Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • nwt Jọn 1:1-21:25
  • Jọn

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jọn
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Jọn

OZI ỌMA JỌN DERE

1 Okwu ahụ+ nọ ná mmalite, Okwu ahụ na Chineke nọkwa,+ Okwu ahụ bụkwa chi.*+ 2 Ya na Chineke nọ ná mmalite. 3 Ihe niile si n’aka ya dịrị.+ E nweghịdị otu ihe dịnụ nke na-esighị n’aka ya.

Ihe e si n’aka ya 4 mee ka ọ dịrị bụ ndụ. Ndụ ahụ bụkwaara ụmụ mmadụ ìhè.+ 5 Ìhè ahụ na-enwu n’ọchịchịrị,+ ma ọchịchịrị ahụ akabeghị ya ike.

6 E nwere otu nwoke Chineke zitere ka ọ bụrụ onye nnọchiteanya ya. Aha ya bụ Jọn.+ 7 Nwoke a bịara ka ọ bụrụ onye àmà, ka o wee gbaa àmà banyere ìhè ahụ,+ ka ụdị mmadụ niile si n’aka ya kwere. 8 Ọ bụghị ya bụ ìhè ahụ.+ Kama ọ bịara ka ọ gbaa àmà banyere ìhè ahụ.

9 Oge eruwela ka ezigbo ìhè ahụ nke na-enye ụdị mmadụ ọ bụla ìhè bịa n’ụwa.+ 10 Ọ nọrọla n’ụwa,+ ụwa sikwa n’aka ya dịrị.+ Ma ụwa amaghị ya. 11 Ọ bịara n’obodo a mụrụ ya, ma ndị obodo ya anabataghị ya. 12 Ma, o nyere ndị niile nabatara ya ikike ịghọ ụmụ Chineke+ n’ihi na ha nwere okwukwe n’aha ya.+ 13 E sighị n’ọbara ma ọ bụ n’anụ ahụ́ ma ọ bụ n’ọchịchọ mmadụ mụọ ha, kama e si na Chineke mụọ ha.+

14 Okwu ahụ ghọrọ anụ ahụ́+ ma bie n’etiti anyị. Anyị hụkwara ebube ya, bụ́ ụdị ebube ọkpara a mụrụ naanị ya na-enweta+ n’aka nna ya. O jupụtakwara n’amara Chineke nakwa n’eziokwu. 15 (Jọn gbara àmà banyere ya. N’eziokwu, o tiri mkpu, sị: “Ọ bụ onye a ka m kwuru banyere ya, sị, ‘Onye na-abịa n’azụ m agafeela n’ihu m n’ihi na ọ dị adị tupu mụnwa.’”)+ 16 N’ihi na anyị niile si n’aka ya enweta amara mgbe niile maka na o jupụtara n’amara Chineke. 17 N’ihi na Chineke si n’aka Mosis nye Iwu,+ ma o si n’aka Jizọs Kraịst+ mee ka anyị nweta amara+ na eziokwu. 18 O nweghị mmadụ hụtụrụla Chineke mgbe ọ bụla.+ Ọ bụ chi a mụrụ naanị ya+ nke nọ n’akụkụ* Nna ya+ kọwara onye Nna ya bụ.+

19 Ihe a bụ àmà Jọn gbara mgbe ndị Juu si na Jeruselem zipụ ndị nchụàjà na ndị Livaị ka ha gaa jụọ ya, sị: “Ònye ka ị bụ?”+ 20 Ọ gọghị agọ, kama o kwuru hoo haa, sị: “Abụghị m Kraịst.” 21 Ha wee jụọ ya, sị: “Ònyekwanụ ka ị bụ? Ị̀ bụ Ịlaịja?”+ Ọ zara, sị: “Abụghị m ya.” “Ị̀ bụ Onye Amụma ahụ a na-atụ anya ya?”+ O wee sị: “Mba.” 22 Ha sịziri ya: “Ònye ka ị bụ? Gwa anyị ka anyị mara ihe anyị ga-aza ndị zitere anyị. Olee ihe ị na-ekwu banyere onwe gị?” 23 Ọ sịrị: “Abụ m olu onye na-eti mkpu n’ala ịkpa, sị, ‘Meenụ ka ụzọ Jehova* kwụrụ ọtọ,’+ dị ka Aịzaya onye amụma kwuru.”+ 24 Ọ bụ ndị Farisii zitere ndị ahụ. 25 Ha wee jụọ ya, sị: “Gịnịzi mere i ji na-eme ndị mmadụ baptizim ma ọ bụrụ na ị bụghị Kraịst ma ọ bụ Ịlaịja ma ọ bụ Onye Amụma ahụ a na-atụ anya ya?” 26 Jọn zara ha, sị: “Eji m mmiri na-eme baptizim. E nwere onye unu na ya nọ unu na-amaghị, 27 onye na-abịa n’azụ m. Erughị m eru ịtọpụ eriri akpụkpọ ụkwụ ya.”+ 28 Ihe ndị a mere na Betani n’ofe Osimiri Jọdan,* bụ́ ebe Jọn nọ na-eme baptizim.+

29 N’echi ya, ọ hụrụ Jizọs ka ọ na-abịakwute ya, o wee sị: “Lee Nwa Atụrụ+ Chineke onye na-ewepụ mmehie+ nke ụwa.+ 30 Ọ bụ onye a ka m kwuru banyere ya, sị: ‘Otu nwoke na-abịa n’azụ m, onye gaferela n’ihu m n’ihi na ọ dị adị tupu mụnwa.’+ 31 Amaghịdị m ya. Ma, ihe mere m ji bịa jiri mmiri na-eme baptizim bụ ka e mee ka Izrel mara ya.”+ 32 Jọn gbakwara àmà, sị: “Ahụrụ m mmụọ nsọ ka o si n’eluigwe na-efedata n’ụdị nduru, ọ dịgidekwara n’isi ya.+ 33 Amaghịdị m ya. Ma, Onye zitere m ka m jiri mmiri na-eme baptizim sịrị m: ‘Onye ọ bụla ị hụrụ ka mmụọ nsọ bịakwasịrị ma dịgide n’isi ya,+ ọ bụ ya bụ onye ji mmụọ nsọ eme baptizim.’+ 34 Ahụla m ya, agbaakwala m àmà na ọ bụ ya bụ Ọkpara Chineke.”+

35 N’echi ya, Jọn na mmadụ abụọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya guzo. 36 Mgbe ọ hụrụ ka Jizọs na-agafe, ọ sịrị: “Lee Nwa Atụrụ+ Chineke.” 37 Mgbe mmadụ abụọ ahụ na-eso ụzọ ya nụrụ ihe a o kwuru, ha sooro Jizọs. 38 Jizọs wee tụgharịa hụ ka ha na-eso ya, ya asị ha: “Gịnị ka unu na-achọ?” Ha sịrị ya: “Rabaị (nke pụtara “Onye Ozizi”), olee ebe i bi?” 39 Ọ sịrị ha: “Bịanụ, ka unu hụ ya.” Ha wee gaa hụ ebe o bi, ha na ya nọkwara n’ụbọchị ahụ. Ọ bụ n’ihe dị ka awa nke iri.* 40 Andru+ nwanne Saịmọn Pita bụ otu n’ime mmadụ abụọ ahụ nụrụ ihe Jọn kwuru wee soro Jizọs. 41 Ihe mbụ o mere bụ ịchọta nwanne ya, bụ́ Saịmọn, sị ya: “Anyị ahụla Mezaya+ ahụ” (nke pụtara “Kraịst”). 42 O wee duru ya gakwuru Jizọs. Mgbe Jizọs lere ya anya, ọ sịrị: “Ị bụ Saịmọn+ nwa Jọn. A ga-akpọ gị Sifas” (nke pụtara “Pita”).+

43 N’echi ya, Jizọs chọrọ ịgawa Galili. O wee hụ Filip+ ma sị ya: “Bụrụ onye na-eso ụzọ m.” 44 Filip bụ onye Betsaịda, onye obodo Andru na Pita. 45 Filip hụrụ Nataniel+ sị ya: “Anyị ahụla onye e dere banyere ya n’Iwu Mosis nakwa n’Akwụkwọ Ndị Amụma, ya bụ, Jizọs, nwa Josef,+ onye Nazaret.” 46 Ma Nataniel sịrị ya: “È nwere ihe ọma ga-esili na Nazaret pụta?” Filip wee sị ya: “Bịa hụrụ.” 47 Jizọs hụrụ ka Nataniel na-abịakwute ya, ya ekwuo banyere ya, sị: “Lee ezigbo onye Izrel, onye na-anaghị aghọ aghụghọ.”+ 48 Nataniel sịrị ya: “Olee otú i si mara m?” Jizọs zara ya, sị: “Tupu Filip akpọọ gị, mgbe ị nọ n’okpuru osisi fig, ahụrụ m gị.” 49 Nataniel wee sị: “Onye Ozizi,* ị bụ Ọkpara Chineke. Ị bụ Eze Izrel.”+ 50 Jizọs sịrị ya: “Ọ̀ bụ maka na m gwara gị na m hụrụ gị n’okpuru osisi fig mere i ji kwere? Ị ga-ahụ ihe karịrị ihe ndị a.” 51 Jizọs gwaziri ya, sị: “N’eziokwu, ana m asị unu na unu ga-ahụ ka eluigwe meghere, ndị mmụọ ozi Chineke ana-arịgo ma na-arịdakwute Nwa nke mmadụ.”+

2 N’ụbọchị nke atọ, e nwere oriri alụmdi na nwunye na Kena nke dị na Galili, nne Jizọs nọkwa n’ebe ahụ. 2 A kpọkwara Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya ka ha bịa oriri alụmdi na nwunye ahụ.

3 Mgbe mmanya gwụwara, nne Jizọs sịrị ya: “Ha enweghị mmanya.” 4 Ma Jizọs sịrị ya: “Nwaanyị, olee otú o si gbasa mụ na gị?* Oge m erubeghị.” 5 Nne ya wee sị ndị na-eje ozi: “Meenụ ihe ọ bụla ọ gwara unu.” 6 E nwere ite nkume isii e ji agbanye mmiri a dọsara n’ebe ahụ n’ihi iwu ndị Juu tiri banyere ịdị ọcha.+ Nke ọ bụla n’ime ha ga-abali ihe dị ka lita mmiri iri anọ na anọ ma ọ bụ lita iri isii na isii.* 7 Jizọs sịrị ha: “Gbajuonụ ite ndị ahụ mmiri.” Ha wee gbajuo ha n’ọnụ. 8 Ọ sịziri ha: “Kurunụ ya bugara onye na-ahazi oriri a.” Ha wee kuru ya bugara ya. 9 Mgbe onye na-ahazi oriri ahụ detụrụ mmiri ahụ e mere ka ọ ghọọ mmanya ọnụ, ebe ọ na-amaghị ebe o si (ọ bụ eziokwu na ndị na-eje ozi bụ́ ndị kupụtara mmiri ahụ ma), ọ kpọrọ nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ, 10 sị ya: “Ndị ọzọ na-ebu ụzọ ebupụta mmanya dị mma. Mgbe mmanya gbuwere ndị mmadụ, e bupụtazie nke na-adịchaghị mma. Ma, ị hapụrụ mmanya dị mma ruo ugbu a.” 11 Jizọs mere ihe a na Kena nke dị na Galili. Ọ bụ ya bụ ọrụ ebube mbụ ọ rụrụ.* O si otú a mee ka ebube ya pụta ìhè.+ Ndị na-eso ụzọ ya wee nwee okwukwe n’ebe ọ nọ.

12 Mgbe e mechara, ya na nne ya na ụmụnne ya ndị nwoke+ na ndị na-eso ụzọ ya gbadara Kapaniọm.+ Ma ha anọghị ọtụtụ ụbọchị n’ebe ahụ.

13 Ememme Ngabiga+ ndị Juu ruwere nso, Jizọs wee gbagoo Jeruselem. 14 Ọ hụrụ ndị nọ n’ụlọ nsọ na-ere ehi na atụrụ na nduru,+ nakwa ndị na-agbanwe ego ka ha nọ n’oche ha. 15 O ji ụdọ mere ụtarị wee jiri ya chụpụ ndị niile chị atụrụ na ehi bịa n’ụlọ nsọ. Ọ wụfukwara mkpụrụ ego ndị na-agbanwe ego ma kpuo tebụl ha ihu.+ 16 Ọ sịrị ndị ahụ na-ere nduru: “Wepụsịanụ ihe ndị a ebe a! Kwụsịnụ ime ka ụlọ Nna m bụrụ ụlọ ahịa!”+ 17 Ndị na-eso ụzọ ya wee cheta na e dere, sị: “Ihe gbasara ụlọ gị ga na-anụ m ọkụ n’obi.”+

18 N’ihi ya, ndị Juu sịrị ya: “Olee ihe àmà ị ga-emere anyị+ iji gosi na i nwere ikike ime ihe ndị a ị na-eme?” 19 Jizọs zara ha, sị: “Kụtuonụ ụlọ nsọ a. M ga-arụ ya n’ụbọchị atọ.”+ 20 Ndị Juu ahụ wee sị ya: “E ji afọ iri anọ na isii rụọ ụlọ nsọ a. Ị̀ ga-arụ ya n’ụbọchị atọ?” 21 Ma ụlọ nsọ ọ na-ekwu bụ ahụ́ ya.+ 22 Mgbe a kpọlitere ya n’ọnwụ, ndị na-eso ụzọ ya chetara na ọ na-ekwu ihe a.+ Ha wee kwere ihe e kwuru n’Akwụkwọ Nsọ nakwa ihe Jizọs kwuru.

23 Ma, mgbe ọ nọ na Jeruselem n’oge Ememme Ngabiga, ọtụtụ ndị nwere okwukwe n’aha ya mgbe ha hụrụ ihe àmà ndị ọ na-eme. 24 Ma Jizọs atụkwasịchaghị ha obi n’ihi na ọ ghọtara ha niile, 25 ọ dịghịkwa ya mkpa ka onye ọ bụla kọwaara ya ihe ọ bụla banyere mmadụ, n’ihi na ọ ma ihe dị mmadụ n’obi.+

3 E nwere otu nwoke onye Farisii aha ya bụ Nikọdimọs.+ Ọ bụ otu n’ime ndị isi ndị Juu. 2 Ọ bịakwutere Jizọs n’abalị,+ sị ya: “Rabaị,*+ anyị ma na ị bụ onye ozizi Chineke zitere n’ihi na e nweghị onye ga-arụli ọrụ ebube ndị a+ ị na-arụ* ma ọ bụrụ na Chineke anọnyereghị ya.”+ 3 Jizọs gwara ya, sị: “N’eziokwu, ana m asị gị na ọ bụrụ na a mụghị mmadụ ọzọ,*+ ọ gaghị ahụ Alaeze Chineke.”+ 4 Nikọdimọs sịrị ya: “Olee otú a ga-esi mụọ mmadụ mgbe o torola eto? Ọ̀ ga-abanyeli n’afọ nne ya nke ugboro abụọ ka a mụọ ya ọzọ?” 5 Jizọs zara ya, sị: “N’eziokwu, ana m asị gị na ọ bụrụ na e sighị na mmiri+ na mmụọ nsọ+ mụọ mmadụ, ọ gaghị abanye n’Alaeze Chineke. 6 Ihe e si n’anụ ahụ́ mụọ bụ anụ ahụ́, ihe e sikwa ná mmụọ nsọ mụọ bụ mmụọ. 7 Ya ejula gị anya na m sịrị gị: A ga-amụrịrị unu ọzọ. 8 Ifufe na-efega n’ebe ọ chọrọ, ị na-anụkwa ụda ya. Ma ị naghị ama ebe o si abịa na ebe ọ na-aga. Otú a ka ọ dị onye ọ bụla e si ná mmụọ nsọ mụọ.”+

9 Nikọdimọs wee sị ya: “Olee otú ihe ndị a ga-esi eme?” 10 Jizọs zara ya, sị: “Ị bụ onye nkụzi n’Izrel. Gịnị mere na ị maghị ihe ndị a? 11 N’eziokwu, ana m asị gị na ihe anyị ma ka anyị na-ekwu, ihe anyị hụkwara ka anyị na-agba àmà ya. Ma unu anaghị anabata àmà anyị na-agba. 12 Ọ bụrụ na m gwara unu ihe banyere ụwa ma unu ekwetaghị, olee otú unu ga-esi kweta ma m gwa unu ihe banyere eluigwe? 13 E nweghị onye garala eluigwe+ ma e wepụ onye si n’eluigwe gbadata,+ ya bụ, Nwa nke mmadụ. 14 Otú ahụ Mosis weliri agwọ elu n’ala ịkpa+ ka a ga-eweli Nwa nke mmadụ elu,+ 15 ka onye ọ bụla nke kweere na ya wee nwee ndụ ebighị ebi.+

16 “N’ihi na Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya,+ ka a ghara ibibi onye ọ bụla nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.+ 17 N’ihi na Chineke eziteghị Ọkpara ya n’ụwa ka o kpee ụwa ikpe, kama ka e si n’aka ya zọpụta ụwa.+ 18 A gaghị ekpe onye ọ bụla nwere okwukwe na ya ikpe.+ E kpeela onye ọ bụla na-enweghị okwukwe ikpe maka na o nweghị okwukwe n’aha Ọkpara Chineke mụrụ naanị ya.+ 19 Ihe a ga-eji kpee ụmụ mmadụ ikpe bụ na ìhè ahụ abịala n’ụwa,+ ma ha hụrụ ọchịchịrị n’anya kama ịhụ ìhè ahụ n’anya n’ihi na ọrụ ha dị njọ. 20 N’ihi na onye ọ bụla na-eme ihe ọjọọ kpọrọ ìhè ahụ asị, ọ naghịkwa abịakwute ìhè ahụ ka a ghara ịkatọ ọrụ ya.* 21 Ma onye ọ bụla nke na-eme ezi ihe na-abịakwute ìhè ahụ,+ ka e mee ka ọrụ ọ rụrụ otú Chineke chọrọ pụta ìhè.”

22 Mgbe e mechara, Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya banyere n’ime ime obodo ndị dị na Judia. Ya na ha nọtụrụ n’ebe ndị ahụ. O mekwara ndị mmadụ baptizim.*+ 23 Ma Jọn nọkwa na-eme ndị mmadụ baptizim n’Inọn nke dị nso na Selim, n’ihi na e nwere mmiri buru ibu n’ebe ahụ.+ Ndị mmadụ na-abịakwa, a na-eme ha baptizim+ 24 n’ihi na a tụbeghị Jọn mkpọrọ.+

25 Ndị na-eso ụzọ Jọn na otu onye Juu rụrịtara ụka banyere iwu ime ka ihe dị ọcha. 26 N’ihi ya, ha bịakwutere Jọn, sị ya: “Onye Ozizi,* nwoke ahụ gị na ya nọ n’ofe Osimiri Jọdan, onye ị gbara àmà banyere ya,+ na-eme ndị mmadụ baptizim, mmadụ niile na-agakwurukwa ya.” 27 Jọn wee sị: “Mmadụ agaghị enwetali otu mkpụrụ ihe ma ọ bụrụ na e sighị n’eluigwe nye ya onye ahụ. 28 Unu onwe unu ga-agbara m akaebe na m kwuru, sị, ‘Abụghị m Kraịst,+ kama e zitere m ka m buru ya ụzọ bịa.’+ 29 Onye nwe nwaanyị a na-alụ ọhụrụ bụ nwoke na-alụ ya.+ Ma, mgbe enyi nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ guzo ma nụ olu nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ, ọ na-enwe ezigbo ọṅụ. N’ihi ya, e meela ka ọṅụ m zuo ezuo. 30 Onye ahụ ga na-amụba amụba, ma m ga na-ebelata ebelata.”

31 Onye ahụ nke si n’elu bịa+ ka ndị ọzọ niile. Onye ahụ nke si n’ụwa si n’ụwa, ọ na-ekwukwa banyere ihe nke ụwa. Onye ahụ nke si n’eluigwe bịa ka ndị ọzọ niile.+ 32 Ọ na-agba àmà ihe ọ hụrụ na ihe ọ nụrụ,+ ma e nweghị onye na-anabata àmà ya.+ 33 Onye ọ bụla nke nabatara àmà ya ekwerela* na Chineke bụ onye eziokwu.+ 34 N’ihi na onye ahụ Chineke zitere na-ekwu ihe Chineke kwuru,+ n’ihi na Chineke na-enye mmụọ nsọ n’ụba.* 35 Nna m hụrụ Ọkpara ya n’anya,+ o nyefeekwala ihe niile n’aka ya.+ 36 Onye nwere okwukwe n’Ọkpara ahụ nwere ndụ ebighị ebi.+ Onye na-enupụrụ Ọkpara ahụ isi agaghị ahụ ndụ,+ kama iwe Chineke na-adịgide n’ahụ́ ya.+

4 Mgbe Onyenwe anyị matara na ndị Farisii anụla na ọ* na-enweta ndị na-eso ụzọ ma na-eme ha baptizim+ karịa Jọn, 2 (ọ bụ eziokwu na Jizọs ejighị aka ya mee onye ọ bụla baptizim, kama ọ bụ ndị na-eso ụzọ ya mere ha baptizim) 3 ọ hapụrụ Judia gawa Galili ọzọ. 4 Ma, ọ bụ Sameria ka ọ ga-esi gafere. 5 O wee rute n’otu obodo Sameria a na-akpọ Saịka, nke dị nso n’ala Jekọb nyere Josef nwa ya.+ 6 N’eziokwu, olulu mmiri Jekọb dị n’ebe ahụ.+ Ma ebe ọ bụ na ike gwụrụ Jizọs n’ihi ije ọ gara, ọ nọdụrụ ala n’akụkụ olulu mmiri ahụ. Ọ bụ n’ihe dị ka awa nke isii.*

7 Otu nwaanyị Sameria bịara isere mmiri. Jizọs wee sị ya: “Nye m mmiri ka m ṅụọ.” 8 (N’ihi na ndị na-eso ụzọ ya gawara n’obodo ịzụta nri.) 9 Nwaanyị Sameria ahụ sịrị ya: “Gịnị mere i ji na-arịọ m ka m nye gị mmiri ka ị ṅụọ ebe ị bụ onye Juu, mụnwa abụrụ nwaanyị Sameria?” (N’ihi na ndị Juu na ndị Sameria anaghị emekọ ihe.)+ 10 Jizọs zara ya, sị: “A sị na ị ma onyinye Chineke na-enye n’efu+ na onye na-asị gị, ‘Nye m mmiri ka m ṅụọ,’ ị gaara arịọ ya mmiri, ọ gakwaara enye gị mmiri na-enye ndụ.”+ 11 O wee sị ya: “Nna anyị ukwu, i nwedịghị ihe e ji esere mmiri, olulu mmiri a mikwara emi. Oleezi ebe i si enweta mmiri a na-enye ndụ? 12 Ị kaghị nna nna anyị Jekọb, onye nyere anyị olulu mmiri a, onye ya na ụmụ ya na anụ ụlọ ya ṅụkwara mmiri si na ya, ka ị̀ ka ya?” 13 Jizọs zara ya, sị: “Onye ọ bụla ṅụrụ mmiri a, mmiri ga-agụ ya ọzọ. 14 Onye ọ bụla ṅụrụ mmiri m ga-enye ya, mmiri agakwaghị agụ ya ọzọ,+ kama mmiri m ga-enye ya ga-aghọ n’ime ya isi iyi nke na-asọpụta mmiri na-enye ndụ ebighị ebi.”+ 15 Nwaanyị ahụ wee sị ya: “Nna anyị ukwu, nye m mmiri a, ka mmiri ghara ịgụ m ọzọ, ka m gharakwa ịna-abịa ebe a esere mmiri.”

