Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • nwt Mkpughe 1:1-22:21
  • Mkpughe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mkpughe
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Mkpughe

MKPUGHE E KPUGHEERE JỌN

1 Ihe ndị a ka Jizọs Kraịst kpughere. Ọ bụ Chineke kpugheere ya ihe ndị a+ ka o gosi ndị ohu ya+ ihe ndị ga-emerịrị n’oge na-adịghị anya. Jizọs wee ziga mmụọ ozi ya, ya ejiri ihe ndị nwere ihe ha nọchiri anya ha gosi ya Jọn ohu ya,+ 2 onye gbara àmà banyere ihe niile ọ hụrụ, ya bụ, ihe Chineke na Jizọs Kraịst kwuru. 3 Onye na-agụpụta okwu amụma a, na onye na-anụ ya ma na-eme ihe ndị e dere na ya,+ na-enwe obi ụtọ, n’ihi na oge ahụ a kara aka dị nso.

4 Jọn na-edegara ọgbakọ asaa+ dị ná mpaghara Eshia akwụkwọ:

Ka “Chineke, onye dị adị na onye dịbu adị na onye na-abịa,”+ nakwa mmụọ asaa+ nọ n’ihu ocheeze ya, meere unu amara, meekwa ka udo dịrị unu. 5 Ka Jizọs Kraịst, “Onye Àmà Kwesịrị Ntụkwasị Obi,”+ “onye mbụ a kpọlitere n’ọnwụ,”+ na “Onye Na-achị ndị eze nke ụwa,”+ meere unu amara, meekwa ka udo dịrị unu.

Jizọs hụrụ anyị n’anya,+ jirikwa ọbara ya napụta anyị n’aka mmehie anyị.+ 6 O mekwara ka anyị bụrụ otu alaeze+ na ndị nchụàjà+ nke Chineke ya, bụ́ Nna ya. Ọ dị ebube, dịrịkwa ike ruo mgbe ebighị ebi. Amen.

7 Ọ ga-abịa n’ígwé ojii.+ Anya niile ga-ahụ ya. Ndị mara ya ube ga-ahụkwa ya. Ebo niile nke ụwa ga-eti aka n’obi, ruokwa uju n’ihi ya.+ N’eziokwu, ihe a ga-emerịrị. Amen.

8 Jehova* Chineke kwuru, sị: “Abụ m Alfa na Omega,*+ onye dị adị na onye dịbu adị na onye na-abịa, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.”+

9 Abụ m Jọn, nwanna unu, onye a na-akpagbu otú e si akpagbu unu,+ na onye na-atachi obi otú unu si atachi,+ na onye unu na ya ga-abụ eze n’Alaeze Chineke+ n’ihi na anyị na-eso ụzọ Jizọs.+ Anọ m n’agwaetiti a na-akpọ Patmọs n’ihi na m na-ekwu gbasara Chineke, na-agbakwa àmà banyere Jizọs. 10 Mmụọ nsọ mere ka m nọrọ n’ụbọchị Onyenwe anyị, m nụkwara olu na-adasi ike ka opi n’azụ m. 11 Olu ahụ sịrị: “Were akwụkwọ mpịakọta dee ihe ị na-ahụ ma zigara ya ọgbakọ asaa ndị dị n’ebe ndị a: Efesọs,+ Smeana,+ Pagamọm,+ Tayataịra,+ Sadis,+ Filadelfịa,+ na Leodisia.”+

12 M tụgharịrị ka m hụ onye na-agwa m okwu. Mgbe m tụgharịrị, ahụrụ m ihe asaa e ji adọsa ọkụ,* ndị e ji ọlaedo rụọ.+ 13 Ahụkwara m onye yiri nwa nke mmadụ+ n’etiti ihe ndị ahụ e ji adọsa ọkụ.* O yi uwe gbadaruru ya n’ụkwụ, keekwa ájị̀ ọlaedo n’obi. 14 Isi ya na ntutu isi ya na-acha ọcha ka owu ọcha, na-achakwa ka snoo. Anya ya dị ka ọkụ na-enwu enwu.+ 15 Ụkwụ ya dị ka ezigbo ọla kọpa+ nke na-egbuke egbuke n’oké ọkụ. Olu ya na-ada ka mmiri na-asọ ike ike. 16 Ọ chị kpakpando asaa n’aka nri.+ Otu ogologo mma agha dị nkọ, nke nwere ihu abụọ,+ si n’ọnụ ya pụta. Ihu ya dịkwa ka anwụ na-achasi ike.+ 17 Mgbe m hụrụ ya, m dara n’ụkwụ ya ma dị ka onye nwụrụ anwụ.

O wee bikwasị m aka nri ya, sị: “Atụla egwu. Abụ m Onye Mbụ+ na Onye Ikpeazụ.+ 18 Abụ m onye dị ndụ.+ Anwụkwara m,+ ma, adịzi m ndụ. M ga-adịkwa ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi.+ Achịkwa m mkpịsị ugodi nke ọnwụ na nke ili.*+ 19 N’ihi ya, were akwụkwọ dee ihe ndị ị hụrụ, deekwa ihe ndị dị adị na ihe ndị ga-eme mgbe ihe ndị a gachara. 20 Kpakpando asaa ahụ ị hụrụ n’aka nri m na ihe asaa ahụ e ji adọsa ọkụ,* ndị e ji ọlaedo rụọ, bụ ihe nzuzo dị nsọ. Ihe a ka ọ pụtara: Kpakpando asaa ahụ pụtara ndị mmụọ ozi nke ọgbakọ asaa ahụ. Ihe asaa ahụ e ji adọsa ọkụ* pụtakwara ọgbakọ asaa.+

2 “Degara mmụọ ozi+ nke ọgbakọ dị n’Efesọs+ akwụkwọ, sị: Onye ahụ chị kpakpando asaa ahụ n’aka nri ya, onye na-eje ije n’etiti ihe asaa ahụ e ji adọsa ọkụ,* ndị e ji ọlaedo rụọ,+ kwuru ihe ndị a: 2 ‘Ama m ihe ndị unu na-eme, marakwa otú unu si arụsi ọrụ ike na otú unu si atachi obi. Amakwa m na unu anaghị anabata ndị ọjọọ, nakwa na unu na-anwale ndị na-asị na ha bụ ndịozi,+ ma ha abụghị, unu wee chọpụta na ha bụ ndị ụgha. 3 Unu na-atachi obi, na-edi ọtụtụ ihe n’ihi aha m,+ unu adabeghịkwa mbà.+ 4 Ma, ihe na-adịghị mụ mma unu mere bụ na unu ahụghịzi Chineke n’anya otú unu hụrụ ya na mbụ.

5 “‘N’ihi ya, chebaranụ ebe unu si daa echiche, chegharịakwanụ.+ Mewenụ ihe ndị unu na-eme na mbụ. Ọ bụrụ na unu echegharịghị,+ m ga-abịakwute unu, m ga-agakwa ebe ihe unu ji adọsa ọkụ* dị wepụ ya.+ 6 Ma, otu ihe dị mma unu na-eme bụ na unu kpọrọ ihe ndị òtù Nikọleyọs+ na-eme asị otú mụnwa kpọrọ ya. 7 Onye nwere ntị, ya nụ ihe mmụọ nsọ na-agwa ọgbakọ ndị a:+ Onye meriri n’agha,+ m ga-ekwe ka o rie mkpụrụ si n’osisi nke ndụ,+ nke dị na paradaịs Chineke.’

8 “Degakwara mmụọ ozi nke ọgbakọ dị na Smeana akwụkwọ, sị: ‘Onye Mbụ na Onye Ikpeazụ,’+ onye nwụrụ anwụ ma dị ndụ ọzọ, kwuru ihe ndị a:+ 9 ‘Ama m ahụhụ unu na-ata, marakwa na unu dara ogbenye. Ma, unu bara ọgaranya.+ Amakwa m ndị na-ekwulu unu ma na-asị na ha bụ ndị Juu, ma ha abụghị. Ha bụ ndị nke* Setan.+ 10 Ụjọ atụla unu maka ahụhụ unu na-aga ịta.+ Ekwensu ga na-eme ka a tụọ ụfọdụ n’ime unu mkpọrọ ka o wee nwaa unu ruo n’isi, kpagbuokwa unu ruo ụbọchị iri. Kwụsienụ ike n’ebe m nọ ruo mgbe unu nwụrụ, m ga-enyekwa unu okpueze bụ́ ndụ.+ 11 Onye nwere ntị, ya nụ+ ihe mmụọ nsọ na-agwa ọgbakọ ndị a: Onye meriri n’agha+ agaghị anwụ ọnwụ nke abụọ.’+

12 “Degara mmụọ ozi nke ọgbakọ dị na Pagamọm akwụkwọ, sị: Onye ahụ nke ji ogologo mma agha dị nkọ, nke nwere ihu abụọ, kwuru ihe ndị a:+ 13 ‘Ama m ebe unu bi, ya bụ, n’ebe ocheeze Setan dị. Ma, unu ka na-erubere m isi.*+ Unu nwere okwukwe siri ike na m,+ ọbụnadị n’oge Antipas, bụ́ onye àmà m, onye e kwesịrị ịtụkwasị obi,+ onye e gburu+ n’obodo unu, ebe Setan bi.

14 “‘Ma, ihe ole na ole unu na-eme na-adịghị mụ mma bụ na unu kwere ka unu na ndị nabatara ihe Belam kụziri nọrọ.+ Ọ bụ Belam kụziiri Belak+ otú a ga-esi rata ndị Izrel ka ha mehie, rie ihe e ji chụọrọ arụsị àjà, kwaakwa iko.*+ 15 Otú ahụkwa ka unu si kwere ka unu na ndị nabatara ihe ndị òtù Nikọleyọs+ na-akụzi nọrọ. 16 N’ihi ya, chegharịanụ. Ọ bụrụ na unu echegharịghị, m ga-abịakwute unu ọsọ ọsọ, jirikwa ogologo mma agha dị n’ọnụ m+ lụso ndị ahụ agha.

17 “‘Onye nwere ntị, ya nụ ihe mmụọ nsọ na-agwa ọgbakọ ndị a:+ M ga-enye onye meriri n’agha+ ụfọdụ mana e zoro ezo.+ M ga-enyekwa ya obere okwute na-acha ọcha. E dekwara aha ọhụrụ n’elu obere okwute ahụ. O nweghịkwa onye ma aha ahụ ma ọ́ bụghị onye nwetara ya.’

18 “Degara mmụọ ozi nke ọgbakọ dị na Tayataịra+ akwụkwọ, sị: Ọkpara Chineke, onye anya ya dị ka ire ọkụ na-enwu enwu,+ onye ụkwụ ya dịkwa ka ọla kọpa mara mma,+ kwuru ihe ndị a: 19 ‘Ama m ihe ndị unu na-eme. Ama m na unu hụrụ ndị ọzọ n’anya, nwee okwukwe, na-ejere Chineke ozi, na-atachikwa obi. Amakwa m na ihe unu na-eme ugbu a karịrị ihe unu mere na mbụ.

20 “‘Ma, ihe na-adịghị mụ mma unu mere bụ na unu gbachiri nwaanyị ahụ bụ́ Jezibel+ nkịtị. Ọ na-akpọ onwe ya onye amụma, na-eduhiekwa ndị ohu m ka ha na-akwa iko,*+ ka ha na-erikwa ihe e ji chụọrọ arụsị àjà. Ọ na-akụzikwara ha ihe ndị a. 21 M nyekwara ya oge ka o chegharịa, ma ọ chọghị ịkwụsị iko ọ na-akwa.* 22 M ga-eme ka ọ rịawa ọrịa. M ga-emekwa ka ndị ha na ya na-akwa iko taa ezigbo ahụhụ ma ha echegharịghị wee kwụsị ime ihe ndị ọ kụziiri ha. 23 M ga-emekwa ka ụmụ ya rịawa ọrịa ga-emecha gbuo ha, ka ọgbakọ niile wee mara na ọ bụ m na-enyocha obi na ihe dị n’ala ala obi.* M ga-akwụkwa onye ọ bụla n’ime unu ụgwọ otú o si kpaa àgwà.+

24 “‘Ma, ndị nke fọdụrụ n’ime unu na Tayataịra, ndị niile na-ekweghị ihe Jezibel na-akụzi, ndị na-amaghịkwa ihe ndị a sịrị na ha bụ “ihe ndị dị omimi nke Setan,”+ ihe a ka m na-agwa unu: Anaghị m ebo unu ibu arọ ọ bụla ọzọ. 25 Kama, na-emenụ ihe dị mma unu na-eme ruo mgbe m bịara.+ 26 Onye meriri n’agha, debekwa iwu m ruo ọgwụgwụ, m ga-enye ya ikike ịchị mba niile.+ 27 Ikike m ga-enye ya bụ ụdị ikike Nna m nyere m. Ọ ga-ejikwa mkpanaka ígwè+ taa ndị mmadụ ahụhụ.* Ọ ga-ebibi ha, ha adịrị ka arịa e ji ụrọ kpụọ, nke a kụriri akụri. 28 M ga-enyekwa ya kpakpando ụtụtụ.+ 29 Onye nwere ntị, ya nụ ihe mmụọ nsọ na-agwa ọgbakọ ndị a.’

3 “Degara mmụọ ozi nke ọgbakọ dị na Sadis akwụkwọ, sị: Onye ahụ nwere mmụọ asaa nke Chineke,+ onye jikwa kpakpando asaa ahụ,+ kwuru ihe ndị a: ‘Ama m ihe ndị unu na-eme. A na-ele unu anya ka ndị dị ndụ, ma unu nwụrụ anwụ.+ 2 Na-echenụ nche,+ meekwanụ ka ihe ndị na-achọ ịnwụ anwụ dị ike, n’ihi na ahụla m na unu emechabeghị ihe niile Chineke m chọrọ ka unu mee. 3 N’ihi ya, na-echetanụ otú unu si nụ ozi e ziri unu na otú unu si nabata ya. Na-emenụ ya, chegharịakwanụ.+ N’eziokwu, ọ bụrụ na unu etetaghị, m ga-abịa ka onye ohi,+ unu agaghịkwa ama oge m ga-abịa.+

4 “‘Ma, unu nwere mmadụ ole na ole na Sadis, ndị na-emerụghị uwe ha.+ Ha ga-eyikwa uwe na-acha ọcha soro m na-eje ije,+ n’ihi na ha ruru eru. 5 Onye meriri n’agha+ ga-esi otú ahụ yiri uwe na-acha ọcha.+ M gaghịkwa ehichapụ aha ya n’akwụkwọ nke ndụ,+ kama m ga-ekwu n’ihu Nna m na n’ihu ndị mmụọ ozi ya na m ma aha ya.+ 6 Onye nwere ntị, ya nụ ihe mmụọ nsọ na-agwa ọgbakọ ndị a.’

