheeze ma ọ bụ ndị isi ma ọ bụ ọchịchị ma ọ bụ ikike. E si n’aka ya kee ihe ndị ọzọ niile,+ e kekwara ha maka ya. 17 O bu ihe ndị ọzọ niile ụzọ malite ịdị.+ E sikwa n’aka ya mee ka ihe ndị ọzọ niile dịrị. 18 Ọ bụkwa onyeisi nke ahụ́ ya, ya bụ, ọgbakọ ya.+ Ọ bụ ya ka e ji malite ihe niile. Ọ bụ onye mbụ e si n’ọnwụ kpọlite.+ N’ihi ya, ọ bụ onye mbụ n’ihe niile. 19 N’ihi na Chineke chọrọ ka Kraịst zuo ezuo n’ihe niile.+ 20 O sikwa n’aka Kraịst mee ka ya na ihe ndị ọzọ niile dị ná mma,+ ma ihe ndị dị n’ụwa ma ihe ndị dị n’eluigwe. Ọ bụkwa ọbara+ Kraịst wụsịrị n’osisi ịta ahụhụ* ka Chineke ji mee ka ya na ihe ndị ọzọ niile dịrị n’udo.
21 N’eziokwu, e nwere oge unu bụ ndị iro Chineke, oge a na-enweghị ihe jikọrọ unu na ya n’ihi na uche unu dị naanị n’ihe ọjọọ. 22 Ma ugbu a, o ji maka ọnwụ onye ahụ ji anụ ahụ́ ya chụọ àjà mee ka unu na ya dị ná mma, ka unu wee dịrị nsọ n’anya ya, bụrụkwa ndị na-enweghị ntụpọ na ndị a na-anaghị ebo ebubo n’ihu ya.+ 23 Ma, unu ekwesịghị ịkwụsị inwe okwukwe na Chineke,+ kama, kwụsienụ ike na ntọala+ okwukwe unu, guzosiekwanụ ike,+ ka a ghara ime ka unu kwụsị inwe olileanya nke ozi ọma unu nụrụ mere ka unu nwee, nke e kwusakwara ebe niile n’ụwa.*+ Mụnwa bụ́ Pọl ghọkwara onyeozi maka izisa ozi ọma a.+
24 Ana m aṅụrị ọṅụ ugbu a n’agbanyeghị na m na-ata ahụhụ maka unu.+ Echere m na m ga na-ata ya na-aga ebe m so n’ahụ́ Kraịst. Ahụhụ a m na-ata bụkwa maka ọdịmma nke ahụ́ Kraịst,+ ya bụ, ọgbakọ ya.+ 25 M na-ejere ndị Chineke ozi n’ihi na ọ họpụtara m maka ozi a.+ Ọ bụkwa maka ọdịmma unu. Ọ bụ ya mere m ji na-eji ike m niile ekwusa okwu Chineke. 26 Ozi a m na-ezisa bụ ihe nzuzo dị nsọ+ e zoro kemgbe ụwa,*+ e meghịkwa ka ọgbọ ndị gara aga mara gbasara ya. Ma ugbu a, e meela ka ndị nsọ mara ya.+ 27 Ọ masịrị Chineke ime ka ndị mba ọzọ bụ́ ndị nsọ mara ihe nzuzo a dị nsọ,+ nke bụ́ akụ̀ dị ebube. Unu nwere olileanya ịdị ebube ka Kraịst+ n’ihi na unu na ya dị n’otu. 28 Anyị na-ekwusa gbasara Kraịst, na-adụ mmadụ niile ọdụ, jirikwa amamihe niile na-akụziri mmadụ niile ihe, ka anyị wee mee ka mmadụ niile, ndị ha na Kraịst dị n’otu, bụrụ ndị tozuru okè n’anya Chineke.+ 29 Ọ bụ ya mere m ji na-arụsi ọrụ ike, jiri ike Chineke nyere m+ na-agbasi mbọ ike.
2 Achọrọ m ka unu mata otú m si na-agbasi mbọ ike maka ọdịmma unu nakwa maka ọdịmma ndị bi na Leodisia+ na ndị niile na-ahụtụbeghị m.* 2 M na-agba mbọ a iji kasie unu niile obi,+ ka unu dịrị n’otu, hụkwa ibe unu n’anya,+ si otú ahụ nweta ezigbo akụ̀. Akụ̀ a bụ na unu ga-amata nnọọ ihe nzuzo dị nsọ gbasara Chineke, ghọtakwa ya nke ọma. Ihe nzuzo a bụ Kraịst.+ 3 Ọ bụ n’ime ya ka e zoro amamihe na ihe niile bara ezigbo uru a na-amụta amụta.+ 4 Ana m ekwu ihe a ka onye ọ bụla ghara iji ire ụtọ duhie unu. 5 Ọ bụ eziokwu na mụ na unu anọghị, obi m dị ebe unu nọ.* M na-aṅụrịkwa ọṅụ ka m na-ahụ otú unu si na-eme ihe n’usoro,+ nakwa otú okwukwe unu nwere na Kraịst si sie ike.+
6 N’ihi ya, ebe ọ bụ na unu na-eso ụzọ Onyenwe anyị Kraịst Jizọs, na-eruberenụ ya isi. 7 Na-emenụ ka okwukwe unu nwere na ya sie ike+ ka osisi gbanyesiri mgbọrọgwụ ike+ n’ala. Na-agbarịtanụ ibe unu ume otú ọ chọrọ. Kwụrụnụ chịm, na-ekelekwanụ Chineke mgbe niile.+ Ihe ndị a ka a kụziiri unu.
8 Na-echenụ nche ka a ghara inwe onye ga-eji amamihe ụwa na ihe ndị na-abụghị eziokwu mata unu n’ọnyà.*+ Ihe ndị a esighị na Kraịst, kama ha si n’ọdịnala ndị mmadụ nakwa n’otú ụwa si ele ihe anya.* 9 Ma, Kraịst nwere àgwà niile Chineke nwere.+ 10 Ọ bụ yanwa mere na o nweghị ihe kọrọ unu. Ọ bụkwa onyeisi ọchịchị niile na ikike niile.+ 11 E biri unu úgwù n’ihi na unu kweere na Kraịst. Ma, e bighị unu úgwù a otú ndị mmadụ si ebi úgwù, kama unu jụrụ ime ihe anụ ahụ́ unu chọrọ.+ Ọ bụkwa otú a ka e si ebi ndị na-eso ụzọ Kraịst úgwù.+ 12 E likọrọ unu na ya n’ihi na unu mere ụdị baptizim o mere.+ A kpọlitekwara unu na ya n’ọnwụ+ n’ihi na unu na ya dị ná mma, unu nwekwara okwukwe n’ihe niile e ji ike Chineke rụọ. Ọ bụ Chineke kpọlitere ya n’ọnwụ.+
13 Ọ bụkwa eziokwu na unu nwụrụ anwụ n’ihi mmehie unu na-eme, nakwa n’ihi úgwù a na-ebighị unu n’anụ ahụ́, Chineke mere ka unu na Kraịst dịrị ndụ.+ Ọ gbaghaara anyị mmehie anyị niile,+ 14 hichapụkwa iwu ahụ+ e ji aka dee,+ nke na-emegide anyị.+ Ọ bụ ọnwụ Kraịst nwụrụ n’osisi ịta ahụhụ* ka Chineke ji hichapụ iwu ahụ.+ 15 O ji osisi ịta ahụhụ* a gbaa ọchịchị na ikike dị iche iche ọtọ, gosi n’ihu ọha na o meriri ha emeri,+ na-edukwa ha agagharị iji gosi na o meriela ha.
16 N’ihi ya, unu ekwela ka onye ọ bụla kpee unu ikpe maka ihe unu na-eri na ihe unu na-aṅụ+ ma ọ bụ maka ememme ma ọ bụ ememme ọnwa ọhụrụ+ ma ọ bụkwanụ ụbọchị izu ike.+ 17 Ihe ndị ahụ nọchiri anya ihe ndị gaje ịbịa,+ ma onye ihe ndị ahụ ga-emezu n’isi ya bụ Kraịst.+ 18 Ụfọdụ ndị na-eme ka hà dị umeala n’obi, na-efekwa ndị mmụọ ozi. Ma unu ekwela ka ha mee ka unu ghara inweta ụgwọ ọrụ+ a ga-akwụ unu. Naanị ihe ha na-ejidesi aka ike bụ ihe ha ji anya ha hụ. Ha na-ejikwa ihe na-enweghị ihe ọ bụ anya isi n’ihi na uche ha niile dị n’ihe gbasara anụ ahụ́. 19 Ha anaghịkwa ejidesi onye bụ́ isi aka ike,+ onye na-enye ahụ́ niile ihe niile na-akpa ya, na-ejikọkwa ihe niile dị n’ahụ́, onye Chineke na-esikwa n’aka ya eme ka ahụ́ niile na-eto eto.+
20 Unu na Kraịst nwụrụ n’ihi na unu anaghị ele ihe anya otú ụwa si ele ihe anya.+ Gịnịzi mere unu ji na-ebi ndụ ka à ga-asị na unu ka bụ nke ụwa? Gịnịkwa mere unu ji na-erube isi n’iwu ndị a:+ 21 “Ewela ihe a, edetụla ihe a ire, ebitụla ihe a aka”? 22 Iwu ndị a bụ gbasara ihe ndị na-ala n’iyi ma e rie ha ma ọ bụ ma a ṅụọ ha. Ha bụ iwu ndị mmadụ na-enye na ihe ha na-akụzi.+ 23 Iwu ndị a yiri ihe na-eme ka mmadụ mara ihe, ma ha anaghị eme ka mmadụ ghara ịna-eme ihe na-agụ ya agụụ. Ndị mmadụ na-edebekwa iwu ndị a n’ihi na ha chọrọ iji aka ha na-ekpebi otú ha ga na-esi efe Chineke. Ha na-ata onwe ha ahụhụ+ n’ihi na ha chọrọ ka ndị mmadụ chee na ha dị umeala n’obi.
3 Ma, ọ bụrụ na Chineke kpọlitere unu na Kraịst n’ọnwụ,+ na-achọnụ ihe ndị dị n’eluigwe, ebe Kraịst nọ ọdụ n’aka nri Chineke.+ 2 Na-echenụ gbasara ihe ndị dị n’eluigwe,+ ọ bụghị ihe ndị dị n’ụwa.+ 3 Unu anwụọla, ma, ndụ unu dị Kraịst n’aka n’ihi na ọ bụ ihe Chineke chọrọ. 4 Mgbe Kraịst, bụ́ ndụ anyị,+ mere ka a hụ ebube ya,* a ga-emekwa ka a hụ ebube unu na ya.+
5 N’ihi ya, meenụ ka ahụ́ unu nwụọ+ n’ihe gbasara ịkwa iko,* adịghị ọcha, ejideghị onwe unu ma agụụ mmekọahụ gụwa unu,+ ihe ọjọọ ịgụ unu agụụ, na anyaukwu, nke bụ́ ikpere arụsị. 6 Chineke ga-ewesa ndị na-eme ihe ndị a iwe. 7 Unu na-emebu ihe ndị a mgbe unu na-agbanwebeghị.+ 8 Ma, ugbu a, unu kwesịrị ịkwụsị ihe ndị a: ọnụma, iwe, ihe ọjọọ,+ ịkparị mmadụ,+ na ikwu okwu rụrụ arụ.+ 9 Unu agharala ibe unu ụgha.+ Yipụnụ àgwà ochie unu na-akpabu,*+ 10 ma yirinụ àgwà* ọhụrụ,+ nke Chineke na-eme ka anyị na-akpa ma anyị mata ya nke ọma. Ọ bụ ya ga-eme ka àgwà anyị na-agbanwe, na-adị ka nke Chineke.+ 11 Ihe a gbasara ma onye Grik ma onye Juu, ma onye e biri úgwù ma onye a na-ebighị úgwù, ma onye mba ọzọ ma onye Sitia,* ma ohu ma onye nweere onwe ya. Ma, Kraịst bụ ihe niile, anyị na ya dịkwa n’otu.+
12 Ebe ọ bụ na Chineke họọrọ unu,+ unu abụrụkwa ndị dị nsọ na ndị ọ hụrụ n’anya, yirinụ àgwà ndị a ka uwe: obi ebere,+ obiọma, obi umeala,+ ịdị nwayọọ,+ na ndidi.+ 13 Na-edirinụ ibe unu ihe, na-agbagharakwanụ ibe unu kpamkpam+ ma e nwee onye ibe ya mejọrọ.+ Jehova* gbaghaara unu kpamkpam, unu kwesịkwara ịna-emere ibe unu otú ahụ.+ 14 E wezụga ihe ndị a niile, yirinụ ịhụnanya ka uwe,+ n’ihi na ịhụnanya na-eme ka mmadụ niile dịrị n’otu.+
15 Kwenụ ka udo nke Kraịst na-achị obi unu,+ n’ihi na Chineke kpọrọ unu ka unu bụrụ otu ahụ́, nọrọkwa n’udo. Gosikwanụ na obi dị unu ụtọ maka ihe e meere unu. 16 Kwenụ ka ihe Kraịst na-akụzi ju eju n’obi unu. Ọ ga-eme ka unu mara ihe. Jirinụ abụ ọma+ na abụ e ji eto Chineke, na nke e ji ekele ya, na-akụziri ibe unu ihe. Jirikwanụ ha na-agba ibe unu ume.* Jirinụ obi unu niile na-abụrụ Jehova* abụ.+ 17 Ihe ọ bụla unu na-eme, ma n’okwu ọnụ ma n’omume, na-emenụ ya n’aha Onyenwe anyị Jizọs. Sikwanụ n’aha ya na-ekele Chineke bụ́ Nna.+
18 Ndị nwunye, na-edonụ onwe unu n’okpuru di unu.+ Ọ bụ ihe Onyenwe anyị chọrọ. 19 Ndị bụ́ di, hụnụ nwunye unu n’anya mgbe niile.+ Unu ewesala ha iwe.*+ 20 Ụmụ, na-eruberenụ ndị mụrụ unu isi n’ihe niile,+ n’ihi na ọ na-amasị Onyenwe anyị. 21 Ndị nna, unu akpasula ụmụ unu iwe,+ ka ha ghara ịda mbà n’obi. 22 Ndị ohu, na-eruberenụ ndị nna unu ukwu* isi+ n’ihe niile. Unu erubela isi naanị ka ndị ọzọ hụ unu, ka obi dị ndị mmadụ ụtọ, kama jirinụ obi unu niile na-erubere ha isi iji gosi na unu na-akwanyere Jehova* ùgwù. 23 Jirinụ obi* unu niile na ike unu niile na-eme ihe ọ bụla unu na-eme, dị ka ùnu na-emere ya Jehova,*+ ọ bụghị mmadụ. 24 N’ihi na unu ma na ọ bụ Jehova* ga-akwụ unu ụgwọ ọrụ o kwere unu ná nkwa.+ Bụrụnụ ndị ohu Kraịst, bụ́ Nna unu ukwu. 25 N’eziokwu, a ga-akwụ onye na-eme ihe ọjọọ ụgwọ ihe ọjọọ ọ na-eme,+ n’ihi na Chineke anaghị ele mmadụ anya n’ihu.+
4 Ndị nna ukwu, na-emesonụ ndị ohu unu otú ziri ezi na otú dị mma, ebe unu ma na unu nwekwara Nna Ukwu n’eluigwe.+
2 Na-ekpenụ ekpere mgbe niile.+ Unu echefukwala ịna-ekpe ya. Na-ekelekwanụ Chineke.+ 3 Na-ekpekwanụ ekpere maka anyị+ ka Chineke megheere anyị ụzọ ka anyị na-ekwusa okwu ya na ihe nzuzo dị nsọ gbasara Kraịst, nke mere e ji tụọ m mkpọrọ.+ 4 Na-ekpekwanụ ekpere ka m na-ekwusa ya otú ndị mmadụ ga na-aghọta ya, dị ka m kwesịrị isi na-ekwusa ya.
5 Mgbe unu na ndị na-abụghị ụmụnna nọ, na-akpanụ àgwà otú na-egosi na unu ma ihe. Na-ejinụ oge unu eme ihe kacha mkpa.*+ 6 Ka okwu unu na-atọ ụtọ mgbe niile ka ihe e tinyere nnu.+ Ọ ga-eme ka unu mara otú unu ga-esi azaghachi onye ọ bụla.+
7 Tikikọs+ ga-agwa unu ihe niile gbasara m. Ọ bụ nwanna m m hụrụ n’anya na onye ozi a tụkwasịrị obi na ohu ibe m n’ihe gbasara Onyenwe anyị. 8 M na-ezitere ya unu ka ọ gwa unu otú anyị mere, kasiekwa unu obi. 9 M na-ezite ya na Onesịmọs+ nwanna m, onye a tụkwasịrị obi, onye m hụrụ n’anya, onye obodo unu. Ha ga-agwa unu ihe niile na-eme ebe a.
10 Arịstakọs,+ onye mkpọrọ ibe m, na-ekele unu. Mak,+ onye ikwu* Banabas, na-ekelekwa unu. (Mak a bụ onye m gwara unu ka unu nabata+ ma ọ bịa ịhụ unu.) 11 Jizọs, onye a na-akpọ Jọstọs, na-ekelekwa unu. Ndị a niile bụ ndị Juu.* Naanị ndị a bụ ndị ọrụ ibe m maka Alaeze Chineke. Ha na-akasikwa m nnọọ obi.* 12 Epafras,+ onye unu na ya nọbu, ohu Kraịst Jizọs, na-ekele unu. Ọ na-ekpesi ekpere ike mgbe niile maka unu, ka unu wee kwụrụ chịm n’ikpeazụ ka ndị tozuru etozu, na-ekwenyesikwa ike n’ihe niile gbasara uche Chineke. 13 M na-agba akaebe na ọ na-agba ezigbo mbọ maka unu nakwa maka ndị nọ na Leodisia na ndị nọ na Haịrapọlis.
14 Luk,+ onye anyị hụrụ n’anya, onye na-agwọ ọrịa, na-ekele unu. Dimas+ na-ekelekwa unu. 15 Keleerenụ m ụmụnna ndị nọ na Leodisia. Keleekwaranụ m Nimfa na ọgbakọ na-ezukọ n’ụlọ ya.+ 16 Unu gụchaa akwụkwọ ozi a, zigaranụ ya ọgbakọ ndị Leodisia ka ha gụọ.+ Gwakwanụ ha ka ha zitere unu nke m zigaara ha ka ununwa gụọ. 17 Gwakwanụ Akịpọs,+ sị: “Na-agba mbọ ka ị rụchaa ọrụ Onyenwe anyị gwara gị rụọ.”
18 Mụnwa bụ́ Pọl na-ekele unu. Ọ bụ m ji aka m na-ede+ ekele a. Burunụ mkpọrọ a tụrụ m+ n’uche. Ka Chineke meere unu amara.
Gụọ A5.
Na Grik, “Ọ napụtara anyị n’ikike nke ọchịchịrị.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Na Grik, “nke e kwusakwaara ihe niile e kere eke dị n’okpuru eluigwe.”
Gụọ Nkọwa Okwu, “Oge a.”
Ma ọ bụ “ndị niile na-ahụtụbeghị ihu m.”
Na Grik, “m nọnyeere unu n’ime mmụọ.”
Ma ọ bụ “buru unu ka anụ oriri.”
Na Grik, “n’ihe ndị mbụ nke ụwa.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
O nwere ike ịbụ, “O ji Kraịst.”
Na Grik, “Mgbe a ga-eme ka Kraịst, bụ́ ndụ anyị, pụta ìhè.”
Grik, por·nei′a. Gụọ Nkọwa Okwu.
Na Grik, “mmadụ ochie na omume ya.”
Na Grik, “mmadụ.”
“Onye Sitia” pụtara onye ime ọhịa.
Gụọ A5.
Ma ọ bụ “na-adụ ibe unu ọdụ.”
Gụọ A5.
Ma ọ bụ “Unu emesila ha ike.”
Ndị nna ukwu a na-ekwu okwu ha ebe a bụ ndị mmadụ.
Gụọ A5.
Gụọ Nkọwa Okwu, “mkpụrụ obi.”
Gụọ A5.
Gụọ A5.
Na Grik, “Na-azụtaranụ onwe unu oge.”
Ihe okwu Grik a sụgharịrị “onye ikwu” pụtara bụ “nwa nwanne nne” ma ọ bụ “nwa nwanne nna” mmadụ.
Na Grik, “ndị e biri úgwù.”
Ma ọ bụ “Ha na-agba m nnọọ ume.”