16 Ọ sịrị nwaanyị ahụ: “Gaa kpọọ di gị, gị na ya soro bịa ebe a.” 17 Nwaanyị ahụ sịrị ya: “Enweghị m di.” Jizọs wee sị ya: “I kwuru eziokwu na i nweghị di. 18 N’ihi na ị lụọla di ise. Nwoke gị na ya bi ugbu a abụghị di gị. Ihe i kwuru bụ eziokwu.” 19 Nwaanyị ahụ sịrị ya: “Nna anyị ukwu, ọ ga-abụrịrị na ị bụ onye amụma.+ 20 Nna nna anyị hà fere Chineke n’ugwu a. Ma, unu na-ekwu na ọ bụ na Jeruselem ka ndị mmadụ ga-anọrịrị fee Chineke.”+ 21 Jizọs wee sị ya: “Nwaanyị, kwere ihe m na-ekwu. Oge na-abịa mgbe unu na-agaghị anọ n’ugwu a ma ọ bụ na Jeruselem fee Nna m ofufe. 22 Unu na-efe ihe unu na-amaghị.+ Anyị na-efe ihe anyị ma n’ihi na nzọpụta bidoro n’ebe ndị Juu nọ.+ 23 Ma oge na-abịa, ọ bụkwa ugbu a, mgbe ndị na-efe Nna m otú ọ chọrọ ga-efe ya n’ime mmụọ na n’eziokwu, n’ihi na n’eziokwu, Nna m na-achọ ụdị ndị ahụ ka ha fee ya ofufe.+ 24 Chineke bụ Mmụọ.+ Ndị na-efe ya ofufe ga-efe ya n’ime mmụọ na n’eziokwu.”+ 25 Nwaanyị ahụ wee sị ya: “Ama m na Mezaya, onye a na-akpọ Kraịst, na-abịa. Mgbe ọ bụla ọ bịara, ọ ga-akọwara anyị ihe niile.” 26 Jizọs sịrị ya: “Ọ bụ mụnwa na-agwa gị okwu bụ ya.”+

27 N’oge ahụ, ndị na-eso ụzọ ya lọghachiri. O wee ju ha anya na ya na nwaanyị na-ekwurịta okwu. Ma e nweghị onye jụrụ ya: “Olee ihe ị chọrọ?” ma ọ bụ “Gịnị mere gị na nwaanyị a ji ekwurịta okwu?” 28 Nwaanyị ahụ hapụrụ ite mmiri ya banye n’obodo ma gwa ndị mmadụ, sị: 29 “Bịanụ hụ nwoke gwara m ihe niile m mere. Ọ̀ ga-abụ ya bụ Kraịst?” 30 Ha wee si n’obodo pụta, bịakwutewe Jizọs.

31 Ka ihe a na-eme, ndị na-eso ụzọ ya nọ na-arịọ ya, sị: “Onye Ozizi,*+ rienụ ihe.” 32 Ma ọ sịrị ha: “M nwere nri m ga-eri nke unu na-amaghị.” 33 Ndị na-eso ụzọ ya wee sị ibe ha: “Ò nwere onye wetaara ya ihe ọ bụla ka o rie?” 34 Jizọs sịrị ha: “Ihe oriri m bụ ka m mee uche onye zitere m,+ ka m rụchaakwa ọrụ ya.+ 35 Ọ̀ bụ na unu asịghị na a ka nwere ọnwa anọ tupu oge iwe ihe ubi eruo? Ana m asị unu: Welienụ anya unu lee ubi, na ihe a kụrụ na ha achaala maka owuwe ihe ubi.+ 36 Onye na-ewe ihe ubi enwetawala ụgwọ ọrụ ma na-ekpokọta mkpụrụ maka ndụ ebighị ebi, ka onye na-agha mkpụrụ na onye na-ewe ihe ubi wee ṅụrịkọọ ọṅụ.+ 37 N’ihe a, okwu ahụ a na-ekwu bụ eziokwu, ya bụ, Otu onye na-agha mkpụrụ, onye ọzọ na-ewe ihe ubi. 38 Ezipụrụ m unu ka unu wee ihe ubi unu na-arụghị ọrụ ya. Ndị ọzọ arụọla ọrụ, ma unu abatala riwe uru ọrụ ha rụrụ.”

39 Ọtụtụ n’ime ndị Sameria ndị si n’obodo ahụ pụta nwere okwukwe na Jizọs n’ihi àmà nwaanyị ahụ gbara, sị: “Ọ gwara m ihe niile m mere.”+ 40 Mgbe ndị Sameria ahụ bịakwutere Jizọs, ha rịọrọ ya ka ọ nọrọ n’obodo ha. O wee nọọ ebe ahụ ụbọchị abụọ. 41 N’ihi ya, ọtụtụ ndị ọzọ kweere n’ihi ihe ọ kụziiri ha. 42 Ha wee gwa nwaanyị ahụ, sị: “Ọ bụghịzi naanị ihe i kwuru mere anyị ji kwere, n’ihi na anyị ejirila ntị anyị nụ, anyị amarakwala na nwoke a bụ onye ga-azọpụta ụwa n’eziokwu.”+

43 Mgbe ụbọchị abụọ ahụ gachara, ọ hapụrụ ebe ahụ gawa Galili. 44 Ma, Jizọs kwuru na a naghị asọpụrụ onye amụma n’obodo ya.+ 45 Mgbe ọ bịarutere na Galili, ndị Galili nabatara ya n’ihi na ha hụrụ ihe niile o mere na Jeruselem n’oge ememme+ maka na ha gakwara ememme ahụ.+

46 O wee bịaghachi na Kena nke dị na Galili, bụ́ ebe o mere ka mmiri ghọọ mmanya.+ Na Kapaniọm, e nwere otu onye na-ejere eze ozi nke nwa ya nwoke na-arịa ọrịa. 47 Mgbe nwoke a nụrụ na Jizọs ahapụla Judia bata na Galili, ọ gakwuuru ya wee rịọ ya ka ọ bịa gwọọ nwa ya nwoke maka na ọ nọ n’ọnụ ọnwụ. 48 Ma Jizọs sịrị ya: “Ọ bụrụ na unu ahụghị ọrụ ebube* na ihe ịtụnanya, unu emekataghị kweta.”+ 49 Onye ahụ na-ejere eze ozi sịrị ya: “Onyenwe anyị, bịa tupu obere nwa m anwụọ.” 50 Jizọs sịrị ya: “Lawa, nwa gị agbakeela.”+ Nwoke ahụ kwetara ihe Jizọs gwara ya wee lawa. 51 Ma ka ọ nọ n’ụzọ na-ala, ndị ohu ya zutere ya ka ha gwa ya na nwa ya nwoke agbakeela. 52 O wee jụọ ha awa ahụ́ dịrị ya mma. Ha sịrị ya: “Ahụ́ ọkụ ahụ kwụsịrị ụnyaahụ, n’awa nke asaa.”* 53 Nna nwa ahụ mataziri na ọ gbakere n’awa ahụ Jizọs sịrị ya: “Nwa gị agbakeela.”+ Ya na ezinụlọ ya niile wee kwere. 54 Ihe a bụ ọrụ ebube nke abụọ+ Jizọs rụrụ mgbe o si Judia bata na Galili.

5 Mgbe e mechara, oge ememme+ ndị Juu ruru, Jizọs wee gbagoo Jeruselem. 2 Na Jeruselem, n’Ọnụ Ụzọ Ámá Atụrụ,+ e nwere ọdọ mmiri a na-akpọ Betzeta n’asụsụ Hibru. Ọdọ mmiri a nwere ogidi ise na varanda ya. 3 Ọtụtụ ndị ọrịa dina n’ebe ahụ, ma ndị ìsì, ma ndị ngwọrọ, ma ndị aka ha ma ọ bụ ụkwụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ. 4* —— 5 Ma otu nwoke nọ n’ebe ahụ. Ọ rịala ọrịa afọ iri atọ na asatọ. 6 Jizọs hụrụ nwoke a ka o dina n’ebe ahụ, marakwa na ọ rịala ọrịa ogologo oge. O wee sị ya: “Ị̀ chọrọ ka ahụ́ dị gị mma?”+ 7 Nwoke ahụ na-arịa ọrịa zara ya, sị: “Nna anyị ukwu, enweghị m onye ga-ekuba m n’ọdọ mmiri a ma o mee ụṅara. Kama ọ na-abụ m gawa, onye ọzọ eburu m ụzọ banye.” 8 Jizọs sịrị ya: “Bilie. Buru ute* gị gawa ije.”+ 9 Ahụ́ wee dị nwoke ahụ mma ozugbo, ya eburu ute* ya malite ịga ije.

Ụbọchị ahụ bụ Ụbọchị Izu Ike. 10 Ndị Juu malitere ịgwa nwoke ahụ a gwọrọ ọrịa, sị: “Taa bụ Ụbọchị Izu Ike, i kwesịghị iburu ute.”*+ 11 Ma ọ gwara ha, sị: “Ọ bụ onye mere ka ahụ́ dị m mma sịrị m, ‘Buru ute* gị gawa ije.’” 12 Ha jụrụ ya, sị: “Ọ̀ bụ onye sịrị gị, ‘Buru ya gawa ije’?” 13 Ma nwoke ahụ a gwọrọ ọrịa amaghị onye ọ bụ n’ihi na Jizọs esila n’ebe ahụ pụọ banye n’ebe ìgwè mmadụ ndị nọ n’ebe ahụ nọ.

14 Mgbe e mechara, Jizọs hụrụ nwoke ahụ n’ụlọ nsọ wee sị ya: “Lee, ahụ́ adịla gị mma. Emehiekwala ọzọ, ka ihe ka njọ ghara ime gị.” 15 Nwoke ahụ gara kọọrọ ndị Juu na ọ bụ Jizọs mere ka ahụ́ dị ya mma. 16 N’ihi ya, ndị Juu megidewere Jizọs maka na ọ na-eme ihe ndị a n’Ụbọchị Izu Ike. 17 Ma ọ gwara ha, sị: “Nna m ka na-arụ ọrụ ruo ugbu a, mụnwa ka na-arụkwa ọrụ.”+ 18 Ọ bụ ya mere ndị Juu ji chọsiwe ike igbu ya, ọ bụghị naanị maka na ọ na-ada iwu Ụbọchị Izu Ike, kama ọ na-akpọkwa Chineke Nna ya,+ na-eme ka ya na Chineke hara.+

19 N’ihi ya, Jizọs gwara ha, sị: “N’eziokwu, ana m asị unu na Ọkpara ahụ enweghị ike ime otu mkpụrụ ihe bụ́ uche ya, kama ọ bụ naanị ihe ọ hụrụ Nna ya na-eme ka ọ na-eme.+ N’ihi na ihe ọ bụla Nna ahụ na-eme, ọ bụ ya ka Ọkpara ya na-emekwa. 20 N’ihi na Nna m hụrụ Ọkpara ya n’anya,+ na-egosikwa ya ihe niile ọ na-eme. Ọ ga-egosikwa ya ọrụ ndị karịrị ọrụ ndị a, ka o wee ju unu anya.+ 21 N’ihi na otú ahụ Nna m na-akpọlite ndị nwụrụ anwụ ma na-eme ka ha dị ndụ,+ ka Ọkpara ya na-emekwa ka ndị ọ bụla ọ chọrọ dị ndụ.+ 22 N’ihi na Nna m anaghị ekpe onye ọ bụla ikpe, kama o nyefeela ikpe niile n’aka Ọkpara ya,+ 23 ka mmadụ niile wee na-asọpụrụ Ọkpara ya otú ha si asọpụrụ Nna ya. Onye ọ bụla na-anaghị asọpụrụ Ọkpara ahụ anaghị asọpụrụ Nna ya nke zitere ya.+ 24 N’eziokwu, ana m asị unu na onye ọ bụla na-anụ okwu m ma kwere n’Onye ahụ zitere m ga-enweta ndụ ebighị ebi,+ a gaghịkwa ekpe ya ikpe, kama o sila n’ọnwụ fere ná ndụ.+

25 “N’eziokwu, ana m asị unu na oge na-abịa, ọ bụkwa ugbu a, mgbe ndị nwụrụ anwụ ga-anụ olu Ọkpara Chineke, ndị ṅara ntị ga-adịkwa ndụ. 26 N’ihi na otú ahụ Nna m nwere ndụ n’ime onwe ya,*+ ka o mekwara ka Ọkpara ya nwee ndụ n’ime onwe ya.+ 27 O nyekwala ya ikike ikpe ikpe+ n’ihi na ọ bụ Nwa nke mmadụ.+ 28 Ka ihe a ghara iju unu anya, n’ihi na oge na-abịa mgbe ndị niile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu ya+ 29 wee pụta. Ndị mere ezi ihe ga-esi n’ọnwụ bilie ka ha dị ndụ,* ma ndị mere ihe ọjọọ ga-esi n’ọnwụ bilie ka e kpee ha ikpe.*+ 30 Enweghị m ike ime otu mkpụrụ ihe bụ́ uche m. Ọ bụ otú Nna m gwara m* ka m si ekpe ikpe. M na-ekpekwa ikpe ziri ezi+ n’ihi na ihe m na-achọ ime abụghị uche m, kama ọ bụ uche onye zitere m.+

31 “Ọ bụrụ na naanị m agbaa àmà banyere onwe m, àmà m abụghị eziokwu.+ 32 E nwere onye ọzọ na-agba àmà banyere m, amakwa m na àmà ọ na-agba banyere m bụ eziokwu.+ 33 Unu zipụrụ ndị mmadụ ka ha gakwuru Jọn, ọ gbakwaara eziokwu àmà.+ 34 Ma, anaghị m anabata àmà si n’aka mmadụ, kama m na-ekwu ihe ndị a ka e wee zọpụta unu. 35 Onye ahụ bụ ọkụ* na-enwu enwu, nke na-enyekwa ìhè. Ọ masịkwara unu ịṅụrị ezigbo ọṅụ n’ihi ìhè ya, ma mmasị ahụ unu nwere adịteghị aka.+ 36 Ma, e nwere ihe na-agbara m àmà nke ka àmà Jọn gbara, n’ihi na ọ bụ ọrụ ndị Nna m kenyere m, ndị m na-arụ, na-agba àmà na ọ bụ Nna m zitere m.+ 37 Nna m bụ́ onye zitere m agbaakwala àmà banyere m.+ Unu anụbeghị olu ya mgbe ọ bụla ma ọ bụkwanụ hụ otú ọ dị.+ 38 Okwu ya adịghịkwa n’ime unu n’ihi na unu ekweghị n’onye ahụ o zitere.

39 “Unu na-enyocha Akwụkwọ Nsọ+ n’ihi na unu chere na ọ ga-eme ka unu nwee ndụ ebighị ebi. Ọ bụkwa ya* na-agba àmà banyere m.+ 40 Ma unu achọghị ịbịakwute m+ ka unu nwee ndụ. 41 Anaghị m anara otuto n’aka mmadụ, 42 kama ama m nke ọma na unu ahụghị Chineke n’anya. 43 Abịala m n’aha Nna m, ma unu anabataghị m. Ọ bụrụ na onye ọzọ abịa n’aha onwe ya, unu ga-anabata ya. 44 Olee otú unu ga-esi kwere ebe ọ bụ na unu na-anara otuto n’aka ibe unu, ma unu anaghị achọ otuto si n’aka onye ahụ naanị ya bụ Chineke?+ 45 Unu echela na m ga-ama unu ikpe* n’ihu Nna m. E nwere onye na-ama unu ikpe.* Ọ bụ Mosis,+ onye unu nwere olileanya n’ebe ọ nọ. 46 N’eziokwu, ọ bụrụ na unu kweere na Mosis, unu gaara ekwere na m n’ihi na o dere banyere m.+ 47 Ma, ọ bụrụ na unu ekwetaghị ihe o dere, olee otú unu ga-esi kwere ihe m na-ekwu?”

6 Mgbe e mechara, Jizọs gara n’ofe nke ọzọ nke Oké Osimiri Galili,* ma ọ bụ Taịbirias.+ 2 Ìgwè mmadụ nọkwa na-eso ya+ n’ihi na ha na-ahụ ọrụ ebube ndị ọ na-arụ* mgbe ọ na-agwọ ndị ọrịa.+ 3 Jizọs wee rịgoro n’elu ugwu ma nọrọ ala n’ebe ahụ, ya na ndị na-eso ụzọ ya. 4 Ememme Ngabiga,+ bụ́ ememme ndị Juu na-eme, na-erukwa nso. 5 Mgbe Jizọs leliri anya hụ na ìgwè mmadụ na-abịakwute ya, ọ jụrụ Filip, sị: “Ebee ka anyị ga-azụta achịcha ndị a ga-ata?”+ 6 Ma, o kwuru ihe a ka ọ mara ihe dị Filip n’obi n’ihi na ọ* ma ihe ọ* na-aga ime. 7 Filip zara ya, sị: “E jirigodị narị mkpụrụ ego dinarịọs abụọ (200) zụta achịcha, ọ gaghị ezu onye ọ bụla n’ime ha inweta ntakịrị.” 8 Otu n’ime ndị na-eso ụzọ ya, bụ́ Andru nwanne Saịmọn Pita, sịrị ya: 9 “Lee nwata nwoke bu ogbe achịcha ọka bali ise na obere azụ̀ abụọ. Ma olee otú ha ga-esi zuoro ọtụtụ mmadụ a?”+

10 Jizọs wee sị: “Gwanụ ha ka ha nọdụ ala.” Ebe ọ bụ na ahịhịa juru eju n’ebe ahụ, ha nọdụrụ ala. Ụmụ nwoke nọ n’ebe ahụ dị ihe dị ka puku ise (5,000).+ 11 Jizọs weere achịcha ahụ. Mgbe o kelechara Chineke, o kesaara ha ndị ahụ nọ ọdụ n’ala. Otú ahụ ka o kesakwaara ha obere azụ̀ ahụ. Ha wee rijuo afọ. 12 Mgbe ha rijuchara afọ, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Tụtụkọtanụ ihe ha rifọrọ, ka ihe ọ bụla ghara ịla n’iyi.” 13 Ha wee tụtụkọta iberibe achịcha ndị ahụ tara achịcha ọka bali ise ahụ tafọrọ, ya eju nkata iri na abụọ.

14 Mgbe ndị mmadụ hụrụ ọrụ ebube ndị ọ rụrụ,* ha malitere ịsị: “N’eziokwu, onye a bụ Onye Amụma ahụ ga-abịa n’ụwa.”+ 15 Ma, ebe Jizọs ma na ha na-achọ ịbịa jide ya ka ha mee ya eze, ọ gaghachiri+ n’ugwu naanị ya.+

16 Mgbe o ruru mgbede, ndị na-eso ụzọ ya gbadara gaa n’oké osimiri.+ 17 Ha banyere n’ụgbọ mmiri, kwọrọ ya gawa ka ha gafee oké osimiri ahụ ruo Kapaniọm. N’oge ahụ, ọchịchịrị agbaala, ma Jizọs abịakwutebeghị ha.+ 18 Oké osimiri ahụ malitere inugharị n’ihi na nnukwu ifufe na-efe.+ 19 Ma mgbe ha kwọọrọ ụgbọ ha ruo ihe dị ka kilomita ise ma ọ bụ isii,* ha hụrụ Jizọs ka ọ na-eje ije n’elu oké osimiri ma na-abịaru ụgbọ mmiri ahụ nso, egwu wee tụwa ha. 20 Ma ọ sịrị ha: “Ọ bụ m. Unu atụla egwu.”+ 21 Ha jizi obi ụtọ nabata ya n’ụgbọ mmiri ahụ. N’oge na-adịghị anya, ụgbọ mmiri ahụ ruru n’ebe ha na-aga.+

22 N’echi ya, ìgwè mmadụ ndị nọ n’ofe nke ọzọ nke osimiri ahụ hụrụ na e nweghị ụgbọ mmiri dị n’ebe ahụ. E nwere otu obere ụgbọ mmiri dịbu n’ebe ahụ, ma Jizọs esoghị ndị na-eso ụzọ ya banye n’ụgbọ mmiri ahụ, n’ihi na ndị na-eso ụzọ ya pụwara naanị ha. 23 Ma, ụgbọ mmiri ndị si Taịbirias rutere n’ebe dị nso n’ebe ahụ ha tara achịcha mgbe Onyenwe anyị kelechara Chineke. 24 N’ihi ya, mgbe ìgwè mmadụ ahụ hụrụ na Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya anọghị n’ebe ahụ, ha banyere ụgbọ mmiri ha bịawa Kapaniọm ịchọ Jizọs.

25 Mgbe ha hụrụ ya n’ofe nke ọzọ nke osimiri ahụ, ha sịrị ya: “Onye Ozizi,*+ olee mgbe i ji rute ebe a?” 26 Jizọs zara ha, sị: “N’eziokwu, ana m asị unu na ihe mere unu ji achọgharị m abụghị maka na unu hụrụ ọrụ ebube ndị m rụrụ,* kama ọ bụ maka na unu tara achịcha, afọ eju unu.+ 27 Unu arụla ọrụ maka nri nke na-ala n’iyi, kama rụọnụ ọrụ maka nri nke ga-adịru ebighị ebi,+ nke Nwa nke mmadụ ga-enye unu, n’ihi na ọ bụ onye a ka Nna m, bụ́ Chineke, kara akara nke na-egosi na ihe ya masịrị ya.”+

28 N’ihi ya, ha sịrị ya: “Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị wee na-arụ ọrụ dị Chineke mma?” 29 Jizọs zara ha, sị: “Ọrụ dị Chineke mma unu ga-arụ bụ inwe okwukwe n’onye o zitere.”+ 30 Ha sịziri ya: “Olee ọrụ ebube ị ga-arụ,*+ ka anyị hụ ya ma kwere na gị? Olee ọrụ ị ga-arụ? 31 Nna nna anyị hà riri mana n’ala ịkpa+ otú ahụ e dere ya, sị, ‘O nyere ha achịcha si n’eluigwe ka ha rie.’”+ 32 Jizọs gwaziri ha, sị: “N’eziokwu, ana m asị unu na Mosis enyeghị unu achịcha si n’eluigwe, ma Nna m na-enye unu ezigbo achịcha si n’eluigwe. 33 N’ihi na achịcha nke Chineke bụ onye ahụ si n’eluigwe bịa, nke na-enye ụwa ndụ.” 34 N’ihi ya, ha sịrị ya: “Onyenwe anyị, na-enye anyị achịcha a mgbe niile.”

35 Jizọs sịrị ha: “Abụ m achịcha na-enye ndụ. Agụụ agaghị agụ onye na-abịakwute m, mmiri agaghịkwa agụ onye nwere okwukwe n’ebe m nọ ọzọ.+ 36 Ma agwala m unu na unu ahụla m, ma unu ekweghị.+ 37 Ndị niile Nna m nyere m ga-abịakwute m, emekataghị m chụpụ onye na-abịakwute m+ 38 n’ihi na esi m n’eluigwe bịa+ ime uche onye zitere m, ọ bụghị uche m.+ 39 Uche onye zitere m bụ ka onye ọ bụla n’ime ndị niile o nyere m ghara ifunahụ m, kama ka m kpọlite ha n’ọnwụ+ n’ụbọchị ikpeazụ. 40 N’ihi na uche Nna m bụ ka onye ọ bụla nke nabatara Ọkpara ahụ ma nwee okwukwe na ya nwee ndụ ebighị ebi.+ M ga-akpọlitekwa ya n’ọnwụ+ n’ụbọchị ikpeazụ.”

41 Ndị Juu malitere ịtamu ntamu n’ihi Jizọs maka na ọ sịrị: “Abụ m achịcha nke si n’eluigwe bịa.”+ 42 Ha wee malite ịsị: “Onye a ọ́ bụghị Jizọs nwa Josef, onye anyị ma nne ya na nna ya?+ Olee otú o sizi na-asị: ‘Esi m n’eluigwe bịa’?” 43 Jizọs sịrị ha: “Kwụsịnụ ịtamu ntamu. 44 E nweghị onye ga-abịakwute m ma ọ bụrụ na Nna m, onye zitere m, adọtaghị ya.+ M ga-akpọlitekwa ya n’ọnwụ n’ụbọchị ikpeazụ.+ 45 E dere n’Akwụkwọ Ndị Amụma, sị: ‘Jehova* ga-akụziri ha niile ihe.’+ Onye ọ bụla gere Nna m ntị ma mụta ihe na-abịakwute m. 46 E nweghị mmadụ ọ bụla hụrụla Nna m,+ ma e wepụ onye ahụ si n’ebe Chineke nọ. Onye a ahụla Nna ahụ.+ 47 N’eziokwu, ana m asị unu na onye ọ bụla kweere ga-enweta ndụ ebighị ebi.+

48 “Abụ m achịcha na-enye ndụ.+ 49 Nna nna unu hà riri mana n’ala ịkpa ma mechaa nwụọ.+ 50 Ma onye ọ bụla na-eri achịcha a si n’eluigwe bịa agaghị anwụ anwụ. 51 Abụ m achịcha na-enye ndụ nke si n’eluigwe bịa. Ọ bụrụ na onye ọ bụla erie achịcha a, ọ ga-adị ndụ ebighị ebi. N’eziokwu, achịcha m ga-enye bụ anụ ahụ́ m ka ụwa wee nweta ndụ.”+

52 Ndị Juu wee malite ịrụrịta ụka, sị: “Olee otú nwoke a ga-esi enye anyị anụ ahụ́ ya ka anyị rie?” 53 N’ihi ya, Jizọs sịrị ha: “N’eziokwu, ana m asị unu na ọ bụrụ na unu erighị anụ ahụ́ Nwa nke mmadụ ma ṅụọ ọbara ya, unu enweghị ndụ n’ime onwe unu.+ 54 Onye ọ bụla na-eri anụ ahụ́ m ma na-aṅụ ọbara m nwere ndụ ebighị ebi, m ga-akpọlitekwa ya n’ọnwụ+ n’ụbọchị ikpeazụ, 55 n’ihi na anụ ahụ́ m bụ ezigbo nri, ọbara m bụkwa ezigbo ihe ọṅụṅụ. 56 Mụ na onye ọ bụla na-eri anụ ahụ́ m ma na-aṅụ ọbara m dị n’otu, yanwa na mụnwa dịkwa n’otu.+ 57 Otú ahụ Nna m dị ndụ zitere m, m wee dị ndụ n’ihi Nna m, ka onye na-eri anụ ahụ́ m ga-adị ndụ n’ihi m.+ 58 Ọ bụ achịcha a bụ achịcha si n’eluigwe bịa. Ọ dịghị ka achịcha nna nna unu hà riri ma mechaa nwụọ. Onye na-eri achịcha a ga-adị ndụ ebighị ebi.”+ 59 O kwuru ihe ndị a mgbe ọ na-ezi ihe n’ụlọ nzukọ ndị Juu dị* na Kapaniọm.

60 Mgbe ọtụtụ n’ime ndị na-eso ụzọ ya nụrụ ihe a, ha sịrị: “Okwu a na-agba agba ná ntị. Ònye ga-achọkwanụ ige ya?” 61 Ma, ebe Jizọs ma na ndị na-eso ụzọ ya na-atamu ntamu n’ihi ihe o kwuru, ọ sịrị ha: “Ihe a ò meela ka okwukwe unu gharazie isi ike?* 62 Gịnịzi ga-eme ma unu hụ Nwa nke mmadụ ka ọ na-arịgo n’ebe ọ nọbu?+ 63 Ọ bụ mmụọ bụ ihe na-enye ndụ.+ Anụ ahụ́ abaghị uru ọ bụla. Okwu m gwara unu si n’ike mmụọ nsọ, ọ na-enyekwa ndụ.+ 64 Ma e nwere ụfọdụ n’ime unu na-ekweghị.” Jizọs kwuru ihe a n’ihi na site ná mmalite, ọ ma ndị na-ekweghị ekwe, marakwa onye ga-arara ya nye.+ 65 O wee sị: “Ọ bụ ya mere m ji sị unu na e nweghị onye ọ bụla ga-abịakwute m, ọ gwụla ma Nna m ò kwere ka ọ bịakwute m.”+

66 N’ihi ihe a o kwuru, ọtụtụ n’ime ndị na-eso ụzọ ya laghachiri n’ihe ndị ha hapụrụ ahapụ,+ kwụsịkwa iso ya. 67 Jizọs wee jụọ ndịozi ya iri na abụọ, sị: “Ùnu chọkwuru ịla?” 68 Saịmọn Pita zara ya, sị: “Onyenwe anyị, ònye ka anyị ga-alakwuru?+ Okwu gị na-enye ndụ ebighị ebi.+ 69 Anyị ekwerela, marakwa na ị bụ Onye Nsọ nke Chineke.”+ 70 Jizọs sịrị ha: “Ọ́ bụghị m họọrọ unu mmadụ iri na abụọ?+ Ma, otu onye n’ime unu bụ onye nkwutọ.”*+ 71 N’eziokwu, ọ na-ekwu banyere Judas nwa Saịmọn Iskarịọt n’ihi na ọ bụ ya ga-arara ya nye, n’agbanyeghị na o so ná ndịozi iri na abụọ ahụ.+

7 Mgbe e mechara, Jizọs nọ na Galili na-ekwusa ozi ọma n’ihi na ọ chọghị ịga Judia maka na ndị Juu nọ na-achọ igbu ya.+ 2 Ma, ememme ndị Juu a na-akpọ Ememme Ụlọikwuu*+ na-eru nso. 3 N’ihi ya, ụmụnne ya ndị nwoke+ sịrị ya: “Hapụ ebe a gawa Judia, ka ndị na-eso ụzọ gị hụkwa ọrụ ndị ị na-arụ. 4 N’ihi na e nweghị onye na-eme ihe ọ bụla na nzuzo ma ọ bụrụ na ọ chọrọ ka mmadụ niile mara ya. Ọ bụrụ na ị na-eme ihe ndị a, gosi ụwa onwe gị.” 5 N’eziokwu, ụmụnne ya ndị nwoke enweghị okwukwe na ya.+ 6 N’ihi ya, Jizọs sịrị ha: “Oge m erubeghị,+ ma oge ọ bụla dịịrị unu mma. 7 E nweghị ihe mere ụwa ga-eji kpọọ unu asị. Ma ọ kpọrọ m asị n’ihi na m na-agba àmà na ọrụ ya dị njọ.+ 8 Gawanụ ememme a. Agawabeghị m, n’ihi na oge m eruchabeghị.”+ 9 Mgbe ọ gwachara ha ihe ndị a, ọ nọdụrụ na Galili.

10 Ma mgbe ụmụnne ya ndị nwoke gawarala ememme ahụ, ọ gawakwara. Ma ọ gara na nzuzo, ka ndị mmadụ ghara ịmata. 11 N’ihi ya, ndị Juu malitere ịchọ ya n’ememme ahụ, na-asị: “Olee nwoke ahụ?” 12 Ọtụtụ n’ime ndị nọ n’ebe ahụ weturu olu ala na-ekwu okwu banyere Jizọs. Ụfọdụ nọ na-asị: “Ọ bụ ezigbo mmadụ.” Ndị ọzọ na-asị: “Ọ bụghị ezigbo mmadụ. Ọ na-eduhie ìgwè mmadụ a.”+ 13 Ma, e nweghị onye na-ekwu banyere ya n’ihu ọha n’ihi na ha na-atụ ndị Juu egwu.+

14 Mgbe ememme ahụ gara ọkara, Jizọs gbagooro n’ụlọ nsọ ma malite izi ihe. 15 O juru ndị Juu anya, ha ana-asị: “Olee otú nwoke a si mara Akwụkwọ Nsọ,*+ ebe ọ bụ na ọ gụghị akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ?”*+ 16 Ma Jizọs sịrị ha: “Ihe m na-ezi abụghị nke m, kama ọ bụ nke onye zitere m.+ 17 Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ ime uche Chineke, ọ ga-ama ma ihe m na-ezi ò si n’aka Chineke+ ka m̀ na-ekwu echiche m. 18 Onye na-ekwu echiche nke ya na-achọ otuto nke ya. Ma onye na-achọ otuto nke onye zitere ya+ bụ onye eziokwu, ajọ omume adịghịkwa n’ime ya. 19 Ọ̀ bụ na Mosis enyeghị unu Iwu?+ Ma e nweghị onye n’ime unu na-erube isi n’Iwu ahụ. Gịnị mere unu ji na-achọ igbu m?”+ 20 Ìgwè mmadụ ahụ zara, sị: “Mmụọ ọjọọ ji gị. Ònye na-achọ igbu gị?” 21 Jizọs wee sị ha: “Otu ihe ka m mere, ya eju unu niile anya. 22 Ọ bụ ya mere Mosis ji nye unu iwu ibi úgwù.+ Ọ bụghị na o si n’aka Mosis, kama o si n’aka nna nna unu hà.+ Unu na-ebikwa mmadụ úgwù n’ụbọchị izu ike. 23 Ebe ọ bụ na a na-ebi mmadụ úgwù n’ụbọchị izu ike ka a ghara ịda Iwu Mosis, gịnị mere unu ji na-ewesa m iwe ọkụ maka na m gwọrọ mmadụ n’ụbọchị izu ike?+ 24 Kwụsịnụ ile mmadụ anya n’ihu mgbe unu na-ekpe ikpe, kama na-ekpenụ ikpe ziri ezi.”+

25 Ụfọdụ ndị bi na Jeruselem malitere ịsị: “Ọ́ bụghị nwoke a ka a na-achọ igbu?+ 26 Ma lee, ọ na-ekwu okwu n’ihu ọha, e nweghịkwa ihe ha na-agwa ya. Ọ̀ ga-abụ na ndị isi amatala n’eziokwu na ọ bụ ya bụ Kraịst? 27 Anyị ma ebe nwoke a si.+ Ma mgbe Kraịst ga-abịa, e nweghị onye ga-ama ebe o si.” 28 Mgbe Jizọs na-ezi ihe n’ụlọ nsọ, o ji oké olu kwuo, sị: “Unu ma m, marakwa ebe m si. Ọ bụghị m zitere onwe m,+ kama Onye zitere m dị adị, unu amaghịkwa ya.+ 29 Ama m ya+ n’ihi na abụ m onye nnọchiteanya ya. Ọ bụ ya zitere m.” 30 N’ihi ya, ha malitere ịchọ otú ha ga-esi jide ya.+ Ma e nweghị onye bitụrụ ya aka n’ihi na oge ya erubeghị.+ 31 Ma ọtụtụ n’ime ìgwè mmadụ ahụ nwere okwukwe na ya.+ Ha nọkwa na-asị: “Mgbe Kraịst ga-abịa, ọ̀ ga-arụ ọrụ ebube karịrị nke nwoke a na-arụ?”*

32 Ndị Farisii nụrụ ka ìgwè mmadụ ahụ na-atakwu ihe ndị a banyere Jizọs, ndị isi nchụàjà na ndị Farisii wee dunye ndị nche ka ha gaa jide ya. 33 Jizọs wee sị: “Mụ na unu ka ga-anọtụkwu tupu mụ alakwuru Onye zitere m.+ 34 Unu ga-achọ m, ma unu agaghị ahụ m, unu enweghịkwa ike ịbịa n’ebe m nọ.”+ 35 N’ihi ya, ndị Juu kwurịtara, sị: “Ebee ka nwoke a bu n’uche ịga ka anyị ghara ịhụ ya? Ò bu n’uche ịgakwuru ndị Juu bi n’obodo ndị Grik ka ọ kụziere ndị Grik ihe? 36 Gịnị ka o bu n’obi mgbe ọ sịrị, ‘Unu ga-achọ m, ma unu agaghị ahụ m, unu enweghịkwa ike ịbịa n’ebe m nọ’?”

37 N’ụbọchị ikpeazụ, nke bụ́ nnukwu ụbọchị n’ememme ahụ,+ Jizọs guzoro ọtọ ma jiri oké olu kwuo, sị: “Ọ bụrụ na mmiri na-agụ onye ọ bụla, ya bịakwute m ṅụọ mmiri.+ 38 Onye ọ bụla nwere okwukwe na m, ‘Mmiri nke na-enye ndụ ga-esi n’ime ya na-asọpụta,’+ otú e kwuru ya n’Akwụkwọ Nsọ.” 39 Ma, ọ na-ekwu banyere mmụọ nsọ nke ndị nwere okwukwe na ya na-aga ịnata, n’ihi na ha anatabeghị mmụọ nsọ+ ebe ọ bụ na e mebeghị ka Jizọs dị ebube.+ 40 Ụfọdụ n’ime ìgwè mmadụ ahụ ndị nụrụ ihe a o kwuru malitere ịsị: “N’eziokwu, ọ bụ ya bụ Onye Amụma ahụ.”+ 41 Ndị ọzọ nọ na-asị: “Onye a bụ Kraịst.”+ Ma ụfọdụ nọ na-asị: “Kraịst ọ̀ ga-esi na Galili bịa?+ 42 Ọ̀ bụ na e kwughị n’Akwụkwọ Nsọ na Kraịst ga-esi n’agbụrụ Devid,+ nakwa na ọ ga-esi na Betlehem,+ bụ́ obodo Devid?”+ 43 Ìgwè mmadụ ahụ kewaziri n’ihi ya. 44 Ụfọdụ n’ime ha chọrọ ijide ya, ma e nweghị onye bitụrụ ya aka.

45 Ndị nche ahụ wee laghachikwuru ndị isi nchụàjà na ndị Farisii. Ndị isi nchụàjà na ndị Farisii jụrụ ha, sị: “Gịnị mere na unu akpụtaghị ya?” 46 Ndị nche ahụ zara, sị: “E nwetụbeghị onye ọzọ kwuru okwu otú a.”+ 47 Ma, ndị Farisii kwuru, sị: “È duhiekwala ununwa? 48 È nwere otu n’ime ndị isi ma ọ bụ ndị Farisii nwere okwukwe na ya?+ 49 Ma ìgwè mmadụ a na-amaghị Iwu* bụ ndị a bụrụ ọnụ.” 50 Nikọdimọs, onye bịakwuteburu Jizọs, onye bụ́kwa otu n’ime ndị Farisii, sịrị ha: 51 “Iwu anyị ekwughị na a ga-ama mmadụ ikpe ma ọ bụrụ na e bughị ụzọ nụ n’ọnụ onye ahụ ma mara ihe ọ na-eme, ka ò kwuru otú ahụ?”+ 52 Ha zara ya, sị: “Gịnwa ì sikwu na Galili? Chọọ n’Akwụkwọ Nsọ, ị ga-ahụ na e nweghị onye amụma ga-esi na Galili.”*

8 12 Jizọs gwara ha okwu ọzọ, sị: “Abụ m ìhè nke ụwa.+ Onye ọ bụla na-eso m emekataghị jee ije n’ọchịchịrị, kama ọ ga-enwe ìhè+ nke ndụ.” 13 N’ihi ya, ndị Farisii sịrị ya: “Ị na-agba àmà banyere onwe gị. Àmà gị abụghị eziokwu.” 14 Jizọs wee sị ha: “Ọ bụrụgodị na m na-agba àmà banyere onwe m, àmà m bụ eziokwu, n’ihi na ama m ebe m si bịa na ebe m na-aga.+ Ma unu amaghị ebe m si bịa na ebe m na-aga. 15 Unu na-ekpe ikpe otú mmadụ si ekpe.+ E nweghị onye ọ bụla m na-ekpe ikpe. 16 Ma ọ bụrụgodị na mụ ekpee ikpe, ikpe m bụ ikpe ziri ezi n’ihi na anọghị m naanị m, kama Nna m nke zitere m nọnyeere m.+ 17 E dekwara n’Iwu unu,* sị: ‘Àmà mmadụ abụọ gbara bụ eziokwu.’+ 18 Ọ bụ m na-agba àmà banyere onwe m. Nna m nke zitere m na-agbakwa àmà banyere m.”+ 19 Ha wee jụọ ya, sị: “Olee ebe Nna gị nọ?” Jizọs zara, sị: “Unu amaghị m, unu amaghịkwa Nna m.+ Ọ bụrụ na unu ma m, unu gaara amakwa Nna m.”+ 20 O kwuru ihe ndị a mgbe ọ na-ezi ihe n’ebe a na-edebe ego n’ụlọ nsọ.+ Ma e nweghị onye ọ bụla jidere ya maka na oge ya erubeghị.+

21 O wee gwa ha ọzọ, sị: “Ana m ala, unu ga-achọkwa m, ma unu ga-anwụ ná mmehie unu.+ Unu agaghị abịali n’ebe m na-aga.”+ 22 Ndị Juu malitere ịsị: “Ọ̀ na-aga igbu onwe ya? N’ihi na ọ na-asị, ‘Unu agaghị abịali n’ebe m na-aga.’” 23 O wee sị ha: “Unu si n’ala, ma esi m n’elu.+ Unu si n’ụwa a, ma esighị m n’ụwa a. 24 Ọ bụ ya mere m ji gwa unu, sị: Unu ga-anwụ ná mmehie unu. N’ihi na ọ bụrụ na unu ekweghị na ọ bụ m bụ onye ahụ, unu ga-anwụ ná mmehie unu.” 25 N’ihi ya, ha jụwara ya, sị: “Ònye ka ị bụ?” Jizọs sịrị ha: “Gịnịdị mere m ji atụpụrụ unu ọnụ? 26 Enwere m ọtụtụ ihe m ga-ekwu banyere unu nakwa ikpe ndị m ga-ekpebi. N’eziokwu, Onye zitere m na-ekwu eziokwu. Ọ bụkwa ihe ndị m nụrụ n’ọnụ ya ka m na-ekwu n’ụwa.”+ 27 Ha aghọtaghị na ọ na-agwa ha banyere Nna ya. 28 Jizọs wee sị: “Ọ bụ mgbe unu wegoro Nwa nke mmadụ n’elu*+ ka unu ga-amata na ọ bụ m bụ ya,+ nakwa na e nweghị ihe ọ bụla m na-eme bụ́ uche m.+ Kama m na-ekwu ihe ndị a otú Nna m kụziiri m. 29 Onye zitere m nọnyeere m. Ọ hapụghị m ka m nọrọ naanị m n’ihi na m na-eme ihe dị ya mma mgbe niile.”+ 30 Ka ọ nọ na-ekwu ihe ndị a, ọtụtụ ndị nwere okwukwe na ya.