7 “Degara mmụọ ozi nke ọgbakọ dị na Filadelfịa akwụkwọ, sị: Onye dị nsọ,+ onye eziokwu,+ onye ji mkpịsị ugodi Devid,+ onye na-emeghe ụzọ ka onye ọ bụla ghara imechi ya, onye na-emechikwa ya ka onye ọ bụla ghara imeghe ya, kwuru ihe ndị a: 8 ‘Ama m ihe ndị unu na-eme. Emegheerela m unu ụzọ ọ na-enweghị onye ga-emechili.+ Amakwa m na unu esichaghị ike, ma unu na-eme ihe m kwuru, unu kwụsikwara ike n’ebe m nọ. 9 M ga-akpọta ndị nke* Setan, ndị na-ekwu na ha bụ ndị Juu, ma ha abụghị,+ kama ha na-agha ụgha. M ga-eme ka ha bịa kpọọ isiala n’ụkwụ unu, meekwa ka ha mara na ahụrụ m unu n’anya. 10 N’ihi na unu tachiri obi ka m,+ m ga-echebe unu n’oge ule,+ nke a ga-enwe n’ụwa niile, iji lee mmadụ niile ule. 11 Ana m abịa ngwa ngwa.+ Na-emenụ ihe dị mma unu na-eme, ka onye ọ bụla wee ghara iwere okpueze unu.+

12 “‘M ga-eme ka onye meriri n’agha bụrụ ogidi n’ụlọ nsọ Chineke m. O nweghịkwa ihe ga-eme ka o si ebe ahụ pụọ ọzọ. Ihe m ga-ede n’ahụ́ onye ahụ bụ aha Chineke m+ na aha ọhụrụ m+ na aha obodo ukwu nke Chineke m, bụ́ Jeruselem Ọhụrụ+ nke si n’eluigwe ebe Chineke m nọ na-agbadata. 13 Onye nwere ntị, ya nụ ihe mmụọ nsọ na-agwa ọgbakọ ndị a.’

14 “Degara mmụọ ozi nke ọgbakọ dị na Leodisia+ akwụkwọ, sị: Onye a na-akpọ Amen,+ ezigbo onye àmà+ a tụkwasịrị obi,+ onye mbụ Chineke kere,+ kwuru ihe ndị a: 15 ‘Ama m ihe ndị unu na-eme. Unu ajụghị oyi, unu ekpoghịkwa ọkụ. Ọ dị m ka ya bụrụ na unu jụrụ oyi ma ọ bụkwanụ na unu na-ekpo ọkụ. 16 Ebe ọ bụ na unu dị ṅaraṅara, unu ekpoghị ọkụ,+ unu ajụghịkwa oyi,+ m ga-agbụpụ unu n’ọnụ m. 17 N’ihi na unu na-asị: “Anyị bara ọgaranya,+ nweekwa akụnụba, ọ dịghịkwa ihe kọrọ anyị.” Ma, unu amaghị na unu na-ahụsi anya, bụrụkwa ndị e kwesịrị imetere ebere. Unu amaghịkwa na unu dara ogbenye, na unu kpuru ìsì, nakwa na unu gba ọtọ. 18 Ana m adụ unu ọdụ ka unu bịa ka m resị unu ọlaedo e ji ọkụ nụchaa, ka unu wee baa ọgaranya. Ka m resịkwa unu uwe na-acha ọcha, ka unu wee yiri uwe, ma ọ́ bụghị ya, ndị ọzọ ga-ahụ ọtọ unu, ihere emee unu.+ Ka m resịkwa unu ọgwụ anya unu ga-ete n’anya unu+ ka unu hụwa ụzọ.+

19 “‘Ndị niile m hụrụ n’anya ka m na-abara mba, na-adọkwa aka ná ntị.+ N’ihi ya, chegharịanụ,+ jirikwanụ obi unu niile fewe Chineke. 20 Eguzo m n’ọnụ ụzọ na-akụ aka. E nwee onye nụrụ olu m ma meghee ụzọ, m ga-abata n’ụlọ ya, mụ na ya erikọọ nri anyasị. 21 M ga-eme ka onye meriri n’agha+ soro m nọdụ ala n’ocheeze m,+ otú ahụ mụnwa meriri wee soro Nna m nọdụ ala+ n’ocheeze ya. 22 Onye nwere ntị, ya nụ ihe mmụọ nsọ na-agwa ọgbakọ ndị a.’”

4 Mgbe ihe a gachara, ahụrụ m ọnụ ụzọ e meghere emeghe n’eluigwe. Olu mbụ m nụrụ, nke na-ada ka opi, gwara m, sị: “Gbagote ebe a. M ga-egosi gị ihe ndị ga-emerịrị.” 2 Mgbe ihe a mechara, mmụọ nsọ malitere idu m ozugbo, mụ ahụ otu ocheeze n’eluigwe, nke e nwere onye nọ ọdụ na ya.+ 3 Onye ahụ nke nọ ọdụ n’ocheeze ahụ na-egbuke ka nkume jaspa+ na nkume dị oké ọnụ* nke na-acha ọbara ọbara. Eke na egwurugwu nke na-egbuke ka emerad gbakwara ocheeze ahụ gburugburu.+

4 Ocheeze iri abụọ na anọ gbakwara ocheeze ahụ gburugburu. Ahụkwara m ka ndị okenye iri abụọ na anọ, ndị yi uwe na-acha ọcha, nọ ọdụ n’ocheeze ndị ahụ.+ Onye ọ bụla n’ime ha kpukwa okpueze ọlaedo n’isi ya. 5 Àmụ̀mà si n’ocheeze ahụ na-egbu,+ anụkwara m olu dị iche iche, égbè eluigwe sikwa n’ocheeze ahụ na-agba.+ Mpanaka* asaa ndị na-enwu ọkụ dịkwa n’ihu ocheeze ahụ. Mpanaka* ndị ahụ pụtara mmụọ asaa nke Chineke.+ 6 N’ihu ocheeze ahụ, e nwere ihe yiri oké osimiri nke dị ka enyo+ ma ọ bụ kristal.

N’etiti ocheeze ahụ nakwa gburugburu ocheeze ahụ, e nwere ndị mmụọ ozi anọ*+ ndị ihu na azụ ha bụ anya anya. 7 Mmụọ ozi nke mbụ dị ka ọdụm.+ Mmụọ ozi nke abụọ dị ka oké ehi.+ Mmụọ ozi nke atọ+ nwere ihu yiri ihu mmadụ. Mmụọ ozi nke anọ+ dị ka ugo nke na-efe efe.+ 8 Nke ọ bụla n’ime ndị mmụọ ozi anọ ahụ* nwere nku isii. Nku ha niile bụkwa anya anya.+ Ehihie na abalị, ha na-asị: “Nsọ, nsọ, nsọ ka Jehova* Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, dị.+ Ọ bụ onye dịbu adị na onye dị adị na onye na-abịa.”+

9 Mgbe ọ bụla ndị mmụọ ozi ndị ahụ* toro Chineke, bụ́ onye nọ ọdụ n’ocheeze ahụ, onye na-adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi,+ sọpụrụkwa ya ma kelee ya, 10 ndị okenye iri abụọ na anọ ahụ+ na-ada n’ala n’ihu Chineke, onye nọ ọdụ n’ocheeze ahụ, na onye na-adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi, ma kpọọrọ ya isiala. Ha na-atọgbọkwa okpueze ha n’ihu ocheeze ahụ, sị: 11 “Jehova* Chineke anyị, onye dị ike,+ i ruru eru ka ndị niile too gị+ ma sọpụrụ gị,+ n’ihi na ọ bụ gị kere ihe niile,+ ọ bụ n’ihi uche gị ka ha ji dịrị, ọ bụkwa ya mere i ji kee ha.”

5 Ahụrụ m otu akwụkwọ mpịakọta e dere ihe ihu na azụ,* nke Chineke, onye nọ ọdụ n’ocheeze ahụ,+ ji n’aka nri ya. E jikwa ihe asaa e ji aka ihe akara mechisie ya ike. 2 Ahụkwara m otu mmụọ ozi dị ike, nke ji oké olu na-asị: “Ònye ruru eru imeghe akwụkwọ mpịakọta a na ịtọpụ ihe ndị a e ji aka ihe akara e ji mechie ya?” 3 Ma, ọ dịghị onye ọ bụla nwere ike imeghe akwụkwọ mpịakọta ahụ ma ọ bụ ile anya n’ime ya, ma n’eluigwe ma n’ụwa ma n’okpuru ala. 4 M wee malite ibe ezigbo ákwá n’ihi na a hụghị onye ruru eru imeghe akwụkwọ mpịakọta ahụ ma ọ bụ ile anya n’ime ya. 5 Ma otu n’ime ndị okenye ahụ sịrị m: “Kwụsị ibe ákwá. Ọdụm nke si n’ebo Juda,+ bụ́ mgbọrọgwụ+ Devid,+ emeriela.+ N’ihi ya, o ruru eru imeghe akwụkwọ mpịakọta ahụ na ihe asaa ahụ e ji aka ihe akara e ji mechie ya.”

6 Ahụkwara m nwa atụrụ+ nke guzo n’etiti ocheeze ahụ na n’etiti ndị mmụọ ozi anọ ahụ* na n’etiti ndị okenye ahụ+ dị ka à ga-asị na e gburu ya egbu.+ O nwere mpi asaa na anya asaa. Anya asaa ndị a pụtara mmụọ asaa nke Chineke,+ ndị o zigara n’ụwa niile. 7 Nwa Atụrụ ahụ wee gaa ozugbo nara akwụkwọ mpịakọta ahụ n’aka nri Chineke, onye nọ ọdụ n’ocheeze ahụ.+ 8 Mgbe ọ naara ya, ndị mmụọ ozi anọ ahụ na ndị okenye iri abụọ na anọ ahụ+ dara n’ala n’ihu Nwa Atụrụ ahụ. Onye nke ọ bụla jikwa otu ụbọ akwara na efere ọlaedo insens* juru. (Insens a pụtara ekpere ndị nsọ.)+ 9 Ha na-abụkwa abụ ọhụrụ,+ sị: “I ruru eru ịnata akwụkwọ mpịakọta ahụ na imeghe ihe ndị e ji aka ihe akara e ji mechie ya, n’ihi na e gburu gị egbu, i jikwa ọbara gị zụtara Chineke ndị mmadụ+ n’ebo niile, n’asụsụ niile, n’agbụrụ niile nakwa ná mba niile.+ 10 I mekwara ka ha bụrụ ndị eze+ na ndị nchụàjà ga na-ejere Chineke anyị ozi.+ Ha ga na-achịkwa+ ụwa.”

11 Ahụrụ m ọtụtụ ndị mmụọ ozi gbara ocheeze ahụ na ndị mmụọ ozi anọ ahụ* na ndị okenye ahụ gburugburu, nụkwa olu ha. Ha dị iri puku kwuru iri puku, na puku kwuru puku.+ 12 Ha ji oké olu na-asị: “Nwa Atụrụ ahụ e gburu egbu+ ruru eru ka e nye ya ikike na akụnụba na amamihe na ume. O ruru eru ka a na-asọpụrụ ya, na-eto ya ma na-aja ya mma.”+

13 Anụkwara m ka ihe niile e kere eke ndị dị n’eluigwe na n’ụwa na n’okpuru ala+ na n’oké osimiri, na ihe niile dị n’ime ha, na-asị: “Ka a na-asọpụrụ Chineke, onye dị ike, nke nọ ọdụ n’ocheeze ahụ,+ na Nwa Atụrụ ahụ,+ onye dị ike, ka a na-ajakwa ha mma+ ma na-eto ha ruo mgbe niile ebighị ebi.”+ 14 Ndị mmụọ ozi anọ ahụ na-asịkwa: “Amen!” Ndị okenye ahụ na-adakwa n’ala kpọọrọ Chineke isiala.

6 Ahụkwara m mgbe Nwa Atụrụ ahụ+ meghere otu n’ime ihe asaa ahụ e ji aka ihe akara e ji mechie akwụkwọ mpịakọta ahụ,+ nụkwa ka otu n’ime ndị mmụọ ozi anọ ahụ*+ ji olu na-ada ka égbè eluigwe kwuo, sị: “Bịa!” 2 Ahụkwara m ịnyịnya na-acha ọcha.+ Onye na-agba ya jikwa ụta. E nyekwara ya okpueze,+ ya agaa ka ọ na-emeri ndị iro ya nakwa ka o merie ha ruo n’isi.+

3 Mgbe o meghere nke abụọ n’ime ihe ndị ahụ e ji aka ihe akara e ji mechie akwụkwọ mpịakọta ahụ, anụrụ m ka mmụọ ozi nke abụọ+ sịrị: “Bịa.” 4 Ịnyịnya ọzọ nke na-acha uhie uhie* wee pụta. E nyekwara onye na-agba ya nnukwu mma agha nakwa ikike iwepụ udo n’ụwa ka ndị bi na ya gburịtawa ibe ha.+

5 Mgbe o meghere nke atọ n’ime ihe ndị ahụ e ji aka ihe akara e ji mechie akwụkwọ mpịakọta ahụ,+ anụrụ m ka mmụọ ozi nke atọ+ sịrị: “Bịa.” Ahụkwara m ịnyịnya ojii, nke onye na-agba ya ji ihe gbara mkpị e ji atụ̀ ihe n’aka ya. 6 Anụrụ m ihe dị ka olu si n’etiti ndị mmụọ ozi anọ ahụ.* Olu ahụ sịrị: “A na-ere otu kwọt* nke ọka wit otu mkpụrụ ego dinarịọs.*+ A na-erekwa kwọt atọ nke ọka bali otu mkpụrụ ego dinarịọs. Emebikwala mmanụ oliv na mmanya.”+

7 Mgbe o meghere nke anọ n’ime ihe ndị ahụ e ji aka ihe akara e ji mechie akwụkwọ mpịakọta ahụ, anụrụ m ka olu mmụọ ozi nke anọ+ sịrị: “Bịa.” 8 Ahụkwara m ịnyịnya ahụ́ ya na-acha ntụ ntụ. Aha onye na-agba ya bụ Ọnwụ. Ili* sochikwara ya azụ. E nyekwara ha ikike ịchị otu ụzọ n’ụzọ anọ nke ụwa, ka ha jiri ogologo mma agha, ụkọ nri,+ ọrịa ọjọọ, na anụ ọhịa na-egbu ndị mmadụ.+

9 Mgbe o meghere nke ise n’ime ihe ndị ahụ e ji aka ihe akara e ji mechie akwụkwọ mpịakọta ahụ, ihe m hụrụ n’okpuru ebe ịchụàjà+ bụ ọbara*+ nke ndị e gburu n’ihi na ha na-eme ihe Chineke kwuru nakwa n’ihi ozi ọma ha nọ na-ezisa.+ 10 Ha wee jiri oké olu tie mkpu, sị: “Ọkaakaa Onyenwe anyị, onye dị nsọ na onye eziokwu,+ olee mgbe ị ga-ekpe ikpe ma bọọ ọbọ ọbara anyị n’isi ndị bi n’ụwa?”+ 11 E nyekwara onye ọ bụla n’ime ha otu uwe mwụda na-acha ọcha.+ A gwakwara ha ka ha zutụkwuo ike, ruo mgbe ọnụ ọgụgụ ndị ohu ibe ha na ụmụnna ha ga-ezu ezu, bụ́ ndị a na-aga igbu otú e gburu hanwa.+

12 Ahụkwara m mgbe o meghere nke isii n’ime ihe ndị ahụ e ji aka ihe akara e ji mechie akwụkwọ mpịakọta ahụ. E nwekwara oké ala ọma jijiji. Anyanwụ jikwara oji ka ákwà iru uju e ji ajị anụ kpaa. Ọnwa chakwara ka ọbara.+ 13 Kpakpando ndị dị n’eluigwe dakwara n’ala dị ka mgbe mkpụrụ fig na-achaghị acha si n’osisi ya na-adapụsị mgbe oké ifufe na-aṅagharị ya. 14 E wepụrụ eluigwe otú e si ewepụ akwụkwọ mpịakọta a fụkọtara afụkọta.+ E wepụkwara ugwu niile na agwaetiti niile n’ebe ha dị.+ 15 Ndị eze na-achị ụwa na ndị nọ n’ọkwá ukwu na ndị ọchịagha na ndị bara ọgaranya na ndị dị ike na ndị ohu niile na ndị niile nweere onwe ha agaa zoo n’ọgba nakwa n’oké nkume ndị dị n’ugwu.+ 16 Ha nọkwa na-asị ugwu na oké nkume ndị ahụ: “Dakwasịnụ anyị+ ma chebe anyị ka Chineke, onye nọ n’ocheeze ahụ, ghara ịhụ anyị,+ ka Nwa Atụrụ ahụ gharakwa iwesa anyị iwe ya,+ 17 n’ihi na oké ụbọchị ha ga-ewe iwe eruola,+ ònyekwa ka a ga-azọpụta?”*+

7 Mgbe ihe a gachara, ahụrụ m ndị mmụọ ozi anọ ka ha guzo n’akụkụ anọ nke ụwa. Ha jidesiri ifufe si n’akụkụ anọ nke ụwa ike, ka ifufe ọ bụla ghara ife n’ụwa ma ọ bụ n’oké osimiri ma ọ bụ n’osisi ọ bụla. 2 Ahụkwara m mmụọ ozi ọzọ ka o si n’ebe ọwụwa anyanwụ na-agbago. O nwekwara akara nke Chineke dị ndụ. O wee jiri oké olu gwa ndị mmụọ ozi anọ ahụ e nyere ikike imebi ụwa na oké osimiri, 3 sị: “Unu emebila ụwa ma ọ bụ oké osimiri ma ọ bụ osisi, ruo mgbe anyị kachara ndị ohu Chineke anyị akara+ n’egedege ihu.”+

4 Anụkwara m na ndị ahụ a kara akara dị otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ (144,000).+ Ha si n’ebo niile nke ụmụ Izrel:+

5 Ndị si n’ebo Juda dị puku iri na abụọ (12,000).

Ndị si n’ebo Ruben dị puku iri na abụọ (12,000).

Ndị si n’ebo Gad dị puku iri na abụọ (12,000).

6 Ndị si n’ebo Asha dị puku iri na abụọ (12,000).

Ndị si n’ebo Naftalaị dị puku iri na abụọ (12,000).

Ndị si n’ebo Manase+ dị puku iri na abụọ (12,000).

7 Ndị si n’ebo Simiọn dị puku iri na abụọ (12,000).

Ndị si n’ebo Livaị dị puku iri na abụọ (12,000).

Ndị si n’ebo Ịsaka dị puku iri na abụọ (12,000).

8 Ndị si n’ebo Zebulọn dị puku iri na abụọ (12,000).

Ndị si n’ebo Josef dị puku iri na abụọ (12,000).

Ndị si n’ebo Benjamin dị puku iri na abụọ (12,000).

9 Mgbe ihe ndị a gachara, ka m nọ na-ele anya, ahụrụ m oké ìgwè mmadụ, nke onye ọ bụla na-enweghị ike ịgụta ọnụ, ka ha guzo n’ihu ocheeze ahụ nakwa n’ihu Nwa Atụrụ ahụ. Ha yi uwe mwụda na-acha ọcha,+ jirikwa igu nkwụ n’aka.+ Ha si ná mba niile na ebo niile na agbụrụ niile na asụsụ niile.+ 10 Ha jikwa oké olu na-eti mkpu, sị: “Ọ bụ Chineke anyị, onye nọ ọdụ n’ocheeze ahụ,+ nakwa Nwa Atụrụ ahụ zọpụtara anyị.”+

11 Ndị mmụọ ozi niile guzokwa gburugburu ocheeze ahụ na ndị okenye ahụ+ na ndị mmụọ ozi anọ ahụ.* Ha gbukwara ikpere n’ala, kpudo ihu n’ala n’ihu ocheeze ahụ ma kpọọrọ Chineke isiala, 12 sị: “Amen! Ka a na-eto Chineke anyị, onye nwere amamihe na ume, onye dịkwa ike. Ka a na-ekelekwa ya ma na-asọpụrụ ya ruo mgbe niile ebighị ebi.+ Amen.”

13 Otu n’ime ndị okenye ahụ wee sị m: “Ole ndị bụ ndị a yi uwe mwụda na-acha ọcha?+ Oleekwa ebe ha si bịa?” 14 M wee sị ya ozugbo: “Onyenwe m, ọ bụ gịnwa ma.” Ya asị m: “Ndị a si n’oké mkpagbu ahụ pụta.+ Ha ejirila ọbara Nwa Atụrụ ahụ saa uwe mwụda ha, uwe mwụda ha ana-achazi ọcha.+ 15 Ọ bụ ya mere ha ji nọrọ n’ihu ocheeze Chineke. Ha na-ejekwara ya ozi n’ụlọ nsọ ya ehihie na abalị. Chineke, onye nọ ọdụ n’ocheeze ahụ,+ ga-echebekwa ha.*+ 16 Agụụ agaghị agụ ha ọzọ. Akpịrị agaghị akpọ ha nkụ ọzọ. Anwụ agaghị acha ha, oké okpomọkụ agaghịkwa adị ebe ha nọ,+ 17 n’ihi na Nwa Atụrụ ahụ,+ onye nọ n’etiti ocheeze ahụ, ga-azụ ha dị ka atụrụ,+ dugakwa ha n’isi iyi nke mmiri nke ndụ.+ Chineke ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya ha.”+

8 Mgbe o+ meghere nke asaa n’ime ihe ndị ahụ e ji aka ihe akara e ji mechie akwụkwọ mpịakọta ahụ,+ eluigwe dara jii ruo ihe dị ka nkeji iri atọ. 2 Ahụkwara m ndị mmụọ ozi asaa+ ka ha guzo n’ihu Chineke. E nyekwara ha opi asaa.

3 Mmụọ ozi ọzọ wee bịa guzo n’ebe ịchụàjà.+ O ji arịa ọlaedo nke a na-etinye insens.* E nyekwara ya nnukwu insens+ ka ọ mụnye ya ọkụ n’elu ebe ịchụàjà e ji ọlaedo rụọ,+ nke dị n’ihu ocheeze ahụ. Ọ ga-amụnyekwa ya ọkụ mgbe a nụrụ ekpere ndị nsọ niile. 4 Anwụrụ ọkụ nke si n’insens ahụ mmụọ ozi ahụ mụnyere ọkụ na ekpere+ ndị nsọ gbagooro n’ihu Chineke. 5 Ma, ozugbo ahụ, mmụọ ozi ahụ si n’ọkụ dị n’ebe ịchụàjà ahụ gụjuo ọkụ n’ihe ahụ a na-etinye insens ma wụda ya n’ụwa. Égbè eluigwe wee gbaa, àmụ̀mà egbuo,+ e nweekwa ala ọma jijiji. Anụkwara m olu dị iche iche. 6 Ndị mmụọ ozi asaa ahụ, ndị ji opi asaa,+ wee jikere ịfụ ha.

7 Mgbe mmụọ ozi nke mbụ fụrụ opi ya, e nwere akụ́ mmiri igwe a gwakọtara ya na ọkụ na ọbara. Akụ́ mmiri igwe a dakwara n’ụwa.+ Otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ụwa na nke osisi wee gbaa ọkụ, ahịhịa niile agbaakwa ọkụ.+

8 Mgbe mmụọ ozi nke abụọ fụrụ opi ya, ihe yiri nnukwu ugwu ọkụ na-agba dara wee daba n’ime oké osimiri,+ otu ụzọ n’ụzọ atọ nke oké osimiri aghọọ ọbara.+ 9 Otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ihe e kere eke ndị dị ndụ n’oké osimiri nwụkwara.+ E mekwara ka otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ụgbọ mmiri kpuo.

10 Mgbe mmụọ ozi nke atọ fụrụ opi ya, otu kpakpando ukwu nke na-enwu ka ọkụ si n’eluigwe daa. Ọ dakwara n’elu otu ụzọ n’ụzọ atọ nke osimiri nakwa n’elu isi mmiri dị iche iche.+ 11 Aha kpakpando ahụ bụ Ahịhịa Ilu. O mekwara ka otu ụzọ n’ụzọ atọ nke mmiri na-elu ilu. Mmiri ndị ahụ gbukwara ọtụtụ mmadụ n’ihi ilu ha na-elu.+

12 Mgbe mmụọ ozi nke anọ fụrụ opi ya, e tiri otu ụzọ n’ụzọ atọ nke anyanwụ+ na nke ọnwa na nke kpakpando ihe. E tiri ha ihe a ka otu ụzọ n’ụzọ atọ ha gbaa ọchịchịrị,+ ka otu ụzọ n’ụzọ atọ nke oge ìhè na-adị n’ụbọchị gbaa ọchịchịrị, otu ụzọ n’ụzọ atọ nke oge ìhè na-adị n’abalị agbaakwa ọchịchịrị.

13 Ahụkwara m otu ugo nke na-efe n’etiti eluigwe, nụkwa ka o ji oké olu kwuo, sị: “Ndị bi n’ụwa ga-ata ezigbo ahụhụ+ n’ihi ihe ga-eme mgbe mmụọ ozi atọ ndị fọrọnụ ga-afụ opi ha.”+

9 Mgbe mmụọ ozi nke ise fụrụ opi ya,+ ahụrụ m otu kpakpando nke si n’eluigwe daa n’ụwa. E nyekwara ya mkpịsị ugodi nke olulu abis.*+ 2 O wee meghee olulu abis ahụ, anwụrụ ọkụ dị ka nke si ná nnukwu ekwú esi n’olulu ahụ pụta. Anwụrụ ọkụ a mere ka anyanwụ na ikuku gbaa ọchịchịrị.+ 3 Igurube sikwa n’anwụrụ ọkụ ahụ pụta n’ụwa.+ E nyere ha otu ikike ahụ akpị ndị dị n’ụwa nwere. 4 A gwakwara ha ka ha ghara ibibi ahịhịa ndị dị n’ụwa ma ọ bụ ahịhịa ọ bụla na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ ma ọ bụ osisi ọ bụla. Kama, ka ndị ha ga-emekpa ahụ́ bụrụ naanị ndị mmadụ na-enweghị akara nke Chineke n’egedege ihu ha.+

5 E nyekwara igurube ndị ahụ ikike ka ha mekpaa ha ahụ́ ọnwa ise, ọ bụghị igbu ha egbu. Ahụ́ ha ga-emekpa ha ga-adịkwa ka mgbe akpị+ gbara mmadụ. 6 N’oge ahụ, ndị mmadụ ga-achọ ọnwụ ma ha agaghị achọta ya. Ha ga-achọkwa ịnwụ ma ọnwụ ga-agbara ha ọsọ.

7 Igurube ndị ahụ yiri ịnyịnya ndị a kwadebere iji gaa agha.+ Ha kpukwa ihe yiri okpueze ọlaedo n’isi, ihu ha dịkwa ka ihu mmadụ. 8 Ma ntutu isi ha dị ka ntutu isi ụmụ nwaanyị. Ezé ha dịkwa ka nke ọdụm.+ 9 Ha yikwa ihe e ji echebe obi, ndị dị ka è ji ígwè mee ha. Ụda nku ha dịkwa ka ụda ụgbọ ịnyịnya ndị ọtụtụ ịnyịnya dọkpụ na-aga agha.+ 10 Ha nwekwara ọdụ, na-agbakwa ka akpị. Ike ha ga-eji mekpaa ndị mmadụ ahụ́ ọnwa ise dịkwa n’ọdụ ha.+ 11 Eze ha bụ mmụọ ozi nke na-achị abis.*+ Na Hibru, aha ya bụ Abadọn.* Ma, na Grik, aha ya bụ Apọlịọn.*

12 Otu ahụhụ agafeela. Ahụhụ abụọ ọzọ+ ka na-abịa ma ihe ndị a gachaa.

13 Mgbe mmụọ ozi nke isii+ fụrụ opi ya,+ anụrụ m olu si na mpi ndị dị n’ebe ịchụàjà ahụ e ji ọlaedo rụọ+ nke dị n’ihu Chineke. 14 Olu ahụ gwara mmụọ ozi nke isii ahụ nke ji opi ahụ, sị: “Tọpụ ndị mmụọ ozi anọ ahụ e kere agbụ ná nnukwu osimiri Yufretis.”+ 15 O wee tọpụ ndị mmụọ ozi anọ ahụ agbụ e kere ha. Ha nọ na-eche ka awa na ụbọchị na ọnwa na afọ ha ga-egbu otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ndị mmadụ ruo.

16 Ụsụụ ndị agha ịnyịnya ahụ dị puku iri abụọ ụzọ puku iri:* Anụrụ m ole ha dị. 17 Otú a ka m si hụ ịnyịnya ndị ahụ na ndị na-agba ha n’ọhụụ: Ndị na-agba ha yi ihe e ji echebe obi nke na-acha ọbara ọbara ka ọkụ, na-achakwa anụnụ anụnụ, na-achakwa odo odo ka sọlfọ. Isi ịnyịnya ndị ahụ dịkwa ka isi ọdụm,+ ọkụ na anwụrụ ọkụ na sọlfọ sikwa n’ọnụ ha pụta. 18 Ihe atọ ndị a, ya bụ, ọkụ na anwụrụ ọkụ na sọlfọ ndị si n’ọnụ ha pụta, gburu otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ndị mmadụ. 19 Ike ịnyịnya ndị ahụ dị n’ọnụ ha na n’ọdụ ha, n’ihi na ọdụ ha dị ka agwọ, nweekwa isi. Ha na-ejikwa ha emekpa ndị mmadụ ahụ́.

20 Ma, ndị ihe atọ ndị ahụ na-egbughị akwaghị ụta maka ihe ha ji aka ha mee. Ha akwụsịghị ife ndị mmụọ ọjọọ na arụsị e ji ọlaedo na ọlaọcha na ọla kọpa na nkume na osisi mee. Arụsị ndị a anaghị ahụ ụzọ. Ha anaghị anụ ihe. Ha anaghịkwa eje ije.+ 21 Ndị ahụ echegharịghịkwa ma kwụsị igbu mmadụ,* ime mgbaasị, ịkwa iko,* na izu ohi.

