AKWỤKWỌ OZI E DEGAARA NDỊ HIBRU
1 Ogologo oge gara aga, Chineke si n’ọnụ ndị amụma gwa nna nna anyị hà okwu ọtụtụ mgbe, o sikwa n’ọtụtụ ụzọ gwa ha ya.+ 2 Ma n’ọgwụgwụ oge ndị a, o si n’ọnụ Ọkpara ya gwa anyị okwu,+ onye ọ họpụtara ka o keta ihe niile,+ onye o sikwa n’aka ya kee ihe ndị dị n’eluigwe na n’ụwa.*+ 3 Ọ bụ onyinyo ebube Chineke.+ O yikwara nnọọ Chineke,+ ọ na-ejikwa okwu ya dị ike eme ka ihe niile na-adị. Mgbe ọ sachapụchara mmehie anyị,+ ọ nọdụrụ ala n’aka nri Onye Ukwu ahụ, n’ebe dị elu.+ 4 N’ihi ya, ọ kala ndị mmụọ ozi mma,+ ebe ọ bụ na o nwetala* aha ka nke ha mma.+
5 Dị ka ihe atụ, ònye n’ime ndị mmụọ ozi ka Chineke gwatụrụla, sị: “Ị bụ ọkpara m. Abụrụla m nna gị taa”?+ ma ọ bụ “M ga-abụ nna ya, ọ ga-abụkwa ọkpara m”?+ 6 Ma gbasara oge Chineke ga-ezite Nwa Mbụ ya+ ọzọ n’ụwa,* ọ sịrị: “Ka ndị mmụọ ozi niile nke Chineke kpọọrọ ya isiala.”
7 O kwukwara banyere ndị mmụọ ozi, sị: “Ọ na-eme ka ndị mmụọ ozi ya sie ike, na-emekwa ka ndị ozi ya*+ bụrụ ire ọkụ.”+ 8 Ma o kwuru banyere Ọkpara ya, sị: “Ọ bụ Chineke nyere gị ikike ịchị*+ ruo mgbe niile ebighị ebi, mkpanaka Alaeze gị bụkwa mkpanaka ezi omume.* 9 Ị hụrụ ezi omume n’anya, ị kpọkwara mmebi iwu asị. Ọ bụ ya mere Chineke, bụ́ Chineke gị, ji tee gị mmanụ+ ma mee ka ị na-aṅụrị ọṅụ karịa ndị ibe gị.”+ 10 E kwukwara, sị: “Onyenwe anyị, ị tọrọ ntọala ụwa ná mmalite, ọ bụkwa gị kere eluigwe. 11 Ha ga-ala n’iyi, ma ị ga na-adị ndụ. Ha niile ga-aka nká ka uwe. 12 Ị ga-afụkọtakwa ha ka ákwà mgbokwasị, a ga-agbanwekwa ha ka uwe. Ma ị ka bụ onye ị bụ, e nweghịkwa mgbe ị ga-akwụsị ịdị ndụ.”+
13 Ma ònye n’ime ndị mmụọ ozi ka ọ gwatụrụla, sị: “Nọdụ ala n’aka nri m ruo mgbe m ga-eme ka ndị iro gị bụrụ ihe i ji agbakwasị ụkwụ”?+ 14 Ọ̀ bụ na ha niile abụghị ndị mmụọ na-eje ozi dị nsọ,*+ ndị e zipụrụ ka ha jeere ndị a ga-azọpụta ozi?
2 Ọ bụ ya mere anyị ji kwesị ichebara ihe ndị anyị nụrụ echiche karịa otú anyị na-eme,+ ka a ghara inwe mgbe anyị ga-akpafu.+ 2 N’ihi na ọ bụrụ na okwu e si n’ọnụ ndị mmụọ ozi+ kwuo mezuru, ọ bụrụkwa na a tara onye ọ bụla dara iwu na onye ọ bụla nupụrụ isi ahụhụ kwesịrị ya,+ 3 olee otú a ga-esi ghara ịta anyị ahụhụ ma ọ bụrụ na anyị leghaara nnukwu ihe Chineke mere ka e wee zọpụta anyị anya?+ Ọ bụ Onyenwe anyị malitere ikwu banyere nnukwu ihe a.+ Ndị nụrụ ihe o kwuru gbakwara akaebe na ọ bụ eziokwu. 4 Chineke sokwa gbaa àmà. O ji ihe àmà na ihe ịtụnanya na ọrụ ebube dị iche iche+ nakwa mmụọ nsọ ya o nyere ndị na-ejere ya ozi otú o si chọọ gbaa àmà a.+
5 N’ihi na ọ bụghị ndị mmụọ ozi ka o mere ka ha bụrụ ndị ga-achị ụwa* nke ga-abịa,+ nke anyị na-ekwu banyere ya. 6 Ma otu onye gbara àmà n’otu ebe, sị: “Gịnị ka mmadụ bụ nke mere i ji na-echeta ya? Ma ọ bụ, gịnị ka nwa nke mmadụ bụ nke mere i ji na-elekọta ya?+ 7 I mere ka ndị mmụọ ozi katụ ya. I ji ebube na nsọpụrụ chọọ ya mma, meekwa ka o lekọtawa ọrụ aka gị. 8 I mere ka ihe niile dịrị n’okpuru ya.”+ Ebe ọ bụ na Chineke mere ka ihe niile dịrị n’okpuru ya,+ e nweghị ihe ọ bụla ọ na-emeghị ka ọ dịrị n’okpuru ya.+ Ma, anyị ahụwabeghị ka Jizọs na-achị ihe niile.+ 9 Ma anyị na-ahụ Jizọs, onye e mere ka ndị mmụọ ozi kara,+ ka e ji ebube na nsọpụrụ chọọ ya mma maka na ọ nwụrụ.+ N’ihi amara Chineke, ọ nwụrụ maka mmadụ niile.+
10 Onye ahụ ihe niile dị n’ihi ya, onye ihe niile sikwa n’aka ya dịrị, nọ na-eme ka ọtụtụ ụmụ ya dị ebube.+ N’ihi ya, o kwesịrị ekwesị na o mere ka Nnukwu Onye Ndú e si n’aka ya zọpụta ha+ taa ahụhụ, ka ahụhụ ọ tara wee mee ka o zuo okè.+ 11 N’ihi na ma onye mere ka ha dị nsọ ma ndị e mere ka ha dị nsọ+ sicha n’otu onye.+ N’ihi ya, ihere anaghị eme ya ịkpọ ha ụmụnna ya,+ 12 otú o kwuru, sị: “M ga-akọsara ụmụnna m aha gị. M ga-eji abụ too gị n’ime ọgbakọ.”+ 13 O kwukwara, sị: “M ga-atụkwasị ya obi.”+ Ọ sịkwara: “Leenụ mụ na ụmụaka Jehova* nyere m.”+
14 N’ihi ya, ebe ọ bụ na “ụmụaka” ahụ bụ ụmụ mmadụ ndị nwere anụ ahụ́ na ọbara, ọ ghọkwara mmadụ nke nwere anụ ahụ́ na ọbara,+ ka o wee si n’ọnwụ ya bibie Ekwensu,+ onye nwere ikike ịkpata ọnwụ+ 15 nakwa ka o wee tọhapụ ndị niile egwu ọnwụ mere ka ha bụrụ ndị ohu ná ndụ ha niile.+ 16 N’ihi na ọ bụghị ndị mmụọ ozi ka ọ na-enyere aka n’eziokwu, kama ọ bụ ụmụ* Ebreham+ ka ọ na-enyere aka. 17 Ọ bụ ya mere o ji dị ka “ụmụnna” ya n’ụzọ niile,+ ka o wee bụrụ nnukwu onye nchụàjà dị obi ebere, onye a tụkwasịkwara obi n’ozi ọ na-ejere Chineke, nakwa ka o wee chụọ àjà+ maka mmehie ụmụ mmadụ nke ga-eme ka ha na Chineke dị n’udo.+ 18 Ebe ọ bụ na ọ tara ahụhụ mgbe a na-anwa ya ọnwụnwa,+ ọ ga-enyeliri ndị a na-anwa ọnwụnwa aka.+
3 N’ihi ya, ụmụnna m ndị dị nsọ, ndị so ná ndị a kpọrọ òkù ịga eluigwe,+ cheenụ echiche banyere onyeozi na nnukwu onye nchụàjà, onye anyị na-ekwusa banyere ya, ya bụ, Jizọs.+ 2 O rubeere Onye họpụtara ya isi+ otú Mosis rubere isi mgbe ọ na-eje ozi n’ụlọ Onye ahụ.+ 3 N’ihi na e weere na o* ruru eru ka e nye ya otuto+ karịa Mosis, ebe ọ bụ na a na-akwanyere onye rụrụ ụlọ ùgwù karịa ụlọ ọ rụrụ. 4 N’eziokwu, ụlọ ọ bụla nwere onye rụrụ ya, ma onye rụrụ ihe niile bụ Chineke. 5 Mgbe Mosis na-eje ozi n’ụlọ Onye ahụ, o rubere isi ka onye ozi. Ozi o jere gbara akaebe banyere ihe ndị a ga-emecha kwuo okwu ha. 6 Ma Kraịst rubere isi ka ọkpara+ na-elekọta ụlọ Chineke. Anyị bụ ụlọ Onye ahụ+ ma ọ bụrụ na anyị ejiri obi ike na-ekwu okwu ma na-enwe olileanya ahụ anyị ji anya isi ruo n’ọgwụgwụ.