31 Jizọs wee gwa ndị Juu kweere na ya, sị: “Ọ bụrụ na unu ana-eme ihe m kwuru mgbe niile, unu bụ ndị na-eso ụzọ m n’eziokwu. 32 Unu ga-amara eziokwu,+ eziokwu ga-emekwa ka unu nwere onwe unu.”+ 33 Ha gwara ya, sị: “Anyị bụ ụmụ Ebreham. Anyị abụtụbeghị ohu onye ọ bụla. Gịnị mere i ji asị, ‘Unu ga-enwere onwe unu’?” 34 Jizọs zara ha, sị: “N’eziokwu, ana m asị unu na onye ọ bụla na-eme mmehie na-agbara mmehie ohu.+ 35 Ohu anaghị anọ n’ụlọ nna ya ukwu ruo mgbe ebighị ebi. Ma, nwa na-anọ ruo mgbe ebighị ebi. 36 N’ihi ya, ọ bụrụ na Ọkpara ahụ emee ka unu nwere onwe unu, unu ga-enwere onwe unu n’eziokwu. 37 Ama m na unu bụ ụmụ Ebreham. Ma unu na-achọ igbu m maka na unu anaghị anabata okwu m. 38 Ihe m na-ekwu bụ ihe m hụrụ mgbe mụ na Nna m nọ.+ Ma, unu na-eme ihe nna unu gwara unu.” 39 Ha wee gwa ya, sị: “Nna anyị bụ Ebreham.” Jizọs sịrị ha: “Ọ bụrụ na unu bụ ụmụ Ebreham,+ unu ga na-arụ ọrụ Ebreham rụrụ. 40 Ma ugbu a, unu na-achọ igbu m, bụ́ onye gwara unu eziokwu m nụrụ n’ọnụ Chineke.+ Ebreham emeghị otú a. 41 Unu na-arụ ọrụ nna unu.” Ha sịrị ya: “Anyị abụghị ndị a kwatara n’iko.* Anyị nwere otu Nna, ya bụ, Chineke.”

42 Jizọs wee sị ha: “Ọ bụrụ na Chineke bụ Nna unu, unu ga-ahụ m n’anya+ n’ihi na esi m n’ebe Chineke nọ bịa, anọkwa m ebe a. Ọ bụghị m zitere onwe m, kama ọ bụ ya zitere m.+ 43 Gịnị mere na unu aghọtaghị ihe m na-ekwu? Ọ bụ n’ihi na unu enweghị ike ịnabata okwu m. 44 Unu si ná nna unu bụ́ Ekwensu, unu na-achọkwa ime ihe nna unu chọrọ.+ Onye ahụ bụ ogbu mmadụ mgbe ọ malitere,*+ o guzosighịkwa ike n’eziokwu n’ihi na eziokwu adịghị n’ime ya. Mgbe ọ na-agha ụgha, ọ na-ekwu ihe bụ́ uche ya, n’ihi na ọ bụ onye ụgha, bụrụkwa nna ụgha.+ 45 Ma, unu anaghị ekwere ihe m na-ekwu maka na m na-agwa unu eziokwu. 46 Ònye n’ime unu ga-amali m ikpe na m bụ onye mmehie? Ọ bụrụ na m na-ekwu eziokwu, gịnị mere na unu ekwetaghị ihe m na-ekwu? 47 Onye si na Chineke na-ege ntị n’okwu Chineke.+ Unu anaghị ege ntị n’ihi na unu esighị na Chineke.”+

48 Ndị Juu wee sị ya: “Ọ̀ kwa anyị kwuru ekwu na ị bụ onye Sameria+ nakwa na mmụọ ọjọọ ji gị?”+ 49 Jizọs zara, sị: “Mmụọ ọjọọ ejighị m, kama m na-asọpụrụ Nna m, unu anaghịkwa asọpụrụ m. 50 Ma anaghị m achọrọ onwe m otuto.+ E nwere Onye na-achọ ka e too m, ọ bụkwa ya bụ onyeikpe. 51 N’eziokwu, ana m asị unu na ọ bụrụ na onye ọ bụla na-eme ihe m kwuru, o mekataghị nwụọ.”+ 52 Ndị Juu wee sị ya: “Ugbu a ka anyị matara na mmụọ ọjọọ ji gị. Ebreham nwụrụ, ndị amụma nwụkwara. Ma ị na-asị, ‘Ọ bụrụ na onye ọ bụla na-eme ihe m kwuru, o mekataghị nwụọ.’ 53 Ị̀ ka nna anyị Ebreham onye nwụrụnụ? Ndị amụma nwụkwara. Ònye ka ị na-asị na ị bụ?” 54 Jizọs zara, sị: “Ọ bụrụ na m na-eto onwe m, otuto m enweghị ihe ọ bụ. Ọ bụ Nna m na-eto m,+ bụ́ onye unu na-asị na ọ bụ Chineke unu. 55 Unu amabeghị ya,+ ma ama m ya.+ Ọ bụrụ na mụ asị na amaghị m ya, m ga-abụ onye ụgha dị ka unu. Ma ama m ya, ana m emekwa ihe o kwuru. 56 Obi tọrọ nna unu Ebreham ezigbo ụtọ mgbe ọ nọ na-atụ anya ịhụ ụbọchị m, ọ hụkwara ya ma ṅụrịa ọṅụ.”+ 57 Ndị Juu wee sị ya: “Ị̀ na-ekwu na ị hụrụ Ebreham ebe ị na-erubeghị afọ iri ise?” 58 Jizọs sịrị ha: “N’eziokwu, ana m asị unu na tupu a mụọ Ebreham, anọ m ndụ.”+ 59 N’ihi ya, ha buuru nkume ka ha tụọ ya, ma Jizọs zoro wee si n’ụlọ nsọ ahụ pụọ.

9 Mgbe ọ na-agafe, ọ hụrụ otu nwoke kpuru ìsì malite mgbe a mụrụ ya. 2 Ndị na-eso ụzọ ya wee jụọ ya, sị: “Onye Ozizi,*+ ònye mehiere? Ọ̀ bụ nwoke a, ka ọ̀ bụ ndị mụrụ ya, nke mere o ji kpuo ìsì mgbe a mụrụ ya?” 3 Jizọs zara, sị: “Ma nwoke a ma ndị mụrụ ya emehieghị, kama ọ bụ ka e si n’ihe mere ya mee ka ọrụ Chineke pụta ìhè.+ 4 Anyị ga-arụ ọrụ Onye zitere m mgbe ìhè ka dị.+ Abalị na-abịa, mgbe mmadụ ọ bụla na-agaghị arụli ọrụ. 5 N’oge niile m nọ n’ụwa, abụ m ìhè nke ụwa.”+ 6 Mgbe o kwuchara ihe ndị a, ọ gbụsara asọ mmiri n’ala, gwakọta ya na ájá wee tee ájá ahụ n’anya nwoke ahụ,+ 7 sị ya: “Gaa saa anya gị n’ọdọ mmiri Siloam” (nke pụtara “Ihe Na-asọpụta Asọpụta”). O wee gaa saa anya ya. Mgbe ọ lọghachiri, ọ hụwala ụzọ.+

8 Ndị agbata obi ya na ndị na-ahụbu na ọ bụ onye arịrịọ malitere ịsị: “Onye a ọ́ bụghị nwoke ahụ na-anọdụ ala arịọ arịrịọ?” 9 Ụfọdụ ndị nọ na-asị: “Ọ bụ ya.” Ndị ọzọ nọ na-asị: “Ọ bụghị ya, kama o yiri ya.” Ma nwoke ahụ nọ na-asị: “Ọ bụ m.” 10 Ha wee jụọ ya, sị: “Oleezi otú e si meghee anya gị?” 11 Ọ zara, sị: “Nwoke ahụ a na-akpọ Jizọs gwọkọtara ájá tee m n’anya ma sị m, ‘Gaa na Siloam saa anya gị.’+ M wee gaa saa anya m, hụwa ụzọ.” 12 Ha wee sị ya: “Olee ebe nwoke ahụ nọ?” Ọ sịrị ha: “Amaghị m.”

13 Ha duuru nwoke ahụ kpuburu ìsì gakwuru ndị Farisii. 14 Ọ bụ n’Ụbọchị Izu Ike+ ka Jizọs gwọkọtara ájá ma jiri ya meghee anya nwoke ahụ.+ 15 Ndị Farisii jụwaziri ya otú o si hụwa ụzọ. O wee sị ha: “O tere m ájá n’anya. M wee saa anya m, hụwa ụzọ.” 16 Ụfọdụ ndị Farisii malitere ịsị: “Ọ bụghị Chineke zitere nwoke a n’ihi na ọ naghị edebe Ụbọchị Izu Ike.”+ Ndị ọzọ sịrị: “Olee otú onye mmehie ga-esi na-arụ ụdị ọrụ ebube* ndị ahụ?”+ N’ihi ya, ha kewara.+ 17 Ha sịrị onye ìsì ahụ ọzọ: “Olee ihe ị ga-ekwu banyere ya ebe ọ bụ na o meghere anya gị?” Nwoke ahụ sịrị: “Ọ bụ onye amụma.”

18 Ma, ndị isi ndị Juu ekwetaghị na nwoke ahụ kpuburu ìsì ma mechaa hụwa ụzọ. N’ihi ya, ha kpọrọ ndị mụrụ ya. 19 Ha wee jụọ ha, sị: “Onye a ọ̀ bụ nwa unu, onye unu sịrị na o kpuru ìsì malite mgbe a mụrụ ya? Oleezi otú o si na-ahụ ụzọ ugbu a?” 20 Ndị mụrụ ya zara, sị: “Anyị ma na ọ bụ nwa anyị, marakwa na o kpuru ìsì malite mgbe a mụrụ ya. 21 Ma anyị amaghị otú o si hụwa ụzọ ugbu a, anyị amaghịkwa onye meghere anya ya. Jụọnụ ya. Ọ bụrụla dimkpa. Ya zara ọnụ ya.” 22 Ndị mụrụ ya kwuru ihe ndị a maka na ha na-atụ ndị isi ndị Juu egwu,+ n’ihi na ha kwekọrịtara na onye ọ bụla kwuru na Jizọs bụ Kraịst, a ga-achụpụ ya n’ụlọ nzukọ ha.+ 23 Ọ bụ ya mere ndị mụrụ ya ji sị: “Ọ bụrụla dimkpa. Jụọnụ ya.”

24 Ha wee kpọọ nwoke ahụ kpuburu ìsì nke ugboro abụọ, sị ya: “Nye Chineke otuto.* Anyị ma na nwoke ahụ bụ onye mmehie.” 25 Ọ gwara ha, sị: “Amaghị m ma ọ̀ bụ onye mmehie. Otu ihe m ma bụ na m kpuburu ìsì, ma ana m ahụ ụzọ ugbu a.” 26 Ha wee sị ya: “Gịnị ka o mere gị? Olee otú o si meghee anya gị?” 27 Ọ zara ha, sị: “M kọọrọla ya unu, ma unu egeghị ntị. Gịnị mere unu ji chọọ ịnụ ya ọzọ? Ùnu chọrọ ịghọ ndị na-eso ụzọ ya?” 28 Ha wee kparịa ya, sị: “Ị bụ onye na-eso ụzọ nwoke ahụ, ma anyị bụ ndị na-eso ụzọ Mosis. 29 Anyị ma na Chineke gwara Mosis okwu. Ma anyị amaghị ebe nwoke a si.” 30 Nwoke ahụ gwara ha, sị: “O juru m anya na unu sịrị na unu amaghị ebe o si ma ya emeghee anya m. 31 Anyị ma na Chineke anaghị ege ndị mmehie ntị.+ Ma ọ bụrụ na mmadụ na-atụ egwu Chineke, na-emekwa uche ya, ọ na-ege ya ntị.+ 32 Malite n’oge ochie, a nụtụbeghị na mmadụ meghere anya onye kpuru ìsì malite mgbe a mụrụ ya. 33 Ọ bụrụ na ọ bụghị Chineke zitere nwoke a, o nweghị ihe ọ bụla ọ ga-emeli.”+ 34 Ha gwara ya, sị: “Ị̀ na-ezi anyị ihe n’agbanyeghị na a mụrụ gị ná mmehie?” Ha wee chụpụ ya.+

35 Jizọs nụrụ na ha achụpụla nwoke ahụ. Mgbe Jizọs hụrụ ya, ọ sịrị ya: “Ì nwere okwukwe na Nwa nke mmadụ?” 36 Nwoke ahụ zara, sị: “Nna anyị ukwu, ònyekwanụ ka ọ bụ ka m wee nwee okwukwe na ya?” 37 Jizọs sịrị ya: “Ị hụla ya. Ọ bụ onye a gị na ya na-ekwu okwu.” 38 O wee sị: “Onyenwe anyị, enwere m okwukwe na ya.” Nwoke ahụ wee kpọọrọ ya isiala. 39 Jizọs kwuziri, sị: “Abịara m n’ụwa a ka e kpee ụwa ikpe, ka ndị na-anaghị ahụ ụzọ wee hụwa ụzọ,+ ka ndị na-ahụ ụzọ kpuokwa ìsì.”+ 40 Ndị Farisii nọ n’ebe ahụ nụrụ ihe a o kwuru. Ha wee sị ya: “Ànyị kpukwuru ìsì?” 41 Jizọs sịrị ha: “Ọ bụrụ na unu kpuru ìsì, unu agaraghị abụ ndị mmehie. Ma ugbu a, unu na-asị, ‘Anyị na-ahụ ụzọ.’ A gaghị agbaghara unu mmehie unu.”+

10 “N’eziokwu, ana m asị unu na ọ bụrụ na mmadụ anaghị esi n’ọnụ ụzọ abanye n’ogige atụrụ, kama na-esi ebe ọzọ arịba, ọ bụ onye ohi na onye na-apụnara mmadụ ihe.+ 2 Ma onye na-esi n’ọnụ ụzọ abanye bụ onye na-azụ atụrụ.+ 3 Onye na-eche ọnụ ụzọ nche na-emeghere ya ụzọ,+ atụrụ na-anụkwa olu ya.+ Ọ na-akpọ atụrụ ya aha, na-edurukwa ha apụ. 4 Mgbe ọ kpọpụtara atụrụ niile bụ́ nke ya, ọ na-aga n’ihu ha, ha esoro ya n’ihi na ha ma olu ya. 5 Ha emekataghị soro onye ha na-amaghị, kama ha ga-agbara ya ọsọ n’ihi na ha amaghị olu ya.” 6 Jizọs meere ha ihe atụ a, ma ha aghọtaghị ihe ọ na-agwa ha.

7 Jizọs wee kwuo ọzọ, sị: “N’eziokwu, ana m asị unu na abụ m ọnụ ụzọ atụrụ si agafe.+ 8 Ndị niile bịara ma na-asị na ha bụ m bụ ndị ohi na ndị na-apụnara mmadụ ihe. Ma atụrụ m egeghị ha ntị. 9 Abụ m ọnụ ụzọ. A ga-azọpụta onye ọ bụla na-esi na m abanye. Ọ ga na-abanye ma na-apụ, na-achọtakwa ebe ọ ga-ata nri.+ 10 Onye ohi anaghị abịa ma ọ́ bụghị ka o zuo atụrụ, gbuo ha ma bibie ha.+ Abịara m ka ha nweta ndụ ma nweta ya n’uju. 11 Abụ m ezigbo onye ọzụzụ atụrụ.+ Ezigbo onye ọzụzụ atụrụ na-enye ndụ* ya maka atụrụ ya.+ 12 Onye e goro ọrụ ịzụ atụrụ, onye atụrụ na-abụghịkwa nke ya, na-ahụ anụ ọhịa wolf* ka ọ na-abịa, ya ahapụ atụrụ gbaa ọsọ (anụ ọhịa wolf eburu ha ma chụsasịa ha) 13 n’ihi na ọ bụ onye e goro ọrụ, ihe banyere atụrụ ahụ anaghịkwa emetụ ya n’obi. 14 Abụ m ezigbo onye ọzụzụ atụrụ. Ama m atụrụ m, atụrụ m makwa m,+ 15 otú ahụ Nna m ma m, mụnwa amarakwa Nna m.+ M na-enyekwa ndụ* m n’ihi atụrụ m.+

16 “Enwekwara m atụrụ ọzọ, ndị na-anọghị n’ogige atụrụ a.+ M ga-akpọtakwa ha, ha ga-ege m ntị. Ha ga-aghọ otu ìgwè atụrụ, nweekwa otu onye ọzụzụ atụrụ.+ 17 Nna m hụrụ m n’anya+ maka na m na-enye ndụ* m+ ka m wee nweta ya ọzọ. 18 O nweghị onye na-anapụ m ndụ m, kama ọ bụ m ji aka m enyefe ya. Enwere m ikike inyefe ya, enwekwara m ikike inweta ya ọzọ.+ Ọ bụ Nna m nyere m iwu a.”

19 Ndị Juu kewakwara ọzọ+ n’ihi ihe a o kwuru. 20 Ọtụtụ n’ime ha nọ na-asị: “Mmụọ ọjọọ ji ya, isi adịghịkwa ya mma. Gịnị mere unu ji na-ege ya ntị?” 21 Ndị ọzọ sịrị: “Ihe a abụghị okwu onye mmụọ ọjọọ ji. Mmụọ ọjọọ ọ̀ ga-emegheli anya ndị ìsì?”

22 N’oge ahụ, e mere Ememme Inyefe Chineke Ụlọ na Jeruselem. Ọ bụ oge oyi. 23 Jizọs nọ na-ejegharị n’ụlọ nsọ, n’ebe a na-akpọ varanda Solomọn.+ 24 Ndị Juu wee gbaa ya gburugburu ma bido ịsị ya: “Ị̀ ga-ekowe anyị* obi n’elu ruo ole mgbe? Ọ bụrụ na ị bụ Kraịst, gwa anyị hoo haa.” 25 Jizọs zara ha, sị: “Agwara m unu, ma unu ekweghị. Ọrụ niile m na-arụ n’aha Nna m na-agba àmà banyere m.+ 26 Ma unu ekweghị n’ihi na unu abụghị atụrụ m.+ 27 Atụrụ m na-anụ olu m, amakwa m ha, ha na-esokwa m.+ 28 M na-enye ha ndụ ebighị ebi,+ e nweghịkwa ihe ga-eme ka e bibie ha. E nweghị onye ga-apụnara m ha.+ 29 Ihe Nna m nyere m karịrị ihe niile ọzọ, e nweghịkwa onye nwere ike ịpụnara ha Nna m.+ 30 Mụ na Nna m bụ otu.”*+

31 Ndị Juu tụtụụrụ nkume ọzọ ka ha tụọ ya. 32 Jizọs wee sị ha: “M nọrọla n’ihu unu rụọ ọtụtụ ọrụ ọma si n’aka Nna m. Ole nke n’ime ọrụ ndị ahụ mere unu ji na-achọ ịtụ m nkume?” 33 Ndị Juu zara ya, sị: “Ọ bụghị ọrụ ọma gị mere anyị ji atụ gị nkume, kama ọ bụ maka na ị na-ekwulu Chineke.+ N’ihi na ị na-eme onwe gị chi n’agbanyeghị na ị bụ mmadụ.” 34 Jizọs sịrị ha: “Ọ̀ bụ na e deghị n’Iwu unu,* sị, ‘Asịrị m: “Unu bụ chi”’?*+ 35 Unu makwa na Akwụkwọ Nsọ anaghị agha ụgha. N’ihi ya, ọ bụrụ na Chineke kpọrọ ndị okwu ya mara ikpe ‘chi,’+ 36 ùnu na-asị m, bụ́ onye Nna m doro nsọ ma zite n’ụwa, ‘Ị na-ekwulu Chineke,’ maka na m sịrị, ‘Abụ m Ọkpara Chineke’?+ 37 Ọ bụrụ na anaghị m arụ ọrụ Nna m chọrọ ka m rụọ, unu ekwerela na m. 38 Ma ọ bụrụ na m na-arụ ha, ọ bụrụgodị na unu ekweghị na m, kwerenụ n’ọrụ ndị ahụ,+ ka unu wee mara ma nọgide na-amara na mụ na Nna m dị n’otu, nakwa na Nna m na mụnwa dịkwa n’otu.”+ 39 Ha wee gbalịa ọzọ ka ha jide ya, ma ọ gbanahụrụ ha.

40 Ọ gaghachiri n’ofe nke ọzọ nke Osimiri Jọdan, bụ́ ebe Jọn nọbu na-eme baptizim.+ O wee nọrọ n’ebe ahụ. 41 Ọtụtụ ndị bịakwutere ya, malite ịsị: “N’eziokwu, Jọn arụghị otu mkpụrụ ọrụ ebube,* ma ihe niile Jọn kwuru banyere nwoke a bụcha eziokwu.”+ 42 Ọtụtụ ndị nọ n’ebe ahụ wee nwee okwukwe na Jizọs.

11 E nwere otu nwoke na-arịa ọrịa. Aha ya bụ Lazarọs. Ọ bụ onye Betani. Ya na ụmụnne ya bụ́ Meri na Mata bi n’obodo ahụ.+ 2 Ọ bụ Meri a bụ onye tere Onyenwe anyị mmanụ na-esi ísì ọma ma jiri ntutu isi ya hichaa ụkwụ ya.+ Ọ bụkwa ya ka Lazarọs nwanne ya nwoke na-arịa ọrịa. 3 Ụmụnne Lazarọs ndị nwaanyị wee zigara Onyenwe anyị ozi, sị: “Onyenwe anyị, onye ị hụrụ n’anya na-arịa ọrịa.” 4 Ma mgbe Jizọs nụrụ ya, ọ sịrị: “Ihe ga-esi n’ọrịa a pụta abụghị ọnwụ, kama ọ bụ ka e too Chineke,+ ka e wee si na ya too Ọkpara Chineke.”

5 Jizọs hụrụ Mata na nwanne ya nwaanyị na Lazarọs n’anya. 6 Ma, mgbe ọ nụrụ na Lazarọs na-arịa ọrịa, ọ nọkwuru ụbọchị abụọ n’ebe ọ nọ. 7 Mgbe e mechara, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ka anyị gaghachinụ na Judia.” 8 Ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya: “Onye Ozizi,*+ ọ dịchabeghị anya ndị Judia chọrọ ịtụ gị nkume.+ Ị̀ na-agaghachi ebe ahụ?” 9 Jizọs zara, sị: “Ọ́ bụghị awa iri na abụọ ka a na-enwe ìhè n’ụbọchị?+ Ọ bụrụ na mmadụ na-ejegharị n’oge ìhè dị, ọ naghị akpọ ụkwụ n’ihe ọ bụla n’ihi na ọ na-ahụ ìhè nke ụwa a. 10 Ma ọ bụrụ na mmadụ na-ejegharị n’abalị, ọ na-akpọ ụkwụ n’ihe n’ihi na ìhè adịghị n’ime ya.”

11 Mgbe o kwuchara ihe ndị a, ọ sịrị: “Enyi anyị Lazarọs na-arahụ ụra,+ ma m na-eje ebe ahụ ịkpọte ya.” 12 Ndị na-eso ụzọ ya wee sị ya: “Onyenwe anyị, ọ bụrụ na ọ na-arahụ ụra, ahụ́ ga-adị ya mma.” 13 Ma, ihe Jizọs na-ekwu bụ na Lazarọs anwụọla. Ma ha chere na ọ na-ekwu banyere ụra efu. 14 Jizọs gwaziri ha hoo haa, sị: “Lazarọs anwụọla.+ 15 Ana m aṅụrị ọṅụ n’ihi unu na anọghị m n’ebe ahụ, ka unu wee kwere. Ma ka anyị gaanụ hụ ya.” 16 Tọmọs, onye a na-akpọ Ejima, wee gwa ndị na-eso ụzọ ibe ya, sị: “Ka anyị gaakwa, ka anyị soro Jizọs nwụọ.”+

17 Mgbe Jizọs rutere, ọ hụrụ na Lazarọs anọọla ụbọchị anọ n’ili.* 18 Betani dị nso na Jeruselem. Ọ dị ihe dị ka kilomita atọ* ma e si na Jeruselem gawa ya. 19 Ọtụtụ ndị Juu bịara ịkasi Mata na Meri obi n’ihi nwanne ha nwoke nwụrụ anwụ. 20 Mgbe Mata nụrụ na Jizọs na-abịa, ọ gara izute ya. Ma Meri+ nọdụrụ n’ụlọ. 21 Mata wee gwa Jizọs, sị: “Onyenwe anyị, a sị na ị nọ n’ebe a, nwanne m nwoke agaraghị anwụ. 22 Amakwa m ugbu a na ihe ọ bụla ị rịọrọ Chineke, Chineke ga-enye gị ya.” 23 Jizọs sịrị ya: “Nwanne gị nwoke ga-ebili.” 24 Mata wee sị ya: “Ama m na ọ ga-ebili mgbe a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ+ n’ụbọchị ikpeazụ.” 25 Jizọs sịrị ya: “Abụ m mbilite n’ọnwụ na ndụ.+ Onye nwere okwukwe na m, ọ bụrụgodị na ọ nwụọ, ọ ga-adị ndụ ọzọ. 26 Onye ọ bụla dị ndụ ma nwee okwukwe na m emekataghị nwụọ.+ Ì kwetara?” 27 O wee sị ya: “Ee, Onyenwe anyị. Ekwetara m na ị bụ Kraịst, Ọkpara Chineke, Onye ga-abịa n’ụwa.” 28 Mgbe o kwuru ihe a, ọ gara kpọọ Meri nwanne ya, takwunyere ya, sị: “Onye Ozizi+ abịala. Ọ na-akpọ gị.” 29 Mgbe Meri nụrụ ya, o biliri ọsọ ọsọ gawa ịhụ ya.

30 Jizọs abatabeghị n’obodo ahụ, kama ọ ka nọ n’ebe Mata zutere ya. 31 Mgbe ndị Juu ha na Meri nọ n’ụlọ, bụ́ ndị na-akasi ya obi, hụrụ ka o biliri ọsọ ọsọ pụọ, ha sochiri ya n’ihi na ha chere na ọ na-aga n’ili*+ ịga bee ákwá. 32 Mgbe Meri rutere n’ebe Jizọs nọ ma hụ ya, ọ dara n’ụkwụ ya, sị ya: “Onyenwe anyị, a sị na ị nọ n’ebe a, nwanne m nwoke agaraghị anwụ.” 33 Mgbe Jizọs hụrụ ka ọ na-ebe ákwá, hụkwa ka ndị Juu so ya bịa na-ebe ákwá, ọ sụrụ ude,* obi ajọọkwa ya njọ. 34 O wee sị: “Olee ebe unu liri ya?” Ha sịrị ya: “Onyenwe anyị, bịa ka ị hụ ebe ọ bụ.” 35 Anya mmiri wee gbaa Jizọs.+ 36 Ndị Juu malitere ịsị: “Lee ka o si hụ ya n’anya.” 37 Ma ụfọdụ n’ime ha sịrị: “Ọ̀ bụ na nwoke a meghere anya onye ìsì+ enweghị ike ime ka onye a ghara ịnwụ?”

38 Jizọs sụrụ ude ọzọ, ya abịa n’ili* ahụ. N’eziokwu, ili* ahụ bụ ọgba, e jikwa nkume dọchie ọnụ ya. 39 Jizọs sịrị: “Kwapụnụ nkume a.” Mata, nwanne onye ahụ nwụrụ anwụ, sịrị ya: “Onyenwe anyị, ọ ga-abụ na o siwela ísì ugbu a n’ihi na o meela ụbọchị anọ.” 40 Jizọs sịrị ya: “Ọ̀ kwa m gwara gị na ọ bụrụ na i kwere, ị ga-ahụ ebube Chineke?”+ 41 Ha kwapụrụ nkume ahụ. Jizọs wee lelie anya n’eluigwe,+ sị: “Nna, ana m ekele gị na ị nụla olu m. 42 N’eziokwu, ama m na ị na-anụ olu m mgbe niile. Ma, m na-ekwu ihe a n’ihi ìgwè mmadụ a guzo gburugburu ka ha wee kwere na ọ bụ gị zitere m.”+ 43 Mgbe o kwuchara ihe ndị a, o kwuziri n’oké olu, sị: “Lazarọs, pụta!”+ 44 Nwoke ahụ nwụrụ anwụ wee pụta. E kere ya ákwà n’ụkwụ na n’aka, jirikwa ákwà kechie ya ihu. Jizọs sịrị ha: “Tọpụnụ ya ákwà ka ọ lawa.”

45 N’ihi ya, ọtụtụ n’ime ndị Juu, bụ́ ndị bịakwutere Meri, nwere okwukwe na Jizọs mgbe ha hụrụ ihe o mere.+ 46 Ma ụfọdụ n’ime ha gakwuuru ndị Farisii kọọrọ ha ihe Jizọs mere. 47 Ndị isi nchụàjà na ndị Farisii kpọkọtara ndị Sanhedrin* ma kwuo, sị: “Gịnị ka anyị ga-eme n’ihi na nwoke a na-arụ ọtụtụ ọrụ ebube?*+ 48 Ọ bụrụ na anyị hapụ ya otú a, ha niile ga-enwe okwukwe na ya, ndị Rom ga-abịakwa weghara ma ụlọ nsọ anyị ma mba anyị.” 49 Ma e nwere otu onye n’ime ha aha ya bụ Kayafas.+ Ọ bụ nnukwu onye nchụàjà n’afọ ahụ. Ọ sịrị ha: “Unu amaghị ihe ọ bụla. 50 Ọ̀ bụ na unu echeghị na ọ kaara unu mma ka otu onye nwụchitere mmadụ niile ọnwụ, kama a ga-ebibi mba a niile?” 51 Ma, o kwughị ihe a n’echiche nke ya, kama ebe ọ bụ nnukwu onye nchụàjà n’afọ ahụ, o si otú ahụ buo amụma na Jizọs ga-anwụ maka mba ahụ. 52 Ọ bụghị naanị maka mba ahụ, kama ka e wee chịkọta ụmụ Chineke ndị gbasasịrị agbasasị ka ha bụrụ otu. 53 Malite n’ụbọchị ahụ gawa, ha gbawara izu igbu ya.

54 N’ihi ya, Jizọs kwụsịrị ijegharị n’ebe ọtụtụ ndị* ga-ahụ ya. Ọ hapụkwara ebe ahụ gaa n’ebe dị nso n’ala ịkpa ma banye n’obodo a na-akpọ Ifrem.+ Ya na ndị na-eso ụzọ ya wee nọrọ n’ebe ahụ. 55 Ugbu a, Ememme Ngabiga+ ndị Juu eruwela nso. Ọtụtụ ndị wee si n’ime ime obodo gbagoo Jeruselem tupu Ememme Ngabiga ahụ amalite ka ha mee onwe ha ka ha dị ọcha otú Iwu* kwuru. 56 Ha nọ na-achọ Jizọs. Ka ha guzokwa gburugburu ụlọ nsọ, ha nọ na-ajụrịta ibe ha, sị: “Gịnị ka unu chere? Ọ̀ bụ na ọ gaghị abịa ememme a?” 57 Ma, ndị isi nchụàjà na ndị Farisii nyere iwu ka onye ọ bụla matara ebe ọ nọ mee ka ha mara, ka ha wee jide ya.

12 Mgbe ọ fọrọ ụbọchị isii ka e mee Ememme Ngabiga, Jizọs rutere Betani, bụ́ ebe Lazarọs+ ahụ ọ kpọlitere n’ọnwụ bi. 2 E wee meere ya oriri anyasị n’ebe ahụ. Mata nọ na-eje ozi.+ Ma Lazarọs so ná ndị ya na ha nọ na-eri ihe. 3 Meri wee were mmanụ na-esi ísì ọma dị otu paụnd* n’arọ tee Jizọs n’ụkwụ ma jiri ntutu isi ya hichaa ya ụkwụ. Mmanụ ahụ bụ ezigbo mmanụ nad,* ọ dịkwa oké ọnụ. Ísì mmanụ ahụ wee ju n’ụlọ ahụ.+ 4 Ma Judas Iskarịọt,+ otu n’ime ndị na-eso ụzọ ya, onye na-aga ịrara ya nye, sịrị: 5 “Gịnị mere na e reghị mmanụ a na-esi ísì ọma narị mkpụrụ ego dinarịọs* atọ (300) ma nye ya ndị ogbenye?” 6 Ma, ihe mere o ji kwuo ihe a abụghị na ihe banyere ndị ogbenye na-emetụ ya n’obi, kama ọ bụ maka na ọ bụ onye ohi. Ọ bụ ya na-eji igbe ego, ọ na-ewerekwa ego e tinyere na ya. 7 Jizọs sịrị: “Hapụnụ ya, ka o mee ihe a iji kwadebe ahụ́ m maka ụbọchị a ga-eli m.+ 8 N’ihi na unu na ndị ogbenye nọ mgbe niile,+ ma mụ na unu agaghị anọ mgbe niile.”+

9 Ma, ọtụtụ ndị Juu matara na Jizọs nọ n’ebe ahụ. Ha wee bịa ọ bụghị naanị ka ha hụ ya, kama ka ha hụkwa Lazarọs, onye ọ kpọlitere n’ọnwụ.+ 10 Ndị isi nchụàjà wee gbaa izu igbukwa Lazarọs, 11 n’ihi na ọ bụ maka ya ka ọtụtụ ndị Juu ji na-aga n’ebe ahụ ma na-enwe okwukwe na Jizọs.+

12 N’echi ya, ìgwè mmadụ ndị bịara ememme ahụ nụrụ na Jizọs na-abịa Jeruselem. 13 Ha wee chịrị igu nkwụ gawa izute ya. Ha malitekwara iti mkpu, sị: “Biko, zọpụta ya! Onye ahụ nke na-abịa n’aha Jehova*+ bụ onye a gọziri agọzi. Ọ bụ Eze Izrel!”+ 14 Mgbe Jizọs hụrụ otu nwa jakị, ọ nọkwasịrị na ya,+ otú ahụ e dere, sị: 15 “Atụla egwu, Zayọn.* Lee, Eze gị na-abịa. Ọ nọkwasịrị na nwa jakị.”+ 16 Ndị na-eso ụzọ ya aghọtaghị ihe ndị a na mbụ. Ma mgbe e mere ka Jizọs dị ebube,+ ha chetara na e dere ihe ndị a banyere ya, chetakwa na ha meere ya ihe ndị a.+

17 Ìgwè mmadụ ndị hụrụ mgbe Jizọs si n’ili*+ kpọlite Lazarọs n’ọnwụ nọ na-akọrọ ndị ọzọ ihe merenụ.+ 18 Ọ bụkwa ya mere ìgwè mmadụ ji gakwuru ya n’ihi ọrụ ebube a ha nụrụ na ọ rụrụ.* 19 Ndị Farisii wee gwa ibe ha, sị: “Unu ahụla na e nweghị ebe unu ji azụ aga. Lee, ụwa niile esorola ya.”+

20 E nwere ụfọdụ ndị Grik so ná ndị bịara ife Chineke n’ememme ahụ. 21 Ha bịakwutere Filip+ onye Betsaịda, nke dị na Galili, malite ịrịọ ya, sị: “Nna anyị ukwu, anyị chọrọ ịhụ Jizọs.” 22 Filip bịara kọọrọ Andru, Andru na Filip abịa kọọrọ Jizọs.

23 Ma Jizọs sịrị ha: “Oge eruola ka e mee ka Nwa nke mmadụ dị ebube.+ 24 N’eziokwu, ana m asị unu na ọ bụrụ na otu mkpụrụ ọka wit adaghị n’ala ree,* ọ ka bụ otu mkpụrụ ọka. Ma ọ bụrụ na o ree,*+ ọ na-amị ọtụtụ mkpụrụ. 25 Onye ọ bụla hụrụ ndụ* ya n’anya na-ebibi ya. Ma onye ọ bụla kpọrọ ndụ* ya asị+ n’ụwa a ga-echebe ya ka o wee nweta ndụ ebighị ebi.+ 26 Ọ bụrụ na onye ọ bụla ga-ejere m ozi, ya sowe m. Ebe m nọ ka onye ozi m ga-anọkwa.+ Ọ bụrụ na onye ọ bụla ga-ejere m ozi, Nna m ga-eme ka o nwee ùgwù. 27 E nwere ihe na-echegbu m* ugbu a.+ Gịnịkwa ka m ga-ekwu? Nna, zọpụta m n’awa a.+ Ma, ọ bụ n’ihi awa a mere m ji bịa. 28 Nna, mee ka aha gị dị ebube.” Otu olu+ wee si n’eluigwe kwuo, sị: “Emeela m ka ọ dị ebube, m ga-emekwa ka ọ dị ebube ọzọ.”+

29 Ìgwè mmadụ ndị guzo n’ebe ahụ nụrụ ya wee malite ikwu na ọ bụ égbè eluigwe gbara. Ndị ọzọ sịrị: “Mmụọ ozi agwala ya okwu.” 30 Jizọs sịrị: “Olu a kwuru okwu abụghị n’ihi m, kama ọ bụ n’ihi unu. 31 A na-ekpe ụwa a ikpe ugbu a. Ugbu a, a ga-achụpụ+ onye na-achị ụwa a.+ 32 Ma ọ bụrụ na e si n’ụwa wegoo m n’elu,*+ m ga-adọta ụdị mmadụ niile n’ebe m nọ.” 33 N’eziokwu, ọ nọ na-ekwu ihe a iji gosi ụdị ọnwụ ọ ga-anwụ n’oge na-adịghị anya.+ 34 Ìgwè mmadụ ahụ wee sị ya: “Iwu* kwuru na Kraịst ga-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.+ Oleekwanụ otú i si na-asị na a ga-ewego Nwa nke mmadụ n’elu?*+ Ònye ka Nwa nke mmadụ a bụ?” 35 Jizọs wee sị ha: “Ìhè ahụ ga-anọtụkwu n’etiti unu. Na-ejegharịnụ n’ìhè ahụ mgbe unu ka nwere ya, ka ọchịchịrị ghara ikpuchi unu. Onye na-ejegharị n’ọchịchịrị anaghị ama ebe ọ na-aga.+ 36 Nweenụ okwukwe n’ìhè ahụ mgbe unu ka nwere ya, ka unu wee bụrụ ụmụ nke ìhè.”+

Jizọs kwuru ihe ndị a, gazie zoo ka ha ghara ịhụ ya. 37 N’agbanyeghị na ọ rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube* n’ihu ha, ha enweghị okwukwe na ya, 38 ka e wee mezuo ihe Aịzaya onye amụma kwuru, sị: “Jehova,* ònye nwere okwukwe n’ihe a nụrụ n’ọnụ anyị?*+ Ònyekwa ka Jehova* mere ka ọ mara ike* ya?”+ 39 Ihe mere na ha enweghị ike ikwere bụ na Aịzaya kwukwara, sị: 40 “O meela ka anya ha kpuo ìsì, meekwa ka obi ha kpọọ nkụ, ka ha ghara iji anya ha hụ ụzọ, gharakwa iji obi ha ghọta ihe ma gbanwee,* mụ agwọọ ha.”+ 41 Aịzaya kwuru ihe ndị a n’ihi na ọ hụrụ ebube Kraịst wee kwuo banyere ya.+ 42 Ma, ọtụtụ n’ime ndị isi ndị Juu nwedịrị okwukwe na ya.+ Ma ha anaghị ekwupụta ya n’ihi ndị Farisii, ka a ghara ịchụpụ ha n’ụlọ nzukọ ha,+ 43 n’ihi na ha chọrọ otuto si n’aka mmadụ karịadị otuto si n’aka Chineke.+

44 Ma, Jizọs kwuru n’olu dara ụda, sị: “Onye ọ bụla nwere okwukwe na m nwere okwukwe, ọ bụghị naanị na m, kamakwa n’onye zitere m.+ 45 Onye ọ bụla na-ahụ m na-ahụkwa Onye zitere m.+ 46 Abịara m n’ụwa dị ka ìhè,+ ka onye ọ bụla nke nwere okwukwe na m ghara ịnọgide n’ọchịchịrị.+ 47 Ma, ọ bụrụ na onye ọ bụla anụ okwu m, ma ọ naghị eme ya eme, anaghị m ekpe ya ikpe, n’ihi na abịara m ịzọpụta ụwa, ọ bụghị ikpe ụwa ikpe.+ 48 Onye ọ bụla na-eleda m anya ma ghara ịnabata ihe m na-ekwu nwere onye ga-ekpe ya ikpe. Ọ bụ okwu m kwuru ga-ekpe ya ikpe n’ụbọchị ikpeazụ. 49 N’ihi na e nweghị ihe m kwuru bụ́ uche m, kama Nna m, onye zitere m, gwara m* ihe m ga-ekwu na ihe m ga-akụzi.+ 50 Amakwa m na iwu ya na-enye ndụ ebighị ebi.+ N’ihi ya, ihe ọ bụla m na-ekwu, m na-ekwu ya otú Nna m gwara m ya.”+

13 Tupu Ememme Ngabiga eruo, Jizọs ma na oge ọ ga-ahapụ ụwa lakwuru Nna ya eruola.+ Ebe ọ bụ na ọ hụrụ ndị nke ya nọ n’ụwa n’anya, ọ hụrụ ha n’anya ruo ọgwụgwụ.+ 2 Ha nọ na-eri nri anyasị, ma Ekwensu etinyela n’obi Judas Iskarịọt,+ nwa Saịmọn, ka ọ rara Jizọs nye.+ 3 Ebe ọ bụ na Jizọs ma na Nna ya enyefeela ya ihe niile n’aka, marakwa na ya si n’ebe Chineke nọ bịa, na-alakwurukwa Chineke,+ 4 o biliri ka ha na-eri nri anyasị ahụ ma chịsa uwe elu ya n’akụkụ. O wee chịrị ákwà e ji ehicha ahụ́ kee n’úkwù.+ 5 Ọ gbanyeziri mmiri n’efere malite ịsa ụkwụ ndị na-eso ụzọ ya, jirikwa ákwà ahụ o kere n’úkwù na-ehicha ha ụkwụ. 6 Mgbe o rutere n’ebe Saịmọn Pita nọ, ọ sịrị ya: “Onyenwe anyị, ị̀ na-achọ ịsa m ụkwụ?” 7 Jizọs zara ya, sị: “Ugbu a, ị gaghị aghọta ihe m na-eme. Ma e mechaa, ị ga-aghọta ya.” 8 Pita sịrị ya: “E nweghị ihe ga-eme ka ị saa m ụkwụ.” Jizọs wee sị ya: “Ọ bụrụ na asaghị m gị ụkwụ,+ e nweghị ihe jikọrọ mụ na gị.” 9 Saịmọn Pita sịziri ya: “Onyenwe anyị, ọ bụghị naanị ụkwụ m ka ị ga-asa, kama ị ga-asakwu aka m na isi m.” 10 Jizọs wee sị ya: “Onye ọ bụla sara ahụ́ dị ọcha, e kwesịghịkwa ịsa ya ebe ọzọ ma e wepụ ụkwụ ya. Unu dịkwa ọcha, ma ọ bụghị unu niile.” 11 Ọ ma onye na-arara ya nye.+ Ọ bụ ya mere o ji sị: “Ọ bụghị unu niile dị ọcha.”