10 Ahụkwara m ka mmụọ ozi ọzọ dị ike nke yi ígwé ojii dị ka uwe si n’eluigwe na-agbadata, eke na egwurugwu dịkwa n’isi ya, ihu ya dịkwa ka anyanwụ,+ ụkwụ ya dịkwa ka ogidi ọkụ. 2 O jikwa obere akwụkwọ mpịakọta e meghere emeghe n’aka. Ọ zọkwasịkwara ụkwụ aka nri ya n’elu oké osimiri, ma zọkwasị ụkwụ aka ekpe ya n’elu ala. 3 O jikwa oké olu tie mkpu ka mgbe ọdụm gbọrọ ụja.+ Mgbe o tiri mkpu, anụrụ m olu égbè eluigwe asaa.+

4 Mgbe m nụrụ olu égbè eluigwe asaa ahụ, m nọ na-achọ ide ihe ha kwuru, ma, anụrụ m ka otu olu si n’eluigwe,+ sị: “Zochie ihe niile égbè eluigwe asaa ahụ kwuru. Edekwala ha ede.” 5 Mmụọ ozi ahụ m hụrụ nke guzo n’elu oké osimiri na n’elu ala weliziri aka nri ya elu, chee n’eluigwe. 6 Ọ ṅụkwara iyi n’aha Chineke, onye na-adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi,+ onye kere eluigwe na ihe ndị dị n’ime ya, kee ụwa na ihe ndị dị n’ime ya, keekwa oké osimiri na ihe ndị dị n’ime ya.+ Ọ ṅụrụ iyi, sị: “A gaghịzi egbu oge. 7 Ma mgbe ọ fọrọ obere ka mmụọ ozi nke asaa ahụ+ fụọ opi ya,+ a ga-emezu ihe nzuzo dị nsọ+ nke bụ́ ozi ọma Chineke ziri ndị ohu ya bụ́ ndị amụma.”+

8 Anụkwara m olu ahụ si n’eluigwe+ ọzọ ka ọ na-agwa m, sị: “Gaa nara mmụọ ozi ahụ guzo n’elu oké osimiri nakwa n’elu ala+ akwụkwọ mpịakọta ahụ e meghere emeghe, nke o jikwa n’aka.” 9 M wee gakwuru mmụọ ozi ahụ, gwa ya ka o nye m obere akwụkwọ mpịakọta ahụ. Ya asị m: “Were ya taa.+ Ọ ga-enye gị nsogbu n’afọ,* ma ọ ga na-atọ ka mmanụ aṅụ n’ọnụ gị.” 10 M wee nara mmụọ ozi ahụ obere akwụkwọ mpịakọta ahụ o ji n’aka ma taa ya.+ Ọ tọrọ m ụtọ n’ọnụ ka mmanụ aṅụ.+ Ma mgbe m tachara ya, o nyere m nsogbu n’afọ.* 11 A gwakwara m, sị: “Buo amụma ọzọ gbasara ndị dị iche iche na mba dị iche iche na asụsụ dị iche iche na ọtụtụ ndị eze.”

11 E nyere m okporo ahịhịa amị nke yiri mkpara,*+ sịkwa m: “Bilie, tụọ ebe nsọ nke ụlọ nsọ Chineke na ebe ịchụàjà ya, gụọkwa ndị nọ n’ime ya na-efe Chineke ọnụ. 2 Ma hapụ ogige nke dị n’èzí ebe nsọ nke ụlọ nsọ ahụ. Atụkwala ya atụ̀, n’ihi na e nyela ya ndị mba ọzọ. Ha ga-azọkwasịkwa obodo nsọ+ ụkwụ ruo ọnwa iri anọ na abụọ.+ 3 M ga-emekwa ka ndị àmà m abụọ yiri ákwà iru uju buo amụma ruo otu puku ụbọchị na narị ụbọchị abụọ na iri isii (1,260).” 4 Ọ bụ ha ka osisi oliv abụọ+ na ihe abụọ e ji adọsa ọkụ*+ nọchiri anya ha. Ha guzokwa n’ihu Onyenwe ụwa.+

5 Ọ bụrụ na ndị iro ha achọọ imerụ ha ahụ́, ọkụ ga-esi n’ọnụ ha pụta repịa ndị iro ha. Ọ bụrụkwa na onye ọ bụla achọọ imerụ ha ahụ́, a ga-esikwa otú a gbuo ya. 6 Ha nwere ikike imechi eluigwe+ ka mmiri ọ bụla ghara izo+ n’ụbọchị niile ha na-ebu amụma. Ha nwekwara ikike ime ka mmiri ghọọ ọbara,+ nweekwa ikike ime ka e nwee ụdị ihe ọjọọ ọ bụla n’ụwa ugboro ole ha chọrọ.

7 Mgbe ha buchara amụma, anụ ọhịa nke ga-esi n’abis* gbagote ga-alụso ha agha, meriekwa ha ma gbuo ha.+ 8 Ozu ha ga-atọgbọkwa n’okporo ámá obodo ukwu, ebe e gburu Onyenwe ha n’elu osisi. Obodo a yiri Sọdọm na Ijipt. 9 Ndị si n’agbụrụ niile na ebo niile na asụsụ niile na mba niile ga na-ele ozu ha ruo ụbọchị atọ na ọkara.+ Ha agaghịkwa ekwe ka e lie ozu ha n’ili. 10 Ndị bi n’ụwa ga-aṅụrị ọṅụ, meekwa oriri maka na ha abụọ nwụrụ. Ha ga-ezigara ibe ha onyinye, n’ihi na ndị amụma abụọ a mekpara ha ahụ́.

11 Mgbe ụbọchị atọ na ọkara ahụ gachara, Chineke nyeghachiri ha abụọ ume ndụ,+ ha eguzoro n’ụkwụ ha. Ezigbo ụjọ jidekwara ndị hụrụ ha. 12 Ha abụọ nụkwara oké olu nke si n’eluigwe sị ha: “Gbagotenụ ebe a.” Ha wee si n’ígwé ojii gbagoo eluigwe. Ndị iro ha hụkwara ha.* 13 N’oge ahụ, e nwere oké ala ọma jijiji. Otu ụzọ n’ụzọ iri nke obodo ahụ wee daa. Ala ọma jijiji ahụ gbukwara puku mmadụ asaa (7,000), ụjọ atụwa ndị fọdụrụ, ha etowe Chineke nke eluigwe.

14 Ahụhụ nke abụọ+ agafeela. Ahụhụ nke atọ ga-abịakwa ọsọ ọsọ.

15 Mgbe mmụọ ozi nke asaa fụrụ opi ya,+ e nwere ndị ji oké olu si n’eluigwe kwuo, sị: “Alaeze ụwa aghọọla Alaeze nke Chineke+ na nke Kraịst ya.+ Chineke ga na-achịkwa ruo mgbe niile ebighị ebi.”+

16 Ndị okenye iri abụọ na anọ+ ndị nọ ọdụ n’ocheeze ha n’ihu Chineke wee gbuo ikpere n’ala, kpudo ihu n’ala, kpọọrọ Chineke isiala, 17 sị: “Anyị na-ekele gị, Jehova* Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, onye dị adị+ na onye dịbu adị, n’ihi na i jirila ike gị dị ukwuu bụrụ eze ma na-achị.+ 18 Ma mba niile were iwe, gịnwa eweekwa iwe, oge a kara aka eruo ka e kpee ndị nwụrụ anwụ ikpe, kwụọkwa ndị ohu gị bụ́ ndị amụma+ na ndị nsọ na ndị na-atụ egwu gị* ụgwọ,+ ma ndị nta ma ndị ukwu, bibiekwa ndị na-ebibi ụwa.”+

19 E wee meghee ebe nsọ nke ụlọ nsọ Chineke dị n’eluigwe, mụ ahụ igbe ọgbụgba ndụ ya n’ebe nsọ nke ụlọ nsọ ya.+ Àmụ̀mà gburu. Anụrụ m olu dị iche iche. Égbè eluigwe gbara. Ala mara jijiji, nnukwu akụ́ mmiri ígwé dakwara.

12 Ahụkwara m nnukwu ihe àmà n’eluigwe. Ihe àmà ahụ bụ: Otu nwaanyị+ nke yi anyanwụ dị ka uwe, ọnwa dịkwa n’okpuru ụkwụ ya. O kpukwa okpueze e ji kpakpando iri na abụọ mee. 2 Nwaanyị ahụ dị ime. Ebe ọ bụkwa na ime na-eme ya, ọ na-eti mkpu n’ihi mgbu ịmụpụta nwa na-egbu ya nakwa ụfụ ọ na-afụ ya.

3 Ahụkwara m ihe àmà ọzọ n’eluigwe. Ahụrụ m nnukwu dragọn* na-acha uhie uhie,*+ nke nwere isi asaa na mpi iri. O kpukwa okpueze asaa n’isi ya. 4 Ọdụ ya dọkpụụrụ otu ụzọ n’ụzọ atọ nke kpakpando+ ndị dị n’eluigwe, tụdata ha n’ụwa.+ Dragọn ahụ guzokwa n’ihu nwaanyị ahụ+ nke na-aga ịmụ nwa, ka ọ ga-abụ, ọ mụọ nwa, ya erie nwa ahụ.

5 Nwaanyị ahụ wee mụọ nwa nwoke,+ onye ga-eji mkpanaka ígwè taa mba niile ahụhụ.*+ E kukwaara nwa ya ozugbo kugara Chineke n’ocheeze ya. 6 Nwaanyị ahụ gbagakwara n’ala ịkpa, ebe Chineke kwadebere ọ ga-anọ, ka a na-enye ya nri ebe ahụ ruo otu puku ụbọchị na narị ụbọchị abụọ na iri isii (1,260).+

7 Agha dakwara n’eluigwe: Maịkel*+ na ndị mmụọ ozi ya lụsoro dragọn ahụ agha, dragọn ahụ na ndị mmụọ ozi ya lụsokwara ha agha. 8 Ma, e meriri dragọn ahụ na ndị mmụọ ozi ya,* nke na e nweghịzi ebe ha ga-anọ n’eluigwe. 9 A chụdataziri nnukwu dragọn+ ahụ n’ụwa.+ Ọ bụ ya bụ agwọ mbụ ahụ,+ onye a na-akpọ Ekwensu+ na Setan,+ onye na-eduhie ụwa niile.+ A chụdatara ya na ndị mmụọ ozi ya. 10 Anụkwara m oké olu nke si n’eluigwe sị:

“Chineke anyị azọpụtala ndị mmadụ!+ O ji ike ya merie! Alaeze ya amalitela ịchị!+ Kraịst ya amalitela iji ikike o nwere akpa ike, n’ihi na a chụdala onye na-ebo ụmụnna anyị ebubo, onye na-ebo ha ebubo n’ihu Chineke anyị ehihie na abalị!+ 11 Ha merikwara ya+ n’ihi ọbara Nwa Atụrụ ahụ,+ na n’ihi ozi ha zisara.+ Ha ahụghịkwa ndụ* ha n’anya.+ Ọ bụ ya mere na ha atụghị ụjọ ọnwụ. 12 N’ihi ya, ṅụrịanụ ọṅụ, unu ndị bi n’eluigwe. Ụwa na oké osimiri ga-ata ahụhụ+ n’ihi na Ekwensu agbadatala ebe ha nọ. Ezigbo iwe ji ya maka na ọ ma na oge ya fọrọ ntakịrị.”+

13 Mgbe dragọn ahụ hụrụ na a chụdatala ya n’ụwa,+ ọ kpagburu nwaanyị ahụ+ mụrụ nwa nwoke. 14 Ma e nyere nwaanyị ahụ nku abụọ nke nnukwu ugo,+ ka o fega n’ala ịkpa, ebe a kwadebeere ya. N’ebe ahụ ka a ga-enye ya nri ruo otu oge na oge abụọ na ọkara otu oge*+ ebe agwọ ahụ+ na-anọghị.

15 Agwọ ahụ wee gbụpụta mmiri yiri osimiri n’ọnụ ya n’azụ nwaanyị ahụ, ka mmiri ahụ rie nwaanyị ahụ. 16 Ma ala nyeere nwaanyị ahụ aka. O meghere ọnụ loo mmiri ahụ dragọn ahụ gbụpụtara n’ọnụ ya. 17 Dragọn ahụ wee wesa nwaanyị ahụ iwe, gaakwa ịlụso ndị fọdụrụ n’ime ụmụ* ya agha,+ bụ́ ndị na-edebe iwu Chineke, ndị e nyekwara ọrụ ịgba àmà banyere Jizọs.+

13 O* wee guzo otu ebe n’elu ájá oké osimiri.

Ahụkwara m otu anụ ọhịa+ nke si n’oké osimiri na-apụta.+ O nwere mpi iri na isi asaa, okpueze iri dịkwa na mpi ndị ahụ. Aha dị iche iche e ji na-ekwulu Chineke dịkwa n’isi ya. 2 Anụ ọhịa ahụ m hụrụ dịkwa ka agụ owuru, ma ụkwụ ya dị ka nke anụ ọhịa bea, ọnụ ya dịkwa ka ọnụ ọdụm. Dragọn ahụ+ nyekwara anụ ọhịa ahụ ike na ocheeze na ikike dị ukwuu.+

3 Ahụkwara m na e merụrụ anụ ọhịa ahụ ezigbo ahụ́ n’otu isi ya. Ma ahụ́ a e merụrụ ya lara+ n’agbanyeghị na ọ gaara egbu ya. Ụwa niile sokwaara ya, na-aja ya mma. 4 Ha fekwara dragọn ahụ n’ihi na o nyere anụ ọhịa ahụ ikike. Ha fekwara anụ ọhịa ahụ, na-asị: “Ònye dị ka anụ ọhịa a? Ònyekwa ga-alụsoli ya agha?” 5 E nyere anụ ọhịa ahụ ike itu ọnụ na ikwulu Chineke. E nyekwara ya ike ime ihe ọ bụla masịrị ya ruo ọnwa iri anọ na abụọ.+ 6 O wee meghee ọnụ ya, na-ekwulu+ Chineke, na-ekwutọ aha ya na ebe o bi, na-ekwutọkwa ndị bi n’eluigwe.+ 7 E nyere ya ike ịlụso ndị nsọ agha na imeri ha.+ E nyekwara ya ike ịchị ebo niile na agbụrụ niile na asụsụ niile na mba niile. 8 Ndị niile bi n’ụwa ga-efekwa ya. Malite mgbe a tọrọ ntọala ụwa, o nweghị onye n’ime ha e dere aha ya n’akwụkwọ mpịakọta nke ndụ+ nke Nwa Atụrụ ahụ e gburu egbu.+

9 Onye nwere ntị, ya nụ.+ 10 Ọ bụrụ na e nwere onye e kwesịrị ịtụ mkpọrọ, a ga-atụ ya mkpọrọ. A ga-ejikwa mma agha gbuo onye ji mma agha gbuo mmadụ.*+ N’ihi ya, ndị nsọ+ kwesịrị ịtachi obi,+ nweekwa okwukwe.+

11 M wee hụ anụ ọhịa ọzọ nke si n’ala na-apụta. O nwere mpi abụọ ndị dị ka nke obere ebule, ma ọ malitere ikwu okwu dị ka dragọn.+ 12 O ji ikike niile nke anụ ọhịa mbụ ahụ+ nwere na-achị n’ihu ya. Ọ na-emekwa ka ụwa na ndị bi n’ime ya na-efe anụ ọhịa mbụ ahụ, nke e merụrụ ezigbo ahụ́, ma ya agbakee.+ 13 Ọ na-emekwa ihe dị ịtụnanya n’ihu ụmụ mmadụ. Ọ na-emedị ka ọkụ si n’eluigwe daa n’ụwa.

14 N’ihi ihe ndị dị ịtụnanya e nyere ya ike ime n’ihu anụ ọhịa ahụ, ọ na-eduhie ndị bi n’ụwa. Ọ na-agwakwa ndị bi n’ụwa ka ha kpụọ ihe yiri anụ ọhịa ahụ+ e ji mma agha merụọ ahụ́, ma ya agbakee.+ 15 E nyekwara anụ ọhịa nke abụọ ahụ ike ime ka ihe ahụ yiri anụ ọhịa nke mbụ ahụ kuwe ume, ka ihe ahụ yiri anụ ọhịa ahụ nwee ike ịna-ekwu okwu, meekwa ka e gbuo ndị niile na-ekweghị efe yanwa.

16 Ọ na-amanyekwa mmadụ niile ka a kaa ha akara n’aka nri ha ma ọ bụ n’egedege ihu ha,+ ma ndị nta ma ndị ukwu, ma ndị ọgaranya ma ndị ogbenye, ma ndị nweere onwe ha ma ndị ohu. 17 Ọ na-emekwa ka a ghara inwe onye ga-azụ ihe ma ọ bụ ree ihe ma e wezụga onye nwere akara ahụ, ya bụ, aha+ anụ ọhịa ahụ ma ọ bụ nọmba nke aha ya.+ 18 Ka onye nwere ọgụgụ isi gbakọọ nọmba nke anụ ọhịa ahụ, n’ihi na ọ bụ nọmba mmadụ. Nọmba ya bụkwa narị isii na iri isii na isii (666).+ Ọ bụ naanị onye nwere amamihe ga-aghọta ihe a.

14 M wee hụ Nwa Atụrụ ahụ+ ka o guzo n’Ugwu Zayọn,+ ya na otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ (144,000).+ E dere aha ya na aha Nna ya+ n’egedege ihu ha. 2 Anụkwara m ụda si n’eluigwe, nke dị ka ụda mmiri na-asọ ike ike, dịkwa ka ụda oké égbè eluigwe. Ụda ahụ m nụrụ dịkwa ka nke ndị na-abụ abụ, ndị na-akpọ ụbọ akwara ha ka ha na-abụ abụ. 3 Ha na-abụkwa abụ yiri abụ ọhụrụ+ n’ihu ocheeze ahụ na n’ihu ndị mmụọ ozi anọ ahụ*+ na n’ihu ndị okenye ahụ.+ O nweghịkwa onye mụtaliri abụ ahụ ma e wezụga otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ (144,000) ahụ,+ ndị Chineke zụtara n’ụwa. 4 Ndị a ejighị ụmụ nwaanyị merụọ onwe ha. N’eziokwu, ha dị ka ụmụ nwaanyị na-amaghị nwoke.+ Ha na-eso Nwa Atụrụ ahụ na-aga ebe ọ bụla ọ na-aga.+ Chineke si n’ụmụ mmadụ zụta ha+ ka ha bụụrụ ya na Nwa Atụrụ ahụ mkpụrụ mbụ.+ 5 Aghụghọ ọ bụla adịghịkwa n’ọnụ ha. Ha enweghịkwa ntụpọ ọ bụla.+

6 Ahụkwara m mmụọ ozi ọzọ ka ọ na-efegharị n’etiti eluigwe.* Ọ nọ na-ezisara ndị bi n’ụwa, mba niile na ebo niile na ndị na-asụ asụsụ niile na agbụrụ niile ozi ọma ga-adịru mgbe ebighị ebi.+ 7 O ji oké olu na-asị: “Tụọnụ egwu Chineke, tookwanụ ya, n’ihi na oge ọ ga-eji ekpe ndị mmadụ ikpe eruola.+ N’ihi ya, feenụ Chineke, onye kere eluigwe na ụwa na oké osimiri+ na isi mmiri niile.”

8 Mmụọ ozi nke abụọ wee sochie nke mbụ, sị: “Babịlọn Ukwu ahụ+ adaala! Ọ daala!+ Ọ bụ ya bụ onye mere ka mba niile ṅụọ mmanya ya nke na-eme ka ịkwa iko* gụsiwe ha agụụ ike!”+

9 Mmụọ ozi nke atọ wee sochie ha, jiri oké olu sị: “Onye ọ bụla a kara akara n’egedege ihu ya ma ọ bụ n’aka ya,+ nke na-efekwa anụ ọhịa ahụ+ na ihe ahụ yiri ya a kpụrụ akpụ, 10 ga-aṅụkwa mmanya Chineke, nke bụ́ iwe ya. A gwaghị mmanya a agwa. Chineke ga-agbanyekwa ya n’iko iwe ya.+ A ga-ejikwa ọkụ na sọlfọ+ mekpaa onye ahụ ahụ́ n’ihu ndị mmụọ ozi dị nsọ na n’ihu Nwa Atụrụ ahụ. 11 Ọkụ e ji na-emekpa ha ahụ́* ga na-akwụ anwụrụ ruo mgbe niile ebighị ebi.+ Ndị ahụ na-efe anụ ọhịa ahụ na ihe ahụ yiri ya a kpụrụ akpụ, na onye ọ bụla a kara akara nke aha anụ ọhịa ahụ,+ agaghịkwa ezu ike ma n’ehihie ma n’abalị. 12 Ndị nsọ, bụ́ ndị na-edebe iwu Chineke, ndị nwekwara okwukwe+ ka Jizọs, kwesịrị ịtachi obi.”+

13 Anụkwara m olu si n’eluigwe sị, “Dee ihe a: Si ugbu a gawa, ndị ha na Onyenwe anyị dị n’otu+ tupu ha anwụọ ga-enwe obi ụtọ. Mmụọ nsọ na-asị ka ha zuru ike n’ọrụ ha nọ na-arụ, n’ihi na a gaghị echefu ya.”*

14 Ahụkwara m ígwé ojii na-acha ọcha, na onye yiri nwa nke mmadụ+ nke nọ ọdụ n’elu ígwé ojii ahụ, onye kpukwa okpueze ọlaedo n’isi ya. O jikwa mma dị nkọ e ji ewe ihe ubi n’aka.

15 Mmụọ ozi ọzọ wee si n’ebe nsọ nke ụlọ nsọ ahụ pụta, jiri oké olu gwa onye ahụ nọ ọdụ n’elu ígwé ojii ahụ, sị: “Were mma i ji ewe ihe ubi ghọrọ mkpụrụ, n’ihi na ihe ubi nke ụwa achaala nke ọma,+ oge e ji aghọ mkpụrụ eruokwala.” 16 Onye ahụ nọ ọdụ n’elu ígwé ojii ahụ wee jiri mma o ji ewe ihe ubi ghọrọ mkpụrụ ndị dị n’ụwa.

17 Mmụọ ozi ọzọ wee si n’ebe nsọ nke ụlọ nsọ ahụ dị n’eluigwe pụta. Yanwa jikwa mma dị nkọ e ji ewe ihe ubi.

18 Mmụọ ozi ọzọ wee si n’ebe ịchụàjà ahụ pụta. E nyekwara ya ikike ịhụ maka ọkụ. O wee jiri oké olu gwa mmụọ ozi ahụ ji mma e ji ewe ihe ubi, sị: “Were mma dị nkọ i ji ewe ihe ubi ghọrọ ụyọkọ mkpụrụ vaịn ndị dị n’ụwa, n’ihi na mkpụrụ ha achaala.”+ 19 Mmụọ ozi ahụ wee tinye mma o ji ewe ihe ubi n’ụwa ma ghọrọ mkpụrụ vaịn ndị dị n’ụwa. Ọ wụbakwara ha n’ime nnukwu ebe a na-azọchapụta mmanya nke nọchiri anya iwe Chineke.+ 20 A zọchakwara mkpụrụ vaịn ahụ n’ebe a na-azọchapụta mmanya nke dị n’azụ obodo, ọbara esikwa ebe ahụ na-asọpụta, tookwa ruo n’eriri e kere ịnyịnya n’olu, ruo ebe dị ihe dị ka narị kilomita abụọ na iri itoolu na isii (296).*

15 M wee hụ ihe àmà ọzọ dị egwu, nke dịkwa ebube, n’eluigwe, ya bụ, ndị mmụọ ozi asaa+ ji ihe asaa a ga-eji ata ndị mmadụ ahụhụ. Ahụhụ ndị a bụ ndị ikpeazụ, maka na ha gachaa, iwe Chineke adajụọ.+

2 Ahụkwara m ihe yiri oké osimiri nke dị ka enyo,+ nke a gwakọtara ya na ọkụ, hụkwa ndị meriri+ anụ ọhịa ahụ na ihe yiri ya a kpụrụ akpụ+ na nọmba aha ya.+ Ndị ahụ guzokwa n’akụkụ oké osimiri ahụ nke dị ka enyo, jirikwa ụbọ akwara Chineke n’aka. 3 Ha nọkwa na-abụ abụ Mosis,+ ohu Chineke, na-abụkwa abụ Nwa Atụrụ ahụ,+ sị:

“Jehova* Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile,+ ọrụ gị dị ukwuu, dịkwa ebube.+ Eze mgbe ebighị ebi,+ ụzọ gị ziri ezi, ị na-ekwukwa eziokwu.+ 4 Jehova,* naanị gị bụ Chi e kwesịrị ịtụkwasị obi.+ N’ihi ya, olee onye na-agaghị atụ egwu gị? Oleekwa onye na-agaghị eto aha gị? Mba niile ga-abịa fee gị,+ maka na ha achọpụtala na ị na-ekpe ikpe ziri ezi.”

5 Mgbe ihe ndị a gachara, ahụrụ m ka ebe nsọ nke ụlọikwuu mepere n’eluigwe.+ Ihe dị n’ime ya bụ ihe Chineke ji agbara ndị ya àmà.+ 6 Ndị mmụọ ozi asaa ahụ, ndị ji ihe asaa ahụ a ga-eji ata ndị mmadụ ahụhụ,+ sikwa n’ebe nsọ ahụ pụta. Ha yi ákwà linin dị ọcha nke na-enwu gbaa, keekwa ájị̀ ọlaedo gburugburu obi ha. 7 Otu n’ime ndị mmụọ ozi anọ ahụ* wee nye ndị mmụọ ozi asaa ahụ efere ọlaedo asaa. Ihe juru n’efere ndị ahụ bụ iwe Chineke,+ onye na-adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi. 8 Anwụrụ ọkụ bịakwara ju ebe nsọ ahụ n’ihi ebube Chineke+ nakwa n’ihi ike ya. Ọ dịghịkwa onye nwere ike ịbanye n’ebe nsọ ahụ ruo mgbe ndị mmụọ ozi asaa ahụ tachara ndị mmadụ ahụhụ asaa ahụ.+

16 Anụkwara m oké olu nke si n’ebe nsọ ahụ+ gwa ndị mmụọ ozi asaa ahụ, sị: “Gaanụ n’ụwa wụpụ iwe Chineke nke dị n’efere asaa ahụ.”+

2 Mmụọ ozi nke mbụ wee gaa n’ụwa wụpụ ihe dị n’efere ya.+ Ọnyá na-afụ ezigbote ụfụ+ wee pụta n’ahụ́ ndị nwere akara anụ ọhịa ahụ+ na ndị na-efe ihe ahụ yiri ya a kpụrụ akpụ.+

3 Mmụọ ozi nke abụọ wee wụpụ ihe dị n’efere ya n’oké osimiri.+ Ihe ahụ wee ghọọ ọbara+ dị ka nke onye nwụrụ anwụ. Ihe* niile dị ndụ n’oké osimiri nwụkwara.+

4 Mmụọ ozi nke atọ wee wụpụ ihe dị n’efere ya n’osimiri nakwa n’isi mmiri dị iche iche.+ Ha wee ghọọ ọbara.+ 5 Anụkwara m ka mmụọ ozi nke na-ahụ maka mmiri sịrị: “Ị bụ Chineke e kwesịrị ịtụkwasị obi,+ onye dị adị na onye dịbu adị.+ Ị bụ onye ezi omume n’ihi ihe ndị a i kpebiri.+ 6 Ha gburu* ndị nsọ na ndị amụma.+ Ọ bụ ya mere i ji nye ha ọbara ka ha ṅụọ.+ Ọ bụkwa ihe kwesịịrị ha.”+ 7 Anụkwara m olu si n’ebe ịchụàjà ahụ sị: “Jehova* Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile,+ ikpe gị ziri ezi, e kwesịkwara ịtụkwasị ya obi.”+

8 Mmụọ ozi nke anọ wee wụpụ ihe dị n’efere ya n’anyanwụ.+ E nyekwara anyanwụ ike ka o jiri ọkụ chagbuo ndị mmadụ. 9 E jikwa oké okpomọkụ mekpaa ndị mmadụ ahụ́. Ma ha echegharịghị, kama ha kwuluru Chineke.* Ha etoghị Chineke, onye nwere ikike ịta ha ahụhụ ndị a.

10 Mmụọ ozi nke ise wee wụpụ ihe dị n’efere ya n’elu ocheeze anụ ọhịa ahụ. Alaeze anụ ọhịa ahụ wee gbaa ọchịchịrị,+ ndị mmadụ amalitekwa ịtabi ire ha n’ihi ahụ́ na-egbu ha mgbu. 11 Ma, ha ahapụghị ihe ọjọọ ha na-eme, kama ha kwuluru Chineke nke eluigwe n’ihi ahụ́ na-egbu ha mgbu na ọnyá dị ha n’ahụ́.

12 Mmụọ ozi nke isii wee wụnye ihe dị n’efere ya ná nnukwu osimiri Yufretis,+ mmiri ya atakpọọ+ iji doziere ndị eze+ si n’ebe ọwụwa anyanwụ ụzọ.

13 Ahụkwara m dragọn ahụ+ na anụ ọhịa ahụ na onye amụma ụgha ahụ ka okwu na-adịghị ọcha* si n’ọnụ nke ọ bụla n’ime ha pụta. Okwu atọ ndị a si n’ọnụ ha pụta yiri mbàrá.* 14 Okwu ndị a si n’aka ndị mmụọ ọjọọ, ndị eze niile nọ n’ụwa nụkwara ha. Okwu ndị a mekwara ihe ndị dị ịtụnanya+ iji kpọkọta ndị eze ahụ maka agha+ a ga-alụ n’oké ụbọchị Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.+

15 Anụkwara m olu sịrị: “Ana m abịa ka onye ohi.+ Onye mụ anya,+ nke a na-anaraghịkwa uwe ya, ga-enwe obi ụtọ, n’ihi na ọ gaghị agba ọtọ na-ejegharị, ndị mmadụ ahụ ya, ihere emee ya.”+

16 Okwu ndị ahụ si n’aka ndị mmụọ ọjọọ kpọkọtakwara ndị eze ahụ n’ebe a na-akpọ Amagedọn* n’asụsụ Hibru.+

17 Mgbe mmụọ ozi nke asaa wụpụrụ ihe dị n’efere ya n’ikuku, anụrụ m oké olu si n’ocheeze dị n’ebe nsọ ahụ.+ Ọ sịrị: “Ọ gwụla!” 18 Àmụ̀mà wee gbuo, mụ anụkwa olu dị iche iche, égbè eluigwe agbaakwa, enweekwa oké ala ọma jijiji nke dị egwu, nke a na-enwetụbeghịkwa ụdị ya kemgbe e kere mmadụ n’ụwa.+ 19 Obodo ukwu ahụ+ kewakwara ụzọ atọ, obodo dị iche iche ná mba niile adaakwa. Chineke chetakwara Babịlọn Ukwu ahụ,+ ka o mee ka ọ ṅụọ mmanya dị n’iko nke iwe ya dị ọkụ.+ 20 Agwaetiti niile gbakwara ọsọ. O nweghịkwa ebe a hụrụ ugwu dị iche iche.+ 21 Ọtụtụ nnukwu akụ́ mmiri ígwé, ndị nke ọ bụla n’ime ha dị otu talent n’arọ,* wee si n’eluigwe dakwasị ndị mmadụ.+ Ha kwulukwara Chineke n’ihi akụ́ mmiri ígwé a+ o ji taa ha ahụhụ. Ahụhụ ọ takwara ha enweghị atụ.

17 Otu n’ime ndị mmụọ ozi asaa ahụ, ndị ji efere asaa ahụ,+ wee bịa sị m: “Bịa, m ga-egosi gị ikpe ahụ a mara oké nwaanyị akwụna ahụ nke nọ ọdụ n’elu mmiri na-asọ ike ike,+ 2 onye ya na ndị eze ụwa kwara iko.*+ E mekwara ka mmanya ya, nke nọchiri anya iko ọ na-akwa, na-egbu ndị bi n’ụwa.”+

3 Mmụọ ozi ahụ wee buru m n’ike mmụọ nsọ baa n’ala ịkpa. Ahụkwara m otu nwaanyị nke nọ ọdụ n’elu otu anụ ọhịa nke na-acha uhie uhie.* Aha e ji ekwulu Chineke jukwara n’ahụ́ anụ ọhịa ahụ. O nwekwara isi asaa na mpi iri. 4 Nwaanyị ahụ yi ákwà na-acha pọpụl+ na ákwà na-acha uhie uhie. O jikwa ọlaedo na nkume dị oké ọnụ* na nkume pel chọọ onwe ya mma.+ O bukwa iko ọlaedo n’aka. Ihe juru n’iko a bụ ihe ndị rụrụ arụ na ihe ndị na-adịghị ọcha o ji akwa iko.* 5 E dere otu aha dị omimi n’egedege ihu ya. Aha ahụ bụ: “Babịlọn Ukwu, nne ụmụ nwaanyị akwụna+ na nne ihe ndị rụrụ arụ dị n’ụwa.”+ 6 Ahụkwara m na ọbara ndị nsọ na ọbara ndị àmà Jizọs na-egbu nwaanyị ahụ ka mmanya.+

Mgbe m hụrụ ya, o juru m nnọọ anya. 7 N’ihi ya, mmụọ ozi ahụ gwara m, sị: “Gịnị mere o ji ju gị anya? M ga-akọwara gị ihe dị omimi gbasara nwaanyị ahụ+ na anụ ọhịa ahụ ọ nọ ọdụ n’elu ya, nke nwekwara isi asaa na mpi iri.+ 8 Anụ ọhịa ahụ ị hụrụ dịbu adị, ma ọ dịghịzi, ma ọ ga-esikwa n’abis* gbagote,+ a ga-ebibikwa ya. Mgbe ndị bi n’ụwa, ndị a na-edeghị aha ha n’akwụkwọ mpịakọta nke ndụ,+ malite mgbe a tọrọ ntọala ụwa, ga-ahụ otú anụ ọhịa ahụ si bụrụ nke dịbu adị, ma ọ dịghịzi, ma bụrụ nke ga-adị, ọ ga-eju ha anya.

9 “Ọ bụ onye ma ihe ga-aghọta ihe a: Isi asaa ahụ+ pụtara ugwu asaa, bụ́ ebe nwaanyị ahụ nọ ọdụ. 10 Ha pụtara ndị eze asaa: Ise adaala. Otu nọ ugbu a. Nke ọzọ abịabeghị. Ma mgbe ọ ga-abịa, ọ ga-anọ obere oge. 11 Ma anụ ọhịa ahụ nke dịbu adị, ma ọ dịghịzi,+ bụ eze nke asatọ. O sikwa na nke asaa ahụ pụta. A ga-ebibikwa ya.

12 “Mpi iri ahụ ị hụrụ pụtara ndị eze iri, ndị na-achịwabeghị, ma ha na anụ ọhịa ahụ ga-anata ikike ịchị otu awa. 13 Obi ndị eze ahụ bụ otu. Ọ bụ ya mere ha ji nye anụ ọhịa ahụ ike na ikike ha. 14 Ndị eze ahụ ga-alụso Nwa Atụrụ ahụ agha.+ Ma Nwa Atụrụ ahụ ga-emeri ha,+ n’ihi na ọ bụ Onyenwenụ kacha ndị nwenụ niile na Eze ndị eze.+ Ndị so ya ga-emerikwa ha, ya bụ, ndị Chineke kpọrọ, ndị ọ họọrọ, na ndị jisiri ya aka ike.”+

15 Ọ sịkwara m: “Mmiri ahụ ị hụrụ, bụ́ ebe nwaanyị akwụna ahụ nọ ọdụ, pụtara agbụrụ dị iche iche na ìgwè mmadụ na mba dị iche iche na ndị na-asụ asụsụ dị iche iche.+ 16 Mpi iri ahụ+ na anụ ọhịa ahụ+ ị hụrụ ga-akpọ nwaanyị akwụna ahụ+ asị, nara ya ihe niile o nwere ma gbaa ya ọtọ. Ha ga-erikwa anụ ya ma kpọọ ya ọkụ kpamkpam.+ 17 N’ihi na Chineke mere ka imezu nzube ya dịrị ha n’obi,+ ya bụ, ka ha jiri otu obi nye anụ ọhịa ahụ alaeze ha,+ ruo mgbe a ga-emezu ihe Chineke kwuru. 18 Nwaanyị ahụ+ ị hụrụ pụtara obodo ukwu ahụ nke na-achị ndị eze na-achị ụwa.”

18 Mgbe ihe ndị a gachara, ahụrụ m mmụọ ozi ọzọ si n’eluigwe na-agbadata. O nwere ikike dị ukwuu. Ebube ya mekwara ka ìhè dị n’ụwa. 2 O wee jiri oké olu tie mkpu, sị: “Babịlọn Ukwu ahụ adaala! Ọ daala!+ Ọ ghọọla ebe ndị mmụọ ọjọọ bi nakwa ebe ndị mmụọ ọjọọ* na nnụnụ niile na-adịghị ọcha, nke rụkwara arụ, na-ezo!+ 3 N’ihi na o meela ka mba niile ṅụọ mmanya ya nke na-eme ka ịkwa iko* gụsiwe ha agụụ ike.+ Ya na ndị eze nke ụwa kwakwara iko.+ Ndụ okomoko ọ na-ebi emeekwala ka ndị ahịa nke ụwa baa ọgaranya.”

4 Anụkwara m ka olu ọzọ si n’eluigwe sị: “Ndị nke m, sinụ n’ime ya pụta,+ ma ọ bụrụ na unu achọghị iso ya mehie, ọ bụrụkwa na unu achọghị ka a taa unu ahụhụ a ga-ata ya.+ 5 Mmehie ya karịrị akarị,*+ Chineke ga-ekpekwa ya ikpe maka ihe ọjọọ ndị o mere.+ 6 Mee ya ihe ndị o mere ndị ọzọ,+ meekwa ha ya okpukpu abụọ.+ Jiri iko ahụ+ ọ gbanyere mmanya a gwara agwa gbanyere ya ụdị mmanya ahụ okpukpu abụọ.+ 7 Otú ahụ o toro onwe ya, biekwa ndụ okomoko, ị ga-esi otú ahụ mekpaa ya ahụ́, meekwa ka o ruo uju. N’ihi na ọ na-asị n’obi ya: ‘Abụ m eze nwaanyị nọ n’ocheeze. Abụghị m nwaanyị isi mkpe. E nweghịkwa mgbe m ga-eru uju.’+ 8 Ọ bụ ya mere a ga-eji taa ya ahụhụ niile a ga-ata ya n’otu ụbọchị. Ọ ga-eru uju. Ọ ga-anọ n’ụkọ nri. Ọ ga-anwụ, a ga-akpọkwa ya ọkụ kpamkpam,+ n’ihi na Jehova* Chineke, bụ́ onye mara ya ikpe, dị ike.+

9 “Ndị eze ụwa, ndị ha na ya kwara iko,* ndị nwetakwara ihe ná ndụ okomoko o biri, ga-ebere ya ákwá, tie aka n’obi, ruokwara ya uju, mgbe ha ga na-ele anwụrụ ọkụ nke si n’ọkụ a na-akpọ ya. 10 Ha ga-eguzo n’ebe dị anya n’ihi ụjọ ha na-atụ maka ahụ́ a na-emekpa ya. Ha ga-asịkwa: ‘Babịlọn, obodo ukwu,+ obodo dị ike, ihe nke a mere gị ajọgbuola onwe ya. Chineke ekpeela gị ikpe n’otu awa.’

11 “Ndị ahịa ụwa na-ebere ya ákwá, na-erukwara ya uju, n’ihi na e nweghịzi onye ga-azụ ngwá ahịa ha. 12 Ngwá ahịa ha bụ ọlaedo, ọlaọcha, nkume dị oké ọnụ,* nkume pel, ezigbo ákwà linin, ákwà na-acha pọpụl, ákwà silk, ákwà na-acha uhie uhie,* osisi ọ bụla na-esi ísì ọma, ụdị ihe ọ bụla e ji ọdụ́ mee, ụdị ihe ọ bụla e ji osisi dị oké ọnụ mee, ihe e ji ọla kọpa mee, na nke e ji ígwè mee, nakwa nke e ji nkume mabụl mee. 13 Ngwá ahịa ha ndị ọzọ bụ sinamọn, ihe na-esi ísì ọma nke si India, insens,* mmanụ na-esi ísì ọma, frankinsens, mmanya, mmanụ oliv, ntụ ọka e gwere nke ọma, ọka wit, ehi, atụrụ, ịnyịnya, ụgbọ ịnyịnya, ndị ohu, na ndị ọzọ.* 14 Ihe ọma* ndị gụrụ gị* agụụ anaghịzi eru gị aka. Ihe niile dị ụtọ na ihe ndị mara ezigbo mma i nwere alaala n’iyi. A gaghịkwa ahụ ha ọzọ.

15 “Ndị na-ere ihe ndị a, ndị nwaanyị ahụ mere ka ha baa ọgaranya, ga-eguzo ebe dị anya n’ihi egwu ha na-atụ ahụ́ a na-emekpa ya. Ha ga-ebe ákwá, ruokwa uju, 16 sị: ‘Obodo ukwu, ihe nke a mere gị ajọgbuola onwe ya. Ị na-eyi ezigbo ákwà linin na nke na-acha pọpụl na ákwà na-acha uhie uhie. Ị na-ejikwa ihe ndị e ji ọlaedo mee na nkume dị oké ọnụ* na nkume pel achọ onwe gị mma.+ 17 Akụnụba a niile ị kpakọtara alaala n’iyi n’otu awa.’

“Ndị isi ụgbọ niile, ndị niile na-eji ụgbọ mmiri aga ebe ha na-aga, ndị na-akwọ ụgbọ mmiri nakwa ndị niile na-anọ n’oké osimiri akpa afọ ha, guzokwa n’ebe dị anya 18 tie mkpu ka ha nọ na-ele anwụrụ ọkụ nke si n’ọkụ na-agba ya. Ha sịrị: ‘Olee obodo yiri obodo ukwu a?’ 19 Ha wụkwasịkwara ájá n’isi ha, tiekwa mkpu, na-ebe ákwá, na-erukwa uju, na-asị: ‘Obodo ukwu, ihe nke a mere gị ajọgbuola onwe ya. Ndị niile nwere ụgbọ mmiri n’oké osimiri si n’akụnụba gị baa ọgaranya. A laala gị n’iyi n’otu awa.’+

20 “Unu ndị nọ n’eluigwe+ na unu ndị nsọ+ na ndịozi na ndị amụma, ṅụrịanụ ọṅụ n’ihi ihe e mere ya, maka na Chineke amaala ya ikpe maka ihe ndị o mere unu!”+

21 Otu mmụọ ozi dị ike wee buru otu nkume yiri nnukwu nkume e ji egwe nri tụba ya n’oké osimiri, sị: “Otú a ka a ga-esi atụda obodo ukwu a bụ́ Babịlọn ngwa ngwa. A gaghịzi ahụ ya ọzọ.+ 22 A gaghịkwa anụ ụda egwú nke ndị na-akpọ ụbọ, na-agụkwa egwú, na ụda egwú nke ndị na-akụ egwú na nke ndị na-egbu ọjà na nke ndị na-afụ opi n’ime gị ọzọ. A gaghịkwa ahụ omenkà nke na-arụ ụdị ọrụ ọ bụla n’ime gị ọzọ. A gaghịkwa anụ ụda nkume e ji egwe nri n’ime gị ọzọ. 23 Ọkụ* agaghịkwa enwu n’ime gị ọzọ. A gaghịkwa anụ olu nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ na nke nwaanyị a na-alụ ọhụrụ n’ime gị ọzọ. N’ihi na ndị ahịa gị bụ ndị nọ n’ọkwá ukwu n’ụwa. I jikwa mgbaasị ị na-eme+ duhie mba niile. 24 A hụkwara ọbara ndị amụma na nke ndị nsọ+ na nke ndị niile e gburu n’ụwa n’ime gị.”+

19 Mgbe ihe a gachara, anụrụ m oké olu dị ka nke oké ìgwè mmadụ n’eluigwe. Ha sịrị: “Toonụ Jaa!*+ Ọ bụ Chineke anyị na-azọpụta mmadụ. Ọ dị ebube, dịkwa ike. 2 Ikpe ya ziri ezi, e kwesịkwara ịtụkwasị ikpe ya obi.+ N’ihi na ọ taala nwaanyị akwụna ahụ ahụhụ. Nwaanyị a ji iko ọ na-akwa* merụọ ụwa, Chineke abọọkwala ọbọ ọbara ndị ohu ya n’isi ya.”+ 3 Ozugbo ahụ, ha kwuru nke ugboro abụọ, sị: “Toonụ Jaa!*+ Anwụrụ ọkụ nke si n’ahụ́ ya ga na-akwụgo ruo mgbe niile ebighị ebi.”+

4 Ndị okenye iri abụọ na anọ ahụ+ na ndị mmụọ ozi anọ ahụ*+ gburu ikpere n’ala ma kpọọrọ Chineke bụ́ onye nọ ọdụ n’ocheeze isiala, sị: “Amen! Toonụ Jaa!”*+

5 Otu olu sikwa n’ocheeze ahụ sị: “Na-etonụ Chineke anyị, unu niile bụ́ ndị ohu ya,+ ndị na-atụ egwu ya, ndị ukwu na ndị nta.”+

6 Anụkwara m ihe na-ada ka olu oké ìgwè mmadụ, dịkwa ka ụda nke mmiri na-asọ ike ike na ụda oké égbè eluigwe. Ha sịrị: “Toonụ Jaa,*+ n’ihi na Jehova* Chineke anyị, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile,+ amalitela ịchị!+ 7 Ka anyị ṅụrịa ọṅụ, nwee ezigbo obi ụtọ ma too Chineke, n’ihi na oge Nwa Atụrụ ahụ ga-eji alụ nwaanyị eruola, nwunye ya ejikerekwala. 8 E nyere nwunye Nwa Atụrụ ahụ ákwà linin ọma nke na-enwu gbaa, nke dịkwa ọcha. Ezigbo ákwà linin a nọchiri anya ezi omume ndị nsọ na-eme.”+

9 Mmụọ ozi ahụ wee sị m, “Dee ihe a: Ndị a kpọrọ òkù ka ha bịa rie nri agbamakwụkwọ Nwa Atụrụ ahụ+ na-enwe obi ụtọ.” Ọ sịkwara m: “Ọ bụ Chineke kwuru ihe ndị a e kwesịrị ịtụkwasị obi.” 10 M wee sekpuru ala n’ụkwụ ya ka m fee ya. Ma ọ sịrị m: “Kpachara anya! Emela ya!+ Abụ m naanị ohu otú gị na ụmụnna gị bụkwa, unu ndị e nyere ọrụ ịna-agba àmà banyere Jizọs.+ Na-efe naanị Chineke,+ n’ihi na amụma ndị a na-ebu bụ maka ịgba àmà banyere Jizọs.”+

11 Ahụrụ m ka e meghere eluigwe, hụkwa otu ịnyịnya ọcha+ dị ebe ahụ. A na-akpọkwa onye na-agba ya Onye E Kwesịrị Ịtụkwasị Obi+ na Onye Eziokwu.+ Ọ na-ekpe ikpe ziri ezi, na-alụkwa agha kwesịrị ekwesị.+ 12 Anya ya bụ ire ọkụ na-enwu enwu,+ o kpukwa ọtụtụ okpueze n’isi ya. O nwekwara aha e dere n’ahụ́ ya, nke onye ọ bụla na-amaghị ma e wezụga yanwa. 13 O yikwa uwe elu ọbara gbasara.* Aha a na-akpọkwa ya bụ Okwu+ Chineke. 14 Ụsụụ ndị agha nọ n’eluigwe gbakwa ịnyịnya ọcha na-eso ya n’azụ. Ha yikwa ezigbo ákwà linin nke na-acha ọcha, dịkwa ọcha. 15 Ogologo mma agha dị nkọ sikwa n’ọnụ ya pụta.+ Ọ ga-eji ya gbuo mba niile. Ọ ga-ejikwa mkpanaka ígwè taa ha ahụhụ.*+ Ọ na-azọchakwa mkpụrụ dị n’ebe a na-azọchapụta mmanya nke nọchiri anya iwe dị ọkụ nke Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.+ 16 O nwere aha e dere n’uwe elu ya, n’ebe apata ụkwụ ya. Aha ahụ bụ Eze ndị eze na Onyenwenụ kacha ndị nwenụ niile.+

17 Ahụkwara m otu mmụọ ozi ka o guzo n’anyanwụ. O jikwa oké olu kpọọ nnụnụ niile na-efe n’etiti eluigwe,* sị: “Bịanụ ebe a. Zukọtanụ maka nnukwu oriri Chineke kpọrọ,+ 18 ka unu wee rie anụ ndị eze na anụ ndị ọchịagha na anụ ndị dike+ na anụ ịnyịnya na nke ndị na-agba ha,+ na anụ mmadụ niile, ma nke ndị nweere onwe ha ma nke ndị ohu, ma nke ndị nta ma nke ndị ukwu.”

19 Ahụkwara m anụ ọhịa ahụ na ndị eze ụwa na ụsụụ ndị agha ha ka ha zukọtara ka ha lụso ma onye ahụ na-agba ịnyịnya ahụ ma ụsụụ ndị agha ya agha.+ 20 E jidekwara anụ ọhịa ahụ na onye amụma ụgha ahụ+ nọ n’ihu ya mee ihe ndị dị ịtụnanya, ndị o ji duhie ndị a kara akara anụ ọhịa ahụ+ na ndị na-efe ihe yiri ya a kpụrụ akpụ.+ A tụbara anụ ọhịa ahụ na onye amụma ụgha ahụ ná ndụ n’ọdọ ọkụ* nke sọlfọ mere ka ọ na-enwusi ike.+ 21 Ma, e ji ogologo mma agha ahụ si n’ọnụ onye ahụ na-agba ịnyịnya+ pụta gbuchapụ ndị fọrọnụ. Nnụnụ niile rikwara anụ ha, rijuo afọ.+

20 Ahụkwara m otu mmụọ ozi ka o si n’eluigwe na-agbadata. O ji mkpịsị ugodi nke abis*+ na nnukwu agbụ ígwè n’aka. 2 O jidekwara dragọn ahụ,+ bụ́ agwọ mbụ ahụ,+ onye a na-akpọ Ekwensu+ na Setan,+ kee ya agbụ otu puku (1,000) afọ. 3 Ọ tụbakwara ya n’abis,*+ mechie ya ma kaa akara n’elu ya, ka ọ ghara iduhie mba niile ọzọ ruo mgbe otu puku (1,000) afọ ahụ gwụchara. Mgbe ihe a gachara, a ga-ahapụtụ ya.+

4 Ahụrụ m ocheeze dị iche iche. E nyere ndị nọ ọdụ na ha ike ikpe ikpe. Ahụrụ m ọbara* ndị e gburu* maka na ha gbara àmà banyere Jizọs, gwakwa ndị mmadụ gbasara Chineke. Ndị a efeghị anụ ọhịa ahụ ma ọ bụ ihe yiri ya a kpụrụ akpụ, a kaghịkwa ha akara anụ ọhịa ahụ n’egedege ihu na n’elu aka ha.+ Ha wee dịrị ndụ ma soro Kraịst bụrụ eze,+ chịakwa otu puku (1,000) afọ. 5 Ọ bụ ya bụ mbilite n’ọnwụ mbụ.+ Ndị fọrọ ná ndị nwụrụ anwụ+ agaghị adị ndụ ruo mgbe otu puku (1,000) afọ ahụ gwụchara. 6 Ndị a ga-akpọlite ná mbilite n’ọnwụ mbụ ga-enwe obi ụtọ,+ dịrịkwa nsọ. Ha agaghị anwụ+ ọnwụ nke abụọ,*+ kama ha ga-abụ ndị nchụàjà+ Chineke na nke Kraịst. Ha ga-esokwa ya* bụrụ eze, chịakwa otu puku (1,000) afọ.+

7 Ozugbo otu puku (1,000) afọ ahụ gwụchara, a ga-atọpụ Setan na mkpọrọ. 8 Ọ ga-agakwa ka o duhie mba ndị dị n’akụkụ anọ nke ụwa, bụ́ Gọg na Megọg, ka ọ kpọkọta ha maka ịlụ agha. Ha dị ọtụtụ ka ájá dị n’oké osimiri. 9 Ha ga-agakwa ebe niile n’ụwa, gbaa ebe ndị nsọ mara ụlọikwuu gburugburu, gbaakwa obodo ahụ a hụrụ n’anya gburugburu. Ma ọkụ ga-esi n’eluigwe bịa repịa ha.+ 10 A ga-atụbakwa Ekwensu, onye na-eduhie ha, n’ọdọ ọkụ* ahụ sọlfọ na-eme ka ọ na-enwusi ike, ebe anụ ọhịa ahụ+ na onye amụma ụgha ahụ nọ anọ.+ A ga-emekpakwa ha ahụ́* ehihie na abalị ruo mgbe niile ebighị ebi.

11 Ahụrụ m otu nnukwu ocheeze na-acha ọcha, hụkwa Chineke, onye nọ ọdụ na ya.+ Ụwa na eluigwe sikwa n’ihu ya gbapụ,+ a hụghịkwa ha ọzọ. 12 Ahụkwara m ndị nwụrụ anwụ, ma ndị ukwu ma ndị nta, ka ha guzo n’ihu ocheeze ahụ. E meghekwara akwụkwọ mpịakọta dị iche iche. Ma e meghere akwụkwọ mpịakọta ọzọ. Ọ bụ akwụkwọ mpịakọta nke ndụ.+ E jikwa ihe e dere n’akwụkwọ mpịakọta ndị ahụ kpee ndị nwụrụ anwụ ikpe otú ha si kpaa àgwà.+ 13 Oké osimiri hapụrụ ndị nwụrụ anwụ nọ n’ime ya, ọnwụ na ili* hapụkwara ndị nwụrụ anwụ nọ n’ime ha. E kpekwara ndị ahụ ikpe otú ha si kpaa àgwà n’otu n’otu.+ 14 A tụbakwara ọnwụ na ili* n’ime ọdọ ọkụ ahụ.+ Ọdọ ọkụ ahụ+ pụtara ọnwụ nke abụọ.+ 15 A tụbakwara onye ọ bụla a na-edeghị aha ya n’akwụkwọ nke ndụ+ n’ọdọ ọkụ ahụ.+

21 Ahụkwara m eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ,+ n’ihi na eluigwe mbụ na ụwa mbụ alaala n’iyi,+ oké osimiri+ adịghịkwa. 2 Ahụkwara m obodo nsọ ahụ, bụ́ Jeruselem Ọhụrụ, ka o si n’eluigwe, ebe Chineke nọ, na-agbadata.+ E jikeere ya otú e si ejike nwaanyị a na-alụ ọhụrụ nke a chọrọ mma ka ọ gaa zute di ya.+ 3 M wee nụ ka otu oké olu si n’ocheeze ahụ sị: “Ụlọikwuu nke Chineke dị ebe ụmụ mmadụ nọ. Ha na Chineke ga-ebikwa. Ha ga-abụkwa ndị nke ya. Chineke ga-anọnyekwara ha.+ 4 Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri niile dị ha n’anya.+ Ọnwụ agaghịzi adị.+ Iru uju ma ọ bụ ibe ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịzi adị.+ Ihe mbụ niile agafeela.”

5 Chineke, onye nọ ọdụ n’ocheeze ahụ,+ sịkwara: “Ana m eme ihe niile ka ha dị ọhụrụ.”+ Ọ sịkwara: “Dee ha edee, n’ihi na e kwesịrị ịtụkwasị okwu ndị a obi, ha bụkwa eziokwu.” 6 Ọ sịkwara m: “Ha emezuola. Abụ m Alfa na Omega,* mmalite na ọgwụgwụ.+ M ga-enye onye ọ bụla akpịrị na-akpọ nkụ mmiri si n’isi iyi mmiri nke ndụ n’efu.+ 7 Onye ọ bụla meriri n’agha ga-enweta ihe ndị a. M ga-abụkwa Chineke ya. Ọ ga-abụkwa nwa m. 8 Ma ndị ụjọ na ndị na-enweghị okwukwe+ na ndị na-adịghị ọcha na ndị rụrụ arụ na ndị na-egbu mmadụ*+ na ndị na-akwa iko*+ na ndị na-eme mgbaasị na ndị na-ekpere arụsị na ndị ụgha niile,+ a ga-atụba ha n’ọdọ ọkụ ahụ sọlfọ na-eme ka ọ na-enwusi ike.+ Ọ pụtara ọnwụ nke abụọ.”+

9 Otu n’ime ndị mmụọ ozi asaa ahụ, ndị ji efere asaa ahụ ahụhụ asaa ndị ikpeazụ juru,+ wee bịa gwa m, sị: “Bịa, m ga-egosikwa gị nwaanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ, bụ́ nwunye Nwa Atụrụ ahụ.”+ 10 N’ihi ya, o buuru m n’ike mmụọ nsọ gaa ná nnukwu ugwu dị oké elu. O gosikwara m ka obodo nsọ ahụ bụ́ Jeruselem si n’eluigwe, ebe Chineke nọ, na-agbadata.+ 11 Obodo nsọ a jupụtakwara n’ebube Chineke.+ Ọ na-egbuke egbuke ka nkume dị ezigbo oké ọnụ,* dị ka nkume jaspa nke na-egbuke nke ọma.+ 12 O nwere nnukwu mgbidi dị oké elu, nweekwa ọnụ ụzọ ámá iri na abụọ. Ndị mmụọ ozi iri na abụọ nọkwa n’ọnụ ụzọ ámá ndị ahụ. E dekwara aha ebo iri na abụọ nke ụmụ Izrel na ha. 13 Ọnụ ụzọ ámá atọ dị n’ebe ọwụwa anyanwụ, ọnụ ụzọ ámá atọ adịrị n’ebe ugwu, ọnụ ụzọ ámá atọ adịrị n’ebe ndịda, ọnụ ụzọ ámá atọ adịrịkwa n’ebe ọdịda anyanwụ.+ 14 Mgbidi obodo ahụ nwere nkume iri na abụọ e ji tọọ ntọala ya. E dekwara aha iri na abụọ nke ndịozi iri na abụọ+ nke Nwa Atụrụ ahụ n’elu nkume ndị ahụ.

15 Onye ahụ nke na-agwa m okwu ji okporo ahịhịa amị ọlaedo ọ ga-eji atụ̀ obodo ahụ na ọnụ ụzọ ámá ya na mgbidi ya.+ 16 Obodo ahụ nwekwara akụkụ anọ há nhata. Ogologo ya hakwa ka obosara ya. O wee jiri okporo ahịhịa amị ahụ tụọ obodo ahụ, ya abụrụ na ọ dị ihe dị ka puku kilomita abụọ na narị abụọ na iri abụọ (2,220).* Ogologo ya na obosara ya na ogo ya hà nhata. 17 Ọ tụkwara mgbidi ya, ya abụrụ na ọ dị otu narị kubit na iri anọ na anọ (144).* Ihe mmụọ ozi a ji tụọ ya bụ ihe ndị mmadụ ji atụ̀ ihe. 18 Nkume jaspa ka e ji rụọ mgbidi ya.+ Obodo ahụ bụkwa ezigbo ọlaedo nke yiri enyo na-egbuke egbuke. 19 E ji ụdị nkume ọ bụla dị oké ọnụ* tọọ ntọala mgbidi obodo ahụ. Nkume nke mbụ e ji tọọ ntọala ya bụ jaspa. Nke abụọ bụ safaya. Nke atọ bụ kalsidọni. Nke anọ bụ emerad. 20 Nke ise bụ sadọniks. Nke isii bụ sadiọs. Nke asaa bụ krisolaịt. Nke asatọ bụ beril. Nke itoolu bụ topaz. Nke iri bụ krisopres. Nke iri na otu bụ hayasịnt. Nke iri na abụọ bụ ametist. 21 Ọnụ ụzọ ámá iri na abụọ ahụ bụkwa nkume pel iri na abụọ. E ji otu nkume pel rụọ nke ọ bụla n’ime ọnụ ụzọ ámá ndị ahụ. Okporo ámá obodo ahụ bụkwa ezigbo ọlaedo, dị ka enyo na-egbuke egbuke.

22 Ahụghị m ụlọ nsọ n’obodo ahụ, n’ihi na Jehova* Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile,+ na Nwa Atụrụ ahụ bụ ụlọ nsọ ya. 23 Ìhè anyanwụ na ọnwa abaghị uru n’obodo ahụ, n’ihi na ebube Chineke na-enye ya ìhè.+ Ọkụ* ya bụkwa Nwa Atụrụ ahụ.+ 24 Mba niile ga-eji ìhè ya na-eje ije,+ ndị eze ụwa ga-emekwa ka obodo ahụ dịkwuo ebube. 25 A gaghịkwa emechi ọnụ ụzọ ámá ya emechi n’ehihie, n’ihi na abalị agaghị adị ebe ahụ.+ 26 Ndị mmadụ ga-eto obodo a, sọpụrụkwa ya.+ 27 Ma ihe ọ bụla na-adịghị nsọ na onye ọ bụla nke na-eme ihe rụrụ arụ, nke na-aghọkwa aghụghọ, agaghị aba n’ime ya.+ Ọ bụ naanị ndị e dere aha ha n’akwụkwọ mpịakọta nke ndụ nke Nwa Atụrụ ahụ ga-aba n’ime ya.+

22 Mmụọ ozi ahụ gosikwara m ka osimiri nke mmiri nke ndụ,+ nke dị ka enyo na-egbuke egbuke, si n’ocheeze Chineke na nke Nwa Atụrụ ahụ+ na-asọpụta, 2 na-asọda n’etiti okporo ámá obodo ahụ. E nwere osisi nke ndụ n’akụkụ abụọ nke osimiri ahụ. Ha na-amị mkpụrụ ugboro iri na abụọ n’afọ. Ha na-amị mkpụrụ ha kwa ọnwa. Akwụkwọ nke osisi ndị ahụ bụ maka ịgwọ mba niile.+

3 Chineke agaghịzi abụ obodo ahụ ọnụ. Ma, ocheeze Chineke na nke Nwa Atụrụ ahụ+ ga-adị n’obodo ahụ. Ndị ohu Chineke ga na-efekwa ya.* 4 Ha ga-ahụkwa ihu ya.+ A ga-edekwa aha ya n’egedege ihu ha.+ 5 Abalị agaghịzi adị.+ Ìhè mpanaka* na nke anyanwụ agaghịzi abara ha uru, n’ihi na Jehova* Chineke ga-enye ha ìhè.+ Ha ga-abụ eze, na-achịkwa ruo mgbe niile ebighị ebi.+

6 Mmụọ ozi ahụ wee sị m: “E kwesịrị ịtụkwasị okwu ndị a obi, ha bụkwa eziokwu.+ Jehova,* bụ́ Chineke, onye mere ka ndị amụma si n’ike mmụọ nsọ kwuo okwu,+ zigara mmụọ ozi ya ka o gosi ndị ohu ya ihe ndị ga-emerịrị n’oge na-adịghị anya. 7 Ana m abịa ngwa ngwa.+ Onye ọ bụla nke na-eme ihe e kwuru n’amụma ndị dị n’akwụkwọ mpịakọta a na-enwe obi ụtọ.”+

8 Ọ bụ mụnwa bụ́ Jọn na-anụ ihe ndị a, na-ahụkwa ha. Mgbe m nụrụ ha, hụkwa ha, esekpuuru m ala n’ụkwụ mmụọ ozi nke nọ na-egosi m ihe ndị a ka m fee ya. 9 Ma ọ gwara m, sị: “Kpachara anya! Emela ya! Abụ m naanị ohu otú gị na ụmụnna gị, bụ́ ndị amụma, bụkwa. Abụkwa m ohu otú ndị na-eme ihe ndị e kwuru n’akwụkwọ mpịakọta a bụ. Na-efe naanị Chineke.”+

10 Ọ sịkwara m: “Ezochila ihe e kwuru n’amụma ndị dị n’akwụkwọ mpịakọta a, n’ihi na oge ahụ a kara aka dị nso. 11 Onye na-eme ajọ omume, ya mere ajọ omume ya na-aga. Onye na-akpa àgwà rụrụ arụ, ya kpara àgwà rụrụ arụ ya na-aga. Ma, onye na-eme ezi omume, ya mere ezi omume ya na-aga. Onye dịkwa nsọ, ya dịrị nsọ na-aga.”

12 “Ana m abịa ngwa ngwa, m ga-akwụkwa onye ọ bụla ụgwọ otú o si kpaa àgwà.+ 13 Abụ m Alfa na Omega,*+ onye mbụ na onye ikpeazụ, mmalite na ọgwụgwụ. 14 Ndị sara uwe mwụda ha+ na-enwe obi ụtọ. A ga-enye ha ikike ịta mkpụrụ si n’osisi nke ndụ ahụ,+ na isi n’ọnụ ụzọ ámá ndị dị n’obodo ahụ banye na ya.+ 15 N’azụ obodo ahụ ka ndị na-eme ka nkịta* nọ, ha na ndị na-eme mgbaasị na ndị na-akwa iko* na ndị na-egbu mmadụ* na ndị na-ekpere arụsị na onye ọ bụla ịgha ụgha na-amasị, nke na-aghakwa ụgha.+

16 “Mụnwa, bụ́ Jizọs, zigara mmụọ ozi m ka ọ gbaara unu àmà banyere ihe ndị a ga-abara ọgbakọ niile uru. Abụ m mgbọrọgwụ Devid, bụrụkwa nwa ya.+ Abụkwa m kpakpando ụtụtụ+ nke na-enwu gbaa.”

17 Mmụọ nsọ na nwaanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ+ na-asị, “Bịa!” Onye ọ bụla nke nụrụ ya, ya sịkwa, “Bịa!” Onye ọ bụla akpịrị na-akpọ nkụ, ya bịa.+ Onye ọ bụla nke chọrọ, ya bịa ṅụọ mmiri nke ndụ n’efu.+

18 “Ana m agwa onye ọ bụla nụrụ okwu amụma ndị dị n’akwụkwọ mpịakọta a, sị: Ọ bụrụ na e nwee onye tinyere ihe n’ihe ndị a e dere,+ Chineke ga-ata ya ahụhụ ndị e dere n’akwụkwọ mpịakọta a.+ 19 Ọ bụrụkwa na e nwee onye wepụrụ ihe n’okwu amụma ndị dị n’akwụkwọ mpịakọta a, Chineke agaghị ekwe ka o nweta ihe ọma ndị e dere n’akwụkwọ mpịakọta a, ya bụ, ọ gaghị ekwe ka ọ taa mkpụrụ si n’osisi nke ndụ.+ Ọ gaghịkwa ekwe ka ọ banye n’obodo nsọ ahụ.+

20 “Onye ahụ nke na-ekwu na ihe ndị a bụ eziokwu kwuru, sị, ‘Ana m abịa ọsọ ọsọ.’”+

“Amen! Bịa, Onyenwe anyị Jizọs.”

21 Ka Onyenwe anyị Jizọs meere ndị nsọ amara.

Gụọ A5.

Ma ọ bụ “A na Z.” Alfa bụ mkpụrụ akwụkwọ mbụ na Grik, Omega abụrụ mkpụrụ akwụkwọ ikpeazụ.

Ma ọ bụ “oriọna.”

Ma ọ bụ “oriọna.”

Ma ọ bụ “Hedis.” Gụọ Nkọwa Okwu.

Ma ọ bụ “oriọna.”

Ma ọ bụ “oriọna.”

Ma ọ bụ “oriọna.”

Ma ọ bụ “oriọna.”

Na Grik, “ụlọ nzukọ.”

Na Grik, “jidesiri aha m ike.”

Gụọ Nkọwa Okwu, “Ịkwa iko.”

Gụọ Nkọwa Okwu, “Ịkwa iko.”

Gụọ Nkọwa Okwu, “Ịkwa iko.”

Na Grik, “na akụrụ.”

Ma ọ bụ “Ọ ga-eji mkpanaka ígwè chịa ndị mmadụ.”

Na Grik, “si n’ụlọ nzukọ.”

Ma ọ bụ “nkume sadiọs.”

Ma ọ bụ “Oriọna.”

Ma ọ bụ “Oriọna.”

Na Grik, “ihe anọ dị ndụ.”

Na Grik, “ihe anọ ahụ dị ndụ.”

Gụọ A5.

Na Grik, “ihe anọ ahụ dị ndụ.”

Gụọ A5.

Na Grik, “n’ime na n’azụ.”

Na Grik, “ihe anọ ahụ dị ndụ.”

Ma ọ bụ “ihe na-esi ísì ọma a na-amụnye ọkụ.”

Na Grik, “ihe anọ ahụ dị ndụ.”

Na Grik, “ihe anọ ahụ dị ndụ.”

Ma ọ bụ “ọbara ọbara.”

Na Grik, “ihe anọ ahụ dị ndụ.”

Kwọt bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Gụọ B14.

Dinarịọs bụ mkpụrụ ego ọlaọcha ndị Rom. Otu dinarịọs ka a na-akwụ onye e goro ọrụ ụbọchị. Gụọ B14.

Ma ọ bụ “Hedis.” Gụọ Nkọwa Okwu.

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.” Gụọ Nkọwa Okwu.

Ma ọ bụ “ònyekwa ga-eguzoli?”

Na Grik, “ihe anọ ahụ dị ndụ.”

Ma ọ bụ “ga-agbasakwa ụlọikwuu ya n’isi ha.”

Ma ọ bụ “ihe na-esi ísì ọma a na-amụnye ọkụ.”

Ma ọ bụ “olulu na-enweghị nsọtụ.”

Ma ọ bụ “olulu na-enweghị nsọtụ.”

Abadọn pụtara “Mbibi.”

Apọlịọn pụtara “Onye Mbibi.”

Ya bụ, narị nde abụọ (200,000,000).

Ma ọ bụ “igbu ọchụ.”

Grik, por·nei′a. Gụọ Nkọwa Okwu.

Na Grik, “Ọ ga-eme ka afọ luo gị ilu.”

Na Grik, “o mere ka afọ luo m ilu.”

Ma ọ bụ “mkpara e ji atụ̀ ihe.”

Ma ọ bụ “oriọna.”

Ma ọ bụ “n’olulu na-enweghị nsọtụ.”

Ma ọ bụ “nọkwa na-ele ha.”

Gụọ A5.

Na Grik, “ndị na-atụ egwu aha gị.”

Ma ọ bụ “nnukwu agwọ.”

Ma ọ bụ “ọbara ọbara.”

Ma ọ bụ “onye ga-eji mkpanaka ígwè chịa mba niile.”

Maịkel pụtara “Ònye Dị Ka Chineke?”

O nwere ike ịbụ, “Ma e meriri dragọn ahụ.”

Na Grik, “mkpụrụ obi.” Gụọ Nkọwa Okwu.

Ya bụ, oge atọ na ọkara.

Na Grik, “mkpụrụ.”

Ya bụ, nnukwu agwọ a na-akpọ dragọn.

O nwere ike ịbụ, “Ọ bụrụ na a ga-eji mma agha gbuo mmadụ, a ga-ejirịrị mma agha gbuo ya.”

Na Grik, “ihe anọ ahụ dị ndụ.”

Ma ọ bụ “ọ na-efegharị n’elu.”

Grik, por·nei′a. Gụọ Nkọwa Okwu.

Ma ọ bụ, “Mkpọrọ a ga-atụ ha.”

Na Grik, “ọrụ ha rụrụ na-eso ha.”

Na Grik, “stediọm 1,600.” Otu stediọm bụ mita 185 (amaụkwụ 606.95). Stediọm a abụghị ámá egwuregwu. Gụọ B14.

Gụọ A5.

Gụọ A5.

Na Grik, “ihe anọ ahụ dị ndụ.”

Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi.”

Na Grik, “wụfuru ọbara.”

Gụọ A5.

Na Grik, “aha Chineke.”

Na Grik, “mmụọ na-adịghị ọcha.”

Ma ọ bụ “akịrị.”

Grik, Har Ma·ge·don′. E si n’okwu Hibru pụtara “Ugwu Megido” nweta ya.

Otu talent ndị Grik bụ kilogram 20.4. Gụọ B14.

Gụọ Nkọwa Okwu, “Ịkwa iko.”

Ma ọ bụ “ọbara ọbara.”

Ma ọ bụ “nkume pụrụ iche.”

Gụọ Nkọwa Okwu, “Ịkwa iko.”

Ma ọ bụ “n’olulu na-enweghị nsọtụ.”

Ma ọ bụ “mmụọ na-adịghị ọcha.” O nwere ike ịbụ, “ume; ikuku ọjọọ; okwu ndị mmụọ ọjọọ.”

Grik, por·nei′a. Gụọ Nkọwa Okwu.

Ma ọ bụ “kpụkọtara ọnụ ruo eluigwe.”

Gụọ A5.

Gụọ Nkọwa Okwu, “Ịkwa iko.”

Ma ọ bụ “nkume pụrụ iche.”

Ma ọ bụ “na-acha ọbara ọbara.”

Ma ọ bụ “ihe na-esi ísì ọma a na-amụnye ọkụ.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Na Grik, “Mkpụrụ osisi ọma.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi gị.”

Ma ọ bụ “nkume pụrụ iche.”

Ma ọ bụ “Ìhè oriọna.”

Ma ọ bụ “Haleluja!” “Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.

Gụọ Nkọwa Okwu, “Ịkwa iko.”

Ma ọ bụ “Haleluja!” “Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.

Na Grik, “ihe anọ ahụ dị ndụ.”

Ma ọ bụ “Haleluja!” “Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.

Ma ọ bụ “Haleluja!” “Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.

Gụọ A5.

O nwere ike ịbụ, “e fesara ọbara.”

Ma ọ bụ “Ọ ga-ejikwa mkpanaka ígwè chịa ha.”

Ma ọ bụ “na-efe n’elu.”

Ọ pụtara mbibi ebighị ebi. Gụọ Nkọwa Okwu.

Ma ọ bụ “olulu na-enweghị nsọtụ.”

Ma ọ bụ “n’olulu na-enweghị nsọtụ.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.” Gụọ Nkọwa Okwu.

Na Grik, “ndị e ji anyụike gbuo.”

Na Grik, “Ọnwụ nke abụọ enweghị ikike n’ebe ha nọ.”

Ya bụ, Kraịst.

Ọ pụtara mbibi ebighị ebi. Gụọ Nkọwa Okwu.

Ma ọ bụ “A ga-atụkwa ha mkpọrọ.” Gụọ ihe e dere n’ala ala peeji Mkpu. 14:11.

Ma ọ bụ “Hedis.” Gụọ Nkọwa Okwu.

Ma ọ bụ “Hedis.” Gụọ Nkọwa Okwu.

Ma ọ bụ “A na Z.” Alfa bụ mkpụrụ akwụkwọ mbụ na Grik, Omega abụrụ mkpụrụ akwụkwọ ikpeazụ.

Ma ọ bụ “na-egbu ọchụ.”

Gụọ Nkọwa Okwu, “Ịkwa iko.”

Ma ọ bụ “ka nkume pụrụ iche.”

Na Grik, “stediọm 12,000.” Otu stediọm bụ mita 185 (amaụkwụ 606.95). Stediọm a abụghị ámá egwuregwu. Gụọ B14.

Ihe dị ka mita 64 (amaụkwụ 210). Gụọ B14.

Ma ọ bụ “nkume ọ bụla pụrụ iche.”

Gụọ A5.

Ma ọ bụ “Mpanaka; Oriọna.”

Na Grik, “na-ejekwara ya ozi dị nsọ.”

Ma ọ bụ “oriọna.”

Gụọ A5.

Gụọ A5.

Ma ọ bụ “A na Z.” Alfa bụ mkpụrụ akwụkwọ mbụ na Grik, Omega abụrụ mkpụrụ akwụkwọ ikpeazụ.

Ya bụ, ndị na-eme ihe rụrụ arụ n’anya Chineke.

Gụọ Nkọwa Okwu, “Ịkwa iko.”

Ma ọ bụ “na-egbu ọchụ.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya