Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • nwt Ndị Rom 1:1-16:27
  • Ndị Rom

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị Rom
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Ndị Rom

AKWỤKWỌ OZI E DEGAARA NDỊ ROM

1 Abụ m Pọl, ohu Kraịst Jizọs. A kpọrọ m ka m bụrụ onyeozi, a họpụtakwara m ka m kwusaa ozi ọma Chineke.+ 2 Chineke si n’ọnụ ndị amụma ya kwe nkwa ozi ọma a n’Akwụkwọ Nsọ n’oge dị anya gara aga. 3 Ozi ọma a bụ banyere Ọkpara ya, onye a mụrụ n’ụwa n’ezinụlọ Devid.*+ 4 Ma e si n’ike mmụọ nsọ mee ka a mara na ọ bụ Ọkpara Chineke+ mgbe a kpọlitere ya n’ọnwụ.+ Ọ bụ ya bụ Jizọs Kraịst Onyenwe anyị. 5 Anyị si n’aka ya nweta amara na ọrụ ịbụ ndịozi,+ ka anyị wee kpọọ ndị mba ọzọ niile ka ha nwee okwukwe ma na-erube isi+ ka e wee too aha Jizọs. 6 Unu so ná mba ndị ahụ, Chineke kpọkwara unu ka unu bụrụ nke Jizọs Kraịst. 7 Ana m edetara unu niile nọ na Rom akwụkwọ ozi, unu ndị Chineke hụrụ n’anya, ndị a kpọrọ ịbụ ndị nsọ:

Ka Chineke Nna anyị na Onyenwe anyị Jizọs Kraịst meere unu amara, meekwa ka udo dịrị unu.

8 M si n’aka Jizọs Kraịst na-ekelegodị Chineke m maka unu niile, n’ihi na a na-ekwu banyere okwukwe unu n’ụwa niile. 9 Chineke, onye m ji obi m niile na-efe ma na-ekwusa ozi ọma banyere Ọkpara ya, bụ onye akaebe m na m na-echeta unu mgbe niile n’ekpere m.+ 10 Ana m arịọ na ọ bụrụ na ọ ga-ekwe omume, ọ bụrụkwa na ọ bụ uche Chineke, ka m mechaa bịakwute unu. 11 N’ihi na ọ na-agụsi m agụụ ike ịhụ unu, ka m nye unu onyinye si n’aka Chineke ka unu wee guzosie ike, 12 ma ọ bụ, e kwuo ya otú ọzọ, ka unu jiri okwukwe unu gbaa m ume,+ mụnwa ejirikwa okwukwe nke m gbaa unu ume.

13 Ma ụmụnna m, achọrọ m ka unu mara na ọtụtụ mgbe, m chọrọ ịbịakwute unu ka ozi ọma m ziri unu mịa ezigbo mkpụrụ otú ọ na-amị ná mba ndị ọzọ. Ma mgbe ọ bụla m chọrọ ịbịa, a na-enwe ihe na-egbochi m. 14 Eji m ndị niile ụgwọ, ma ndị Grik ma ndị ala ọzọ, ma ndị ma ihe ma ndị na-amaghị ihe. 15 N’ihi ya, ọ na-agụsi m agụụ ike izisakwara unu ndị bi na Rom ozi ọma.+ 16 N’ihi na ihere ozi ọma ahụ anaghị eme m.+ N’eziokwu, ọ bụ ike Chineke ji azọpụta ndị niile nwere okwukwe.+ O bu ụzọ ruo ndị Juu aka,+ mechazie ruo ndị Grik.+ 17 Ndị nwere okwukwe na-esi n’ozi ọma ahụ amata ezi omume Chineke, ọ na-emekwa ka ha na-enwekwu okwukwe+ otú e dere ya, sị: “Ma onye ezi omume ga-adị ndụ maka na o nwere okwukwe.”+

18 Chineke si n’eluigwe eme ka a mata iwe ọ na-ewesa+ ndị niile na-anaghị asọpụrụ ya na ndị ajọ omume niile, ndị na-eme ihe ndị na-adịghị mma ka ndị mmadụ wee ghara ịmata eziokwu ahụ.+ 19 Ha kwesịrị ịma banyere Chineke maka na Chineke emeela ka ọtụtụ ihe doo ha anya.+ 20 N’ihi na e leruo otú e si kee ụwa anya, a na-ahụ àgwà ya ndị a na-anaghị ahụ anya. Ihe ndị o kere na-eme ka a ghọta ụdị onye ọ bụ.+ Ha na-eme ka a mata na ike ya na-adịru ebighị ebi+ nakwa na ọ bụ Chineke.+ Ndị na-eleghara ihe ndị a anya enweghị ihe mere ha ga-eji kwuo na Chineke adịghị. 21 N’agbanyeghị na ha ma Chineke, ha etoghị ya otú e kwesịrị ito Chineke, ha ekeleghịkwa ya, kama ha chewere echiche ka ndị na-anaghị aghọta ihe, obi ha nke kpọchiri akpọchi gbakwara ọchịchịrị.+ 22 Ọ bụ eziokwu na ha na-ekwu na ha ma ihe, ha ghọrọ ndị nzuzu 23 ma were otuto ha kwesịrị inye Chineke onye na-anaghị anwụ anwụ na-enye arụsị ndị yiri mmadụ na-anwụ anwụ, ndị yikwara nnụnụ, na anụ ndị nwere ụkwụ anọ, nakwa ihe ndị na-arị arị.*+

24 N’ihi ya, ebe ọ bụ na ha chọrọ ime ihe dị ha n’obi, Chineke hapụrụ ha ka ha mewe omume rụrụ arụ, ka ha wee merụọ onwe ha. 25 Ha ji eziokwu nke Chineke gbanwere okwu ụgha, na-efe ihe e kere eke, na-ejekwara ya ozi dị nsọ kama ijere Onye kere ihe niile ozi, onye a na-enye otuto ruo mgbe ebighị ebi. Amen. 26 Ọ bụ ya mere Chineke ji hapụ ha ka agụụ mmekọahụ na-eme ihere na-agụ ha.+ Ụmụ nwaanyị ha hapụrụ mmekọahụ nwoke na nwaanyị, ha na ụmụ nwaanyị ibe ha ana-enwezi mmekọahụ.+ 27 Ụmụ nwoke hapụkwara mmekọahụ nwoke na nwaanyị, ahụ́ wee na-ere ha ọkụ ka ha na ụmụ nwoke ibe ha na-enwe mmekọahụ.+ Ụmụ nwoke na ụmụ nwoke wee na-eme ihe rụrụ arụ ma na-enweta ụgwọ ọrụ zuru ezu kwesịrị mmehie ha.+

28 Ebe ọ bụ na ha achọghị ịmata Chineke nke ọma, Chineke hapụrụ ha ka ha na-eche echiche na-adịghị mma, ka ha na-eme ihe na-ekwesịghị ekwesị.+ 29 Ihe jukwara ha n’obi bụ omume niile na-ezighị ezi,+ ajọ omume, anyaukwu,+ ihe ọjọọ, na anyaụfụ.+ Ha na-egbukwa mmadụ,*+ na-ese okwu, na-aghọ aghụghọ,+ na-ebu iwe n’obi.+ Ha bụkwa ndị asịrị, 30 ndị na-ekwu okwu azụ,+ ndị kpọrọ Chineke asị, ndị na-akparị mmadụ, ndị mpako, ndị na-anya isi, ndị na-echepụta ihe ọjọọ, ndị na-enupụrụ ndị mụrụ ha isi,+ 31 ndị na-anaghị aghọta ihe,+ ndị na-anaghị emezu nkwa ha, ndị na-enweghị obi mmadụ, na ndị na-anaghị eme ebere. 32 Ha ma nke ọma na iwu ziri ezi Chineke nyere kwuru na ndị na-eme ihe ndị ahụ kwesịrị ọnwụ,+ ma ọ bụghị naanị na ha na-eme ha, kama ha na-akwado ndị na-eme ha.

2 N’ihi ya, onye ọ sọkwara gị bụrụ, e nweghị otú ị ga-esi ekwu na aka gị dị ọcha+ ma ọ bụrụ na ị na-ekpe mmadụ ikpe. N’ihi na mgbe ị na-ekpe onye ọzọ ikpe, ị na-ama onwe gị ikpe maka na ị na-emekwa ihe onye ị na-ekpe ikpe na-eme.+ 2 Ma anyị ma na Chineke na-ama ndị na-eme ihe ndị ahụ ikpe, ikpe ọ na-ekpe zikwara ezi.*

3 Ma ì chere na ị ga-agbanahụ ikpe Chineke ebe ọ bụ na ị na-ekpe ndị na-eme ihe ndị ahụ ikpe ma na-emekwa ihe ndị ha na-eme? 4 Ka ị̀ na-eleda obiọma Chineke+ na ntachi obi ya+ na ndidi ya+ dị ukwuu anya maka na ị maghị na ọ na-achọ inyere gị aka ka i chegharịa maka na ọ dị obiọma?+ 5 Ma ebe ọ bụ na ị na-eme isi ike ma jụ ichegharị, ihe a ị na-eme ga-eme ka Chineke wesa gị iwe n’ụbọchị iwe ya nakwa n’ụbọchị ọ ga-eme ka a mata ikpe ya ziri ezi.+ 6 Ọ ga-akwụkwa onye ọ bụla ụgwọ ọrụ ya.+ 7 Ọ ga-enye ndị tachiri obi na-arụ ọrụ dị mma ndụ ebighị ebi, ya bụ, ndị na-achọ ebube na nsọpụrụ na ahụ́ na-agaghị ere ure.+ 8 Ma ọnụma ya na iwe ya ga-abịara ndị na-ese okwu na ndị na-enupụrụ eziokwu isi ma na-erubere ajọ omume isi.+ 9 Mkpagbu na ahụhụ ga-abịara onye* ọ bụla nke na-eme ihe ọjọọ. Ọ ga-ebu ụzọ bịara onye Juu, bịakwara onye Grik. 10 Ma onye ọ bụla nke na-eme ihe dị mma ga-enweta ebube na nsọpụrụ na udo. Onye Juu ga-ebu ụzọ enweta,+ onye Grik enwetakwa.+ 11 N’ihi na Chineke anaghị ele mmadụ anya n’ihu.+

12 Ndị niile mehiere mgbe a na-enweghị iwu ga-anwụ n’agbanyeghị na e nweghị iwu.+ Ma ndị niile mehiere n’agbanyeghị na e nwere iwu, a ga-eji ihe e dere n’iwu kpee ha ikpe.+ 13 N’ihi na ọ bụghị ndị na-anụ ihe e dere n’iwu bụ ndị ezi omume n’anya Chineke, kama ọ bụ ndị na-eme ihe e dere n’iwu ka a ga-akpọ ndị ezi omume.+ 14 N’ihi na mgbe ndị mba ọzọ, ndị na-enweghị iwu,+ ji aka ha na-eme ihe e kwuru n’iwu, ha bụụrụ onwe ha iwu n’agbanyeghị na ha enweghị iwu. 15 Ọ bụ ha na-egosi na e dere iwu ahụ n’obi ha, akọnuche ha sokwa ha na-agba àmà. Echiche ha na-agwa ha mgbe ha mere ihe na-adịghị mma na mgbe ha mere ihe dị mma. 16 Ihe a ga-eme mgbe Chineke ga-esi n’aka Jizọs Kraịst kpee ụmụ mmadụ ikpe maka ihe ndị ha zoro ezo.+ N’eziokwu, ọ ga-eme otú m na-ezisa ya n’ozi ọma.

17 Ma gị onye sịrị na ị bụ onye Juu,+ ị tụkwasịrị iwu obi, jirikwa Chineke na-anya isi. 18 Ị ma uche ya, na-aghọtakwa ihe ndị dị ezigbo mma n’ihi na a kụziiri gị Iwu ahụ.*+ 19 Obi sikwara gị ike na ị na-ezi ndị kpuru ìsì ụzọ, na ị bụụrụ ndị nọ n’ọchịchịrị ìhè, 20 na ị na-akụziri ndị na-enweghị ezi uche ihe, na-ezi ụmụaka ihe, marakwa ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ na eziokwu ndị dị n’Iwu ahụ.* 21 Ma, gị onye na-akụziri onye ọzọ ihe, ị̀ na-akụzikwara onwe gị?+ Gị onye na-ezisa, sị, “Ezula ohi,”+ ị̀ na-ezu ohi? 22 Gị onye na-asị, “Akwala iko,”+ ị̀ na-akwa iko? Gị onye na-asọ arụsị oyi, ị̀ na-ezu ihe dị n’ụlọ arụsị? 23 Gị onye ji iwu anya isi, ị̀ na-ada Iwu ahụ,* si otú ahụ na-eleda Chineke anya? 24 N’ihi na “ndị mba ọzọ na-ekwulu aha Chineke n’ihi unu,” otú e dere na ha ga-eme.+

25 N’eziokwu, ibi úgwù+ bara uru naanị ma ọ bụrụ na ị na-eme ihe e kwuru n’iwu.+ Ma ọ bụrụ na ị na-ada iwu, ị bụzi onye a na-ebighị úgwù n’agbanyeghị na e biri gị úgwù. 26 N’ihi ya, ọ bụrụ na onye a na-ebighị úgwù+ na-eme ihe ndị Chineke kwuru e dere n’Iwu ahụ,* ọ̀ bụ na a gaghị ewere onye ahụ a na-ebighị úgwù ka onye e biri úgwù?+ 27 Onye a na-ebighị úgwù n’ahụ́ nke na-eme ihe e kwuru n’Iwu ahụ* ga-ekpe gị ikpe ebe ọ bụ na e biri gị úgwù n’ahụ́, nyekwa gị iwu ahụ e dere ede, ma ị naghị edebe ya. 28 N’ihi na ọ bụghị onye bụ́ onye Juu n’ahụ́ bụ onye Juu,+ ọ bụghịkwa úgwù e biri n’ahụ́ bụ ibi úgwù.+ 29 Kama, ọ bụ onye bụ́ onye Juu n’obi bụ onye Juu,+ úgwù e biri ya bụkwa n’obi.+ E si na mmụọ nsọ bie ya úgwù, e sighị n’iwu e dere ede.+ Ọ bụ Chineke na-aja onye ahụ mma, ọ bụghị mmadụ.+