7 N’ihi ya, dị ka e si n’ike mmụọ nsọ kwuo,+ sị: “Taa, ọ bụrụ na unu egee ntị n’olu ya, 8 unu akpọchila obi unu otú nna nna unu hà mere mgbe ha kpasuru m ezigbo iwe, otú ha mere n’ụbọchị ha nwara m n’ala ịkpa,+ 9 bụ́ ebe nna nna unu hà nọ nwaa m ọnwụnwa, leekwa m ule n’agbanyeghị na ha hụrụ ihe ndị m mere ruo afọ iri anọ.+ 10 Ọ bụ ya mere ihe ọgbọ a ji wee m iwe. M wee sị: ‘Ha na-eme isi ike, na-eme naanị ihe dị ha n’obi, ha amatabeghịkwa m.’ 11 M wee jiri iwe ṅụọ iyi, sị: ‘Ha agaghị eso m zuo ike.’”+
12 Ụmụnna m, lezienụ anya ka onye ọ bụla n’ime unu ghara ịhapụ Chineke dị ndụ,+ nke ga-eme ka onye ahụ nwee ajọ obi na-enweghị okwukwe. 13 Ma, na-agbanụ ibe unu ume kwa ụbọchị ebe ọ bụ na anyị ka bi n’oge ahụ a kpọrọ “Taa,”+ ka onye ọ bụla n’ime unu wee ghara ikwe ka ike dị aghụghọ nke mmehie mee ka obi ya kpọchie. 14 N’ihi na, n’eziokwu, anyị ga-eketa ihe Kraịst ketara naanị ma anyị na-enwe obi ike anyị nwere ná mmalite ruo n’ọgwụgwụ.+ 15 Dị ka e kwuru, sị: “Taa, ọ bụrụ na unu egee ntị n’olu ya, unu akpọchila obi unu otú nna nna unu hà mere mgbe ha kpasuru m ezigbo iwe.”+
16 N’ihi na olee ndị nụrụ olu ya ma kpasuo ya oké iwe? Ọ̀ bụ na ọ bụghị ndị niile Mosis si n’Ijipt dupụta?+ 17 Oleekwa ndị nọ na-akpasu Chineke iwe ruo afọ iri anọ?+ Ọ̀ bụ na ọ bụghị ndị ahụ mere mmehie, ndị nwụrụ n’ala ikpa?+ 18 Oleekwa ndị ọ ṅụrụ iyi na ha agaghị eso ya zuo ike? Ọ̀ bụ na ọ bụghị ndị ahụ nupụrụ isi? 19 N’ihi ya, anyị ahụla na ha enweghị ike iso ya zuo ike maka na ha enweghị okwukwe.+
4 N’ihi ya, ebe ọ bụ na Chineke kwuru na anyị ka nwere ike iso ya zuo ike, ka anyị lezie anya* ka a ghara inwe onye ọ bụla n’ime anyị na-agaghị eru eru iso zuo ike ahụ.+ 2 N’ihi na e zikwara anyị ozi ọma+ otú e ziri ha. Ma okwu ha nụrụ abaraghị ha uru n’ihi na ha enweghị ụdị okwukwe ndị rubere isi nwere. 3 N’ihi na anyị ndị nwere okwukwe so na-ezu ike. Ma o kwuru banyere ndị nupụrụ isi, sị: “M wee jiri iwe ṅụọ iyi, sị, ‘Ha agaghị eso m zuo ike,’”+ n’agbanyeghị na ọ na-ezu ike kemgbe a tọrọ ntọala ụwa, mgbe ọ rụchara ọrụ ya.+ 4 N’ihi na e kwuru n’otu ebe n’Akwụkwọ Nsọ banyere ụbọchị nke asaa, sị: “Chineke zuru ike n’ụbọchị nke asaa mgbe ọ rụchara ọrụ ya niile.”+ 5 O kwukwara ọzọ, sị: “Ha agaghị eso m zuo ike.”+
6 Ndị e bu ụzọ zie ozi ọma ahụ esoghị ya zuo ike maka na ha nupụrụ isi.+ Ma, ụfọdụ ndị ka nwere ike iso ya zuo ike. 7 N’ihi ya, mgbe ogologo oge gachara, Chineke kwuru n’abụ ọma Devid otú e kwuburu ya, sị, “Taa, ọ bụrụ na unu egee ntị n’olu ya, unu akpọchila obi unu.”+ O si otú a wepụtaghachi ụbọchị a kpọrọ “Taa.” 8 N’ihi na ọ bụrụ na Joshụa+ du ha gaa n’ebe ha so Chineke zuo ike, Chineke agaraghị emecha kwuo banyere ụbọchị izu ike ọzọ. 9 N’ihi ya, a ka nwere ụbọchị izu ike dịịrị ndị Chineke.+ 10 N’ihi na onye so Chineke ezu ike ezuokwala ike n’ọrụ nke ya otú Chineke zuru n’ọrụ ya.+
11 N’ihi ya, ka anyị gbalịsie ike ka anyị soro ya zuo ike ahụ, ka e wee ghara inwe onye ga-enupụ isi otú ha nupụrụ.+ 12 N’ihi na okwu Chineke dị ndụ ma na-akpa ike.+ Ọ dịkwa nkọ karịa mma agha ọ bụla nwere ihu abụọ.+ Ọ na-amabadị n’ime ime wee kewaa mkpụrụ obi* na mmụọ,* na-ekewakwa nkwonkwo na ụmị ha. O nwekwara ike ịchọpụta ihe mmadụ na-eche na ihe mmadụ bu n’obi. 13 E nweghịkwa ihe e kere eke e zoro ezo n’anya ya,+ kama ihe niile gba ọtọ, gherekwa oghe n’anya onye ahụ anyị ga-aza ajụjụ.+
14 N’ihi ya, ebe anyị nwere nnukwu onye nchụàjà kachanụ nke banyere n’eluigwe, ya bụ, Jizọs Ọkpara Chineke,+ ka anyị na-ekwusa banyere okwukwe anyị nwere na ya.+ 15 N’ihi na nnukwu onye nchụàjà anyị nwere abụghị onye na-agaghị aghọtali* na anyị adịghị ike,+ kama a nwalere ya n’ụzọ niile otú e si anwale anyịnwa, ma o mehieghị.+ 16 N’ihi ya, ka anyị bịa nso n’ocheeze Chineke onye na-eme amara ma jiri obi ike na-ekpe ekpere,+ ka e wee meere anyị ebere, anyị enwetakwa amara ya n’oge kwesịrị ekwesị.
5 Mmadụ ọ bụla a họpụtara ka ọ bụrụ nnukwu onye nchụàjà, a họpụtara ya ka ọ na-ejere ndị mmadụ ozi n’ihe gbasara ofufe ha na-efe Chineke,+ ka o wee na-ewetara Chineke onyinye ha dị iche iche, na-achụkwa àjà maka mmehie ha.+ 2 Ọ na-emetere ndị na-eme mmehie ebere,* ya bụ, ndị na-eme mmehie maka na ha amaghị ihe ziri ezi, ebe ọ bụ na yanwa na-emekwa mmehie. 3 N’ihi ya, ọ na-achụ àjà maka mmehie nke ya otú ọ na-achụ maka mmehie ndị ọzọ.+
4 Mmadụ anaghị ahọpụta onwe ya ka ọ bụrụ nnukwu onye nchụàjà, kama ọ bụ Chineke na-ahọpụta mmadụ, otú ọ họpụtara Erọn.+ 5 Otú ahụ ka ọ dịkwa Kraịst. O toghị onwe ya+ ma jiri aka ya họpụta onwe ya ka ọ bụrụ nnukwu onye nchụàjà, kama ọ bụ Onye nyere ya otuto gwara ya, sị: “Ị bụ ọkpara m. Abụrụla m nna gị taa.”+ 6 Dịkwa ka o kwuru n’ebe ọzọ, sị: “Ị bụ onye nchụàjà dị ka Melkizedek, ị ga-abụkwa onye nchụàjà ruo mgbe ebighị ebi.”+
7 Mgbe Kraịst nọ n’ụwa, o kpesiri ekpere ike, besie ákwá ike ma jiri anya mmiri rịọ+ Onye nwere ike ịzọpụta ya n’ọnwụ arịrịọ. A nụkwara ekpere ya n’ihi na ọ na-atụ egwu Chineke. 8 N’agbanyeghị na ọ bụ ọkpara, o si n’ahụhụ ọ tara mụta irube isi.+ 9 Mgbe e mechara ka o zuo okè,+ ọ ghọrọ onye a ga-esi n’aka ya zọpụta ndị niile na-erubere ya isi. Ọ ga-azọpụta ha ruo mgbe ebighị ebi,+ 10 n’ihi na Chineke ahọpụtala ya ka ọ bụrụ nnukwu onye nchụàjà dị ka Melkizedek.+
11 Anyị nwere ọtụtụ ihe anyị ga-ekwu banyere Kraịst, ịkọwa ihe ndị ahụ sikwara ike n’ihi na unu aghọọla ndị ntị ike.* 12 N’eziokwu, unu ekwesịla ịbụ ndị na-akụziri ndị ọzọ ihe ugbu a, ma onye ọzọ ka ga-ebido n’isi kụziwere unu ihe ndị na-ataghị akpụ+ e dere n’okwu dị nsọ nke Chineke. Ọ bụzi mmiri ara ka a ga-enye unu, ọ bụghị nri siri ike. 13 N’ihi na onye nọgidere na-aṅụ mmiri ara amatabeghị okwu Chineke* n’ihi na ọ bụ nwatakịrị.+ 14 Ma nri siri ike bụ maka ndị tozuru etozu, ya bụ, ndị na-echebara ihe echiche nke ọma. Ha na-esi otú a azụ onwe ha* ka ha mata ihe dị iche n’ihe ọma na ihe ọjọọ.
6 N’ihi ya, ebe anyị mụtarala ihe ndị mbụ a kụziiri anyị+ banyere Kraịst, ka anyị jisie ike na-eme nke ọma ruo mgbe anyị tozuru etozu.+ Ka anyị ghara ịlaghachi azụ mụwa ihe ndị mbụ a kụziiri anyị,* ya bụ, ịmụ banyere isi n’ọrụ na-abaghị uru* chegharịa, inwe okwukwe na Chineke, 2 ụdị baptizim dị iche iche, ibikwasị mmadụ aka n’isi,+ ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ,+ nakwa ihe Chineke kpebiri nke ga-adịru mgbe ebighị ebi. 3 Anyị ga-etozu etozu ma ọ bụrụ uche Chineke.
4 N’ihi na ndị e merela ka ha ghọta eziokwu,+ ndị detụrụ onyinye si n’eluigwe e nyere n’efu ire, ndị nwetarala mmụọ nsọ, 5 ndị detụrụ okwu Chineke nke dị ezigbo mma ire, detụkwa ihe ọma ndị ga-eme n’ọdịnihu ire,* 6 ma ha adapụ n’okwukwe,+ e nweghị ike ime ka ha chegharịa ọzọ n’ihi na ha na-akpọgide Ọkpara Chineke n’osisi ọzọ ma na-eme ka ihere mee ya n’ihu ọha.+ 7 Chineke na-eji mmiri na-ezo ugboro ugboro agọzi ala n’ihi na ala na-amịrị mmiri ozuzo ma puoro ndị kọrọ ihe na ya ihe ha kọrọ. 8 Ma, o puo ogwu na uke, e nweghịzi ihe a na-eji ya eme. Obere oge a ga-abụ ya ọnụ. E mechaakwa, a ga-esu ya ọkụ.
9 Ma unu ndị anyị hụrụ n’anya, obi siri anyị ike na unu ka ndị dapụrụ n’okwukwe mma, unu na-emekwa ihe ga-eme ka a zọpụta unu, n’agbanyeghị na anyị na-ekwu ihe a. 10 N’ihi na Chineke abụghị onye ajọ omume. Ọ gaghị echefu ọrụ unu na otú unu si gosi na unu ji aha ya kpọrọ ihe*+ n’ihi na unu jeere ndị nsọ ozi ma ka na-ejere ha ozi. 11 Ma anyị chọrọ ka onye ọ bụla n’ime unu na-arụsi ọrụ ike otú ahụ, ka obi wee sie unu ike ruo ọgwụgwụ+ na unu ga-enweta ihe unu na-atụ anya ya.+ 12 Anyị achọghị ka unu dịrị umengwụ,+ kama na-emenụ ka ndị ahụ, bụ́ ndị okwukwe ha na ndidi ha mere ka e kwe ha nkwa.
13 N’ihi na mgbe Chineke kwere Ebreham nkwa, o ji onwe ya ṅụọ iyi+ ebe ọ bụ na e nweghị onye ka yanwa. 14 Ọ sịrị: “N’eziokwu, m ga-agọzi gị. N’eziokwu, m ga-eme ka ị dị ọtụtụ.”+ 15 Ọ bụ mgbe Ebreham nwechara ndidi ka e kwere ya nkwa a. 16 Ndị mmadụ na-eji onye ka ha aṅụ iyi, iyi ha na-aṅụ na-emekwa ka esemokwu bie n’ihi na ọ na-egosi na ihe ha kwuru bụ eziokwu.+ 17 Chineke mekwara ihe yiri ya. Mgbe o kpebiri ime ka o dokwuo ndị ga-eso nweta ihe ahụ e kwere ná nkwa+ anya na nzube ya* anaghị agbanwe agbanwe, ọ ṅụrụ iyi wee gosi na ihe o kwuru bụ eziokwu. 18 Ihe abụọ a Chineke mere* anaghị agbanwe agbanwe, Chineke emekataghịkwa ghaa ụgha.+ Ihe ndị a na-eme ka obi sie anyịnwa ndị gbabara n’ime ya ike, ka anyị wee ghara ịkwụsị inwe olileanya anyị nwere. 19 Olileanya a anyị nwere+ ji ndụ* anyị otú nko e ji ejide ụgbọ mmiri* si ejide ụgbọ mmiri. O siri ike, e jikwa ya n’aka. Ọ na-edu anyị agafe ákwà mgbochi ahụ,+ 20 nke onye bu anyị ụzọ gaferela n’ihi anyị, ya bụ, Jizọs,+ onye ghọrọ nnukwu onye nchụàjà dị ka Melkizedek, ọ ga-abụkwa onye nchụàjà ruo mgbe ebighị ebi.+
7 N’ihi na Melkizedek a, eze Selem, onye bụ́kwa onye nchụàjà Chineke Onye Kacha Elu, zutere Ebreham mgbe Ebreham gbuchara ndị eze lọtawa, o wee gọzie Ebreham.+ 2 Ebreham nyere ya otu ụzọ n’ụzọ iri n’ihe niile ọ kwatara n’agha. Aha nwoke a pụtara “Eze Ezi Omume.” Ọ bụkwa eze Selem, ya bụ, “Eze Udo.” 3 A maghị onye bụ́ nna ya na onye bụ́ nne ya nakwa agbụrụ o si. A maghịkwa mgbe a mụrụ ya na mgbe ọ nwụrụ. Ma, ebe e mere ka ọ dị ka Ọkpara Chineke, ọ bụ onye nchụàjà mgbe niile.+
4 Nwoke a, onye Ebreham onyeisi ezinụlọ anyị* nyere otu ụzọ n’ụzọ iri n’ihe ndị kacha mma ọ kwatara n’agha, bụ nnukwu mmadụ.+ 5 N’eziokwu, Iwu* kwuru na ụmụ Livaị+ ndị ga-abụ ndị nchụàjà ga na-anata ndị ọzọ,+ ya bụ, ụmụnne ha, otu ụzọ n’ụzọ iri, n’agbanyeghị na ụmụnne ha bụ ụmụ Ebreham.* 6 Ma nwoke a, onye na-esighị n’ezinụlọ Livaị, natara Ebreham otu ụzọ n’ụzọ iri ma gọzie Ebreham, onye Chineke kwere nkwa.+ 7 O doro anya na ọ bụ onye ukwu na-agọzi onye nta. 8 Ụmụ Livaị ndị na-anata otu ụzọ n’ụzọ iri na-anwụ anwụ, ma a gbara àmà na nwoke a na-adị ndụ.+ 9 E nwedịrị ike ikwu na Livaị, onye na-anata otu ụzọ n’ụzọ iri, si n’aka Ebreham kwụọ otu ụzọ n’ụzọ iri, 10 n’ihi na nna nna ya Ebreham amụbeghị ya* mgbe Melkizedek zutere Ebreham.+
11 Ọ bụrụ na ọrụ nchụàjà ndị Livaị na-arụ ga-emeli ka mmadụ zuo okè+ (n’ihi na ọrụ a so n’Iwu ahụ* e nyere ha), ọ̀ ka ga-adị mkpa ka e nwee onye nchụàjà ọzọ, onye e kwuru na ọ dị ka Melkizedek,+ ọ bụghị ka Erọn? 12 Ebe ọ bụ na a na-agbanwe ndị nchụàjà, e kwesịkwara ịgbanwe Iwu ahụ.*+ 13 N’ihi na nwoke a na-ekwu ihe ndị a gbasara ya si n’ebo ọzọ, nke a na-enwebeghị onye si na ya rụrụla ọrụ n’ebe ịchụàjà.+ 14 O doro anya na Onyenwe anyị si n’ebo Juda,+ ma e nweghị mgbe Mosis kwuru na ndị nchụàjà ga-esi n’ebo ahụ.
15 Ihe a edokwuola anyị anya ugbu a ebe ọ bụ na e nweela onye nchụàjà ọzọ,+ onye dị ka Melkizedek,+ 16 onye ghọrọ onye nchụàjà, ọ bụghị n’ihi ebo o si otú iwu kwuru, kama n’ihi na o nwere ike nke na-enye ya ndụ a na-enweghị ike ibibi ebibi.+ 17 N’ihi na a gbara àmà banyere ya, sị: “Ị bụ onye nchụàjà dị ka Melkizedek, ị ga-abụkwa onye nchụàjà ruo mgbe ebighị ebi.”+
18 N’ihi ya, a kagburu iwu mbụ ahụ maka na ọ rụzuchaghị ihe a chọrọ ka ọ rụọ, ọ bakwaghị oké uru.+ 19 N’ihi na Iwu ahụ* emeghị ka ihe ọ bụla zuo okè,+ ma olileanya ka mma+ anyị nwere ugbu a mere ka ihe zuo okè. Anyị sikwa na ya na-abịaru Chineke nso.+ 20 Ebe ọ bụ na Chineke ṅụrụ iyi mgbe ọ họpụtara Jizọs ka ọ bụrụ onye nchụàjà 21 (n’ihi na e nwere ndị nchụàjà Chineke na-aṅụghị iyi tupu e mee ha ndị nchụàjà, ma tupu onye a abụrụ onye nchụàjà, Chineke ṅụrụ iyi banyere ya, sị: “Jehova* aṅụọla iyi, ọ gaghịkwa agbanwe obi ya,* ‘Ị bụ onye nchụàjà ruo mgbe ebighị ebi’”),+ 22 Jizọs bụzi onye a ga-esi n’aka ya mee ka ọgbụgba ndụ ka mma nwee isi.+ 23 Ọtụtụ ndị ghọkwara ndị nchụàjà, onye pụọ ibe ya anọchie,+ maka na ọnwụ ekweghị ka ha nọgide na-arụ ọrụ ha. 24 Ma, ebe ọ bụ na ọ na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi,+ e nweghị onye ga-anọchi ya n’ọrụ nchụàjà ọ na-arụ. 25 N’ihi ya, ọ ga-azọpụtali ndị si n’aka ya na-abịakwute Chineke, ebe ọ bụ na ọ na-adị ndụ mgbe niile ịrịọrọ ha arịrịọ.+
26 N’ihi na ọ bụ ụdị nnukwu onye nchụàjà a ka anyị kwesịrị inwe, onye jisiri Chineke aka ike, onye aka ya dị ọcha, onye a na-emerụghị emerụ,+ onye dị iche ná ndị mmehie, onye e mekwara ka ọ dị elu karịa eluigwe.+ 27 Ọ dịghị ka nnukwu ndị nchụàjà ahụ, ndị na-achụ àjà kwa ụbọchị,+ ha buru ụzọ chụọ maka mmehie nke ha, ha achụzie maka mmehie ndị ọzọ.+ Ọ chụrụ àjà a naanị otu ugboro mgbe o nyefere onwe ya.+ 28 N’ihi na ndị Iwu ahụ* na-ahọpụta ka ha bụrụ nnukwu ndị nchụàjà bụ ndị na-eme mmehie,+ ma iyi a ṅụrụ+ mgbe e nwechara Iwu ahụ* họpụtara otu Ọkpara, onye e mere ka o zuo okè+ ruo mgbe ebighị ebi.
8 Isi ihe anyị na-ekwu bụ na anyị nwere ụdị nnukwu onye nchụàjà a.+ Ọ nọdụkwala ala n’aka nri ocheeze Onye Ukwu ahụ n’eluigwe.+ 2 Ọ na-eje ozi* n’ebe nsọ*+ nakwa n’ezigbo ụlọikwuu nke Jehova* rụrụ, ọ bụghị mmadụ. 3 N’ihi na a na-ahọpụta nnukwu onye nchụàjà ọ bụla ka ọ na-enye Chineke onyinye dị iche iche e wetaara ya nakwa ka ọ na-achụrụ Chineke àjà. Ọ bụ ya mere onye a ji kwesịkwa inwe ihe ọ ga-achụ n’àjà.+ 4 A sị na ọ nọ n’ụwa, ọ garaghị abụ onye nchụàjà,+ ebe ọ bụ na e nweela ndị nchụàjà ndị na-enye Chineke onyinye dị iche iche e wetaara ya otú Iwu* kwuru. 5 Ozi dị nsọ ha na-eje bụ ihe atụ, ọ nọchikwara anya+ ihe ndị dị n’eluigwe.+ Ihe gosiri nke a bụ ihe Chineke nyere Mosis n’iwu mgbe ọ chọrọ ịrụ ụlọikwuu ahụ. Chineke sịrị ya: “Hụ na ị rụrụ ihe niile ka ha dị ka ihe ndị e gosiri gị n’ugwu.”+ 6 Ma ugbu a, e nyela Jizọs ozi ka nnọọ mma* n’ihi na ọ bụkwa onye ogbugbo+ nke ọgbụgba ndụ ka mma.+ Iwu Chineke kwadoro ọgbụgba ndụ a, o hiwekwara isi ná nkwa ndị ka mma.+
7 A sị na e nweghị ihe dị njọ n’ọgbụgba ndụ nke mbụ, a garaghị ekwuwe okwu ọgbụgba ndụ nke abụọ.+ 8 N’ihi na ọ hụrụ na ndị Izrel na-eme ihe na-adịghị mma. Ọ bụ ya mere o ji sị: “Jehova* kwuru, sị, ‘Oge na-abịa mgbe mụ na ndị Izrel na ndị Juda ga-agba ọgbụgba ndụ ọhụrụ. 9 Ọ gaghị adị ka ọgbụgba ndụ ahụ mụ na ndị nna nna ha gbara n’ụbọchị m seere ha n’aka si n’Ijipt kpọpụta ha+ n’ihi na ha hapụrụ ọgbụgba ndụ m, m wee kwụsị ilekọta ha.’ Ọ bụ ihe Jehova* kwuru.
10 “Jehova* kwukwara, sị: ‘Ọgbụgba ndụ mụ na ndị Izrel ga-agba mgbe oge ahụ gachara bụ na m ga-etinye iwu m n’uche ha, m ga-edekwa ya n’obi ha.+ M ga-abụ Chineke ha, ha ga-abụkwa ndị m.’+
11 “‘A gaghịzi enwe onye ga-akụziri nwa amaala ibe ya na nwanne ya, sị: “Mara Jehova.”* N’ihi na ha niile ga-ama m, malite n’onye kacha nta n’ime ha ruo n’onye kacha ukwuu. 12 N’ihi na m ga-agbaghara ha ajọ omume ha, agaghịzi m echeta mmehie ha.’”+
13 Mgbe ọ sịrị “ọgbụgba ndụ ọhụrụ,” o meela ka nke mbụ bụrụ nke ochie.+ Ọ fọrọ obere ka ihe ahụ mere ochie, nke oge ya na-agafekwa, gharazie ịdị.+
9 N’ọgbụgba ndụ nke mbụ ahụ, e nwere iwu na-achị ozi dị nsọ a na-eje,+ ụlọikwuu* ya dịkwa n’ụwa. 2 A rụrụ ụlọikwuu a ka o nwee nkebi abụọ. Ihe ndị dị ná nkebi nke mbụ bụ ihe e ji adọsa ọkụ,*+ tebụl, na achịcha a na-enye Chineke.+ A na-akpọ nkebi a Ebe Nsọ.+ 3 Ma, nkebi nke abụọ nke ụlọikwuu a dị n’azụ ákwà mgbochi nke abụọ.+ A na-akpọ ya Ebe Kacha Nsọ.+ 4 Ihe dị ná nkebi a bụ ihe e ji ọlaedo mee e ji etinye insens*+ nakwa igbe ọgbụgba ndụ+ nke e ji ọlaedo machie ahụ́ ya niile.+ Ihe ndị dị n’ime igbe ọgbụgba ndụ ahụ bụ ite ọlaedo nke mana dị n’ime ya,+ mkpanaka Erọn nke wara okooko,+ na mbadamba nkume abụọ+ e dere ihe Chineke na ndị Izrel gbara ná ndụ. 5 N’elu igbe ahụ, e nwere ndị cherob dị ebube, ndị ji nku ha sachie okwuchi igbe ahụ.*+ Ma ihe a abụghị oge a ga-ekwucha ihe niile gbasara ihe ndị a.
6 Mgbe a rụchara ihe ndị a otú a, ndị nchụàjà na-abanye ná nkebi nke mbụ n’ụlọikwuu a mgbe niile na-eje ozi dị nsọ.+ 7 Ma, ọ bụ naanị nnukwu onye nchụàjà na-abanye ná nkebi nke abụọ. Ọ na-abanye na ya otu ugboro n’afọ.+ O mekataghị banye ma ọ bụrụ na o jighị ọbara+ o ji achụ àjà maka mmehie ya+ nakwa maka mmehie ndị Izrel+ mere n’amaghị ụma. 8 Mmụọ nsọ si otú a mee ka o doo anya na e mebeghị ka a mata ụzọ e si abanye n’ebe nsọ mgbe ụlọikwuu nke mbụ ka dị.+ 9 Ụlọikwuu a bụ ihe atụ maka oge a.+ A ka na-enyekwa onyinye ma na-achụ àjà otú e kwuru ka a na-eme.+ Ma, ihe ndị a anaghị emeli ka akọnuche onye na-eje ozi dị nsọ zuo okè.+ 10 E nweghị ihe ọzọ dị n’onyinye na àjà ndị ahụ ma ọ́ bụghị naanị okwu gbasara ihe oriri na mmanya na ụzọ dị iche iche e si eme ka ihe dị ọcha.*+ Ha bụ iwu e nyere gbasara ahụ́.+ A chọkwara ka a na-edebe ha ruo oge a ga-eme ka ihe ka mma.
11 Ma, mgbe Kraịst bịara ka nnukwu onye nchụàjà, o wetara ihe ọma ndị dị ugbu a. Ọ banyekwara n’ụlọikwuu ka ukwuu a na-ejighị aka rụọ, nke kakwa zuo okè, ya bụ, nke na-adịghị n’ụwa a. 12 O jighị ọbara ewu na nke oké ehi banye, kama o ji ọbara nke ya banye n’ebe nsọ ahụ.+ Ọ banyere naanị otu ugboro ma napụta* anyị. Nnapụta a na-adịru ebighị ebi.+ 13 N’ihi na ọ bụrụ na ọbara ewu na nke oké ehi+ na ntụ ehi e fesara ndị na-adịghị ọcha na-edo ha nsọ ma mee ka ahụ́ ha dị ọcha,+ 14 o doro anya na ọbara Kraịst ga-eme ihe karịrị ihe ọbara ndị ahụ mere.+ Mmụọ ebighị ebi duziri ya, ya enyefee Chineke onwe ya ka àjà a na-emerụghị emerụ. Ọbara ya na-asachapụ ọrụ dị iche iche na-abaghị uru* n’akọnuche anyị+ ka anyị wee na-ejere Chineke dị ndụ ozi dị nsọ.+
15 Ọ bụ ya mere o ji bụrụ onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ,+ ka e wee kwe ndị a kpọrọ nkwa na ha ga-enweta ngọzi* na-adịru mgbe ebighị ebi.+ Ihe niile a nwere isi n’ihi ọnwụ ya nke e si na ya gbapụta ha+ ma tọhapụ ha ná mmehie ndị ha na-eme n’ọgbụgba ndụ mbụ ahụ. 16 N’ihi na ọ bụrụ na mmadụ na Chineke agbaa ndụ, mmadụ ahụ ga-anwụrịrị ka ọgbụgba ndụ ahụ nwee isi. 17 N’ihi na ọ bụ ọnwụ na-eme ka ọgbụgba ndụ nwee isi. Ọ naghị enwe isi ma ọ bụrụ na onye kwesịrị ịnwụ ka nọ ndụ.* 18 N’ihi ya, ọ bụkwa ọbara ka e ji mee ka ọgbụgba ndụ mbụ ahụ nwee isi. 19 N’ihi na mgbe Mosis gwachara ndị Izrel niile ihe niile e kwuru n’Iwu ahụ, o weere ọbara oké ehi na nke ewu, gwakọta ha na mmiri, jirizie owu na-acha uhie uhie e kere n’okporo osisi hisop fesa ọbara ahụ n’akwụkwọ* ọgbụgba ndụ, fesakwa ya ndị Izrel niile, 20 wee sị: “Ihe a bụ ọbara nke na-eme ka ọgbụgba ndụ unu na Chineke nwee isi. Ọ chọrọ ka unu debe ọgbụgba ndụ a.”+ 21 O fesakwara ọbara ahụ+ n’ụlọikwuu na n’arịa niile e ji eje ozi dị nsọ.* 22 Dị ka Iwu ahụ* kwuru, ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na e ji ọbara eme ka ihe niile dị ọcha.+ A naghị agbaghara mmehie ma ọ bụrụ na a wụpụghị ọbara.+
23 N’ihi ya, o kwesịrị ekwesị na e si otú a mee ka ihe ndị nọchiri anya+ ihe ndị dị n’eluigwe dị ọcha.+ Ma, ọ bụ àjà ka mma ka e ji mee ka ihe ndị dị n’eluigwe dị ọcha. 24 N’ihi na Kraịst abanyeghị n’ebe nsọ e ji aka rụọ,+ nke bụ́ ihe atụ nke ezigbo ebe nsọ,+ kama ọ banyere n’eluigwe,+ nke mere o ji pụta ugbu a n’ihu Chineke maka anyị.+ 25 Ọ bụghị ka ọ na-achụ onwe ya n’àjà ugboro ugboro otú nnukwu onye nchụàjà si eji ọbara na-abụghị nke ya abanye n’ebe nsọ kwa afọ.+ 26 Ma ọ́ bụghị ya, ọ ga na-ata ahụhụ mgbe mgbe malite mgbe a tọrọ ntọala ụwa. Ma ugbu a, ọ pụtara naanị otu ugboro n’ọgwụgwụ oge a* ka o si n’àjà o ji onwe ya chụọ wepụ mmehie.+ 27 Otú ahụ ọ bụ na ihe na-echere ụmụ mmadụ bụ ịnwụ naanị otu ugboro, e mechaa, e kpee ha ikpe, 28 ọ bụkwa otú ahụ ka a chụrụ Kraịst n’àjà naanị otu ugboro ka o buru mmehie ọtụtụ ndị.+ Mgbe ọ ga-apụta nke ugboro abụọ, ọ gaghị abụ ka o wepụ mmehie, ndị na-achọsi ya ike ka a zọpụta ha ga-ahụkwa ya.+
10 Iwu ahụ* nọchiri anya+ ihe ọma ndị na-abịa abịa,+ ma ọ bụghị ya bụ ihe ọma ndị ahụ. N’ihi ya, o nweghị* ike iji àjà ndị a na-achụ mgbe niile kwa afọ mee ka ndị na-abịakwute Chineke zuo okè.+ 2 A sị na o nwere ike ime ka ha zuo okè, ọ̀ bụ na a garaghị akwụsị ịchụ àjà ndị ahụ maka na obi agaghịzi na-ama ndị na-efe Chineke ikpe ma e mehaala ka ha dị ọcha otu ugboro? 3 Ma àjà ndị ahụ na-echetara ndị mmadụ kwa afọ+ na ha bụ ndị mmehie, 4 n’ihi na ọbara oké ehi na ọbara ewu enweghị ike iwepụ mmehie.
5 N’ihi ya, mgbe ọ bịara n’ụwa, ọ sịrị: “‘Ihe ị chọrọ abụghị àjà na onyinye, kama ị kwadebeere m ahụ́. 6 I nweghị mmasị n’àjà a na-esucha ọkụ nakwa n’àjà mmehie.’+ 7 M wee sị: ‘Lee, abịala m ime uche gị, Chineke+ (e dere banyere m n’akwụkwọ mpịakọta).’” 8 Mgbe o kwuchara, sị: “Ihe ị chọrọ abụghị àjà na onyinye, i nweghịkwa mmasị n’àjà a na-esucha ọkụ nakwa n’àjà mmehie,” ya bụ, àjà ndị Iwu* kwuru ka a na-achụ, 9 o kwuziri, sị: “Lee, abịala m ime uche gị.”+ O wepụrụ ihe nke mbụ ka o wee webata nke abụọ. 10 Ọ bụ “uche”+ Chineke a mere e ji jiri àjà e ji ahụ́ Jizọs Kraịst chụọ naanị otu ugboro mee ka anyị dị nsọ.+
11 Onye nchụàjà ọ bụla na-eguzo kwa ụbọchị na-eje ozi dị nsọ*+ ma na-achụ otu ụdị àjà ugboro ugboro,+ bụ́ àjà ndị na-enweghị ike iwepụcha mmehie.+ 12 Ma nwoke a chụrụ otu àjà maka mmehie, bụ́ àjà ga-adịru mgbe niile, nọrọzie ala n’aka nri Chineke.+ 13 Malite mgbe ahụ gawa, ọ nọ na-eche ruo mgbe a ga-eme ka ndị iro ya bụrụ ihe o ji agbakwasị ụkwụ.+ 14 N’ihi na ọ bụ otu àjà ọ chụrụ ka o ji mee ka ndị a na-edo nsọ zuo okè+ mgbe niile. 15 Mmụọ nsọ na-agbakwara anyị àmà na ọ bụ eziokwu, n’ihi na mgbe o kwuchara, sị: 16 “‘Ihe a bụ ọgbụgba ndụ mụ na ha ga-agba mgbe oge ahụ gachara,’ ka Jehova* kwuru. ‘M ga-etinye iwu m n’uche ha, m ga-edekwa ya n’obi ha,’”+ 17 o kwuziri, sị: “Agaghịzi m echeta mmehie ha na omume ọjọọ ha.”+ 18 Ebe ọ bụ na a gbagharala ha mmehie ha, e nweghịzi àjà a ga-achụ maka mmehie.
19 Ụmụnna m, ebe ọ bụ na ọbara Jizọs na-eme ka obi sie anyị ike isi n’ụzọ e si abanye n’ebe nsọ*+ ahụ na-abanye, 20 bụ́ ụzọ ọhụrụ o megheere anyị nke na-eduba ná ndụ, nke e si n’ákwà mgbochi ahụ abanye,+ ya bụ, ahụ́ ya, 21 ebe ọ bụkwa na anyị nwere onye nchụàjà ukwu na-elekọta ụlọ Chineke,+ 22 ka anyị jiri ezi obi na-abịa Chineke nso ma nwee okwukwe siri ezigbo ike, ebe ọ bụ na e meela ka obi anyị dị ọcha ka anyị ghara inwe akọnuche ọjọọ,+ e jirikwa mmiri dị ọcha sachaa ahụ́ anyị.+ 23 Ka anyị nọgidesie ike na-ekwupụta olileanya anyị n’ihu ọha n’amaghị jijiji,+ n’ihi na onye kwere anyị nkwa kwesịrị ka a tụkwasị ya obi. 24 Ka anyị na-echebakwara ibe anyị echiche n’ihi na ọ ga-eme ka anyị na-ahụrịta ibe anyị n’anya ma na-arụ ezigbo ọrụ.+ 25 Ka anyị ghara ịhapụ nzukọ anyị+ otú ụfọdụ ndị na-emekarị, kama ka anyị na-agbarịta ibe anyị ume+ ma na-emekwu ihe ndị a ebe anyị na-ahụ ụbọchị ahụ ka ọ na-eru nso.+
26 N’ihi na ọ bụrụ na anyị akpachara anya na-eme mmehie mgbe anyị matachara eziokwu nke ọma,+ e nweghịzi àjà ọ bụla fọrọ a ga-achụ maka mmehie anyị,+ 27 kama ihe ga-echere anyị bụ ikpe dị egwu na iwe Chineke na-enwu ka ọkụ nke ga-erepịa ndị na-emegide ya.+ 28 Onye ọ bụla dara Iwu Mosis, a na-egbu ya n’emetereghị ya ebere* ma mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ gbaa akaebe na o mere otú ahụ.+ 29 Ọ̀ bụ na unu echeghị na ahụhụ a ga-ata onye zọrọ Ọkpara Chineke ụkwụ ga-aka njọ, bụ́ onye na-ejighị ọbara ọgbụgba ndụ+ e ji doo ya nsọ kpọrọ ihe, onye ledakwara mmụọ nke amara Chineke anya ma mejọọ ya?+ 30 N’ihi na anyị ma Onye kwuru, sị: “Ọ bụ m ga-abọ ọbọ. M ga-akwụ ụgwọ.” E dekwara, sị: “Jehova* ga-ekpe ndị ya ikpe.”+ 31 Mmadụ daba n’aka Chineke dị ndụ, nke ya agwụla.
32 Ma, na-echetanụ ụbọchị ndị gara aga, bụ́ mgbe e mechara ka unu hụ ìhè.+ N’oge ahụ, unu tachiri obi mgbe unu nọ na-atagbu onwe unu n’ahụhụ. 33 N’oge ụfọdụ, a kparịrị unu n’ihu ọha* ma kpagbuo unu. N’oge ụfọdụkwa, unu so ndị e mere ụdị ihe ndị a taa ahụhụ.* 34 N’ihi na unu meteere ndị nọ n’ụlọ mkpọrọ ebere, unu akwụsịghịkwa inwe ọṅụ mgbe e bukọọrọ ihe unu,+ ebe unu ma na unu nwere ihe ka mma, nke na-adịgide adịgide.+
35 N’ihi ya, unu akwụsịla inwe obi ike,* ebe ọ bụ na unu ga-enweta ụgwọ ọrụ dị ukwuu.+ 36 N’ihi na unu kwesịrị ịtachi obi,+ ka unu wee nweta ihe Chineke kwere ná nkwa mgbe unu mechara uche ya. 37 N’ihi na ọ ka fọrọ “obere oge,”+ ‘onye ahụ nke na-abịa ga-abịarute, ọ gaghịkwa egbu oge.’+ 38 “Ma onye nke m nke na-eme ezi omume ga-adị ndụ maka na o nwere okwukwe,”+ ‘ọ bụrụkwa na o si n’ebe m nọ laa azụ, ihe ya agaghị amasị m.’*+ 39 Ma anyị abụghị ụdị ndị na-ala azụ ka e wee bibie anyị,+ kama anyị bụ ndị nwere okwukwe ka e wee chebe ndụ* anyị.
11 Okwukwe bụ ezigbo obi ike e nwere na ihe ndị a na-ele anya ha ga-emezu.+ Ọ bụ ihe àmà doro anya na ihe ndị a na-anaghị ahụ anya dị adị n’eziokwu. 2 Ọ bụ ụdị okwukwe a ndị oge ochie* nwere mere e ji gbaara ha àmà.*
3 Ọ bụ okwukwe mere anyị ji aghọta na ọ bụ okwu Chineke ka e ji kee ihe ndị dị n’eluigwe na n’ụwa.* Chineke si otú ahụ si n’ihe ndị anyị na-anaghị ahụ anya mee ihe ndị anyị na-ahụ anya.
4 Ọ bụ okwukwe ka Ebel ji chụọrọ Chineke àjà ka nke Ken mma.+ Ọ bụkwa okwukwe ahụ mere e ji gbaara ya àmà na ọ bụ onye ezi omume n’ihi na Chineke nabatara onyinye ya.+ Ọ bụ eziokwu na ọ nwụrụ, ọ ka si n’okwukwe ya na-ekwu okwu.+
5 Ọ bụ okwukwe Ịnọk+ mere e ji wepụ ya ka ọ ghara ịnwụ otú ndị ọzọ si anwụ, e nweghịkwa ebe a hụrụ ya n’ihi na Chineke wepụrụ ya.+ N’ihi na tupu e wepụ ya, a gbaara ya àmà na o mere ihe dị Chineke ezigbo mma. 6 Ọ bụrụkwa na mmadụ enweghị okwukwe, ọ gaghị emeli ihe dị Chineke ezigbo mma, n’ihi na onye ọ bụla na-abịakwute Chineke ga-ekwetarịrị na ọ dị adị nakwa na ọ na-akwụ ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ.+
7 Ọ bụ okwukwe mere Noa+ ji tụọ egwu Chineke ma rụọ ụgbọ+ a ga-eji zọpụta ezinụlọ ya mgbe Chineke dọchara ya aka ná ntị banyere ihe ndị a na-ahụbeghị anya.+ Ọ bụkwa okwukwe a ka o ji gosi na ikpe mara ụwa,+ e wee kpọọ ya onye ezi omume n’ihi okwukwe ya.
8 Ọ bụ okwukwe mere Ebreham+ ji rube isi mgbe a kpọrọ ya, o wee gaa n’ebe Chineke kwere nkwa na ọ ga-enye ya. Ọ gawara, n’agbanyeghị na ọ maghị ebe ọ na-aga.+ 9 Ọ bụ okwukwe mere o ji gaa bụrụ onye mbịarambịa n’ala nkwa ahụ,+ birikwa n’ụlọikwuu,+ ya na Aịzik na Jekọb, ndị e kwere ha na ya otu nkwa ahụ.+ 10 N’ihi na ọ nọ na-echere obodo nwere ezigbo ntọala, nke Chineke sere otú ọ ga-adị, rụọkwa.+
11 Ọ bụkwa okwukwe mere ka Sera nwee ike ịdị ime* mgbe ọ gaferela oge ịmụ nwa,+ n’ihi na o kwetara na e kwesịrị ịtụkwasị Onye kwere nkwa ahụ obi. 12 Ọ bụ ya mere e ji si n’otu nwoke, onye e weere ahụ́ ya ka nke nwụrụla anwụ,+ mụta ụmụ dị ọtụtụ+ ka kpakpando dị n’eluigwe, ndị a na-enweghịkwa ike ịgụta ọnụ ka ájá dị n’akụkụ oké osimiri.+
13 Ndị a niile nwere okwukwe ruo mgbe ha nwụrụ, n’agbanyeghị na nkwa ndị ahụ emezughị n’oge ha.+ Ma, ọ dị ha ka à ga-asị na ha ahụla ka nkwa ndị ahụ mezuru+ ma nabata ha. Ha kwusakwara n’ihu ọha na ha bụ ndị mbịarambịa na ndị bịara ịnọ obere oge n’ala ha bi. 14 N’ihi na ndị na-ekwu ihe ndị a na-egosi na ha na-achọsi ebe ga-abụ nke ha ike. 15 Ma, a sị na ha nọ na-echeta ebe ha hapụrụ,+ ha gaara achọta ihe ga-eme ka ha laghachi. 16 Ma, ha na-achọ ka ha nweta ebe ka mma, ya bụ, nke eluigwe. N’ihi ya, ihere anaghị eme Chineke na ha na-arịọ ya ka o nyere ha aka ebe ọ bụ Chineke ha*+ n’ihi na ọ kwadeberela ha otu obodo.+
17 Ọ bụ okwukwe Ebreham mere o ji fọ obere ka ọ chụọ Aịzik n’àjà mgbe a nwalere ya.+ Nwoke a, onye ji obi ụtọ nabata nkwa ndị e kwere ya, chọrọ iji ọkpara ọ mụrụ naanị ya chụọ àjà,+ 18 n’agbanyeghị na Chineke gwara ya, sị: “Ọ bụ Aịzik ga-amụta ndị a ga-akpọ ụmụ* gị.”+ 19 Ma o kwetara na Chineke ga-akpọliteli nwa ya n’ọnwụ, o nwetaghachikwara nwa ya. Ihe a merenụ bụ ihe atụ.+
20 Ọ bụ okwukwe mere ka Aịzik gọzie Jekọb+ na Ịsọ+ ma gwa ha ihe ndị ga-emecha mee.
21 Mgbe ọ fọrọ obere ka Jekọb nwụọ,+ ọ bụ okwukwe mere ka ọ gọzie ụmụ nwoke abụọ Josef mụrụ+ ma dabere n’isi mkpara ya kpọọrọ Chineke isi ala.*+
22 Mgbe ọ fọrọ obere ka Josef nwụọ, ọ bụ okwukwe mere ka o kwuo na ndị Izrel ga-esi n’Ijipt pụọ. O nyekwara iwu ka a chịrị ọkpụkpụ ya pụọ n’ebe ahụ.*+
23 Ọ bụ okwukwe mere ndị mụrụ Mosis ji zoo ya ruo ọnwa atọ a mụchara ya,+ n’ihi na ha hụrụ na nwatakịrị ahụ mara mma,+ ha atụghịkwa iwu eze nyere egwu.+ 24 Mgbe Mosis toro,+ ọ bụ okwukwe mere na o kweghị ka a kpọọ ya nwa ada Fero.+ 25 Ọ họọrọ ka e megbuo ya na ndị Chineke kama ime mmehie nke ga-emetụ ya obi ụtọ obere oge, 26 n’ihi na o weere mkparị a kparịrị ya dị ka Onye E Tere Mmanụ* ka akụ̀ karịrị akụ̀ niile dị n’Ijipt maka na ọ nọ na-atụsi anya ụgwọ ọrụ a ga-akwụ ya ike. 27 Ọ bụ okwukwe mere ka ọ hapụ Ijipt,+ ọ bụghị na ọ na-atụ ụjọ na eze na-ewe iwe,+ n’ihi na ọ nọ na-atachi obi ka à ga-asị na ọ na-ahụ Onye a na-anaghị ahụ anya.+ 28 Ọ bụ okwukwe mere o ji mee Ememme Ngabiga, fesakwa ọbara n’awara ụzọ, ka onye mbibi ghara igbu ụmụ ha e bu ụzọ mụọ.+
29 Ọ bụ okwukwe mere ha ji si n’Oké Osimiri Uhie gafere ka à ga-asị na ọ bụ ala nkịtị.+ Ma mgbe ndị Ijipt nwara isi n’osimiri ahụ gafere, mmiri riri ha.+
30 Ọ bụ okwukwe ndị Izrel mere ka mgbidi Jeriko daa mgbe ha gbachara ya gburugburu ụbọchị asaa.+ 31 Ọ bụ okwukwe mere ka Rehab, bụ́ nwaanyị akwụna, ghara iso ndị nupụụrụ Chineke isi nwụọ, n’ihi na o ji obiọma nabata ndị bịara inyopụta otú obodo ahụ dị.+
32 Gịnị ọzọ ka m ga-ekwu? N’ihi na oge ga-agwụnahụ m ma m kọwa banyere Gidiọn,+ Berak,+ Samsịn,+ Jefta,+ Devid,+ na Samuel+ na ndị amụma ndị ọzọ. 33 Ọ bụ okwukwe ha mere ka ha merie alaeze dị iche iche,+ mee ka ndị mmadụ mewe ezi omume, mee ka e kwee ha nkwa dị iche iche,+ meekwa ka e mechie ọnụ ọdụm.+ 34 Okwukwe ha mekwara ka ọkụ ghara ime ha ihe ọ bụla,+ mee ka ha gbalaga ka a ghara iji mma agha gbuo ha,+ mee ka ha dị ike mgbe ha na-adịghị ike,+ mee ka ha bụrụ ndị dike n’agha,+ mee ka ha chụlaa ndị bịara ịlụso ha agha.+ 35 A kpọliteere ụmụ nwaanyị ndị nwụnahụrụ ha,+ ma e mekpọrọ ụfọdụ ọnụ maka na ha ekweghị eme ihe na-adịghị mma ka e wee hapụ ha, ka ha wee nweta mbilite n’ọnwụ ka mma. 36 A nwakwara ndị ọzọ mgbe e ji ha mee ihe ọchị ma pịa ha ihe. N’eziokwu, e mere ha nke ka njọ. E kere ha agbụ,+ tụọkwa ha mkpọrọ.+ 37 A tụrụ ha nkume,+ a nwara ha ọnwụnwa, a kwọbiri ha abụọ, e ji mma agha gbuo ha,+ ha na-eyi akpụkpọ atụrụ na akpụkpọ ewu.+ E nwere mgbe ha nọ n’ụkọ, a kpagburu ha,+ e megburu ha.+ 38 Ha ekwesịghịkwa ụwa. Ha gagharịrị n’ọzara na n’ugwu, zookwa n’ọgba+ nakwa n’oghere ndị dị n’ala.
39 Ma ndị a niile enwetaghị ihe ahụ e kwere ná nkwa n’agbanyeghị na okwukwe ha mere ka a gbaara ha àmà dị mma, 40 n’ihi na Chineke ebula ụzọ hụ ihe ga-akara anyị mma,+ ka e wee ghara ime ka ha zuo okè, a hapụ anyị.
12 N’ihi ya, ebe ọ bụ na anyị nwere oké ìgwè ndị àmà a gbara anyị gburugburu, ka anyị tụfuo ibu arọ ọ bụla na mmehie ahụ nke na-ekegidekarị anyị.+ Ka anyị jirikwa ntachi obi na-agba ọsọ anyị na-agba,+ 2 ebe anyị na-elegidesi Jizọs anya ike, bụ́ Nnukwu Onye Ndú nke okwukwe anyị na Onye na-eme ka okwukwe anyị zuo ezuo.+ N’ihi ọṅụ a ga-eme ka o nwee n’ọdịnihu, o diri ọnwụ ọ nwụrụ n’osisi ịta ahụhụ,* o kweghịkwa ka ihere mee ya. Ọ nọdụla ala n’aka nri ocheeze Chineke.+ 3 N’eziokwu, chesienụ echiche ike banyere onye ahụ diri ụdị mkparị ahụ ndị mmehie, ndị mere onwe ha ihe ọjọọ, kparịrị ya,+ ka ike wee ghara ịgwụ unu, unu* adaa mbà.+
4 Na mgba unu na mmehie ahụ na-agba, unu agbabeghị ya ruo na nke ịnwụ anwụ. 5 Unu echefuchaakwala ndụmọdụ ahụ Chineke nyere unu ka ụmụ ya, sị: “Nwa m, eledala aka ná ntị Jehova* na-adọ gị anya, adakwala mbà mgbe ọ na-abara gị mba; 6 n’ihi na ọ bụ ndị Jehova* hụrụ n’anya ka ọ na-adọ aka ná ntị. N’eziokwu, ọ na-apịa onye ọ bụla o weere ka nwa ya ihe.”+
7 Unu kwesịrị ịna-atachi obi ma were ya na e si otú a na-adọ unu aka ná ntị.* Chineke na-emeso unu ka ụmụ ya.+ Ka è nwere nwa nna ya na-anaghị adọ aka ná ntị?+ 8 Ma ọ bụrụ na ọ dọbeghị unu niile aka ná ntị a, unu abụghị ụmụ ya n’eziokwu, kama unu bụ ụmụ onye ọzọ. 9 Ndị nna mụrụ anyị na-adị adọ anyị aka ná ntị, anyị na-akwanyekwara ha ùgwù. Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ido onwe anyị n’okpuru Nna nke ji mmụọ nsọ ya họpụta anyị ka anyị wee dị ndụ?+ 10 N’ihi na ha na-adọ anyị aka ná ntị ruo obere oge otú ha chere dị mma, ma Chineke na-adọ anyị aka ná ntị ga-abara anyị uru ka anyị wee dị nsọ ka ya.+ 11 N’eziokwu, e nweghị ịdọ aka ná ntị na-eme mmadụ obi ụtọ mgbe a na-adọ ya onye ahụ, kama ọ na-ewute ewute. Ma e mechaa, ọ na-abara ndị e ji ya zụọ ezigbo uru. Ha ga na-eme ezi omume, obi eruokwa ha ala.
12 N’ihi ya, meenụ ka aka kụdara akụda na ikpere na-adịghị ike dị ike,+ 13 na-emekwanụ ka ụzọ unu na-aga na ya kwụrụ ọtọ,+ ka ebe na-esighị ike n’ahụ́ unu ghara ikwokapụ, kama ka a gwọọ ya. 14 Na-agbanụ mbọ ka unu na mmadụ niile na-adị n’udo,+ na-adịkwanụ nsọ+ n’ihi na mmadụ agaghị ahụ Onyenwe anyị ma ọ bụrụ na onye ahụ adịghị nsọ. 15 Na-elezinụ anya ka a ghara inwe onye ọ bụla n’ime unu na-agaghị enweta amara Chineke, ka mgbọrọgwụ ọjọọ ọ bụla ghara ipulite n’etiti unu ma kpata nsogbu, merụọkwa ọtụtụ ndị.+ 16 Leziekwanụ anya ka a ghara inwe onye ọ bụla n’ime unu na-akwa iko* ma ọ bụ onye ọ bụla na-ejighị ihe dị nsọ kpọrọ ihe ka Ịsọ, onye nyefere onye ọzọ ihe o kwesịrị inweta dị ka ọkpara ka o wee nweta otu efere nri.+ 17 N’ihi na unu ma na mgbe o mechara chọọ ka a gọzie ya, a jụrụ ya. N’agbanyeghị na ọ gbalịsiri ike ime ka ọ gbanwee obi ya,* anya mmiri agbaakwa ya,+ o nwetaghị ihe ọ bụla.
18 Unu abịaghị nso n’ihe e nwere ike imetụ aka,*+ nke ọkụ na-ere na ya,+ nke ígwé ojii na oké ọchịchịrị kpuchiri, nke oké ifufe na-efekwa na ya,+ 19 nke ụda opi si na ya na-ada,+ a na-anụkwa olu si na ya na-ekwu okwu.+ Mgbe ndị Izrel nụrụ olu a, ha rịọrọ ka a ghara ịgwa ha okwu ọ bụla ọzọ.+ 20 N’ihi na ha tụrụ ezigbo ụjọ maka iwu e nyere, sị: “Ọ bụrụgodị na ọ bụ anụmanụ zọrọ ụkwụ n’ugwu a, a ga-eji nkume tụgbuo ya.”+ 21 Ihe ha hụrụ dịkwa egwu nke na Mosis sịrị: “Egwu ji m, m na-amakwa jijiji.”+ 22 Kama, unu bịara nso n’Ugwu Zayọn+ nakwa n’obodo Chineke dị ndụ, bụ́ Jeruselem nke eluigwe,+ na ọtụtụ iri puku ndị mmụọ ozi ndị 23 zukọrọ n’ìgwè,+ bịakwa nso n’ọgbakọ ndị e bu ụzọ mụọ, bụ́ ndị e dere aha ha n’eluigwe, bịakwa Chineke nso bụ́ Onye na-ekpe mmadụ niile ikpe,+ bịakwa ndị ezi omume nso bụ́ ndị mmụọ nsọ na-edu,+ ndị e mekwara ka ha zuo okè.+ 24 Unu abịakwala Jizọs nso bụ́ onye ogbugbo+ ọgbụgba ndụ ọhụrụ,+ nakwa ọbara e fesara anyị, nke na-ekwu okwu otú dị mma karịa ọbara Ebel.+
25 Hụnụ na unu na-ege onye ahụ na-ekwu okwu ntị. N’ihi na ọ bụrụ na a tara ndị na-egeghị onye ahụ dọrọ ndị mmadụ aka ná ntị* n’ụwa ahụhụ, o doro anya na a ga-atakwa anyị ahụhụ ma anyị gbakụta onye si n’eluigwe na-ekwu okwu azụ.+ 26 N’oge ahụ, olu ya mere ka ụwa maa jijiji,+ ma o kwere nkwa ugbu a, sị: “M ka ga-eme ọzọ ka ụwa na eluigwe maa jijiji.”+ 27 Ma okwu bụ́ “m ka ga-eme ọzọ” na-egosi na a ga-ewepụ ihe ndị e mere ka ha maa jijiji, bụ́ ihe ndị Chineke na-ekeghị, ka ihe ndị a na-emeghị ka ha maa jijiji wee dịgide. 28 N’ihi ya, ebe ọ bụ na anyị ga-eketa Alaeze a na-enweghị ike ime ka ọ maa jijiji, ka anyị na-ekwe ka amara Chineke baara anyị uru, nke anyị ga-esi na ya jiri egwu Chineke na-ejere ya ozi dị nsọ nke ọ na-anabata. 29 N’ihi na Chineke anyị bụ ọkụ na-erechapụ ihe.+
13 Nọgidenụ na-ahụ ibe unu n’anya ka ụmụnne.+ 2 Unu echefula ịna-ele ndị ọzọ ọbịa*+ n’ihi na ọ bụ ile ọbịa mere ka ụfọdụ ndị lee ndị mmụọ ozi ọbịa n’amaghị na ha bụ ndị mmụọ ozi.+ 3 Na-echetanụ ndị nọ n’ụlọ mkpọrọ*+ ka à ga-asị na unu na ha nọ n’ụlọ mkpọrọ+ nakwa ndị a na-emegbu emegbu, ebe ọ bụ na unu na ha nọ n’otu ahụ́.* 4 Ka mmadụ niile na-akwanyere alụmdi na nwunye ùgwù, ka a gharakwa imerụ alụmdi na nwunye,+ n’ihi na Chineke ga-ekpe ndị na-akwa iko* ikpe, kpeekwa di ma ọ bụ nwunye na-akwa iko ikpe.+ 5 Ka otú unu si ebi ndụ gosi na unu ahụghị ego n’anya,+ kama ka ihe ndị dị ugbu a ju unu afọ.+ N’ihi na o kwuru, sị: “E nweghị ihe ga-eme ka m hapụ gị, e nweghịkwa ihe ga-eme ka m gbakụta gị azụ.”+ 6 Ka anyị wee nwee obi ike ma sị: “Jehova* bụ onye na-enyere m aka. Agaghị m atụ egwu. Gịnị ka mmadụ ga-emeli m?”+
7 Na-echetanụ ndị na-eduzi unu,+ bụ́ ndị gwara unu okwu Chineke, nweekwanụ ụdị okwukwe ha nwere* mgbe unu na-ahụ uru omume ọma ha bara.+
8 Jizọs Kraịst anaghị agbanwe agbanwe. Onye ọ bụ ụnyaahụ ka ọ ka bụ taa, ọ ga-abụkwa ya ruo mgbe ebighị ebi.
9 Unu ekwela ka e jiri ozizi dị iche iche si ebe ọzọ duhie unu, n’ihi na ọ ka mma ka ọ bụrụ amara Chineke ga-eme ka obi sie unu ike kama nri* ga-eme ka obi sie unu ike. Nri anaghị abara ndị ji ya kpọrọ oké ihe uru.+
10 Anyị nwere ebe ịchụàjà nke ndị na-eje ozi dị nsọ n’ụlọikwuu na-enweghị ikike iri ihe dị na ya.+ 11 N’ihi na a na-akpọ ozu anụmanụ ọkụ n’azụ ebe a mara ụlọikwuu,+ nnukwu onye nchụàjà ejiri ọbara anụmanụ ndị ahụ chụọ àjà mmehie n’ebe nsọ. 12 Ọ bụkwa ya mere Jizọs ji taa ahụhụ n’azụ obodo*+ ka o wee jiri ọbara ya mee ka ndị mmadụ dị nsọ.+ 13 N’ihi ya, ka anyị gakwuru ya n’azụ ebe a mara ụlọikwuu ma die mkparị o diri,+ 14 n’ihi na anyị enweghị obodo nke na-adịgide adịgide n’ebe a, kama anyị na-echeresi nke na-abịa abịa ike.+ 15 Ka anyị si n’aka ya na-achụrụ Chineke àjà otuto mgbe niile,+ ya bụ, okwu ọnụ+ anyị nke na-akọsa aha Chineke n’ihu ọha.+ 16 Unu echefukwala ịna-eme ihe ọma na ịna-enye ndị ọzọ ihe+ n’ihi na ụdị àjà ndị a na-adị Chineke ezigbo mma.+
17 Na-eruberenụ ndị na-eduzi unu isi,+ na-edokwanụ onwe unu n’okpuru ha,+ n’ihi na ha na-eche unu* nche ebe ọ bụ na ha ga-aza Chineke ajụjụ.+ Ime otú a ga-eme ka ha jiri ọṅụ na-arụ ọrụ a ma ghara ịna-ama ọsụ, n’ihi na ọ ga-emebiri unu ihe.
18 Na-ekperenụ anyị ekpere n’ihi na obi siri anyị ike na akọnuche anyị dị ọcha,* anyị chọkwara ịna-akwụwa aka ọtọ n’ihe niile.+ 19 Ma m na-agba unu ume karịchaa ka unu na-ekpe ekpere ka m bịakwute unu n’oge na-adịghị anya.
20 Ka Chineke nke udo, onye si n’ọnwụ kpọlite Onyenwe anyị Jizọs, bụ́ nnukwu onye ọzụzụ atụrụ+ nke wetaara Chineke ọbara ọgbụgba ndụ ebighị ebi, 21 nye unu ihe ọma niile ga-eme ka unu na-eme uche ya. Ka o si n’aka Jizọs Kraịst mee ka anyị na-eme ihe dị ya mma. Ka otuto dịrị ya ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.
22 Ụmụnna m, m na-agba unu ume ka unu wetuo obi gee ntị n’okwu agbamume a, n’ihi na m detaara unu akwụkwọ ozi dị nkenke. 23 Achọrọ m ka unu mara na a hapụla nwanna anyị Timoti. Ọ bụrụ na ọ bịa n’oge na-adịghị anya, mụ na ya ga-eso bịa hụ unu.
24 Keleerenụ m ndị niile na-eduzi unu nakwa ndị nsọ niile. Ndị nọ n’Ịtali+ na-ekele unu.
25 Ka Chineke meere unu niile amara.
Ma ọ bụ “kee usoro ihe a.” Gụọ Nkọwa Okwu, “Oge a.”
Na Grik, “o ketala.”
Ma ọ bụ “n’ụwa mmadụ bi.”
Ma ọ bụ “ndị na-ejere ọha mmadụ ozi.”
Na Grik, “Chineke bụ ocheeze gị.”
Ma ọ bụ “ikpe ziri ezi.”
Ma ọ bụ “na-ejere ọhaneze ozi.”
Ma ọ bụ “ụwa mmadụ bi.”
Gụọ A5.
Na Grik, “mkpụrụ.”
Ya bụ, Jizọs.
Na Grik, “tụọ egwu.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “na-agaghị emetere anyị ebere.”
Ma ọ bụ “na-enwere ndị kpafuru akpafu ọmịiko.”
Ma ọ bụ “ndị na-anaghị aghọta ihe ngwa ngwa.”
Na Grik, “okwu ezi omume.”
Na Grik, “azụ ikike nghọta ha.”
Na Grik, “ghara ibidokwa n’isi tọwa ntọala.”
Na Grik, “n’ọrụ nwụrụ anwụ.”
Na Grik, “detụkwa ike nke usoro ihe na-abịa abịa ire.” Gụọ Nkọwa Okwu, “Oge a.”
Ma ọ bụ “otú unu si gosi na unu hụrụ aha ya n’anya.”
Ma ọ bụ “ihe o kpebiri ime.”
Ya bụ, nkwa o kwere na iyi ọ ṅụrụ.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “otú arịlịka.”
Ma ọ bụ “nna nna anyị.”
Ya bụ, Iwu Mosis.
Na Grik, “ụmụnne ha si n’úkwù Ebreham.”
Na Grik, “ọ ka nọ n’úkwù nna nna ya.”
Ya bụ, Iwu Mosis.
Ya bụ, Iwu Mosis.
Ya bụ, Iwu Mosis.
Gụọ A5.
Ma ọ bụ “ọ gaghị akwa ụta.”
Ya bụ, Iwu Mosis.
Ya bụ, Iwu Mosis.
Ma ọ bụ “na-ejere ọhaneze ozi.”
Ma ọ bụ “n’Ebe Kacha Nsọ.”
Gụọ A5.
Ya bụ, Iwu Mosis.
Ma ọ bụ “ozi ka nnọọ mma ọ na-ejere ọhaneze.”
Gụọ A5.
Gụọ A5.
Gụọ A5.
Gụọ A5.
Ma ọ bụ “ebe nsọ.”
Ma ọ bụ “ihe e ji adọsa oriọna.”
Ma ọ bụ “ihe na-esi ísì ọma a na-amụnye ọkụ.”
Ma ọ bụ “ebe a na-ekpuchi mmehie.”
Na Grik, “ụdị baptizim dị iche iche.”
Na Grik, “gbapụta.”
Na Grik, “ọrụ nwụrụ anwụ.”
Ma ọ bụ “ihe nketa.”
O nwekwara ike ịbụ anụmanụ ga-anwụ.
Ma ọ bụ “n’akwụkwọ mpịakọta.”
Ma ọ bụ “e ji ejere ọhaneze ozi.”
Ya bụ, Iwu Mosis.
Gụọ Nkọwa Okwu.
Ya bụ, Iwu Mosis.
O nwere ike ịbụ, “ndị mmadụ enweghị.”
Ya bụ, Iwu Mosis.
Ma ọ bụ “na-ejere ọhaneze ozi.”
Gụọ A5.
Ma ọ bụ “n’Ebe Kacha Nsọ.”
Ma ọ bụ “n’enwereghị ya ọmịiko.”
Gụọ A5.
Na Grik, “a kpọpụtara unu n’ọgbọ egwuregwu.”
Ma ọ bụ “unu kwụ ndị e mere ụdị ihe ndị a n’akụkụ.”
Na Grik, “ikwu okwu n’atụghị ụjọ.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “ndị nna nna anyị.”
Ma ọ bụ “gbaara ha àmà na ihe ha dị Chineke mma.”
Ma ọ bụ “kee usoro ihe a.” Gụọ Nkọwa Okwu, “Oge a.”
Na Grik, “nweta ike ịdị ime mkpụrụ.”
Ma ọ bụ “na a na-akpọ ya Chineke ha.”
Ma ọ bụ “onye a ga-akpọ nwa.” Na Grik, “mkpụrụ.”
Ma ọ bụ “fee Chineke ofufe.”
Ma ọ bụ “iwu gbasara olili ya.”
Na Grik, “Kraịst.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi unu.”
Gụọ A5.
Gụọ A5.
Ma ọ bụ “na-azụ unu.”
Gụọ Nkọwa Okwu, “Ịkwa iko.”
Ya bụ, ime ka nna ya gbanwee obi ya.
Ebe a na-ekwu banyere oge ndị Izrel gara nso n’Ugwu Saịnaị.
O nwere ike ịbụ, “onye Chineke si n’aka ya dọọ ndị mmadụ aka ná ntị.”
Ma ọ bụ “ịna-emere ndị ọbịa ihe ọma.”
Na Grik, “ndị nọ n’agbụ; ndị e kere agbụ.”
O nwere ike ịbụ, “ka à ga-asị na unu na ha na-atakọ ahụhụ.”
Gụọ Nkọwa Okwu, “Ịkwa iko.”
Gụọ A5.
Ma ọ bụ “na-eṅominụ okwukwe ha.”
Ya bụ, iwu gbasara nri.
Na Grik, “n’azụ ọnụ ụzọ ámá obodo.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi unu.”
Na Grik, “dị mma.”