OZI ỌMA MAK DERE
1 Ihe a bụ otú ozi ọma banyere Jizọs Kraịst, Ọkpara Chineke, si malite: 2 E dere n’akwụkwọ Aịzaya onye amụma, sị: “(Lee, m na-ezipụ onye ozi m ga-ebu gị ụzọ bịa,* ọ ga-edozikwa ụzọ gị.)*+ 3 E nwere onye na-eti mkpu n’ala ịkpa, sị, ‘Kwadebenụ ụzọ Jehova!* Meenụ ka okporo ụzọ ya kwụrụ ọtọ.’”+ 4 N’ihi ya, Jọn Onye Na-eme Baptizim nọ n’ala ịkpa, na-ekwusara ndị mmadụ na ha kwesịrị ime baptizim iji gosi na ha echegharịala ka e wee gbaghara ha mmehie ha.+ 5 Ndị si n’ala niile dị na Judia na ndị niile bi na Jeruselem nọ na-agakwuru ya. O wee na-eme ha baptizim* n’Osimiri Jọdan. Ha na-ekwupụtakwa mmehie ha n’ihu ọha.+ 6 Jọn yi uwe e ji ajị kamel mee, keekwa ájị̀ e ji akpụkpọ anụ mee n’úkwù.+ Ihe ọ na-eri bụ igurube na mmanụ aṅụ.+ 7 Ọ na-ekwusakwa, sị: “Onye ka m ike na-abịa n’azụ m. Erughị m eru ihulata tọpụ eriri akpụkpọ ụkwụ ya.+ 8 Eji m mmiri mee unu baptizim. Ma, ọ ga-eji mmụọ nsọ mee unu baptizim.”+
9 N’ụbọchị ndị ahụ, Jizọs si Nazaret nke dị na Galili bịa, Jọn wee mee ya baptizim n’Osimiri Jọdan.+ 10 Ozugbo o si na mmiri na-apụta, ọ hụrụ ka e meghere eluigwe, hụkwa mmụọ nsọ n’ụdị nduru ka ọ na-ebekwasị ya.+ 11 Otu olu sikwa n’eluigwe kwuo, sị: “Ị bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya. Ihe gị masịrị m.”+
12 Ozugbo ahụ, mmụọ nsọ mere ka ọ banye n’ala ịkpa. 13 Ọ nọ n’ala ịkpa ruo ụbọchị iri anọ, Setan wee na-anwa ya ọnwụnwa.+ Ya na anụ ọhịa dị iche iche nọ, ma ndị mmụọ ozi nọ na-ejere ya ozi.+
14 Mgbe e jidechara Jọn tụba ya n’ụlọ mkpọrọ, Jizọs banyere Galili,+ na-ekwusa ozi ọma Chineke,+ 15 sị: “Oge a kara aka eruola, Alaeze Chineke eruokwala nso. Chegharịanụ,+ kwerekwanụ n’ozi ọma.”
16 Ka ọ na-aga n’akụkụ Oké Osimiri Galili,* ọ hụrụ Saịmọn na Andru+ nwanne Saịmọn ka ha na-awụnye ụgbụ ha n’oké osimiri+ n’ihi na ha bụ ndị na-akụ azụ̀.+ 17 Jizọs wee sị ha: “Soronụ m. M ga-eme ka unu bụrụ ndị na-akụta mmadụ.”+ 18 Ha hapụrụ ụgbụ ha ozugbo soro ya.+ 19 Mgbe ọ gatụkwuru ihu, ọ hụrụ Jems nwa Zebedi na Jọn nwanne ya, ka ha nọ n’ụgbọ mmiri ha na-edozi ụgbụ ha.+ 20 Ọ kpọkwara ha n’egbughị oge. Ha wee hapụ nna ha Zebedi na ndị o goro ọrụ n’ụgbọ mmiri ahụ, soro ya gawa. 21 Ha wee banye Kapaniọm.
Ozugbo Ụbọchị Izu Ike ruru, ọ banyere n’ụlọ nzukọ malite izi ihe.+ 22 Otú o si ezi ihe juru ha anya n’ihi na ọ nọ na-ezi ha ihe ka onye Chineke nyere ikike, ọ bụghị ka ndị odeakwụkwọ.+ 23 N’oge ahụ, e nwere otu nwoke mmụọ ọjọọ* ji nọ n’ụlọ nzukọ ha. O tiri mkpu, sị: 24 “Jizọs onye Nazaret, gịnị jikọrọ anyị na gị?+ Ị̀ bịara ibibi anyị? Ama m gị nke ọma, Onye Nsọ nke Chineke.”+ 25 Ma Jizọs baara ya mba, sị: “Mechie ọnụ, sikwa n’ime ya pụta!” 26 Mgbe mmụọ ọjọọ ahụ* mechara ka ihe ọdụdọ dọọ nwoke ahụ, o tisiri mkpu ike ma si n’ime ya pụta. 27 O juru mmadụ niile anya nke na ha malitere ikwurịta ya, sị: “Gịnị bụ ihe a? Otú o si ezi ihe pụrụ iche. Ọ na-enyedị ndị mmụọ ọjọọ* iwu, ha ana-erubekwara ya isi.” 28 Akụkọ banyere Jizọs wee gbasaa ngwa ngwa n’ebe niile n’ógbè Galili.
29 Ha wee si n’ụlọ nzukọ ahụ pụọ gaa n’ụlọ Saịmọn na Andru. Ha na Jems na Jọn so.+ 30 Ma nne nwunye Saịmọn+ dina ala maka na ahụ́ ọkụ ji ya. Ozugbo ahu, ha kọọrọ Jizọs banyere ya. 31 Jizọs gakwuuru ya, jide ya n’aka ma selite ya. Ahụ́ ọkụ ahụ kwụsịrị, ya amalite ijere ha ozi.
32 Ná mgbede, mgbe anyanwụ darala, ndị mmadụ malitere ịkpọtara ya ndị niile na-arịa ọrịa na ndị mmụọ ọjọọ ji.+ 33 Obodo ahụ niile gbakọkwara n’ọnụ ụzọ. 34 O wee gwọọ ọtụtụ ndị na-arịa ọrịa dị iche iche.+ Ọ chụpụkwara ọtụtụ ndị mmụọ ọjọọ. Ma, ọ naghị ekwe ka ndị mmụọ ọjọọ ahụ kwuo okwu n’ihi na ha ma na ọ bụ ya bụ Kraịst.*
35 N’isi ụtụtụ, mgbe ọchịchịrị ka gbara, o biliri pụọ n’èzí ma gaa n’ebe ndị mmadụ na-anaghị anọkarị. Ọ malitere ikpe ekpere n’ebe ahụ.+ 36 Ma, Saịmọn na ndị ya na ha so chọsiwere ya ike 37 ma chọta ya. Ha wee sị ya: “Mmadụ niile na-achọgharị gị.” 38 Ma, ọ sịrị ha: “Ka anyị gaa ebe ọzọ, n’obodo ndị dị nso, ka m kwusaakwa ozi ọma n’ebe ndị ahụ n’ihi na ọ bụ ihe mere m ji bịa.”+ 39 Ọ gazukwara Galili niile, na-ekwusa ozi ọma n’ụlọ nzukọ ha dị iche iche ma na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ.+
40 Otu onye ekpenta bịakwutekwara ya. O gburu ikpere n’ala na-arịọ ya arịrịọ, sị: “Ọ bụrụ na ị chọrọ, ị ga-emeli ka m dị ọcha.”+ 41 O meteere ya ebere. O wee matịa aka bitụ ya aka, sị ya: “Achọrọ m. Dị ọcha.”+ 42 Ozugbo ahụ, a gwọrọ ya ekpenta ya, ya adị ọcha. 43 Tupu nwoke ahụ alawa, Jizọs dọsiri ya aka ná ntị ike, 44 sị ya: “Ya enwekwala onye ị ga-akọrọ ihe ọ bụla. Kama gaa gosi onye nchụàjà onwe gị, nyekwa ihe ndị Mosis kwuru na onye ekpenta ga-enye ma ọ dị ọcha,+ ka e wee mara na a gwọọla gị.”+ 45 Ma mgbe nwoke ahụ lawara, ọ malitere ịkọsa akụkọ ahụ, na-agbasakwa ya n’ebe niile, nke mere na Jizọs enwekwaghị ike ịbanye n’obodo n’ihi otú ndị mmadụ si abịakwute ya n’ìgwè. N’ihi ya, ọ nọdụrụ n’azụ obodo n’ebe ndị mmadụ na-anaghị anọkarị. Ma, ha si ebe dị iche iche na-abịakwute ya.+
2 Ma mgbe ụbọchị ụfọdụ gachara, Jizọs banyere Kapaniọm ọzọ. A kọsakwara ebe niile na ọ nọ n’ụlọ.+ 2 Ọtụtụ ndị gbakọrọ n’ụlọ ahụ nke na ohere adịghịzi, ma n’ọnụ ụzọ. O wee malite ịgwa ha okwu Chineke.+ 3 Ndị mmadụ butekwaara ya otu onye ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ. Ọ bụ mmadụ anọ bu ya.+ 4 Ma, ha enweghị ike iburute ya n’ebe Jizọs nọ n’ihi ìgwè mmadụ ahụ. Ha wee meghee elu ụlọ ebe Jizọs nọ, si n’oghere ha gwupuru buda àkwà* onye ahụ ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ dina na ya. 5 Mgbe Jizọs hụrụ na ha nwere okwukwe,+ ọ sịrị onye ahụ ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ: “Nwa m, a gbagharala gị mmehie gị.”+ 6 Ma ụfọdụ ndị odeakwụkwọ nọ ọdụ n’ebe ahụ, ha nọ na-eche n’obi ha, sị:+ 7 “Gịnị mere nwoke a ji na-ekwu okwu otú a? Ọ na-ekwulu Chineke. Ònye ga-agbagharali mmehie ma e wepụ otu onye, ya bụ, Chineke?”+ 8 Ma ozugbo ahụ, Jizọs matara na ọ bụ ihe ahụ ka ha na-eche ma na-ekwurịta. O wee sị ha: “Gịnị mere unu ji na-eche ihe ndị a n’obi unu?+ 9 Olee nke ka mfe? Ọ̀ bụ ịsị onye a ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, ‘A gbagharala gị mmehie gị,’ ka ọ̀ bụ ịsị ya, ‘Bilie, buru ihe i ji edina ala gawa ije’? 10 Ma, ka unu wee mara na Nwa nke mmadụ+ nwere ikike ịgbaghara mmehie n’ụwa—”+ ọ gwara onye ahụ ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, sị: 11 “Ana m asị gị, Bilie, buru àkwà gị lawa n’ụlọ gị.” 12 O wee bilie, buru ihe o ji edina ala ozugbo ma si n’ihu ha niile pụọ. Ihe a juru ha niile anya. Ha tokwara Chineke, sị: “Anyị ahụtụbeghị ụdị ihe a.”+
13 Ọ gara ọzọ n’akụkụ oké osimiri. Ìgwè mmadụ nọkwa na-abịakwute ya. O wee malite izi ha ihe. 14 Ma mgbe ọ na-agafe, ọ hụrụ Livaị nwa Alfiọs ka ọ nọ ọdụ n’ebe a na-anakọta ụtụ. O wee sị ya: “Bụrụ onye na-eso ụzọ m.” O wee bilie, soro ya.+ 15 Mgbe e mechara, Jizọs gara iri nri n’ụlọ ya. Ọtụtụ ndị ọnaụtụ na ndị mmehie sokwa Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya na-eri ihe, n’ihi na ọtụtụ n’ime ha na-esokwa ya.+ 16 Ma mgbe ndị odeakwụkwọ ndị Farisii hụrụ na o so ndị mmehie na ndị ọnaụtụ na-eri ihe, ha malitere ịjụ ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ọ̀ na-eso ndị ọnaụtụ na ndị mmehie eri ihe?” 17 Mgbe Jizọs nụrụ ya, ọ sịrị ha: “Ndị ahụ́ dị anaghị achọ onye ga-agwọ ha, kama ọ bụ ndị ahụ́ na-adịghị na-achọ ya. Ọ bụghị ndị ezi omume ka m bịara ịkpọ, kama ọ bụ ndị mmehie.”+
18 Ndị na-eso ụzọ Jọn na ndị Farisii na-ebu ọnụ. N’ihi ya, ụfọdụ ndị bịara jụọ Jizọs, sị: “Gịnị mere ndị na-eso ụzọ Jọn na ndị na-eso ụzọ ndị Farisii ji ebu ọnụ, ma ndị na-eso ụzọ gị anaghị ebu ọnụ?”+ 19 O wee sị ha: “Mgbe nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ+ na ndị enyi ya nọ, ndị enyi ya ekwesịghị ibu ọnụ, ka hà kwesịrị? Ọ bụrụhaala na ha na nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ nọ, ha agaghị ebu ọnụ. 20 Ma oge na-abịa mgbe a ga-akpọpụ nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ n’ebe ha nọ.+ Ha ga-ebuzi ọnụ mgbe ahụ. 21 E nweghị onye na-eji ibé ákwà ọhụrụ adụchi uwe ochie dọkara adọka. Ọ bụrụ na e mee otú ahụ, ibé ákwà ọhụrụ ahụ na-eme ka nke ochie ahụ dọkaa. Ọ na-adọka karịa otú ọ dọkaburu.+ 22 E nweghịkwa onye na-agbanye mmanya ọhụrụ n’ime karama akpụkpọ ochie. Ọ bụrụ na e mee otú ahụ, mmanya ahụ na-agbawa karama akpụkpọ ahụ. Mmanya ahụ na karama akpụkpọ ahụ na-alakwa n’iyi. Kama, a na-agbanye mmanya ọhụrụ n’ime karama akpụkpọ mmanya ọhụrụ.”
23 Mgbe o si n’ubi ọka wit na-agafe n’Ụbọchị Izu Ike, ndị na-eso ụzọ ya malitere ịghọrọ ụyọkọ ọka wit ka ha na-aga.+ 24 Ndị Farisii wee sị ya: “Legodị, gịnị mere ha ji na-eme ihe iwu kwuru ka a ghara ime n’Ụbọchị Izu Ike?” 25 Ma ọ sịrị ha: “Ọ̀ bụ na unu agụtụbeghị ihe Devid mere mgbe ọ na-enweghị ihe oriri, agụụ ana-agụ ya na ndị so ya?+ 26 N’akụkọ banyere Abayata,+ onyeisi nchụàjà, e kwuru na Devid banyere n’ụlọ Chineke taa achịcha a na-enye Chineke, o nyekwara ndị so ya. Ma, iwu kwuru na o nweghị onye kwesịrị ịta ya ma e wezụga ndị nchụàjà.”+ 27 O wee sị ha: Chineke mere Ụbọchị Izu Ike maka ụmụ mmadụ.+ O keghị ụmụ mmadụ maka Ụbọchị Izu Ike. 28 N’ihi ya, Nwa nke mmadụ bụ Onyenwe Ụbọchị Izu Ike.”+
3 Ọ banyere ọzọ n’ụlọ nzukọ. Otu nwoke otu aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ nọkwa n’ebe ahụ.+ 2 N’ihi ya, ha nọ na-ele ya anya ka ha hụ ma ọ̀ ga-agwọ nwoke ahụ n’Ụbọchị Izu Ike, ka ha bo ya ebubo. 3 O wee gwa nwoke ahụ aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ, sị: “Bilie bịa n’etiti.” 4 Ọ sịziri ha: “Iwu ò kwuru ka a na-eme ihe ọma n’Ụbọchị Izu Ike ka ọ̀ bụ ihe ọjọọ, ịzọ ndụ* ka ọ̀ bụ ibibi ndụ?”+ Ma ha gbachiri nkịtị. 5 Mgbe o lechara ha anya n’iwe, o wutere ya nke ukwuu na obi kpọrọ ha nkụ.+ Ọ sịziri nwoke ahụ: “Gbatịa aka gị.” O wee gbatịa ya, aka ya adị mma. 6 Ndị Farisii wee pụọ n’èzí, ha na ndị òtù Herọd+ amalite ịgba izu ozugbo ka ha gbuo ya.
7 Ma Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya gawara n’oké osimiri. Ìgwè mmadụ buru ibu ndị si Galili na Judia sokwaara ya.+ 8 Ìgwè mmadụ buru ibu sidị Jeruselem na Idumia nakwa n’ofe Osimiri Jọdan na gburugburu Taya na Saịdọn bịakwute ya mgbe ha nụrụ banyere ọtụtụ ihe ọ na-eme. 9 O wee gwa ndị na-eso ụzọ ya ka ha kwadebere ya otu obere ụgbọ mmiri ọ ga-anọ na ya ka ìgwè mmadụ ahụ ghara ịkpagide ya. 10 Ebe ọ bụ na ọ gwọrọ ọtụtụ ndị, ndị niile nwere ajọ ọrịa dị iche iche nọ na-agbakọta n’ebe ọ nọ ka ha bitụ ya aka.+ 11 Mgbe ọ bụla ndị mmụọ ọjọọ*+ ji hụrụ ya, ha na-adadị n’ala n’ihu ya, tie mkpu, sị: “Ị bụ Ọkpara Chineke.”+ 12 Ma ọ gwasiri ha ike ugboro ugboro ka ha ghara ime ka a mata onye ọ bụ.+
13 O wee rịgoro n’otu ugwu ma kpọọ ndị ọ chọrọ,+ ha wee gakwuru ya.+ 14 O wee họpụta mmadụ iri na abụọ, ndị ọ kpọkwara ndịozi. Ha ga na-eso ya. Ọ ga-ezipụ ha ka ha na-ekwusa ozi ọma, 15 ọ ga-enyekwa ha ikike ịchụpụ ndị mmụọ ọjọọ.+
16 Mmadụ iri na abụọ ahụ+ ọ họpụtara bụ Saịmọn, onye ọ gụkwara Pita,+ 17 Jems nwa Zebedi na Jọn nwanne Jems (ọ gụkwara ha Boanajis, nke pụtara “Ụmụ Égbè Eluigwe”),+ 18 Andru, Filip, Batolomiu, Matiu, Tọmọs, Jems nwa Alfiọs, Tadiọs, Saịmọn, onye na-anụ ọkụ n’obi, 19 na Judas Iskarịọt, onye mechara rara ya nye.
O wee banye n’otu ụlọ. 20 Ìgwè mmadụ gbakọkwara ọzọ, nke mere na Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya enweghịdị ike iri nri. 21 Ma mgbe ndị ikwu ya nụrụ ihe na-emenụ, ha gawara ka ha jide ya, n’ihi na ha nọ na-ekwu, sị: “Isi emebiela ya.”+ 22 Ndị odeakwụkwọ ndị si Jeruselem bịa nọkwa na-asị: “Bielzebọb* nọ n’ime ya, o jikwa ike onye na-achị ndị mmụọ ọjọọ achụpụ ndị mmụọ ọjọọ.”+ 23 N’ihi ya, ọ kpọrọ ha ka ha bịakwute ya, ya emeere ha ihe atụ, sị: “Olee otú Setan ga-esi achụpụ Setan? 24 Ọ bụrụ na alaeze ekewaa na-emegide onwe ya, alaeze ahụ ga-ada.+ 25 Ọ bụrụ na ezinụlọ ekewaa na-emegide onwe ya, ezinụlọ ahụ ga-ada. 26 Ọ bụrụkwa na Setan ebilie na-emegide onwe ya ma kewaa, ọ gaghị eguzo, kama nke ya agwụla. 27 N’eziokwu, e nweghị onye banyere n’ụlọ nwoke dị ike nke ga-enwe ike izuru ihe ya ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ kee nwoke ahụ dị ike agbụ. Ọ bụ naanị mgbe ahụ ka ọ ga-enwe ike izuru ihe ndị dị n’ụlọ ya. 28 N’eziokwu, ana m asị unu na a ga-agbaghara ụmụ mmadụ ihe niile, n’agbanyeghị mmehie ha mere na nkwulu ha kwuluru. 29 Ma, onye ọ bụla nke kwuluru mmụọ nsọ, a gaghị agbaghara ya ruo mgbe ebighị ebi,+ kama ikpe mmehie amala ya ruo mgbe ebighị ebi.”+ 30 O kwuru ihe a n’ihi na ha nọ na-asị: “Mmụọ ọjọọ* ji ya.”+
31 Nne ya na ụmụnne ya ndị nwoke+ wee bịa. Ha guzo n’èzí ma dunye mmadụ ka ọ gaa kpọọ ya.+ 32 Ebe ọ bụ na ìgwè mmadụ nọ ọdụ gbaa ya gburugburu, ha sịrị ya: “Lee, nne gị na ụmụnne gị ndị nwoke nọ n’èzí na-achọ gị.”+ 33 Ma ọ zara ha, sị: “Ole ndị bụ nne m na ụmụnne m ndị nwoke?” 34 O wee lee ndị nọ ya gburugburu anya, sị: “Lee, ndị a bụ nne m na ụmụnne m ndị nwoke.+ 35 Ọ bụ onye ọ bụla nke na-eme uche Chineke bụ nwanne m nwoke na nwanne m nwaanyị na nne m.”+
4 Ọ malitekwara izi ihe n’akụkụ oké osimiri. Ìgwè mmadụ dị ukwuu gbakọtara n’ebe ọ nọ. N’ihi ya, ọ banyere n’ụgbọ mmiri ma nọdụ ala. E wee kwọpụtụ ụgbọ ahụ n’ikpere mmiri. Ma, ìgwè mmadụ ahụ niile nọ n’ikpere mmiri ahụ.+ 2 O wee malite iji ihe atụ dị iche iche na-ezi ha ọtụtụ ihe.+ Ka ọ na-ezi ha ihe, ọ sịrị ha:+ 3 “Geenụ ntị. Ọgha mkpụrụ gawara ịgha mkpụrụ.+ 4 Ka ọ nọ na-agha mkpụrụ, mkpụrụ ụfọdụ dara n’akụkụ ụzọ, ụmụ nnụnụ abịa tụrụchaa ha. 5 Mkpụrụ ụfọdụ dara n’ala nkume ma pulite ozugbo n’ihi na ájá dị ebe ahụ emighị emi.+ 6 Ma mgbe anwụ chawara, ha chanwụrụ, kpọnwụọkwa n’ihi na ha enweghị mgbọrọgwụ. 7 Mkpụrụ ụfọdụ dara n’ebe ogwu juru. Ogwu ndị ahụ tolitere ma kpagbuo ha. Ha amịghịkwa mkpụrụ ọ bụla.+ 8 Ma ndị ọzọ dara n’ala dị mma. Mgbe ha tolitere ma buo ibu, ha malitere ịmị mkpụrụ. Ha na-amịkwa okpukpu iri atọ, okpukpu iri isii nakwa okpukpu otu narị (100).”+ 9 O wee sị: “Onye nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.”+
10 Ma mgbe ọ nọ naanị ya, ndị na-eso ụzọ ya na ndịozi ya iri na abụọ malitere ịjụ ya ajụjụ banyere ihe atụ ndị ahụ.+ 11 O wee sị ha: “Ọ bụ unu ka e nyere ikike ịghọta ihe nzuzo dị nsọ+ nke Alaeze Chineke. Ma ihe niile bụụrụ ndị ọzọ ihe atụ,+ 12 ka ha wee na-ele anya ma ghara ịhụ ihe ọ bụla, ka ha na-anụ ihe ma ghara ịghọta ihe ọ bụla. Ha agaghịkwa alọghachikwute Chineke, ka e wee gbaghara ha.”+ 13 Ọ sịkwara ha: “Unu aghọtaghị ihe atụ a. Oleezi otú unu ga-esi ghọta ihe atụ ndị nke ọzọ niile?
14 “Ọgha mkpụrụ na-agha okwu Chineke.+ 15 Ụfọdụ ndị yiri mkpụrụ ndị ahụ dara n’akụkụ ụzọ. Ozugbo ha nụrụ okwu ahụ, Setan na-abịa+ ewepụ okwu ahụ a ghara n’ime ha.+ 16 Ndị ọzọ yiri mkpụrụ ndị a ghara n’ala nkume. Ozugbo ha nụrụ okwu ahụ, ha na-eji ọṅụ anabata ya.+ 17 Ma okwu ahụ agbanyeghị mgbọrọgwụ n’obi ha, kama ha na-anọ obere oge. Ozugbo nsogbu ma ọ bụ mkpagbu bịaara ha n’ihi okwu ahụ, ha na-akwụsị ikwere okwu ahụ. 18 E nwekwara ndị yiri mkpụrụ a ghara n’ebe ogwu juru. Ndị a bụ ndị nụrụ okwu ahụ,+ 19 ma nchegbu+ nke oge a* na akụnụba nke na-aghọgbu ndị mmadụ+ na ihe ndị ọzọ na-agụ ndị mmadụ agụụ+ na-abanye n’obi ha ma kpagbuo okwu ahụ, okwu ahụ agharazie ịmị mkpụrụ. 20 N’ikpeazụ, ndị yiri mkpụrụ a ghara n’ala dị mma bụ ndị na-ege ntị n’okwu ahụ, na-anabatakwa ya nke ọma ma na-amị mkpụrụ okpukpu iri atọ, okpukpu iri isii na okpukpu otu narị.”+
21 Ọ sịkwara ha: “À na-ebute ọkụ* dọwa ya n’okpuru nkata* ma ọ bụ n’okpuru àkwà?* Ọ́ bụghị n’elu ihe e ji adọsa ọkụ* ka a na-adọkwasị ya?+ 22 N’ihi na e nweghị ihe e zoro ezo a na-agaghị ekpughe. E nweghịkwa ihe ọ bụla e kpuchiri nke ọma na-agaghị apụta ìhè.+ 23 Onye ọ bụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.”+
24 Ọ gwakwara ha, sị: “Geenụ ntị nke ọma n’ihe m na-ekwu.+ Ihe unu ji atụ̀ ihe ka a ga-eji tụọrọ unu, a ga-atụkwasịkwara unu ihe na ya. 25 N’ihi na onye ọ bụla nke nwere ihe ka a ga-enyekwu.+ Ma onye ọ bụla na-enweghị, a ga-anapụdị ya nke o nwere.”+
26 O wee kwuo, sị: “Alaeze Chineke dị ka mgbe mmadụ ghara mkpụrụ n’ala. 27 Ọ na-ehi ụra n’abalị ma teta mgbe chi bọrọ. Mkpụrụ ndị ahụ pulitere, tookwa, ma ọ maghị otú o si mee. 28 Mkpụrụ na-eji nwayọọ nwayọọ si n’ala puo. Akwụkwọ na-ebu ụzọ apụta, oko ya apụtazie. N’ikpeazụ, mkpụrụ kara aka na-esi n’oko ya apụta. 29 Ma ozugbo mkpụrụ ahụ chara, ọ na-eji mma e ji ewe ihe ubi were ya n’ihi na oge owuwe ihe ubi eruola.”
30 O wee sị: “Olee ihe anyị nwere ike iji Alaeze Chineke tụnyere? Ma ọ bụ, olee ihe atụ anyị nwere ike iji kọwaa ya? 31 Ọ dị ka mkpụrụ osisi mọstad. Ọ bụ mkpụrụ kacha nta n’ime mkpụrụ niile dị n’ụwa n’oge a kụrụ ya.+ 32 Ma a kụhaala ya, ọ na-eto ma yie nnukwu osisi. Ọ na-awakwa alaka ndị buru ibu, nke mere na ụmụ nnụnụ na-abịa biri na ndò ya.”
33 O ji ọtụtụ ihe atụ+ ndị dị otú a gwa ha okwu Chineke otú ha nwere ike ịghọta. 34 N’eziokwu, ọ naghị agwa ha okwu n’emereghị ha ihe atụ. Ma, ọ na-akọwara ndị na-eso ụzọ ya ihe niile ma ha na ya nọrọ.+
35 N’ụbọchị ahụ, mgbe o ruru ná mgbede, ọ sịrị ha: “Ka anyị gafee n’ofe nke ọzọ nke osimiri a.”+ 36 N’ihi ya, mgbe ha gwachara ìgwè mmadụ ahụ ka ha lawa, ha ji ụgbọ kwọrọ ya. E nwekwara ụgbọ ndị ọzọ so ụgbọ ọ nọ na ya.+ 37 Oké ifufe wee malite ife. Ebili mmiri nọkwa na-awụba mmiri n’ụgbọ ahụ, nke mere na ọ fọrọ obere ka mmiri ju n’ụgbọ ahụ.+ 38 Ma ọ nọ n’azụ ụgbọ ahụ, jiri ohiri isi na-ehi ụra. Ha wee kpọtee ya, sị ya: “Onye Ozizi, ọ́ naghị emetụ gị n’obi na mmiri na-achọ iri anyị?” 39 O wee bilie baara ifufe ahụ mba ma sị oké osimiri ahụ: “Shịị! Daa jụụ!”+ Ifufe ahụ kwụsịrị ife, ebe niile adaa jụụ. 40 O wee sị ha: “Gịnị mere ụjọ ji na-atụ unu?* Ọ̀ bụ na unu enwebeghị okwukwe?” 41 Ma oké egwu tụrụ ha, ha agwa ibe ha, sị: “Onye a ọ̀ bụdị onye? Ifufe na oké osimiri na-erubedịrị ya isi.”+
5 Ha wee rute n’ofe nke ọzọ nke oké osimiri ahụ n’obodo ndị Gerasa.+ 2 Ozugbo Jizọs pụtara n’ụgbọ mmiri ahụ, otu nwoke mmụọ ọjọọ* ji si n’ebe a na-eli ozu* bịakwute ya. 3 O bi n’ebe ahụ a na-eli ozu. Tupu mgbe ahụ, e nwetụbeghị onye nwere ike ike ya agbụ ya aghara ịdọbi ya, ọ sọgodị ya bụrụ agbụ ígwè. 4 A tụọkwala ya ịga n’ụkwụ nakwa n’aka ọtụtụ ugboro, ma ọ kụjiri ịga ndị ahụ. E nweghịkwa onye nwere ike ijide ya. 5 Ọ na-eti mkpu mgbe niile, ma n’ehihie ma n’abalị, n’ebe a na-eli ozu nakwa n’ugwu, jirikwa nkume na-ebekasị onwe ya ahụ́. 6 Ma mgbe ọ nọ n’ebe dị anya hụ Jizọs, ọ gbaara ọsọ gaa kpọọrọ ya isiala.+ 7 O wee tie mkpu n’oké olu, sị: “Jizọs, Ọkpara Chineke Onye Kacha Elu, gịnị jikọrọ mụ na gị? Jiri Chineke ṅụọrọ m iyi na ị gaghị emekpa m ahụ́.”+ 8 Ọ bụ n’ihi na Jizọs nọ na-asị ya: “Gị mmụọ ọjọọ,* si n’ime nwoke a pụta.”+ 9 Ma, Jizọs jụrụ ya, sị: “Gịnị bụ aha gị?” Ọ sịrị ya: “Aha m bụ Ìgwè, n’ihi na anyị dị ọtụtụ.” 10 O wee na-arịọ Jizọs ka ọ ghara ịchụpụ ha n’obodo ahụ.+
11 E nwekwara ìgwè ézì+ nọ n’ugwu dị n’ebe ahụ na-ata ahịhịa.+ 12 Ndị mmụọ ọjọọ ahụ wee rịọ ya, sị: “Chụba anyị n’ime ìgwè ézì ndị a, ka anyị banye n’ime ha.” 13 O wee kwe ka ha banye. Ndị mmụọ ọjọọ* ahụ pụtara banye n’ime ézì ndị ahụ. Ézì ndị ahụ nuuru daba n’oké osimiri. Ha dị ihe dị ka puku ézì abụọ (2,000). Oké osimiri wee rie ha. 14 Ma ndị na-azụ ézì ndị ahụ gbara ọsọ. Ha gara n’obodo ha nakwa gburugburu ya kọọ ihe merenụ. Ndị mmadụ wee bịa ka ha hụ ihe merenụ.+ 15 Ha bịakwutere Jizọs ma hụ nwoke ahụ mmụọ ọjọọ ji, onye ìgwè ndị mmụọ ọjọọ nọbu n’ime ya. Nwoke ahụ yi uwe, nọrọ ọdụ, isi kpakọkwara ya ọnụ. Egwu wee tụọ ha. 16 Ndị hụrụ ihe merenụ kọkwaara ha ihe mere nwoke ahụ mmụọ ọjọọ jibu nakwa ihe mere ézì ndị ahụ. 17 Ha wee malite ịrịọ Jizọs ka ọ pụọ n’ógbè ha.+
18 Ka Jizọs na-abanye n’ụgbọ mmiri, nwoke ahụ mmụọ ọjọọ jibu rịọrọ ya ka ya soro ya.+ 19 Ma o kweghị, kama ọ sịrị ya: “Lakwuru ndị ikwu gị, kọọkwara ha ihe niile Jehova* meere gị nakwa ebere o meere gị.” 20 Nwoke a gawara ma malite ịkọsa n’ime Dikapọlis* ihe niile Jizọs meere ya. Ihe a juru mmadụ niile anya.
21 Mgbe Jizọs ji ụgbọ gaghachi n’ofe nke ọzọ nke osimiri ahụ, ìgwè mmadụ gbakọtara n’ebe ọ nọ mgbe ọ ka nọ n’akụkụ oké osimiri ahụ.+ 22 Otu n’ime ndị isi ụlọ nzukọ ndị Juu, onye aha ya bụ Jaịrọs, bịara. Mgbe ọ hụrụ Jizọs, o gburu ikpere n’ala n’ihu ya.+ 23 Ọ rịọrọ ya arịrịọ ọtụtụ ugboro, sị: “Ọrịa ji obere nwa m nwaanyị aka ọjọọ.* Biko, bịa bikwasị ya aka+ ka ọ gbakee dị ndụ.” 24 Jizọs wee soro ya gawa. Ìgwè mmadụ sokwa ya ma na-adagide ya.
25 E nwere otu nwaanyị nke rịarala ọrịa oruru ọbara+ afọ iri na abụọ.+ 26 Ọ taala nnukwu ahụhụ* n’aka ọtụtụ ndị na-agwọ ọrịa, mefuokwa ihe niile o nwere. Ma ọ gbakebeghị, kama ọrịa ya akala njọ. 27 Mgbe ọ nụrụ banyere Jizọs, o si n’etiti ìgwè mmadụ ahụ bịa n’azụ ya bitụ uwe elu ya aka,+ 28 n’ihi na ọ nọ na-ekwu, sị: “Ọ bụrụ na m bitụ naanị uwe elu ya aka, m ga-agbake.”+ 29 Ọrịa oruru ọbara ya lara ozugbo. O wee mata na a gwọọla ya ọrịa ọjọọ ahụ.
30 Jizọs matara ozugbo na ike+ apụọla ya n’ahụ́. O wee tụgharịa n’etiti ìgwè mmadụ ahụ, jụọ, sị: “Ònye bitụrụ uwe elu m aka?”+ 31 Ma ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya: “Ị hụrụ ka ìgwè mmadụ na-adagide gị, gị ana-ajụ, ‘Ònye bitụrụ m aka?’” 32 Ma, ọ nọ na-elegharị anya ka ọ hụ onye bitụrụ ya aka. 33 Ebe nwaanyị ahụ ma ihe mere ya, ọ tụrụ ụjọ, marakwa jijiji bịa sekpuru ala n’ihu ya wee gwa ya eziokwu niile. 34 Jizọs sịrị ya: “Nwa m nwaanyị, okwukwe gị emeela ka ahụ́ dị gị mma. Lawa n’udo,+ gbakeekwa n’ọrịa ọjọọ na-arịa gị.”+
35 Mgbe ọ ka kpụ okwu n’ọnụ, ụfọdụ ụmụ nwoke ndị si n’ụlọ Jaịrọs bịara kwuo, sị: “Nwa gị nwaanyị anwụọla. Ọ baghịzi uru inyewe Onye Ozizi nsogbu.”+ 36 Ma Jizọs nụpeere ihe ha na-ekwu wee sị Jaịrọs: “Atụla egwu,* naanị nwee okwukwe.”+ 37 O kweghị ka onye ọ bụla soro ya ma e wepụ Pita, Jems, na Jọn nwanne Jems.+
38 Ha wee bịa n’ụlọ Jaịrọs. Jizọs wee hụ otú ebe niile si na-agba ghara ghara, hụkwa ndị na-ebe ákwá ma na-eti mkpu arịrị.+ 39 Mgbe ọ batara, ọ sịrị ha: “Gịnị mere unu ji na-ebe ákwá ma na-eme ka ebe niile na-agba ghara ghara? Nwatakịrị ahụ anwụbeghị, kama ọ na-ehi ụra.”+ 40 Ha wee malite ịchị ya ọchị, na-akwa ya emo. Ma, ọ chụpụrụ ha niile n’èzí, kpọrọ nne na nna nwatakịrị ahụ na ndị ha na ya so banye n’ebe nwatakịrị ahụ tọgbọ. 41 O wee sere nwatakịrị ahụ n’aka, sị ya: “Talita kumi,” nke pụtara: “Nwata nwaanyị, ana m asị gị, bilie.”+ 42 Nwata nwaanyị ahụ biliri ozugbo malite ije ije. (Ọ dị afọ iri na abụọ.) Ozugbo ahụ, ha nwere nnukwu obi ụtọ. 43 Ma ọ gwara ha ugboro ugboro* ka ha ghara ime ka onye ọ bụla nụ ihe a.+ O kwukwara ka e nye nwata nwaanyị ahụ ihe ka o rie.
6 O si n’ebe ahụ pụọ banye n’obodo ya.+ Ndị na-eso ụzọ ya sokwa ya. 2 Mgbe Ụbọchị Izu Ike ruru, ọ malitere izi ihe n’ụlọ nzukọ. O jukwara ọtụtụ n’ime ndị nụrụ ihe ọ na-akụzi anya. Ha wee, sị: “Olee ebe nwoke a si mụta ihe ndị a?+ Gịnị mere e ji nye ya amamihe a? Oleekwa otú o si arụli ọrụ ebube ndị ahụ?+ 3 Onye a ọ́ bụghị ọkwá nkà,+ nwa Meri?+ Ọ́ bụghịkwa nwanne Jems,+ Josef, Judas, na Saịmọn?+ Ọ̀ bụ na anyị na ụmụnne ya ndị nwaanyị ebighị n’ebe a?” N’ihi ya, ha anabataghị ya. 4 Ma Jizọs gwara ha, sị: “A na-asọpụrụ onye amụma ma e wezụga n’obodo ya nakwa n’etiti ndị ikwu ya nakwa n’ụlọ ya.”+ 5 N’ihi ya, ọ rụghị ọtụtụ ọrụ ebube n’ebe ahụ ma e wepụ ibikwasị mmadụ ole na ole na-arịa ọrịa aka ma gwọọ ha. 6 N’eziokwu, o juru ya anya na ha enweghị okwukwe. O wee gazuo obodo nta dị iche iche, na-ezi ihe.+
7 O wee kpọọ ndịozi ya iri na abụọ, bido izipụ ha abụọ abụọ+ ma nye ha ikike ịchụpụ ndị mmụọ ọjọọ.*+ 8 Ọ gwakwara ha ka ha ghara iji ihe ọ bụla gaa, ma e wepụ mkpara. Ọ sịrị ha ejila achịcha, obere akpa nri, na ego* ha ga-etinye n’obere akpa ego ha na-eke n’úkwù.+ 9 Ọ sịkwara ha eyila uwe abụọ,* ma ọ sịrị ha yiri akpụkpọ ụkwụ. 10 Ọ gwakwara ha, sị: “N’ụlọ ọ bụla unu banyere, nọrọnụ n’ebe ahụ ruo mgbe unu si na ya pụọ.+ 11 N’ebe ọ bụla a na-anabataghị unu ma ọ bụ gee unu ntị, mgbe unu na-apụ, tichapụnụ ájá dị n’ụkwụ unu ka ọ bụụrụ ha ihe àmà.”+ 12 Ha wee gaa na-ekwusara ndị mmadụ ozi ọma ka ha chegharịa.+ 13 Ha chụpụkwara ọtụtụ ndị mmụọ ọjọọ,+ teekwa ọtụtụ ndị na-arịa ọrịa mmanụ ma gwọọ ha.
14 Eze Herọd nụrụ ihe a n’ihi na a na-anụ aha Jizọs n’ebe niile. Ndị mmadụ nọkwa na-asị: “A kpọlitela Jọn Onye Na-eme Baptizim n’ọnwụ. Ọ bụ ya mere o ji na-arụ ọrụ ebube dị iche iche.”+ 15 Ma ụfọdụ ndị nọ na-asị: “Ọ bụ Ịlaịja.” Ndị ọzọ na-asịkwa: “Ọ bụ onye amụma nke dị ka otu n’ime ndị amụma e nwere n’oge ochie.”+ 16 Ma mgbe Herọd nụrụ ya, ọ sịrị: “A kpọlitela Jọn ahụ m gbupụrụ isi n’ọnwụ.” 17 N’ihi na Herọd zipụrụ ndị mmadụ, ha agaa jide Jọn, kee ya agbụ ma tụba ya n’ụlọ mkpọrọ n’ihi Herodias nwunye Filip nwanne ya, onye ọ lụrụ.+ 18 N’ihi na Jọn nọ na-agwa Herọd, sị: “Ọ dịghị mma na ị kpọọrọ nwunye nwanne gị nwoke lụwa.”+ 19 N’ihi ya, Herodias buuru Jọn iwe n’obi, chọọkwa igbu ya. Ma, o nweghị ike igbu ya 20 n’ihi na Herọd na-atụ Jọn egwu maka na ọ ma na ọ bụ onye ezi omume na onye dị nsọ,+ ọ nọkwa na-echebe ya. Mgbe ọ bụla ọ nụrụ ihe Jọn kwuru, ọ naghị ama ihe ọ ga-eme. Ma, ọ na-eji obi ụtọ ege ya ntị.
21 Ọ dabaara Herodias otu ụbọchị na Herọd kpọrọ ndị nọ n’ọkwá ukwu na ndị ọchịagha ya na ndị a ma ama na Galili+ oriri anyasị n’ụbọchị ọ na-eme ememme ncheta ọmụmụ ya.+ 22 Ada Herodias batara gbaa egwú ma mee ka obi dị Herọd na ndị ha na ya nọ na-eri ihe mma. Eze sịrị nwa agbọghọ ahụ: “Rịọ m ihe ọ bụla ị chọrọ. M ga-enye gị ya.” 23 Ọ ṅụụrụ ya iyi, sị: “Ihe ọ bụla ị rịọrọ m, m ga-enye gị ya, ọ bụrụgodị na o ruru ọkara alaeze m.” 24 O wee gaa jụọ nne ya, sị: “Gịnị ka m ga-arịọ?” Nne ya sịrị ya: “Isi Jọn Onye Na-eme Baptizim.” 25 Ọ gakwuuru eze ozugbo kwuo ihe ọ chọrọ. Ọ sịrị: “Achọrọ m ka i bunye m isi Jọn Onye Na-eme Baptizim ozugbo n’efere mbadamba.”+ 26 Ọ bụ eziokwu na ihe a ọ rịọrọ wutere eze nke ukwuu, ma eze achọghị ileghara ihe ọ rịọrọ ya anya n’ihi iyi ọ ṅụrụ nakwa n’ihi ndị ọbịa ya. 27 Eze zipụrụ otu onye nche ozugbo ma nye ya iwu ka o bute isi Jọn. O wee gaa gbupụ ya isi n’ụlọ mkpọrọ 28 ma bute isi ya n’efere mbadamba. O bunyere ya nwa agbọghọ ahụ, nwa agbọghọ ahụ ebunye ya nne ya. 29 Mgbe ndị na-eso ụzọ Jọn nụrụ ihe a, ha bịara buru ozu ya, gaa lie n’ebe a na-eli ozu.*
30 Ndịozi iri na abụọ ahụ zukọtara n’ebe Jizọs nọ ma kọọrọ ya ihe niile ha mere na ihe ha kụziiri ndị mmadụ.+ 31 O wee sị ha: “Bịanụ ka anyị gaa zurutụ ike n’ebe ndị mmadụ na-anaghị anọkarị.”+ O kwuru ya maka na ọtụtụ ndị na-abịa ma na-ala, ha enweghịkwa ohere ọ bụla, ma ohere iri nri. 32 Ha wee jiri ụgbọ mmiri gawa n’ebe ndị mmadụ na-anaghị anọkarị ka ha nọrọ naanị ha.+ 33 Ma ndị mmadụ hụrụ ka ha na-aga, ọtụtụ ndị matakwara. Ha wee jiri ụkwụ si n’obodo niile buru Jizọs na ndịozi ya ụzọ gbaruo n’ebe ahụ. 34 Mgbe ha si n’ụgbọ pụta, ọ hụrụ ìgwè mmadụ, ya emetere ha ebere+ n’ihi na ha dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.+ O wee malite izi ha ọtụtụ ihe.+
35 Ugbu a mgbede eruwela. Ndị na-eso ụzọ ya wee bịakwute ya, sị ya: “Ebe a dịpụrụ adịpụ, chi ejiwekwala.+ 36 Gwa ha ka ha lawa, ka ha gaa n’ime obodo nakwa n’obodo nta ndị dị gburugburu ebe a zụrụ ihe ha ga-eri.”+ 37 Ọ sịrị ha: “Nyenụ ha nri ka ha rie.” Ha wee sị ya: “Ọ̀ bụ anyị gaa zụta achịcha ruru narị mkpụrụ ego dinarịọs* abụọ (200) nye ha ka ha rie?”+ 38 Ọ sịrị ha: “Ogbe achịcha ole ka unu nwere? Gaanụ chọpụta.” Mgbe ha chọpụtara, ha sịrị: “Achịcha ise na azụ̀ abụọ.”+ 39 O wee gwa mmadụ niile ka ha nọdụ n’ìgwè n’ìgwè n’elu ahịhịa.+ 40 Ha wee nọdụ n’ìgwè n’ìgwè. Ụfọdụ dị otu narị mmadụ, ụfọdụ adịrị iri ise. 41 O weere ogbe achịcha ise ahụ na azụ̀ abụọ ahụ, lelie anya n’eluigwe ma gọzie ha.+ O wee nyawaa ogbe achịcha ndị ahụ malite inye ha ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-enye ìgwè mmadụ ahụ. O kekwaara mmadụ niile azụ̀ abụọ ahụ. 42 Ha niile wee rie, rijuo afọ. 43 Ha tụtụkọtara ibé achịcha ndị e rifọrọ erifọ, ya eju nkata iri na abụọ, n’agụnyeghị azụ̀ ha tụtụkọtara.+ 44 Ndị riri achịcha ahụ dị puku ụmụ nwoke ise (5,000).
45 Ọ gwaziri ndị na-eso ụzọ ya ozugbo ka ha banye n’ụgbọ ma buru ya ụzọ gawa n’ofe nke ọzọ nke osimiri ahụ, n’ebe dị Betsaịda nso. Ma, ọ gwara ìgwè mmadụ ahụ ka ha lawa.+ 46 Ma mgbe ọ sịchara ha gaa nke ọma, ọ gawara n’ugwu ka o kpee ekpere.+ 47 Mgbe chi jiwere, ụgbọ mmiri ahụ nọ n’etiti oké osimiri. Ma, ọ nọ naanị ya n’elu ala.+ 48 Mgbe ọ hụrụ na ọ na-esiri ha ike ịkwọ ụgbọ ahụ n’ihi na ifufe na-efesi ike, ọ bịawara n’ebe ha nọ. Ọ bụ n’ihe dị ka oge nche nke anọ nke abalị.* Ọ nọ na-eje ije n’elu oké osimiri ka ọ na-agakwuru ha. Ma, o mere ka ọ̀ chọrọ ịgafere ha. 49 Mgbe ha hụrụ ya ka ọ na-eje ije n’elu oké osimiri, ha chere na ọ bụ mmụọ ka ha na-ahụ. Ha wee tie mkpu, 50 n’ihi na ha niile hụrụ ya, obi amapụ ha. Ma, ọ gwara ha okwu ozugbo, sị: “Nweenụ obi ike. Ọ bụ m. Unu atụla egwu.”+ 51 O wee banye n’ụgbọ ahụ ha nọ, ifufe ahụ akwụsị. O juru ha ezigbo anya 52 n’ihi na ha aghọtabeghị ihe ha kwesịrị ịghọta n’ọrụ ebube ahụ o ji achịcha rụọ. Kama, ọ ka na-esiri obi ha ike ịghọta ihe.
53 Mgbe ha rutere n’ofe nke ọzọ n’elu ala, ha banyere Genesaret ma kegide ụgbọ ha n’akụkụ mmiri ahụ.+ 54 Ma ozugbo ha pụtara n’ụgbọ ahụ, ndị mmadụ matara onye ọ bụ. 55 Ha wee gbagharịa n’ógbè ahụ niile malite iji ihe e ji edina ala na-ebute ndị ahụ́ na-enye nsogbu n’ebe ha nụrụ na ọ nọ. 56 N’obodo nta ọ bụla ma ọ bụ n’obodo ukwu ọ bụla ọ banyere, ndị mmadụ na-ebusa ndị ọrịa n’ọma ahịa. Ha na-arịọkwa ya ka ha bitụ naanị ọnụ ọnụ uwe elu ya aka.+ Ndị niile bitụrụ ọnụ ọnụ uwe elu ya aka gbakere.
7 Ndị Farisii na ụfọdụ ndị odeakwụkwọ ndị si Jeruselem bịa gbakọtara n’ebe ọ nọ.+ 2 Ha hụrụ ka ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya ji aka rụrụ arụ, ya bụ, aka a na-akwọghị akwọ, na-eri nri.* 3 (N’ihi na ndị Farisii na ndị Juu niile anaghị eri ihe, ọ gwụla ma hà kwọruru aka n’ikpere aka maka na ha na-eso ọdịnala ndị oge gboo. 4 Ha si ahịa lọta, ha anaghị eri ihe, ọ gwụla ma hà ji mmiri sachaa onwe ha. E nwekwara ọtụtụ ọdịnala ndị ọzọ e nyefere ha ha na-esosi ike, dị ka imikpu iko, udu, na arịa ndị e ji ọla kọpa kpụọ n’ime mmiri.*)+ 5 Ndị Farisii na ndị odeakwụkwọ ahụ wee jụọ ya, sị: “Gịnị mere na ndị na-eso ụzọ gị anaghị eso ọdịnala ndị oge gboo, kama ha na-eji aka rụrụ arụ eri nri?”+ 6 Ọ sịrị ha: “Ndị ihu abụọ, ihe Aịzaya buru n’amụma banyere unu dabara adaba. O dere, sị, ‘Ndị a na-asị na ha na-asọpụrụ m, ma obi ha adịghị n’ebe m nọ.+ 7 Ọ bụ n’efu ka ha na-efe m n’ihi na ihe ha na-akụzi bụ ihe mmadụ nyere n’iwu.’+ 8 Unu na-ahapụ iwu Chineke ma na-eso ọdịnala ụmụ mmadụ.”+
9 Ọ gwakwara ha, sị: “Unu ji aghụghọ* na-eleghara iwu Chineke anya ka unu wee debe ọdịnala unu.+ 10 Dị ka ihe atụ, Mosis sịrị, ‘Sọpụrụ nne gị na nna gị.’+ Ọ sịkwara, ‘A ga-egbu onye kpọrọ nne ya ma ọ bụ nna ya iyi.’*+ 11 Ma unu na-asị, ‘Ọ bụrụ na mmadụ asị nne ya ma ọ bụ nna ya: “Ihe ọ bụla m nwere nke m gaara eji nyere gị aka bụ kọban (ya bụ, onyinye m kwere Chineke ná nkwa),”’ 12 unu anaghịzi ekwe ka o meere nne ya ma ọ bụ nna ya otu mkpụrụ ihe.+ 13 Unu si otú a eji ọdịnala unu nke unu nyefere ndị ọzọ eme ka okwu Chineke bụrụ ihe efu.+ Unu na-emekwa ọtụtụ ihe yiri ya.”+ 14 N’ihi ya, ọ kpọrọ ìgwè mmadụ ahụ ọzọ ka ha bịakwute ya. O wee sị ha: “Geenụ m ntị, unu niile, ghọtakwanụ ihe m na-ekwu.+ 15 E nweghị ihe banyere n’ọnụ mmadụ nke nwere ike imerụ ya, kama ọ bụ ihe na-esi n’obi mmadụ apụta na-emerụ ya.”+ 16* ——
17 Mgbe ọ hapụrụ ìgwè mmadụ ahụ banye n’ụlọ, ndị na-eso ụzọ ya malitere ịjụ ya ajụjụ banyere ihe atụ ahụ.+ 18 O wee sị ha: “Ùnu bụkwu ndị na-anaghị aghọta ihe ka ha? Ọ̀ bụ na unu amaghị na e nweghị ihe ọ bụla banyere mmadụ n’ọnụ nwere ike imerụ ya, 19 ebe ọ bụ na ọ naghị abanye ya n’obi, kama ọ na-abanye n’afọ ya, sizie n’afọ ya banye n’olulu nsị?” O si otú a kwuo na ihe oriri niile dị ọcha. 20 Ọ sịkwara: “Ọ bụ ihe na-esi n’obi mmadụ apụta na-emerụ ya.+ 21 N’ihi na ọ bụ n’obi mmadụ+ ka echiche ọjọọ ndị a na-esi apụta: ịkwa iko,* izu ohi, igbu mmadụ,* 22 di ma ọ bụ nwunye ịkwa iko, anyaukwu, omume ọjọọ, aghụghọ, ime ihe ọjọọ n’asọghị anya,* anyaụfụ, nkwulu, mpako, enweghị ezi uche. 23 Ihe ọjọọ a niile na-esi n’obi apụta, ha na-emerụkwa mmadụ.”
24 O si ebe ahụ pụọ ma banye n’ógbè Taya na Saịdọn.+ N’ebe ahụ, ọ banyere n’otu ụlọ, ọ chọghịkwa ka onye ọ bụla mata na ọ nọ ya. Ma, ndị mmadụ matara. 25 Ozugbo ahụ, otu nwaanyị nke mmụọ ọjọọ* ji obere nwa ya nwaanyị nụrụ banyere Jizọs ma bịa daa n’ala n’ụkwụ ya.+ 26 Nwaanyị ahụ bụ onye Grik, onye si n’obodo Finishia dị na Siria.* O wee na-arịọ Jizọs ka ọ chụpụ mmụọ ọjọọ ahụ n’ahụ́ nwa ya nwaanyị. 27 Ma Jizọs sịrị ya: “Ka ụmụaka buru ụzọ rijuo afọ n’ihi na e kwesịghị iwere nri ụmụaka tụpụrụ ụmụ nkịta.”+ 28 Ma, nwaanyị ahụ sịrị ya: “Ee, nna anyị ukwu. Ma, ụmụ nkịta ndị nọ n’okpuru tebụl na-eri iberibe ihe ndị si ná nri ụmụaka dapụ.” 29 Jizọs wee sị ya: “Ebe i kwuru ihe a, lawa. Mmụọ ọjọọ ahụ apụọla n’ahụ́ nwa gị nwaanyị.”+ 30 O wee laa n’ụlọ ya ma hụ nwatakịrị ahụ ka o dina n’àkwà.* Mmụọ ọjọọ ahụ ahapụla ya.+
31 Mgbe Jizọs si n’ógbè Taya na-alaghachi, o si na Saịdọn nakwa ógbè Dikapọlis* gafere ruo n’Oké Osimiri Galili.+ 32 N’ebe a,* ha kpọtaara ya otu nwoke ntị chiri, nke ọ na-esikwara ike ikwu okwu.+ Ha rịọrọ ya ka ọ gwọọ ya.* 33 O wee kpọpụ ya n’ebe ìgwè mmadụ ahụ nọ ma rụnye mkpịsị aka ya n’ime ntị abụọ nwoke ahụ. Ọ gbụpụkwara asọ mmiri, metụ nwoke ahụ aka n’ire.+ 34 O leliziri anya n’eluigwe, kuda ume ma sị ya: “Efata,” ya bụ, “Meghee.” 35 Ntị ya wee meghee,+ nsogbu ọ na-enwe n’ikwu okwu lakwara. O wee malite ikwu okwu nke ọma. 36 Jizọs gwara ndị nọ n’ebe ahụ ka ha ghara ịkọrọ ya onye ọ bụla.+ Ma, ka ọ na-enyekwu ha iwu ka ha na-akọsakwu ya.+ 37 N’eziokwu, o riri ha ọnụ,+ ha asị: “Ihe niile o mere dị ezigbo mma. Ọ na-emedị ka ndị ntị chiri nụ ihe, na-emekwa ka ndị ogbi kwuo okwu.”+
8 N’ụbọchị ndị ahụ, ìgwè mmadụ gbakọtara ọzọ, ha enweghịkwa ihe ha ga-eri. O wee kpọọ ndị na-eso ụzọ ya, sị ha: 2 “Ana m emetere ìgwè mmadụ a ebere+ n’ihi na mụ na ha anọọla ụbọchị atọ, ha enweghịkwa ihe ha ga-eri.+ 3 Ọ bụrụ na mụ asị ha buru ọnụ lawa n’ụlọ ha, ha ga-atụbọ n’ụzọ. Ụfọdụ n’ime ha sikwa ebe dị anya.” 4 Ma ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya: “Ebee ka mmadụ ga-esi nweta achịcha ga-eju ndị a afọ n’ebe a dịpụrụ adịpụ?” 5 O wee jụọ ha, sị: “Ogbe achịcha ole ka unu nwere?” Ha sịrị ya: “Asaa.”+ 6 Ọ gwara ìgwè mmadụ ahụ ka ha nọdụ n’ala. O wee buru ogbe achịcha asaa ahụ, kelee Chineke, nyawaa ha ma malite inye ha ndị na-eso ụzọ ya ka ha kesaa. Ha wee kesaara ha ìgwè mmadụ ahụ.+ 7 Ha nwekwara obere azụ̀ ole na ole. Ọ gọziri azụ̀ ndị ahụ, gwa ndị na-eso ụzọ ya ka ha kee ha. 8 Ha wee rie, rijuo afọ. Ha tụtụkọtara ihe ha rifọrọ, ya eju nnukwu nkata asaa.+ 9 Ụmụ nwoke riri ihe ahụ dị ihe dị ka puku anọ (4,000). O wee sị ha lawa.
10 Ozugbo ahụ, ya na ndị na-eso ụzọ ya banyere n’ụgbọ wee bata n’ógbè Dalmanuta.+ 11 N’ebe a, ndị Farisii bịara malite ịrụ ya ụka. Iji nwaa ya, ha gwara ya ka o gosi ha ihe àmà si n’eluigwe.+ 12 O wutere ya nke ukwuu,* ya asị: “Gịnị mere ọgbọ a ji achọ ihe àmà?+ N’eziokwu, ana m asị na a gaghị egosi ọgbọ a ihe àmà ọ bụla.”+ 13 O wee hapụ ha, banyeghachi n’ụgbọ, ma gaa n’ofe nke ọzọ nke oké osimiri ahụ.
14 Ma, ndị na-eso ụzọ ya chefuru iwere achịcha. Naanị ihe ha nwere n’ụgbọ ahụ bụ otu ogbe achịcha.+ 15 Jizọs dọrọ ha aka ná ntị, sị: “Lezienụ anya. Kpacharanụ anya maka ihe iko achịcha ndị Farisii na ihe iko achịcha Herọd.”+ 16 Ha wee malite ịrụrịta ụka maka na ha ejighị achịcha. 17 Mgbe ọ hụrụ na ha na-arụrịta ụka, ọ sịrị ha: “Gịnị mere unu ji arụrịta ụka maka na unu ejighị achịcha? Ọ̀ bụ na unu aghọtabeghị ihe m na-ekwu? Ọ̀ ka na-esiri obi unu ike ịghọta ihe? 18 ‘Ọ̀ bụ na unu anaghị ahụ ụzọ n’agbanyeghị na unu nwere anya? Ọ̀ bụ na unu anaghị anụ ihe n’agbanyeghị na unu nwere ntị?’ Ọ̀ bụ na unu echetaghị 19 mgbe m nyawaara puku ụmụ nwoke ise (5,000) ogbe achịcha ise?+ Nkata ole ka unu tụtụjuru ibé achịcha e rifọrọ erifọ?” Ha sịrị ya: “Iri na abụọ.”+ 20 “Mgbe m nyawaara puku ụmụ nwoke anọ (4,000) ogbe achịcha asaa, nnukwu nkata ole ka unu tụtụjuru ibé achịcha e rifọrọ erifọ?” Ha asị ya: “Asaa.”+ 21 O wee sị ha: “Ọ̀ bụ na unu aghọtabeghị ihe m na-ekwu?”
22 Ha wee banye Betsaịda. N’ebe a, ndị mmadụ kpọtaara ya otu nwoke kpuru ìsì. Ha rịọkwara ya arịrịọ ka ọ gwọọ ya.+ 23 O wee sere nwoke ahụ kpuru ìsì n’aka, kpọrọ ya pụọ n’obodo nta ahụ. O tere ya asọ mmiri n’anya+ ma bikwasị ya aka, jụọ ya, sị: “Ò nwere ihe ị na-ahụ?” 24 Nwoke ahụ leliri anya ma sị: “Ana m ahụ ndị mmadụ. Ma, ha yiri osisi na-ejegharị ejegharị.” 25 O bikwasịrị nwoke ahụ aka n’anya ọzọ, nwoke ahụ ahụwa ụzọ nke ọma, hụwa ihe niile. 26 O wee gwa ya ka ọ lawa, sị ya: “Abanyela n’obodo nta a.”
27 Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya gawaziri n’obodo nta ndị dị na Sizaria Filipaị. Mgbe ha nọ n’ụzọ, ọ malitere ịjụ ndị na-eso ụzọ ya ajụjụ, sị: “Ònye ka ndị mmadụ na-asị na m bụ?”+ 28 Ha sịrị ya: “Jọn Onye Na-eme Baptizim.+ Ma ndị ọzọ na-asị na ị bụ Ịlaịja.+ Ndị ọzọ na-asịkwa, otu n’ime ndị amụma.” 29 O wee jụọ ha, sị: “Ma ònye ka ununwa chere na m bụ?” Pita zara ya, sị: “Ị bụ Kraịst.”+ 30 Ọ gwasiri ha ike ka ha ghara ịkọrọ onye ọ bụla onye ọ bụ.+ 31 Ọ malitekwara ịkụziri ha na Nwa nke mmadụ ga-ata nnukwu ahụhụ, na ndị okenye na ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ ga-ajụ ya, na a ga-egbu ya,+ nakwa na ọ ga-ebili ma ụbọchị atọ gachaa.+ 32 N’eziokwu, ọ nọ na-ekwu ya n’ezoghị ọnụ. Ma, Pita kpọpụrụ ya n’akụkụ bido ịbara ya mba.+ 33 O wee tụgharịa, lee ndị na-eso ụzọ ya anya ma baara Pita mba, sị: “Gaa m n’azụ, Setan, n’ihi na ihe ndị ị na-eche abụghị echiche Chineke, kama ọ bụ nke mmadụ.”+
34 Ọ kpọziri ìgwè mmadụ ahụ na ndị na-eso ụzọ ya ka ha bịakwute ya. O wee sị ha: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ iso m, ya jụ onwe ya ma buru osisi ịta ahụhụ* ya na-eso m mgbe niile.+ 35 N’ihi na onye ọ bụla nke chọrọ ịzọpụta ndụ* ya ga-atụfu ya. Ma, onye ọ bụla nke tụfuru ndụ* ya n’ihi m nakwa n’ihi ozi ọma Chineke ga-azọpụta ya.+ 36 N’eziokwu, olee uru ọ ga-abara mmadụ ma o nwetachaa ụwa niile ma tụfuo ndụ* ya?+ 37 Ma ọ bụ, gịnị ka mmadụ ga-eji gbanwere ndụ* ya?+ 38 N’ihi na onye ọ bụla ihere ịbụ onye na-eso ụzọ m na ihere okwu m na-eme n’ọgbọ a hapụrụ Chineke,* nke na-emekwa mmehie, ihere onye ahụ ga-eme Nwa nke mmadụ+ mgbe ọ ga-abịa n’ebube nke Nna ya, ya na ndị mmụọ ozi dị nsọ.”+
9 Ọ gwakwara ha, sị: “N’eziokwu, ana m asị unu na e nwere ụfọdụ n’ime ndị guzo ebe a na-agaghị anwụ ruo mgbe ha bu ụzọ hụ na Alaeze Chineke amalitela ịchị.”+ 2 Mgbe ụbọchị isii gachara, Jizọs kpọọrọ Pita na Jems na Jọn gbagoo n’ugwu dị elu. O wee nwoghaa n’ihu ha.+ 3 Uwe elu ya malitere igbuke egbuke, na-enwu gbaa karịa otú onye ọ bụla na-asụ ákwà n’ụwa a nwere ike ịsụ ákwà ka ọ dị ọcha. 4 Ịlaịja na Mosis pụtakwara n’ihu ha, ha na Jizọs nọ na-akparịta ụka. 5 Pita wee sị Jizọs: “Onye Ozizi,* ọ dị mma na anyị nọ n’ebe a. N’ihi ya, ka anyị maa ụlọikwuu atọ, otu maka gị, otu maka Mosis, otu maka Ịlaịja.” 6 N’eziokwu, Pita amaghị ihe ọ ga-eme n’ihi na ezigbo ụjọ ji ha. 7 Ígwé ojii pụtara wee kpuchie ha. Otu olu+ sikwa n’ígwé ojii ahụ kwuo, sị: “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya.+ Geenụ ya ntị.”+ 8 Na mberede, ha legharịrị anya ma hụ na e nweghịzi onye ha na ya nọ ma e wepụ Jizọs.
9 Mgbe ha si n’ugwu ahụ na-agbadata, ọ gwasiri ha ike ka ha ghara ịkọrọ onye ọ bụla ihe ha hụrụ+ ruo mgbe Nwa nke mmadụ si n’ọnwụ bilie.+ 10 Ha buuru okwu ahụ n’obi.* Ma, ha kwurịtara ihe Jizọs isi n’ọnwụ bilie pụtara. 11 Ha wee jụọ ya, sị: “Gịnị mere ndị odeakwụkwọ ji ekwu na Ịlaịja+ ga-ebu ụzọ bịa?”+ 12 Ọ sịrị ha: “N’eziokwu, Ịlaịja ga-ebu ụzọ bịa ma mee ka ihe niile dị otú ha dị na mbụ.+ Ma gịnị mere e ji dee na Nwa nke mmadụ ga-ata nnukwu ahụhụ,+ e mesookwa ya ka onye a jụrụ ajụ?+ 13 Ma ana m agwa unu na Ịlaịja+ abịala n’eziokwu. Ha mekwara ya ihe masịrị ha, dị ka e dere banyere ya.”+
14 Mgbe ha bịakwutere ndị na-eso ụzọ ya ndị ọzọ, ha hụrụ ka ìgwè mmadụ gbara ha gburugburu, ndị odeakwụkwọ nọkwa na-arụ ha ụka.+ 15 Ma ozugbo ìgwè mmadụ ahụ hụrụ ya, o juru ha anya, ha agbakwuru ya ka ha kelee ya. 16 O wee jụọ ha, sị: “Gịnị ka unu na ha na-arụrịta ụka ya?” 17 Otu onye n’ime ìgwè mmadụ ahụ zara ya, sị: “Onye Ozizi, m kpọtaara gị nwa m nwoke n’ihi na o nwere mmụọ ọjọọ nke na-eme ka ọ ghara ikwu okwu.+ 18 Mgbe ọ bụla o jidere ya, ọ na-atụ ya n’ala. Ọ na-agbọ ụfụfụ n’ọnụ, na-atakwa ikikere ezé, ike na-agwụkwa ya. M gwara ndị na-eso ụzọ gị ka ha chụpụ ya, ma ha enweghị ike ịchụpụ ya.” 19 Ọ gwara ha, sị: “Unu ọgbọ na-enweghị okwukwe,+ ruo ole mgbe ka mụ na unu ga-anọ tupu unu enwee okwukwe? Ruo ole mgbe ka m ga na-edi ihe unu na-eme? Kpọtaranụ m ya.”+ 20 Ha wee kpọtara ya nwa ahụ. Ma mgbe mmụọ ọjọọ ahụ hụrụ Jizọs, o mere ka ihe ọdụdọ dọwa nwa ahụ ozugbo, ya adaa n’ala, na-atụrụgharị, na-agbọpụta ụfụfụ n’ọnụ ya. 21 Jizọs jụrụ nna ya, sị: “Olee mgbe ihe a malitere ime ya?” Ọ sịrị: “Ọ malitere kemgbe ọ bụ nwata. 22 Ọ na-atụbakarị ya n’ime ọkụ nakwa n’ime mmiri ka o gbuo ya. Ma, ọ bụrụ na i nwere ike ime ihe ọ bụla, metere anyị ebere ma nyere anyị aka.” 23 Jizọs sịrị ya: “Gịnị mere i ji sị m, ‘Ọ bụrụ na i nwere ike’? N’eziokwu, ihe niile kwere omume ma ọ bụrụ na mmadụ nwere okwukwe.”+ 24 Nna nwatakịrị ahụ tiri mkpu ozugbo, sị: “Enwere m okwukwe. Nyere m aka ka okwukwe m sikwuo ike.”+
25 Mgbe Jizọs hụrụ na ìgwè mmadụ nuuru na-abịa n’ebe ha nọ, ọ baara mmụọ ọjọọ ahụ* mba, sị ya: “Gị mmụọ mere ka nwa a ghara ikwu okwu ma ghara ịnụ ihe, ana m enye gị iwu, si n’ime ya pụọ, abanyekwala n’ime ya ọzọ.”+ 26 Mgbe mmụọ ọjọọ ahụ tichara mkpu, meekwa ka ihe ọdụdọ dọọ nwa ahụ ọtụtụ ugboro, o si n’ime ya pụta. Nwa ahụ wee tọgbọrọ ka onye nwụrụ anwụ, nke mere na ọtụtụ n’ime ìgwè mmadụ ahụ nọ na-asị: “Ọ nwụọla.” 27 Ma Jizọs seere ya n’aka dọlite ya, ya ebilie. 28 Mgbe ọ banyere n’ime ụlọ, ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya n’ebe naanị ha nọ, sị: “Gịnị mere na anyị achụpụlighị ya?”+ 29 O wee sị ha: “Ọ bụ naanị ekpere ga-eme ka a chụpụlie ụdị mmụọ ọjọọ a.”
30 Ha si n’ebe ahụ pụọ ma si Galili gafere. Ma, ọ chọghị ka onye ọ bụla mara ebe ọ nọ. 31 N’ihi na ọ nọ na-akụziri ndị na-eso ụzọ ya ihe, na-asị ha: “A ga-arara Nwa nke mmadụ nye n’aka ndị mmadụ, ha ga-egbukwa ya.+ Ma n’agbanyeghị na a ga-egbu ya, ọ ga-ebili n’ụbọchị nke atọ.”*+ 32 Ha aghọtaghị ihe o kwuru, ma egwu ekweghị ha jụọ ya ajụjụ.
33 Ha wee bata Kapaniọm. Mgbe ọ nọ n’ime ụlọ, ọ jụrụ ha, sị: “Gịnị ka unu na-arụ ụka ya n’ụzọ?”+ 34 Ha gbachiri nkịtị n’ihi na ha nọ na-arụrịta ụka n’ụzọ banyere onye ka ukwuu n’ime ha. 35 O wee nọdụ ala ma kpọọ ndịozi ya iri na abụọ, sị ha: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ ịbụ onye mbụ, ọ ga-abụ onye ikpeazụ na onye na-ejere mmadụ niile ozi.”+ 36 Ọ kpọtara otu nwatakịrị, gwa ya ka o guzo n’etiti ha. Ọ tụkwasịrị ya aka n’ubu ma sị ha: 37 “Onye ọ bụla nke na-anabata otu n’ime ụmụntakịrị a+ n’aha m na-anabata m. Onye ọ bụla nke na-anabata m na-anabata, ọ bụghị naanị m, kamakwa Onye zitere m.”+
38 Jọn sịrị ya: “Onye Ozizi, anyị hụrụ onye ji aha gị na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ, anyị gbalịkwara igbochi ya n’ihi na ọ naghị eso anyị.”+ 39 Ma Jizọs sịrị: “Unu anwala igbochi ya n’ihi na e nweghị onye ga-arụ ọrụ dị ike n’aha m nke ga-atụgharị ozugbo kwujọọ m. 40 N’ihi na onye na-anaghị emegide anyị dịnyeere anyị.+ 41 N’eziokwu, ana m asị unu na onye ọ bụla kunyere unu otu iko mmiri ka unu ṅụọ maka na unu na-eso ụzọ Kraịst,+ ga-enweta ụgwọ ọrụ ya.+ 42 Ma, onye ọ bụla nke mere ka otu n’ime ndị a dị nta bụ́ ndị nwere okwukwe dapụ n’okwukwe,* ọ ga-akara ya mma ma e konye nkume e ji egwe nri, nke jakị na-akwagharị, n’olu ya ma tụba ya n’oké osimiri.+
43 “Ọ bụrụ na aka gị na-eme ka ị na-eme mmehie,* gbupụ ya. Ọ kaara gị mma ibu nkwarụ nweta ndụ kama inwe aka abụọ banye na Gehena,* n’ọkụ nke a na-enweghị ike imenyụ emenyụ.+ 44* —— 45 Ọ bụrụkwa na ụkwụ gị na-eme ka ị na-eme mmehie,* gbupụ ya. Ọ kaara gị mma inwe otu ụkwụ nweta ndụ kama inwe ụkwụ abụọ a tụba gị na Gehena.*+ 46* —— 47 Ọ bụrụkwa na anya gị na-eme ka ị na-eme mmehie,* ghụpụ ya.+ Ọ kaara gị mma ibu otu anya banye n’Alaeze Chineke kama inwe anya abụọ a tụba gị na Gehena.*+ 48 Ikpuru ndị dị n’ebe ahụ anaghị anwụ anwụ, a naghịkwa emenyụ ọkụ ya emenyụ.+
49 “N’ihi na a ga-agha onye ọ bụla ọkụ otú e si agha nnu n’ihe.+ 50 Nnu dị mma. Ma, ọ bụrụ na nnu anaghịzi atọ ka nnu, gịnị ka unu ga-eji mee ka ọ tọwakwa ka nnu?+ Nweenụ nnu n’ime onwe unu.+ Unu na ibe unu na-adị n’udo.”+
10 O si n’ebe ahụ pụọ ma bịarute n’ókè Judia, n’ofe Osimiri Jọdan. Ìgwè mmadụ gbakọtara ọzọ n’ebe ọ nọ. O wee malite ọzọ izi ha ihe otú ọ na-eme.+ 2 Ndị Farisii bịakwutere ya ka ha nwaa ya. Ha jụrụ ya ma ọ̀ dị mma ka nwoke gbaa nwunye ya alụkwaghịm.+ 3 Ọ zara ha, sị: “Gịnị ka Mosis nyere unu n’iwu?” 4 Ha sịrị: “Mosis kwere ka nwoke dee akwụkwọ ọ ga-eji chụpụ nwunye ya ma gbaa ya alụkwaghịm.”+ 5 Ma Jizọs sịrị ha: “Ọ bụ n’ihi na obi kpọrọ unu nkụ+ mere o ji deere unu iwu a.+ 6 Ma, malite n’oge Chineke kere ihe, ‘O kere ụmụ mmadụ nwoke na nwaanyị.+ 7 Ọ bụ ya mere nwoke ga-eji hapụ nne ya na nna ya,+ 8 ha abụọ ga-abụkwa otu anụ ahụ́,’+ nke mere na ha abụkwaghị anụ ahụ́ abụọ, kama ha bụ otu anụ ahụ́. 9 N’ihi ya, ihe Chineke kekọtara, mmadụ ọ bụla atọsala ya.”+ 10 Mgbe ha nọ ọzọ n’ụlọ, ndị na-eso ụzọ ya malitere ịjụ ya ajụjụ banyere ihe a. 11 Ọ sịrị ha: “Onye ọ bụla gbara nwunye ya alụkwaghịm ma lụọ nwaanyị ọzọ, na-akwa iko,+ na-emejọkwa nwunye mbụ ya. 12 Ọ bụrụkwa na nwaanyị agbaa di ya alụkwaghịm ma lụrụ di ọzọ, ọ na-akwa iko.”+
13 Ndị mmadụ malitere ịkpọtara ya ụmụntakịrị ka o bitụ ha aka. Ma, ndị na-eso ụzọ ya baara ha mba.+ 14 Mgbe Jizọs hụrụ ihe ha mere, o were iwe ma sị ha: “Hapụnụ ụmụntakịrị ka ha bịakwute m. Unu egbochila ha n’ihi na Alaeze Chineke bụ nke ndị dị otú ahụ.+ 15 N’eziokwu, ana m asị unu na onye ọ bụla na-anabataghị Alaeze Chineke otú nwatakịrị si anabata ihe emekataghị banye na ya.”+ 16 O wee kuru ụmụntakịrị ahụ ma malite ịgọzi ha, na-ebikwasị ha aka n’isi.+
17 Mgbe ọ na-aga n’ụzọ, otu nwoke gbakwuuru ya ma gbuo ikpere n’ala n’ihu ya, jụọ ya, sị: “Ezigbo Onye Ozizi, gịnị ka m ga-eme ka m nweta ndụ ebighị ebi?”+ 18 Jizọs sịrị ya: “Gịnị mere i ji akpọ m ezigbo onye? E nweghị onye bụ́ ezigbo onye, ma e wezụga otu onye, ya bụ, Chineke.+ 19 Ị manụ ihe ndị e nyere n’iwu, ya bụ: ‘Egbula mmadụ,*+ akwala iko,+ ezula ohi,+ agbala akaebe ụgha,+ erigbula mmadụ,+ sọpụrụ nne gị na nna gị.’”+ 20 Nwoke ahụ sịrị ya: “Onye Ozizi, m na-edebe iwu a niile kemgbe m bụ nwata.” 21 Jizọs lere ya anya ma nwee mmasị n’ebe ọ nọ,* wee sị ya: “E nwere otu ihe ị ka ga-eme: Gaa ree ihe ndị i nwere, nye ndị ogbenye ihe i retara, ị ga-enwekwa akụ̀ n’eluigwe. Bịazie bụrụ onye na-eso ụzọ m.”+ 22 Ma ihe a Jizọs zara ya adịghị ya mma. O wutere ya, ya alawa, n’ihi na o nwere ọtụtụ ihe.+
23 Jizọs legharịrị anya ma gwa ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ọ ga-esiri ndị nwere ego ezigbo ike ịbanye n’Alaeze Chineke.”+ 24 Ma, ihe a o kwuru juru ndị na-eso ụzọ ya anya. Jizọs gwaziri ha, sị: “Ụmụntakịrị, mmadụ ịba n’Alaeze Chineke siri ike. 25 Ọ dịịrị kamel mfe isi n’anya agịga gafere karịa ọgaranya ịbanye n’Alaeze Chineke.”+ 26 Ma ọ ka jukwuru ha anya, ha asị ya:* “Ònyezi ka a ga-azọpụta?”+ 27 Jizọs legidere ha anya, sị: “N’anya ụmụ mmadụ, ihe a agaghị ekwe omume. Ma, e nweghị ihe nyịrị Chineke n’ihi na ihe niile kwere Chineke omume.”+ 28 Pita malitere ịsị ya: “Ma, anyị ahapụla ihe niile soro gị.”+ 29 Jizọs sịrị: “N’eziokwu, ana m asị unu na e nweghị onye hapụrụ ụlọ ma ọ bụ ụmụnne ndị nwoke ma ọ bụ ụmụnne ndị nwaanyị ma ọ bụ nne ma ọ bụ nna ma ọ bụ ụmụ ma ọ bụ ubi n’ihi m nakwa n’ihi ozi ọma,+ 30 nke na-agaghị enweta okpukpu otu narị (100) ụlọ, ụmụnne ndị nwoke, ụmụnne ndị nwaanyị, nne, ụmụ, ubi, nakwa mkpagbu n’oge a,+ nwetakwa ndụ ebighị ebi n’ọdịnihu.”* 31 Ma, ọtụtụ ndị mbụ ga-abụ ndị ikpeazụ, ndị ikpeazụ ga-abụkwa ndị mbụ.”+
32 Ugbu a, ha nọ n’ụzọ na-agbago Jeruselem, Jizọs nọkwa ha n’ihu, ya eju ha anya. Ma ndị so ha malitere ịtụ egwu. O wee kpọpụ ndịozi ya iri na abụọ iche ọzọ ma malite ịkọrọ ha ihe ndị a na-aga ime ya, sị:+ 33 “Lee, anyị na-agbago Jeruselem, a ga-enyefekwa Nwa nke mmadụ n’aka ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ. Ha ga-ama ya ikpe ọnwụ ma nyefee ya n’aka ndị mba ọzọ. 34 Ha ga-eji ya mee ihe ọchị, gbụọ ya asọ mmiri, pịa ya ihe, gbuokwa ya. Ma ụbọchị atọ gachaa, ọ ga-ebili.”+
35 Jems na Jọn, ụmụ Zebedi,+ gakwuuru ya ma sị ya: “Onye Ozizi, anyị chọrọ ka i meere anyị ihe ọ bụla anyị ga-arịọ gị.”+ 36 Ọ sịrị ha: “Gịnị ka unu chọrọ ka m meere unu?” 37 Ha wee sị ya: “Kwe ka anyị soro gị nọdụ ala n’Alaeze* gị, otu onye n’aka nri gị, otu onye n’aka ekpe gị.”+ 38 Ma Jizọs sịrị ha: “Unu amaghị ihe unu na-arịọ. Ùnu ga-aṅụli ihe dị n’iko m na-aṅụ, ma ọ bụ ùnu dị njikere ka e mee unu baptizim a na-eme m?”+ 39 Ha sịrị ya: “Ee.” Jizọs wee sị ha: “Unu ga-aṅụ ihe dị n’iko m na-aṅụ, a ga-emekwa unu baptizim a na-eme m.+ 40 Ma, ọ bụghị m na-ekpebi onye ga-anọ n’aka nri m ma ọ bụ n’aka ekpe m, kama ọ dịịrị ndị Nna m kwadebeere ya.”
41 Mgbe mmadụ iri ndị nke ọzọ nụrụ ya, ha wesoro Jems na Jọn iwe.+ 42 Ma Jizọs kpọrọ ha ka ha bịakwute ya. Ọ sịrị ha: “Unu ma na ndị e weere ka ndị na-achị ndị mba ọzọ na-eme ha ka ọ̀ bụ ha nwe ha, ndị isi ha na-ejikwa aka ike achị ha.+ 43 O kwesịghị ịdị otú ahụ n’ebe unu nọ. Kama onye ọ bụla nke chọrọ ịbụ onye ukwu n’ime unu ga-abụ onye na-ejere unu ozi.+ 44 Onye ọ bụla nke chọkwara ịbụ onye mbụ n’ime unu ga-abụ ohu unu niile. 45 N’ihi na Nwa nke mmadụ abịaghị ka e jeere ya ozi, kama ọ bịara ka o jee ozi+ ma nye ndụ* ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta maka ọtụtụ mmadụ.”+
46 Ha wee bata Jeriko. Ma mgbe ya na ndị na-eso ụzọ ya na ìgwè mmadụ buru ibu si na Jeriko na-apụ, Batimiọs (nwa Timiọs), onye arịrịọ nke kpuru ìsì, nọ ọdụ n’akụkụ ụzọ.+ 47 Mgbe ọ nụrụ na ọ bụ Jizọs onye Nazaret na-agafe, ọ malitere iti mkpu, sị: “Jizọs, nwa Devid,+ meere m ebere!”+ 48 Ọtụtụ ndị malitere ịbara ya mba, na-agwa ya ka o mechie ọnụ. Ma, ọ nọ na-etisikwu mkpu ike, sị: “Nwa Devid, meere m ebere!” 49 Jizọs kwụsịrị, sị: “Kpọọrọnụ m ya.” Ha wee kpọọ nwoke ahụ kpuru ìsì, sị ya: “Nwee obi ike. Bilie, ọ na-akpọ gị.” 50 O yipụrụ uwe elu ya, malie ma gakwuru Jizọs. 51 Jizọs wee sị ya: “Gịnị ka ị chọrọ ka m meere gị?” Nwoke ahụ kpuru ìsì sịrị ya: “Rabonaị,* mee ka m hụwa ụzọ.” 52 Jizọs sịziri ya: “Lawa, okwukwe gị emeela ka ahụ́ dị gị mma.”+ Ozugbo ahụ, ọ hụwara ụzọ.+ O wee soro Jizọs gawa.
11 Mgbe ha rutewere Jeruselem nso, ha rutere n’Ugwu Oliv bụ́ ebe obodo Betfeji na obodo Betani dị.+ O wee zipụ mmadụ abụọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya,+ 2 sị ha: “Gaanụ n’obodo a unu na-ahụ. Ozugbo unu banyere n’ime ya, unu ga-ahụ nwa jakị e liwere eliwe, nke a na-enwebeghị onye nọkwasịrị na ya ruo ugbu a. Tọpụnụ ya, kpụtakwanụ ya ebe a. 3 Ọ bụrụ na onye ọ bụla asị unu, ‘Gịnị mere unu ji na-atọpụ ya?’ sịnụ ya, ‘Onyenwe anyị chọrọ ka anyị kpụta ya, a ga-akpụghachikwa ya ebe a ozugbo.’” 4 Ha wee gawa ma hụ nwa jakị ahụ ka e liwere ya n’ọnụ ụzọ otu ụlọ dị n’akụkụ ụzọ. Ha wee tọpụ ya.+ 5 Ma ụfọdụ ndị guzo n’ebe ahụ sịrị ha: “Gịnị mere unu ji na-atọpụ nwa jakị ahụ?” 6 Ha gwara ha ihe Jizọs kwuru, ha ahapụ ha ka ha gawa.
7 Ha wee kpụtara Jizọs nwa jakị ahụ.+ Ha wụkwasịkwara uwe elu ha n’elu ya, ya anọrọ n’elu ya.+ 8 Ọtụtụ ndị gbasakwara uwe elu ha n’okporo ụzọ, ma ndị ọzọ si n’ọhịa gbute alaka osisi.+ 9 Ma ndị na-aga n’ihu ya ma ndị na-abịa n’azụ ya nọ na-eti mkpu, sị: “Biko, zọpụta ya!+ Onye ahụ nke na-abịa n’aha Jehova bụ onye a gọziri agọzi!+ 10 Alaeze na-abịa abịa nke nna anyị Devid+ bụ ihe a gọziri agọzi! Biko, zọpụta ya, gị onye nọ n’ebe kacha elu!” 11 O wee rute Jeruselem ma banye n’ụlọ nsọ lee ihe niile anya. Ma ebe ọ bụ na chi ejiwela, ya na ndịozi ya iri na abụọ gawara Betani.+
12 N’echi ya, mgbe ha si Betani na-apụta, agụụ gụwara Jizọs.+ 13 Ọ nọ n’ebe dị anya hụ otu osisi fig nwejuru akwụkwọ ndụ. O wee gawa ile ma è nwere mkpụrụ ọ ga-ahụ na ya. Ma mgbe o ruru, e nweghị ihe ọ hụrụ ma e wezụga akwụkwọ ndụ n’ihi na oge ahụ abụghị oge mkpụrụ fig ji amị. 14 N’ihi ya, ọ sịrị osisi ahụ: “Ka onye ọ bụla ghara iri mkpụrụ gị ọzọ ruo mgbe ebighị ebi.”+ Ndị na-eso ụzọ ya nụkwara ihe o kwuru.
15 Ha wee bịarute Jeruselem. N’ebe ahụ, ọ banyere n’ụlọ nsọ ma malite ịchụpụ ndị na-ere ihe na ndị na-azụ ihe n’ụlọ nsọ. O kpuru tebụl ndị na-agbanwe ego nakwa oche ndị na-ere nduru ihu n’ala.+ 16 O kweghịkwa ka onye ọ bụla buru ihe ọ bụla si n’ụlọ nsọ gafere. 17 Ọ nọ na-ezi ihe, na-asị ha: “Ọ̀ bụ na e deghị, sị, ‘A ga-akpọ ụlọ m ụlọ ekpere maka mba niile’?+ Ma unu emeela ya ọgba ndị ohi.”+ 18 Ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ nụrụ ihe merenụ. Ha wee malite ịchọ otú ha ga-esi gbuo ya+ n’ihi na ha na-atụ ya egwu maka na otú o si ezi ihe juru ìgwè mmadụ niile ahụ anya.+
19 Mgbe chi jiwere, ha si n’obodo ahụ pụọ. 20 Ma mgbe ha na-agafe n’isi ụtụtụ, ha hụrụ na osisi fig ahụ akpọnwụọla malite na mgbọrọgwụ ya.+ 21 Pita chetara ihe merenụ, ya asị Jizọs: “Onye Ozizi,* lee, osisi fig ahụ ị bụrụ ọnụ akpọnwụọla.”+ 22 Jizọs gwara ha, sị: “Nweenụ okwukwe na Chineke. 23 N’eziokwu, ana m asị unu na ọ bụrụ na onye ọ bụla asị ugwu a, ‘Si ebe a pụọ daba n’oké osimiri,’ ọ bụrụkwa na o nwee okwukwe na ihe o kwuru ga-eme ma ghara inwe obi abụọ, ọ ga-eme.+ 24 Ọ bụ ya mere m ji asị unu na ihe niile unu na-ekpe n’ekpere ma na-arịọ n’arịrịọ, nweenụ okwukwe na unu enwetala ha, unu ga-enwetakwa ha.+ 25 Mgbe unu guzo na-ekpe ekpere, gbagharanụ onye ọ bụla ihe ọ bụla o mere unu, ka Nna unu nọ n’eluigwe wee gbagharakwa unu mmehie unu.”+ 26* ——
27 Ha bịara Jeruselem ọzọ. Ka ọ na-agagharị n’ụlọ nsọ, ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ na ndị okenye bịara, 28 sị ya: “Ebee ka i si nweta ikike i ji eme ihe ndị a? Ma ọ bụ, ònye nyere gị ikike ime ihe ndị a?”+ 29 Jizọs sịrị ha: “M ga-ajụ unu otu ajụjụ. Unu zaa m ya, m ga-agwazi unu ebe ikike m ji na-eme ihe ndị a si. 30 Ikike Jọn ji mee ndị mmadụ baptizim+ ò si n’eluigwe ka ò si n’aka mmadụ? Zaanụ m ya.”+ 31 Ha wee malite ịgwa ibe ha, sị: “Ọ bụrụ na anyị asị, ‘O si n’eluigwe,’ ọ ga-asị, ‘Gịnịzi mere na unu ekwetaghị ihe o kwuru?’ 32 Ma anyị agaghị anwa anwa sị, ‘O si n’aka mmadụ.’” Ha na-atụ ìgwè mmadụ ahụ egwu n’ihi na ha niile kwetara n’eziokwu na Jọn bụ onye amụma.+ 33 N’ihi ya, ha zara Jizọs, sị: “Anyị amaghị.” Jizọs sịziri ha: “M gaghịkwa agwa unu ebe ikike m ji eme ihe ndị a si.”
12 Jizọs malitere imere ha ihe atụ. Ọ sịrị: “Otu nwoke kọrọ ubi vaịn,+ gbaa ya ogige gburugburu, gwuo olulu ebe mmanya si n’ebe a na-azọchapụta mmanya ga na-asọba ma rụọ ụlọ elu.+ O nyefeziri ya n’aka ndị ọrụ ubi, wee gawa mba ọzọ.+ 2 Mgbe oge e ji aghọ mkpụrụ vaịn ruru, o zipụrụ otu ohu ya ka ọ gakwuru ndị ọrụ ubi ahụ nata ha ụfọdụ n’ime mkpụrụ si n’ubi vaịn ahụ. 3 Ma ha jidere ya, tikasịa ya ahụ́ ma chụlaa ya n’enyeghị ya ihe ọ bụla. 4 O zigakwaara ha ohu ọzọ. Ma ha kụrụ ya ihe n’isi, menyekwa ya ihere.+ 5 O wee ziga onye ọzọ, ha egbuo ya. O zigakwara ọtụtụ ndị ọzọ. Ma ha tiri ụfọdụ n’ime ha ihe, gbuokwa ụfọdụ n’ime ha. 6 O wee zigara ha onye nke ikpeazụ o nwere, bụ́ ọkpara ya ọ hụrụ n’anya,+ kwuo, sị, ‘Ha ga-akwanyere ọkpara m ùgwù.’ 7 Ma ndị ọrụ ubi ahụ gwara ibe ha, sị, ‘Ọ bụ onye a ga-eketa ubi a.+ Bịanụ ka anyị gbuo ya, ka ihe ọ ga-eketa bụrụzie nke anyị.’ 8 Ha wee jide ya, gbuo ya ma tụpụ ya n’ubi vaịn ahụ.+ 9 Gịnịzi ka onye nwe ubi vaịn ahụ ga-eme? Ọ ga-abịa gbuo ndị ọrụ ubi ahụ ma nyefee ndị ọzọ ubi vaịn ahụ.+ 10 Ọ̀ bụ na unu agụtụbeghị ihe a e dere n’Akwụkwọ Nsọ: ‘Nkume ndị na-arụ ụlọ jụrụ aghọọla nkume ji ụlọ.+ 11 Ihe a si n’aka Jehova,* ọ dịkwa ebube n’anya anyị’?”+
12 Ha wee chọọ ijide ya n’ihi na ha ma na ọ bụ ha ka o bu n’obi mee ihe atụ ahụ. Ma, ha tụrụ ìgwè mmadụ ahụ egwu. N’ihi ya, ha hapụrụ ya pụọ.+
13 Ha zipụziri ụfọdụ ndị Farisii nakwa ụfọdụ ndị òtù Herọd ka ha gakwuru ya, ka ha si n’ihe ọ ga-ekwu mata ya n’ọnyà.+ 14 Mgbe ha rutere, ha sịrị ya: “Onye Ozizi, anyị ma na ị na-ekwu eziokwu, ị naghịkwa asọ onye ọ bụla anya n’ihi na ị naghị ele mmadụ anya n’ihu, kama ihe ị na-akụzi banyere Chineke bụ eziokwu. È kwesịrị ịkwụ Siza ụtụ isi ka ọ̀ bụ na e kwesịghị? 15 Ọ̀ bụ anyị kwụọ, ka ọ̀ bụ anyị akwụla?” Ọ chọpụtara na ha bụ ndị ihu abụọ, ya asị ha: “Gịnị mere unu ji na-anwa m? Wetaranụ m mkpụrụ ego dinarịọs* ka m hụ.” 16 Ha wetaara ya otu, ya asị ha: “Isi ònye na aha ònye dị n’ego a?” Ha sịrị ya: “Ọ bụ nke Siza.” 17 Jizọs wee sị: “Kwụọnụ Siza ihe Siza,+ ma kwụọnụ Chineke ihe Chineke.”+ Ihe a o kwuru juru ha anya.
18 Ndị Sadusii, bụ́ ndị na-asị na mbilite n’ọnwụ adịghị,+ bịara jụọ ya, sị:+ 19 “Onye Ozizi, Mosis dere na ọ bụrụ na nwanne mmadụ anwụọ, ma nwunye ya amụtaraghị ya nwa, nwanne ya nwoke kwesịrị ịlụrụ nwaanyị ahụ ọ hapụrụ ma mụtara nwanne ya nwoke nwa.+ 20 E nwere ụmụnne asaa. Nke mbụ lụrụ nwunye, ma ọ nwụrụ n’amụtaghị nwa. 21 Nke abụọ lụụrụ nwaanyị ahụ, ma ọ nwụkwara n’amụtaghị nwa. Otu ihe ahụ mekwara onye nke atọ. 22 Ụmụ nwoke asaa ahụ nwụrụ n’amụtaghị nwa. N’ikpeazụ, nwaanyị ahụ nwụkwara. 23 A kpọlite ha n’ọnwụ, ònye n’ime ha ka ọ ga-abụ nwunye ya ebe ọ bụ na ha asaa lụchara ya?” 24 Jizọs sịrị ha: “Unu amaghị Akwụkwọ Nsọ, unu amaghịkwa otú ike Chineke si arụ ọrụ. Ọ bụ ya mere unu ji efu ụzọ.+ 25 N’ihi na mgbe ha ga-esi n’ọnwụ bilie, ụmụ nwoke agaghị alụ nwaanyị, a gaghịkwa eke ụmụ nwaanyị di, kama ha ga-adị ka ndị mmụọ ozi nọ n’eluigwe.+ 26 Ọ̀ bụ na unu agụbeghị akụkọ osisi ogwu ahụ n’akwụkwọ Mosis? Chineke na-ekwu banyere ndị nwụrụ anwụ a ga-akpọlite n’ọnwụ mgbe ọ gwara Mosis, sị: ‘Abụ m Chineke Ebreham na Chineke Aịzik na Chineke Jekọb.’+ 27 Ọ bụghị Chineke nke ndị nwụrụ anwụ, kama ọ bụ nke ndị dị ndụ. N’eziokwu, unu efuola ụzọ.”+
28 Otu n’ime ndị odeakwụkwọ nke bịara n’ebe ahụ nụrụ ka ha na-arụrịta ụka. Ebe ọ ma na ihe Jizọs zara ha dị mma, ọ jụrụ ya, sị: “Olee nke bụ́ nke mbụ* n’ihe niile e nyere n’iwu?”+ 29 Jizọs zara, sị: “Nke mbụ bụ, ‘Nụrụ, Izrel, Jehova* bụ́ Chineke anyị bụ otu Jehova.* 30 Jiri obi gị niile na mkpụrụ obi* gị niile na uche gị niile na ike gị niile hụ Jehova* bụ́ Chineke gị n’anya.’+ 31 Nke abụọ bụ, ‘Hụ onye agbata obi gị n’anya otú ị hụrụ onwe gị.’+ E nweghị ihe ọ bụla ọzọ e nyere n’iwu karịrị iwu ndị a.” 32 Odeakwụkwọ ahụ sịrị ya: “Onye Ozizi, ihe i kwuru bụ eziokwu. ‘Ọ bụ otu Chineke ka e nwere, e nweghịkwa ọzọ ma e wepụ ya.’+ 33 Mmadụ iji obi ya niile na nghọta ya niile na ike ya niile hụ ya n’anya nakwa ịhụ onye agbata obi ya n’anya otú ọ hụrụ onwe ya karịrị àjà niile a na-esucha ọkụ na àjà ndị ọzọ.”+ 34 Jizọs hụrụ na o kwuru okwu ka onye ma ihe, ya asị ya: “Ọ bụ naanị obere ihe ji gị ịbanye n’Alaeze Chineke.” Ma, e nweghịzi onye obi kara ịjụ ya ajụjụ.+
35 Ma, ka Jizọs na-ezi ihe n’ụlọ nsọ, ọ sịrị: “Gịnị mere ndị odeakwụkwọ ji asị na Kraịst bụ nwa Devid?+ 36 Devid si n’ike mmụọ nsọ+ kwuo, sị: ‘Jehova* gwara Onyenwe m, sị: “Nọdụ ala n’aka nri m ruo mgbe m ga-eme ka ndị iro gị nọrọ n’okpuru ụkwụ gị.”’+ 37 Devid kpọrọ ya Onyenwe ya. Oleezi otú o si bụrụ nwa ya?”+
Ìgwè mmadụ nọ na-ege ya ntị, obi ana-atọ ha ụtọ. 38 Ka ọ nọ na-ezi ihe, ọ sịrị: “Kpacharanụ anya maka ndị odeakwụkwọ, ndị ọ na-amasị iyi uwe mwụda na-agagharị ma na-achọ ka a na-ekele ha n’ọma ahịa.+ 39 Ha na-achọkwa ka ha nọrọ n’oche ihu* n’ụlọ nzukọ nakwa n’isi oche ná nri anyasị.+ 40 Ha na-anara ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ ihe niile ha nwere,* na-ekpekwa ogologo ekpere ka ndị mmadụ hụ ha. Ikpe a ga-ama ha ga-akarị nke ndị ọzọ.”
41 Jizọs nọdụrụ ala chee ihu n’ebe igbe ndị a na-atụnye ego+ dị. O wee malite ile otú ìgwè mmadụ si na-atụnye ego n’igbe ndị ahụ. Ọtụtụ ndị bara ọgaranya nọkwa na-atụnye ọtụtụ mkpụrụ ego.+ 42 Ma, otu nwaanyị di ya nwụrụ nke dara ogbenye bịara tụnye obere mkpụrụ ego abụọ nke ga-azụta ihe dị nnọọ ntakịrị.*+ 43 Jizọs wee kpọọ ndị na-eso ụzọ ya ka ha bịakwute ya, ya asị ha: “N’eziokwu, ana m asị unu na nwaanyị a di ya nwụrụ, bụ́ onye dara ogbenye, tụnyere ihe karịrị ihe ndị niile na-atụnye ego n’igbe ndị ahụ tụnyere.+ 44 N’ihi na ha niile si n’ọtụtụ ihe ha nwere na-atụnye ihe. Ma nwaanyị a tụnyere ihe niile o nwere, n’agbanyeghị na ọ bụ ogbenye ọnụ ntụ.”*+
13 Mgbe o si n’ụlọ nsọ ahụ na-apụ, otu n’ime ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya: “Onye Ozizi, ị̀ hụkwara otú nkume ndị a na ụlọ ndị a si buo ibu ma maa mma?”+ 2 Ma Jizọs sịrị ya: “Ị̀ hụrụ nnukwu ụlọ ndị a? A ga-akwatucha nkume ndị a. E nweghị otu a ga-ahapụ n’elu ibe ya.”+
3 Mgbe ọ nọ ọdụ n’Ugwu Oliv, chee ihu n’ụlọ nsọ ahụ, Pita, Jems, Jọn, na Andru jụrụ ya mgbe naanị ha na ya nọ, sị: 4 “Gwa anyị, olee mgbe ihe ndị a ga-eme? Gịnị ga-abụkwa ihe àmà ga-egosi na ọgwụgwụ ihe ndị a niile eruola?”+ 5 Jizọs malitere ịsị ha: “Lezienụ anya ka onye ọ bụla ghara iduhie unu.+ 6 Ọtụtụ ndị ga-abịa n’aha m, sị, ‘Ọ bụ m bụ ya.’ Ha ga-eduhiekwa ọtụtụ ndị. 7 Mgbe unu na-anụkwa mkpọtụ agha na akụkọ agha, unu atụla ụjọ. Ihe ndị a ga-emerịrị. Ma ọgwụgwụ erubeghị.+
8 “N’ihi na mba ga-alụso mba ọzọ agha, alaeze ga-alụsokwa alaeze ọzọ agha.+ A ga-enwe ala ọma jijiji n’ebe dị iche iche. A ga-enwekwa ụkọ nri.+ Ihe ndị a bụ mmalite ihe mgbu.*+
9 “Ma kpacharanụ anya. Ndị mmadụ ga-akpụpụ unu n’ụlọikpe obodo,+ a ga-etikwa unu ihe n’ụlọ nzukọ.+ A ga-eme ka unu guzoro n’ihu ndị gọvanọ na ndị eze n’ihi m, ka unu si otú ahụ gbaara ha àmà.+ 10 A ga-ebukwa ụzọ kwusaa ozi ọma ná mba niile.+ 11 Mgbe ha kpụ unu na-aga n’ụlọikpe, unu ebula ụzọ na-echegbu onwe unu maka ihe unu ga-ekwu. Kama kwuonụ ihe ọ bụla a ga-agwa unu kwuo n’oge ahụ, n’ihi na ọ bụghị unu na-ekwu, kama ọ bụ mmụọ nsọ na-ekwu.+ 12 Nwanne ga-enyefe nwanne ya n’aka ndị iro ka e gbuo ya, nna ga-enyefekwa nwa ya. Ụmụ ga-emegide nne na nna ha ma mee ka e gbuo ha.+ 13 Mmadụ niile ga-akpọkwa unu asị n’ihi aha m.+ Ma, ọ bụ onye tachiri obi* ruo ọgwụgwụ+ ka a ga-azọpụta.+
14 “Ma mgbe unu hụrụ ihe arụ nke na-akpata mbibi+ ka o guzo n’ebe ọ na-ekwesịghị iguzo (onye na-agụ ya,* ya gbalịa ghọta ya nke ọma), ka ndị nọ na Judia malite ịgbaga n’ugwu.+ 15 Ka onye nọ n’elu ụlọ ghara ịrịdata, ya abanyekwala n’ụlọ ya ka o were ihe ọ bụla. 16 Onye nọ n’ubi, ya alaghachila ka ọ chịrị uwe elu ya. 17 Ụmụ nwaanyị dị ime na ndị ji nwa n’aka n’oge ahụ ga-ata ahụhụ.+ 18 Na-ekpenụ ekpere ka ọ ghara ime n’oge oyi, 19 n’ihi na oge ahụ ga-abụ oge mkpagbu+ nke a na-enwetụbeghị ụdị ya malite mgbe Chineke kere ihe ruo n’oge ahụ, a gaghịkwa enwe ya ọzọ.+ 20 N’eziokwu, ọ bụrụ na Jehova* emeghị ka oge ahụ dị mkpirikpi, e nweghị onye* a ga-azọpụta. Ma n’ihi ndị ọ họọrọ, ọ ga-eme ka oge ahụ dị mkpirikpi.+
21 “Mgbe ahụ, ọ bụrụ na onye ọ bụla asị unu, ‘Lee, Kraịst nọ n’ebe a,’ ma ọ bụ ‘Lee, ọ nọ n’ebe ahụ,’ unu ekwela.+ 22 N’ihi na a ga-enwe Kraịst ụgha dị iche iche na ndị amụma ụgha.+ Ha ga na-arụ ọrụ ebube ma na-eme ihe ịtụnanya dị iche iche iji duhie ndị Chineke họọrọ, ma o kwe ha omume. 23 N’ihi ya, lezienụ anya.+ Agwala m unu ihe niile tupu oge ha ga-eme eruo.
24 “Ma n’ụbọchị ndị ahụ, mgbe mkpagbu ahụ gachara, anyanwụ ga-agba ọchịchịrị, ọnwa agaghịkwa enye ìhè ya.+ 25 Kpakpando ga-esi n’eluigwe na-ada, a ga-emekwa ka ihe* ndị dị n’eluigwe maa jijiji. 26 Mgbe ahụ, ha ga-ahụ Nwa nke mmadụ+ ka ọ na-abịa n’ígwé ojii n’ike na ebube dị ukwuu.+ 27 Mgbe ahụ, ọ ga-ezipụ ndị mmụọ ozi. Ha ga-esikwa n’akụkụ anọ nke ụwa* chịkọta ndị ọ họọrọ, malite na nsọtụ ụwa ruo na nsọtụ eluigwe.+
28 “Sinụ n’osisi fig mụta ihe: Ozugbo alaka ọhụrụ ya dịwara nro ma pupụtawa akwụkwọ, unu na-ama na oge osisi ji amị mkpụrụ eruwela.+ 29 Ma ununwa, mgbe unu hụrụ ka ihe ndị a na-eme, maranụ na Nwa nke mmadụ nọ nso n’ọnụ ụzọ.+ 30 N’eziokwu, ana m asị unu na e nweghị ihe ga-eme ka ọgbọ a nwụchaa ruo mgbe ihe ndị a niile mere.+ 31 Eluigwe na ụwa ga-ala n’iyi.*+ Ma, e nweghị ihe ga-eme ka okwu m laa n’iyi.*+
32 “E nweghị onye ma ụbọchị ma ọ bụ awa ọ ga-abụ. Ndị mmụọ ozi nọ n’eluigwe amaghị, Ọkpara ahụ amaghịkwa, kama naanị Nna m ma.+ 33 Na-elenụ anya, mụrụnụ anya,+ n’ihi na unu amaghị oge ọ ga-abụ.+ 34 Ọ dị ka nwoke jewere mba ọzọ, nke hapụrụ ụlọ ya ma nye ndị ohu ya ikike ka ha lekọtawa ya.+ O nyere onye nke ọ bụla ọrụ ọ ga-arụ, nyekwa onye nche ọnụ ụzọ iwu ka ọ na-eche nche.+ 35 N’ihi ya, na-echenụ nche, n’ihi na unu amaghị mgbe nna nwe ụlọ ga-abịa,+ ma ọ̀ bụ ná mgbede, ma ọ̀ bụ n’etiti abalị, ma ọ̀ bụ tupu chi abọwa,* ma ọ̀ bụ n’ụtụtụ,+ 36 ka ọ ghara ịhụ unu ka unu na-ehi ụra ma ọ bịa na mberede.+ 37 Ma ihe m na-agwa unu ka m na-agwa mmadụ niile: Na-echenụ nche.”+
14 Ọ fọrọ ụbọchị abụọ+ ka e mee Ememme Ngabiga+ na Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko.+ Ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ na-achọkwa otú ha ga-esi jiri aghụghọ jide ya ma gbuo ya.+ 2 Ma ha nọ na-asị: “Ọ bụghị n’oge ememme a maka na ndị mmadụ nwere ike ịkpata ọgba aghara.”
3 Mgbe ọ nọ na-eri nri na Betani, n’ụlọ Saịmọn onye ekpenta, otu nwaanyị ji mkpọ̀ alabasta* nke mmanụ na-esi ísì ọma dị n’ime ya bịa. Mmanụ ahụ bụ ezigbo mmanụ nad,* ọ dịkwa oké ọnụ. Nwaanyị ahụ mepere mkpọ̀ mmanụ ahụ ma malite ịwụsa ya Jizọs n’isi.+ 4 Ụfọdụ ndị wee jiri iwe gwa ibe ha, sị: “Gịnị mere e ji laa mmanụ a na-esi ísì ọma n’iyi? 5 N’ihi na a gaara ere mmanụ a na-esi ísì ọma ihe karịrị narị mkpụrụ ego dinarịọs* atọ (300) ma nye ya ndị ogbenye.” Ha wesara nwaanyị ahụ ezigbo iwe.* 6 Ma Jizọs sịrị: “Hapụnụ ya. Gịnị mere unu ji na-enye ya nsogbu? O meere m ihe ọma.+ 7 N’ihi na unu na ndị ogbenye nọ mgbe niile,+ unu nwekwara ike imere ha ihe ọma mgbe ọ bụla unu chọrọ. Ma mụ na unu agaghị anọ mgbe niile.+ 8 O mere ihe o nwere ike ime. O tere m mmanụ na-esi ísì ọma iji kwadebe m tupu oge a ga-eli m eruo.+ 9 N’eziokwu, ana m asị unu na n’ebe ọ bụla a na-ekwusa ozi ọma n’ụwa niile,+ a ga na-akọ ihe nwaanyị a mere, jiri ya na-echeta ya.”+
10 Judas Iskarịọt, otu n’ime ndịozi iri na abụọ ahụ, wee gakwuru ndị isi nchụàjà ka ha kpaa otú ọ ga-esi rara Jizọs nye n’aka ha.+ 11 Mgbe ha nụrụ ihe Judas kwuru, obi tọrọ ha ụtọ, ha ekwe nkwa inye ya ego ọlaọcha.+ N’ihi ya, ọ malitere ịchọ oge ga-adaba adaba ọ ga-eji rara ya nye.
12 N’ụbọchị mbụ nke Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko,+ mgbe a na-achụ anụ e ji eme Ememme Ngabiga n’àjà,+ ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya: “Olee ebe ị chọrọ ka anyị gaa kwadebe ka ị nọrọ rie nri Ememme Ngabiga?”+ 13 O wee zipụ mmadụ abụọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya, sị ha: “Banyenụ n’ime obodo. Unu ga-ahụ otu nwoke bu udu mmiri. Soronụ ya.+ 14 N’ebe ọ bụla ọ banyere, sịnụ nna nwe ụlọ ahụ, ‘Onye Ozizi sịrị: “Olee ọnụ ụlọ ndị ọbịa ebe mụ na ndị na-eso ụzọ m ga-anọ rie nri Ememme Ngabiga?”’ 15 Ọ ga-egosi unu nnukwu ọnụ ụlọ dị n’elu a kwadebere ma dozie. Kwadeberenụ anyị nri Ememme Ngabiga n’ebe ahụ.” 16 Ndị na-eso ụzọ ya gawara ma banye n’ime obodo ahụ. Ihe niile mekwara otú Jizọs gwara ha. Ha wee kwadebe maka Ememme Ngabiga.
17 Ná mgbede, ya na ndịozi ya iri na abụọ ahụ bịara.+ 18 Mgbe ha nọ na-eri ihe na tebụl, Jizọs sịrị: “N’eziokwu, ana m asị unu na otu onye n’ime unu, onye mụ na ya na-erikọ nri, ga-arara m nye.”+ 19 Ọ malitere iwute ha, ha ana-agwa ya n’otu n’otu, sị: “Ọ bụghị m, ka ọ̀ bụ m?” 20 Ọ sịrị ha: “Ọ bụ otu onye n’ime unu iri na abụọ, onye mụ na ya na-esurukọ achịcha n’efere.+ 21 N’ihi na Nwa nke mmadụ na-ahapụ unu, otú e dere banyere ya. Ma, onye ga-arara Nwa nke mmadụ nye ga-ata ahụhụ.+ Ọ gaara akara onye ahụ mma ma a sị na a mụghị ya amụ.”+
22 Mgbe ha nọ na-eri ihe, o weere otu ogbe achịcha, gọzie ya, nyawaa ya, were ya nye ha, sị: “Naranụ m ya. Nke a pụtara ahụ́ m.”+ 23 O bukwaara iko, kelee Chineke, bunyekwa ha ya. Ha niile wee ṅụọ ihe dị na ya.+ 24 O wee sị ha: “Nke a pụtara ọbara m,+ bụ́ ‘ọbara ọgbụgba ndụ’+ nke a ga-awụpụ n’ihi ọtụtụ mmadụ.+ 25 N’eziokwu, ana m asị unu na agaghị m aṅụ mmanya si ná mkpụrụ vaịn ọzọ ruo ụbọchị ahụ m ga-aṅụ nke ọhụrụ n’Alaeze Chineke.” 26 N’ikpeazụ, mgbe ha bụchara abụ otuto,* ha gawara n’Ugwu Oliv.+
27 Jizọs wee sị ha: “Unu niile ga-ahapụ m,* n’ihi na e dere, sị: ‘M ga-egbu onye ọzụzụ atụrụ,+ atụrụ ya ga-agbasasịkwa.’+ 28 Ma a kpọlitechaa m n’ọnwụ, m ga-ebu unu ụzọ gaa Galili.”+ 29 Ma Pita sịrị ya: “Ọ bụrụgodị na ndị ọzọ niile ahapụ gị,* agaghị m ahapụ gị.”+ 30 Jizọs wee sị ya: “N’eziokwu, ana m asị gị na n’abalị a, tupu oké ọkpa akwaa ugboro abụọ, ị ga-agọnahụ m ugboro atọ taa.”+ 31 Ma ọ nọ na-ekwusi ike, sị: “Ọ bụrụgodị na m ga-eso gị nwụọ, e nweghị ihe ga-eme ka m gọnahụ gị.” Ndị ọzọ malitekwara ikwu otu ihe ahụ.+
32 Ha wee bịa n’ebe a na-akpọ Getsemeni, ya agwa ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Nọdụnụ ala ebe a ka m gaa kpee ekpere.”+ 33 Ọ kpọọrọ Pita, Jems, na Jọn gawa.+ O wee malite ichegbu onwe ya nke ukwuu. 34 Ọ sịrị ha: “Ọ na-ewutesi m ike.*+ Nọrọnụ n’ebe a, na-echenụ nche.”+ 35 Mgbe ọ gatụrụ n’ihu, o gburu ikpere n’ala malite ikpe ekpere ka oge ahụ siri ike ghara ịbịara ya, ma ọ bụrụ na o kwere omume. 36 O wee sị: “Aba,* Nna,+ ihe niile kwere omume n’ebe ị nọ. Ekwela ka m ṅụọ ihe dị n’iko a. Ma ọ bụghị ka e mee ihe m chọrọ, kama ka ihe ị chọrọ mee.”+ 37 Ọ bịaghachiri hụ ka ha na-ehi ụra. O wee sị Pita: “Saịmọn, ị̀ na-ehi ụra? Í nweghị ike ị ga-eji chee nche ruo otu awa?+ 38 Na-echenụ nche, na-ekpekwanụ ekpere mgbe niile, ka a ghara ịnwata unu.+ N’eziokwu, ọ na-agụ mmadụ ime ihe dị mma,* ma anụ ahụ́ adịghị ike.”+ 39 Ọ pụrụ ọzọ gaa kpee ekpere, kwuokwa otu ihe ahụ.+ 40 Ọ bịaghachikwara hụ ka ha na-ehi ụra, n’ihi na ụra ji ha aka ọjọọ. Ha amaghị ihe ha ga-aza ya. 41 O wee bịa nke ugboro atọ, sị ha: “N’ụdị oge dị otú a ka unu na-ehi ụra, na-ezukwa ike. O zuolanụ. Oge eruola.+ Lee, a na-arara Nwa nke mmadụ nye n’aka ndị mmehie. 42 Bilienụ ka anyị pụọ. Lee, onye ga-arara m nye abịala nso.”+
43 Ozugbo ahụ, mgbe ọ ka kpụ okwu n’ọnụ, Judas, otu n’ime ndịozi iri na abụọ ahụ, bịarutere, ya na ìgwè mmadụ ndị ji mma agha na okpiri. Ọ bụ ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ na ndị okenye dunyere ha.+ 44 Onye ga-arara ya nye nyere ha ihe àmà ha na ya kwekọrịtara. Ọ sịrị ha: “Onye ọ bụla m susuru ọnụ, ọ bụ ya. Jidenụ ya. Kpụrụnụ ya pụọ, unu ekwekwala ka ọ gbafuo.” 45 O wee bịarute n’ebe ọ nọ, sị: “Onye Ozizi.”* O wee jiri nwayọọ susuo ya ọnụ. 46 N’ihi ya, ha jidere ya ma kpụrụ ya. 47 Ma, otu n’ime ndị guzo n’akụkụ mịịrị mma agha ya, gbuo ya ohu nnukwu onye nchụàjà, bepụ ya ntị.+ 48 Ma Jizọs sịrị ha: “Ùnu ji mma agha na okpiri bịa ijide m ka à ga-asị na unu bịara ijide onye ohi?+ 49 Mụ na unu na-anọ mgbe m na-ezi ihe n’ụlọ nsọ kwa ụbọchị,+ ma unu ejideghị m. Ma, ihe mere ihe a ji mee bụ ka ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ mezuo.”+
50 Ha* niile hapụrụ ya gbaa ọsọ.+ 51 Ma otu nwa okorobịa nke yi naanị ezigbo uwe elu linin malitere iso ya n’azụ n’ebe na-adịchaghị anya. Ha gbalịrị ijide ya, 52 ma ọ hapụrụ uwe linin ya gbara ahụ́ ọtọ* gbalaga.
53 Ha duuru Jizọs gakwuru nnukwu onye nchụàjà.+ Ndị isi nchụàjà na ndị okenye na ndị odeakwụkwọ niile zukọkwara.+ 54 Ma Pita nọ ebe dị anya na-eso ya n’azụ, ruo na mbara èzí nnukwu onye nchụàjà ahụ. O sokwa ndị na-eje ozi n’ụlọ nọrọ ọdụ na-anya ọkụ n’otu ọkụ na-enwusi ike.+ 55 Ndị isi nchụàjà na ndị ọzọ so ná ndị Sanhedrin* nọ na-achọgharị ebubo ha ga-ebo Jizọs ka ha wee gbuo ya. Ma, e nweghị nke ha hụrụ.+ 56 N’eziokwu, ọtụtụ ndị nọ na-agbagide ya akaebe ụgha,+ ma ihe otu onye na-ekwu adabaghị n’ihe ibe ya na-ekwu. 57 Ụfọdụ ndị na-ebilikwa na-agbagide ya akaebe ụgha, sị: 58 “Anyị nụrụ ka ọ sịrị, ‘M ga-akwatu ụlọ nsọ a e ji aka rụọ. N’ime ụbọchị atọ, m ga-arụ ọzọ nke a na-ejighị aka rụọ.’”+ 59 Ma ihe ndị a ha nọ na-ekwu adabaghị n’ihe ibe ha na-ekwu.
60 Nnukwu onye nchụàjà biliziri guzoro n’ihu ha jụọ Jizọs, sị: “Ị̀ gbara nkịtị? Ị́ nụghị ebubo ndị a na-ebo gị?”+ 61 Ma ọ gbachiri nkịtị, o nweghịkwa ihe ọ bụla ọ zara.+ Nnukwu onye nchụàjà malitere ịjụ ya ọzọ, sị: “Ọ̀ bụ gị bụ Kraịst, Ọkpara nke Onye A Gọziri Agọzi?” 62 Jizọs sịrị: “Ọ bụ m. Unu ga-ahụkwa Nwa nke mmadụ+ ka ọ nọ ọdụ n’aka nri+ Chineke dị ike* ma na-abịa n’ígwé ojii nke eluigwe.”+ 63 Nnukwu onye nchụàjà wee dọwaa uwe ya ma kwuo, sị: “Ànyị ka kwesịrị ịchọwa ndị akaebe?+ 64 Unu nụrụ ka o kwuluru Chineke. Gịnị ka unu kpebiri?”* Ha niile mara ya ikpe, sị na o kwesịrị ọnwụ.+ 65 Ụfọdụ ndị malitere ịgbụ ya asọ mmiri,+ kpuchie ya ihu, suo ya ọkpọ ma sị ya: “Buo amụma.” Ndị na-eje ozi n’ụlọikpe mara ya ụra n’ihu wee kpụrụ ya pụọ.+
66 Mgbe Pita nọ n’ala na mbara èzí, otu n’ime ụmụ agbọghọ ndị na-ejere nnukwu onye nchụàjà ozi bịara.+ 67 Mgbe ọ hụrụ Pita ka ọ na-anya ọkụ, o legidere ya anya, sị: “Gị na onye Nazaret a, bụ́ Jizọs, na-anọ.” 68 Ma ọ gọrọ agọ, sị: “Amaghị m onye ọ bụ, aghọtaghịkwa m ihe ị na-ekwu.” O wee pụọ gaa n’ebe ọnụ ụzọ ámá.* 69 Nwa agbọghọ ahụ na-eje ozi hụrụ ya n’ebe ahụ, malitekwa ịsị ndị guzo n’akụkụ: “Onye a bụ otu n’ime ha.” 70 Ọ gọrọ agọ ọzọ. Mgbe obere oge gachara, ndị guzo n’akụkụ malitere ịgwa Pita ọzọ, sị: “O doro anya na ị bụ otu n’ime ha, n’ihi na n’eziokwu, ị bụ onye Galili.” 71 Ma ọ malitere ịbụ onwe ya ọnụ na ịṅụ iyi, sị: “Amaghị m onye a unu na-ekwu okwu ya.” 72 Ozugbo ahụ, oké ọkpa kwara nke ugboro abụọ.+ Pita wee cheta na Jizọs gwara ya, sị: “Tupu oké ọkpa akwaa ugboro abụọ, ị ga-agọnahụ m ugboro atọ.”+ N’ihi ya, o jidelighị onwe ya. O wee bewe ákwá.
15 Ozugbo o ruru n’isi ụtụtụ, ndị isi nchụàjà na ndị okenye na ndị odeakwụkwọ, ya bụ, ndị Sanhedrin* niile, gbara izu. Ha wee kee Jizọs agbụ, kpụrụ ya pụọ ma nyefee ya n’aka Paịlet.+ 2 Paịlet wee jụọ ya, sị: “Ị̀ bụ Eze ndị Juu?”+ Ọ zara ya, sị: “Ọ bụ gị kwuru ya.”*+ 3 Ma ndị isi nchụàjà nọ na-ebo ya ọtụtụ ebubo. 4 Paịlet malitere ịjụ ya ọzọ, sị: “Ọ̀ bụ na e nweghị ihe ị ga-aza?+ Ị́ naghị anụ ọtụtụ ebubo ha na-ebo gị?”+ 5 Ma e nweghị ihe ọzọ Jizọs zara. O wee ju Paịlet anya.+
6 Mgbe ọ bụla a na-eme Ememme Ngabiga, Paịlet na-ahapụrụ ndị Juu otu onye mkpọrọ ha rịọrọ ka ọ hapụrụ ha.+ 7 N’oge ahụ, e nwere otu nwoke a na-akpọ Barabas. A tụrụ ya na ndị na-emegide ọchịchị mkpọrọ maka na ha gburu mmadụ* mgbe ha na-agba ọchịchị mgba okpuru. 8 Ìgwè mmadụ bịara malite ịrịọ Paịlet ka o meere ha ihe ọ na-emere ha. 9 Ọ sịrị ha: “Ùnu chọrọ ka m hapụrụ unu Eze ndị Juu?”+ 10 N’ihi na Paịlet ma na ọ bụ anyaụfụ mere ndị isi nchụàjà ji nyefee Jizọs n’aka ya.+ 11 Ma ndị isi nchụàjà ahụ mere ka ìgwè mmadụ ahụ mewe aghara ka ọ hapụrụ ha Barabas, kama ịhapụ Jizọs.+ 12 Paịlet gwara ha ọzọ, sị: “Gịnịzi ka m ga-eme onye unu na-akpọ Eze ndị Juu?”+ 13 Ha tiri mkpu ọzọ, sị: “Kwụwa ya n’osisi!”*+ 14 Ma Paịlet gwara ha, sị: “Maka gịnị? Olee ihe ọjọọ o mere?” Ma ha tikwuru mkpu, sị: “Kwụwa ya n’osisi!”*+ 15 Paịlet wee hapụrụ ha Barabas n’ihi na ọ chọrọ ime ihe dị ìgwè mmadụ ahụ mma. Mgbe o mechara ka a pịa Jizọs ụtarị,+ o nyefere ya n’aka ha ka e gbuo ya n’elu osisi.+
16 Ndị agha wee kpụrụ ya banye na mbara èzí, ya bụ, n’ụlọ gọvanọ. Ha kpọkọtakwara ndị agha niile.+ 17 Ha yiwere ya ákwà na-acha pọpụl, jirikwa ogwu kpaa okpueze kpuwe ya n’isi. 18 Ha malitekwara ịsị ya: “Eze ndị Juu, ndeewo!”+ 19 Ha na-akụkwa ya okporo osisi amị n’isi ma na-agbụ ya asọ mmiri. Ha gbukwara ikpere n’ala kpọọrọ ya isiala. 20 N’ikpeazụ, mgbe ha kwachara ya emo, ha yipụrụ ya ákwà pọpụl ahụ ma yiwe ya uwe elu ya. Ha wee kpụrụ ya pụọ ka ha kpọgide ya n’osisi.+ 21 Ha manyekwara otu onye na-agafe agafe aha ya bụ Saịmọn, onye Saịrini, ka o buru osisi ịta ahụhụ* Jizọs.+ O si n’ime ime obodo na-abịa. Ọ bụ nna Alegzanda na Rufọs.
22 Ha wee kpọta Jizọs n’ebe a na-akpọ Gọlgọta, nke pụtara, “Ebe Okpokoro Isi.”+ 23 N’ebe a, ha gbalịrị ka ha nye ya mmanya a gwakọtara ya na mea na-egbu egbu.+ Ma ọ ṅụghị ya. 24 Ha wee kpọgide ya n’osisi. Ha fekwara nza kee uwe elu ya ka ha mara onye ga-achịrị nke ọ ga-achịrị.+ 25 Ọ bụ n’awa nke atọ.* Ha wee kpọgide ya n’osisi. 26 E dere ebubo e boro ya n’osisi ahụ, ya bụ: “Eze ndị Juu.”+ 27 A kpọgidekwara ndị ohi abụọ n’osisi n’akụkụ ya, otu n’aka nri ya, otu n’aka ekpe ya.+ 28 *—— 29 Ndị na-agafe agafe nọ na-akparị ya, na-efufe isi,+ na-asị: “Tụfịa! Gị onye ga-akwatu ụlọ nsọ ma rụghachi ya n’ụbọchị atọ,+ 30 si n’osisi ịta ahụhụ* rịdata ka ị zọpụta onwe gị.” 31 Otú ahụkwa ka ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ nọ na-akwa ya emo, na-asị: “Ọ zọpụtara ndị ọzọ, ma o nweghị ike ịzọpụta onwe ya.+ 32 Ka Kraịst, Eze Izrel, si n’osisi ịta ahụhụ* rịdata ugbu a, ka anyị hụ ma kwere.”+ Ndị ahụ a kpọgidere n’osisi n’akụkụ ya nọkwa na-akparị ya.+
33 Mgbe o ruru awa nke isii,* ọchịchịrị gbara n’ala ahụ niile ruo n’awa nke itoolu.*+ 34 N’awa nke itoolu, Jizọs tiri mkpu n’oké olu, sị: “Eli, Eli, lama sabaktani?” nke pụtara: “Chineke m, Chineke m, gịnị mere i ji hapụ m?”+ 35 Mgbe ụfọdụ n’ime ndị guzo nso nụrụ ya, ha malitere ịsị: “Lee, ọ na-akpọ Ịlaịja.” 36 Otu onye wee gbara ọsọ mikpuo ogbo n’ime mmanya gbara ụka, dokwasị ya n’okporo osisi amị. O nyere ya Jizọs ka ọ ṅụọ+ ma sị: “Hapụnụ ya! Ka anyị hụ ma Ịlaịja ọ̀ ga-abịa kpọdata ya.” 37 Ma Jizọs tiri ezigbo mkpu wee nwụọ.*+ 38 Ákwà mgbochi* nke dị n’ụlọ nsọ+ dọwakwara ụzọ abụọ si n’elu ruo n’ala.+ 39 E nwere otu onyeisi ndị agha nke guzo chee Jizọs ihu. Mgbe ọ hụrụ ka ihe ndị a mere mgbe Jizọs nwụrụ, ọ sịrị: “N’eziokwu, nwoke a bụ Ọkpara Chineke.”+
40 E nwekwara ụmụ nwaanyị ndị nọ n’ebe dịtụ anya na-ele ihe na-emenụ. Ụfọdụ n’ime ha bụ Meri Magdalin, Meri nne Jems nke Nta na Josis, nakwa Salomi.+ 41 Ha na-eso Jizọs ma na-ejere ya ozi+ mgbe ọ nọ na Galili. E nwekwara ọtụtụ ụmụ nwaanyị ndị ọzọ nọ n’ebe ahụ bụ́ ndị ya na ha so gbagote Jeruselem.
42 Mgbe o ruwere mgbede, ebe ọ bụ ụbọchị e ji akwadebe maka Ụbọchị Izu Ike, ya bụ, ụbọchị ga-abọta Ụbọchị Izu Ike, 43 Josef onye Arimatia bịara. O so ná ndị a na-akwanyere ùgwù n’ụlọikpe kacha elu nke ndị Juu.* Ọ nọkwa na-eche ka Alaeze Chineke bịa. Ọ katara obi gakwuru Paịlet ma rịọ ya ka e bunye ya ozu Jizọs.+ 44 Ma Paịlet chọrọ ịma ma Jizọs ọ̀ nwụọla, ya akpọọ onyeisi ndị agha ahụ, jụọ ya ma ọ̀ nwụọla. 45 Mgbe ọ chọpụtara n’aka onyeisi ndị agha ahụ na Jizọs anwụọla, o nyere Josef ikike ka o buru ozu ya. 46 Mgbe Josef zụtachara ezigbo ákwà linin ma budata ozu Jizọs, o ji ezigbo ákwà linin ahụ fụchie ya ma lie ya n’ili*+ e gwuru n’oké nkume. O wee kwara otu nkume kwachie ọnụ ili ahụ.+ 47 Ma Meri Magdalin na Meri nne Josis nọ na-ele anya n’ebe ahụ e liri ya.+
16 Mgbe Ụbọchị Izu Ike+ gachara, Meri Magdalin, Meri+ nne Jems, na Salomi zụrụ ihe na-esi ísì ọma ka ha gaa tee ozu Jizọs.+ 2 N’isi ụtụtụ, n’ụbọchị mbụ n’izu, mgbe anyanwụ warala, ha bịara n’ili* ahụ.+ 3 Ha nọ na-agwa ibe ha, sị: “Ònye ga-akwapụrụ anyị nkume n’ọnụ ili a?” 4 Ma mgbe ha leliri anya, ha hụrụ na a kwapụla nkume ahụ, n’agbanyeghị na o buru nnukwu ibu.+ 5 Mgbe ha banyere n’ili ahụ, ha hụrụ nwa okorobịa yi uwe mwụda ọcha ka ọ nọ ọdụ n’akụkụ aka nri. O wee ju ha anya. 6 Ọ sịrị ha: “Ya ejula unu anya.+ Unu na-achọ Jizọs onye Nazaret, onye e gburu n’elu osisi. A kpọlitela ya.+ Ọ nọghị ebe a. Lee, ọ bụ n’ebe a ka e liri ya.+ 7 Ma gaanụ kọọrọ ndị na-eso ụzọ ya nakwa Pita, sị, ‘O burula unu ụzọ gawa Galili.+ Unu ga-ahụ ya ebe ahụ, dị ka ọ gwara unu.’”+ 8 Mgbe ha si n’ili ahụ pụta, ha gbalagara. Ahụ́ nọ na-ama ha jijiji, ihe merenụ rikwara ha ọnụ. O nweghị onye ha gwara ihe ọ bụla n’ihi na egwu ji ha.*+
Na Grik, “na-ezipụ onye ozi m n’ihu gị.”
Gụọ Malakaị 3:1. Ọ bụ ebe e dere ahịrịokwu a dị n’akara ngebichi.
Gụọ A5.
Ma ọ bụ “na-emikpu ha.”
Ọ bụ ọdọ mmiri. Baịbụl kpọkwara ya Ọdọ Mmiri Genesaret na Oké Osimiri Taịbirias.
Na Grik, “mmụọ na-adịghị ọcha.”
Na Grik, “mmụọ ahụ na-adịghị ọcha.”
Na Grik, “mmụọ na-adịghị ọcha.”
O nwere ike ịbụ, “ha ma onye ọ bụ.”
Ma ọ bụ “ihe ndina.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Na Grik, “mmụọ na-adịghị ọcha.”
Bielzebọb bụ aha a na-akpọ Setan.
Na Grik, “Mmụọ na-adịghị ọcha.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “mpanaka; oriọna.”
Ma ọ bụ “nkata e ji atụ̀ ihe.”
Ma ọ bụ “ihe ndina.”
Ma ọ bụ “ihe e ji adọsa oriọna.”
Ma ọ bụ “obi ji na-amapụ unu?”
Na Grik, “mmụọ na-adịghị ọcha.”
Ma ọ bụ “n’ili ncheta.”
Na Grik, “mmụọ na-adịghị ọcha.”
Na Grik, “mmụọ na-adịghị ọcha.”
Gụọ A5.
Ma ọ bụ “Obodo Nwere Obodo Nta Iri.”
Ma ọ bụ “Obere nwa m nwaanyị nọ n’ọnụ ọnwụ.”
Ma ọ bụ “O nweela ọtụtụ ihe mgbu.”
Ma ọ bụ “Kwụsị ịtụ ụjọ.”
Ma ọ bụ “o nyesiri ha iwu ike.”
Na Grik, “mmụọ na-adịghị ọcha.”
Na Grik, “ego ọla kọpa.”
Ma ọ bụ “ka ha ghara ịchịrị uwe ọzọ.”
Ma ọ bụ “n’ili ncheta.”
Gụọ B14.
Ya bụ, malite n’ihe dị ka elekere atọ n’ime abalị ruo mgbe anyanwụ wara n’ihe dị ka elekere isii n’ụtụtụ.
Ya bụ, aka a na-akwọghị otú omenala ndị Juu kwuru.
Na Grik, “ime iko, udu, na arịa ndị e ji ọla kọpa kpụọ baptizim.”
Ma ọ bụ “akọ.”
Ma ọ bụ “onye kparịrị nne ya ma ọ bụ nna ya.”
Gụọ A3.
Grik, por·nei′a. Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “igbu ọchụ.”
Ma ọ bụ “ime ihe ọjọọ n’emeghị ihere.” Grik, a·sel′gei·a. Gụọ Nkọwa Okwu.
Na Grik, “mmụọ na-adịghị ọcha.”
Ma ọ bụ “onye a mụrụ n’obodo Finishia dị na Siria.”
Ma ọ bụ “n’ihe ndina.”
Ma ọ bụ “Obodo Nwere Obodo Nta Iri.”
Ya bụ, mgbe Jizọs nọ na Dikapọlis.
Na Grik, “ka o bikwasị ya aka.”
Na Grik, “Ọ sụrụ ude na mmụọ ya.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Na Grik, “ọgbọ a na-akwa iko.”
Ma ọ bụ “Rabaị.” Gụọ Nkọwa Okwu.
O nwere ike ịbụ, “Ha agwaghị onye ọ bụla ihe a.”
Na Grik, “mmụọ ahụ na-adịghị ọcha.”
Na Grik, “ma ụbọchị atọ gachaa.”
Na Grik, “nwere okwukwe daa.”
Na Grik, “na-eme ka ị daa.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Gụọ A3.
Na Grik, “na-eme ka ị daa.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Gụọ A3.
Na Grik, “na-eme ka ị daa.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “Egbula ọchụ.”
Na Grik, “ma hụ ya n’anya.”
O nwere ike ịbụ, “ha asị ibe ha.”
Ma ọ bụ “n’oge na-abịa abịa.” Gụọ Nkọwa Okwu, “Oge a.”
Na Grik, “n’ebube.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Rabonaị pụtara “Onye Ozizi.”
Ma ọ bụ “Rabaị.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Gụọ A3.
Gụọ A5.
Gụọ B14.
Ma ọ bụ “nke kachanụ.”
Gụọ A5.
Gụọ A5.
Gụọ Nkọwa Okwu.
Gụọ A5.
Gụọ A5.
Ma ọ bụ “n’oche kacha mma.”
Na Grik, “na-eripịa ụlọ ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ.”
Na Grik, “mkpụrụ ego leptọn abụọ, nke bụ́ mkpụrụ ego kwọdrans.” Gụọ B14.
Ma ọ bụ “ọ dara ụkpa.”
Ya bụ, ụdị ihe mgbu nwaanyị na-enwe ma ọ mụwa nwa.
Ma ọ bụ “onye na-atachi obi.”
Ya bụ, amụma Daniel buru.
Gụọ A5.
Na Grik, “anụ ahụ́.”
Na Grik, “ike.”
Na Grik, “ifufe anọ.”
O nwere ike ịbụ ndị na-achị achị na ndị ha na-achị n’ụwa ọjọọ a ka a na-ekwu maka ha.
Ma ọ bụ “ghara imezu.”
Na Grik, “mgbe oké ọkpa ji akwa.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Gụọ Nkọwa Okwu.
Gụọ B14.
Ma ọ bụ “Ha ji iwe gwa ya okwu; Ha baara ya mba.”
Ma ọ bụ “abụ ọma.”
Na Grik, “ga-ada.”
Na Grik, “adaa.”
Na Grik, “Ọ na-ewute mkpụrụ obi m nke ukwuu, ọbụna ruo ọnwụ.”
Aba bụ okwu Hibru ma ọ bụ Arameik. Ọ pụtara “Nna!”
Na Grik, “mmụọ dị njikere.”
Ma ọ bụ “Rabaị.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Ya bụ, ndị na-eso ụzọ Jizọs.
Ma ọ bụ “n’enweghị ezigbo ihe o yi; yiri naanị ihe o yi n’úkwù.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Na Grik, “n’aka nri nke ike.”
Ma ọ bụ “Gịnị ka unu chere?”
Ma ọ bụ “n’ebe e si abata na mbara èzí.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Ihe a bụ akpaala okwu ndị Juu nke na-egosi na mmadụ kwetara ihe e kwuru.
Ma ọ bụ “gburu ọchụ.”
Ma ọ bụ “Gbuo ya n’elu osisi!”
Ma ọ bụ “Gbuo ya n’elu osisi!”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Ya bụ, ihe dị ka n’elekere itoolu nke ụtụtụ.
Gụọ A3.
Gụọ Nkọwa Okwu.
Gụọ Nkọwa Okwu.
Ya bụ, ihe dị ka n’elekere iri na abụọ nke ehihie.
Ya bụ, ihe dị ka n’elekere atọ nke ehihie.
Ma ọ bụ “kubie ume.”
Ákwà mgbochi a dị n’agbata Ebe Kacha Nsọ na Ebe Nsọ.
Ma ọ bụ “na Sanhedrin.”
Ma ọ bụ “n’ili ncheta.”
Ma ọ bụ “n’ili ncheta.”
Akwụkwọ Nsọ ndị e ji aka dee n’oge ochie, bụ́ ndị kwuru ihe e ji n’aka, gosiri na Ozi Ọma Mak kwụsịrị n’ihe e dere n’amaokwu nke 8. Gụọ A3.