3 Oleezi ihe onye Juu ji ka ndị ọzọ mma? Ma ọ bụ, olee uru ibi úgwù bara? 2 Ha dị ọtụtụ. Nke mbụ bụ na ọ bụ ha ka e nyefere okwu dị nsọ nke Chineke.+ 3 Gịnịzi ka a ga-ekwu gbasara ụfọdụ ndị Juu na-enweghị okwukwe? Okwukwe ha na-enweghị ọ̀ na-egosi na a gaghịzi atụkwasịli Chineke obi? 4 Mbanụ! Kama ka Chineke bụrụ onye eziokwu,+ ọ bụrụgodị na mmadụ niile bụ ndị ụgha,+ otú e dere ya, sị: “Ka okwu gị wee gosi na ị bụ onye ezi omume, ka i gosikwa na ihe ha na-ebo gị abụghị eziokwu.”+ 5 Ma, ọ bụrụ na ajọ omume ndị anyị na-eme na-eme ka a mata na Chineke bụ onye ezi omume, gịnịzi ka anyị ga-ekwu? Ọ̀ pụtara na Chineke na-ekpe ikpe na-ezighị ezi ma o wesa anyị iwe? (Ana m ekwu otú mmadụ si ekwu.) 6 Mbanụ! Ọ bụrụ na Chineke na-ekpe ikpe na-ezighị ezi, oleezi otú ọ ga-esi kpee ụwa ikpe?+

7 Ma ọ bụrụ na m ghara ụgha, ụgha m emee ka a matakwuo na Chineke na-ekwu eziokwu, e wee nye ya otuto, gịnịzi mere e ji ama m ikpe na m bụ onye mmehie? 8 Gịnị mere na anyị agaghị ekwu ihe ahụ ụfọdụ ndị sịrị na anyị na-ekwu, ya bụ, “Ka anyị mewe ihe ọjọọ ka ihe ọma wee bịa”? Ikpe a mara ndị ahụ ziri ezi.+

9 Ànyị kwesịziri iche na anyị ka ndị ọzọ mma? Mbanụ! N’ihi na anyị ekwuola na ndị Juu na ndị Grik bụcha ndị mmehie,+ 10 otú e dere ya, sị: “E nweghị onye bụ́ onye ezi omume, e nweghịdị otu onye.+ 11 E nweghị onye ọ bụla na-aghọta ihe. E nweghị onye na-achọ Chineke. 12 Mmadụ niile akwụsịla ime ihe dị mma. Ha niile bụzi ndị na-abaghị uru. E nweghị onye dị obiọma, e nweghịdị otu onye.”+ 13 “Ọnụ* ha dị ka ili ghe oghe. Ha ejirila ire ha ghọọ aghụghọ.”+ “Okwu ọjọọ ndị na-esi ha n’ọnụ apụta dị ka elò agwọ.”+ 14 “Ha na-abụ ndị mmadụ ọnụ mgbe niile, na-ekwukwa okwu ọjọọ.”+ 15 “Ha* na-eme ngwa ngwa aga egbu mmadụ.”*+ 16 “Ha na-emebisị ihe ndị mmadụ ma na-echi ha ọnụ n’ala, 17 ha amaghịkwa otú ha na ndị ọzọ ga-esi na-adị n’udo.”+ 18 “Ha anaghị atụ egwu Chineke.”+

19 Anyị ma na ọ bụ ndị e nyere Iwu ahụ* ka a gwara ihe niile dị n’Iwu ahụ,* ka e wee mechie ọnụ niile, ka Chineke wee maa ụwa niile ikpe.+ 20 N’ihi ya, e nweghị onye* a ga-akpọ onye ezi omume n’ihu ya maka na ọ na-eme ihe e kwuru n’iwu,+ n’ihi na ọ bụ iwu na-eme ka anyị mata ihe bụ́ mmehie.+

21 Ma ugbu a, o doola anya na mmadụ ga-abụli onye ezi omume n’anya Chineke ma ọ bụrụ na ọ naghị eme ihe e kwuru n’iwu.+ Ọ bụ ihe Iwu Mosis na Akwụkwọ Ndị Amụma* gbara àmà ya.+ 22 N’eziokwu, ndị niile nwere okwukwe ga-abụli ndị ezi omume n’anya Chineke n’ihi okwukwe ha nwere na Jizọs Kraịst maka na e nweghị ihe dị iche n’otu onye na ibe ya.+ 23 N’ihi na mmadụ niile emehiela, ha anaghịkwa akpa àgwà na-eme ka ebube Chineke pụta ìhè.+ 24 Ọ bụ amara ya,+ bụ́ onyinye o nyere n’efu,+ mere e ji akpọ ha ndị ezi omume n’ihi ihe mgbapụta Kraịst Jizọs kwụrụ ụgwọ ya nke e ji zọpụta ha.+ 25 Chineke wepụtara ya ka ọ bụrụ àjà nke ga-eme ka ya na ụmụ mmadụ dịrị n’udo+ ma ha nwee okwukwe n’ọbara ya.*+ Chineke mere ihe a iji gosi na ya bụ onye ezi omume n’ihi na ntachi obi* ya mere ka ọ na-agbaghara mmehie ndị e mere n’oge gara aga. 26 O ji ya gosi na ya bụ onye ezi omume+ n’oge a, ka o wee bụrụkwa onye ezi omume mgbe ọ na-akpọ onye nwere okwukwe na Jizọs onye ezi omume.+

27 È nweziri ihe mere anyị ga-eji na-anya isi? Mba, e nweghị. Olee iwu nke mere na anyị agaghị anya isi? Ọ̀ bụ nke kwuru ka mmadụ na-eme ihe e dere n’iwu?+ Mbanụ! Kama ọ bụ iwu nke kwuru ka mmadụ nwee okwukwe. 28 N’ihi na anyị ma na a na-akpọ mmadụ onye ezi omume n’ihi okwukwe o nwere, ọ bụghị maka na ọ na-eme ihe e kwuru n’iwu.+ 29 Ka Chineke ọ̀ bụ naanị Chineke ndị Juu?+ Ọ́ bụghịkwa Chineke ndị mba ọzọ?+ N’eziokwu, ọ bụkwa Chineke ndị mba ọzọ.+ 30 Ebe ọ bụ na Chineke bụ otu,+ ọ ga-akpọ ndị e biri úgwù ndị ezi omume+ n’ihi okwukwe ha, kpọọkwa ndị a na-ebighị úgwù ndị ezi omume+ n’ihi okwukwe ha. 31 Ànyị ga-atụfuzi iwu maka na anyị nwere okwukwe? Mbanụ! Kama nke ahụ, anyị na-akwado iwu.+

4 Ebe ọ dị otú ahụ, oleezi uru anyị ga-asị na Ebreham, nna nna anyị, onye anyị si n’agbụrụ ya, ritere? 2 Dị ka ihe atụ, a sị na ọ bụ ọrụ Ebreham rụrụ mere e ji kpọọ ya onye ezi omume, ọ gaara enwe ihe ọ ga-eji na-anya isi, ma ọ gaghị anya isi n’ihu Chineke. 3 Gịnị ka ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ kwuru? O kwuru, sị: “Ebreham nwere okwukwe na Jehova,* e jiri maka ya kpọọ ya onye ezi omume.”+ 4 A naghị ewere ụgwọ a ga-akwụ onye rụrụ ọrụ ka imere ya amara, kama a na-ewere ya ka ụgwọ e ji ya eji. 5 Ma ọ bụrụ na mmadụ anaghị arụ ọrụ, ma ya enwee okwukwe n’Onye na-akpọ onye ajọ omume onye ezi omume, a ga-akpọ onye ahụ onye ezi omume n’ihi okwukwe ya.+ 6 Devid kwukwara banyere ụdị obi ụtọ onye Chineke kpọrọ onye ezi omume na-enwe n’agbanyeghị na ọ bụghị ọrụ ọ rụrụ mere e ji kpọọ ya onye ezi omume. Ọ sịrị: 7 “Ndị a gbaghaara ihe ọjọọ ha mere na ndị e kpuchiri* mmehie ha na-enwe obi ụtọ. 8 Onye Jehova* na-agaghị agụkọrọ mmehie ya na-enwe obi ụtọ.”+

9 Ọ̀ bụ naanị ndị e biri úgwù na-enwe obi ụtọ a, ka ndị a na-ebighị úgwù hà na-enwekwu ya?+ N’ihi na anyị na-ekwu na “e ji maka okwukwe Ebreham nwere kpọọ ya onye ezi omume.”+ 10 Oleezi mgbe a kpọrọ ya onye ezi omume? Ọ̀ bụ mgbe o birila úgwù, ka ọ̀ bụ mgbe ọ na-ebibeghị úgwù? Ọ bụghị mgbe o birila úgwù, kama ọ bụ mgbe ọ na-ebibeghị úgwù. 11 Chineke gwara ya ka o bie úgwù. Úgwù o biri bụ ihe àmà+ gosiri na okwukwe o nwere mere ka ọ bụrụ onye ezi omume mgbe ọ na-ebibeghị úgwù. O si otú ahụ bụrụ nna ndị niile nwere okwukwe+ n’agbanyeghị na ha bụ ndị a na-ebighị úgwù, Chineke wekwaara ha ka ndị ezi omume; 12 Ebreham bụkwa nna ndị e biri úgwù. Ọ bụghị naanị nna ndị e biri úgwù, kama ọ bụkwa nna ndị nwere okwukwe ka ya. Nna anyị Ebreham+ nwere okwukwe ahụ mgbe ọ na-ebibeghị úgwù.

13 N’ihi na ihe mere e ji kwe Ebreham ma ọ bụ nwa* ya nkwa na ọ ga-eketa ụwa+ abụghị na o mere ihe e kwuru n’iwu, kama ọ bụ n’ihi okwukwe ya nke mere o ji bụrụ onye ezi omume.+ 14 N’ihi na ọ bụrụ na ọ bụ ndị na-eme ihe e kwuru n’iwu ga-enweta ihe ahụ e kwere ná nkwa, ọ baghịzi uru mmadụ inwe okwukwe, nkwa ahụ enweghịkwa isi. 15 N’eziokwu, imebi Iwu ahụ* na-eme ka Chineke wesa mmadụ iwe.+ Ma n’ebe iwu na-adịghị, mmebi iwu anaghị adị.+

16 N’ihi ya, e kwere Ebreham nkwa ahụ n’ihi okwukwe ya. E sikwa otú ahụ gosi amara Chineke.+ N’ihi ya, o doro anya na ndị niile bụ́ ụmụ* ya ga-enweta ihe ahụ e kwere ná nkwa.+ Ọ bụghị naanị ndị na-eme ihe e kwuru n’Iwu ahụ* ga-enweta ya, kamakwa ndị nwere ụdị okwukwe Ebreham nwere, onye bụ́ nna anyị niile.+ 17 (Ọ bụ otú e dere ya, sị: “Emeela m ka ị bụrụ nna ọtụtụ mba.”)+ Nkwa a Chineke kwere ga-emezurịrị, Ebreham nwekwara okwukwe na Chineke, onye na-eme ka ndị nwụrụ anwụ dị ndụ, onye na-akpọkwa ihe ndị na-adịghị adị ka à ga-asị na ha dị adị.* 18 Ọ bụ eziokwu na e nweghị ihe mere ọ ga-eji nwee olileanya, ma n’ihi ihe ọ na-atụ anya ya, o nwere okwukwe na ya ga-abụ nna ọtụtụ mba otú e kwuru ya, sị: “Otú ahụ ka ụmụ* gị ga-adị ọtụtụ.”+ 19 Ọ daghị mbà n’okwukwe n’agbanyeghị na o chere banyere ahụ́ ya nke e nwere ike ikwu na ọ nwụọla (ebe ọ dị ihe dị ka otu narị afọ),+ o chekwara banyere Sera onye na-enweghịzi ike ịdị ime.*+ 20 Ma n’ihi nkwa Chineke kwere, o nwere okwukwe nke mere na o nweghị obi abụọ. Kama okwukwe ya mere ka o sie ike, ya esi otú ahụ nye Chineke otuto. 21 Obi sikwara ya ezigbo ike na Chineke ga-emeli ihe o kwere ná nkwa.+ 22 N’ihi ya, “a kpọrọ ya onye ezi omume.”+

23 Ma, ọ bụghị naanị n’ihi ya+ ka e ji dee na “a kpọrọ ya onye ezi omume,” 24 kama ọ bụkwa n’ihi anyịnwa ndị a ga-akpọkwa ndị ezi omume, n’ihi na anyị kweere n’onye si n’ọnwụ kpọlite Jizọs Onyenwe anyị.+ 25 E nyefere Jizọs ka e gbuo ya n’ihi mmehie anyị,+ a kpọlitekwara ya n’ọnwụ ka e wee kpọọ anyị ndị ezi omume.+

5 N’ihi ya, ugbu a a kpọrọla anyị ndị ezi omume maka na anyị nwere okwukwe,+ ka anyị na Chineke na-adị n’udo. Ọ bụ Onyenwe anyị Jizọs Kraịst mere ka udo a nwee isi.+ 2 Okwukwe anyị nwere na ya emeela ka amara a ruo anyị aka, bụ́ nke anyị na-enweta ugbu a.+ Ka anyị na-aṅụrịkwa ọṅụ* n’ihi na anyị nwere olileanya na anyị ga-enweta ebube Chineke. 3 Ọ bụghị naanị ya, kama ka anyị na-aṅụrị ọṅụ* mgbe a na-akpagbu anyị,+ ebe ọ bụ na anyị ma na mkpagbu na-eme ka anyị tachie obi;+ 4 ịtachi obi na-eme ka anyị na Chineke dịrị ná mma;+ anyị na Chineke ịdị ná mma na-eme ka anyị nwee olileanya.+ 5 Olileanya a anaghị emenye anyị ihere;+ n’ihi na Chineke ji mmụọ nsọ o nyere anyị mee ka ịhụnanya ya ju n’obi anyị.+

6 N’eziokwu, mgbe anyị ka bụ ndị mmehie,*+ Kraịst nwụrụ n’oge a kara aka maka ndị na-anaghị asọpụrụ Chineke. 7 O siri ike mmadụ ọ bụla ịnwụ maka onye ezi omume; ma mmadụ nwere ike ikweta ịnwụ maka ezigbo mmadụ. 8 Ma Chineke gosiri anyị na ọ hụrụ anyị n’anya n’ihi na Kraịst nwụrụ maka anyị mgbe anyị ka bụ ndị mmehie.+ 9 Ebe ọ bụ na a kpọọla anyị ndị ezi omume ugbu a n’ihi ọbara ya,+ o doro anya na a ga-esi n’aka ya zọpụta anyị ka Chineke ghara iwesa anyị iwe.+ 10 N’ihi na ọ bụrụ na ọnwụ Ọkpara ya mere ka anyị na Chineke dị ná mma mgbe anyị bụ ndị iro ya,+ o doro anya na ndụ ya ga-eme ka a zọpụta anyị ugbu a e merela ka anyị na Chineke dị ná mma. 11 Ọ bụghị naanị ya, kama anyị na-aṅụrịkwa ọṅụ maka na anyị na Chineke dị ná mma n’ihi Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, onye mere ka anyị na Chineke dịrị ná mma ugbu a.+

12 N’ihi ya, otú ahụ mmehie si n’aka otu mmadụ bata n’ụwa, ọnwụ esikwa ná mmehie bata,+ ọnwụ wee gbasaa ruo mmadụ niile n’ihi na ha niile mehiere+—. 13 N’ihi na mmehie dị n’ụwa tupu Iwu ahụ,* ma a naghị ekwu na mmadụ bụ onye mmehie mgbe iwu na-adịghị.+ 14 Ma, ọnwụ chịrị mmadụ niile malite n’Adam ruo na Mosis. Ọ chịdịrị ndị na-emeghị ụdị mmehie Adam mere, bụ́ onye yiri onye ahụ e kwuru na ọ ga-abịa.+

15 Ma onyinye ahụ adịghị ka mmehie ahụ. N’ihi na ọ bụrụ na ọtụtụ mmadụ nwụrụ n’ihi mmehie otu onye, o doro anya na amara Chineke na onyinye o nyere n’efu nke si n’amara otu onye,+ bụ́ Jizọs Kraịst, ga-eru ọtụtụ ndị aka n’ụba.+ 16 Uru onyinye ahụ e nyere n’efu bara adịghịkwa ka nsogbu mmehie otu onye kpatara.+ N’ihi na otu mmehie mere ka a maa mmadụ niile ikpe,+ ma onyinye e nyere mgbe ọtụtụ ndị merela mmehie mere ka a kpọọ ọtụtụ ndị ndị ezi omume.+ 17 Ebe ọ bụ na ọnwụ si n’aka otu onye bụrụ eze n’ihi mmehie onye ahụ,+ o doro anya na ndị na-enweta amara Chineke n’ụba na onyinye ezi omume ahụ e nyere n’efu+ ga-adị ndụ ma si n’aka otu onye ahụ, bụ́ Jizọs Kraịst,+ bụrụ ndị eze.+

18 N’ihi ya, otú ahụ otu mmehie mere ka a maa ụdị mmadụ niile ikpe,+ otú ahụkwa ka otu ezi omume si eme ka a na-akpọ ụdị mmadụ niile+ ndị ezi omume ka ha wee nweta ndụ.+ 19 N’ihi na ebe ọ bụ na nnupụisi otu onye mere ka ọtụtụ mmadụ bụrụ ndị mmehie,+ otú ahụkwa ka nrubeisi otu onye ga-esi eme ka ọtụtụ mmadụ bụrụ ndị ezi omume.+ 20 E mechara nwee Iwu ahụ* ka ndị mmadụ wee mata na ha na-eme ọtụtụ mmehie.+ Ma n’ebe mmehie dị ọtụtụ, amara na-abakwu ụba. 21 Ọ̀ bụ ka gịnị wee mee? Ọ bụ ka amara wee si n’ezi omume bụrụ eze otú ahụ mmehie na ọnwụ bụ eze,+ mezie ka ndị mmadụ si n’aka Jizọs Kraịst Onyenwe anyị nweta ndụ ebighị ebi.+

6 Gịnịzi ka anyị ga-ekwu? Ànyị ka ga na-eme mmehie ka amara baa ụba? 2 Mbanụ! Ebe ọ bụ na mmehie anaghịzi achị anyị,+ gịnị mere anyị ga-eji ka nọrọ na-eme mmehie?+ 3 Ka ọ̀ bụ na unu amaghị na anyị niile ndị e mere baptizim ka anyị na Kraịst Jizọs dịrị n’otu,+ e mere anyị baptizim ka anyị nwụọ ụdị ọnwụ ọ nwụrụ?+ 4 N’ihi ya, e si na baptizim ahụ e mere anyị ka anyị nwụọ ụdị ọnwụ ọ nwụrụ likọọ anyị na ya,+ ka anyị wee na-ebi ndụ ọhụrụ otú ahụ e si n’ebube nke Nna ahụ kpọlite Kraịst n’ọnwụ.+ 5 Ọ bụrụ na anyị na ya dị n’otu maka na anyị nwụrụ ụdị ọnwụ ọ nwụrụ,+ n’eziokwu, anyị na ya ga-adịkwa n’otu maka na a ga-akpọlite anyị n’ọnwụ otú e si kpọlite ya n’ọnwụ.+ 6 N’ihi na anyị ma na a kpọgidere ya na àgwà ochie anyị n’osisi,+ ka e wee mee ka ahụ́ anyị nke na-eme mmehie kwụsị ịrụ ọrụ,+ ka anyị ghara ịnọ na-agbara mmehie ohu.+ 7 N’ihi na onye nwụrụ anwụ enwerela onwe ya ná* mmehie ya.

8 Ọ bụrụ na anyị na Kraịst nwụrụ, anyị kweere na anyị na ya ga-adịkwa ndụ. 9 N’ihi na anyị ma na ugbu a e sirila n’ọnwụ kpọlite Kraịst,+ ọ naghịzi anwụ anwụ;+ ọnwụ abụkwaghị nna ya ukwu. 10 N’ihi na ọnwụ ọ nwụrụ, ọ nwụrụ ya naanị otu ugboro ka o wepụ mmehie.+ Ma ndụ ọ dị, ọ na-adịrị ya Chineke. 11 Ununwa, werekwanụ onwe unu ka ndị nwụrụ anwụ n’ihe gbasara mmehie ma bụrụ ndị si n’aka Kraịst Jizọs na-adịrị Chineke ndụ.+

12 N’ihi ya, unu ekwela ka mmehie bụrụ eze na-achị ahụ́ unu nke na-anwụ anwụ,+ unu ewee na-eme ihe ahụ́ unu chọrọ. 13 Unu enyefekwala mmehie ahụ́ unu ka ọ bụrụ ihe unu ji eme ajọ omume, kama nyefeenụ Chineke onwe unu dị ka ndị si n’ọnwụ bilie wee dịrị ndụ. Nyefeekwanụ Chineke ahụ́ unu ka ọ bụrụ ihe unu ji eme ezi omume.+ 14 Unu ekwela ka mmehie bụrụ nna unu ukwu ebe ọ bụ na ọ bụghị iwu na-achị unu,+ kama ọ bụ amara na-achị unu.+

15 Gịnịzi ka anyị ga-ekwu? Ànyị kwesịrị ime mmehie maka na ọ bụghị iwu na-achị anyị kama ọ bụ amara na-achị anyị?+ Mbanụ! 16 Ọ̀ bụ na unu amaghị na ọ bụrụ na unu enyefee onye ọ bụla onwe unu ka unu na-erubere ya isi, unu na-agbara ya ohu maka na unu na-erubere ya isi?+ N’ihi ya, ọ bụrụ na unu na-agbara mmehie ohu,+ ọ ga-akpatara unu ọnwụ.+ Ma ọ bụrụ na unu na-agbara Chineke ohu ma na-erubere ya isi, unu ga-abụ ndị ezi omume. 17 Ma m na-ekele Chineke na n’agbanyeghị na unu na-agbaburu mmehie ohu, unu jizi obi unu na-erubere Chineke isi ma na-eme ihe ọ kụziiri* unu. 18 N’eziokwu, ebe ọ bụ na e mere ka unu kwụsị ịgbara mmehie ohu,+ unu na-agbaziri ezi omume ohu.+ 19 Ana m agwa unu okwu otú mmadụ ga-aghọta ya maka na mmehie emeela ka ahụ́ unu ghara ịdị ike. Otú ahụ unu nyefere adịghị ọcha na mmebi iwu ahụ́ unu ka unu bụrụ ohu ha, unu wee na-emebi iwu, nyefeekwanụ ezi omume ahụ́ unu ugbu a ka unu wee bụrụ ohu ya, ka ihe unu na-eme wee bụrụ ihe dị nsọ.+ 20 N’ihi na n’oge unu na-agbara mmehie ohu, ezi omume anaghị achị unu.

21 Oleezi mkpụrụ unu nọ na-amị n’oge ahụ? Ha bụ ihe ndị na-eme unu ihere ugbu a. N’ihi na ihe ndị ahụ na-akpata ọnwụ.+ 22 Ma, ebe ọ bụ na e meela ka unu kwụsị ịgbara mmehie ohu ma na-agbara Chineke ohu, mkpụrụ unu na-amị bụ ndụ dị nsọ unu na-ebi,+ ọ ga-emekwa ka unu nweta ndụ ebighị ebi.+ 23 N’ihi na ụgwọ ọrụ mmehie na-akwụ bụ ọnwụ,+ ma onyinye Chineke si n’aka Kraịst Jizọs Onyenwe anyị+ na-enye bụ ndụ ebighị ebi.+

7 Ụmụnna m, ọ̀ ga-abụ na unu amaghị (n’ihi na ọ bụ ndị ma iwu ka m na-agwa) na ọ bụrụhaala na mmadụ nọ ndụ, Iwu ahụ* bụ nna ya ukwu? 2 Dị ka ihe atụ, iwu kwuru na nwaanyị lụrụ di ekwesịghị ịhapụ di ya mgbe di ya nọ ndụ. Ma ọ bụrụ na di ya anwụọ, iwu di ya ejighịzi ya.+ 3 N’ihi ya, mgbe di ya nọ ndụ, a ga-akpọ ya nwaanyị na-akwa iko ma ọ lụọ nwoke ọzọ.+ Ma ọ bụrụ na di ya anwụọ, iwu di ya ejighịzi ya. Ọ bụghị nwaanyị na-akwa iko ma ọ lụọ nwoke ọzọ.+

4 Ụmụnna m, e sikwa n’ahụ́ Kraịst mee ka unu nwere onwe unu n’Iwu ahụ,* ka unu wee bụrụ ndị onye ọzọ nwe,+ ndị onye ahụ e si n’ọnwụ kpọlite nwe,+ ka anyị wee mịara Chineke mkpụrụ.+ 5 N’ihi na mgbe anyị na-ebi ndụ otú ahụ́ anyị chọrọ, ihe ọjọọ ndị na-agụ ahụ́ anyị agụụ, bụ́ ndị Iwu ahụ* mere ka a mata, nọ na-eme ka anyị na-eme mmehie. Mkpụrụ ọ na-amịkwa bụ ọnwụ.+ 6 Ma ugbu a, anyị enwerela onwe anyị n’Iwu ahụ*+ n’ihi na iwu ahụ ejighịzi anyị. N’ihi ya, ka anyị bụrụ ndị ohu maka na mmụọ nsọ na-edu anyị,+ ọ bụghị maka na iwu na-achị anyị.+

7 Gịnịzi ka anyị ga-ekwu? Iwu ahụ* ọ̀ bụ mmehie? Mbanụ! N’eziokwu, agaraghị m ama ihe bụ́ mmehie ma a sị na Iwu ahụ* adịghị.+ Dị ka ihe atụ, agaraghị m ama ihe bụ́ anyaukwu ma a sị na Iwu ahụ* ekwughị, sị: “Enwela anyaukwu.”+ 8 Ma ebe ọ bụ na e nyere iwu ahụ, mmehie chọtara ụzọ mee ka m na-enwe ụdị anyaukwu ọ bụla, n’ihi na mgbe iwu na-adịghị, mmehie nwụrụ anwụ.+ 9 N’eziokwu, mgbe iwu na-adịghị, adị m ndụ. Ma mgbe e nweziri iwu, mmehie dịwara ndụ ọzọ, mụnwa anwụọ.+ 10 M chọpụtakwara na iwu ahụ e nyere, nke kwesịrị ime ka m dị ndụ,+ meziri ka m nwụọ. 11 Ebe ọ bụ na e nyere iwu ahụ, mmehie chọtara ụzọ rafuo m ma gbuo m. 12 N’ihi ya, Iwu ahụ* dị nsọ, ihe e kwuru na ya dịkwa nsọ, zie ezie ma dị mma.+

13 Ọ̀ pụtaziri na ihe dị mma kpataara m ọnwụ? Mbanụ! Kama ọ bụ mmehie kpataara m ya. Mmehie si n’ihe dị mma kpatara m ọnwụ iji mee ka a mata ihe bụ́ mmehie.+ Iwu ahụ si otú a gosi na mmehie jọgburu onwe ya.+ 14 N’ihi na anyị ma na Iwu ahụ* si n’aka Chineke, ma abụ m anụ ahụ́, e rekwara m ka m gbawara mmehie ohu.+ 15 N’ihi na anaghị m aghọta ihe m na-eme. N’ihi na anaghị m eme ihe m chọrọ ime, kama m na-eme ihe m kpọrọ asị. 16 Ma, ọ bụrụ na ihe m na-eme bụ ihe m na-achọghị ime, ekwetara m na Iwu ahụ* dị mma. 17 Ma ugbu a, ọ bụghịzi mụnwa na-eme ya, kama ọ bụ mmehie nke bi n’ime m na-eme ya.+ 18 N’ihi na ama m na e nweghị ihe dị mma bi n’ime m, ya bụ, n’ahụ́ m; n’ihi na m na-achọ ime ihe dị mma, ma anaghị m enwe ike ime ya.+ 19 N’ihi na anaghị m eme ihe dị mma m na-achọ ime, kama ọ bụ ihe ọjọọ m na-achọghị ime ka m na-eme. 20 Ma, ọ bụrụ na ihe m na-eme bụ ihe m na-achọghị ime, ọ bụghịzi mụnwa na-eme ya, kama ọ bụ mmehie nke bi n’ime m na-eme ya.

21 Achọpụtala m na ọ bụ iwu a na-achị m: Mgbe m chọrọ ime ihe dị mma, ihe ọjọọ na-abata m n’obi.+ 22 N’ime obi m, iwu Chineke na-amasị m.+ 23 Ma ana m ahụ na e nwere iwu ọzọ na-akpa ike n’ahụ́ m. Iwu a na-alụso iwu na-achị obi m agha.+ Ọ na-adọrọkwa m n’agha, mee ka m gbawara iwu mmehie nke dị n’ahụ́ m ohu.+ 24 Ahụsiela m anya! Ònye ga-anapụta m n’ahụ́ a nke na-akpatara m ọnwụ a? 25 Esi m n’aka Jizọs Kraịst Onyenwe anyị na-ekele Chineke. N’ihi ya, n’ime obi m, m na-agbara iwu Chineke ohu. Ma n’ahụ́ m, m na-agbara iwu mmehie ohu.+

8 N’ihi ya, ikpe amaghị ndị ha na Kraịst Jizọs dị n’otu. 2 N’ihi na iwu nke mmụọ nsọ, nke na-enye ndị ha na Kraịst Jizọs dị n’otu ndụ, emeela ka unu nwere onwe unu+ n’iwu nke mmehie na iwu nke ọnwụ. 3 Ihe Iwu ahụ* na-enweghị ike ime+ maka na anụ ahụ́ adịghị ike+ ka Chineke mere. Otú o si mee ya bụ na o zitere Ọkpara ya+ ka ọ dịrị ka ụmụ mmadụ bụ́ ndị na-eme mmehie,+ ka o wee wepụ mmehie. O si otú a na-ama mmehie dị ụmụ mmadụ n’ahụ́ ikpe, 4 ka anyị wee na-eme ihe ndị Chineke kwuru e dere n’Iwu ahụ,*+ ghara ikwe ka anụ ahụ́ na-achị anyị, kama ka mmụọ nsọ na-edu anyị.+ 5 Ndị na-ebi ndụ otú anụ ahụ́ chọrọ na-eche banyere ihe ga-adị anụ ahụ́ mma,+ ma ndị mmụọ nsọ na-edu na-eche banyere ihe ga-adị mmụọ nsọ mma.+ 6 N’ihi na iche banyere ihe ga-adị anụ ahụ́ mma na-eweta ọnwụ,+ ma iche banyere ihe ga-adị mmụọ nsọ mma na-eweta ndụ na udo;+ 7 n’ihi na iche banyere ihe ga-adị anụ ahụ́ mma na-eme ka mmadụ bụrụ onye iro Chineke,+ maka na anụ ahụ́ anaghị erubere iwu Chineke isi. N’eziokwu, ọ gaghị erubere ya isi. 8 N’ihi ya, ndị na-ebi ndụ otú anụ ahụ́ chọrọ agaghị emeli ihe dị Chineke mma.

9 Ma, ọ bụrụ n’eziokwu na mmụọ nsọ Chineke dị n’ime unu, unu agaghị na-eme ihe anụ ahụ́ chọrọ, kama mmụọ nsọ ga na-edu unu.+ Ma ọ bụrụ na onye ọ bụla enweghị mmụọ nke Kraịst, onye ahụ abụghị onye nke ya. 10 Ma ọ bụrụ na unu na Kraịst dị n’otu,+ ahụ́ unu nwụrụ anwụ n’ihi mmehie, ma mmụọ nsọ na-enye unu ndụ n’ihi ezi omume. 11 Ọ bụrụ na mmụọ nke onye ahụ kpọlitere Jizọs n’ọnwụ dị n’ime unu, onye ahụ kpọlitere Kraịst Jizọs n’ọnwụ+ ga-ejikwa mmụọ ya nke dị n’ime unu mee ka ahụ́ unu nke na-anwụ anwụ dị ndụ.+

12 N’ihi ya, ụmụnna m, anyị ji ụgwọ, ma ọ bụghị ụgwọ ibi ndụ otú anụ ahụ́ chọrọ.+ 13 N’ihi na ọ bụrụ na unu na-ebi ndụ otú anụ ahụ́ chọrọ, unu ga-anwụ. Ma ọ bụrụ na mmụọ nsọ enyere unu aka ka unu mee ka omume niile nke ahụ́ nwụọ,+ unu ga-adị ndụ.+ 14 N’ihi na ndị niile mmụọ Chineke na-edu bụ ụmụ Chineke n’eziokwu.+ 15 N’ihi na unu enwetaghị mmụọ nke na-eme ka unu gbawa ohu ma tụwa egwu, kama unu nwetara mmụọ nke mere ka unu bụrụ ụmụ. Mmụọ ahụ na-emekwa ka anyị na-eti mkpu, sị: “Aba,* Nna!”+ 16 Mmụọ nsọ na mmụọ anyị na-agbara anyị àmà+ na anyị bụ ụmụ Chineke.+ 17 Ma ọ bụrụ na anyị bụ ụmụ Chineke, anyị ga-eketa ihe Chineke ga-ekenye anyị. Ọ ga-ekenye anyị ihe ahụ+ Kraịst ga-eketa ma ọ bụrụhaala na anyị na Kraịst atakọọ ahụhụ,+ ka e wee mee ka anyị na ya dịkọọ ebube.+

18 N’ihi na m weere ya na ahụhụ ndị anyị na-ata n’oge a enweghị ihe ha bụ ma e jiri ha tụnyere ụgwọ ọrụ dị ebube anyị ga-enweta nke Chineke ga-eme ka a hụ.+ 19 N’ihi na ihe e kere eke* na-atụsi anya ike oge a ga-ekpughe ụmụ Chineke.+ 20 N’ihi na e mere ka ihe e kere eke* bụrụ ihe efu,+ ọ bụghị maka na ọ bụ uche ya, kama ọ bụ maka na ọ bụ uche onye mere ka ọ bụrụ ihe efu, ebe ọ bụ na e nwere olileanya 21 na a ga-emekwa ka ihe e kere eke* nwere onwe ya+ n’ohu ọ na-agbara ire ure. Ọ ga-enwere onwe ya n’ụzọ dị ebube ka ụmụ Chineke. 22 N’ihi na anyị ma na ihe niile e kere eke* na-asụkọ ude ọnụ, nọrọkwa n’ihe mgbu ruo ugbu a. 23 Ọ bụghị naanị nke ahụ, kama anyịnwa bụ́ ndị nwetara mkpụrụ mbụ ahụ, ya bụ, mmụọ ahụ, anyị na-asụkwa ude n’ime onwe anyị+ ka anyị na-echeresi ike ka e mee ka anyị bụrụ ụmụ,+ ka e jiri ihe mgbapụta tọhapụ ahụ́ anyị. 24 N’ihi na anyị nwere olileanya a mgbe a zọpụtara anyị. Ma ọ bụrụ na mmadụ ahụ ihe ọ na-ele anya ya, ọ naghịzi enwe olileanya ihe ahụ. N’ihi na ọ bụrụ na mmadụ ahụ ihe anya, ọ̀ ka ga na-atụ anya ya? 25 Ma ọ bụrụ na anyị na-ele anya+ ihe anyị na-anaghị ahụ anya,+ anyị na-eji ntachi obi echeresi ya ike.+

26 Mmụọ nsọ na-enyekwara anyị aka mgbe anyị na-adịghị ike;+ n’ihi na e nwere mgbe anyị na-anaghị ama ihe anyị ga-ekpe n’ekpere. N’oge ndị ahụ, n’agbanyeghị na anyị amaghị otú anyị ga-esi ekwupụta ihe anyị na-asụrụ ude, mmụọ nsọ na-arịọrọ anyị arịrịọ. 27 Ma onye ahụ nke na-enyocha obi+ na-aghọta ihe mmụọ nsọ na-arịọ, n’ihi na ọ na-arịọrọ ya ndị nsọ otú Chineke si chọọ.

28 Anyị ma na Chineke na-eme ka ọrụ ya niile na-agakọ ọnụ ka ihe wee gaziere ndị hụrụ ya n’anya, ndị a kpọrọ otú bụ́ uche ya;+ 29 n’ihi na ọ bụ ndị mbụ ọ matara ka o kpebikwara tupu oge eruo na a ga-eme ka ha dịrị otú Ọkpara ya dị,+ ka Ọkpara ya wee bụrụ onye e bu ụzọ mụọ+ n’ime ọtụtụ ụmụnna.+ 30 Ndị o kpebiri tupu oge eruo+ bụkwa ndị ọ kpọrọ.+ Ndị ọ kpọrọ bụkwa ndị ọ kpọrọ ndị ezi omume.+ Ndị ọ kpọrọ ndị ezi omume bụ ndị o mekwara ka ha dị ebube.+

31 Gịnịzi ka anyị ga-ekwu banyere ihe ndị a? Ọ bụrụ na Chineke nọnyeere anyị, ònye ga-emegide anyị?+ 32 Ebe ọ bụ na ọ zọghịdị Ọkpara ya, kama o nyefere ya maka anyị niile,+ ọ̀ bụ na ya na Ọkpara ya agaghịkwa eji obiọma nye anyị ihe niile ọzọ? 33 Ònye ga-ebo ndị Chineke họọrọ ebubo?+ E nweghị, n’ihi na ọ bụ Chineke bụ Onye na-akpọ ha ndị ezi omume.+ 34 Ònye ga-ama ha ikpe? E nweghị, n’ihi na ọ bụ Kraịst Jizọs bụ onye ahụ nwụrụnụ. Ọ bụghị naanị na ọ nwụrụ, kama a kpọlitekwara ya. Ọ nọ n’aka nri Chineke,+ ọ na-arịọkwara anyị arịrịọ.+

35 Gịnị* ga-eme ka Kraịst kwụsị ịhụ anyị n’anya?+ Ọ̀ bụ ahụhụ, ka ọ̀ bụ nsogbu, ka ọ̀ bụ mkpagbu, ka ọ̀ bụ agụụ, ka ọ̀ bụ ịgba ọtọ, ka ọ̀ bụ ịnọ n’ọnụ ọnwụ, ka ọ̀ bụ mma agha?+ 36 Otú ahụ ka e dere ya, sị: “Ọ bụ n’ihi gị ka e ji na-egbu anyị mgbe niile. E werela anyị ka atụrụ a ga-egbu egbu.”+ 37 Ma n’ihe ndị a niile, anyị na-emeri+ n’ihi na onye ahụ hụrụ anyị n’anya na-enyere anyị aka. 38 N’ihi na ekwetara m na ọnwụ ma ọ bụ ndụ ma ọ bụ ndị mmụọ ozi ma ọ bụ ọchịchị ma ọ bụ ihe ndị dị ugbu a ma ọ bụ ihe ndị ga-abịa abịa ma ọ bụ ike+ 39 ma ọ bụ ihe ndị dị n’elu ma ọ bụ ihe ndị dị n’okpuru ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ e kere eke agaghị enwe ike ime ka Chineke kwụsị ịhụ anyị n’anya, bụ́ ịhụnanya Kraịst Jizọs Onyenwe anyị nwekwara.