12 Mgbe ọ sachara ha ụkwụ ma yiri uwe elu ya, ọ nọdụrụ ala ọzọ na tebụl, sị ha: “Ùnu ma ihe m meere unu? 13 Unu na-akpọ m ‘Onye Ozizi’ na ‘Onyenwe anyị.’ Ihe unu na-akpọ m ziri ezi maka na ọ bụ ihe m bụ.+ 14 N’ihi ya, ọ bụrụ na mụnwa, bụ́ Onye Ozizi na Onyenwe unu, sara ụkwụ unu,+ unu kwesịkwara* ịsa ụkwụ ibe unu.+ 15 N’ihi na m na-egosi unu ihe unu ga na-eme, ka unu wee na-eme otú m meere unu.+ 16 N’eziokwu, ana m asị unu na ohu anaghị aka nna ya ukwu, onye ozi anaghịkwa aka onye zitere ya. 17 Ọ bụrụ na unu ma ihe ndị a, unu ga-enwe obi ụtọ ma unu na-eme ha.+ 18 Anaghị m ekwu banyere unu niile. Ama m ndị m họọrọ. Kama ọ bụ ka ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ mezuo, nke sịrị:+ ‘Onye na-eri nri m na-emegidezi m.’*+ 19 Ugbu a, ana m agwa unu ihe a tupu ya emee, ka unu wee kwere na ọ bụ m bụ ya mgbe ọ ga-eme.+ 20 N’eziokwu, ana m asị unu na onye na-anabata onye ọ bụla m zitere na-anabata m.+ Onye na-anabatakwa m na-anabata Onye zitere m.”+

21 Mgbe Jizọs kwuchara ihe ndị a, obi jọrọ ya njọ.* O wee gbaa àmà, sị: “N’eziokwu, ana m asị unu na otu onye n’ime unu ga-arara m nye.”+ 22 Ndị na-eso ụzọ ya malitere ilerịta ibe ha anya n’ihi na ha amaghị onye ọ na-ekwu maka ya.+ 23 Otu n’ime ha, onye Jizọs hụrụ n’anya,+ nọ Jizọs nso* na-eri ihe. 24 N’ihi ya, Saịmọn Pita kweere onye a n’isi, sị ya: “Gwa anyị onye ọ na-ekwu maka ya.” 25 Onye a wee dalaa azụ dabere n’obi Jizọs ma sị ya: “Onyenwe anyị, ọ̀ bụ onye?”+ 26 Jizọs zara, sị: “Ọ bụ onye m ga-enye ibé achịcha m na-esuru.”+ Mgbe o suuru achịcha ahụ, o weere ya nye Judas, nwa Saịmọn Iskarịọt. 27 Mgbe Judas natachara ya ibé achịcha ahụ, Setan banyere n’ime ya.+ Jizọs wee sị ya: “Ihe ị na-eme, mee ya ọsọ ọsọ.” 28 Ma, o nweghị onye ọ bụla n’ime ndị nọ na tebụl ma ihe mere o ji gwa ya ihe a. 29 N’eziokwu, ụfọdụ chere na ebe ọ bụ Judas na-eji igbe ego,+ na Jizọs na-agwa ya ka ọ zụta ihe ndị dị ha mkpa maka ememme ahụ ma ọ bụ ka o nye ndị ogbenye ihe. 30 Mgbe Judas natachara ibé achịcha ahụ, ọ pụrụ ozugbo. Ọ bụkwa n’abalị.+

31 Mgbe ọ pụrụ, Jizọs sịrị: “Ugbu a, e meela ka Nwa nke mmadụ dị ebube,+ e meekwala ka Chineke dị ebube n’ihi Okpara ya. 32 Chineke ga-eme ka ọ dị ebube,+ ọ ga-emekwa ka ọ dị ebube ozugbo. 33 Ụmụntakịrị, mụ na unu ga-anọkwu obere oge. Unu ga-achọ m. Ma ihe m gwara ndị Juu, ka m na-agwakwa unu ugbu a, sị, ‘Unu enweghị ike ịbịa n’ebe m na-aga.’+ 34 Ana m enye unu iwu ọhụrụ, ka unu hụ ibe unu n’anya. Otú m hụrụ unu n’anya,+ hụnụ ibe unu n’anya otú ahụ.+ 35 Ọ bụrụ na unu hụrụ ibe unu n’anya, mmadụ niile ga-eji ya mata na unu bụ ndị na-eso ụzọ m.”+

36 Saịmọn Pita sịrị ya: “Onyenwe anyị, olee ebe ị na-aga?” Jizọs zara, sị: “I nweghị ike iso m ugbu a gaa ebe m na-aga, ma ị ga-eso m ma e mechaa.”+ 37 Pita sịrị ya: “Onyenwe anyị, gịnị mere na enweghị m ike iso gị ugbu a? M ga-enye ndụ* m n’ihi gị.”+ 38 Jizọs wee sị ya: “Ị̀ ga-enye ndụ* gị n’ihi m? N’eziokwu, ana m asị gị na oké ọkpa agaghị akwa ruo mgbe ị gọnahụrụ m ugboro atọ.”+

14 “Obi alọla unu mmiri.+ Nweenụ okwukwe na Chineke,+ nweekwanụ okwukwe na m. 2 N’ụlọ Nna m, e nwere ọtụtụ ebe obibi. Ma ọ́ bụghị ya, m gaara agwa unu n’ihi na m na-aga ịkwadebere unu ebe.+ 3 Ọ bụrụkwa na mụ agaa kwadebere unu ebe, m ga-abịa ọzọ, m ga-anabatakwa unu n’ebe m nọ, ka unu wee nọrọ n’ebe m nọ.+ 4 Unu ma ụzọ ebe m na-aga.”

5 Tọmọs+ sịrị ya: “Onyenwe anyị, anyị amaghị ebe ị na-aga. Olee otú anyị ga-esi mara ụzọ ya?”

6 Jizọs sịrị ya: “Ọ bụ m bụ ụzọ+ na eziokwu+ na ndụ.+ E nweghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ bụrụ na o sighị na m.+ 7 A sị na unu ma m, unu gaara amakwa Nna m. Si ugbu a gawa, unu amarala ya, unu ahụkwala ya.”+

8 Filip wee sị ya: “Onyenwe anyị, gosi anyị Nna ahụ, ọ ga-ezuru anyị.”

9 Jizọs sịrị ya: “Filip, ọ̀ bụ na ị mabeghị m n’agbanyeghị na mụ na unu anọọla ogologo oge otú a? Onye ọ bụla hụrụ m ahụla Nna m.+ Gịnị mere i ji asị, ‘Gosi anyị Nna ahụ’? 10 Ọ̀ bụ na i kweghị na mụ na Nna m dị n’otu nakwa na Nna m na mụnwa dị n’otu?+ Ihe ndị m na-agwa unu abụghị uche m,+ kama Nna m nke mụ na ya dị n’otu si n’aka m na-arụ ọrụ ya. 11 Kwerenụ ihe m na-ekwu mgbe m sịrị na mụ na Nna m dị n’otu nakwa na Nna m na mụnwa dị n’otu. Ma ọ bụrụ na unu ekweghị ihe m na-ekwu, jirinụ maka ọrụ ndị m na-arụ kwere.+ 12 N’eziokwu, ana m asị unu na onye ọ bụla nwere okwukwe na m, ọ ga-arụ ọrụ m na-arụ. Ọ ga-arụkwa ọrụ karịrị ọrụ ndị a+ n’ihi na m na-alakwuru Nna m.+ 13 Ihe ọ bụla unu rịọkwara n’aha m, m ga-eme ya, ka e wee si n’aka Ọkpara ahụ nye Nna m otuto.+ 14 Ọ bụrụ na unu arịọ ihe ọ bụla n’aha m, m ga-eme ya.

15 “Ọ bụrụ na unu hụrụ m n’anya, unu ga na-eme ihe m nyere n’iwu.+ 16 M ga-arịọkwa Nna m, ọ ga-enye unu ihe inyeaka* ọzọ ka ọ dịnyere unu ruo mgbe ebighị ebi,+ 17 ya bụ, mmụọ nke eziokwu,+ nke ụwa na-enweghị ike inweta n’ihi na ụwa anaghị ahụ ya, ọ maghịkwa ya.+ Unu ma ya n’ihi na ọ dị n’ime unu, ọ na-adịgidekwa n’ime unu. 18 Agaghị m ahapụ unu ka unu nọrọ ka ndị mmadụ nwụnahụrụ.* M ga-abịakwute unu.+ 19 N’oge na-adịghị anya, ụwa agaghị ahụ m ọzọ, ma unu ga-ahụ m.+ Ebe ọ bụ na m dị ndụ, unu ga-adịkwa ndụ. 20 N’ụbọchị ahụ, unu ga-ama na mụ na Nna m dị n’otu, unu na m adịrị n’otu, mụ na unu adịrịkwa n’otu.+ 21 Onye ọ bụla nabatara ihe m nyere n’iwu ma na-eme ha bụ onye hụrụ m n’anya. Onye ọ bụla hụrụ m n’anya, Nna m ga-ahụ ya n’anya. M ga-ahụkwa onye ahụ n’anya ma gosi ya onwe m nke ọma.”

22 Judas+ (ọ bụghị Judas Iskarịọt) wee sị ya: “Onyenwe anyị, gịnị mere i ji chọọ igosi anyị onwe gị nke ọma kama igosi ya ụwa?”

23 Jizọs zara ya, sị: “Ọ bụrụ na mmadụ hụrụ m n’anya, ọ ga na-eme ihe m kwuru,+ Nna m ga-ahụkwa ya n’anya, anyị ga-abịakwute ya, anyị na ya ebiri.+ 24 Onye ọ bụla na-ahụghị m n’anya anaghị eme ihe m kwuru. Okwu unu na-anụ abụghị nke m, kama ọ bụ nke Nna m, onye zitere m.+

25 “Agwala m unu ihe ndị a mgbe mụ na unu ka nọ. 26 Ma ihe inyeaka ahụ, bụ́ mmụọ nsọ, nke Nna m ga-ezite n’aha m, ga-akụziri unu ihe niile ma chetara unu ihe niile m gwara unu.+ 27 M na-ahapụrụ unu udo. M na-enye unu udo m.+ Anaghị m enye ya unu otú ụwa si enye ya. Obi alọla unu mmiri, unu atụkwala egwu. 28 Unu nụrụ na m sịrị unu, ‘M na-ala, m ga-alọghachikwutekwa unu.’ Ọ bụrụ na unu hụrụ m n’anya, unu ga-aṅụrị ọṅụ na m na-alakwuru Nna m n’ihi na Nna m ka m ukwuu.+ 29 Agwala m ya unu ugbu a tupu ya emee, ka unu wee kwere ma o mee.+ 30 Mụ na unu agakwaghị ekwu ọtụtụ okwu n’ihi na onye na-achị ụwa+ na-abịa. O nweghịkwa ike n’ebe m nọ.+ 31 Ma, ka ụwa wee mara na m hụrụ Nna m n’anya, m na-eme ihe niile otú Nna m nyere m iwu ka m mee.+ Bilienụ, ka anyị pụọ n’ebe a.

15 “Abụ m ezigbo osisi vaịn, ọ bụkwa Nna m na-elekọta ya. 2 Ọ na-ewepụ alaka ọ bụla dị na m nke na-anaghị amị mkpụrụ. Ọ na-eme ka nke ọ bụla na-amị mkpụrụ dị ọcha, ka o wee na-amịkwu mkpụrụ.+ 3 Okwu m gwara unu emeela ka unu dị ọcha.+ 4 Nọgidenụ n’ime m, m ga-anọgidekwa n’ime unu. Otú ahụ alaka na-enweghị ike ịmị mkpụrụ n’onwe ya ma ọ bụrụ na ọ dịgideghị n’osisi vaịn, ka unu na-enweghịkwa ike ịmị mkpụrụ ma ọ bụrụ na unu anọgideghị n’ime m.+ 5 Abụ m osisi vaịn. Unu bụ alaka ya. Onye ọ bụla nọgidere n’ime m, mụ anọgidekwa n’ime ya, ọ na-amị mkpụrụ dị ukwuu.+ N’ihi na e wepụ m, e nweghị ihe ọ bụla unu ga-emeli. 6 Ọ bụrụ na onye ọ bụla anọgideghị n’ime m, ọ ga-adị ka alaka a tụfuru atụfu, ọ na-akpọnwụkwa. Ndị mmadụ na-achịkọta alaka ndị ahụ ma wụba ha n’ime ọkụ, ha eree ọkụ. 7 Ọ bụrụ na unu anọgide n’ime m, okwu m adịgidekwa n’ime unu, rịọnụ ihe ọ bụla unu chọrọ, a ga-emekwara ya unu.+ 8 A na-enye Nna m otuto mgbe unu na-amị mkpụrụ dị ukwuu ma na-egosi na unu bụ ndị na-eso ụzọ m.+ 9 Otú Nna m hụrụ m n’anya+ ka m hụkwara unu n’anya. Na-emenụ ihe ga-eme ka m na-ahụ unu n’anya. 10 Ọ bụrụ na unu ana-eme ihe m nyere n’iwu, unu ga-abụ ndị m hụrụ n’anya, otú ahụ m mere ihe Nna m nyere n’iwu wee bụrụ onye ọ hụrụ n’anya.

11 “M gwara unu ihe ndị a ka unu wee nwee ọṅụ m na-enwe, ka e meekwa ka ọṅụ unu zuo ezuo.+ 12 Ihe m nyere unu n’iwu bụ ka unu hụ ibe unu n’anya otú m hụrụ unu n’anya.+ 13 E nweghị onye nwere ịhụnanya karịrị nke a, na mmadụ ga-enye ndụ* ya maka ndị enyi ya.+ 14 Unu bụ ndị enyi m ma ọ bụrụ na unu na-eme ihe m na-enye unu n’iwu.+ 15 Anaghịzi m akpọ unu ndị ohu n’ihi na ohu anaghị ama ihe nna ya ukwu na-eme. Kama ana m akpọ unu ndị enyi m n’ihi na m mere ka unu mara ihe niile m nụrụ n’ọnụ Nna m. 16 Ọ bụghị unu họọrọ m, kama ọ bụ m họọrọ unu. M họpụtara unu ka unu nọgide na-amị mkpụrụ, ka mkpụrụ unu dịgidekwa, ka Nna m wee nye unu ihe ọ bụla unu rịọrọ ya n’aha m.+

17 “Ihe ndị a ka m na-enye unu n’iwu, ka unu na-ahụ ibe unu n’anya.+ 18 Ọ bụrụ na ụwa akpọọ unu asị, maranụ na ọ kpọọla m asị tupu ya akpọọ unu asị.+ 19 A sị na unu bụ nke ụwa, ụwa gaara ahụ unu n’anya. Ma ebe ọ bụ na unu abụghị nke ụwa,+ kama m si n’ụwa họrọ unu, ọ bụ ya mere ụwa ji kpọọ unu asị.+ 20 Chetanụ okwu m gwara unu: Ohu anaghị aka nna ya ukwu. Ọ bụrụ na ha kpagburu m, ha ga-akpagbukwa unu.+ Ọ bụrụ na ha mere ihe m kwuru, ha ga-emekwa ihe unu kwuru. 21 Ma ha ga-eme unu ihe niile a n’ihi aha m n’ihi na ha amaghị Onye zitere m.+ 22 A sị na abịaghị m gwa ha okwu, ha agaraghị enwe mmehie.*+ Ma ugbu a, e nweghị otú ha ga-esi sị na ha enweghị mmehie.+ 23 Onye ọ bụla kpọrọ m asị kpọkwara Nna m asị.+ 24 A sị na e nwetụla onye rụrụ ọrụ ndị m rụrụ n’etiti ha, ha agaraghị enwe mmehie.*+ Ma ugbu a, ha ahụla m ma kpọọ mụ na Nna m asị. 25 Ma ihe a mere ka e wee mezuo ihe e dere n’Iwu* ha, nke sịrị: ‘Ha kpọrọ m asị n’agbanyeghị na e nweghị ihe m mere ha.’+ 26 M ga-esi n’ebe Nna m nọ zitere unu ihe inyeaka, bụ́ mmụọ nke eziokwu,+ nke na-esi n’ebe Nna m nọ abịa. Mgbe ọ bịara, ọ ga-agba àmà banyere m.+ 27 Unu ga-agbakwa àmà banyere m+ n’ihi na mụ na unu nọ site ná mmalite.

16 “Agwala m unu ihe ndị a ka unu ghara ịdapụ n’okwukwe.* 2 Ndị mmadụ ga-achụpụ unu n’ụlọ nzukọ.+ N’eziokwu, oge na-abịa mgbe ndị mmadụ ga-egbu unu+ ma chee na ha jeere Chineke ozi dị nsọ. 3 Ma, ha ga-eme ihe ndị a n’ihi na ha amatabeghị ma Nna m ma mụnwa.+ 4 Ma, agwala m unu ihe ndị a ka ọ ga-abụ oge ha ga-eme ruo, unu echeta na m gwara unu ha.+

“Agwaghị m unu ihe ndị a na mbụ maka na mụ na unu nọ. 5 Ma ugbu a, m na-alakwuru Onye zitere m,+ ma e nweghị otu onye n’ime unu jụrụ m, sị, ‘Ebee ka ị na-aga?’ 6 Ma ihe ndị a m gwara unu emeela ka obi jọọ unu njọ.+ 7 Ma, ana m agwa unu eziokwu, ọ bụ ka ihe dịrị unu ná mma mere m ji ala. N’ihi na ọ bụrụ na alaghị m, ihe inyeaka ahụ+ agaghị abịakwute unu. Ma ọ bụrụ na mụ alaa, m ga-ezitere unu ya. 8 Mgbe ọ ga-abịa, ọ ga-egosi ụwa ihe àmà doro anya gbasara mmehie, gbasara ezi omume nakwa gbasara ikpe: 9 nke mbụ, gbasara mmehie,+ n’ihi na ha enweghị okwukwe na m,+ 10 gbasara ezi omume, n’ihi na m na-alakwuru Nna m, unu agaghịzi ahụ m, 11 gbasara ikpe, n’ihi na e kpeela onye na-achị ụwa a ikpe.+

12 “M ka nwere ọtụtụ ihe m ga-agwa unu, ma unu enweghị ike ịghọta ha ugbu a. 13 Ma, mgbe ihe inyeaka ahụ ga-abịa, bụ́ mmụọ nke eziokwu,+ ọ ga-edu unu ka unu ghọta eziokwu niile, n’ihi na ọ gaghị ekwu ihe bụ́ uche ya. Kama ihe ndị ọ nụrụ ka ọ ga-ekwu, ọ ga-akọkwara unu ihe ndị ka ga-emenụ.+ 14 Ọ* ga-enye m otuto+ n’ihi na ọ ga-esi n’aka m nweta ihe ọ ga-akọrọ unu.+ 15 Ihe niile Nna m nwere bụ nke m.+ Ọ bụ ya mere m ji kwuo na ọ* na-esi n’aka m enweta ihe ọ na-akọrọ unu. 16 N’oge na-adịghị anya, unu agakwaghị ahụ m,+ n’oge na-adịghịkwa anya, unu ga-ahụ m.”

17 Ụfọdụ n’ime ndị na-eso ụzọ ya wee gwa ibe ha, sị: “Gịnị ka ihe a ọ na-agwa anyị pụtara, ‘N’oge na-adịghị anya, unu agaghị ahụ m, n’oge na-adịghịkwa anya, unu ga-ahụ m,’ nakwa, ‘n’ihi na m na-alakwuru Nna m’?” 18 Ha wee na-asị: “Gịnị ka ‘oge na-adịghị anya’ ọ na-ekwu pụtara? Anyị amaghị ihe ọ na-ekwu.” 19 Jizọs ma na ha chọrọ ịjụ ya ajụjụ, ya asị ha: “Ùnu na-ajụrịta ibe unu ajụjụ maka na m sịrị: ‘N’oge na-adịghị anya, unu agaghị ahụ m, n’oge na-adịghịkwa anya, unu ga-ahụ m’? 20 N’eziokwu, ana m asị unu na unu ga-ebe ákwá ma tie mkpu arịrị, ma ụwa ga-aṅụrị ọṅụ. Unu ga-eru uju, ma a ga-eme ka unu kwụsị iru uju, nwewezie ọṅụ.+ 21 Mgbe nwaanyị na-amụ nwa, ọ na-ahụju anya maka na oge ọ ga-amụ nwa eruola. Ma mgbe ọ mụpụtara nwa, ọ naghịzi echeta ahụhụ ọ tara n’ihi ọṅụ ọ na-enwe na ọ mụọla nwa n’ụwa. 22 Otú ahụ ka ọ dịkwa unu. Unu na-eru uju ugbu a. Ma mgbe m ga-ahụ unu ọzọ, ọṅụ ga-eju unu obi,+ e nweghịkwa onye ga-anapụ unu ọṅụ unu. 23 N’ụbọchị ahụ, unu agaghị ajụ m ajụjụ ọ bụla. N’eziokwu, ana m asị unu na ọ bụrụ na unu arịọ Nna m ihe ọ bụla,+ ọ ga-enye ya unu n’aha m.+ 24 Ruo ugbu a, unu arịọbeghị otu mkpụrụ ihe n’aha m. Rịọnụ, unu ga-anatakwa, ka e wee mee ka ọṅụ unu zuo ezuo.

25 “Eji m ihe atụ gwa unu ihe ndị a. Oge na-abịa mgbe m na-agakwaghị eji ihe atụ agwa unu okwu, kama m ga-akọrọ unu ihe banyere Nna m otú doro anya. 26 N’ụbọchị ahụ, unu ga-arịọ Nna m arịrịọ n’aha m. Ma, anaghị m ekwu na ọ bụ m ga-arịọrọ unu arịrịọ. 27 N’ihi na Nna m hụrụ unu n’anya maka na unu hụrụ m n’anya,+ unu ekwerekwala na m bịara ka onye nnọchiteanya Chineke.+ 28 Abịara m n’ụwa ka onye nnọchiteanya Nna m. Ugbu a, ana m ahapụ ụwa, ana m alakwurukwa Nna m.”+

29 Ndị na-eso ụzọ ya wee sị: “Ị na-ekwu okwu ugbu a otú doro anya, i jighịkwa ihe atụ ekwu ya. 30 Anyị amatala ugbu a na ị ma ihe niile, ọ dịghịkwa mkpa ka onye ọ bụla jụọ gị ajụjụ. Ọ bụ ya mere anyị ji kwere na i si n’ebe Chineke nọ bịa.” 31 Jizọs gwara ha, sị: “Ùnu ekwetala ugbu a? 32 Lee, oge na-abịa, n’eziokwu, o ruokwala, mgbe a ga-achụsasị unu, onye ọ bụla alaa n’ụlọ ya, unu ahapụkwa naanị m.+ Ma anọghị m naanị m n’ihi na Nna m nọnyeere m.+ 33 Agwala m unu ihe ndị a ka unu wee nwee udo n’ihi m.+ N’ụwa, a ga-akpagbu unu, ma nweenụ obi ike. Emeriela m ụwa.”+

17 Mgbe Jizọs kwuchara ihe ndị a, o leliri anya n’eluigwe, sị: “Nna, oge eruola. Mee ka ọkpara gị dị ebube, ka ọkpara gị wee mee ka ị dị ebube.+ 2 I nyela ya ikike n’ebe mmadụ* niile nọ,+ ka o wee nye ndị niile i nyere ya+ ndụ ebighị ebi.+ 3 Iji nweta ndụ ebighị ebi,+ ha ga-amata gị,* onye naanị ya bụ ezi Chineke,+ matakwa onye i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.+ 4 Emeela m ka ị dị ebube n’ụwa,+ ebe ọ bụ na arụchaala m ọrụ i nyere m ka m rụọ.+ 5 Ugbu a, Nna, mee ka m nwee ebube n’akụkụ gị, bụ́ ebube m nweburu n’akụkụ gị mgbe ụwa na-adịbeghị.+

6 “Emeela m ka ndị i si n’ụwa nye m mara aha gị.+ Ha bụ nke gị. Ọ bụ gị nyere m ha, ha na-emekwa ihe i kwuru.* 7 Ha amarala ugbu a na ihe niile i nyere m si n’aka gị 8 n’ihi na agwala m ha ihe ndị ị gwara m.+ Ha anabatala ha, ha amarakwala na m bịara ka onye nnọchiteanya gị.+ Ha ekwetala na ọ bụ gị zitere m.+ 9 M na-arịọ arịrịọ maka ha. M na-arịọ, ọ bụghị maka ụwa, kama maka ndị i nyere m n’ihi na ha bụ nke gị. 10 Ihe m niile bụ nke gị, ihe gị bụkwa nke m.+ E meekwala ka m dị ebube n’etiti ha.

11 “Anọghịzi m n’ụwa, ma ha nọ n’ụwa,+ m na-abịakwutekwa gị. Nna dị nsọ, chebe ha+ n’ihi aha gị nke i nyere m, ka ha wee bụrụ otu* otú anyị bụ otu.*+ 12 Mgbe mụ na ha nọ, m na-echebe ha+ n’ihi aha gị nke i nyere m. Echebere m ha. E nweghịkwa otu n’ime ha e bibiri+ ma e wepụ nwa mbibi ahụ,+ ka ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ wee mezuo.+ 13 Ma ugbu a, m na-abịakwute gị. M na-ekwukwa ihe ndị a n’ụwa ka ha wee nwee ọṅụ m na-enwe ma nwezuo ya enwezuo.+ 14 Agwala m ha okwu gị. Ma ụwa kpọrọ ha asị n’ihi na ha abụghị nke ụwa,+ otú m na-abụghị nke ụwa.

15 “Anaghị m arịọ ka ị kpọpụ ha n’ụwa, kama ka i chebe ha n’ihi ajọ onye ahụ.+ 16 Ha abụghị nke ụwa,+ otú m na-abụghị nke ụwa.+ 17 Jiri eziokwu doo ha nsọ.*+ Okwu gị bụ eziokwu.+ 18 Otú ahụ i zitere m n’ụwa ka m zipụkwara ha n’ụwa.+ 19 M na-edo onwe m nsọ n’ihi ha, ka e wee jirikwa eziokwu doo ha nsọ.

20 “M na-arịọ arịrịọ, ọ bụghị naanị maka ndị a, kamakwa maka ndị ga-enwe okwukwe na m n’ihi okwu ha, 21 ka ha niile wee bụrụ otu+ otú ahụ gịnwa, Nna, na mụnwa dị n’otu, mụ na gị adịrịkwa n’otu,+ ka anyị na ha wee dị n’otu, ka ụwa wee kwere na ọ bụ gị zitere m. 22 Enyela m ha otuto i nyere m, ka ha wee bụrụ otu otú anyị bụ otu.+ 23 Mụ na ha dị n’otu, gịnwa na mụnwa dịkwa n’otu, ka ha wee dịrị n’otu n’eziokwu, ka ụwa wee mara na ọ bụ gị zitere m, marakwa na ị hụrụ ha n’anya otú ị hụrụ m n’anya. 24 Nna, achọrọ m ka ndị i nyere m soro m nọrọ n’ebe m nọ,+ ka ha wee hụ ebube i nyere m n’ihi na ị hụrụ m n’anya tupu a tọọ ntọala ụwa.+ 25 Nna m Onye ezi omume, n’eziokwu, ụwa amatabeghị gị.+ Ma ama m gị,+ ndị a amarakwala na ọ bụ gị zitere m. 26 Emeela m ka ha mara aha gị, m ga-emekwa ka a mara ya,+ ka ha wee hụ ndị ọzọ n’anya otú ị hụrụ m n’anya, ka mụ na ha wee dị n’otu.”+

18 Mgbe Jizọs kwuchara ihe ndị a, ya na ndị na-eso ụzọ ya pụrụ gafee Ndagwurugwu Kidrọn*+ ma gaa n’ebe e nwere ubi. Ya na ndị na-eso ụzọ ya wee banye n’ubi ahụ.+ 2 Judas, onye ga-arara ya nye, makwa ebe ahụ n’ihi na Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya ezukọọla n’ebe ahụ ugboro ugboro. 3 Judas wee kpọrọ ìgwè ndị agha na ndị nche bịa n’ebe ahụ. Ọ bụ ndị isi nchụàjà na ndị Farisii zitere ndị nche a. Ha ji ọwa ọkụ na mpanaka* na ngwá ọgụ bịa.+ 4 Ebe Jizọs ma ihe niile ga-eme ya, ọ gakwuuru ha, sị ha: “Ònye ka unu na-achọ?” 5 Ha sịrị ya: “Ọ bụ Jizọs onye Nazaret.”+ O wee sị ha: “Ọ bụ m.” Judas, onye na-arara ya nye, so ha guzoro n’ebe ahụ.+

6 Ma mgbe Jizọs sịrị ha, “Ọ bụ m,” ha lara azụ daa n’ala.+ 7 O wee jụọ ha ọzọ, sị: “Ònye ka unu na-achọ?” Ha sịrị: “Jizọs onye Nazaret.” 8 Jizọs wee sị: “Agwara m unu na ọ bụ m. N’ihi ya, ọ bụrụ m ka unu na-achọ, hapụnụ ndị a ka ha laa.” 9 Ihe a mere ka ihe o kwuru mezuo, ya bụ: “N’ime ndị niile i nyere m, e nweghị otu onye funahụrụ m.”+

10 Saịmọn Pita ji mma agha. O wee mịrị ya gbuo ya ohu nnukwu onye nchụàjà ma bepụ ya ntị aka nri.+ Aha ohu ahụ bụ Makọs. 11 Ma Jizọs sịrị Pita: “Mịghachi mma agha ahụ n’ọbọ ya.+ Ọ̀ bụ na mụ ekwesịghị ịṅụ ihe dị n’iko Nna m bunyere m?”+

12 Ndị agha ahụ na ọchịagha ha na ndị nche ndị Juu wee jide Jizọs kee ya agbụ n’aka. 13 Ha bu ụzọ kpụgara ya Anas n’ihi na ọ bụ nna nwunye Kayafas. Ọ bụ Kayafas+ bụ nnukwu onye nchụàjà n’afọ ahụ.+ 14 N’eziokwu, ọ bụ Kayafas bụ onye gwara ndị Juu na ọ kaara ha mma ka otu onye nwụchitere ha ọnwụ.+

15 Saịmọn Pita nọ na-eso Jizọs, ya na onye ọzọ bụ́ onye na-eso ụzọ Jizọs.+ Nnukwu onye nchụàjà ma onye ahụ na-eso ụzọ Jizọs. Onye ahụ sooro Jizọs banye na mbara èzí nnukwu onye nchụàjà. 16 Ma Pita guzo n’èzí n’ọnụ ụzọ. Onye ahụ na-eso ụzọ Jizọs, onye nnukwu onye nchụàjà ma, gara gwa onye nche ọnụ ụzọ okwu wee kpọbata Pita. 17 Nwa agbọghọ na-eje ozi, onye na-eche ọnụ ụzọ ahụ nche, sịrị Pita: “Ọ̀ bụ na i soghị ná ndị na-eso ụzọ nwoke a?” O wee sị: “Esoghị m.”+ 18 Ndị ohu na ndị nche guzocha gburugburu ọkụ ha kwanyere. Ha nọ na-anya ọkụ maka na oyi na-atụ. Pita sokwa ha guzoro na-anya ọkụ.

19 Onyeisi nchụàjà wee jụọ Jizọs ajụjụ banyere ndị na-eso ụzọ ya na ihe ọ na-akụzi. 20 Jizọs sịrị ya: “Agwara m ndị mmadụ okwu n’ihu ọha. M kụziri ihe mgbe niile n’ụlọ nzukọ nakwa n’ụlọ nsọ,+ bụ́ ebe ndị Juu niile na-ezukọ. E nweghịkwa ihe m kwuru na nzuzo. 21 Gịnị mere i ji ajụ m ajụjụ? Jụọ ndị nụrụ ihe m gwara ha. Ha ma ihe m kwuru.” 22 Mgbe o kwuchara ihe ndị a, otu n’ime ndị nche guzo nso n’ebe ahụ mara Jizọs ụra n’ihu+ ma sị ya: “Ọ̀ bụ otú a ka i si aza onyeisi nchụàjà ajụjụ?” 23 Jizọs zara ya, sị: “Ọ bụrụ na m kwuru ihe ọjọọ, gbaa akaebe na m kwuru ihe ọjọọ. Ma ọ bụrụ na ihe m kwuru ziri ezi, gịnị mere i ji tie m ihe?” 24 Anas wee kwuo ka a kpụgara ya Kayafas, nnukwu onye nchụàjà. Jizọs ka bukwa agbụ e kere ya n’aka mgbe a kpụ ya gawa.+

25 Saịmọn Pita guzo na-anya ọkụ. Ha wee sị ya: “Ọ̀ bụ na i soghị ná ndị na-eso ụzọ ya?” Ọ gọrọ agọ, sị: “Esoghị m.”+ 26 Otu n’ime ndị ohu nnukwu onye nchụàjà, bụ́ onye ikwu nwoke ahụ Pita bepụrụ ntị,+ sịrị: “Ọ̀ bụ na mụ ahụghị gị na ya n’ubi ahụ?” 27 Ma Pita gọrọ agọ ọzọ. Ozugbo ahụ, oké ọkpa kwara.+

28 Ha wee kpụrụ Jizọs si n’ụlọ Kayafas gaa n’ụlọ gọvanọ.+ Ọ bụzi isi ụtụtụ. Ma, ha abanyeghị n’ụlọ gọvanọ ka ha ghara imerụ onwe ha,+ ka ha nwee ike iri nri Ememme Ngabiga. 29 Paịlet wee bịakwute ha n’èzí, sị: “Olee ihe ọjọọ unu sị na nwoke a mere?” 30 Ha zara ya, sị: “A sị na nwoke a anaghị eme ihe ọjọọ, anyị agaraghị enyefe ya n’aka gị.” 31 Paịlet wee sị ha: “Kpọrọnụ ya, kpeenụ ya ikpe otú iwu unu kwuru.”+ Ndị Juu sịrị ya: “E nyeghị anyị ikike igbu onye ọ bụla.”+ 32 Ihe a bụ ka e wee mezuo ihe Jizọs kwuru gbasara ụdị ọnwụ ọ ga-anwụ n’oge na-adịghị anya.+

33 Paịlet banyere ọzọ n’ụlọ ya* ma kpọọ Jizọs, sị ya: “Ị̀ bụ Eze ndị Juu?”+ 34 Jizọs zara ya, sị: “Ọ̀ bụ gị chepụtara ajụjụ a ị jụrụ m, ka ọ̀ bụ ndị ọzọ gwara gị banyere m?” 35 Paịlet sịrị: “Àbụ m onye Juu? Ọ bụ ndị obodo unu na ndị isi nchụàjà nyefere gị n’aka m. Gịnị ka i mere?” 36 Jizọs zara,+ sị: “Alaeze m abụghị nke ụwa a.+ A sị na Alaeze m bụ nke ụwa a, ndị na-ejere m ozi gaara alụ ọgụ ka a ghara inyefe m n’aka ndị Juu.+ Ma, Alaeze m esighị n’ebe a.” 37 Paịlet wee sị ya: “Ma, ị̀ bụnụ eze?” Jizọs zara, sị: “Ọ bụ gị na-ekwu na m bụ eze.*+ Ọ bụ ihe a mere e ji mụọ m, ọ bụkwa ihe a mere m ji bịa n’ụwa, ka m wee gbaara eziokwu àmà.+ Onye ọ bụla nke dịnyeere eziokwu na-ege m ntị.” 38 Paịlet sịrị ya: “Gịnị bụ eziokwu?”

Mgbe o kwuchara ihe a, ọ gakwuuru ndị Juu ọzọ, sị ha: “O nweghị ihe ọjọọ m hụrụ o mere.+ 39 Omenala unu bụkwa na m ga-ahapụrụ unu otu onye n’oge Ememme Ngabiga.+ Ùnu chọrọnụ ka m hapụrụ unu Eze ndị Juu?” 40 Ha wee tie mkpu ọzọ, sị: “Ahapụla nwoke a, kama hapụrụ anyị Barabas!” Ma, Barabas bụ onye ohi.+

19 Paịlet wee kpọrọ Jizọs pịa ya ihe.+ 2 Ndị agha ji ogwu kpaa okpueze ma kpuwe ya Jizọs n’isi. Ha yiwekwara ya uwe na-acha pọpụl.+ 3 Ha wee na-abịakwute ya, na-asị: “Eze ndị Juu, ndeewo.” Ha nọkwa na-ama ya ụra n’ihu.+ 4 Paịlet pụrụ n’èzí ọzọ, sị ha: “Lee, m na-akpọpụtara unu ya n’èzí ka unu mara na e nweghị ihe ọjọọ m hụrụ o mere.”+ 5 Jizọs wee pụta n’èzí. O kpu okpueze ahụ e ji ogwu kpaa, yirikwa uwe elu ahụ na-acha pọpụl. Paịlet sịrị ha: “Leenụ nwoke ahụ!” 6 Ma, mgbe ndị isi nchụàjà na ndị nche hụrụ ya, ha tiri mkpu, sị: “Kwụwa ya n’osisi! Kwụwa ya n’osisi!”*+ Paịlet wee sị ha: “Kpọrọnụ ya, jirinụ aka unu gbuo ya* n’ihi na e nweghị ihe ọjọọ m hụrụ o mere.”+ 7 Ndị Juu wee sị ya: “Anyị nwere iwu. Iwu ahụ kwukwara na o kwesịrị ịnwụ+ n’ihi na o mere onwe ya ọkpara Chineke.”+

8 Mgbe Paịlet nụrụ ihe ha na-ekwu, ụjọ tụkwuru ya. 9 O wee banye ọzọ n’ụlọ ya* ma sị Jizọs: “Ebee ka i si bịa?” Ma Jizọs azaghị ya ihe ọ bụla.+ 10 Paịlet wee sị ya: “Ị́ chọghị ịtụpụrụ m ọnụ? Ọ̀ bụ na ị maghị na m nwere ikike ịhapụ gị, nweekwa ikike igbu gị?”* 11 Jizọs zara ya, sị: “Ị gaghị enwe ikike ime m ihe ọ bụla ma ọ bụrụ na e sighị n’elu nye gị ya. Ọ bụ ya mere mmehie onye nyefere m n’aka gị ji ka nke gị.”

12 N’ihi ya, Paịlet chọwara otú ọ ga-esi hapụ ya. Ma ndị Juu tiri mkpu, sị: “Ọ bụrụ na ị hapụ nwoke a, ị bụghị enyi Siza. Onye ọ bụla na-eme onwe ya eze na-ekwugide* Siza.”+ 13 Mgbe Paịlet nụchara ihe ha kwuru, ọ kpọpụtara Jizọs n’èzí ma nọdụ ala n’oche ikpe dị n’ebe e ji nkume wụọ ala ya. A na-akpọ ebe ahụ Gabata n’asụsụ Hibru. 14 Ọ bụ ụbọchị e ji akwadebe Ememme Ngabiga.*+ Ọ bụ n’ihe dị ka awa nke isii.* O wee gwa ndị Juu, sị: “Leenụ eze unu!” 15 Ma ha tiri mkpu, sị: “Kpọrọ ya pụọ! Kpọrọ ya pụọ! Kwụwa ya n’osisi!”* Paịlet sịrị ha: “Ọ̀ bụ m gbuo eze unu?” Ndị isi nchụàjà wee sị: “Anyị enweghị eze ọ bụla ma ọ́ bụghị Siza.” 16 O nyefeziri Jizọs n’aka ha ka e gbuo ya n’elu osisi.+

Ha wee kpọrọ ya pụọ. 17 Jizọs buuru osisi ịta ahụhụ* gawa ebe a na-akpọ Ebe Okpokoro Isi.+ A na-akpọ ya Gọlgọta n’asụsụ Hibru.+ 18 Ha kpọgidere ya n’osisi n’ebe ahụ,+ ya na ụmụ nwoke abụọ ọzọ. Otu onye nọ ya n’otu akụkụ, onye nke ọzọ anọrọ n’akụkụ ya nke ọzọ, Jizọs anọrọ n’etiti.+ 19 E nwekwara ihe Paịlet dere ma kụgide ya n’osisi ịta ahụhụ* ahụ. Ihe o dere bụ: “Jizọs onye Nazaret, Eze ndị Juu.”+ 20 Ọtụtụ ndị Juu gụrụ ihe ahụ o dere n’ihi na ebe a kpọgidere Jizọs n’osisi dị nso n’obodo. E dere ya n’asụsụ Hibru, n’asụsụ Latịn, nakwa n’asụsụ Grik. 21 Ma, ndị isi nchụàjà ndị Juu gwara Paịlet, sị: “Edela ‘Eze ndị Juu,’ kama dee na ọ sịrị, ‘Abụ m Eze ndị Juu.’” 22 Paịlet wee sị: “Edeela m ihe m dere.”

23 Mgbe ndị agha ahụ kpọgidere Jizọs n’osisi, ha chịịrị uwe elu ya ma kee ya ụzọ anọ, otu ụzọ maka otu onye agha. Ha chịkwaara uwe ime ya. Ma uwe ime ya enweghị ebe a dụkọtara ya n’ihi na a kpara ya akpa si n’elu ruo n’ala. 24 Ha gwara ibe ha, sị: “Ka anyị ghara ịdọwa ya adọwa, kama ka anyị fee nza iji mata onye ọ ga-abụ nke ya.”+ Ihe a bụ ka e wee mezuo ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ, nke sịrị: “Ha kere uwe m, ha fekwaara uwe m nza.”+ Ndị agha ahụ mere ihe ndị a n’eziokwu.

25 Ma nne Jizọs,+ nwanne nne Jizọs nke nwaanyị, Meri nwunye Klopas, na Meri Magdalin+ guzo n’akụkụ osisi ịta ahụhụ* Jizọs. 26 Mgbe Jizọs hụrụ nne ya na onye na-eso ụzọ ya ọ hụrụ n’anya+ ka ha guzo nso, ọ sịrị nne ya: “Nwaanyị, lee nwa gị.” 27 Ọ gwakwara onye ahụ na-eso ụzọ ya, sị: “Lee nne gị.” Malite n’oge ahụ gawa, onye ahụ na-eso ụzọ ya kpọọrọ ya laa n’ụlọ ya.

28 Mgbe ihe a mechara, Jizọs ma ugbu a na ihe niile emechaala. O wee sị: “Mmiri na-agụ m.”+ O kwuru ihe a ka ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ mezuo. 29 Otu ite nke mmanya gbara ụka juru dọ n’ebe ahụ. Ha wee tinye ogbo na mmanya ahụ gbara ụka, tụkwasị ya n’okporo osisi hisop,* welie ya elu ka o ruo ya n’ọnụ.+ 30 Mgbe Jizọs detụrụ mmanya ahụ gbara ụka ọnụ, ọ sịrị: “E mechaala ya.”+ O hulataziri isi kubie ume.+

31 Ebe ọ bụ ụbọchị e ji akwadebe maka Ụbọchị Izu Ike,+ ndị Juu achọghị ka ozu ha dịrị n’elu osisi ịta ahụhụ+ n’Ụbọchị Izu Ike (n’ihi na Ụbọchị Izu Ike ahụ bụ nke ukwu).+ N’ihi ya, ha rịọrọ Paịlet ka a kụjisịa ha ụkwụ ma bupụ ozu ha. 32 Ndị agha ahụ wee bịa kụjisịa ụkwụ onye nke mbụ nakwa ụkwụ onye nke abụọ a kpọgidere ha na Jizọs n’osisi. 33 Ma mgbe ha rutere n’ebe Jizọs nọ, ha hụrụ na ọ nwụọla. N’ihi ya, ha akụjisịghị ya ụkwụ. 34 Ma otu n’ime ndị agha ahụ mara ya ube n’akụkụ.+ Ozugbo ahụ, ọbara na mmiri gbapụtara. 35 Ọ bụ onye hụrụ ihe ndị a gbara àmà a, àmà ya bụkwa eziokwu. Ọ makwa na ihe ọ na-ekwu bụ eziokwu, ka unu wee kwerekwa.+ 36 N’eziokwu, ihe ndị a mere ka e wee mezuo ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ, nke sịrị: “E nweghị ọkpụkpụ ya a ga-agbaji.”*+ 37 Ihe ọzọ e dere n’Akwụkwọ Nsọ bụ: “Ha ga-elegide onye ha mara ube anya.”+

38 Mgbe ihe ndị a mechara, Josef onye Arimatia rịọrọ Paịlet ka ya buru ozu Jizọs. Ọ bụ onye na-eso ụzọ Jizọs, ma ọ na-ezo ya ezo n’ihi na ọ na-atụ egwu ndị Juu.+ Paịlet wee nye ya ikike, ya abịa buru ozu Jizọs.+ 39 Nikọdimọs,+ onye bịakwuteburu Jizọs n’abalị, bịakwara. O wetara ngwugwu mea na ihe otite alo nke dị ihe dị ka otu narị paụnd* n’arọ.+ 40 Ha wee buru ozu Jizọs ma kee ya ákwà linin e tinyere ihe ndị ahụ na-esi ísì ọma,+ otú ndị Juu si akwadebe ozu a chọrọ ili. 41 E nwere ubi dị n’ebe ahụ e gburu ya.* N’ubi ahụ, e nwere otu ili* ọhụrụ+ a na-elitụbeghị onye ọ bụla na ya. 42 Ebe ọ bụ ụbọchị ndị Juu ji akwadebe ememme,+ ha liri Jizọs n’ebe ahụ n’ihi na ili ahụ dị nso.

20 N’ụbọchị mbụ n’izu, Meri Magdalin bịara n’ili* ahụ n’isi ụtụtụ+ mgbe ọchịchịrị ka gbara. O wee hụ na a kwapụla nkume e ji dọchie ili* ahụ.+ 2 Ọ gbaara ọsọ bịakwute Saịmọn Pita na onye ọzọ ahụ na-eso ụzọ Jizọs, onye Jizọs hụrụ n’anya.+ O wee sị ha: “Ha ebupụla Onyenwe anyị n’ili,+ anyị amaghịkwa ebe ha dọsara ya.”

3 Pita na onye ọzọ ahụ na-eso ụzọ Jizọs wee gawa n’ili ahụ. 4 Ha abụọ malitere ịgba ọsọ. Ma onye ọzọ ahụ na-eso ụzọ Jizọs gbanahụrụ Pita wee buru ụzọ rute n’ili ahụ. 5 O hulatara lee anya n’ili ahụ ma hụ ákwà linin ndị ahụ ka ha wụsa n’ebe ahụ.+ Ma ọ banyeghị. 6 Saịmọn Pita, onye so ya n’azụ, rutekwara. O wee banye n’ili ahụ hụ ákwà linin ndị ahụ ka ha wụsa n’ebe ahụ. 7 Ákwà e kere Jizọs n’isi adịghị n’ebe ákwà ndị nke ọzọ dị, kama a fụkọtara ya dosa naanị ya iche. 8 Onye ọzọ ahụ na-eso ụzọ Jizọs, onye bu ụzọ rute n’ili ahụ, banyeziri. O wee hụ ma kwere. 9 Ma ha aghọtabeghị ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ nke kwuru na Jizọs ga-esi n’ọnwụ bilie.+ 10 Ndị a na-eso ụzọ ya wee laghachi n’ụlọ ha.

11 Ma Meri guzo n’èzí n’akụkụ ili ahụ na-ebe ákwá. Ka ọ nọ na-ebe ákwá, o hulatara nyoba anya n’ili ahụ. 12 O wee hụ mmụọ ozi abụọ+ yi uwe ọcha ka ha nọ ọdụ n’ebe ozu Jizọs dịbu. Otu nọ n’ebe isi ya dịbu, otu anọrọ n’ebe ụkwụ ya dịbu. 13 Ha sịrị ya: “Nwaanyị, gịnị mere i ji na-ebe ákwá?” O wee sị ha: “Ha ebupụla Onyenwe m, amaghịkwa m ebe ha dọsara ya.” 14 Mgbe o kwuchara ihe a, ọ tụgharịrị hụ Jizọs ka o guzo n’ebe ahụ, ma ọ mataghị na ọ bụ Jizọs.+ 15 Jizọs sịrị ya: “Nwaanyị, gịnị mere i ji na-ebe ákwá? Ònye ka ị na-achọ?” Ebe o chere na ọ bụ onye na-elekọta ubi ahụ, ọ sịrị ya: “Nna anyị ukwu, ọ bụrụ na ọ bụ gị bupụrụ ya, gwa m ebe ị dọsara ya ka m gaa buru ya.” 16 Jizọs sịrị ya: “Meri.” Nwaanyị ahụ tụgharịrị sị ya n’asụsụ Hibru: “Rabonaị!” (nke pụtara “Onye Ozizi!”) 17 Jizọs wee sị ya: “Ejidezila m n’ihi na alakwurubeghị m Nna m. Kama gakwuru ụmụnna m,+ sị ha, ‘Ana m alakwuru Nna m+ na Nna unu nakwa Chineke m na Chineke unu.’”+ 18 Meri Magdalin bịara kọọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs, sị: “Ahụrụ m Onyenwe anyị.” Ọ gwakwara ha ihe Jizọs gwara ya.+

19 Mgbe chi jiwere n’ụbọchị ahụ, bụ́ ụbọchị mbụ n’izu, ndị na-eso ụzọ Jizọs zukọtara n’otu ụlọ ma kpọchie ọnụ ụzọ ya akpọchie n’ihi na ha na-atụ ndị Juu egwu. Ma, Jizọs bịara guzoro n’etiti ha, sị ha: “Udo dịrị unu.”+ 20 Mgbe o kwuchara ihe a, o gosiri ha aka ya na akụkụ ya.+ Ndị na-eso ụzọ ya wee ṅụrịa ọṅụ na ha hụrụ Onyenwe anyị.+ 21 Jizọs wee sị ha ọzọ: “Udo dịrị unu.+ Otú Nna m zitere m+ ka m na-ezigakwa unu.”+ 22 Mgbe o kwuchara ihe a, ọ fụrụ ha ikuku, sị ha: “Natanụ mmụọ nsọ.+ 23 Ọ bụrụ na unu agbaghara onye ọ bụla mmehie ya, a gbagharala ya. Ọ bụrụ na unu agbagharaghị onye ọ bụla mmehie ya, a gbagharabeghị ya.”

24 Ma Tọmọs,+ otu n’ime ndịozi ya iri na abụọ, bụ́ onye a na-akpọ Ejima, esoghị ha nọrọ mgbe Jizọs bịara. 25 Ndị ọzọ na-eso ụzọ Jizọs wee sị ya: “Anyị hụrụ Onyenwe anyị.” Ma ọ sịrị ha: “Ọ bụrụ na ahụghị m apa ntu n’aka ya, rụnyekwa mkpịsị aka m n’apa ntu ndị ahụ nakwa n’akụkụ ya,+ agaghị m ekweta.”

26 Mgbe ụbọchị asatọ gachara, ndị na-eso ụzọ ya zukọtara ọzọ n’ime ụlọ, Tọmọs sokwa ha nọrọ. N’agbanyeghị na a kpọchichara ụzọ akpọchi, Jizọs bịara ma guzoro n’etiti ha, sị: “Udo dịrị unu.”+ 27 Ọ sịziri Tọmọs: “Rụnye mkpịsị aka gị n’aka m, werekwa aka gị tinye n’akụkụ m. Kwụsị ịrụ ụka,* kama kweta.” 28 Tọmọs wee sị ya: “Onyenwe m na Chineke m.” 29 Jizọs sịrị ya: “Ọ̀ bụ maka na ị hụrụ m mere i ji ekweta? Ndị na-ahụghị ma kweta na-enwe obi ụtọ.”

30 N’eziokwu, Jizọs rụkwara ọtụtụ ọrụ ebube* ndị ọzọ n’ihu ndị na-eso ụzọ ya, bụ́ ndị a na-edeghị n’akwụkwọ mpịakọta a.+ 31 Ma e dere ihe ndị a ka unu wee kwere na Jizọs bụ Kraịst, Ọkpara Chineke, nakwa ka unu si n’aha ya nweta ndụ maka na unu kweere.+

21 Mgbe e mechara, Jizọs pụtara ọzọ n’ihu ndị na-eso ụzọ ya n’Oké Osimiri Taịbirias. Ọ bụ otú a ka o si gosi ha onwe ya. 2 Saịmọn Pita, Tọmọs (onye a na-akpọ Ejima),+ Nataniel+ onye Kena nke dị na Galili, ụmụ Zebedi,+ na mmadụ abụọ ọzọ na-eso ụzọ Jizọs nọ. 3 Saịmọn Pita sịrị ha: “Ana m aga igbu azụ̀.” Ha wee sị ya: “Anyị ga-eso gị gaa.” Ha pụrụ gaa banye n’ụgbọ mmiri. Ma o nweghị ihe ha gbutere n’abalị ahụ.+

4 Mgbe chi na-abọ, Jizọs guzo n’ikpere osimiri ahụ. Ma ndị na-eso ụzọ ya amataghị na ọ bụ ya.+ 5 Jizọs wee sị ha: “Ụmụntakịrị, ùnu nwere ihe ọ bụla* unu ga-eri?” Ha sịrị ya: “Mba.” 6 O wee sị ha: “Wụnyenụ ụgbụ n’akụkụ aka nri nke ụgbọ mmiri unu, unu ga-egbute azụ̀.” Ha wee wụnye ya, ma ha enweghịzi ike ịdọbata ya n’ụgbọ ha n’ihi ọtụtụ azụ̀ juru na ya.+ 7 Onye ahụ na-eso ụzọ Jizọs, onye Jizọs hụrụ n’anya,+ sịrị Pita: “Ọ bụ Onyenwe anyị.” Mgbe Saịmọn Pita nụrụ na ọ bụ Onyenwe anyị, o yiiri uwe elu ya n’ihi na ọ gba ahụ́ ọtọ.* O wee maba n’oké osimiri ahụ. 8 Ma ndị ọzọ na-eso ụzọ Jizọs, ndị nọ n’obere ụgbọ ahụ, kwọọrọ ụgbọ ahụ ma dọkpụrụ ụgbụ ahụ azụ̀ juru pụtawa n’ihi na ebe ha nọ adịghị anya n’ikpere osimiri ahụ. Ọ dị ihe dị ka mita iri itoolu.*

9 Mgbe ha pụtara n’elu ala, ha hụrụ ọkụ a kwanyere nke azụ̀ dị n’elu ya nakwa achịcha. 10 Jizọs sịrị ha: “Wetanụ ụfọdụ n’ime azụ̀ ndị unu ka gbutere ugbu a.” 11 Saịmọn Pita wee banye n’ụgbọ mmiri dọpụta ụgbụ ahụ nnukwu azụ̀ juru n’elu ala. Azụ̀ ndị ahụ dị otu narị na iri ise na atọ (153). Ụgbụ ahụ adọkaghị n’agbanyeghị na azụ̀ ndị dị na ya dị ọtụtụ. 12 Jizọs sịrị ha: “Bịanụ rie nri ụtụtụ.” E nweghị otu n’ime ndị na-eso ụzọ ya obi kara ịjụ ya, sị: “Ònye ka ị bụ?” n’ihi na ha ma na ọ bụ Onyenwe anyị. 13 Jizọs bịara were achịcha ahụ nye ha, nyekwa ha azụ̀ ndị ahụ. 14 Nke a bụ nke ugboro atọ+ Jizọs pụtara n’ihu ndị na-eso ụzọ ya mgbe a kpọlitechara ya n’ọnwụ.

15 Mgbe ha richara nri ụtụtụ, Jizọs jụrụ Saịmọn Pita, sị: “Saịmọn nwa Jọn, ị̀ hụrụ m n’anya karịa ihe ndị a?” O wee sị ya: “Ee, Onyenwe anyị, ị ma na m hụrụ gị n’anya.” Ọ sịrị ya: “Na-enye ụmụ atụrụ m nri.”*+ 16 Ọ jụrụ ya nke ugboro abụọ, sị: “Saịmọn nwa Jọn, ị̀ hụrụ m n’anya?” O wee sị ya: “Ee, Onyenwe anyị, ị ma na m hụrụ gị n’anya.” Ọ sịrị ya: “Na-azụ ụmụ atụrụ m.”+ 17 O wee jụọ ya nke ugboro atọ, sị: “Saịmọn nwa Jọn, ị̀ hụrụ m n’anya?” O wee wute Pita na ọ jụrụ ya nke ugboro atọ, sị: “Ị̀ hụrụ m n’anya?” Pita wee sị ya: “Onyenwe anyị, ị ma ihe niile. Ị ma na m hụrụ gị n’anya.” Jizọs sịziri ya: “Na-enye ụmụ atụrụ m nri.*+ 18 N’eziokwu, ana m asị gị na mgbe ị bụ nwata, ị na-eji aka gị eyiri ákwà ma na-ejegharị ebe ị chọrọ. Ma mgbe ị ga-eme agadi, ị ga-agbatị aka gị, onye ọzọ eyiwe gị ákwà, durukwa gị gaa n’ebe ị na-achọghị.” 19 O kwuru ihe a iji gosi ụdị ọnwụ Pita ga-anwụ, nke ga-ewetara Chineke otuto. Mgbe o kwuchara ihe a, ọ sịrị ya: “Na-eso m.”+

20 Pita tụgharịrị hụ onye ahụ na-eso ụzọ Jizọs, onye Jizọs hụrụ n’anya,+ ka ọ na-eso ha. Ọ bụ ya bụ onye ahụ dalara azụ ma dabere n’obi Jizọs n’oge ha na-eri nri anyasị, sị: “Onyenwe anyị, ọ̀ bụ onye ga-arara gị nye?” 21 Mgbe Pita hụrụ ya, ọ sịrị Jizọs: “Onyenwe anyị, onye a kwanụ?” 22 Jizọs sịrị ya: “Ọ bụrụ na ọ bụ uche m ka ọ nọrọ ruo mgbe m ga-abịa, ọ̀ gbasara gị? Gịnwa, na-eso m.” 23 N’ihi ya, ụmụnna nụrụ na onye ahụ na-eso ụzọ Jizọs agaghị anwụ. Ma, Jizọs agwaghị ya na ọ gaghị anwụ, kama ọ sịrị ya: “Ọ bụrụ na ọ bụ uche m ka ọ nọrọ ruo mgbe m ga-abịa, ọ̀ gbasara gị?”

24 Ọ bụ onye ahụ na-eso ụzọ Jizọs+ na-agba àmà a banyere ihe ndị a, ọ bụkwa ya dere ihe ndị a. Anyị makwa na àmà ya bụ eziokwu.

25 N’eziokwu, e nwekwara ọtụtụ ihe ndị ọzọ Jizọs mere. Ọ bụrụ na e dechaa ha niile, echeghị m na ụwa ga-aba akwụkwọ mpịakọta ndị e ji dee ha.+

Ma ọ bụ “dị ka Chineke.”

Ma ọ bụ “n’obi.” Ọ pụtara na Nna ya hụrụ ya n’anya nke ukwuu.

Gụọ A5.

Ya bụ, ebe ọwụwa anyanwụ Osimiri Jọdan. Ọ bụghị Betani nke dị nso na Jeruselem. Gụọ B10.

Ya bụ, ihe dị ka n’elekere anọ nke mgbede.

Ma ọ bụ “Rabaị.” Gụọ Nkọwa Okwu.

Ihe a bụ akpaala okwu n’asụsụ Arameik. Ọ na-egosi na mmadụ achọghị ime ihe a gwara ya mee. Na Jizọs kpọrọ nne ya “nwaanyị” apụtaghị na ọ na-akparị ya.

Ihe dị ka galọn 12 ruo galọn 17. Gụọ Nkọwa Okwu. O nwere ike ịbụ na mmiri nwere ike ịba n’ite nke ọ bụla bụ bat abụọ ma ọ bụ atọ. Otu bat bụ lita 22 (galọn 5.81). Gụọ Nkọwa Okwu.

Na Grik, “ihe àmà mbụ o mere.”

Rabaị pụtara “Onye Ozizi.”

Na Grik, “ga-emeli ihe àmà ndị a ị na-eme.”

O nwere ike ịbụ, “e sighị n’elu mụọ mmadụ.”

Ma ọ bụ “ịgba ọrụ ya n’anwụ.”

Ọ ga-abụ na Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha mee ndị ahụ baptizim. Gụọ Jn 4:2.

Ma ọ bụ “Rabaị.” Gụọ Nkọwa Okwu.

Na Grik, “akanyela akara ya.”

Na Grik, “anaghị atụ̀ mmụọ nsọ ọ na-enye atụ̀.” Ma ọ bụ “anaghị enye mmụọ nsọ obere obere.”

Na Grik, “Jizọs.”

Ya bụ, ihe dị ka n’elekere iri na abụọ nke ehihie.

Ma ọ bụ “Rabaị.” Gụọ Nkọwa Okwu.

Na Grik, “ihe àmà.”

Ya bụ, ihe dị ka n’elekere mbụ nke ehihie.

Gụọ A3.

Ma ọ bụ “àkwà.”

Ma ọ bụ “àkwà.”

Ma ọ bụ “àkwà.”

Ma ọ bụ “àkwà.”

Ma ọ bụ “nwere ikike inye ndụ,” “nwere onyinye nke ndụ n’ime onwe ya.”

Na Grik, “ga-enweta mbilite n’ọnwụ nke ndụ.”

Na Grik, “ga-enweta mbilite n’ọnwụ nke ikpe.”

Na Grik, “otú m si nụ.”

Ma ọ bụ “mpanaka; oriọna.”

Ya bụ, Akwụkwọ Nsọ.

Na Grik, “ga-ebo unu ebubo.”

Na Grik, “na-ebo unu ebubo.”

Ọ bụ ọdọ mmiri. Baịbụl kpọkwara ya Ọdọ Mmiri Genesaret na Oké Osimiri Taịbirias.

Na Grik, “ihe àmà ndị ọ na-eme.”

Ya bụ, Jizọs.

Ya bụ, Jizọs.

Na Grik, “ihe àmà ndị o mere.”

Ihe dị ka maịl atọ ma ọ bụ anọ. Na Grik, “ihe dị ka stediọm 25 ma ọ bụ 30.” Otu stediọm bụ mita 185. Stediọm a abụghị ámá egwuregwu. Gụọ B14.

Ma ọ bụ “Rabaị.” Gụọ Nkọwa Okwu.

Na Grik, “hụrụ ihe àmà.”

Na Grik, “ihe àmà ị ga-eme.”

Gụọ A5.

O nwere ike ịbụ, “n’ebe ọhaneze gbakọtara.”

Na Grik, “Ihe a ò meela ka unu daa?”

Ma ọ bụ “ekwensu.”

Ma ọ bụ “Ụlọ Ndò.”

Na Grik, “ihe e dere ede.”

Ya bụ, ụlọ akwụkwọ ndị Rabaị.

Na Grik, “ọ̀ ga-eme ihe àmà karịrị nke nwoke a na-eme?”

Ya bụ, Iwu Mosis.

Ọtụtụ Akwụkwọ Nsọ ndị e ji aka dee n’oge ochie, bụ́ ndị kwuru ihe e ji n’aka, edenyeghị amaokwu nke 53 ruo isi 8, amaokwu nke 11.

Ya bụ, Iwu Mosis.

Ya bụ, kwụwa Jizọs n’osisi.

Grik, por·nei′a. Gụọ Nkọwa Okwu.

Ya bụ, mgbe ọ ghara ụgha gbasara Chineke.

Ma ọ bụ “Rabaị.” Gụọ Nkọwa Okwu.

Na Grik, “na-eme ụdị ihe àmà.”

Ihe ọ pụtara bụ “Kwuo eziokwu n’ihu Chineke.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Wolf bụ anụ ọhịa na-eri anụ ndị ọzọ. O yiri nkịta ọhịa, ma ọ na-aka ya ibu.

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi anyị.”

Ma ọ bụ “dị n’otu.”

Ọ ga-abụ na Iwu a bụ Akwụkwọ Nsọ Hibru niile.

Ma ọ bụ “Unu dị ka chi.”

Na Grik, “emeghị otu mkpụrụ ihe àmà.”

Ma ọ bụ “Rabaị.” Gụọ Nkọwa Okwu.

Ma ọ bụ “n’ili ncheta.”

Ihe dị ka maịl abụọ. Na Grik, “ihe dị ka stediọm 15.” Otu stediọm bụ mita 185. Stediọm a abụghị ámá egwuregwu. Gụọ B14.

Ma ọ bụ “n’ili ncheta.”

Na Grik, “ọ sụrụ ude na mmụọ ya.”

Ma ọ bụ “n’ili ncheta.”

Ma ọ bụ “ili ncheta.”

Gụọ Nkọwa Okwu.

Na Grik, “na-eme ọtụtụ ihe àmà.”

Na Grik, “ndị Juu.”

Ya bụ, Iwu Mosis.

Ya bụ, paụnd ndị Rom. Ọ bụ ihe dị ka gram 327. Gụọ B14.

Gụọ Nkọwa Okwu.

Gụọ B14.

Gụọ A5.

Na Grik, “ada bụ́ Zayọn.”

Ma ọ bụ “n’ili ncheta.”

Na Grik, “ihe àmà a ha nụrụ na o mere.”

Na Grik, “nwụọ.”

Na Grik, “nwụọ.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”

Ya bụ, kwụwa Jizọs n’osisi.

Ọ ga-abụ na Iwu a bụ Akwụkwọ Nsọ Hibru niile.

Ya bụ, kwụwa Jizọs n’osisi.

Na Grik, “o mere ọtụtụ ihe àmà.”

Gụọ A5.

Ma ọ bụ “n’ihe anyị kwuru?”

Gụọ A5.

Na Grik, “aka.”

Na Grik, “tụgharịa.”

Na Grik, “nyere m iwu.”

Ma ọ bụ “iwu jikwa unu.”

Na Grik, “eweliela ikiri ụkwụ ya ka o megide m.”

Na Grik, “o wutere ya ná mmụọ ya.”

Na Grik, “nọ n’obi Jizọs.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Ma ọ bụ “ihe nkasi obi.”

Ma ọ bụ “ka ụmụ na-enweghị nne na nna.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Ma ọ bụ “ikpe mmehie agaraghị ama ha.”

Ma ọ bụ “ikpe mmehie agaraghị ama ha.”

Ọ ga-abụ na Iwu a bụ Akwụkwọ Nsọ Hibru niile.

Na Grik, “ghara ịda.”

Ya bụ, ihe inyeaka. Ihe inyeaka a bụ mmụọ nsọ, ọ bụghị onye.

Ya bụ, ihe inyeaka. Ihe inyeaka a bụ mmụọ nsọ, ọ bụghị onye.

Na Grik, “anụ ahụ́.”

Ma ọ bụ “ha ga na-amụta banyere gị.” Okwu Grik a sụgharịrị “ga na-amụta” gosiri na ọ bụ ihe a ga-emere na-aga.

Ma ọ bụ “na-erubekwa isi n’okwu gị.”

Ma ọ bụ “dị n’otu.”

Ma ọ bụ “dị n’otu.”

Ma ọ bụ “mee ka ha dị iche; mee ka ha dị nsọ.”

Mmiri na-adị na ndagwurugwu a naanị ma mmiri zosie ike n’oge udu mmiri.

Ma ọ bụ “oriọna.”

Ma ọ bụ “n’ụlọ gọvanọ.”

Ọ bụ akpaala okwu ndị Juu nke na-egosi na mmadụ kwetara ihe e kwuru.

Ma ọ bụ “Gbuo ya n’elu osisi! Gbuo ya n’elu osisi!”

Ma ọ bụ “gbuo ya n’elu osisi.”

Ya bụ, “n’ụlọ gọvanọ.”

Ma ọ bụ “igbu gị n’elu osisi.”

Ma ọ bụ “na-emegide.”

Ihe a bụ nkwadebe a na-eme maka Ememme Ngabiga e ji otu izu eme. A na-emekwa Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko n’izu ahụ.

Ya bụ, ihe dị ka n’elekere iri na abụọ nke ehihie.

Ma ọ bụ “Gbuo ya n’elu osisi!”

Gụọ Nkọwa Okwu.

Gụọ Nkọwa Okwu.

Gụọ Nkọwa Okwu.

Gụọ Nkọwa Okwu.

Ma ọ bụ “a ga-egweri.”

Ya bụ, paụnd ndị Rom. Gụọ B14.

Ma ọ bụ “e gburu ya n’elu osisi.”

Ma ọ bụ “ili ncheta.”

Ma ọ bụ “n’ili ncheta.”

Ma ọ bụ “ili ncheta.”

Na Grik, “Abụla onye na-anaghị ekweta ekweta.”

Na Grik, “mekwara ọtụtụ ihe àmà.”

Ma ọ bụ “azụ̀ ọ bụla.”

Ma ọ bụ “e nweghị ezigbo ihe o yi.”

Na Grik, “ihe dị ka kubit 200.” Gụọ B14.

Ma ọ bụ “Na-azụ ụmụ atụrụ m.”

Ma ọ bụ “Na-azụ ụmụ atụrụ m.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya