Jeremaya
51 Nke a bụ ihe Jehova kwuru: “Lee, m ga-akpali ifufe na-emebi ihe ka o fekwasị Babịlọn+ na ndị bi na Leb-kemaị;+ 2 M ga-eziga ndị na-afụcha ihe na Babịlọn, ha ga-afụcha ya ma mee ka ala ya tọgbọrọ n’efu;+ n’ihi na ha ga-esi n’akụkụ niile megide ya n’ụbọchị ọdachi.+
3 “Ka onye na-ekwe ụta hapụ ikwe ya.+ Ka onye yi uwe agha ghara ibili ọtọ.
“Unu enwekwarala ụmụ okorobịa ya ọmịiko.+ Bibienụ ndị agha ya niile.+ 4 A ga-egbu ha n’ala ndị Kaldia,+ a ga-emerụkwa ha ahụ́ nke ukwuu n’okporo ámá ya dị iche iche.+
5 “N’ihi na Izrel na Juda+ abụghị nwaanyị nke di ya, bụ́ Chineke ha, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha, nwụrụ anwụ.+ N’ihi na ala ndị Kaldia jupụtara n’ikpe ọmụma n’anya Onye Nsọ Izrel.+
6 “Sinụ n’ime Babịlọn gbapụ,+ onye ọ bụla n’ime unu meere mkpụrụ obi ya ụzọ mgbapụ.+ Ka njehie ya ghara igbu unu.+ N’ihi na ọ bụ oge ịbọ ọbọ Jehova.+ Ọ ga-akwụ ya ụgwọ dị ka ọrụ ya si dị.+ 7 Babịlọn bụ iko ọlaedo Jehova bu n’aka,+ nke na-eme ka mmanya gbuwe mba dị iche iche.+ Mba dị iche iche aṅụwo mmanya dị n’ime ya.+ Ọ bụ ya mere mba dị iche iche ji na-eme ara ara.+ 8 Na mberede, Babịlọn adawo, o wee kụrie.+ Kwasierenụ ya ákwá ike.+ Werenụ mmanụ bọlsọm a ga-ete ya maka ihe mgbu ya.+ Ikekwe, a ga-agwọta ya.”
9 “Anyị gaara agwọta Babịlọn, ma o kweghị ngwọta. Hapụnụ ya,+ ka anyị lawa, onye ọ bụla n’ala ya.+ N’ihi na ikpe ya eruwo eluigwe, e mewo ka o ruo n’ígwé ojii.+ 10 Jehova arụworo anyị ọrụ ezi omume.+ Bịanụ ka anyị gaa na Zayọn kọọ ọrụ Jehova bụ́ Chineke anyị.”+
11 Pịanụ akụ́ unu.+ Burunụ ọta okirikiri unu. Jehova akpaliwo mmụọ nke ndị eze ndị Midia,+ n’ihi na o bu n’obi imegide Babịlọn,+ iji laa ya n’iyi. N’ihi na ọ bụ ịbọ ọbọ Jehova, bụ́ ọbọ ọ ga-abọ n’ihi ụlọ nsọ ya.+ 12 Gwunyenụ ihe mgbaàmà megide mgbidi Babịlọn.+ Chesienụ nche ike.+ Debenụ ndị nche. Meenụ ka e nwee ndị gara zoo.+ N’ihi na Jehova echepụtawo ya, ọ ga-emekwa ihe o kwuru ọ ga-eme ndị bi na Babịlọn.”+
13 “Gị nwaanyị nke bi n’ọtụtụ mmiri,+ nke nwekwara akụ̀ dị ukwuu,+ ọgwụgwụ gị abịawo, uru+ ị na-enweta akwụsịla.+ 14 Jehova nke ụsụụ ndị agha ejiriwo mkpụrụ obi ya ṅụọ iyi,+ sị, ‘M ga-eme ka ndị mmadụ jupụta n’ime gị, dị ka igurube,+ ha ga-abụ abụ n’oké olu n’ihi gị.’+ 15 Ọ bụ ya bụ Onye ji ike ya kee ụwa,+ Onye ji amamihe ya+ mee ka elu ala guzosie ike,+ Onye jikwa nghọta ya+ setịa eluigwe.+ 16 Olu ya na-eme ka mmiri dị n’eluigwe mee mkpatụ, ya onwe ya na-emekwa ka alụlụụ si na nsọtụ ụwa kwụgoo.+ O meworo mmiri ozuzo oghere,+ ọ na-esikwa n’ụlọ nkwakọba ihe ya eme ka ifufe pụta. 17 Mmadụ niile emewo ihe n’echeghị echiche nke na amaghị ihe ha apụtawo ìhè.+ Ihere ihe oyiyi a pịrị apị ga-eme onye ọ bụla nke na-eji ígwè akpụ ihe;+ n’ihi na ihe oyiyi ya a wụrụ awụ bụ ihe ụgha,+ mmụọ adịghịkwa n’ime ya.+ 18 Ha bụ ihe efu,+ ihe ịkwa emo.+ N’oge a ga-elebara ha anya, ha ga-ala n’iyi.+
19 “Òkè Jekọb adịghị ka ihe ndị a,+ n’ihi na ọ bụ ya bụ Onye kpụrụ ihe niile,+ bụrụkwa mkpara nke ihe nketa ya.+ Jehova nke ụsụụ ndị agha bụ aha ya.”+
20 “Ị bụụrụ m okpiri, bụ́ ngwá ọgụ m,+ m ga-eji gị kụrie mba dị iche iche, m ga-ejikwa gị laa alaeze dị iche iche n’iyi. 21 M ga-eji gị kụrie ịnyịnya na onye na-agba ya, m ga-ejikwa gị kụrie ụgbọ ịnyịnya agha na onye na-agba ya.+ 22 M ga-eji gị kụrie nwoke na nwaanyị, m ga-ejikwa gị kụrie agadi nwoke na nwatakịrị nwoke, m ga-ejikwa gị kụrie nwa okorobịa na nwa agbọghọ na-amaghị nwoke. 23 M ga-eji gị kụrie onye na-azụ atụrụ na ìgwè atụrụ ya, m ga-eji gị kụrie onye ọrụ ubi na anụ abụọ o ji akọ ihe, m ga-eji gị kụrie ndị gọvanọ na ndị osote onye na-achị achị. 24 M ga-akwụ Babịlọn na ndị niile bi na Kaldia ụgwọ ihe ọjọọ niile ha mere na Zayọn, n’ihu unu,”+ ka Jehova kwuru.
25 “Lee, m na-emegide gị,+ gị ugwu na-ebibi ihe,+ nke bibiri ụwa dum,”+ ka Jehova kwuru; “m ga-esetị aka m megide gị, m ga-esi n’elu nkume dị elu kwapụ gị ma mee ka ị bụrụ ugwu a gbara ọkụ.”+
26 “Ndị mmadụ agaghị esi na gị weta nkume a ga-eji wuo nkuku ụlọ ma ọ bụ nkume a ga-eji tọọ ntọala,+ n’ihi na ị ga-aghọ ebe tọgbọrọ n’efu ruo mgbe ebighị ebi,”+ ka Jehova kwuru.
27 “Gwunyenụ ihe mgbaàmà n’ala ahụ.+ Fụọnụ opi n’etiti mba dị iche iche. Kwadebenụ mba dị iche iche ka ha buso ya agha.*+ Kpọkọtanụ alaeze Ararat,+ alaeze Minaị na nke Ashkenaz+ ka ha buso ya agha. Họpụtanụ onye ga-ewe ndị agha n’ọrụ ka ha buso ya agha. Mee ka ịnyịnya+ bịa dị ka ụmụ igurube na-ama ogwu. 28 Kwadebe mba dị iche iche, tinyere ndị eze Midia,+ ndị gọvanọ ya, na ndị ya niile na-esote onye na-achị achị na ala dum onye nke ọ bụla na-achị, ka ha buso ya agha. 29 Ka ụwa maa jijiji, nọrọkwa n’oké ihe mgbu,+ n’ihi na Jehova echewo echiche ime Babịlọn ihe, ime ka ala Babịlọn bụrụ ihe ijuanya, n’enweghị onye ga-ebi n’ime ya.+
30 “Ndị dike nke Babịlọn akwụsịwo ịlụ agha. Ha nọ ọdụ n’ebe e wusiri ike. Ike agwụla ha.+ Ha aghọọla ndị inyom.+ A gbawo ebe obibi ya niile ọkụ. A gbajisịwo ihe e ji atụchi ya.+
31 “Onye ọsọ na-agbakwuru onye ọsọ ibe ya, onye ozi na-agbakwurukwa onye ozi ibe ya,+ ka ha kọọrọ eze Babịlọn na e wegharawo akụkụ niile nke obodo ya,+ 32 na e wegharawokwa ebe ndị a na-eji ụkwụ agafe mmiri ya,+ gbaakwa ụgbọ mmiri ya niile e ji ahịhịa papaịrọs rụọ ọkụ, nakwa na ụjọ ejidewo ndị agha ya.”+
33 N’ihi na nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru: “Ada bụ́ Babịlọn dị ka ebe nzọcha mkpụrụ.+ Oge eruwo ka a zọsie ya ụkwụ ike. Ma, ọ fọrọ ntakịrị ka oge a ga-ewe ya dị ka ihe ubi ruo.”+
34 “Nebukadreza eze Babịlọn eriela m;+ o tinyewo m n’ọgba aghara. O mewo ka m dịrị ka okpokoro ite. O lowo m dị ka nnukwu agwọ;+ o riwo ihe ọma m rijuo afọ. Ọ ṅachapụwo m. 35 ‘Ka ihe ike e mere m, meekwa ahụ́ m, dịrị n’isi Babịlọn!’ ka nwaanyị bi na Zayọn ga-ekwu.+ ‘Ka ọbara m dịrị n’isi ndị bi na Kaldia!’ ka Jeruselem ga-ekwu.”+
36 Ya mere, nke a bụ ihe Jehova kwuru: “Lee, m ga-ekpechite ọnụ gị,+ m ga-abọkwara gị ọbọ.+ M ga-eme ka oké osimiri ya taa, m ga-emekwa ka olulu mmiri ya taa.+ 37 Babịlọn ga-aghọ ikpo nkume,+ ọgba nkịta ọhịa,+ ihe ijuanya na ihe a na-afụrụ mkpọrọhịhị, n’enweghị onye bi ya.+ 38 Ha niile ga-ebigbọ dị ka ụmụ ọdụm tojuru etoju. Ha ga-abakwa mba dị ka ụmụ ọdụm.”
39 “Mgbe ahụ́ kpooro ha ọkụ, m ga-emere ha oriri, m ga-emekwa ka mmanya gbuwe ha, ka ha wee nwee aṅụrị;+ ha ga-arahụ ụra nke ha na-agaghị eteta eteta ruo mgbe a na-akaghị aka,”+ ka Jehova kwuru. 40 “M ga-akpụrụ ha dị ka ebule, dị ka ebule na mkpi, gaa n’ebe a ga-egbu ha.”+
41 “Lee nnọọ ka e si weghara Shishak,+ leekwa ka e si weghara Otuto ụwa dum!+ Lee ka Babịlọn si ghọọ naanị ihe ijuanya n’etiti mba niile!+ 42 Oké osimiri erikpuwo Babịlọn. Ebili mmiri ya ekpuchiwo ya.+ 43 Obodo ya dị iche iche aghọwo ihe ijuanya, ala mmiri na-adịghị na mbara ọzara.+ Obodo ya niile aghọwo ala mmadụ na-agaghị ebi, ọ dịghịkwa nwa nke mmadụ ga-agafe na ha.+ 44 M ga-elebara Bel+ nke dị na Babịlọn anya, m ga-esi n’ọnụ ya wepụta ihe o loro.+ Mba dị iche iche agaghị enuba n’ime ya ọzọ.+ Mgbidi Babịlọn ga-adakwa.+
45 “Ndị m, sinụ n’ime ya pụta,+ ka onye ọ bụla n’ime unu meere mkpụrụ obi ya ụzọ ọ ga-esi gbanahụ+ iwe dị ọkụ nke Jehova.+ 46 Ma ọ́ bụghị otú ahụ, obi ga-alọ unu mmiri,+ egwu ga-atụkwa unu n’ihi akụkọ unu ga-anụ n’ala a. Unu ga-anụ akụkọ ahụ n’otu afọ, ya gasịa, n’afọ ọzọ ya, unu ga-anụ akụkọ ahụ, nụkwa banyere ime ihe ike n’ụwa nakwa banyere onye na-achị achị nke na-emegide onye na-achị achị. 47 Ya mere, lee! oge na-abịa mgbe m ga-elebara ihe oyiyi a pịrị apị nke Babịlọn anya;+ ihere ga-eme ala ya dum, ndị ya niile e gburu egbu ga-ada n’ime ya.+
48 “Eluigwe na ụwa na ndị niile nọ n’ime ha ga-eti mkpu ọṅụ n’ihi Babịlọn,+ n’ihi na ndị na-ebukọrọ ihe mmadụ ga-esi n’ebe ugwu bịa na ya,”+ ka Jehova kwuru. 49 “Ọ bụghị naanị na ọ bụ Babịlọn mere ka e gbuo ndị Izrel,+ kamakwa, ọ bụ na Babịlọn ka e gburu ndị niile nke ụwa.+
50 “Unu ndị gbanahụrụ mma agha, na-aganụ. Unu eguzola otu ebe.+ Nọrọnụ n’ebe dị anya cheta Jehova,+ ka Jeruselem batakwa unu n’obi.”+
51 “E menyewo anyị ihere,+ n’ihi na anyị anụwo nkọcha.+ E mechuwo anyị ihu,+ n’ihi na ndị ala ọzọ awakpowo ebe nsọ ndị dị n’ụlọ Jehova.”+
52 “Ya mere, lee! oge na-abịa,” ka Jehova kwuru, “mgbe m ga-elebara ihe oyiyi ya a pịrị apị anya.+ Onye a mara ube ga-asụkwa ude n’ala ya dum.”+
53 “Ọ bụrụgodị na Babịlọn arịgoo n’eluigwe,+ ọ bụrụgodị na o mee ka ebe dị elu o ji mere ike ya bụrụ ebe a na-apụghị ịbanye abanye,+ ndị na-ebukọrọ ihe mmadụ ga-esi n’ebe m nọ bịakwute ya,”+ ka Jehova kwuru.
54 “Geenụ ntị! Mkpu ákwá na-ada na Babịlọn,+ a na-anụ ụzụ oké mbibi n’ala ndị Kaldia,+ 55 n’ihi na Jehova na-ebibi Babịlọn, ọ ga-ebibikwa oké olu ya,+ ụzụ ha ga-eme mkpọtụ dị ka ọtụtụ mmiri.+ Mkpọtụ nke olu ha na-eme ga na-ala elu. 56 N’ihi na onye na-ebukọrọ ihe mmadụ ga-abịakwasị Babịlọn,+ a ga-ejidekwa ndị dike ya.+ A ga-agbajisị ụta ha,+ n’ihi na Jehova bụ Chineke nke na-akwụ ụgwọ.+ Ọ ghaghị ịkwụ ya ụgwọ.+ 57 M ga-eme ka mmanya gbuwe ndị isi ya na ndị ya maara ihe, ndị gọvanọ ya na ndị ya na-esote onye na-achị achị na ndị dike ya,+ ha ga-arahụ ụra ruo mgbe a na-akaghị aka, bụ́ ụra nke ha na-agaghị eteta eteta,”+ ka Eze,+ onye aha ya bụ Jehova nke ụsụụ ndị agha,+ kwuru.
58 Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru: “A ghaghị ịkwada mgbidi Babịlọn, ọ bụ ezie na ọ sara mbara;+ a ga-agba ọnụ ụzọ ámá ya ọkụ, ọ bụ ezie na ọ dị elu.+ Ndị dị iche iche ga-adọgbu onwe ha n’ọrụ n’efu,+ ọkụ ga-agbakwa ihe mba dị iche iche dọgburu onwe ha n’ọrụ nweta;+ ha ga-arụtara onwe ha ike ọgwụgwụ.”
59 Nke a bụ ihe Jeremaya onye amụma nyere Seraya nwa Neraya+ nwa Masaya+ n’iwu mgbe o sooro Zedekaya bụ́ eze Juda gaa Babịlọn n’afọ nke anọ nke ọbụbụeze ya; Seraya bụ onye na-elekọta ụlọ eze. 60 Jeremaya wee dee ọdachi dum ga-adakwasị Babịlọn n’otu akwụkwọ,+ bụ́ ihe niile a e dere ga-adakwasị Babịlọn. 61 Jeremaya sịkwara Seraya: “Ozugbo ị garuru Babịlọn ma hụ obodo ahụ, gụpụta okwu a niile n’olu dara ụda.+ 62 Kwuo, sị, ‘Jehova, gị onwe gị ekwuwo okwu megide ebe a, iji bibie ya ka a ghara inwe onye ga-ebi n’ime ya,+ ma mmadụ ma anụ ụlọ, kama ka ọ ghọọ naanị ebe tọgbọrọ n’efu ruo mgbe ebighị ebi.’ 63 Ọ ga-erukwa na mgbe ị gụsịrị akwụkwọ a, kegide ya nkume, tụba ya n’ime Yufretis.+ 64 Kwuokwa, sị, ‘Ọ bụ otú a ka Babịlọn ga-esi mikpuo, ọ gaghịkwa apụta ọzọ n’ihi ọdachi m ga-eme ka ọ dakwasị ya;+ ha ga-arụtara onwe ha ike ọgwụgwụ.’”+
N’ebe a ka okwu Jeremaya jedebere.