9 Ebe m bụ onye na-eso ụzọ Kraịst, ana m ekwu eziokwu, ọ bụghị ụgha ka m na-agha n’ihi na akọnuche m, nke mmụọ nsọ na-edu, na-agba àmà 2 na m na-eru nnukwu uju, obi anaghịkwa ezu m ike. 3 N’ihi na ọ dị m ka ya bụrụ na e kewapụrụ m n’ebe Kraịst nọ, ka m bụrụ onye a bụrụ ọnụ kama ụmụnna m ga-abụ ndị a bụrụ ọnụ, bụ́ ndị agbụrụ m, 4 ndị bụ́ ndị Izrel. Ọ bụ ha ka Chineke mere ka ha bụrụ ụmụ ya.+ E mere ka ha dị ebube, ha na ya gbakwara ndụ.+ Ọ bụ ha ka e nyere Iwu Mosis,+ nye ha ohere ije ozi dị nsọ,+ kwekwa ha nkwa dị iche iche.+ 5 Ha si n’agbụrụ nna nna anyị hà,+ bụ́ agbụrụ Kraịst sikwa na ya.+ Ka otuto dịrị Chineke, onye bụ́ isi ihe niile, ruo mgbe ebighị ebi. Amen.

6 Ma, ọ pụtaghị na okwu Chineke emezughị. N’ihi na ọ bụghị ndị niile Izrel mụrụ bụ “ndị Izrel” n’eziokwu.+ 7 Ọ bụghịkwa maka na ha bụ ụmụ Ebreham mere ha niile ga-eji bụrụ ụmụ* ya;+ kama e dere, sị, “Ọ bụ Aịzik ga-amụta ndị a ga-akpọ ụmụ* gị.”+ 8 Ọ pụtara na ọ bụghị ndị niile Ebreham mụrụ bụ ụmụ Chineke n’eziokwu,+ kama ọ bụ ụmụ a mụrụ n’ihi nkwa ahụ+ bụ ụmụ* Ebreham. 9 N’ihi na Chineke kwere nkwa, sị: “M ga-abịa n’ụdị oge a n’afọ ọzọ, Sera ga-amụkwa nwa nwoke.”+ 10 Ọ bụghị naanị n’oge ahụ, kamakwa n’oge Aịzik nna nna anyị tụwara Ribeka ime, ya abụrụ ime ejima.+ 11 Mgbe a na-amụbeghị ha, mgbe ha na-emebeghịkwa ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ ọ bụla, Chineke ekpebiela otú ọ ga-esi họrọ onye ọ chọrọ, ọ bụghị n’ihi ọrụ onye ahụ, kama ọ na-ahọrọ onye ọ chọrọ ịkpọ. 12 N’ihi ya, a gwara Ribeka, sị: “Nke okenye ga-agbara nke nwata ohu.”+ 13 Otú ahụ ka e dere ya, sị: “Ahụrụ m Jekọb n’anya, ma m kpọrọ Ịsọ asị.”+

14 Gịnịzi ka anyị ga-ekwu? Chineke ọ̀ na-ekpe ikpe na-ezighị ezi? Mbanụ!+ 15 N’ihi na ọ gwara Mosis, sị: “Onye ọ bụla m chọrọ imere ebere ka m ga-emere ebere, onye ọ bụla m chọkwara inwere ọmịiko ka m ga-enwere ọmịiko.”+ 16 N’ihi ya, ọ bụghị ihe mmadụ chọrọ ma ọ bụ mbọ ọ na-agba ga-eme ka a họrọ ya,* kama ọ bụ Chineke, onye na-eme ebere, ka ọ dị n’aka.+ 17 N’ihi na n’Akwụkwọ Nsọ, Chineke gwara Fero, sị: “Ọ bụ ihe a mere m ji hapụ gị ndụ: ka m wee jiri gị gosi ike m, ka m wee mee ka a kọsaa aha m n’ụwa niile.”+ 18 N’ihi ya, ọ bụ onye ọ chọrọ ka ọ na-emere ebere, ma ọ na-ahapụ onye ọ bụla ọ chọrọ ka ọ gbaa isi akwara.+

19 N’ihi ya, ị ga-ajụ m, sị: “Gịnịzi mere o ji ata ndị mmadụ ụta? È nwere onye ga-emeli ka ọ ghara imezu uche ya?” 20 Ma, gị mmadụ, ònye ka ị bụ na ị ga na-asa Chineke okwu?+ Ihe a kpụrụ akpụ ọ̀ na-agwa onye kpụrụ ya, sị: “Gịnị mere i ji kpụọ m otú a?”+ 21 Ọ̀ bụ na ọkpụite enweghị ikike iji ụrọ+ ọ gwakọtara kpụọ otu arịa ka e jiri ya mee ihe bara ezigbo uru, kpụọkwa ọzọ ka e jiri ya mee ihe na-abaghị uru? 22 Otú ahụ ka ọ dịkwa Chineke. N’agbanyeghị na ọ chọrọ iwesa ndị ajọ omume iwe ma mee ka ha hụ ike ya, o nwere ezigbo ndidi ma hapụ ndị yiri arịa a ga-ewesa iwe, bụ́ ndị e kwesịrị ibibi ebibi. 23 O mere ihe a ka e wee mata ebube ya dị ukwuu nke ọ ga-eme ka ndị yiri arịa a ga-emere ebere nweta,+ bụ́ ndị o burula ụzọ kwadebe ka ha nweta ebube, 24 ya bụ, anyịnwa, ndị o si ma n’etiti ndị Juu ma n’etiti ndị mba ọzọ kpọọ.+ 25 Ọ bụ otú a ka o kwuru ya n’akwụkwọ Hosia, sị: “Ndị na-abụghị ndị m+ ka m ga-akpọ ‘ndị m.’ Nwaanyị ahụ a na-ahụghị n’anya ka m ga-akpọ ‘onye m hụrụ n’anya’;+ 26 n’ebe m gwara ha, sị, ‘Unu abụghị ndị m,’ n’ebe ahụ ka a ga-akpọ ha ‘ụmụ Chineke dị ndụ.’”+

27 Aịzaya kwukwara banyere Izrel, sị: “Ọ bụ eziokwu na ndị Izrel nwere ike ịdị ọtụtụ ka ájá dị n’oké osimiri, ọ bụ naanị ndị fọdụrụ ka a ga-azọpụta.+ 28 N’ihi na Jehova* ga-ekpe ụwa ikpe, kpechaa ya n’egbughị oge.”*+ 29 Aịzaya kwukwara, sị: “A sị na Jehova* nke ụsụụ ndị agha emeghị ka ụmụ* anyị fọdụ, anyị gaara adị nnọọ ka Sọdọm, anyị gakwaara adị ka Gọmọra.”+

30 Gịnịzi ka anyị ga-ekwu? Anyị ga-ekwu na n’agbanyeghị na ndị mba ọzọ anaghị agbalị ka ha bụrụ ndị ezi omume, a kpọrọ ha ndị ezi omume+ n’ihi okwukwe ha.+ 31 Ma n’agbanyeghị na Izrel gbara mbọ ka ha debe iwu ahụ ka ha wee bụrụ ndị ezi omume, ha edebelighị iwu ahụ. 32 Ọ̀ bụ maka gịnị? Ọ bụ maka na ha chere na a ga-akpọ ha ndị ezi omume n’ihi ọrụ ha, kama ịbụ n’ihi okwukwe ha. Ha kpọrọ ụkwụ na “nkume mkpọbi ụkwụ”;+ 33 otú ahụ e dere, sị: “Lee, ana m adọnye otu nkume+ na-akpọbi ndị mmadụ ụkwụ nakwa otu oké nkume na-akpasu ndị mmadụ iwe* na Zayọn, ma e nweghị onye nwere okwukwe na ya a ga-emechu ihu.”+

10 Ụmụnna m, ihe ọma m buuru ha n’obi na arịrịọ m na-arịọsi Chineke ike bụ ka a zọpụta ha.+ 2 N’ihi na m na-agba akaebe na ọ na-anụ ha ọkụ n’obi ijere Chineke ozi,+ ma ha amaghị Chineke nke ọma. 3 N’ihi na ebe ọ bụ na ha amaghị ihe bụ́ ezi omume n’anya Chineke,+ kama ha nọ na-achọ iji aka ha egosi na ha bụ ndị ezi omume,+ ha emeghị ihe bụ́ ezi omume n’anya Chineke.+ 4 N’ihi na Iwu ahụ* kwụsịrị na Kraịst,+ ka e wee kpọọ onye ọ bụla nwere okwukwe na ya onye ezi omume.+

5 N’ihi na Mosis dere banyere ihe Iwu ahụ kwuru bụ́ ezi omume, sị: “Onye na-eme ihe ndị a ga-adị ndụ maka na ọ na-eme ha.”+ 6 Ma Akwụkwọ Nsọ gosiri na ọ bụ inwe okwukwe na-eme ka a kpọọ mmadụ onye ezi omume. Ọ sịrị: “Asịla n’obi gị,+ ‘Ònye ga-arịgo n’eluigwe?’+ ya bụ, ịga kpọdata Kraịst, 7 ma ọ bụ, ‘Ònye ga-arịda n’abis?’*+ ya bụ, ịga kpọlite Kraịst n’ọnwụ.” 8 Ma gịnị ka o kwuru? Ọ sịrị: “Okwu ahụ dị gị nso, n’ọnụ gị nakwa n’obi gị”;+ ya bụ, “okwu” anyị na-ekwusa nke e ji okwukwe ekweta. 9 N’ihi na ọ bụrụ na i ji ọnụ gị ekwusa n’ihu ọha na Jizọs bụ Onyenwe anyị+ ma nwee okwukwe n’obi gị na Chineke kpọlitere ya n’ọnwụ, a ga-azọpụta gị. 10 N’ihi na mmadụ inwe okwukwe n’obi ya ga-eme ka ọ bụrụ onye ezi omume, ma ọ ga-eji ọnụ kwupụta ihe o kweere* n’ihu ọha+ ka e wee zọpụta ya.

11 N’ihi na e dere n’Akwụkwọ Nsọ, sị: “E nweghị onye nwere okwukwe na ya a ga-emechu ihu.”+ 12 N’ihi na e nweghị ihe dị iche n’onye Juu na onye Grik.+ Ọ bụ otu onye bụ Onyenwe mmadụ niile, onye na-enye ndị niile na-akpọku ya ihe n’ụba. 13 N’ihi na “a ga-azọpụta onye ọ bụla na-akpọku aha Jehova.”*+ 14 Ma, olee otú ha ga-esi kpọkuo ya ma ọ bụrụ na ha enwebeghị okwukwe na ya? Oleekwa otú ha ga-esi nwee okwukwe n’onye ha na-anụbeghị banyere ya? Oleekwa otú ha ga-esi anụ ma ọ bụrụ na e nweghị onye ga-ekwusara ha banyere ya? 15 Oleekwa otú ha ga-esi kwusaa ma ọ bụrụ na e zigaghị ha?+ Otú ahụ ka e dere ya, sị: “Ụkwụ ndị na-ezi ozi ọma nke ihe dị mma mara ezigbo mma.”+

16 Ma, ọ bụghị ha niile nabatara ozi ọma* ahụ. N’ihi na Aịzaya sịrị: “Jehova,* ònye nwere okwukwe n’ihe a nụrụ n’ọnụ anyị?”*+ 17 N’ihi ya, ọ bụ ihe mmadụ nụrụ na-eme ka o nwee okwukwe.+ A na-anụkwa okwu ahụ ma mmadụ kwusaa banyere Kraịst. 18 Ma ana m ajụ, sị, Ọ̀ bụ na ha anụghị? N’eziokwu, “ụda ha ruru ụwa niile, ozi ha rukwara n’ebe niile mmadụ bi n’ụwa.”+ 19 Ma ana m ajụ, sị, Ọ̀ bụ na Izrel amaghị?+ Mosis bu ụzọ sị: “M ga-eji ndị mba ọzọ mee ka obi jọọ unu njọ. M ga-eji mba dị nzuzu kpasuo unu ezigbo iwe.”+ 20 Ma Aịzaya ji nnọọ obi ike kwuo, sị: “Ndị na-anaghị achọ m chọtara m;+ ndị na-anaghị ajụ ajụjụ m matara m.”+ 21 Ma o kwuru banyere Izrel, sị: “Ana m agbasara ndị na-enupụ isi na ndị na-agba isi akwara aka m mgbe niile.”+

11 Ana m ajụzi, sị, Chineke ọ̀ jụrụ ndị ya?+ Mbanụ! N’ihi na mụnwa bụkwa onye Izrel, onye si n’agbụrụ* Ebreham, n’ebo Benjamin. 2 Chineke ajụghị ndị ya, bụ́ ndị mbụ ọ matara.+ Ọ̀ bụ na unu amaghị ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere Ịlaịja mgbe ọ na-arịọ Chineke arịrịọ, na-ekpesara ya ihe Izrel mere? 3 Ọ sịrị: “Jehova,* ha egbuola ndị amụma gị. Ha akwatuola ebe ịchụàjà gị, ọ bụkwa naanị m fọrọ. Ugbu a, ha na-achọ otú ha ga-esi gbuo m.”*+ 4 Ma gịnị ka Chineke gwara ya? Ọ sịrị ya: “M ka nwere puku mmadụ asaa (7,000) ndị na-egbutụbereghị Bel ikpere n’ala.”+ 5 Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ dị n’oge a. A ka nwere ndị fọrọ,+ ndị a họọrọ n’ihi amara Chineke. 6 Ọ bụrụ na ọ họọrọ ha n’ihi amara ya,+ ọ pụtara na ọ bụghị ọrụ ha mere o ji họrọ ha.+ A sị na ọ bụ ọrụ ha mere o ji họrọ ha, amara agaghịzi abụ amara.

7 Gịnịzi ka anyị ga-ekwu? Izrel enwetaghị ihe ọ nọ na-achọsi ike, ma ndị a họọrọ nwetara ya.+ Ndị ọzọ kpọchiri obi ha,+ 8 otú e dere ya, sị: “Chineke emeela ka ha na-ehi oké ụra.+ O nyekwala ha anya na-anaghị ahụ ụzọ na ntị na-anaghị anụ ihe ruo taa.”+ 9 Devid kwukwara, sị: “Ka tebụl ha bụụrụ ha ọnyà na igbudu na ihe mkpọbi ụkwụ na ụgwọ ọrụ ihe ọjọọ ha mere. 10 Ka anya ha gbaa ọchịchịrị ka ha gharazie ịhụ ụzọ, meekwa ka azụ ha huru ehuru mgbe niile.”+

11 Ana m ajụzi, sị, Hà zọhiere ụkwụ wee daa nke na ha enweghịzi ike ibili? Mbanụ! Kama ụkwụ ha zọhiere mere ka a zọpụta ndị mba ọzọ, ka e wee mee ka ndị Izrel nwewe anyaụfụ.+ 12 Ọ bụrụ na ụkwụ ha zọhiere mere ka a gọzie ụwa, ọ bụrụkwa na mbelata ha belatara mere ka a gọzie ndị mba ọzọ,+ o doro anya na a ga-enwe ngọzi dị ukwuu mgbe ọnụ ọgụgụ ha ga-ezu ezu.

13 Ugbu a, ọ bụ unu ndị mba ọzọ ka m na-agwa okwu. Ebe m bụ onyeozi nke ndị mba ọzọ,+ ana m akwanyere ozi m ùgwù,+ 14 ka m mara ma è nwere otú m ga-esi mee ka ndị Juu ibe m* nwewe anyaụfụ, ka e wee zọpụta ụfọdụ n’ime ha. 15 N’ihi na ọ bụrụ na nchụpụ a chụpụrụ ha+ mere ka ụwa nwee ohere ka ha na Chineke dịrị ná mma, gịnịzi ga-eme ma a nabata ha? Ọ ga-adị ka è si n’ọnwụ kpọlite ha, ha adịrịzie ndụ. 16 Ọ bụrụkwa na ụfọdụ n’ime ntụ ọka a gwakọtara agwakọta, nke e weere ka mkpụrụ mbụ, dị nsọ, ọ pụtara na ntụ ọka niile ahụ dịkwa nsọ; ọ bụrụkwa na mgbọrọgwụ osisi dị nsọ, alaka ya niile dịkwa nsọ.

17 Ma, ọ bụrụ na a nyakapụrụ alaka ụfọdụ n’ezigbo osisi oliv wee nyado unu na ya n’agbanyeghị na unu bụ oliv ọhịa, unu wee soro na-enweta ọtụtụ ihe ọma dị na mgbọrọgwụ osisi oliv ahụ, 18 unu anyarala alaka ndị a nyakapụrụ anyakapụ isi. Ma ọ bụrụ na unu na-anyara ha isi,*+ chetanụ na ọ bụghị unu ji mgbọrọgwụ, kama ọ bụ mgbọrọgwụ ji unu. 19 Ma, unu ga-asị: “A nyakapụrụ alaka dị iche iche ka e wee nyado anyị.”+ 20 Ọ bụ eziokwu. A nyakapụrụ ha maka na ha enweghị okwukwe.+ Ma, ọ bụ okwukwe unu mere unu ji kwụsie ike.+ Kwụsịnụ ịdị mpako, kama na-atụnụ egwu. 21 N’ihi na ọ bụrụ na Chineke emereghị alaka dị iche iche osisi ahụ wara ebere, ọ gaghị emere unu ebere. 22 N’ihi ya, chebaranụ obiọma Chineke echiche+ nakwa otú o si adọsi mmadụ aka ná ntị ike. Ọ na-adọsi ndị dara ada aka ná ntị ike,+ ma Chineke ga na-enwere unu obiọma ma ọ bụrụhaala na unu anọgide na-eme ihe ọ chọrọ ka ndị ọ na-enwere obiọma na-eme. Ma ọ́ bụghị ya, a ga-egbupụkwa unu. 23 Ọ bụrụkwa na ha amalite inwe okwukwe, a ga-anyado ha n’osisi oliv ahụ,+ n’ihi na Chineke ga-anyadoghachili ha. 24 N’ihi na ọ bụrụ na e si n’osisi oliv ọhịa gbute unu ma nyado unu n’osisi oliv dị n’ubi n’agbanyeghị na a naghị eme ya otú ahụ, o doro anya na e nwere ike ịnyadoghachi alaka ndị osisi oliv ahụ wara.

25 N’ihi na achọrọ m ka unu mara ihe nzuzo a dị nsọ,+ ụmụnna m, ka unu wee ghara ịma ihe n’anya onwe unu. Ihe nzuzo a bụ na ụfọdụ ndị Izrel ghọrọ ndị ihe na-anaghị emetụ n’obi ruo mgbe ọnụ ọgụgụ ndị mba ọzọ zuru. 26 A ga-esikwa otú a zọpụta Izrel niile.+ Otú ahụ ka e dere ya, sị: “Onye nnapụta* ga-esi na Zayọn pụta+ wee mee ka ụmụ Jekọb kwụsị ime ihe ọjọọ ndị ha na-eme. 27 Mụ na ha ga-agbakwa ndụ+ mgbe m ga-agbaghara ha mmehie ha.”+ 28 N’eziokwu, unu ritere uru maka na ha ghọrọ ndị iro Chineke mgbe ha na-anabataghị ozi ọma. Ma n’ihi nkwa Chineke kwere ndị nna nna ha, ọ họọrọ ụfọdụ n’ime ha ka ha bụrụ ndị enyi ya.+ 29 N’ihi na onyinye Chineke na-enye na òkù ọ kpọrọ ndị mmadụ abụghị ihe ọ ga-akwara ụta. 30 N’ihi na otú ahụ unu nupụbuuru Chineke isi,+ ma e meere unu ebere ugbu a+ maka na ha nupụrụ isi,+ 31 otú ahụkwa ka ọ dị ha. O meere unu ebere maka na ha nupụrụ isi. N’ihi ya, o nwekwara ike imere ha ebere ugbu a. 32 N’ihi na ebe mmadụ niile bụ ndị nnupụisi,+ Chineke kwere ka ha niile nupụwa isi, ka o wee meere ha niile ebere.+

33 N’eziokwu, ngọzi Chineke na amamihe ya enweghị atụ, ihe ọ ma dịkwa ukwuu. E nweghị onye nwere ike ịchọpụtacha ihe ndị o kpebiri, e nweghịkwa onye nwere ike ịmatacha ihe ndị ọ na-eme. 34 N’ihi na e dere, sị: “Ònye ma uche Jehova,* ma ọ bụ, ònye bụ onye ndụmọdụ ya?”+ 35 Ma ọ bụ, “ònye bu ụzọ nye ya ihe nke na ọ ga-akwụghachi onye ahụ ụgwọ ya?”+ 36 N’ihi na ihe niile si n’aka ya, ọ bụkwa ya mere ha ji dịrị, ha niile dịkwa n’ihi ya. Ka otuto dịrị ya ruo mgbe ebighị ebi. Amen.

12 N’ihi ya, ụmụnna m, ebe ọ bụ na Chineke na-emetere anyị ebere,* ana m arịọ unu ka unu nyefee ya ahụ́ unu+ ka àjà dị ndụ, nke dị nsọ,+ nke dịkwa Chineke mma. Unu ga-esi otú a jiri echiche unu+ na-ejere ya ozi. 2 Kwụsịkwanụ ịna-eme omume otú ndị oge a* si eme, kama gbanweenụ ụdị mmadụ unu bụ. Otú unu ga-esi eme ya bụ ịgbanwe otú unu si eche echiche,+ ka unu wee chọpụta+ ihe bụ́ uche Chineke, nke dị mma, nke zuru okè, nke na-emekwa ya obi ụtọ.

3 N’ihi na ebe Chineke meere m amara, ana m agwa unu niile nọ n’ebe ahụ ka a ghara inwe onye na-eche na ya bara uru karịa otú ọ bara,+ kama ka onye ọ bụla na-eche echiche otú gosiri na ọ na-ele ihe anya otú dị mma n’ihi okwukwe Chineke nyere ya.+ 4 N’ihi na otú ahụ ahụ́ anyị nwere akụkụ dị iche iche,+ ma ha niile anaghị arụ otu ọrụ, 5 otú ahụkwa ka ọ dị anyị. N’agbanyeghị na anyị dị ọtụtụ, anyị bụ otu ahụ́ n’ihi na anyị na Kraịst dị n’otu, ma anyị niile n’otu n’otu bụ ihe dị iche iche dị n’otu ahụ́.+ 6 N’ihi ya, ebe ọ bụ na anyị nwere onyinye dị iche iche n’ihi amara Chineke meere anyị,+ ọ bụrụ amụma ka anyị na-ebu, ka anyị na-ebu ya n’ihi okwukwe e nyere anyị. 7 Ọ bụrụ ozi ka anyị na-eje, ka anyị na-eje ozi a; ma ọ bụ, ọ bụrụ onye na-ezi ihe, ya ziwe ihe ọ na-ezi.+ 8 Ọ bụrụ onye na-agba ndị ọzọ ume,* ya gbawa ha ume;*+ onye na-ekesa ihe,* ya na-emesapụ aka ma ọ na-ekesa ya.+ Onye na-edu ndị ọzọ, ya jiri obi ya niile* na-edu ha.+ Onye na-eme ebere, ya gbasapụ ihu ma ọ na-eme ya.+

9 Ka ịhụnanya unu ghara ịbụ ịhụnanya ihu abụọ.+ Kpọọnụ ihe ọjọọ asị;+ na-agbasinụ mbọ ike ka unu na-eme ihe ọma.* 10 Na-ahụnụ ibe unu n’anya ka ụmụnne, na-enwekwaranụ ibe unu ọmịiko. Na-ebunụ ụzọ asọpụrụ ndị ọzọ.+ 11 Na-arụsinụ ọrụ ike.* Unu adịla umengwụ.+ Ka mmụọ Chineke mee ka unu na-anụ ọkụ n’obi.+ Bụrụnụ ndị ohu Jehova.*+ 12 Na-aṅụrịnụ ọṅụ n’ihi olileanya unu nwere. Na-atachinụ obi mgbe a na-akpagbu unu.+ Nọgidenụ na-ekpe ekpere.+ 13 Na-enyenụ ndị nsọ ihe na-akpa ha.+ Na-elenụ ọbịa.+ 14 Na-agọzinụ ndị na-akpagbu unu;+ na-agọzinụ ndị mmadụ, unu abụkwala ndị mmadụ ọnụ.+ 15 Soronụ ndị na-aṅụrị ọṅụ ṅụrịa ọṅụ; soronụ ndị na-ebe ákwá bee ákwá. 16 Na-elenụ ndị ọzọ anya otú unu si ele onwe unu; unu adịla mpako,* kama dịnụ umeala n’obi.+ Unu amala ihe n’anya onwe unu.+

17 Unu ejila ihe ọjọọ akwụ onye ọ bụla ụgwọ ihe ọjọọ.+ Na-emenụ ihe mmadụ niile ga-ewere na ọ dị mma. 18 Ọ bụrụ na o kwere omume, ọ bụrụkwa unu ka ọ dị n’aka, unu na mmadụ niile dịrị n’udo.+ 19 Ndị m hụrụ n’anya, unu abọrọla onwe unu ọbọ, kama nyenụ ọnụma* ohere;+ n’ihi na e dere, sị: “‘Ọ bụ m ga-abọ ọbọ. M ga-akwụ ụgwọ.’ Ọ bụ ihe Jehova* kwuru.”+ 20 Ma, “ọ bụrụ na agụụ na-agụ onye iro gị, nye ya nri. Ọ bụrụ na mmiri na-agụ ya, nye ya mmiri ka ọ ṅụọ; n’ihi na i mee otú ahụ, ị ga-ekpokwasị icheku ọkụ n’isi ya.”*+ 21 Ekwela ka ihe ọjọọ merie gị, kama na-eme ihe ọma ka i wee merie ihe ọjọọ.+

13 Ka onye* ọ bụla na-erubere ndị ọchịchị isi+ n’ihi na e nweghị ọchịchị ọ bụla ga-adị ma ọ bụrụ na Chineke ekweghị ka ọ dịrị.+ Ọ bụ Chineke dowere ọchịchị ndị dị adị ka ha nọrọ n’okpuru ya.+ 2 N’ihi ya, onye ọ bụla na-emegide ndị ọchịchị na-agba ihe Chineke haziri ụkwụ; ndị na-emegide ha na-ewetara onwe ha ikpe ọmụma. 3 N’ihi na a na-atụ ndị na-achị achị egwu, ma ọ bụghị ndị na-eme ihe ọma na-atụ ha egwu, kama ọ bụ ndị na-eme ihe ọjọọ.+ Ị̀ chọrọ ka ị ghara ịna-atụ ndị ọchịchị egwu? Mewe ihe ọma,+ ha ga-ajakwa gị mma. 4 N’ihi na ha bụ ndị na-ejere Chineke ozi ka ihe wee gaziere gị. Ma ọ bụrụ na ị na-eme ihe ọjọọ, tụọ egwu n’ihi na ha anaghị ebu mma agha na nkịtị. Ha bụ ndị na-ejere Chineke ozi, ndị na-ata ndị na-eme ihe ọjọọ ahụhụ.

5 N’ihi ya, e nwere ezigbo ihe mere unu ga-eji na-erubere ha isi, ọ bụghị naanị maka ahụhụ ha na-ata ndị mmadụ, kamakwa maka akọnuche unu.+ 6 Ọ bụ ya mere unu jikwa na-atụ ụtụ isi; n’ihi na ha bụ ndị ozi Chineke, ndị na-ejere ọhaneze ozi a mgbe niile. 7 Na-enyenụ mmadụ niile ihe ruuru ha: onye e kwesịrị ịtụrụ ụtụ isi, tụọrọnụ ya ụtụ isi;+ onye e kwesịrị ịtụrụ ụtụ ahịa, tụọrọnụ ya ụtụ ahịa; onye e kwesịrị ịtụ egwu, tụọnụ ya egwu;+ onye e kwesịrị ịsọpụrụ, sọpụrụnụ ya.+

8 Unu ejila onye ọ bụla ụgwọ ihe ọ bụla, ma e wepụ ịhụ ibe unu n’anya;+ n’ihi na onye hụrụ mmadụ ibe ya n’anya emezuola ihe iwu kwuru.+ 9 N’ihi na e dere n’iwu, sị, “Akwala iko,+ egbula mmadụ,*+ ezula ohi,+ enwela anyaukwu.”+ A chịkọtara iwu ndị a na iwu ọ bụla ọzọ n’otu iwu, ya bụ, “Hụ onye agbata obi gị n’anya otú ị hụrụ onwe gị.”+ 10 Onye hụrụ ndị ọzọ n’anya anaghị eme onye agbata obi ya ihe ọjọọ;+ n’ihi ya, onye hụrụ ndị ọzọ n’anya na-emezu ihe iwu kwuru.+

11 Na-emekwanụ ihe ndị a m kwuru n’ihi na unu ma na ihe a bụ oge unu kwesịrị iteta n’ụra+ maka na nzọpụta anyị dị nso ugbu a karịa mgbe anyị malitere inwe okwukwe na Jizọs. 12 Chi ejimiela; chi abọwala. N’ihi ya, ka anyị ghara ịrụ ọrụ ọ bụla gbasara ọchịchịrị,+ kama ka anyị yiri ngwá agha nke ìhè.+ 13 Otú ahụ ndị mmadụ na-eme n’ehihie mgbe onye ọ bụla na-ahụ ibe ya, ka anyị na-akpa àgwà kwesịrị ekwesị,+ ghara iso na-eri oriri oké mkpọtụ na ịna-aṅụ oké mmanya, ghara inwe mmekọahụ na-ekwesịghị ekwesị na ime ihe ọjọọ n’asọghị anya,*+ gharakwa ịna-ese okwu na ịna-ekwo ekworo.+ 14 Kama yirinụ Onyenwe anyị Jizọs Kraịst ka uwe.*+ Unu anọkwala na-eche otú unu ga-esi eme ihe na-agụ ahụ́ unu agụụ.+

14 Nabatanụ onye okwukwe ya na-esighị ike,+ ma unu ekpela ya ikpe maka otú o si ele ihe anya.* 2 Onye okwukwe ya siri ike na-eri ihe niile, ma onye okwukwe ya na-esighị ike na-eri naanị akwụkwọ nri. 3 Ka onye na-eri ihe niile ghara ileda onye na-anaghị eri ihe niile anya, ka onye na-anaghịkwa eri ihe niile ghara ikpe onye na-eri ihe niile ikpe+ n’ihi na Chineke anabatala onye ahụ. 4 Ònye ka ị bụ na ị ga na-ekpe onye na-ejere onye ọzọ ozi ikpe?+ Ọ bụ Chineke bụ́ nna ya ukwu ga-ekpebi ma ihe ọ na-eme ọ̀ dị mma ka ọ̀ dị njọ.+ N’eziokwu, ebe Jehova* na-enyere ya aka, ihe ọ na-eme ga-adị ya mma.

5 Otu onye na-ewere na otu ụbọchị ka ụbọchị ndị ọzọ.+ Onye ọzọ na-ewere na ụbọchị niile bụ otu ihe.+ Ka obi sie onye ọ bụla ezigbo ike n’ihe o kweere. 6 Onye na-edebe otu ụbọchị ka ụbọchị pụrụ iche na-edebe ya maka Jehova.* Onye na-eri ihe niile na-eri ya maka Jehova* n’ihi na ọ na-ekele Chineke.+ Onye na-anaghịkwa eri ihe niile anaghị eri ya maka Jehova,* ma ọ na-ekelekwa Chineke.+ 7 N’eziokwu, e nweghị onye n’ime anyị dị ndụ maka naanị onwe ya,+ e nweghịkwa onye na-anwụ maka naanị onwe ya. 8 N’ihi na ọ bụrụ na anyị dị ndụ, anyị dị ndụ maka Jehova,*+ ọ bụrụkwa na anyị nwụrụ anwụ, anyị nwụrụ maka Jehova.* N’ihi ya, ma ànyị dị ndụ ma ànyị nwụrụ anwụ, anyị bụ nke Jehova.*+ 9 N’ihi na ọ bụ ya mere Kraịst ji nwụọ ma dị ndụ ọzọ, ka o wee bụrụ Onyenwe ndị nwụrụ anwụ na ndị dị ndụ.+

10 Ma gịnị mere i ji ekpe nwanna gị ikpe?+ Ma ọ bụ, gịnị mere i jikwa eleda nwanna gị anya? N’ihi na anyị niile ga-eguzo n’ihu oche ikpe Chineke.+ 11 N’ihi na e dere, sị: “Ọ bụ ihe a ka Jehova* kwuru, ‘Ebe ọ bụ na m na-adị ndụ,+ ikpere niile ga-egburu m n’ala, ire niile ga-ekwupụtakwa na m bụ Chineke.’”+ 12 N’ihi ya, onye ọ bụla n’ime anyị ga-aza Chineke ajụjụ maka onwe ya.+

13 N’ihi ya, ka anyị kwụsị ịna-ekpe ibe anyị ikpe,+ kama ka anyị kpebie na anyị agaghị edowe ihe mkpọbi ụkwụ n’ihu nwanna ma ọ bụ mee ihe ga-eme ka o mehie.+ 14 Ebe m bụ onye na-eso ụzọ Onyenwe anyị Jizọs, ama m, o dokwara m anya na e nweghị ihe na-eji aka ya aghọ ihe rụrụ arụ.+ Ọ bụ naanị mgbe mmadụ weere na ihe rụrụ arụ ka ihe ahụ bụụrụ onye ahụ ihe rụrụ arụ. 15 N’ihi na ọ bụrụ na nri ị na-eri na-akpasu nwanna gị iwe, ị naghịzi egosi na ị hụrụ ya n’anya.+ Ekwela ka nri ị na-eri bibie* nwanna gị, onye Kraịst nwụrụ maka ya.+ 16 N’ihi ya, unu emela ihe unu chere na ọ dị mma ma ọ bụrụ na ọ na-eme ka ndị mmadụ na-ekwu okwu ọjọọ gbasara unu. 17 N’ihi na ọ bụghị iri nri na ịṅụ mmanya ga-eme ka mmadụ baa n’Alaeze Chineke,+ kama ọ bụ ezi omume na udo na ọṅụ, nke mmụọ nsọ na-eme ka mmadụ nwee. 18 N’ihi na Chineke na-anabata onye ọ bụla si otú a agbara Kraịst ohu, ihe onye ahụ na-adịkwa ndị mmadụ mma.

19 N’ihi ya, ka anyị na-eme ihe ọ bụla anyị nwere ike ime ka anyị na ndị ọzọ na-adị n’udo,+ ka anyị na-emekwa ihe ndị ga-agba ibe anyị ume.+ 20 Kwụsịnụ imebi ọrụ Chineke naanị n’ihi nri.+ N’eziokwu, ihe niile dị ọcha. Ma ọ dịghị mma ka mmadụ rie ihe ma ọ bụrụ na ọ ga-eme ka onye ọzọ zọhie ụkwụ.+ 21 Ọ ka mma ka ị ghara ịta anụ ma ọ bụ ịṅụ mmanya ma ọ bụ ime ihe ọ bụla ga-eme ka nwanna gị zọhie ụkwụ.+ 22 Okwukwe ahụ i nwere, were ya ka ihe dị n’etiti gị na Chineke. Ọ bụrụ na obi mmadụ anaghị ama ya ikpe mgbe ọ na-eme ihe o kpebiri ime, onye ahụ na-enwe obi ụtọ. 23 Ma ọ bụrụ na o nwee obi abụọ, a maala ya ikpe ma o rie ya n’ihi na o jighị okwukwe rie ya. N’eziokwu, ihe ọ bụla a na-ejighị okwukwe mee bụ mmehie.

15 Ma, anyị ndị siri ike n’okwukwe kwesịrị ịna-enyere ndị okwukwe ha na-esighị ike aka,+ ọ bụghị ịna-eme ihe ndị ga-amasị anyịnwa.+ 2 Ka onye ọ bụla n’ime anyị na-eme ihe na-amasị onye agbata obi ya ma na-emere ya ihe dị mma, ka e wee gbaa ya ume.+ 3 N’ihi na Kraịst emeghịdị ihe masịrị ya,+ kama e dere banyere ya, sị: “Ọ bụ m ka ndị na-akparị gị kparịrị.”+ 4 N’ihi na e dere ihe niile e dere n’oge gara aga ka e jiri ha kụziere anyị ihe,+ ka obi anyị na-atachi+ na nkasi obi anyị na-enweta n’Akwụkwọ Nsọ wee mee ka anyị nwee olileanya.+ 5 Ka Chineke onye na-eme ka anyị tachie obi na onye na-akasi anyị obi mee ka unu na-eche echiche ka Kraịst Jizọs, 6 ka unu wee jiri otu obi+ na otu olu* na-enye Chineke na Nna Onyenwe anyị Jizọs Kraịst otuto.

7 N’ihi ya, na-anabatanụ ibe unu+ otú Kraịst nabatara unu,+ ka e wee nye Chineke otuto. 8 N’ihi na ana m agwa unu na Kraịst ghọrọ onye na-ejere ndị e biri úgwù ozi+ iji gosi na Chineke na-ekwu eziokwu, ka o wee gosi na nkwa niile Chineke kwere ndị nna nna ha bụ eziokwu+ 9 nakwa ka ndị mba ọzọ wee nye Chineke otuto n’ihi ebere ya.+ Otú ahụ ka e dere ya, sị: “Ọ bụ ya mere m ga-eji nọrọ ná mba dị iche iche too gị, m ga-abụkwa abụ iji too aha gị.”+ 10 E dekwara, sị: “Unu mba niile, soronụ ndị ya ṅụrịa ọṅụ.”+ 11 Ebe ọzọ n’Akwụkwọ Nsọ sịkwara: “Mba niile, toonụ Jehova,* ka mmadụ niile tookwa ya.”+ 12 Aịzaya sịkwara: “A ga-enwe onye ga-esi n’ezinụlọ* Jesi.+ Ọ ga-achịkwa mba dị iche iche.+ Mba dị iche iche ga-enwe olileanya na ya.”+ 13 Ka Chineke onye na-eme ka anyị nwee olileanya mee ka unu nwee ọṅụ na udo zuru ezu ebe ọ bụ na unu tụkwasịrị ya obi, ka ike mmụọ nsọ wee mee ka unu nwee olileanya.+

14 Ụmụnna m, obi siri m ike na unu na-eme ihe dị mma mgbe niile, mara ihe niile unu kwesịrị ịma, nakwa na unu na-adụli ibe unu ọdụ.* 15 Ma, e nwere ihe ụfọdụ m gwara unu hoo haa banyere ha n’akwụkwọ ozi a, ka m wee chetara unu ihe ndị ahụ ọzọ maka na Chineke meere m amara 16 ka m wee bụrụ onye ozi Kraịst Jizọs ma na-ejere mba dị iche iche ozi.+ Ana m arụ ọrụ dị nsọ nke bụ́ ikwusa ozi ọma banyere Chineke,+ ka mba ndị a wee bụrụ àjà ga-adị Chineke mma, nke e ji mmụọ nsọ mee ka ọ dị nsọ.

17 N’ihi ya, ebe m bụ onye na-eso ụzọ Kraịst Jizọs, e nwere ihe mere m ga-eji na-aṅụrị ọṅụ n’ihi ozi m na-ejere Chineke. 18 N’ihi na agaghị m anwa anwa kwuo ihe ọ bụla ma ọ́ bụghị gbasara ihe Kraịst si n’aka m rụọ ka mba dị iche iche wee rubere ya isi. O si n’ihe ndị m kwuru na ihe ndị m mere rụọ ha, 19 jirikwa ọrụ ebube na ihe ịtụnanya+ nakwa ike mmụọ nsọ Chineke rụọ ha. Ọ bụ ya mere m ji nwee ike ikwusa ozi ọma banyere Kraịst nke ọma malite na Jeruselem ma gazuo Ilirikọm.+ 20 N’eziokwu, m si otú a gbaa mbọ ka m ghara izisa ozi ọma n’ebe e merela ka a mata aha Kraịst, ka m ghara ịrụwa ọrụ onye ọzọ maliterela.* 21 Kama m mere ihe dabara n’ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ, sị: “Ndị na-anụghị ihe ọ bụla gbasara ya ga-ahụ ụzọ, ndị na-anụbeghịkwa ga-aghọta.”+

22 Ọ bụkwa ya mere na abịabeghị m na nke unu n’agbanyeghị na e nweela ọtụtụ ugboro m chọrọ ịbịa. 23 Ma ugbu a, ekwusaala m ozi ọma n’ebe niile n’ógbè ndị a. Ọ na-agụkwa m agụụ kemgbe ọtụtụ afọ* ịbịa na nke unu. 24 N’ihi ya, enwere m olileanya na m ga-abata hụ unu ma m gawa Spen. M nwekwara olileanya na unu ga-edupụtụ m ma mụ na unu nọrịtụchaa. 25 Ma ugbu a, achọwala m ịga Jeruselem ka m gaa jeere ndị nsọ ozi.+ 26 N’ihi na obi dị ndị nọ na Masedonia na Akeya ụtọ isi n’ihe ndị ha nwere tụkọta ihe a ga-enye ndị dara ogbenye n’ime ndị nsọ nọ na Jeruselem.+ 27 N’eziokwu, obi dị ha ụtọ ime otú ahụ. Ha jidị ha ụgwọ ime ya. N’ihi na ọ bụrụ na mba dị iche iche ritere uru n’ihe Chineke nyere ndị nsọ ahụ, ha jikwa ụgwọ iji ihe ndị ha nwere jeere ndị nsọ ozi.+ 28 N’ihi ya, mgbe m bugachara onyinye a* ma hụ na o ruola ha aka, m ga-abata na nke unu ma m gawa Spen. 29 Amakwa m na mgbe m ga-abịa na nke unu, m ga-ewetara unu ngọzi buru ibu si n’aka Kraịst.

30 Ụmụnna m, ebe ọ bụ na anyị nwere okwukwe n’Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, mmụọ nsọ emeekwa ka anyị hụ ibe anyị n’anya, m na-agba unu ume ka unu soro m na-arịọsi Chineke arịrịọ ike n’ekpere maka m,+ 31 ka a napụta m+ n’aka ndị nọ na Judia na-ekweghị na Jizọs nakwa ka ndị nsọ nabata ozi m ga-ejere ha na Jeruselem.+ 32 Ọ ga-eme ka m jiri ọṅụ bịakwute unu, anyị agbarịta ibe anyị ume, ma ọ bụrụ uche Chineke. 33 Ka Chineke onye na-eme ka anyị nwee udo* nọnyere unu niile.+ Amen.

16 Ana m eme ka unu mata Fibi, nwanna anyị nwaanyị, onye na-eje ozi n’ọgbakọ dị na Senkrea,+ 2 ka unu wee nabata ya n’aha Onyenwe anyị otú e kwesịrị isi anabata ndị nsọ* ma nyere ya aka n’ihe ọ bụla o nwere ike ịchọ ka unu nyere ya aka,+ n’ihi na yanwa agbachiterela ọtụtụ ndị, ma mụnwa.

3 Keleerenụ m Priska na Akwịla,+ ndị mụ na ha na-arụ ọrụ Kraịst Jizọs, 4 ndị mere ihe gaara ata isi ha n’ihi m.*+ Ọ bụghị naanị m na-ekele ha, kama ọgbakọ niile dị ná mba dị iche iche na-ekelekwa ha. 5 Keleekwanụ ọgbakọ na-ezukọ n’ụlọ ha.+ Keleenụ onye m hụrụ n’anya bụ́ Epinetọs, onye so ná ndị mbụ ghọrọ ndị na-eso ụzọ Kraịst n’Eshia. 6 Keleenụ Meri, onye rụụrụ unu nnukwu ọrụ. 7 Keleenụ Andrọnaịkọs na Junias, bụ́ ndị ikwu m+ a tụrụ mụ na ha mkpọrọ, ndị ndịozi ma nke ọma, ndị bu m ụzọ sowe ụzọ Kraịst.

8 Keleerenụ m Amplietọs, onye m hụrụ n’anya na-eso ụzọ Onyenwe anyị. 9 Keleenụ Ọbenọs, onye anyị na ya na-arụrụ Kraịst ọrụ, nakwa Stekis onye m hụrụ n’anya. 10 Keleenụ Apelis, onye omume ya dị Kraịst mma. Keleenụ ndị si n’ezinụlọ Arịstọbulọs. 11 Keleenụ Herodiọn onye ikwu m. Keleenụ ndị si n’ezinụlọ Nasisọs, ndị na-eso ụzọ Onyenwe anyị. 12 Keleenụ Traịfina na Traịfosa, bụ́ ụmụ nwaanyị na-arụsi ọrụ Onyenwe anyị ike. Keleenụ Pesis, nwanna nwaanyị anyị hụrụ n’anya, n’ihi na ọ rụsiiri Onyenwe anyị ọrụ ike. 13 Keleenụ Rufọs, onye pụrụ iche na-ejere Onyenwe anyị ozi. Keleekwanụ nne ya, onye bụ́kwa nne m. 14 Keleenụ Asịnkritọs, Fligọn, Hemis, Patrọbas, Hemas, na ụmụnna ha na ha nọ. 15 Keleenụ Filọlọgọs na Julia, Niriọs na nwanne ya nwaanyị, na Olimpas, nakwa ndị nsọ niile ha na ha nọ. 16 Susuonụ ibe unu ọnụ mgbe unu na-ekele ibe unu.* Ọgbakọ niile nke Kraịst na-ekele unu.

17 Ụmụnna m, m na-agba unu ume ka unu kpachara anya maka ndị na-akpata nkewa ma na-eme ihe ndị nwere ike ime ka unu zọhie ụkwụ. Ihe ndị a ha na-eme dị iche n’ihe a kụziiri unu. Zerekwanụ ndị ahụ.+ 18 N’ihi na ụdị ndị ahụ anaghị agbara Onyenwe anyị Kraịst ohu, kama ọ bụ ihe na-agụ ahụ́ ha agụụ* ka ha na-agbara ohu. Ha na-ekwukwa okwu na-atọ ụtọ ma na-aja ndị mmadụ mma na-esighị ha n’obi ka ha rafuo ndị na-ebughị ihe ọjọọ n’obi. 19 Mmadụ niile amarala na unu na-erube isi. N’ihi ya, ihe unu na-eme na-eme m obi ụtọ. Ma achọrọ m ka unu bụrụ ndị ma ihe ma a bịa n’ihe dị mma, ma bụrụ ndị aka ha dị ọcha ma a bịa n’ihe ọjọọ.+ 20 Chineke, onye na-eme ka anyị nwee udo, ga-azọpịa Setan+ n’okpuru ụkwụ unu n’oge na-adịghị anya. Ka Onyenwe anyị Jizọs meere unu amara.

21 Timoti onye ọrụ ibe m na-ekele unu. Lushiọs, Jesin, na Sosipata, bụ́ ndị ikwu m,+ na-ekelekwa unu.

22 Mụnwa bụ́ Teshiọs, onye deere Pọl akwụkwọ ozi a, na-ekele unu n’aha Onyenwe anyị.

23 Gayọs,+ onye m nọ n’ụlọ ya, onye ọgbakọ a niile na-ezukọkwa n’ụlọ ya, na-ekele unu. Erastọs, onye na-ahụ maka ego obodo,* na-ekele unu. Kwọtọs nwanne ya nwoke na-ekelekwa unu. 24* ——

25 Ozi ọma m na-ezisa na ozi m na-ekwusa banyere Jizọs Kraịst gosiri na Chineke ga-emeli ka unu guzosie ike. Ozi ọma a dabara n’ihe dị nsọ e kpughere nke e zoro ezo+ kemgbe oge dị anya. 26 Ma, e meela ka a mata* ya ugbu a. E jirikwala amụma ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ mee ka mba niile mata ya. Ihe a dabara n’iwu Chineke onye na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi nyere ka mba niile wee nwee okwukwe na ya ma na-erubere ya isi. 27 Ka e si n’aka Jizọs Kraịst nye Chineke, onye naanị ya ma ihe,+ otuto ruo mgbe ebighị ebi. Amen.

Na Grik, “onye si ná mkpụrụ Devid.”

Ma ọ bụ “ihe ndị na-akpụ akpụ.”

Ma ọ bụ “na-egbukwa ọchụ.”

Na Grik, “dabara n’eziokwu.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Ya bụ, Iwu Mosis.

Ya bụ, Iwu Mosis.

Ya bụ, Iwu Mosis.

Ya bụ, Iwu Mosis.

Ya bụ, Iwu Mosis.

Na Grik, “Akpịrị.”

Na Grik, “Ụkwụ ha.”

Na Grik, “awụfu ọbara.”

Ya bụ, Iwu Mosis.

Ya bụ, Iwu Mosis.

Na Grik, “anụ ahụ́.”

“Iwu Mosis na Akwụkwọ Ndị Amụma” pụtara Akwụkwọ Nsọ Hibru niile.

Ya bụ, n’ọbara Jizọs.

Ma ọ bụ “ndidi.”

Gụọ A5.

Ma ọ bụ “a gbaghaara.”

Gụọ A5.

Na Grik, “mkpụrụ.”

Ya bụ, Iwu Mosis.

Na Grik, “mkpụrụ.”

Ya bụ, Iwu Mosis.

O nwere ike ịbụ, “onye na-eme ka ihe na-adịghị adị dịrị.”

Na Grik, “mkpụrụ.”

Na Grik, “onye akpa nwa ya nwụrụ anwụ.”

O nwere ike ịbụ, “Anyị na-aṅụrị ọṅụ.”

O nwere ike ịbụ, “kama anyị na-aṅụrị ọṅụ.”

Na Grik, “ndị na-adịghị ike.”

Ya bụ, Iwu Mosis.

Ya bụ, Iwu Mosis.

Ma ọ bụ “a tọpụla onye nwụrụ anwụ ná; a gbagharala onye nwụrụ anwụ.”

Ma ọ bụ “na-erube isi n’ụdị ozizi e nyefere.”

Ya bụ, Iwu Mosis.

Ya bụ, Iwu Mosis.

Ya bụ, Iwu Mosis.

Ya bụ, Iwu Mosis.

Ya bụ, Iwu Mosis.

Ya bụ, Iwu Mosis.

Ya bụ, Iwu Mosis.

Ya bụ, Iwu Mosis.

Ya bụ, Iwu Mosis.

Ya bụ, Iwu Mosis.

Ya bụ, Iwu Mosis.

Ya bụ, Iwu Mosis.

Aba bụ okwu Hibru ma ọ bụ Arameik. Ọ pụtara “Nna!”

Ọ bụ ụmụ mmadụ ka a na-ekwu maka ha.

Ọ bụ ụmụ mmadụ ka a na-ekwu maka ha.

Ọ bụ ụmụ mmadụ ka a na-ekwu maka ha.

Ọ bụ ụmụ mmadụ ka a na-ekwu maka ha.

Ma ọ bụ “Ònye.”

Na Grik, “mkpụrụ.”

Ma ọ bụ “onye a ga-akpọ nwa.” Na Grik, “mkpụrụ.”

Na Grik, “mkpụrụ.”

Na Grik, “ọ dịghị n’aka onye na-achọ ma ọ bụ n’aka onye na-agba ọsọ.”

Gụọ A5.

Ma ọ bụ “mee ihe o kpebiri ọsọ ọsọ.”

Gụọ A5.

Na Grik, “mkpụrụ.”

Ma ọ bụ “oké nkume nke na-eme ka ndị mmadụ daa.”

Ya bụ, Iwu Mosis.

Ma ọ bụ “n’olulu na-enweghị nsọtụ.”

Ma ọ bụ “okwukwe ya.”

Gụọ A5.

Na Grik, “rubere isi n’ozi ọma.”

Gụọ A5.

Ma ọ bụ “n’ihe anyị kwuru?”

Na Grik, “ná mkpụrụ.”

Gụọ A5.

Na Grik, “na-achọ mkpụrụ obi m.”

Na Grik, “ka ahụ́ m.”

Ma ọ bụ “na-eturu ha ọnụ.”

Ma ọ bụ “Onye nzọpụta.”

Gụọ A5.

Ma ọ bụ “na-enwere anyị ọmịiko.”

Gụọ Nkọwa Okwu.

Ma ọ bụ “na-adụ ndị ọzọ ọdụ.”

Ma ọ bụ “dụwa ha ọdụ.”

Ma ọ bụ “na-enye ihe.”

Ma ọ bụ “ịnụ ọkụ n’obi.”

Ma ọ bụ “jidesienụ ihe ọma ike.”

Ma ọ bụ “Na-agbasinụ mbọ ike.”

Gụọ A5.

Ma ọ bụ “ka obi unu ghara ịna-adị n’ihe ukwu.”

Ya bụ, ọnụma Chineke.

Gụọ A5.

Ya bụ, ime ka obi onye ahụ jụrụ.

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Ma ọ bụ “egbula ọchụ.”

Ma ọ bụ “ime ihe ọjọọ n’emeghị ihere.” Grik, a·sel′gei·a. Gụọ Nkọwa Okwu.

Ma ọ bụ “ṅomienụ Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.”

O nwere ike ịbụ, “maka ihe ndị dị ya n’obi.”

Gụọ A5.

Gụọ A5.

Gụọ A5.

Gụọ A5.

Gụọ A5.

Gụọ A5.

Gụọ A5.

Gụọ A5.

Ya bụ, mee ka ọ ghara inwekwa okwukwe ma ọ bụ ka ọ ghara inweta ndụ ebighị ebi n’ọdịnihu.

Na Grik, “ọnụ.”

Gụọ A5.

Na Grik, “ga-enwe mgbọrọgwụ.”

Ma ọ bụ “na-akụziri ibe unu ihe.”

Na Grik, “ịrụ ihe na ntọala onye ọzọ tọrọ.”

O nwere ike ịbụ, “afọ ole na ole.”

Na Grik, “mkpụrụ a.”

Na Grik, “Chineke nke udo.”

Ma ọ bụ “otú ndị nsọ kwesịrị isi anabata ndị ọzọ.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”

Otú e si ekele mmadụ n’oge ahụ bụ isusu ya ọnụ, dị ka isusu ya ọnụ na ntì.

Ma ọ bụ “afọ ha.”

Ma ọ bụ “onye na-ejere obodo ozi.”

Gụọ A3.

Ma ọ bụ “e kpugheela.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya