Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • nwt Ọrụ Ndịozi 1:1-28:31
  • Ọrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọrụ
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Ọrụ

ỌRỤ NDỊOZI

1 Tiofilọs, n’akwụkwọ mbụ m detaara gị, m dere banyere ihe niile Jizọs mere na ihe ọ kụziiri ndị mmadụ,+ si ná mbido 2 ruo mgbe a kpọgoro ya eluigwe.+ A kpọgoro ya mgbe mmụọ nsọ nyere ya ike, ya agwa ndịozi ọ họọrọ ihe ha ga-eme.+ 3 Mgbe ọ tachara ahụhụ, ọ pụtara n’ihu ha ọtụtụ ugboro ka o doo ha anya na ya dị ndụ.+ Ha hụkwara ya ruo ụbọchị iri anọ, ọ nọkwa na-ekwu gbasara Alaeze Chineke.+ 4 Mgbe ya na ha hụrụ, ọ gwara ha, sị: “Unu apụla na Jeruselem,+ kama cherenụ ka Nna m mezuo ihe o kwere ná nkwa,+ nke m gwara unu gbasara ya. 5 Jọn ji mmiri mee ndị mmadụ baptizim, ma a ga-eji mmụọ nsọ mee unu baptizim+ n’oge na-adịghị anya.”

6 Mgbe ha zukọrọ, ha jụrụ ya, sị: “Onyenwe anyị, ị̀ ga-eme ka Izrel nwetaghachi alaeze ha n’oge a?”+ 7 Ọ gwara ha, sị: “Ọ bụ naanị Nna m nwere ikike ikpebi oge na mgbe ihe ga-emenụ ga-eme. Unu ekwesịghị ịma oge ọ ga-abụ.+ 8 Ma unu ga-anata ike mgbe mmụọ nsọ ga-adakwasị unu.+ Unu ga-abụkwa ndị àmà m+ ma na Jeruselem+ ma na Judia na Sameria niile,+ ruokwa n’ebe kacha anya n’ụwa.”*+ 9 Mgbe o kwuchara ihe ndị a, e buliri ya elu ka ha nọ na-ele anya, ígwé ojii kpuchikwara ya, nke mere na ha enweghịzi ike ịhụ ya anya.+ 10 Mgbe ha nọkwa na-ele anya na mbara igwe ka ọ na-agbago, n’otu ntabi anya, ụmụ nwoke abụọ ndị yi uwe ọcha+ bịara guzoro ha n’akụkụ 11 wee sị ha: “Ndị Galili, gịnị mere unu ji guzoro na-ele anya na mbara igwe? Jizọs a, onye si ebe unu nọ gbagoo na mbara igwe, ga-esi otú a bịa, ya bụ, otú a unu hụrụ ya ka ọ na-abanye na mbara igwe.”

12 Ha wee si n’ugwu a na-akpọ Ugwu Oliv, nke dị nso na Jeruselem,+ laghachi Jeruselem. Isi n’ugwu ahụ ruo Jeruselem dị ihe dị ka otu kilomita.* 13 Mgbe ha rutere, ha gbagoro n’ọnụ ụlọ dị n’elu, ebe ha na-anọ. Ha bụ Pita na Jọn na Jems na Andru, Filip na Tọmọs, Batolomiu na Matiu, Jems nwa Alfiọs na Saịmọn onye na-anụ ọkụ n’obi, na Judas nwa Jems.+ 14 Ha niile ji otu obi na-ekpe ekpere mgbe niile, ha na ụmụ nwaanyị+ ụfọdụ na ụmụnne Jizọs ndị nwoke+ na Meri nne ya.

15 Otu ụbọchị ha gbakọrọ ka ha kpee ekpere, ụmụnna gbakọrọ ebe ahụ dị ihe dị ka otu narị na iri abụọ (120). Pita biliri, sị: 16 “Ụmụnna m, Devid si n’ike mmụọ nsọ buo amụma gbasara Judas,+ onye dutere ndị jidere Jizọs.+ Amụma a nke dị n’Akwụkwọ Nsọ kwesịkwara imezu. 17 Ọ bụbu onye òtù anyị,+ anyị na ya jekọkwara ozi. 18 (Nwoke a natakwara ụgwọ ọrụ ihe ọjọọ o mere,+ jiri ya zụta otu ala. O bukwa ụzọ sụọ isi n’ala, afọ ya wee gbawaa, eriri afọ ya niile awụpụtakwa.+ 19 Ndị niile bi na Jeruselem mechara mara ihe a, nke mere na a kpọrọ ala ahụ Akeldama n’asụsụ ha, ya bụ, “Ala Ọbara.”) 20 N’ihi na e dere n’akwụkwọ Abụ Ọma, sị, ‘Ka ebe o bi tọgbọrọ chakoo, ka a gharakwa inwe onye ga-ebi na ya.’+ E dekwara, sị, ‘Ka onye ọzọ rụwa ọrụ* ọ na-arụbu.’+ 21 N’ihi ya, anyị kwesịrị ịhọpụta otu nwoke. Ma, ọ ga-abụrịrị onye na-eso anyị n’oge niile anyị na Onyenwe anyị Jizọs nọ, ya ana-eje ozi ya, 22 malite n’oge Jọn mere Jizọs baptizim+ ruo n’ụbọchị Jizọs gbagoro eluigwe.+ Nwoke ahụ ga-abụkwa onye ji anya ya soro anyị hụ na a kpọlitela Jizọs n’ọnwụ.”+

23 N’ihi ya, ha kpọpụtara mmadụ abụọ, Matayas na Josef onye a na-akpọ Basabas, onye a na-akpọkwa Jọstọs. 24 Ha kpekwara ekpere, sị: “Jehova,* onye ma obi mmadụ niile,+ biko, gosi anyị onye ị họọrọ n’ime ụmụ nwoke abụọ a 25 ka ọ nọchie Judas bụrụ onyeozi ma na-ejere gị ozi Judas hapụrụ gawara onwe ya.”+ 26 Ha feere ha nza,+ nza ama Matayas, ya esoro ná ndịozi iri na abụọ.

2 N’ụbọchị Ememme Pentikọst,+ ndị niile na-eso ụzọ Jizọs zukọrọ otu ebe. 2 Ka ha nọdụrụ ala, na mberede, ha nụrụ ụzụ si n’eluigwe nke dị ka ụzụ oké ifufe. A nụkwara ụzụ a ebe niile n’ụlọ ahụ ha nọ.+ 3 Ha hụkwara ihe ndị dị ka ire ọkụ e kesaara ha, otu dịkwa n’isi onye nke ọ bụla n’ime ha. 4 Ha niile wee jupụta na mmụọ nsọ,+ malite ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche, n’ihi na mmụọ nsọ nọ na-enye ha ike ikwu okwu.+

5 N’oge ahụ, e nwere ndị Juu nọ na Jeruselem, ndị na-atụ egwu Chineke. Ha si ná mba dị iche iche bịa.+ 6 Mgbe ọtụtụ ndị nụrụ ụzụ a, ha gbakọtara, ihe na-emenụ jukwara ha anya, n’ihi na onye ọ bụla nụrụ ka ndị na-eso ụzọ Jizọs na-ekwu okwu n’asụsụ nke ya. 7 N’eziokwu, o juru ha anya, ha asị: “Legodị, ndị a niile na-ekwu okwu bụ ndị Galili.+ 8 Oleezi otú onye ọ bụla n’ime anyị si na-anụ ka ha na-asụ asụsụ ya?* 9 Ndị anyị na ha nọ ebe a bụ ndị Patia, Midia,+ Ịlam,+ Mesopotemia, Judia, Kapadoshia, Pọntọs na ndị si mpaghara Eshia,+ 10 nakwa ndị Frijia, Pamfilia, Ijipt na ndị si mpaghara Libia, nke dị nso na Saịrini, na ndị si Rom bịa, ma ndị Juu ma ndị mba ọzọ na-ekpe okpukpe ndị Juu,*+ 11 ndị Krit, na ndị Arebia. Anyị na-anụ ka ndị na-eso ụzọ Jizọs na-ekwu okwu n’asụsụ anyị banyere ọrụ ebube dị iche iche Chineke rụrụ.” 12 O juru ha niile anya, ha ana-ajụ ibe ha, sị: “Gịnị ka ihe a pụtara?” 13 Ma, ndị ọzọ nọ na-akwa ndị na-eso ụzọ Jizọs emo, na-asị: “Mmanya* na-egbu ha.”

14 Ma, Pita na ndịozi iri na otu ahụ biliri ọtọ,+ Pita ejiri olu dara ụda kwuo, sị: “Ndị Judia na ndị niile bi na Jeruselem, maranụ ihe a, ṅaakwanụ ntị nke ọma n’ihe m na-ekwu. 15 N’eziokwu, ọ bụghị mmanya na-egbu ndị a otú unu chere, n’ihi na ihe a ka bụ awa nke atọ* n’ụbọchị. 16 Kama, ọ bụ ihe Joel buru n’amụma na-emezu n’isi ha. Ọ sịrị: 17 ‘Chineke kwuru, sị, “N’oge ikpeazụ, m ga-awụkwasị mmụọ m n’ahụ́ ụdị mmadụ ọ bụla. Ụmụ unu ndị nwoke na ụmụ unu ndị nwaanyị ga-ebukwa amụma, ụmụ okorobịa unu ga-ahụkwa ọhụụ, ndị agadi nwoke unu ga-arọkwa nrọ.+ 18 N’oge ahụ, m ga-awụkwasịkwa mmụọ m n’ahụ́ ndị ohu m ndị nwoke nakwa n’ahụ́ ndị ohu m ndị nwaanyị, ha ga-ebukwa amụma.+ 19 M ga-eme ihe ndị dị ịtụnanya* n’eluigwe, rụọkwa ọrụ ebube n’ụwa. A ga-ahụ ọbara, ọkụ na anwụrụ ọkụ nke dị ka ìgwè ojii. 20 A ga-eme ka anyanwụ ghọọ ọchịchịrị, meekwa ka ọnwa ghọọ ọbara tupu oké ụbọchị dị ebube nke Jehova* eruo. 21 A ga-azọpụta onye ọ bụla na-akpọku aha Jehova.”’*+

22 “Ndị Izrel, nụrụnụ ihe a: Unu ma na ọ bụ Chineke zitere Jizọs onye Nazaret. Chineke sikwa n’aka ya rụọ ọrụ ebube ma mee ihe ndị dị ịtụnanya* unu ma gbasara ha.+ 23 E nyefere nwoke a n’aka unu otú Chineke zubere nakwa otú o bu ụzọ mara na a ga-eme ya.+ Ebe unu nyefere ya n’aka ndị na-emebi iwu, ọ bụ unu kpọgidere ya n’osisi, gbuokwa ya.+ 24 Ma Chineke tọpụrụ ya n’agbụ ọnwụ kere ya, kpọlitekwa ya n’ọnwụ,+ n’ihi na ọnwụ enweghị ike ijigide ya.+ 25 Ọ bụ ya mere Devid ji kwuo gbasara ya, sị: ‘M mere ka Jehova* nọrọ n’ihu m mgbe niile. Ebe ọ bụ na ọ nọ m n’aka nri, e nweghị ihe ga-eme ka m daa.* 26 N’ihi ya, obi tọrọ m ụtọ, aṅụrị jukwara m obi ka m na-ekwu okwu. M* ga-enwekwa olileanya, 27 n’ihi na ị gaghị ahapụ m* n’ili,* ị gaghịkwa ekwe ka onye jisiri gị aka ike ree ure.+ 28 I meela ka m mara ụzọ ndụ, ị ga-emekwa ka ọṅụ ju m obi n’ihu gị.’+

29 “Ụmụnna m, biko, ka m gwa unu hoo haa gbasara nna nna anyị Devid. Ọ nwụrụ, e liekwa ya,+ ili ya dịkwa n’obodo anyị ruo taa. 30 Ọ bụ onye amụma. Ọ makwa na Chineke ṅụụrụ ya iyi na ọ ga-eme ka otu n’ime ụmụ ya* nọdụ ala n’ocheeze ya.+ 31 Ọ ma na a ga-akpọlite Kraịst n’ọnwụ nakwa na a gaghị ahapụ ya n’ili,* anụ ahụ́ ya agaghịkwa ere ure.+ 32 Chineke kpọlitere Jizọs a n’ọnwụ, anyị hụkwara ya.+ 33 A kpọgoro ya n’eluigwe, ya anọrọ n’aka nri Chineke.+ Nna ya nyekwara ya mmụọ nsọ o kwere nkwa na ọ ga-ezite.+ Ọ bụ ya mere o ji wụkwasị anyị mmụọ nsọ dị ka unu na-ahụ ma na-anụ. 34 N’eziokwu, Devid agaghị eluigwe, ma ọ sịrị, ‘Jehova* gwara Onyenwe m, sị: “Nọdụ ala n’aka nri m 35 ruo mgbe m ga-eme ka ndị iro gị bụrụ ihe i ji agbakwasị ụkwụ.”’+ 36 N’ihi ya, ka ndị Izrel niile mara n’eziokwu na Chineke mere ka Jizọs a unu kpọgidere n’osisi+ bụrụ Onyenwe anyị+ na Kraịst.”

37 Mgbe ha nụrụ ihe a, o wutere ha nnọọ, ha wee gwa Pita na ndịozi ndị ọzọ, sị: “Ụmụnna anyị, gịnị ka anyị kwesịrị ime?” 38 Pita agwa ha, sị: “Chegharịanụ,+ ka onye ọ bụla n’ime unu meekwa baptizim+ n’aha Jizọs Kraịst ka e wee gbaghara unu mmehie unu.+ Unu ga-anatakwa mmụọ nsọ Chineke na-enye n’efu. 39 N’ihi na ndị e kwere nkwa+ inye ya bụ ndị niile Jehova* Chineke anyị kpọrọ, ya bụ, unu na ụmụ unu na ndị niile nọ n’ebe dị anya.”+ 40 O kwuru ọtụtụ ihe ndị ọzọ, ziekwa ha ozi ọma nke ọma. Ọ gbakwara ha ume, sị: “Bụrụnụ ndị a ga-azọpụta n’ọgbọ a jọgburu onwe ya.”+ 41 E mere ndị ji obi ha niile nabata okwu ya baptizim.+ N’ụbọchị ahụ, ihe dị ka puku mmadụ* atọ (3,000) ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs.+ 42 Ha nọkwa na-ege ntị n’ihe ndịozi na-akụzi, na-anọkọ, na-erikọ nri,+ na-ekpekọkwa ekpere.+

43 Ndịozi malitekwara ịrụ ọtụtụ ọrụ ebube. Mmadụ niile* hụkwara ihe a ma bido ịtụ egwu Chineke.+ 44 Ndị niile ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs na-anọkọ, na-ekerịtakwa ihe niile ha nwere. 45 Ha na-erekwa ala na ihe ndị ha nwere+ ma na-ekere mmadụ niile ego ha retere, onye ọ bụla enweta ego ọ ga-eji gboo mkpa ya.+ 46 N’ụbọchị ọ bụla, ha na-eji otu obi anọkọ mgbe niile n’ụlọ nsọ. Ha na-eji obi ọcha eri ihe n’ụlọ ibe ha, na-enwekwa ezigbo aṅụrị, 47 na-eto Chineke, ihe ha na-amasịkwa mmadụ niile. N’ụbọchị ọ bụla, Jehova* na-eme ka a na-enwekwu ndị na-eso ụzọ Jizọs a ga-azọpụta.+

3 Otu ụbọchị, ka Pita na Jọn nọ na-agbago n’ụlọ nsọ n’oge e ji ekpe ekpere, ya bụ, n’awa nke itoolu,* 2 e nwere otu nwoke dara ngwọrọ kemgbe a mụrụ ya, onye e bu na-abịa ka e busa ya n’akụkụ ọnụ ụzọ ụlọ nsọ a na-akpọ Ọnụ Ụzọ Mara Mma. A na-ebusa ya ebe ahụ kwa ụbọchị ka o wee na-arịọ ndị na-abanye n’ụlọ nsọ ahụ arịrịọ. 3 Mgbe ọ hụrụ ka Pita na Jọn na-achọ ịbanye n’ụlọ nsọ, ọ malitere ịrịọ ha arịrịọ. 4 Ma Pita na Jọn legidere ya anya wee sị ya: “Lee anyị anya.” 5 O wee legide ha anya, na-atụ anya ka ha nye ya ihe. 6 Ma, Pita sịrị: “Enweghị m ọlaọcha na ọlaedo. Ihe m nwere ka m ga-enye gị. N’aha Jizọs Kraịst onye Nazaret, jewe ije!”+ 7 O wee jide ya n’aka nri selite ya.+ Ozugbo ahụ, ụkwụ ya na nkwonkwo ụkwụ ya agbasie ike,+ 8 ya amalie elu,+ malite ije ije, sorokwa ha banye n’ụlọ nsọ, na-eje ije, na-amali elu, na-etokwa Chineke. 9 Mmadụ niile hụkwara ya ka ọ nọ na-aga na-eto Chineke. 10 Ha matakwara onye ọ bụ, na ọ bụ ya bụ nwoke ahụ na-anọbu n’Ọnụ Ụzọ Mara Mma n’ụlọ nsọ na-arịọ arịrịọ.+ O juru ha nnọọ anya na ọ na-ejezi ije.

11 Ka nwoke ahụ ka ji Pita na Jọn aka, mmadụ niile kwooro gaa n’ebe ha nọ, n’ebe a na-akpọ Varanda Solomọn.+ Ọ tụkwara ha nnọọ n’anya. 12 Mgbe Pita hụrụ ihe a, ọ gwara ndị ahụ, sị: “Ndị Izrel, gịnị mere ihe a merenụ ji na-eju unu anya? Gịnịkwa mere unu ji na-ele anyị ka à ga-asị na ọ bụ ike anyị ma ọ bụ maka na anyị na-efesi Chineke ike mere anyị ji mee ka nwoke a jewe ije? 13 Chineke Ebreham na nke Aịzik na nke Jekọb,+ ya bụ, Chineke nna nna anyị hà, emeela ka Jizọs,+ bụ́ Ohu ya, dị ebube,+ onye unu nyefere+ Paịlet, gọnahụkwa ya n’ihu ya, mgbe ọ chọrọ ịhapụ ya. 14 Unu gọnahụrụ onye nsọ na onye ezi omume. Unu kwukwara ka a hapụrụ unu otu nwoke, bụ́ ogbu mmadụ.+ 15 Ma, unu gburu Nnukwu Onye Ndú a họpụtara ka o nye ndị mmadụ ndụ.+ Ma Chineke kpọlitere ya n’ọnwụ, anyị jikwa anya anyị hụ ya.+ 16 Ọ bụ aha Jizọs ka anyị ji mee ka ụkwụ nwoke a unu na-ahụ, onye unu makwaara, gbasie ike. Ọ bụkwa maka na anyị kweere na aha ya na-akpa ike. Ihe mere ahụ́ ji dị nwoke a mma n’ihu unu niile bụ n’ihi na anyị kweere na Jizọs. 17 Ugbu a, ụmụnna m, ama m na unu mere ihe unu mere n’amaghị ụma,+ otú ndị na-achị unu mere.+ 18 Ma, Chineke hapụrụ ka ihe ndị a mee iji mezuo ihe ndị o si n’ọnụ ndị amụma niile kwuo na ha ga-eme, ya bụ, na Kraịst ga-ata ahụhụ.+

19 “N’ihi ya, chegharịanụ,+ lọghachikwutekwanụ Jehova*+ ka o wee hichapụ mmehie unu,+ meekwa ka obi ruo unu ala. 20 Ọ ga-ezitekwa Kraịst ọ họpụtaara unu, ya bụ, Jizọs. 21 N’oge ochie, Chineke si n’ọnụ ndị amụma ya dị nsọ kwe nkwa na ya ga-eme ka ihe niile dị ọhụrụ. Ma tupu oge ahụ eruo, Jizọs ga-anọgide n’eluigwe. 22 N’eziokwu, Mosis sịrị: ‘Jehova* bụ́ Chineke unu ga-esi n’ụmụnne unu họpụtara unu onye amụma nke dị ka m.+ Geenụ ntị n’ihe ọ bụla ọ ga-agwa unu.+ 23 A ga-ebibi onye ọ bụla* na-egeghị Onye Amụma ahụ ntị.’+ 24 Ndị amụma niile, ma Samuel ma ndị sochiri ya, kwuchara gbasara oge a.+ 25 Ndị amụma ahụ kwuru gbasara ọgbụgba ndụ Chineke na nna nna unu hà gbara. Unu sokwa n’ọgbụgba ndụ a,+ n’ihi na Chineke kwere Ebreham nkwa, sị: ‘M ga-esi n’aka nwa* gị gọzie ezinụlọ niile dị n’ụwa.’+ 26 Mgbe Chineke họpụtachara Ohu ya, o bu ụzọ zitere unu ya+ ka o mee ka onye ọ bụla n’ime unu hapụ àgwà ọjọọ ya, si otú a gọzie unu.”

4 Ka ndịozi abụọ ahụ nọ na-agwa ndị Juu okwu, ndị nchụàjà, onyeisi ndị nche ụlọ nsọ, na ndị Sadusii+ bịakwutere ha. 2 Iwe ji ha maka na ndịozi ahụ na-akụziri ndị mmadụ ihe, na-ekwukwa hoo haa na a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ.+ 3 Ha wee jide ha, kpọchie ha,+ ha anọbọọ chi ebe ahụ, n’ihi na ọ bụ ná mgbede ka ha jidere ha. 4 Ma, ọtụtụ n’ime ndị gere ntị n’okwu ahụ ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs, ụmụ nwoke niile na-eso ụzọ Jizọs wee ruo ihe dị ka puku ise (5,000).+

5 N’echi ya, ndị na-achị ha na ndị okenye na ndị odeakwụkwọ zukọrọ na Jeruselem, 6 ha na Anas+ onyeisi nchụàjà na Kayafas+ na Jọn na Alegzanda na ndị niile bụ́ ndị ikwu onyeisi nchụàjà. 7 Ha wee kpọpụta Pita na Jọn ma jụwa ha, sị: “Ònye nyere unu ike unu ji mee ihe a? Ọ̀ bụkwa aha onye ka unu ji mee ya?” 8 N’oge ahụ, Pita jupụtara na mmụọ nsọ.+ O wee sị ha:

“Unu ndị na-achị obodo na ndị okenye, 9 ọ bụrụ na unu na-ajụ anyị ajụjụ taa n’ihi ihe ọma e meere onye ngwọrọ a,+ nakwa ka unu mara onye gwọrọ nwoke a, 10 ka unu niile na ndị Izrel niile mara na a gwọrọ nwoke a n’aha Jizọs Kraịst onye Nazaret.+ Ọ bụkwa Jizọs, onye unu kpọgidere n’osisi,+ Chineke akpọlite ya n’ọnwụ,+ mere ahụ́ ji dị nwoke a guzo n’ihu unu mma. 11 Ọ bụkwa ya bụ ‘nkume ahụ nke unu ndị na-arụ ụlọ na-ejighị kpọrọ ihe, nke ghọrọla nkume ji ụlọ.’+ 12 E nweghị onye ọzọ a ga-esi n’aka ya zọpụta anyị, n’ihi na e nweghị aha ọzọ+ a na-akpọ mmadụ n’ụwa nke Chineke họọrọ ọ ga-eji zọpụta anyị.”+

13 Ma mgbe ha hụrụ otú ọnụ si kaa Pita na Jọn, marakwa na ha bụ ndị nkịtị na-agụghị akwụkwọ,*+ o juru ha anya. Ha wee cheta na ha na Jizọs na-anọbu.+ 14 Ka ha nọ na-ele nwoke ahụ a gwọrọ ọrịa ka ya na ndịozi abụọ ahụ guzo,+ ha amaghị ihe ha ga-ekwu ekwu.+ 15 Ha wee gwa ha ka ha si n’ụlọ nzukọ Sanhedrin ahụ pụtụ. Ka ha pụrụ, ha malitere ịgba izu, 16 sị: “Gịnị ka anyị ga-eme ndị a?+ N’ihi na, n’eziokwu, ha arụọla ọrụ ebube a na-enweghị ike izochi ezochi, ndị niile bi na Jeruselem makwa gbasara ya,+ anyị enweghịkwa ike ikwu na ha arụghị ya. 17 Ma, ka anyị majaa ha ka ha ghara ịna-agwa ndị mmadụ ihe a merenụ. Anyị ga-agwakwa ha ka ha ghara ịgwa onye ọ bụla okwu ọzọ n’aha nwoke ahụ.”+

18 Ha wee kpọọ ha ma gwa ha ka ha ghara ikwu ihe ọ bụla ma ọ bụ izi ihe ọ bụla n’aha Jizọs. 19 Ma Pita na Jọn gwara ha, sị: “Chegodịnụ ma ọ̀ ga-adị Chineke mma ka e gee unu ntị kama ige yanwa ntị. 20 Ma, anyịnwa enweghị ike ịkwụsị ikwu gbasara ihe anyị ji anya anyị hụ na ihe anyị ji ntị anyị nụ.”+ 21 N’ihi ya, mgbe ha majakwuru ha, ha hapụrụ ha, n’ihi na ha ahụghị ihe ọ bụla mere ha ga-eji taa ha ahụhụ, ha na-atụkwa ụjọ ihe ndị mmadụ ga-eme ha,+ maka na ha niile nọ na-eto Chineke maka ihe merenụ. 22 Nwoke ahụ a rụrụ ọrụ ebube n’ahụ́ ya, ya agbakee, akarịala afọ iri anọ.

23 Mgbe a hapụrụ ndịozi abụọ ahụ, ha jekwuuru ndị ibe ha ma kọọrọ ha ihe ndị isi nchụàjà na ndị okenye gwara ha. 24 Mgbe ndị niile nọ ebe ahụ nụrụ ihe a, ha ji olu dara ụda gwa Chineke n’otu obi, sị:

“Ọkaakaa Onyenwe anyị, ọ bụ gị bụ Onye kere eluigwe na ụwa na oké osimiri na ihe niile dị n’ime ha.+ 25 Ọ bụkwa gị ji mmụọ nsọ si n’ọnụ nna nna anyị Devid,+ bụ́ ohu gị, kwuo, sị: ‘Gịnị mere mba niile ji na-agba ghara ghara, ndị dị iche iche ana-atamukwa ihe* na-enweghị isi? 26 Ndị eze ụwa ejikerela ka ha lụso Jehova* na onye o tere mmanụ* ọgụ, ndị na-achị achị ezukọtakwala ka otu ndị ka ha lụso ha ọgụ.’+ 27 Ihe a mezuru, n’ihi na Herọd na Pọntiọs Paịlet+ nakwa ndị mba ọzọ na ndị Izrel zukọtara n’obodo a megide Jizọs, bụ́ ohu gị dị nsọ, onye i tere mmanụ.+ 28 Ha zukọtara ka ha mezuo ihe i kwuru na ọ ga-eme. Ihe a niile mere n’ihi ike i nwere nakwa n’ihi na ọ bụ nzube gị.+ 29 Ugbu a, Jehova,* biko, leba anya ná mmaja a ha majara anyị, nyekwa anyị bụ́ ndị ohu gị ike ka anyị na-ekwu okwu gị n’atụghị egwu ọ bụla. 30 Anyị na-arịọkwa gị ka ị na-eji ike gị na-agwọ ọrịa nakwa ka a na-arụ ọrụ ebube+ n’aha Jizọs bụ́ ohu gị dị nsọ.”+

31 Mgbe ha rịọsiri Chineke arịrịọ ike,* ebe ahụ ha zukọtara mara jijiji. Ha niile wee jupụta na mmụọ nsọ,+ na-ekwukwa okwu Chineke n’atụghị egwu.+

32 Ndị niile na-eso ụzọ Jizọs nwere otu obi.* O nweghịkwa onye ọ bụla n’ime ha na-ekwu na nke ọ bụla n’ime ihe ndị o nwere bụ nke ya. Kama ha nwekọrọ ihe niile ọnụ.+ 33 Ndịozi gbakwara àmà otú dị mma na a kpọlitere Onyenwe anyị Jizọs n’ọnwụ.+ Chineke mekwara ka amara ya baara ha niile ụba. 34 N’eziokwu, e nweghị onye n’ime ha ihe kọrọ,+ n’ihi na ndị niile nwere ala ma ọ bụ ụlọ na-ere ha ma na-eweta ego ha retere. 35 Ha na-ewetara ya ndịozi,+ ha ana-enye onye ọ bụla ego ọ ga-eji gboo mkpa ya.+ 36 Josef, onye ndịozi na-akpọkwa Banabas+ (nke pụtara “Nwa Nkasi Obi”), onye Livaị a mụrụ na Saịprọs, 37 nwere ala. O rere ya ma wetara ndịozi ego ya.+

5 Otu nwoke aha ya bụ Ananayas na Safaịra nwunye ya rekwara ala ha. 2 Ma, o zoro ụfọdụ ego ha retere, wee wetara ndịozi nke fọdụrụ. Nwunye ya makwa ihe a o mere.+ 3 Ma Pita sịrị ya: “Ananayas, gịnị mere i ji kwe ka Setan mee ka obi kaa gị ịghara mmụọ nsọ+ ụgha+ wee zoo ego ụfọdụ unu retere n’ala unu? 4 Ala ahụ ọ́ bụghị nke gị tupu gị eree ya? Mgbe i rere ya, ọ̀ bụ na ego i retere ya abụghị nke gị? Gịnị mere ime ụdị ihe a ji bata gị n’obi? Ọ bụ Chineke ka ị ghaara ụgha, ọ bụghị mmadụ.” 5 Mgbe Ananayas nụrụ ihe a, ọ dara n’ala nwụọ. Ezigbo ụjọ wee jide ndị niile nụrụ ya. 6 Ụmụ okorobịa wee bilie, fụchie ya ákwà, buru ya gaa lie.

7 Ma mgbe ihe dị ka awa atọ gachara, nwunye ya batara. Ọ maghịkwa ihe merenụ. 8 Pita sịrị ya: “Gwa m, ọ̀ bụ ego ole a ka unu abụọ rere ala ahụ?” Ya asị: “Ee, ọ bụ ego ole a.” 9 Pita wee sị ya: “Gịnị mere unu abụọ ji kwekọrịta ịghọ mmụọ Jehova* aghụghọ? Ị̀ na-anụ ụda ụkwụ ndị mmadụ n’èzí? Ọ bụ ụda ụkwụ ndị gara lie di gị. Ha ga-eburukwa gị pụọ.” 10 Ozugbo ahụ, ọ dara n’ụkwụ Pita nwụọ. Mgbe ụmụ okorobịa ahụ batara, ha hụrụ na ọ nwụọla, ha wee buru ya gaa lie n’akụkụ di ya. 11 N’ihi ya, ezigbo ụjọ jidere ọgbakọ ahụ niile na ndị niile nụrụ ihe a merenụ.

12 Ndịozi nọkwa na-arụrụ ọtụtụ ndị ọrụ ebube.+ Ha niile na-ezukọkwa na Varanda Solomọn.+ 13 N’eziokwu, e nweghị otu onye n’ime ndị ọzọ ụjọ kwere soro ha. Ma, ndị mmadụ ka na-aja ha mma. 14 Ọtụtụ ndị nọkwa na-ekwere n’Onyenwe anyị, ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị.+ 15 Ha kpọpụtadịrị ndị ọrịa n’okporo ámá ma nyiwe ha n’obere àkwà* na n’ute dị iche iche, ka ọ ga-abụ, Pita gafewe, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, onyinyo ya esi n’elu ụfọdụ n’ime ha gafee.+ 16 Ìgwè mmadụ ndị sikwa n’obodo ndị dị Jeruselem nso nọ na-abịa, na-ebute ndị ọrịa na ndị mmụọ ọjọọ* na-enye nsogbu. A na-agwọkwa ha niile.

17 Ma nnukwu onye nchụàjà biliri, ya na ndị niile ya na ha nọ, ndị so n’òtù ndị Sadusii, iwe jukwara ha obi. 18 Ha wee jide ndịozi ahụ ma kpọchie ha n’ụlọ mkpọrọ.+ 19 Ma n’abalị, mmụọ ozi Jehova* meghere ụzọ ụlọ mkpọrọ ahụ,+ kpọpụta ha ma sị: 20 “Gaanụ n’ụlọ nsọ, na-agwakwanụ ndị mmadụ gbasara ndụ a ga-adị n’ọdịnihu.” 21 Mgbe ha nụrụ ihe a, ha banyere n’ụlọ nsọ mgbe chi bọrọ ma malite ịkụziri ndị mmadụ ihe.

Ma, nnukwu onye nchụàjà na ndị so ya bịara kpọkọọ ndị Sanhedrin* nakwa ìgwè ndị okenye ndị Izrel, ziekwa ozi ka a gaa n’ụlọ mkpọrọ kpọtara ha ndịozi ahụ. 22 Ma mgbe ndị nche ahụ rutere n’ụlọ mkpọrọ ahụ, ha ahụghị ha. N’ihi ya, ha laghachiri gwa ha, 23 sị: “Anyị hụrụ na a kpọchisiri ụlọ mkpọrọ ahụ ike, hụkwa ndị nche ka ha guzo n’ọnụ ụzọ. Ma mgbe anyị meghere ụzọ, anyị ahụghị onye ọ bụla n’ime ya.” 24 Mgbe onyeisi ndị nche ụlọ nsọ na ndị isi nchụàjà nụrụ ihe a, ha nọ na-eche ihe ihe a merenụ ga-akpata. 25 Ma otu onye bịara gwa ha, sị: “Ndị unu tụbara n’ụlọ mkpọrọ nọ n’ụlọ nsọ na-akụziri ndị mmadụ ihe.” 26 Onyeisi ndị nche ụlọ nsọ ahụ na ndị ọrụ ya gara kpọta ha, ma ha amanyeghị ha amanye, n’ihi na ha na-atụ egwu na ndị mmadụ ga-atụ ha nkume.+

27 Ha kpọtara ha, ha eguzoro n’ihu ndị zukọrọ na Sanhedrin. Nnukwu onye nchụàjà wee gwa ha, 28 sị: “Anyị gwasiri unu ike ka unu kwụsị ịkụziri ndị mmadụ ihe n’aha a.+ Ma unu emeela ka ihe unu na-akụzi gbasaa ebe niile na Jeruselem. Unu chọkwara ka ọbara nwoke a dị anyị n’isi.”+ 29 Pita na ndịozi ndị ọzọ wee sị: “Anyị ga-erubere Chineke isi* karịa mmadụ.+ 30 Chineke nna nna anyị hà kpọlitere Jizọs, onye unu kwụwara n’elu osisi, ya anwụọ.+ 31 Chineke buliri onye a elu ka ọ nọrọ n’aka nri ya.+ Ọ họpụtara ya ka ọ bụrụ Nnukwu Onye Ndú+ na Onye Nzọpụta.+ Chineke mere ihe a ka ndị Izrel chegharịa, ka a gbagharakwa ha mmehie ha.+ 32 Anyị ji anya anyị hụ ihe ndị a.+ Mmụọ nsọ,+ nke Chineke na-enye ndị na-erubere ya isi, enyekwarala anyị aka ịgba àmà banyere ihe ndị a.”

33 Mgbe ha nụrụ ihe a, ezigbo iwe were ha,* ha achọwa igbu ha. 34 Ma otu onye Farisii aha ya bụ Gameliel+ biliri ka ọ gwa ndị Sanhedrin* okwu. Ọ bụ onye na-akụzi Iwu,* ndị Juu niile na-asọpụkwara ya. O kwuru ka a kpọpụtụ ndịozi ahụ n’èzí. 35 Ọ gwaziri ha, sị: “Ndị Izrel, cheenụ ihe a nke ọma tupu unu emee ndị a ihe ọ bụla. 36 Dị ka ihe atụ, e nwere oge Tiudas bidoro ikwu na e nwere ihe ya bụ. Ihe dị ka narị ụmụ nwoke anọ (400) ghọkwara ndị òtù ya. Ma e gburu ya, ndị niile na-eso ụzọ ya agbasasịa, òtù ahụ ọ malitere adaakwa. 37 Mgbe nke ya gachara, Judas onye Galili pụtara n’oge a na-edeba aha ndị mmadụ n’akwụkwọ, o nwetakwara ndị sooro ya. Ma ọ nwụkwara, ndị niile nọ na-eso ya agbasasịa. 38 Ka ihe si kwụrụ ugbu a, ana m asị unu, unu akpala ndị a aka, kama hapụnụ ha. Ọ bụrụ na atụmatụ ha ma ọ bụ ihe a ha na-eme si n’aka mmadụ, ọ ga-akụ afọ n’ala. 39 Ma ọ bụrụ na o si n’aka Chineke, unu agaghị akwụsịli ha.+ Kpacharanụ anya, n’ihi na o nwedịrị ike ịbụ na unu na-alụso Chineke ọgụ.”+ 40 Ha nabatara ihe a o kwuru, kpọọ ndịozi ahụ, pịa* ha ihe,+ gwa ha ka ha kwụsị ikwu okwu n’aha Jizọs, hapụkwa ha ka ha laa.

41 Ha wee si ebe ahụ ndị Sanhedrin* nọ pụọ, na-aṅụrị ọṅụ+ maka na Chineke gụrụ ha ná ndị e kwesịrị imenye ihere n’ihi aha Jizọs. 42 N’ụbọchị ọ bụla, ma n’ụlọ nsọ ma n’ụlọ n’ụlọ,+ ha na-akụzi ihe n’akwụsịghị akwụsị, na-ezisa ozi ọma gbasara Jizọs, onye bụ́ Kraịst.+

6 N’otu oge, mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs na-ehikwu nne, ndị Juu na-asụ Grik malitere ime mkpesa na ihe ndị Juu na-asụ Hibru na-eme adịghị mma, n’ihi na a naghị ekenye ụmụ nwaanyị isi mkpe ha* ihe ndị a na-eke kwa ụbọchị.+ 2 N’ihi ya, ndịozi iri na abụọ Jizọs kpọkọtara ìgwè ndị ahụ na-eso ụzọ Jizọs wee sị ha: “Anyị ekwesịghị ịhapụ okwu Chineke anyị na-akụzi gaa kewe nri na tebụl.+ 3 N’ihi ya, ụmụnna anyị, họpụtanụ ụmụ nwoke asaa ndị nwere aha ọma,*+ ndị mmụọ nsọ na-achị, ndị makwa ihe,+ ka anyị gwa ha ka ha na-ahụ maka ọrụ a dị mkpa.+ 4 Ma anyịnwa ga na-ekpe ekpere mgbe niile, na-akụzikwara ndị mmadụ okwu Chineke.” 5 Ihe a ha kwuru masịrị ìgwè mmadụ ahụ niile, ha ahọrọ Stivin, bụ́ nwoke okwukwe ya siri ike na onye mmụọ nsọ na-achị. Ha họkwaara Filip,+ Prọkọrọs, Naịkenọ, Taịmọn, Pamenas, na Nikọleọs, onye Antiọk na-ekpebu okpukpe ndị Juu.* 6 Ha wee kpọtara ha ndịozi ahụ. Mgbe ndịozi ahụ kpechara ekpere, ha bikwasịrị ha aka n’isi.+

7 N’ihi ya, okwu Chineke nọ na-agbasa,+ ndị na-eso ụzọ Jizọs nọkwa na-ehikwu nne n’ike n’ike+ na Jeruselem. Ọtụtụ ndị nchụàjà ghọkwara ndị na-eso ụzọ Jizọs.+

8 Ma ebe Chineke meere Stivin amara, nyekwa ya ike, ọ nọ na-arụrụ ọtụtụ ndị ọrụ ebube. 9 Ma ụfọdụ n’ime ndị òtù a na-akpọ Ndị Nweere Onwe Ha bịara, ha na ụfọdụ ndị Saịrini na ndị Alegzandria na ụfọdụ ndị si Silishia na Eshia, ka ha rụọ Stivin ụka. 10 Ma, ha agbaghalighị ihe ọ na-ekwu n’ihi na ọ nọ na-ekwu okwu otú gosiri na ọ ma nnọọ ihe, mmụọ nsọ nọkwa na-enyere ya aka.+ 11 Ihe ha meziri bụ ịgwa ụfọdụ ụmụ nwoke na nzuzo ka ha kwuo, sị: “Anyị nụrụ ka ọ na-ekwulu Mosis na Chineke.” 12 Ihe a ha kwuru kpasuru ìgwè mmadụ na ndị okenye na ndị odeakwụkwọ iwe, ha abịa ozugbo, kpụrụ ya n’ike kpụga na Sanhedrin.* 13 Ha kpọpụtakwara ndị akaebe ụgha, ndị sịrị: “Nwoke a na-ekwukarị okwu ọjọọ gbasara Iwu Mosis nakwa ebe nsọ a. 14 Dị ka ihe atụ, anyị nụrụ ka ọ na-ekwu na Jizọs a bụ́ Onye Nazaret ga-akwatu ebe a ma gbanwee omenala anyị ndị si n’aka Mosis.”

15 Ka ndị niile nọ na Sanhedrin* legidere ya anya, ha hụrụ na ihu ya dị ka ihu mmụọ ozi.

7 Ma nnukwu onye nchụàjà sịrị: “Ihe a ndị a kwuru ọ̀ bụ eziokwu?” 2 Stivin wee sị: “Ụmụnna m na ndị nna m, geenụ ntị. Chineke onye dị ebube pụtara n’ihu nna nna anyị Ebreham mgbe ọ nọ na Mesopotemia, tupu ya agaa biri na Heran.+ 3 O wee sị ya: ‘Kwapụ n’obodo gị, hapụkwa ndị ikwu gị, kwaga n’obodo m ga-egosi gị.’+ 4 O wee si n’ala ndị Kaldia kwapụ, gaa biri na Heran. Mgbe nna ya nwụrụ,+ Chineke gwara ya ka o si ebe ahụ kwata n’ala a unu bi ugbu a.+ 5 Ma, o nyeghị ya ala ọ bụla n’ala a, ọbụnadị otu amaụkwụ. Kama o kwere ya nkwa na ọ ga-enye ya ala a nakwa na ọ ga-abụ nke ya, bụrụkwa nke nwa* ya ga-anọchi ya.+ O kwere ya nkwa a n’agbanyeghị na ọ mụtabeghị nwa. 6 Chineke kwukwara na ụmụ* ya ga-abụ ndị mbịarambịa n’ala na-abụghị nke ha. Ndị ala ahụ ga-eji ha mere ndị ohu ma mesie ha ike ruo narị afọ anọ (400).+ 7 Chineke kwukwara, sị: ‘M ga-ekpe mba ahụ ha ga-agbara ohu ikpe,+ ha ga-apụtakwa mgbe ihe ndị a mechara, nọrọkwa ebe a na-efe m.’+

8 “Chineke na Ebreham gbara ndụ na a ga-ebi Ebreham na ụmụ ya ndị nwoke niile úgwù.+ N’ihi ya, mgbe Ebreham mụrụ Aịzik,+ o biri ya úgwù n’ụbọchị nke asatọ.+ Aịzik mụkwara Jekọb, Jekọb amụọ ụmụ nwoke iri na abụọ bụ́ ndị nna nna anyị. 9 Ndị nna nna anyị a nweere Josef nwanne ha anyaụfụ+ ma resị ya ndị Ijipt.+ Ma Chineke nọnyeere ya.+ 10 Ọ napụtara ya n’oge niile a na-akpagbu ya, nye ya amamihe ma mee ka ihe ya masị Fero bụ́ eze Ijipt. Fero mere ya onye na-achị Ijipt nakwa ezinụlọ ya niile.+ 11 Ma ụnwụ dara ebe niile n’Ijipt nakwa na Kenan, nke mere ndị mmadụ ji taa ezigbo ahụhụ, ndị nna nna anyị ahụghịkwa nri ọ bụla.+ 12 Ma Jekọb nụrụ na nri* dị n’Ijipt. O wee zipụ nna nna anyị hà ka ha gaa ebe ahụ.+ 13 Mgbe ha gara nke ugboro abụọ, Josef mere ka ụmụnne ya mata onye ọ bụ. Fero matakwara ezinụlọ Josef si.+ 14 Josef wee zie ozi ka Jekọb nna ya na ndị ikwu ya niile si Kenan kwata Ijipt.+ Ha niile dị mmadụ* iri asaa na ise.+ 15 Jekọb wee gaa Ijipt,+ nwụọkwa ebe ahụ.+ Ndị nna nna anyị nwụkwara ebe ahụ.+ 16 E bugara ha Shikem ma lie ha n’ili Ebreham ji ego ọlaọcha zụọ na Shikem n’aka ụmụ Hemọ.+

17 “Mgbe oge nọ na-eru ka nkwa ahụ Chineke kwere Ebreham mezuo, ndị Izrel bịara dị ọtụtụ, na-amụbakwa n’Ijipt, 18 ruo mgbe eze dị iche na-amaghị Josef malitere ịchị Ijipt.+ 19 Onye a ghọrọ ndị obodo anyị aghụghọ ma mesie ndị nna nna anyị ike, manyekwa ha ịhapụ ụmụ ọhụrụ ha ka ha nwụọ.+ 20 Ọ bụ n’oge ahụ ka a mụrụ Mosis. Ọ makwara mma na-enweghị atụ.* E lekọtakwara ya ruo ọnwa atọ n’ụlọ nna ya.+ 21 Ma mgbe a hapụrụ ya,+ ada Fero kutere ya ma zụọ ya, ya abụrụ nwa ya nwoke.+ 22 N’ihi ya, a kụziiri Mosis ihe otú kacha mma e si akụzi ihe n’Ijipt. N’eziokwu, ọ na-ekwu okwu ka dike, na-emekwa ọtụtụ nnukwu ihe.+

23 “Ma mgbe ọ gbara afọ iri anọ, ọ batara ya n’obi* ịga hụ ụmụnne ya* bụ́ ndị Izrel.+ 24 Mgbe ọ hụrụ ka onye Ijipt na-emesi otu n’ime ụmụnne ya ike, ọ bịara gbachitere nwanne ya ahụ, napụta ya n’aka onye Ijipt ahụ ma gbuo onye Ijipt ahụ. 25 O chere na ụmụnne ya ga-aghọta na Chineke ga-esi n’aka ya zọpụta ha, ma ha aghọtaghị. 26 N’echi ya, ọ bịara hụ ụmụnne ya abụọ ka ha na-ese okwu. O wee gbalịa ikpeziri ha, sị ha: ‘Unu bụ ụmụnne. Gịnị mere unu ji na-ese okwu?’ 27 Ma, onye nke chọrọ ibe ya okwu kwapụrụ ya, wee sị ya: ‘Ònye mere gị onye na-achị anyị na onyeikpe anyị? 28 Ị̀ chọrọ igbu m otú i gburu onye Ijipt ụnyaahụ?’ 29 Mgbe o kwuru ihe a, Mosis gbara ọsọ gbaga Midian, birizie ebe ahụ, lụọ nwaanyị, mụta ụmụ nwoke abụọ.+

30 “Mgbe afọ iri anọ gachara, otu mmụọ ozi pụtara n’ihu ya n’ọkụ na-enwu n’otu osisi ogwu, n’ala ịkpa dị n’Ugwu Saịnaị.+ 31 Mgbe Mosis hụrụ ihe a, ọ tụrụ ya n’anya. Ma ka ọ na-eru nso ka ọ chọpụta ihe na-eme, ọ nụrụ olu Jehova* ka ọ sịrị: 32 ‘Abụ m Chineke nna nna gị hà, Chineke Ebreham na nke Aịzik na nke Jekọb.’+ Mosis wee bido ịma jijiji. Ụjọ ekweghịzi ya ile osisi ahụ anya. 33 Jehova* wee sị ya: ‘Yipụ akpụkpọ ụkwụ gị, n’ihi na ebe i guzo bụ ala dị nsọ. 34 Ahụla m ahụhụ a na-ata ndị m nọ n’Ijipt, anụkwala m ude ha na-asụ.+ Agbadatala m ka m napụta ha. Ugbu a, bịa ka m ziga gị Ijipt.’ 35 Mosis ahụ, onye ha jụrụ ajụ na onye ha gwara, sị: ‘Ònye mere gị onye na-achị anyị na onyeikpe anyị?’+ ọ bụ ya ka Chineke si n’aka mmụọ ozi ahụ pụtara n’ihu Mosis n’osisi ogwu ahụ ziga+ ka ọ bụrụ onye na-achị ha na onye ga-anapụta ha. 36 Ọ bụ nwoke a si n’Ijipt dupụta+ ndị nna nna anyị. Ka ọ na-edupụta ha, ọ rụrụ ọrụ ebube n’Ijipt+ na n’Oké Osimiri Uhie+ nakwa n’ala ịkpa ruo afọ iri anọ.+

37 “Ọ bụ Mosis a gwara ndị Izrel, sị: ‘Chineke ga-esi n’ụmụnne unu họpụtara unu onye amụma nke dị ka m.’+ 38 Mosis a na ndị Izrel ibe ya nọrọ n’ala ịkpa. Ọ na-abụ mmụọ ozi+ gwa ya okwu+ n’Ugwu Saịnaị, yanwa agwa ndị nna nna anyị. Ọ nụkwara okwu Chineke, nke na-enye ndụ, ma gwa anyị ya.+ 39 Nna nna anyị hà jụrụ irubere ya isi, jụkwa iso ya.+ Obi ha niile dị n’ịlaghachi Ijipt.+ 40 Ha sịrị Erọn: ‘Meere anyị chi ga na-edu anyị, n’ihi na anyị amaghị ihe mere Mosis a, onye si n’Ijipt dupụta anyị.’+ 41 N’oge ahụ, ha kpụrụ arụsị yiri nwa ehi ma chụọrọ ya àjà, na-eri, na-aṅụ ma na-enwe obi ụtọ maka ihe ha ji aka ha kpụọ.+ 42 N’ihi ya, Chineke gbakụtara ha azụ ma hapụ ha ka ha na-efe ihe ndị dị n’eluigwe,+ otú ahụ e dere n’Akwụkwọ Ndị Amụma, sị: ‘Unu ndị Izrel, ọ bụghị m ka unu nyere onyinye, ọ bụghịkwa m ka unu chụụrụ àjà dị iche iche n’afọ iri anọ unu nọrọ n’ala ịkpa. 43 Kama ọ bụ ụlọikwuu Molọk+ na kpakpando chi Rifan ka unu na-ebu aga ebe dị iche iche, ya bụ, arụsị ndị unu mere ka unu na-efe ha. N’ihi ya, m ga-eme ka a dọrọ unu n’agha gaa n’ebe dị anya karịa Babịlọn.’+

44 “Nna nna anyị hà nwere ụlọikwuu* n’ala ịkpa. Ọ bụ Chineke gwara Mosis ka a rụọ ụlọikwuu ahụ. Ha rụkwara ya otú Chineke kwuru ka e si rụọ ya.+ 45 E mechaa, ụmụ ndị nna nna anyị hà butere ụlọikwuu a mgbe Joshụa du ha bata n’ala a bụ́ nke ndị mba ọzọ,+ ndị Chineke chụpụrụ n’ihu nna nna anyị hà.+ Ụlọikwuu ahụ dịgidere ebe a ruo n’oge Devid. 46 Ihe Devid masịrị Chineke. O kwukwara na ya ga-achọ ịrụrụ Chineke nke Jekọb ụlọ.+ 47 Ma, ọ bụ Solomọn rụụrụ ya ụlọ.+ 48 Ma, Onye Kacha Elu anaghị ebi n’ụlọ e ji aka rụọ,+ dị ka otu onye amụma sịrị: 49 ‘Jehova* kwuru, sị, “Eluigwe bụ ocheeze m,+ ụwa bụkwa ihe m ji gbakwasị ụkwụ m.+ Olee ụdị ụlọ unu ga-arụrụ m? Ma ọ bụ, olee ebe unu ga-arụrụ m ụlọ m ga-ebi? 50 Ọ̀ bụ na ọ bụghị m ji aka m mee ihe a niile?”’+

51 “Unu ndị isi ike, ndị kpọchiri obi ha na ntị ha, unu na-eme ihe na-ewute mmụọ nsọ mgbe niile. Otú nna nna unu hà mere ka unu na-eme.+ 52 Ò nwere onye amụma nna nna unu hà na-akpagbughị?+ Ha gburu ndị mara ọkwa na e nwere onye ezi omume na-abịa.+ Ọ bụ onye ahụ ka unu raara nye ma gbuo n’oge na-adịbeghị anya.+ 53 Chineke si n’aka ndị mmụọ ozi nye unu Iwu,+ ma unu edebeghị ya.”

54 Ma, ihe a o kwuru were ha ezigbo iwe,* ha ana-ele ya na-ata ikikere ezé. 55 Ma ebe o jupụtara na mmụọ nsọ, o legidere anya n’eluigwe ma hụ ebube Chineke, hụkwa ka Jizọs guzo n’aka nri Chineke.+ 56 O wee, sị: “Ana m ahụ ka eluigwe meghere, na-ahụkwa ka Nwa nke mmadụ+ guzo n’aka nri Chineke.”+ 57 Mgbe o kwuru ihe a, ha tiri ezigbo mkpu, kpuchie aka ná ntị, nukọrọkwa n’ike bịa ebe ọ nọ. 58 Mgbe ha kpụụrụ ya gaa n’azụ obodo, ha malitere ịtụ ya nkume.+ Ndị akaebe ahụ+ wụsakwaara otu nwa okorobịa a na-akpọ Sọl uwe elu ha.+ 59 Ka ha na-atụ Stivin nkume, ọ sịrị: “Onyenwe m Jizọs, ndụ* m dị gị n’aka.”* 60 O wee gbuo ikpere n’ala, tie ezigbo mkpu, sị: “Jehova,* ka mmehie a ghara ịdị ha n’isi.”+ Mgbe o kwuchara ihe a, ọ nwụrụ.*

8 Sọl kwadoro ogbugbu e gburu Stivin.+

Si n’ụbọchị ahụ gawa, a malitere ịkpagbu ọgbakọ dị na Jeruselem. E wezụga ndịozi, a chụsasịrị ndị niile na-eso ụzọ Jizọs, ha agbaga n’ógbè ndị dị na Judia na Sameria.+ 2 Ma ụmụ nwoke ndị na-atụ egwu Chineke buuru Stivin gaa lie. Ha bekwaara ya ezigbo ákwá. 3 Ma, Sọl malitere imesi ọgbakọ Chineke ike. Ọ na-aga n’ụlọ n’ụlọ, na-akpụrụ ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị, na-atụkwa ha mkpọrọ.+

4 Ma, ndị ahụ a chụsasịrị gara obodo dị iche iche na-ekwusa okwu Chineke.+ 5 Otu n’ime ha bụ Filip. Ọ gara Sameria+ malite ikwusara ha gbasara Kraịst. 6 Ndị mmadụ ji otu obi na-aṅa ntị n’ihe Filip na-ekwu. Ha nọ na-ege ntị, na-elekwa anya ka ọ na-arụ ọrụ ebube ndị ọ na-arụ. 7 N’ihi na e nwere ọtụtụ ndị mmụọ ọjọọ* ji, mmụọ ọjọọ ndị ahụ na-etisikwa mkpu ike wee si n’ime ha pụta.+ A gwọkwara ọtụtụ ndị ahụ́ ha kpọnwụrụ akpọnwụ na ndị ngwọrọ. 8 Obi wee bụrụ ndị obodo ahụ sọ aṅụrị.

9 Ma, e nwere otu nwoke n’obodo ahụ aha ya bụ Saịmọn. Tupu oge a, ọ na-eme anwansi,* na-emekwa ihe tụrụ ndị Sameria n’anya. Ọ na-ekwukwa na ya bụ nnukwu mmadụ. 10 Ha niile, malite n’onye kacha nta n’ime ha ruo n’onye kacha ukwuu, na-aṅa ya ntị ma na-ekwu, sị: “Chineke nyere nwoke a ike dị egwu.” 11 Otú anwansi* ọ na-eme kemgbe si atụ ha n’anya mere ka ha na-eso ya. 12 Ma mgbe Filip nọ na-ezisa ozi ọma gbasara Alaeze Chineke+ nakwa gbasara aha Jizọs Kraịst, ha nabatara ihe ọ nọ na-ekwu, e mee ha baptizim, ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị.+ 13 Saịmọn ghọkwara onye na-eso ụzọ Jizọs. Mgbe o mechara baptizim, ya na Filip na-anọkarị.+ Mgbe ọ hụrụ ọrụ ebube Filip nọ na-arụ, ọ tụrụ ya n’anya.

14 Mgbe ndịozi nọ na Jeruselem nụrụ na ndị Sameria anabatala okwu Chineke,+ ha zigaara ha Pita na Jọn. 15 Mgbe ha ruru Sameria, ha kpeere ha ekpere ka mmụọ nsọ dakwasị ha.+ 16 N’ihi na ọ dakwasịbeghị onye ọ bụla n’ime ha, naanị na ha emeela baptizim n’aha Onyenwe anyị Jizọs.+ 17 Pita na Jọn wee bikwasị ha aka n’isi,+ mmụọ nsọ amalite ịdakwasị ha.

18 Ma mgbe Saịmọn hụrụ na mmụọ nsọ na-adakwasị onye ọ bụla ndịozi ahụ bikwasịrị aka n’isi, ya ewepụta ego nyewe ha, 19 sị: “Nyenụ m ikike a, ka ọ ga-abụ, onye ọ bụla m bikwasịrị aka n’isi, mmụọ nsọ adakwasị ya.” 20 Ma Pita sịrị ya: “Ka gị na ọlaọcha gị laa n’iyi, n’ihi na i chere na ị ga-ejili ego nweta onyinye Chineke na-enye n’efu.+ 21 O nweghị ihe ọ bụla gbasara gị n’ihe a, n’ihi na obi gị adịghị ọcha n’anya Chineke. 22 N’ihi ya, chegharịa, hapụ ihe ọjọọ a ị na-eche. Rịọsiekwa Jehova* arịrịọ ike ma gbanwee echiche ọjọọ gị, ka ọ gbaghara gị. 23 N’ihi na ahụrụ m na ị bụ onye anyaụfụ, ihe na-agụkwa gị mgbe niile bụ ime ihe ọjọọ.” 24 Saịmọn wee sị ha: “Rịọsierenụ m Jehova* arịrịọ ike ka nke ọ bụla n’ime ihe unu kwuru ghara ime m.”

25 Mgbe ha gwachara ndị mmadụ okwu Jehova* nke ọma, ha malitere ịlaghachi Jeruselem. Ka ha na-ala, ha nọ na-ezi ndị mmadụ ozi ọma n’ọtụtụ obodo nta ndị dị na Sameria.+

26 Ma, mmụọ ozi Jehova*+ sịrị Filip: “Gaa n’ebe ndịda, n’ụzọ si Jeruselem gaa Gaza.” (Ụzọ a dị n’ọzara.) 27 Filip wee gawa ma hụ otu nwoke onye Etiopia bụ́ nnukwu mmadụ* n’obí eze nwaanyị ndị Etiopia. Aha eze nwaanyị a bụ Kandesi. Ọ bụ nwoke ahụ na-elekọta akụ̀ niile eze nwaanyị a nwere. Nwoke a gara Jeruselem ife Chineke.+ 28 Ka ọ na-alọta, ọ nọ n’ụgbọ ịnyịnya ya na-agụpụta akwụkwọ Aịzaya onye amụma. 29 Chineke wee jiri mmụọ nsọ ya gwa Filip, sị: “Garuo ụgbọ ịnyịnya a nso.” 30 Filip wee gbara ọsọ gaa n’akụkụ ụgbọ ahụ ma nụ ka nwoke ahụ na-agụpụta akwụkwọ Aịzaya onye amụma. Filip asị ya: “Ị̀ na-aghọta ihe ị na-agụ?” 31 Ya asị: “Olee otú m ga-esi ghọta ihe m na-agụ ma ọ bụrụ na o nweghị onye kọwaara m ya?” O wee gwa Filip ka ọ rịgota soro ya nọdụ ala. 32 Ma, ebe ọ nọ na-agụ n’Akwụkwọ Nsọ bụ ebe sịrị: “A kpụụrụ ya ka atụrụ a gaje igbu egbu. Ọ dị ka nwa atụrụ gbara nkịtị ka a na-akpacha ya ajị. O kwughịkwa ihe ọ bụla.+ 33 N’oge ha mere ya ihe ihere, e kpere ya ikpe mkpegbu.+ Ebe ọ bụ na e gbuola ya, ònye ga-akọ ihe niile gbasara ezinụlọ o si?”+

34 Nwoke ahụ wee sị Filip: “Biko, ònye ka onye amụma a na-ekwu banyere ya? Ọ̀ bụ banyere onwe ya, ka ọ̀ bụ banyere onye ọzọ?” 35 Filip malitere ịkọwara ya ebe ahụ ọ na-agụ n’Akwụkwọ Nsọ, ziekwa ya ozi ọma banyere Jizọs. 36 Ma ka ha nọ na-aga n’okporo ụzọ ahụ, ha bịarutere n’otu mmiri, nwoke ahụ wee sị: “Lee mmiri, gịnị ga-egbochi ime m baptizim?” 37* —— 38 N’ihi ya, nwoke ahụ kwuru ka a kwụsị ụgbọ ịnyịnya ahụ. Mgbe ọ kwụsịrị, ya na Filip arịtuo banye na mmiri ahụ, Filip emee ya baptizim. 39 Mgbe ha si na mmiri ahụ pụta, mmụọ Jehova* duuru Filip pụọ ngwa ngwa, nwoke ahụ ahụghịkwa ya ọzọ, kama ọ nọ na-aga ebe ọ na-aga na-aṅụrị ọṅụ. 40 Ma Filip gara Ashdọd. Ọ nọkwa na-ezisa ozi ọma n’obodo dị iche iche ruo mgbe ọ garuru Sizaria.+

9 Ma Sọl kpebiri imesi ndị na-eso ụzọ Onyenwe anyị ike, chọọkwa igbuchapụ ha.+ N’ihi ya, ọ gakwuuru nnukwu onye nchụàjà 2 ma gwa ya ka o nye ya akwụkwọ ozi ndị ọ ga-eji gaa n’ụlọ nzukọ ndị dị na Damaskọs. Akwụkwọ ozi ndị ahụ ga-enye ya ikike ike onye ọ bụla na-eso Ụzọ Onyenwe anyị agbụ,+ ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị, kpụrụkwa ha bịa Jeruselem.

3 Ka ọ nọ na-aga Damaskọs, ya afọkwa obere ka o ruo, ìhè si n’eluigwe nwuo gburugburu ya na mberede,+ 4 ya adaa n’ala ma nụ olu na-agwa ya, sị: “Sọl, Sọl, gịnị mere i ji na-akpagbu m?” 5 Sọl wee sị ya: “Ị̀ bụkwanụ onye, Onyenwe m?” Ya asị ya: “Abụ m Jizọs,+ onye ị na-akpagbu.+ 6 Bilie banye n’obodo, a ga-agwakwa gị ihe ị ga-eme.” 7 Ma, ihe a merenụ enyeghị ndị ya na ha so ọnụ okwu. Ha na-anụ olu onye na-ekwu okwu, ma ha ahụghị onye ahụ.+ 8 Sọl wee si n’ala bilie, o nweghịkwa ihe ọ na-ahụ n’agbanyeghị na anya ya meghere emeghe. N’ihi ya, ha sekpụụrụ ya n’aka ma duru ya banye Damaskọs. 9 Ọ hụghị ụzọ ruo ụbọchị atọ,+ o righịkwa ihe, ọ ṅụghịkwa ihe ọ bụla.

10 Na Damaskọs, e nwere otu onye na-eso ụzọ Jizọs aha ya bụ Ananayas.+ Onyenwe anyị kpọrọ ya òkù n’ọhụụ, sị: “Ananayas!” O wee sị: “Onyenwe anyị, lee m.” 11 Onyenwe anyị wee sị ya: “Bilie, gaa n’okporo ámá a na-akpọ Nke Kwụ Ọtọ. I ruo n’ụlọ Judas, jụọ ase otu nwoke aha ya bụ Sọl, onye Tasọs.+ Ọ nọ ebe ahụ na-ekpe ekpere ugbu a. 12 Ọ hụrụ gị bụ́ Ananayas n’ọhụụ ebe ị batara, bikwasị ya aka n’isi ka ọ hụwa ụzọ.”+ 13 Ma Ananayas sịrị: “Onyenwe anyị, anụla m ihe ọtụtụ ndị na-ekwu gbasara nwoke a. Ha na-ekwu gbasara ihe ọjọọ niile o mere ndị nsọ gị na Jeruselem. 14 Ndị isi nchụàjà nyekwara ya ikike ka ọ kpụta ndị niile na-eso ụzọ gị.”*+ 15 Ma Onyenwe anyị gwara ya, sị: “Gawa, n’ihi na ahọrọla m nwoke a+ ka ọ gbaara ndị mba ọzọ,+ ndị eze+ nakwa ndị Izrel àmà gbasara m. 16 M ga-eme ka ọ mara ahụhụ niile ọ ga-ata n’ihi aha m.”+

17 N’ihi ya, Ananayas gawara ebe ahụ. Mgbe ọ banyere n’ụlọ Sọl nọ, o bikwasịrị ya aka n’isi, sị ya: “Sọl, nwanna m, Onyenwe anyị Jizọs, onye pụtara n’ihu gị mgbe ị nọ n’ụzọ na-abịa, zitere m, ka i wee hụwa ụzọ ma jupụta na mmụọ nsọ.”+ 18 Ihe yiri akpịrịkpa si n’anya ya dapụtasịa ozugbo, ya ahụwa ụzọ. O wee bilie, e meekwa ya baptizim, 19 ya erie nri ma nweta ume.

Ya na ndị na-eso ụzọ Jizọs nọ na Damaskọs nọkwara ụbọchị ole na ole.+ 20 N’egbughị oge, ọ malitere kwusawa n’ụlọ nzukọ na Jizọs bụ Ọkpara Chineke. 21 Ma o juru ndị niile na-anụ ihe ọ na-ekwu anya, ha ana-asị: “Onye a ọ́ bụghị nwoke ahụ na-emesi ndị na-eso ụzọ Jizọs* ike na Jeruselem?+ Ihe mekwara o ji bịa ebe a ọ́ bụghị ka o jide ha* ma kpụgara ha ndị isi nchụàjà?”+ 22 Ma Sọl nọ na-enwetakwu ike, na-ezi ndị mmadụ ozi ọma otú na-eme ka ha kweta n’ihe ọ na-ekwu. Otú o si kọwaara ndị Juu bi na Damaskọs na Jizọs bụ Kraịst doro nnọọ anya, ha enweghịkwa ike ịgbagha ihe o kwuru.+

23 Ma mgbe ọtụtụ ụbọchị gachara, ndị Juu kpara nkata igbu ya.+ 24 Ma, Sọl matara gbasara nkata a ha kpaara ya. Ha na-echesikwa ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ nche ike, ma n’ehihie ma n’abalị, ka ha gbuo ya. 25 N’ihi ya, ndị ọ kụziiri ihe kpọọrọ ya ma si n’oghere dị ná mgbidi jiri nkata butuo ya n’abalị.+

26 Mgbe o ruru Jeruselem,+ ọ gbalịrị ka o sonyere ndị na-eso ụzọ Jizọs, ma ha niile nọ na-atụ ya ụjọ, n’ihi na ha ekwetaghị na ọ ghọọla onye na-eso ụzọ Jizọs. 27 N’ihi ya, Banabas+ nyeere Sọl aka, ya na ya agakwuru ndịozi. Banabas wee kọọrọ ha gbasara otú Sọl si hụ Onyenwe anyị n’ụzọ, gwakwa ha na Onyenwe anyị+ gwara Sọl okwu. Ọ kọkwaara ha otú Sọl si kwuo okwu n’aha Jizọs n’atụghị egwu na Damaskọs.+ 28 Sọl na ndịozi ahụ wee nọrọ, ya ana-aga ebe ọ bụla ọ chọrọ ịga na Jeruselem, na-ekwu okwu n’aha Onyenwe anyị n’atụghị egwu. 29 Ya na ndị Juu ndị na-asụ Grik nọkwa na-ekwurịta okwu ma na-arụrịta ụka. Ma, ha nọ na-achọ igbu ya.+ 30 Mgbe ụmụnna matara gbasara ihe a, ha kpọgara ya Sizaria ma ziga ya Tasọs.+

31 Obi malitere iru ọgbakọ niile dị na Judia na Galili na Sameria+ ala n’oge ahụ, okwukwe ha ana-esikwukwa ike. Ha nọkwa na-ehikwu nne maka na ha na-atụ egwu Jehova,* mmụọ nsọ ana-akasikwa ha obi.+

32 Ka Pita nọ na-aga ebe dị iche iche, ọ bịakwutere ndị nsọ bi na Lida.+ 33 N’ebe ahụ, ọ hụrụ otu nwoke aha ya bụ Anias, onye dina n’àkwà* ya kemgbe afọ asatọ, n’ihi na ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ. 34 Pita wee sị ya: “Anias, Jizọs Kraịst agwọọla gị.+ Bilie dozie àkwà gị.”+ O wee bilie ozugbo ahụ. 35 Mgbe ndị niile bi na Lida na Sharọn hụrụ nwoke ahụ, ha kweere n’Onyenwe anyị.

36 Na Jọpa, e nwere otu onye na-eso ụzọ Jizọs aha ya bụ Tabita, nke bụ́ “Dọkas”* n’asụsụ Grik. Ọ na-arụ ọtụtụ ọrụ ọma, na-enyekwara ndị ogbenye aka. 37 Ka Pita ka nọ na Lida, Dọkas rịawara ọrịa, mechaakwa nwụọ. Ndị na-eso ụzọ Jizọs nọ ebe ahụ wee saa ya ahụ́ ma busa ya n’otu ọnụ ụlọ dị n’elu. 38 Ma, Lida dị Jọpa nso. N’ihi ya, mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs nụrụ na Pita nọ na Lida, ha ziri ụmụ nwoke abụọ ka ha gakwuru ya ma sị ya: “Biko, bịa na nke anyị ngwa ngwa.” 39 Pita wee bilie soro ha gawa. Mgbe o ruru, ha duuru ya gaa n’ọnụ ụlọ ahụ dị n’elu. Ụmụ nwaanyị isi mkpe niile bịakwutekwara ya na-ebe ákwá, na-egosi ya ọtụtụ uwe mwụda* na uwe ndị ọzọ Dọkas kwaara ha mgbe ọ dị ndụ. 40 Pita gwaziri mmadụ niile ka ha pụọ n’èzí.+ Mgbe ha pụrụ, o gburu ikpere n’ala, kpee ekpere, tụgharịzie chee ihu n’ebe e busara ozu ahụ ma sị: “Tabita, bilie!” Nwaanyị ahụ wee meghee anya ya. Ozugbo ọ hụrụ Pita, o biliri nọrọ ọdụ.+ 41 Pita wee jide ya n’aka, nyere ya aka ya eguzoro ọtọ. Ọ kpọkwara ndị nsọ na ụmụ nwaanyị ndị ahụ di ha nwụrụ ma gosi ha na Tabita dịzi ndụ.+ 42 Akụkọ ihe a merenụ gbasara na Jọpa niile, ọtụtụ ndị kwekwaara n’Onyenwe anyị.+ 43 Pita nọkwuru ọtụtụ ụbọchị na Jọpa n’ụlọ otu nwoke aha ya bụ Saịmọn, onye na-esiji akpụkpọ anụ.*+

10 E nwere otu nwoke na Sizaria aha ya bụ Kọnịliọs. Ọ bụ onyeisi otu ìgwè ná ndị agha a na-akpọ ndị agha Ịtali.* 2 Ọ na-efe Chineke. Ya na ndị ezinụlọ ya na-atụkwa egwu Chineke. Ọ na-enye ndị ogbenye onyinye, na-arịọkwa Chineke arịrịọ mgbe niile. 3 Otu ụbọchị, n’ihe dị ka n’awa nke itoolu,*+ ọ hụrụ otu mmụọ ozi Chineke nke ọma n’ọhụụ. Mmụọ ozi a bịakwutere ya ma kpọọ ya: “Kọnịliọs!” 4 Kọnịliọs wee jiri ụjọ legide ya anya ma jụọ ya, sị: “Onyenwe anyị, gịnị ka ị chọrọ ka m mee?” Mmụọ ozi ahụ asị ya: “Chineke anụla ekpere gị, hụkwa otú i si na-enyere ndị ogbenye aka.+ 5 N’ihi ya, ziga ndị ozi Jọpa ugbu a ka ha gaa kpọọ otu nwoke aha ya bụ Saịmọn, onye a na-akpọkwa Pita. 6 Ọ bụ ọbịa n’ụlọ otu nwoke aha ya bụ Saịmọn, onye na-esiji akpụkpọ anụ.* Ụlọ nwoke a dị n’akụkụ oké osimiri.” 7 Ozugbo mmụọ ozi a gwara ya okwu pụrụ, ọ kpọrọ mmadụ abụọ n’ime ndị odibo ya, kpọọkwa otu onye agha n’ime ndị na-ejere ya ozi, onye ife Chineke na-amasị, 8 wee kọọrọ ha ihe niile merenụ ma ziga ha Jọpa.

9 N’echi ya, ka ha nọ na-aga, na-erukwa obodo ahụ nso, Pita gbagooro n’elu ụlọ* n’ihe dị ka n’awa nke isii* ka ọ nọrọ ebe ahụ kpee ekpere. 10 Ma, ezigbo agụụ jidere ya. Ka a nọkwa na-esi nri, ọ hụrụ ọhụụ.+ 11 Ọ hụrụ ka eluigwe meghere, hụkwa ka e ji ihe dị ka nnukwu ibé ákwà linin aka n’isi anọ ya, na-ewedata ya n’ụwa. 12 Ụdị anụmanụ niile nọ na ya, ma anụ ndị nwere ụkwụ anọ ma anụ ndị na-arị arị* ma nnụnụ. 13 Ọ nụrụ otu olu gwara ya, sị: “Pita, bilie, gbuo otu n’ime anụ ndị a rie.” 14 Ma Pita sịrị: “Onyenwe anyị, mbanụ, n’ihi na eritụbeghị m ihe rụrụ arụ ma ọ bụ ihe na-adịghị ọcha.”+ 15 Ọ nụkwara olu ahụ nke ugbo abụọ ka ọ sịrị ya: “Kwụsị ịkpọ ihe Chineke mere ka ha dị ọcha ihe rụrụ arụ.” 16 Ihe a mere ugboro atọ. Ozugbo ahụkwa, e buuru ihe ahụ Pita hụrụ bugoo eluigwe.

17 Ma ọhụụ a gbara Pita gharịị. Ka ọ nọkwa na-eche gbasara ihe ọ pụtara, ndị ozi ahụ Kọnịliọs zipụrụ ajụtala ebe ụlọ Saịmọn dị, kwụrụkwa n’ọnụ ụzọ ámá ya.+ 18 Ha kpọrọ onye nwe ụlọ ahụ ma jụọ ya ma Saịmọn Pita ọ̀ nọ ebe ahụ. 19 Ka Pita nọ na-eche gbasara ọhụụ ahụ, Chineke ji mmụọ nsọ ya+ gwa ya, sị: “E nwere ụmụ nwoke atọ na-achọ gị. 20 Bilie, gbadaa n’ala ma soro ha gawa. Enwekwala obi abụọ ọ bụla, n’ihi na ọ bụ m zitere ha.” 21 Pita wee gbadata n’ala, gakwuru ụmụ nwoke ahụ, sị ha: “Lekwanụ m. Ọ bụ m ka unu na-achọ. Gịnị mere unu ji na-achọ m?” 22 Ha asị ya: “Kọnịliọs+ zitere anyị. Ọ bụ onyeisi ndị agha, onye ezi omume, nwoke na-atụ egwu Chineke nakwa onye ndị Juu niile na-akọ akụkọ ọma gbasara ya. Chineke gwara otu mmụọ ozi* ka ọ gwa Kọnịliọs ka o zie ozi ka a kpọọ gị ka ị bịa n’ụlọ ya, ka ọ nụ ihe ị ga-agwa ya.” 23 Pita wee kpọbata ha, ya na ha anọrọ chi abọọ.

N’echi ya, o biliri soro ha gawa. Ụfọdụ n’ime ụmụnna ndị si Jọpa sokwa ya gaa. 24 Nwanne echi ya, ọ banyere Sizaria. Kọnịliọs nọ na-atụ anya ha, kpọkọọkwa ndị ikwu ya na ezigbo ndị enyi ya. 25 Mgbe Pita batara, Kọnịliọs gara zute ya, sekpuru ala n’ihu ya ma kpọọrọ ya isiala. 26 Ma Pita dọlitere ya, sị ya: “Bilie, abụ m mmadụ ibe gị.”+ 27 Ka ha abụọ nọ na-akparịta ụka, Pita banyere n’ime ụlọ ahụ ma hụ ọtụtụ ndị gbakọtaranụ. 28 O wee sị ha: “O doro unu anya na onye Juu dara iwu ndị Juu ma ọ bụrụ na ya na onye mba ọzọ na-akpakọrịta ma ọ bụkwanụ na ọ bịara onye ahụ nso.+ Ma, Chineke gosiri m na e nweghị onye m kwesịrị ịsị na ọ rụrụ arụ ma ọ bụ na ọ dịghị ọcha.+ 29 Ọ bụ ya mere m ji jiri obi m niile bịa mgbe i ziri ka a kpọọ m. Gwazie m ihe mere i ji zie ozi ka m bịa.”

30 Kọnịliọs wee sị: “N’ụdị oge a n’abalị anọ gara aga, anọ m na-ekpe ekpere n’ụlọ m n’awa nke itoolu,* otu nwoke yi uwe na-enwu gbaa bịara guzoro n’ihu m 31 wee sị m: ‘Kọnịliọs, Chineke anụla ekpere gị, hụkwa otú i si na-enyere ndị ogbenye aka. 32 N’ihi ya, ziga ndị ozi Jọpa ka ha gaa kpọọ otu nwoke aha ya bụ Saịmọn, onye a na-akpọkwa Pita. Ọ bụ ọbịa n’ụlọ otu nwoke aha ya bụ Saịmọn, onye na-esiji akpụkpọ anụ.* Ụlọ nwoke a dị n’akụkụ oké osimiri.’+ 33 M wee zie ozi ozugbo ka a kpọọ gị. I meela otú i si bịa. Ugbu a, anyị niile agbakọtala n’ihu Chineke ịnụ ihe niile Jehova* gwara gị ka i kwuo.”

34 Pita wee sị: “O doola m nnọọ anya na Chineke anaghị ele mmadụ anya n’ihu.+ 35 Kama ná mba ọ bụla, ọ na-anabata onye na-atụ egwu ya, nke na-emekwa ihe dị mma.+ 36 Chineke zigaara ụmụ Izrel ozi, ya bụ, ozi ọma gbasara otú ha ga-esi si n’aka Jizọs Kraịst mee ka ha na Chineke dịrị n’udo.+ Jizọs bụkwa Onyenwe ndị ọzọ niile.+ 37 Unu ma onye a nọ na-ekwu banyere ya malite na Galili+ ruo na Judia niile, mgbe Jọn kwusachara gbasara baptizim. 38 Onye ahụ a na-ekwu banyere ya bụ Jizọs onye Nazaret. Chineke ji mmụọ nsọ tee ya mmanụ+ ma nye ya ike. Ebe Chineke nọnyeere ya,+ ọ gazuru ala ahụ na-eme ihe ọma ma na-agwọ ndị niile Ekwensu na-emekpọ ọnụ.+ 39 Anyị jikwa anya anyị hụ ihe niile o mere ma na Jeruselem ma n’obodo ndị ọzọ bụ́ nke ndị Juu. Ma, ha kwụwara ya n’osisi, ya anwụọ. 40 Chineke kpọlitere ya n’ụbọchị nke atọ+ ma mee ka ndị mmadụ hụ ya. 41 O meghị ka mmadụ niile hụ ya, kama, ọ bụ naanị anyịnwa, ndị ya na ha rikọrọ, ṅụkọọ mgbe o bilitechara n’ọnwụ. Chineke họpụtara anyị tupu oge eruo ka anyị hụ ya ma kwuo gbasara ya.+ 42 Ọ gwakwara anyị ka anyị kwusaara ndị mmadụ ozi ọma ma gbaa àmà nke ọma+ na onye a bụ onye Chineke kpebiri na ọ ga-ekpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe.+ 43 Ndị amụma niile na-agbakwa àmà banyere ya,+ na ọ bụ n’aha ya ka a ga-agbaghara onye ọ bụla nke kweere na ya mmehie.”+

44 Ka Pita nọ na-ekwu ihe ndị a, mmụọ nsọ dakwasịrị ndị niile na-ege okwu Chineke ọ na-ekwu.+ 45 Ihe a juru ndị Juu na-eso ụzọ Jizọs* so Pita bịa anya, n’ihi na mmụọ nsọ, bụ́ onyinye Chineke na-enye, dakwasịkwara ndị mba ọzọ. 46 N’ihi na ha nụrụ ka ha na-ekwu okwu n’asụsụ dị iche iche, na-etokwa Chineke.+ Pita wee sị: 47 “Ebe ọ bụ na mmụọ nsọ adakwasịla ndị a otú ọ dakwasịrị anyị, ò nwere onye ga-asị na a gaghị eme ha baptizim?”+ 48 O wee sị ka e mee ha baptizim n’aha Jizọs Kraịst.+ E mechaa, ha arịọ ya ka ọ nọnyere ha ụbọchị ole na ole.

11 Ndịozi na ụmụnna nọ na Judia nụrụ na ndị mba ọzọ anabatala okwu Chineke. 2 Ma, mgbe Pita gbagotere Jeruselem, ndị chọrọ ka ndị mba ọzọ na-ebi úgwù+ malitere ịkatọ ya, 3 na-asị: “Ị banyere n’ụlọ ndị a na-ebighị úgwù, sorokwa ha rie ihe.” 4 Pita wee bido ịkọwara ha ihe niile merenụ, sị:

5 “Anọ m na Jọpa na-ekpe ekpere, mechaakwa hụ ọhụụ. Ahụrụ m ka e ji ihe dị ka nnukwu ibé ákwà linin aka n’isi anọ ya, si n’eluigwe na-ewedata ya n’ụwa, ya erutekwa nnọọ n’ebe ahụ m nọ.+ 6 Mgbe m lebara anya n’ime ya, ahụrụ m anụ ndị nwere ụkwụ anọ, anụ ọhịa, anụ ndị na-arị arị,* na nnụnụ. 7 Anụkwara m olu sịrị m: ‘Pita, bilie, gbuo otu n’ime anụ ndị a rie.’ 8 Ma m sịrị: ‘Onyenwe anyị, mbanụ, n’ihi na ihe rụrụ arụ ma ọ bụ ihe na-adịghị ọcha abatụbeghị m n’ọnụ.’ 9 Olu ahụ nke si n’eluigwe sịrị nke ugboro abụọ: ‘Kwụsị ịkpọ ihe Chineke mere ka ha dị ọcha ihe rụrụ arụ.’ 10 Ihe a mere ugboro atọ, e buruzie ihe niile ahụ bugoo eluigwe. 11 N’otu oge ahụkwa, ụmụ nwoke atọ guzo n’ihu ụlọ ahụ anyị nọ. E si Sizaria zite ha ka ha bịa hụ m.+ 12 Chineke wee jiri mmụọ nsọ gwa m ka m soro ha gawa n’enweghị obi abụọ ọ bụla. Ụmụnna isii ndị a sokwa m gaa, anyị abanye n’ụlọ nwoke zitere ndị ahụ bịara hụ m.

13 “Ọ kọọrọ anyị otú o si hụ mmụọ ozi bịara guzoro n’ụlọ ya, sị ya: ‘Ziga ndị ozi Jọpa ka ha gaa kpọọ Saịmọn, onye a na-akpọ Pita.+ 14 Ọ ga-agwa gị otú a ga-esi zọpụta gị na ezinụlọ gị.’ 15 Ma mgbe m malitere ikwu okwu, mmụọ nsọ dakwasịrị ha otú ahụ ọ dakwasịrị anyị ná mmalite.+ 16 M wee cheta ihe Onyenwe anyị na-adị ekwu: ‘Jọn ji mmiri mee ndị mmadụ baptizim,+ ma a ga-eji mmụọ nsọ mee unu baptizim.’+ 17 N’ihi ya, ọ bụrụ na Chineke nyere ha otu onyinye ahụ ọ na-enye n’efu otú o nyekwara anyịnwa bụ́ ndị kweere n’Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, ònye ka m bụ igbochi Chineke ime ihe ọ chọrọ ime?”+

18 Ma mgbe ha nụrụ ihe ndị a, ha kwụsịrị ịkatọ ya,* wee nye Chineke otuto, sị: “Ọ bụrụ otú ahụ, Chineke chọkwara ka ndị mba ọzọ chegharịa, ka ha wee nweta ndụ.”+

19 Mgbe e gbuchara Stivin, a malitekwara ịkpagbu ndị kwere ekwe ndị ọzọ. N’ihi ya, ha gbagara+ Finishia, Saịprọs, na Antiọk. Ma, ọ bụ naanị ndị Juu ka ha nọ na-ezi ozi ọma.+ 20 Ma, ụfọdụ n’ime ha ndị si Saịprọs na Saịrini gara Antiọk, malite izisara ndị na-asụ Grik ozi ọma banyere Onyenwe anyị Jizọs. 21 Jehova* nọnyekwaara ha. Ọtụtụ ndị ghọrọ ndị kwere ekwe ma malite iso ụzọ Onyenwe anyị.+

22 Ọgbakọ dị na Jeruselem nụrụ gbasara ha. Ha wee ziga Banabas+ Antiọk. 23 Mgbe o ruru wee hụ otú Chineke si na-emere ndị na-eso ụzọ Jizọs amara, ọ ṅụrịrị ọṅụ ma malite ịgba ha niile ume ka ha jiri obi ha niile na-eso ụzọ Onyenwe anyị.+ 24 Banabas bụ ezigbo mmadụ. O nwere okwukwe, jupụtakwa na mmụọ nsọ. N’ihi ya, ọtụtụ ndị bịara kwere n’Onyenwe anyị.+ 25 Ọ gawara Tasọs ịga chọọ Sọl.+ 26 Mgbe ọ hụrụ ya, ha abụọ sooro gaa Antiọk. Ruo otu afọ zuru ezu, ha nọ na-eso ọgbakọ dị ebe ahụ ezukọta, ha kụzikwaara ìgwè mmadụ ihe. Antiọk bụkwa ebe mbụ a kpọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs Ndị Kraịst otú Chineke si chọọ.+

27 N’oge ahụ, ụfọdụ ndị amụma+ si Jeruselem gaa Antiọk. 28 Otu n’ime ha bụ Agabọs.+ O si n’ike mmụọ nsọ kwuo na oké ụnwụ ga-ada n’ụwa niile.+ Ụnwụ a mechara daa n’oge Klọdiọs. 29 N’ihi ya, ndị na-eso ụzọ Jizọs kpebiri izigara ụmụnna ha bi na Judia ihe enyemaka+ otú aka onye nke ọ bụla n’ime ha hà.+ 30 Ha mekwara ihe a ha kpebiri, si n’aka Banabas na Sọl zigara ndị okenye ihe ndị ahụ.+

12 N’oge ahụ, Eze Herọd malitere ịkpagbu ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ.+ 2 O ji mma agha+ gbuo Jems nwanne Jọn.+ 3 Mgbe ọ hụrụ na ọ dị ndị Juu mma, o jidekwuru Pita. (Ihe a mere n’oge a na-eme Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko.)+ 4 Mgbe o jidere ya, ọ tụbara ya n’ụlọ mkpọrọ,+ nyefee ya n’aka ndị agha dị iri na isii ka ha na-eche ya nche, anọ chechaa, anọ ọzọ echee. O bu n’uche ịkpọpụta ya* n’ihu ndị Juu ma e mechaa Ememme Ngabiga. 5 Ka Pita nọ n’ụlọ mkpọrọ, ọgbakọ nọ na-ekpesi ekpere ike maka ya.+

6 N’abalị bọtara ụbọchị Herọd bu n’uche ịkpọpụta ya, Pita nọ na-ehi ụra n’agbata ndị agha abụọ. E jikwa agbụ ígwè e kere ya kegide n’ahụ́ ndị agha abụọ ahụ. E nwekwara ndị nche nọ n’ọnụ ụzọ na-eche ụlọ mkpọrọ ahụ nche. 7 Ma, mmụọ ozi Jehova* bịara guzoro ebe ahụ,+ ìhè nwukwara n’ime ụlọ mkpọrọ ahụ. Ọ kụtụrụ Pita aka n’akụkụ, kpọtee ya, sị: “Bilie ọsọ ọsọ!” Agbụ ígwè e kere ya n’aka wee dapụsịa.+ 8 Mmụọ ozi ahụ sịrị ya: “Yiri ákwà gị,* yirikwa akpụkpọ ụkwụ gị.” O wee mee ihe ọ gwara ya. Mmụọ ozi ahụ gwaziri ya, sị: “Yiri uwe elu gị, sowe m.” 9 Pita wee si n’ụlọ mkpọrọ ahụ pụọ, soro ya na-aga. Ma, ọ maghị na ihe mmụọ ozi ahụ na-eme bụ n’ìhè. N’eziokwu, o chere na ọ na-ahụ ọhụụ. 10 Ka ha gafere ndị nche nke mbụ na ndị nke abụọ, ha ruru n’ọnụ ụzọ ámá e ji ígwè mee, nke e si abanye n’obodo, ụzọ ahụ emeghee n’onwe ya, ha agafere. Mgbe ha gafechara, ha gatụrụ obere n’okporo ámá, ozugbo ahụkwa, mmụọ ozi ahụ hapụrụ ya. 11 Mgbe Pita matara ihe na-emenụ, ọ sịrị: “Ugbu a ka m matara n’eziokwu na Jehova* zitere mmụọ ozi ya wee napụta m n’aka Herọd, napụtakwa m n’ihe niile ndị Juu nọ na-atụ anya na a ga-eme m.”+

12 Mgbe o chechara ihe a, ọ gara n’ụlọ Meri nne Jọn. Aha Jọn a bụkwa Mak.+ Ọtụtụ ndị na-eso ụzọ Jizọs zukọtara ebe ahụ na-ekpe ekpere. 13 Mgbe ọ kụrụ aka n’ụzọ, otu nwa agbọghọ na-eje ozi, onye aha ya bụ Roda, bịara ịmata onye na-akụ aka. 14 Ozugbo ọ nụrụ olu Pita, ọṅụ ekweghị ya meghee ụzọ, kama ọ gbabara n’ime ụlọ ma gwa ndị nọ ebe ahụ na ọ bụ Pita guzo n’ọnụ ụzọ. 15 Ha sịrị ya: “Ị maghị ihe ị na-ekwu.” Ma ọ nọ na-ekwusi ike na ọ bụ Pita. Ha asịzie: “Ọ bụ mmụọ ozi.”* 16 Ma Pita ka nọ ebe ahụ na-akụ aka. Mgbe ha meghere ụzọ, ha hụrụ ya, ya eju ha anya. 17 Ma o feere ha aka ka ha nọrọ jụụ. O wee kọọrọ ha ihe niile banyere otú Jehova* si kpọpụta ya n’ụlọ mkpọrọ. Ọ sịkwara: “Kọọrọnụ Jems+ na ụmụnna ndị ọzọ ihe ndị a.” Mgbe o kwuchara ihe a, ọ pụrụ gawa ebe ọzọ.

18 Mgbe chi bọrọ, ndị agha ahụ amaghị ihe ha ga-eme eme maka na ha amaghị ihe mere Pita. 19 Herọd chọrọ Pita ebe niile, ma ọ hụghị ya. O wee gbaa ndị nche ahụ ajụjụ ma kwuo ka a kpụrụ ha gaa taa ha ahụhụ.+ Herọd wee si na Judia gaa Sizaria ma nọtụ ebe ahụ.

20 Ma, ndị Taya na ndị Saịdọn na Herọd na-ese okwu. N’ihi ya, ha ji otu obi bịa ịhụ Herọd. Ma, ha bu ụzọ gakwuru Blastọs, bụ́ onye na-elekọta ụlọ ya,* ka o nyere ha aka. Mgbe ha na ya hụchara, ha gakwuuru Herọd ka ha na ya kpezie, n’ihi na ọ bụ n’ala Herọd na-achị ka obodo abụọ ahụ si enweta ihe oriri. 21 Ka ndị mmadụ zụkọrọ n’otu ụbọchị pụrụ iche, Herọd yiiri uwe onye eze ma nọdụ ala n’oche ikpe wee malite ịgwa ha okwu. 22 Ndị ahụ zukọrọ malitere iti mkpu, sị: “Olu ya bụ olu chi. Ọ bụghị olu mmadụ!” 23 Ozugbo ahụ, mmụọ ozi Jehova* mere ka ikpuru gbaa ya, ya anwụọ, n’ihi na ọ naara otuto e kwesịrị inye Chineke.

24 Ma okwu Jehova* nọ na-agbasa, ọtụtụ ndị ana-aghọkwa ndị na-eso ụzọ Jizọs.+

25 Mgbe Banabas+ na Sọl butechaara ụmụnna nọ na Jeruselem ihe enyemaka,+ ha laghachiri Antiọk. Ha kpọọrọ Jọn,+ onye aha ya bụkwa Mak.

13 E nwere ndị amụma na ndị na-akụzi ihe n’ọgbakọ dị n’Antiọk.+ Ha bụ: Banabas na Simiọn onye aha ya bụkwa Naịja, na Lushiọs onye Saịrini, na Manen onye ya na Herọd onye na-achị ógbè ahụ gụkọrọ akwụkwọ, nakwa Sọl. 2 Ka ha nọ na-ejere Jehova* ozi ma na-ebu ọnụ, Chineke ji mmụọ nsọ ya sị: “Kpọpụtaranụ m Banabas na Sọl+ maka na e nwere ọrụ m kpọrọ ha ka ha rụọ.”+ 3 Mgbe ha buchara ọnụ, kpeekwa ekpere, ha bikwasịrị ha aka n’isi wee sị ha gaa nke ọma.

4 Mmadụ abụọ a Chineke ji mmụọ nsọ ya zipụ gawara Seliushia, sizie ebe ahụ banye ụgbọ mmiri bugara ha Saịprọs. 5 Mgbe ha ruru Salamis, ha malitere ikwusa okwu Chineke n’ụlọ nzukọ ndị Juu. Jọn nọkwa na-ejere ha ozi.*+

6 Mgbe ha gazuru agwaetiti ahụ niile wee ruo Pefọs, ha hụrụ otu nwoke onye Juu, bụ́ dibịa afa. Aha ya bụ Baa-Jizọs. Ọ bụkwa onye amụma ụgha. 7 Ya na onye na-achị ebe ahụ nọ. Aha onye a bụ Sajiọs Pọlọs. Ọ bụ nwoke ma ihe. Nwoke a kpọrọ Banabas na Sọl ka ha bịa na nke ya n’ihi na ọ chọrọ ịnụ okwu Chineke. 8 Ma dibịa afa ahụ, onye a na-akpọkwa Elimas (nke pụtara dibịa afa), malitere inye ha nsogbu, na-achọ ime ka onye ahụ na-achị ebe ahụ ghara ikwere n’Onyenwe anyị. 9 Sọl, onye a na-akpọkwa Pọl, jupụtara na mmụọ nsọ, wee legidesie ya anya ike, 10 sị ya: “Gị onye ụdị aghụghọ ọ bụla na ụdị arụrụala ọ bụla juru n’obi, nwa Ekwensu,+ onye iro nke ihe niile dị mma, gịnị mere i ji akpọdo eziokwu Jehova* isi n’ala? 11 Ugbu a, Jehova* ga-ata gị ahụhụ. Ị ga-ekpu ìsì, ị gaghịkwa ahụ ìhè anyanwụ ruo nwa oge.” N’otu ntabi anya ahụ, alụlụụ na ọchịchịrị kpuchiri ya anya, ya ana-asọ ìsì na-achọ onye ga-ejide ya n’aka na-edu ya. 12 Mgbe onye ahụ na-achị ebe ahụ hụrụ ihe merenụ, ọ ghọrọ onye na-eso ụzọ Jizọs, n’ihi na ihe ndị ọ nụrụ gbasara Jehova* tụrụ ya n’anya.

13 Pọl na ndị ya na ha so wee banye ụgbọ mmiri na Pefọs, ya ebuga ha Paga nke dị na Pamfilia. Ma Jọn+ hapụrụ ha, laghachi Jeruselem.+ 14 Ma, ha si Paga gaa Antiọk dị na Pisidia. Ha banyekwara n’ụlọ nzukọ+ n’Ụbọchị Izu Ike nọrọ ọdụ. 15 Mgbe a gụpụtachaara ndị mmadụ Iwu Mosis+ na Akwụkwọ Ndị Amụma,* ndị isi oche ụlọ nzukọ ahụ sịrị ha: “Ụmụnna anyị, ọ bụrụ na unu nwere okwu ga-agba anyị ume, kwuwenụ ya.” 16 Pọl wee bilie, feere mmadụ niile aka ka ha nọrọ jụụ. O wee sị:

“Ndị Izrel na ndị ọzọ na-atụ egwu Chineke, geenụ ntị. 17 Chineke ndị Izrel họọrọ nna nna anyị hà, meekwa ka ha bụrụ mba dị ike mgbe ha bụ ndị mbịarambịa n’Ijipt. O jikwa ike ya dị ukwuu* kpọpụta ha n’ala ahụ.+ 18 Ọ nọ na-edi omume ọjọọ ha na-eme n’ala ịkpa ruo ihe dị ka iri afọ anọ.+ 19 Mgbe o bibichara mba asaa n’ala Kenan, o nyere ndị nna nna anyị ala ha.+ 20 Ihe ahụ niile merenụ were ihe dị ka narị afọ anọ na iri ise (450).

“Mgbe ihe ndị a mechara, ọ nọ na-enye ha ndị ikpe ruo n’oge Samuel onye amụma.+ 21 Ha mechara kwuo ka e nye ha eze.+ Chineke wee nye ha Sọl nwa Kish, nwoke si n’ebo Benjamin.+ Ọ chịrị ha afọ iri anọ. 22 Mgbe ọ kwụsịrị ya ịbụ eze, o mere ka Devid bụrụ eze ha.+ O kwuru banyere ya, sị: ‘Ahọrọla m Devid nwa Jesi,+ nwoke obi m nabatara.+ Ọ ga-eme ihe niile m na-achọ.’ 23 Chineke si n’ụmụ* nwoke a wetara Izrel onye nzọpụta bụ́ Jizọs,+ otú o kwere ná nkwa. 24 Tupu Jizọs abịa, Jọn kwusaara ndị Izrel niile na ha kwesịrị ime baptizim iji gosi na ha echegharịala.+ 25 Ma mgbe ọrụ Jọn na-agwụcha, ọ na-adị asị: ‘Ònye ka unu chere na m bụ? Abụghị m onye unu chere na m bụ. Kama, e nwere onye na-abịa n’azụ m, onye m na-erughị eru ịtọpụ akpụkpọ ụkwụ ya.’+

26 “Ụmụnna m, ndị si n’agbụrụ Ebreham nakwa ndị ọzọ na-atụ egwu Chineke n’ime unu, ọ bụ anyị niile ka Chineke ziteere ozi gbasara nzọpụta anyị.+ 27 N’ihi na ndị bi na Jeruselem na ndị na-achị ha amaghị onye a. Ma, mgbe ha na-ekpe ya ikpe, ha mezuru ihe Akwụkwọ Ndị Amụma kwuru,+ bụ́ ihe a na-agụpụta kwa ụbọchị izu ike. 28 N’agbanyeghị na ha ahụghị ihe ọ bụla mere a ga-eji gbuo ya,+ ha gwara Paịlet ka e gbuo ya.+ 29 Mgbe ha mezuru ihe niile e dere banyere ya, ha si n’elu osisi budata ya ma lie ya.*+ 30 Ma Chineke kpọlitere ya n’ọnwụ.+ 31 O gosikwara ndị ya na ha so si Galili gaa Jeruselem onwe ya ruo ọtụtụ ụbọchị. Ọ bụ ndị ahụ na-agbara ndị Juu àmà banyere ya ugbu a.+

32 “N’ihi ya, anyị na-ezi unu ozi ọma banyere nkwa ahụ Chineke kwere nna nna anyị hà. 33 Ọ kpọlitere Jizọs n’ọnwụ,+ si otú ahụ meere anyịnwa, bụ́ ụmụ ha, ihe ahụ niile o kwere ná nkwa, dị ka e dere ya n’abụ ọma nke abụọ, sị: ‘Ị bụ ọkpara m. Abụrụla m nna gị taa.’+ 34 Chineke kpọlitere ya n’ọnwụ. Ọ gaghị abụ mmadụ ọzọ, ọ gaghịkwa anwụ anwụ ma ọ bụ ree ure. Chineke gosiri na ihe a bụ eziokwu mgbe ọ sịrị: ‘M gaghị akwụsị ịhụ unu n’anya* otú ahụ m kwere Devid ná nkwa. E kwesịrị ịtụkwasị m obi na m ga-emezu nkwa a.’+ 35 O kwukwara ebe ọzọ n’abụ ọma, sị: ‘Ị gaghị ekwe ka onye jisiri gị aka ike ree ure.’+ 36 Devid mere ihe Chineke chọrọ n’oge nke ya, mechaa nwụọ, e lie ya otú e si lie ndị nna nna ya, ya ereekwa.+ 37 Ma, onye ahụ Chineke kpọlitere n’ọnwụ ereghị ure.+

38 “N’ihi ya, ụmụnna m, ya doo unu anya na ọ bụ naanị Jizọs ka Chineke na-esi n’aka ya agbaghara anyị mmehie. Ọ bụ ihe a ka a na-ekwusara unu.+ 39 Marakwanụ na Iwu Mosis emelighị ka unu bụrụ ndị ezi omume.+ Ma n’ihi ọnwụ nwoke a, Chineke ga-agụ onye ọ bụla kweere na ya n’onye ezi omume.+ 40 N’ihi ya, kpacharanụ anya ka ihe e kwuru n’Akwụkwọ Ndị Amụma ghara ime unu. E kwuru, sị: 41 ‘Unu ndị ọ na-amasị ilelị ihe anya, hụnụ ọrụ m na-arụ n’oge unu. Ọ bụ ọrụ unu na-agaghị ekweta na m rụrụ ọ bụrụgodị na mmadụ akọọrọ unu ya nke ọma. Ma, ọ ga-eju unu anya, unu ga-alakwa n’iyi.’”+

42 Mgbe ha na-apụ, ndị Juu rịọrọ ha ka ha gwakwuo ha ihe ndị a n’Ụbọchị Izu Ike na-abịanụ. 43 Mgbe ndị zukọrọ n’ụlọ nzukọ ahụ gbasara, ọtụtụ ndị Juu na ndị mba ọzọ na-ekpe okpukpe ndị Juu* sooro Pọl na Banabas. Ha gwara ha okwu, gbaakwa ha ume ka ha ghara ikwe ka amara Chineke kwaa ha.+

44 N’Ụbọchị Izu Ike sochirinụ, ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ obodo ahụ niile zukọrọ ka ha nụ okwu Jehova.* 45 Mgbe ndị Juu hụrụ ìgwè mmadụ ahụ, ekworo juru ha obi, ha amalitekwa ịgbagha ihe Pọl na-ekwu, si otú ahụ kwuluo Chineke.+ 46 Pọl na Banabas wee gwa ha n’atụghị egwu, sị: “Ọ dị mma na unu bụ ndị mbụ a gwara okwu Chineke.+ Ma, ebe ọ bụ na unu jụrụ ya, meekwa onwe unu ndị na-erughị eru inweta ndụ ebighị ebi, anyị na-agakwuru ndị mba ọzọ.+ 47 N’ihi na Jehova* gwara anyị, sị: ‘Ahọpụtala m gị ka ị bụụrụ mba dị iche iche ìhè, ka i wee gaa n’ebe niile n’ụwa kwusaa otú m ga-esi azọpụta ndị mmadụ.’”+

48 Mgbe ndị mba ọzọ nụrụ ihe a, ha malitere ịṅụrị ọṅụ, na-ekwukwa na okwu Jehova* dị ebube. Ndị niile na-akpa àgwà otú na-egosi na ha chọrọ inweta ndụ ebighị ebi wee ghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. 49 A nọkwa na-agbasa okwu Jehova* ná mba ahụ niile. 50 Ma, ndị Juu mere ka ụmụ nwaanyị a ma ama, ndị bu okpukpe n’isi, na ụmụ nwoke nwere agba n’obodo, megidewe+ Pọl na Banabas. Ha wee mesie ha ike ma chụpụ ha n’obodo ha. 51 Pọl na Banabas wee tichapụrụ ha ájá dị ha n’ụkwụ ma gawa Aịkoniọm.+ 52 Ndị na-eso ụzọ Jizọs wee na-ejupụta na mmụọ nsọ, obi ana-abụkwa ha sọ aṅụrị.+

14 N’Aịkoniọm, Pọl na Banabas banyere n’ụlọ nzukọ ndị Juu ma kwuo okwu otú mere ka ọtụtụ ndị, ma ndị Juu ma ndị Grik, ghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. 2 Ma ndị Juu na-anabataghị ihe ụmụnna ndị a kwuru mere ka ndị mba ọzọ megidewe ha.+ 3 Ha wee nọtụkwuo izu ole na ole ebe ahụ, Jehova* enyekwa ha ike, ha ana-ekwu okwu ya n’atụghị egwu. O sikwa n’aka ha rụọ ọrụ ebube dị iche iche iji gosi na ozi ha na-ezi bụ ozi gbasara amara Chineke.+ 4 Ma, ndị obodo ahụ kewara abụọ. Ụfọdụ nọ na-akwado ndị Juu, ndị ọzọ ana-akwado Pọl na Banabas. 5 Mgbe ndị mba ọzọ na ndị Juu nakwa ndị na-achị ha kpara nkata imenye ha ihere na ịtụ ha nkume,+ 6 a gwara ha gbasara ya, ha agbaga n’obodo ndị dị na Likeonia, ya bụ, Listra na Dabe na obodo ndị dị ha gburugburu.+ 7 Ha nọkwa na-ezisa ozi ọma n’ebe ndị ahụ.

8 Na Listra, e nwere otu nwoke nọ ọdụ. Ọ dara ngwọrọ, o jetụbeghịkwa ije kemgbe a mụrụ ya. 9 Nwoke a nọ na-ege ntị ka Pọl na-ekwu okwu. Mgbe Pọl legidere ya anya ma hụ na o kweere n’ihe ọ na-akụzi, kwerekwa na a ga-eme ka ahụ́ dị ya mma,+ 10 o kwuru n’olu dara ụda, sị: “Guzoro ọtọ.” O wee malie, malite ije ije.+ 11 Mgbe ndị mmadụ hụrụ ihe Pọl mere, ha tiri mkpu n’asụsụ ndị Likeonia, sị: “Ndị bụ́ chi dịzi ka ụmụ mmadụ bịakwute anyị!”+ 12 Ha wee malite ịkpọ Banabas Zus,* ma na-akpọ Pọl Hemis,* maka na ọ bụ ya ka ekwu okwu. 13 Onye nchụàjà n’ụlọ arụsị Zus, nke dị n’ọnụ ụzọ ámá obodo Listra, wetara okooko osisi, kpụtakwa oké ehi ndị ya na ìgwè mmadụ ahụ chọrọ iji chụọrọ Pọl na Banabas àjà.

14 Ma, mgbe Banabas onyeozi na Pọl onyeozi nụrụ gbasara ya, ha dọwara uwe ha, gbara ọsọ gakwuru ìgwè mmadụ ahụ, tie mkpu, sị ha: 15 “Gịnị mere unu ji eme ihe ndị a? Anyị bụ mmadụ nkịtị otú unu bụ.+ Anyị na-ezisara unu ozi ọma, ka unu kwụsị ife ihe efu ndị a ma bịa fewe Chineke dị ndụ, onye kere eluigwe na ụwa na oké osimiri na ihe niile dị n’ime ha.+ 16 N’oge ochie, ọ hapụrụ ndị mba ọzọ niile ka ha na-eme otú masịrị ha.+ 17 Ma, ihe ọma ndị ọ na-eme na-egosi unu ụdị onye ọ bụ.+ Ọ na-eme ka mmiri si n’eluigwe zooro unu, na-eme ka mkpụrụ unu kụrụ na-amị n’oge ya n’uju,+ na-enye unu nri hiri nne, na-emekwa ka unu na-enwe obi ụtọ.”+ 18 Ma n’agbanyeghị ihe ndị a ha kwuru, o siiri ha ike tupu ha egbochie ìgwè mmadụ ahụ ịchụrụ ha àjà.

19 Ma, e nwere ndị Juu si Antiọk na Aịkoniọm bịa mee ka ìgwè mmadụ ahụ megidewe Pọl,+ tụọ ya nkume, kpụrụkwa ya gaa kpụsa n’azụ obodo, na-eche na ọ nwụọla.+ 20 Ma, mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs gbara ya gburugburu, o biliri ma banye n’obodo. N’echi ya, ya na Banabas gawara Dabe.+ 21 Mgbe ha zichara ozi ọma n’obodo ahụ, meekwa ka ọtụtụ ndị bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs, ha laghachiri Listra, Aịkoniọm, na Antiọk. 22 Ha nọ na-agba ndị na-eso ụzọ Jizọs nọ n’ebe ndị ahụ ume+ ka ha sie ike n’okwukwe. Ha sịkwara ha: “Ọtụtụ nsogbu ga-abịara anyị tupu anyị abanye n’Alaeze Chineke.”+ 23 Ha họpụtakwara ndị okenye n’ọgbakọ nke ọ bụla.+ Ha kpere ekpere, buo ọnụ,+ ma nyefee ndị okenye ahụ n’aka Jehova* maka na ha kweere na ya.

24 Ha* wee si Pisidia bata Pamfilia.+ 25 Mgbe ha kwusachara okwu Chineke na Paga, ha gawara Atalaya. 26 Ha sikwa ebe ahụ banye ụgbọ mmiri bugara ha Antiọk. N’oge mbụ ha gara Antiọk, ụmụnna nọ ebe ahụ rịọrọ Chineke ka o meere ha* amara ka ha rụchaa ọrụ a ha rụcharala ugbu a.+

27 Mgbe ha ruru Antiọk, kpọkọta ọgbakọ ahụ, ha kọọrọ ha ọtụtụ ihe Chineke si n’aka ha mee, kọọkwa na o megheerela ndị mba ọzọ ụzọ ha ga-esi kwere na ya.+ 28 Ha na ndị na-eso ụzọ Jizọs bi ebe ahụ nọkwara ruo oge ụfọdụ.

15 E nwere ụmụ nwoke ụfọdụ si Judia bịa Antiọk ma malite ịkụziri ụmụnna, sị: “Ọ bụrụ na e bighị unu úgwù dị ka Iwu Mosis kwuru,+ a gaghị azọpụta unu.” 2 N’ihi ya, ha na Pọl na Banabas nwere nghọtahie, rụọkwa ezigbo ụka. Ụmụnna meziri ndokwa ka Pọl na Banabas na ụfọdụ ụmụnna ndị ọzọ gakwuru ndịozi na ndị okenye nọ na Jeruselem+ gbasara okwu a.

3 Mgbe ọgbakọ ahụ dupụchara ụmụnna ndị a, Pọl na ndị ya na ha so gara Finishia, gaakwa Sameria, na-akọrọ ha ihe niile gbasara otú ndị mba ọzọ si na-echegharị. Obi bụkwa ụmụnna ahụ niile sọ aṅụrị mgbe ha nụrụ ihe ndị a. 4 Mgbe ha ruru Jeruselem, ọgbakọ dị ebe ahụ na ndịozi na ndị okenye nabatara ha nke ọma. Pọl na Banabas kọkwaara ha ọtụtụ ihe Chineke si n’aka ha mee. 5 Ma, ụfọdụ n’ime ndị nọbu n’òtù ndị Farisii, ndị ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs, biliri n’oche ha, sị: “E kwesịrị ibi ha úgwù, gwakwa ha ka ha na-edebe Iwu Mosis.”+

6 Ndịozi na ndị okenye wee zukọta ka ha leba anya n’okwu a. 7 Ma mgbe ha kwutere okwu a aka, Pita biliri, sị ha: “Ụmụnna m, unu ma nke ọma na Chineke si n’ime anyị niile họrọ m ná mmalite, ka ndị mba ọzọ si n’ọnụ m nụ ozi ọma ma kwere.+ 8 Chineke, onye ma obi mmadụ,+ nyekwara ha mmụọ nsọ+ otú o nyere anyị, iji gosi na ọ nabatala ha. 9 Otú o si were anyị ka o sikwa were ha,+ n’ihi na o mere ka obi ha dị ọcha maka na ha nwere okwukwe.+ 10 Gịnịzi mere unu ji akpasu Chineke iwe? Unu na-ebokwasị ndị na-eso ụzọ Jizọs ibu+ nna nna anyị hà na anyịnwa na-ebulighị.+ 11 Ma, obi siri anyị ike na a ga-esi n’amara Onyenwe anyị Jizọs+ zọpụta anyị otú ahụ a ga-azọpụta ha.”+

12 Mgbe o kwuchara ihe a, ebe niile dara jụụ, mmadụ niile nọ ebe ahụ malitekwara ige Banabas na Pọl ntị ka ha na-akọ ọtụtụ ọrụ ebube Chineke si n’aka ha rụọrọ ndị mba ọzọ. 13 Mgbe ha kwuchara, Jems sịrị: “Ụmụnna m, geenụ m ntị. 14 Simiọn*+ akọọrọla anyị nke ọma otú Chineke si cheta ndị mba ọzọ, malitezie isi n’ime ha na-ahọrọ ndị ga-aza aha ya.+ 15 Ihe a o kwuru dabara n’ihe ndị amụma dere. Ha dere, sị: 16 ‘Ihe ndị a mechaa, m ga-alaghachi bulite ụlọikwuu* Devid dara ada. M ga-arụghachikwa ebe niile e bibiri ebibi na ya ma mee ka ha dị otú ha dịbu, 17 ka ndị fọdụrụ wee chọsie mụnwa bụ́ Jehova* ike, ha na ndị mba ọzọ niile, ndị na-aza aha m. Ọ bụ mụnwa bụ́ Jehova* kwuru ihe ndị a. Ọ bụ m na-eme ha.+ 18 O teela m kpebiri ime ha.’+ 19 N’ihi ya, uche m bụ ka a ghara inye ndị mba ọzọ chọrọ ife Chineke nsogbu.+ 20 Kama ka e degara ha akwụkwọ ka ha jụ ihe ọ bụla gbasara ikpere arụsị,+ ghara ịkwa iko,*+ ghara iri anụ a nyagburu anyagbu,* gharakwa iri ọbara.+ 21 N’ihi na kemgbe oge ochie, e nwere ndị na-ekwusa banyere Mosis n’obodo dị iche iche, n’ihi na e nwere ndị na-agụpụta ihe ndị o dere n’ụlọ nzukọ dị iche iche kwa ụbọchị izu ike.”+

22 Ndịozi na ndị okenye nakwa ndị niile nọ n’ọgbakọ wee kpebie ka ha họpụta ụmụ nwoke abụọ n’ime ha ma ziga ha na Pọl na Banabas Antiọk. Ha wee ziga Judas onye a na-akpọ Basabas nakwa Saịlas,+ ndị na-arụrụ ụmụnna ha ezigbo ọrụ n’ọgbakọ. 23 Ha dere akwụkwọ nye ha. Ihe e dere n’akwụkwọ ahụ bụ:

“Ọ bụ ụmụnna unu, ma ndịozi ma ndị okenye, na-edetara ụmụnna ndị nọ n’Antiọk+ na Siria na Silishia, bụ́ ndị mba ọzọ, akwụkwọ ozi a: Anyị na-ekele unu. 24 Anyị anụla na ụfọdụ n’ime anyị bịara na-agwa unu okwu na-enye unu nsogbu,+ na-achọ ime ka unu hapụ ihe unu kweere. N’eziokwu, ọ bụghị anyị gwara ha ihe ahụ ha gwara unu. 25 Anyị ji otu olu kwekọrịta ịhọta ụmụ nwoke abụọ anyị ga-ezitere unu, tinyere ndị anyị hụrụ n’anya, bụ́ Banabas na Pọl, 26 ndị nyere ndụ* ha maka aha Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.+ 27 N’ihi ya, anyị na-ezite Judas na Saịlas, ka ha wee jiri ọnụ ha kọọkwa otu ihe a dị n’akwụkwọ ozi a.+ 28 Mmụọ nsọ+ enyerela anyị aka ikpebi na a gaghị ebo unu ibu arọ, ma e wezụga ihe ndị a dị mkpa: 29 ka unu jụ ihe ọ bụla gbasara ikpere arụsị,+ ghara iri ọbara,+ ghara iri anụ a nyagburu anyagbu,*+ gharakwa ịkwa iko.*+ Ọ bụrụ na unu elezie anya jụ ihe ndị a, ọ ga-adịrị unu mma. Nọrọnụ nke ọma.”

30 Pọl na ndị ya na ha so aga wee gawa Antiọk. Mgbe ha ruru, ha kpọkọtara ndị na-eso ụzọ Jizọs ma nye ha akwụkwọ ozi ahụ. 31 Mgbe ha gụchara ya, ha ṅụrịrị ọṅụ n’ihi na ọ gbara ha ume. 32 Ebe ọ bụ na Judas na Saịlas bụ ndị amụma, ha gwara ụmụnna ahụ ọtụtụ ihe gbara ha ume, meekwa ka okwukwe ha sie ike.+ 33 Mgbe ha nọtụrụ ebe ahụ, ụmụnna ahụ dupụrụ ha ka ha laa. Ha sịkwara ha: “Lakwurunụ ndị zitere unu n’udo.” 34* —— 35 Ma, Pọl na Banabas esoghị ha laa. Ha nọ n’Antiọk na-akụzi ihe. Ha na ọtụtụ ndị ọzọ nọkwa na-ekwusa ozi ọma banyere okwu Jehova.*

36 Mgbe ụbọchị ụfọdụ gara, Pọl sịrị Banabas: “Bịa ka anyị gaa leta ụmụnna nọ n’obodo ndị anyị kwusara okwu Jehova,* ka anyị mara otú ha mere.”+ 37 Banabas chọrọ ka ha kpọrọ Jọn, onye a na-akpọkwa Mak, gawa.+ 38 Ma Pọl chere na o kwesịghị isoro ha, ebe ọ bụ na ọ hapụrụ ha na Pamfilia, o soghịkwa ha gaa kwusaa ozi ọma.+ 39 Ha abụọ wee see ezigbo okwu, nke mere na ha kewara. Banabas+ wee kpọrọ Mak, ha abanye ụgbọ mmiri gawa Saịprọs. 40 Ma, Pọl kpọọrọ Saịlas. Mgbe ụmụnna kpechara ekpere ka Jehova* meere Pọl amara,+ ọ gawara ebe ọzọ. 41 Ọ gawara Siria na Silishia, na-eme ka ọgbakọ ndị dị ebe ahụ sie ike n’okwukwe.

16 Pọl mechara ruo Dabe nakwa Listra.+ E nwekwara otu onye na-eso ụzọ Jizọs nọ ebe ahụ, aha ya bụ Timoti.+ Nne ya bụ onye Juu, bụrụkwa onye na-eso ụzọ Jizọs, ma nna ya bụ onye Grik. 2 Ụmụnna nọ na Listra na Aịkoniọm na-ekwukwa okwu ọma banyere ya. 3 Pọl kwuru na ya chọrọ ka Timoti soro ya na-aga ebe ndị ọ na-aga. Ọ kpọọrọ ya. Ma, o bu ụzọ bie ya úgwù n’ihi ndị Juu nọ ebe ndị ahụ,+ maka na ha niile ma na nna ya bụ onye Grik. 4 N’obodo ọ bụla ha gara, ha na-agwa ndị nọ ebe ahụ ihe ndịozi na ndị okenye nọ na Jeruselem kpebiri ka ha na-eme.+ 5 N’eziokwu, ihe a mere ka okwukwe ndị nọ n’ọgbakọ dị iche iche sie ike, ha ana-ehikwu nne kwa ụbọchị.

6 Ha gafere Frijia na Galeshia,+ n’ihi na mmụọ nsọ gbochiri ha ikwu okwu Chineke ná mpaghara Eshia. 7 Mgbe ha ruru Mishia, ha gbalịrị ịbanye Bitinia,+ ma Jizọs ji mmụọ nsọ gbochie ha ịbanye. 8 N’ihi ya, ha gafere Mishia banye Troas. 9 N’abalị, Pọl hụrụ ọhụụ. Ọ hụrụ otu nwoke Masedonia guzo na-arịọ ya, sị: “Bịa na Masedonia nyere anyị aka.” 10 Ozugbo ọ hụrụ ọhụụ a, anyị gbalịrị ịbanye Masedonia, n’ihi na anyị matara na Chineke agwala anyị ka anyị kwusaara ha ozi ọma.

11 N’ihi ya, anyị banyere ụgbọ mmiri na Troas gawa Samọtres n’akwụsịghị akwụsị. N’echi ya, anyị gawara Niapọlis. 12 Anyị sikwa ebe ahụ gaa Filipaị,+ bụ́ obodo ndị Rom na-achị. Ọ bụ obodo kacha ede ude na Masedonia. Anyị nọrọ ụbọchị ole na ole n’obodo a. 13 N’Ụbọchị Izu Ike, anyị gara n’ihu ọnụ ụzọ ámá, gaa nọrọ n’akụkụ otu osimiri. Anyị nụrụ na e nwere ebe a na-ekpe ekpere ebe ahụ. Mgbe anyị garuru, anyị nọdụrụ ala malite ịgwa ụmụ nwaanyị gbakọrọ ebe ahụ okwu. 14 Otu nwaanyị aha ya bụ Lidia nọkwa na-ege ntị. Nwaanyị a na-ere ákwà na-acha pọpụl.* Ọ bụ onye Tayataịra,+ ọ na-atụkwa egwu Chineke. Jehova* wee meghee obi ya, ya anabata ihe Pọl na-ekwu. 15 Mgbe e mechara ya na ezinụlọ ya baptizim,+ ọ rịọrọ anyị, sị: “Ọ bụrụ na unu kwetara na mụ ekwerela na Jehova,* bịanụ nọrọ n’ụlọ m.” Anyị wee soro ya n’ihi otú o si rịọsie anyị arịrịọ ike.

16 E nwere ụbọchị anyị nọ na-aga ebe a na-ekpe ekpere, otu nwa agbọghọ mmụọ ọjọọ ji ahụ anyị. Nwa agbọghọ a na-akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu,+ o jikwa ya enwetara ndị nna ya ukwu ezigbo ego. 17 Nwa agbọghọ a nọ na-eso anyị na Pọl ma na-eti mkpu, sị: “Ndị a bụ ndị ohu Chineke Onye Kacha Elu.+ Ha na-ekwusara unu otú a ga-esi zọpụta unu.” 18 O megidere ihe a ruo ọtụtụ ụbọchị. N’ikpeazụ, ike ya gwụrụ Pọl, ya atụgharịa gwa mmụọ na-enye nwa agbọghọ ahụ nsogbu, sị: “Ana m enye gị iwu n’aha Jizọs Kraịst ka i si n’ime ya pụta.” O wee pụta ozugbo ahụ.+

19 Mgbe ndị nna ya ukwu hụrụ na ụzọ ha si enweta ego emechiela,+ ha jidere Pọl na Saịlas ma dọkpụrụ ha baa n’ọma ahịa gakwuru ndị ọchịchị.+ 20 Ha kpụgaara ha ndị isi obodo wee sị: “Ndị a na-enye obodo anyị ezigbo nsogbu.+ Ha bụ ndị Juu. 21 Anyịnwa bụ ndị Rom. Ha na-akụzi ihe megidere iwu anyị.” 22 Mmadụ niile nọ ebe ahụ wee jiri iwe gwa ha okwu. Ndị isi obodo ahụ dọkara uwe ha yi, kwuokwa ka a pịa ha ụtarị.+ 23 Mgbe ha tikachara ha ahụ́, ha kpọchiri ha n’ụlọ mkpọrọ, gwakwa onye na-elekọta ụlọ mkpọrọ ka o chee ha nche ka ha ghara ịgbapụ.+ 24 N’ihi ihe a a gwara ya, ọ kpọchiri ha n’ụlọ mkpọrọ dị n’ime ime ma tụọ ha ọtọsị n’ụkwụ.

25 Ma n’ihe dị ka n’etiti abalị, Pọl na Saịlas nọ na-ekpe ekpere ma jiri abụ na-eto Chineke.+ Ndị mkpọrọ nọkwa na-anụ olu ha. 26 Na mberede, oké ala ọma jijiji mere, ntọala ụlọ nga ahụ ebido ịma jijiji. Ụzọ niile meghekwara n’otu ntabi anya, agbụ e kere ha niile tọpụkwara.+ 27 Mgbe onye na-elekọta ụlọ nga ahụ tetara n’ụra wee hụ na ọnụ ụzọ ụlọ mkpọrọ ahụ niile meghechara emeghe, ọ mịịrị mma agha ya ma chọọ igbu onwe ya, n’ihi na o chere na ndị mkpọrọ ahụ agbapụla.+ 28 Ma Pọl tiri mkpu, sị: “Emerụla onwe gị ahụ́, n’ihi na anyị niile nọ ebe a!” 29 Nwoke ahụ wee para ọkụ, gbaba n’ụlọ mkpọrọ ebe Pọl na Saịlas nọ, marakwa jijiji daa n’ihu ha. 30 O wee kpọpụta ha n’èzí, sị ha: “Ndị nwe m, gịnị ka m ga-eme ka a zọpụta m?” 31 Ha asị ya: “Kwere n’Onyenwe anyị Jizọs, a ga-azọpụta gị na ezinụlọ gị.”+ 32 Ha wee gwa ya na ndị niile nọ n’ụlọ ya okwu Jehova.* 33 Ọ kpọọrọ ha n’abalị ahụ ma saa ọnyá ha. E mekwara ya na ndị ezinụlọ ya niile baptizim n’egbughị oge.+ 34 O wee kpọbata ha n’ụlọ ya nye ha nri. Obi bụkwa ya na ezinụlọ ya niile sọ aṅụrị maka na o kwerela na Chineke.

35 Mgbe chi bọrọ, ndị isi obodo ahụ zigara ndị uwe ojii ụlọikpe ka ha gaa sị ya: “Hapụ ndị ahụ.” 36 Onye ahụ na-elekọta ụlọ mkpọrọ wee gwa Pọl ihe ha kwuru. Ọ sịrị: “Ndị isi obodo zitere ndị bịara gwa m ka a hapụ unu abụọ. Pụtanụ lawa n’udo.” 37 Ma Pọl sịrị ha: “Ha pịara anyị ihe n’ihu ọha n’amaghị anyị ikpe,* n’agbanyeghị na anyị bụ ndị Rom.+ Ha tụbakwara anyị n’ụlọ mkpọrọ. Hà na-achụpụzi anyị na nzuzo? Mbanụ! Ha bịa n’onwe ha kpọpụta anyị.” 38 Ndị uwe ojii ụlọikpe ahụ gaziri kọọrọ ndị isi obodo ihe a ha kwuru. Mgbe ha nụrụ na ha bụ ndị Rom, ụjọ tụwara ha.+ 39 N’ihi ya, ha bịara rịọ ha ka ha gbaghara. Mgbe ha kpọpụtachara ha, ha gwara ha ka ha si n’obodo ahụ pụọ. 40 Ma ha si n’ụlọ mkpọrọ ahụ pụta, gaa n’ụlọ Lidia. Mgbe ha hụkwara ụmụnna, ha gbara ha ume+ wee gawa ebe ọzọ.

17 Ha wee na-aga, gafee Amfipọlis na Apọlonịa, bịarute Tesalonaịka,+ bụ́ ebe e nwere ụlọ nzukọ ndị Juu. 2 Pọl wee banye n’ụlọ nzukọ ahụ otú ọ na-emekarị,+ na-enyere ndị nọ ebe ahụ aka ịghọta Akwụkwọ Nsọ ruo ụbọchị izu ike atọ.+ 3 Ọ nọ na-akọwa Akwụkwọ Nsọ, jirikwa ihe e dere na ya na-egosi na Kraịst ga-atarịrị ahụhụ,+ nwụọ, ma si n’ọnwụ bilie.+ Ọ sịkwara: “Jizọs bụ Kraịst, onye m na-agwa unu gbasara ya.” 4 N’ihi ya, ụfọdụ n’ime ha ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs, ha na Pọl na Saịlas ana-anọkọ.+ Ìgwè ndị Grik na-atụ egwu Chineke na ọtụtụ ụmụ nwaanyị a ma ama mekwara otu ihe ahụ.

5 Ma iwe were ndị Juu,+ ha akpọkọta ụfọdụ ndị ọjọọ, ndị na-akwụgharị n’ọma ahịa, ha ekworo n’ìgwè, na-akpa aghara n’obodo ahụ niile. Ha gakwara n’ụlọ Jesin ka ha kpụrụ Pọl na Saịlas kpụnye ndị ahụ na-akpa aghara. 6 Ma mgbe ha na-ahụghị ha, ha kpụụrụ Jesin na ụmụnna ụfọdụ gakwuru ndị na-achị obodo, sị: “Ndị a ọrụ ha bụ ịkpata ọgba aghara ebe niile abịala ebe a,+ 7 Jesin nabatakwara ha. Ndị a niile na-emebi iwu Siza, na-ekwu na e nwere eze ọzọ a na-akpọ Jizọs.”+ 8 Mgbe ìgwè mmadụ ahụ na ndị na-achị obodo nụrụ ihe ndị a, ezigbo iwe were ha. 9 Mgbe ha natachara Jesin na ndị nke ọzọ ego ha kwụrụ iji gbapụta onwe ha, ha hapụrụ ha ka ha laa.

10 Ozugbo chi jiri, ụmụnna zipụrụ Pọl na Saịlas ka ha gaa Beria. Mgbe ha garuru, ha banyere n’ụlọ nzukọ ndị Juu. 11 Ndị Beria ka ndị bi na Tesalonaịka achọ ịmụta ihe, n’ihi na ha ji obi ha niile nabata okwu Chineke, na-enyocha Akwụkwọ Nsọ nke ọma kwa ụbọchị iji mara ma ihe a gwara ha ọ̀ bụ eziokwu. 12 N’ihi ya, ọtụtụ n’ime ha ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs, ha na ọtụtụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị Grik a na-akwanyere ùgwù. 13 Ma mgbe ndị Juu ndị si Tesalonaịka nụrụ na Pọl na-ekwusakwa okwu Chineke na Beria, ha bịara ebe ahụ ka ha mee ka ndị mmadụ malite ịkpa aghara.+ 14 Ụmụnna zipụrụ Pọl ozugbo ka ọ gawa n’akụkụ oké osimiri.+ Ma Saịlas na Timoti nọgidere ebe ahụ. 15 Ma, ndị na-edupụ Pọl duuru ya ruo Atens. Mgbe Pọl gwachara ha ka ha gwa Saịlas na Timoti+ ka ha bịakwute ya ozugbo, ha lawara.

16 Ma ka Pọl nọ na-eche Saịlas na Timoti n’Atens, o wutere ya mgbe ọ hụrụ na arụsị juru eju n’obodo ahụ. 17 N’ihi ya, ọ gara n’ụlọ nzukọ na-akụziri ndị Juu na ndị ọzọ na-atụ egwu Chineke ihe, na-enyere ha aka ịghọta ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ. Ọ na-agakwa n’ahịa kwa ụbọchị na-akụziri ndị nọ ebe ahụ ihe. 18 Ma ụfọdụ ndị ọkachamara, bụ́ ndị òtù Epikurọs na ndị òtù Stoik, malitere ịrụ ya ụka. Ụfọdụ nọ na-asị: “Gịnị ka onye ekwurekwu a chọrọ ikwu?” Ndị ọzọ ana-asị: “Ọ dị ka ọ̀ na-ekwusa gbasara chi ndị mba ọzọ.” Ha na-ekwu ihe a maka na ọ na-ezisa ozi ọma banyere Jizọs na mbilite n’ọnwụ.+ 19 Ha kpọọrọ ya gaa n’Ariopagọs,* sị ya: “Kọwaara anyị ihe ọhụrụ a ị na-akụzi. 20 N’ihi na ị na-akụzi ihe ntị anyị na-anụtụbeghị. Anyị chọkwara ịma ihe ihe ndị a pụtara.” 21 N’eziokwu, ndị Atens na ndị mba ọzọ niile bịara ịnọtụ ebe ahụ anaghị eji oge ha ji ezu ike eme ihe ọzọ ma e wezụga ịkọ ihe ọhụrụ ma ọ bụ igere ihe ọhụrụ. 22 Ma Pọl guzooro ọtọ n’etiti Ariopagọs+ wee sị:

“Ndị Atens, ahụrụ m na, n’ihe niile, o yiri ka ùnu na-ekpere chi dị iche iche karịa ndị ọzọ.+ 23 Dị ka ihe atụ, mgbe m na-agafe ma na-eleru anya n’ihe ndị unu na-asọpụrụ,* ahụrụ m otu ebe ịchụàjà nke ihe e dere n’elu ya bụ: ‘Nke A Bụ nke Chi A Na-amaghị Ama.’ N’ihi ya, ọ bụ chi unu na-amaghị, nke unu na-efe, ka m na-ekwusara unu. 24 Chineke, onye kere ụwa na ihe niile dị n’ime ya, anaghị ebi n’ụlọ nsọ e ji aka rụọ+ n’ihi na ọ bụ Onyenwe eluigwe na ụwa.+ 25 Ọ naghịkwa atụ anya ka ụmụ mmadụ nyere ya aka dị ka à ga-asị na o nwere ihe na-akpa ya,+ n’ihi na ọ bụ yanwa na-enye mmadụ niile ndụ na ume+ na ihe niile. 26 O sikwa n’otu mmadụ+ mee ka mmadụ niile nọ ná mba ọ bụla dịrị, meekwa ka ha biri n’elu ụwa niile.+ O kpebikwara oge ihe dị iche iche ga-eme nakwa ebe ụmụ mmadụ ga-ebi na ebe ha na-agaghị ebi.+ 27 N’ihi na Chineke chọrọ ka ndị mmadụ chọọ ya. Ọ bụrụkwa na ha agbaa mbọ chọọ ya, ha ga-achọta ya.+ N’eziokwu, ọ nọ onye ọ bụla n’ime anyị nso. 28 N’ihi na ọ bụ ya nyere anyị ndụ, meekwa ka anyị na-eje ije, na-adịkwa ndụ, otú ahụ ụfọdụ n’ime unu ndị na-ede uri kwuru, sị: ‘N’ihi na anyị niile bụ ụmụ ya.’

29 “Ebe ọ bụ na anyị bụ ụmụ Chineke,+ anyị ekwesịghị iche na Chineke yiri ọlaedo ma ọ bụ ọlaọcha ma ọ bụ nkume. Anyị ekwesịghịkwa iche na ọ dị ka ihe ụmụ mmadụ chepụtara kpụọ.+ 30 N’eziokwu, Chineke elefurula oge ahụ ndị mmadụ na-amaghị ihe ha na-eme anya.+ Ma ugbu a, ọ na-agwa mmadụ niile n’ebe niile ka ha chegharịa. 31 N’ihi na o wepụtala otu ụbọchị ọ ga-esi n’aka otu nwoke ọ họpụtara kpee mmadụ niile bi n’ụwa ikpe+ n’eleghị ha anya n’ihu. O meekwala ka obi sie mmadụ niile ike na ọ ga-eme ya, n’ihi na ọ kpọlitere nwoke ahụ n’ọnwụ.”+

32 Mgbe ha nụrụ gbasara ịkpọlite mmadụ n’ọnwụ, ụfọdụ malitere ịkwa ya emo.+ Ma, ndị ọzọ sịrị: “Anyị ga-achọ ịnụ gbasara ihe a n’oge ọzọ.” 33 Pọl wee si ebe ahụ pụọ. 34 Ma ụfọdụ ndị sooro ya, ghọọkwa ndị na-eso ụzọ Jizọs. Ụfọdụ n’ime ha bụ Dayọnisiọs, onye bụ́ ọkàikpe n’ụlọikpe Ariopagọs, na otu nwaanyị aha ya bụ Damaris, nakwa ndị ọzọ.

18 Mgbe ihe a mechara, o si n’Atens pụọ gaa Kọrịnt. 2 N’ebe ahụ, ọ hụrụ otu onye Juu aha ya bụ Akwịla+ nakwa Prisila nwunye ya. Nwoke a bụ onye Pọntọs, o tebeghịkwa ha si Ịtali bịa ebe a. Ha bịara ebe a maka na Klọdiọs gwara ndị Juu niile ka ha pụọ na Rom. Pọl wee gakwuru ha. 3 Ebe ya na ha nwere otu ụdị aka ọrụ, ọ gara biri n’ụlọ ha. Ya na ha na-arụkọkwa ọrụ,+ n’ihi na aka ọrụ ha bụ ịkpa ákwà ụlọikwuu. 4 Ọ na-akụzi ihe n’ụlọ nzukọ+ n’ụbọchị izu ike ọ bụla.+ Ọ na-akụzikwa ya otú na-eme ka ndị Juu na ndị Grik kweta ihe ọ na-akụzi.

5 Ma mgbe Saịlas+ na Timoti+ si Masedonia gbadata, Pọl malitere iji oge ya niile na-ekwusa okwu Chineke, na-agwa ndị Juu ihe gosiri na Jizọs bụ Kraịst.+ 6 Ma ha nọ na-emegide Pọl ma na-agwa ya okwu ọjọọ. N’ihi ya, o fechara uwe ya+ wee sị ha: “Ka ọbara unu dị unu n’isi.+ Aka m dị ọcha.+ Si ugbu a gawa, m ga-ejekwuru ndị mba ọzọ.”+ 7 O wee si ebe ahụ* pụọ banye n’ụlọ otu nwoke aha ya bụ Tishiọs Jọstọs, onye na-atụ egwu Chineke, onye ụlọ ya dị n’akụkụ ụlọ nzukọ. 8 Ma Krispọs,+ onyeisi oche nke ụlọ nzukọ, na ezinụlọ ya niile, kweere n’Onyenwe anyị. Ọtụtụ n’ime ndị Kọrịnt, ndị nụrụ okwu Chineke, kwekwaara, e mee ha baptizim. 9 N’abalị, Onyenwe anyị gwara Pọl n’ọhụụ, sị: “Ụjọ atụla gị, kama na-ekwusa ozi ọma, adala mbà, 10 n’ihi na e nwere ọtụtụ ndị n’obodo a ga-ekwere na m. N’ihi ya, anọnyeere m gị,+ o nweghịkwa onye ga-emerụ gị ahụ́.” 11 Ọ bụ ya mere o ji nọrọ ebe ahụ otu afọ na ọnwa isii, na-akụziri ndị mmadụ okwu Chineke.

12 N’oge Galio bụ gọvanọ na-achị Akeya, ndị Juu ji otu obi bịa imesi Pọl ike. Ha kpụụrụ ya gaa ebe a na-anọ ekpe ikpe, 13 sị: “Nwoke a na-akụziri ndị mmadụ ka ha na-efe Chineke otú iwu na-ekwughị ka e si na-efe ya.” 14 Ma mgbe Pọl chọrọ ikwu okwu, Galio gwara ndị Juu, sị: “Ndị Juu, n’eziokwu, a sị na o nwere ihe ọjọọ nwoke a mere ma ọ bụ na o nwere arụ ọ kpara, m gaara enwe ndidi na-ege ihe unu na-ekwu. 15 Ma ebe ọ bụ okwu gbasara aha na iwu unu na ihe mmadụ kwuru,+ jirinụ aka unu kpee ya. Achọghị m ikpe ikpe gbasara ihe ndị a.” 16 O wee chụpụ ha ebe ahụ a na-anọ ekpe ikpe. 17 N’ihi ya, ha niile jidere Sọstenis+ onyeisi oche ụlọ nzukọ ma malite iti ya ihe n’ihu ebe ahụ a na-anọ ekpe ikpe. Ma, Galio atụpụghị ọnụ n’ihe a niile.

18 Ma, mgbe Pọl nọkwuru ọtụtụ ụbọchị ebe ahụ, ọ sịrị ụmụnna ka e mesịa ma banye ụgbọ mmiri ga-ebuga ya Siria. Prisila na Akwịla sokwa ya. Ọ kpụdara ntutu isi ya na Senkrea+ n’ihi na o nwere nkwa o kwere Chineke. 19 Mgbe ha ruru Efesọs, ndị nke ọzọ nọdụrụ otu ebe, Pọl abanye n’ụlọ nzukọ na-akụziri ndị Juu ihe, na-enyere ha aka ịghọta Akwụkwọ Nsọ.+ 20 Ha nọ na-arịọ ya ka ọ nọtụkwuo, ma o kweghị. 21 Kama ọ sịrị ha ka e mesịa, sịkwa ha: “M ga-abịa ịhụ unu ọzọ ma ọ bụrụ uche Jehova.”* O wee banye ụgbọ mmiri n’Efesọs 22 gbadaa Sizaria. Ọ gakwara Jeruselem kelee ọgbakọ dị ebe ahụ ma gawa Antiọk.+

23 Mgbe ọ nọtụrụ ebe ahụ, ọ pụrụ na-aga ebe dị iche iche na Galeshia na Frijia,+ na-eme ka okwukwe ndị niile na-eso ụzọ Jizọs sie ike.+

24 Ma otu onye Juu aha ya bụ Apọlọs,+ onye Alegzandria, bịara n’Efesọs. Ọ bụ ọkà okwu, marakwa Akwụkwọ Nsọ nke ọma. 25 A kụziiri nwoke a ụzọ Jehova.* Mmụọ nsọ mekwara ka o jiri ịnụ ọkụ n’obi na-akụzi ihe ma na-agwa ndị mmadụ eziokwu gbasara Jizọs. Ma ihe ọ ma bụ naanị gbasara baptizim Jọn nọ na-agwa ndị mmadụ ka ha mee. 26 Ọ malitekwara ikwu okwu n’ụlọ nzukọ n’atụghị egwu. Mgbe Prisila na Akwịla+ nụrụ ihe ọ na-ekwu, ha kpọpụrụ ya iche kọwakwuoro ya eziokwu gbasara ụzọ Chineke. 27 Mgbe Apọlọs nọ na-achọ ịga Akeya, ụmụnna degaara ndị ebe ahụ na-eso ụzọ Jizọs akwụkwọ, gwa ha ka ha nabata ya nke ọma. Mgbe o ruru ebe ahụ, o nyeere ndị Chineke meere amara ha ekwere na ya ezigbo aka. 28 Ọ na-apụta n’ihu ọha ma jiri ịnụ ọkụ n’obi na-egosi na ihe ndị Juu na-ekwu abụghị eziokwu. Ọ na-ejikwa Akwụkwọ Nsọ egosi na Jizọs bụ Kraịst.+

19 Mgbe Apọlọs+ nọ na Kọrịnt, Pọl si n’ime ime obodo ndị dị n’Eshia gbadata Efesọs.+ Ọ hụrụ ụfọdụ ndị na-eso ụzọ Jizọs n’ebe ahụ. 2 O wee sị ha: “Mmụọ nsọ ọ̀ dakwasịrị unu mgbe unu ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs?”+ Ha asị ya: “Anyị anụtụbeghị gbasara mmụọ nsọ.” 3 Ya asịzie ha: “Oleezi ụdị baptizim unu mere?” Ha asị: “Ọ bụ baptizim Jọn nọ na-agwa ndị mmadụ ka ha mee.”+ 4 Pọl asị: “Jọn mere ndị Juu baptizim iji gosi na ha echegharịala.+ Ọ nọkwa na-agwa ha ka ha kwere na Jizọs, onye na-abịa n’azụ ya.”+ 5 Mgbe ha nụrụ ihe a, ha mere baptizim n’aha Onyenwe anyị Jizọs. 6 Mgbe Pọl bikwasịrị ha aka n’isi, mmụọ nsọ dakwasịrị ha,+ ha amalite ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche, na-ebukwa amụma.+ 7 Ha niile dị ihe dị ka ụmụ nwoke iri na abụọ.

8 Pọl na-aga n’ụlọ nzukọ+ na-ekwu okwu n’atụghị egwu, na-agwa ndị mmadụ okwu banyere Alaeze Chineke otú ọ na-eru ha n’obi. O mere ihe a ọnwa atọ.+ 9 Ma ụfọdụ kpọchiri obi ha jụ ikwere ihe ọ na-akụzi. Ha nọkwa n’ihu ìgwè mmadụ gbakọrọnụ na-ekwu okwu ọjọọ banyere Ụzọ Onyenwe anyị.+ Pọl si ebe ha nọ pụọ,+ kpọọkwa ndị ọzọ na-eso ụzọ Jizọs, ha esoro ya pụọ. Ọ na-ekwukwa okwu kwa ụbọchị n’ụlọ ezumezu dị n’ụlọ akwụkwọ Tiranọs. 10 Ọ nọ na-ekwu okwu ebe ahụ ruo afọ abụọ, nke mere na ndị niile bi ná mpaghara Eshia nụrụ okwu Onyenwe anyị, ma ndị Juu ma ndị Grik.

11 Chineke sikwa n’aka Pọl na-arụ ọrụ ebube dị iche iche,+ 12 nke na ọ bụrụ na e were ákwà ya ma ọ bụ eprọn ya metụ ndị ọrịa n’ahụ́,+ ha agbakee. E metụkwa ha onye ọ bụla ndị mmụọ ọjọọ ji, ha ahapụ ya.+ 13 Ma ụfọdụ ndị Juu ndị na-agagharị na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ gbalịkwara iji aha Onyenwe anyị Jizọs chụpụ ndị mmụọ ọjọọ. Ha na-adị asị: “Eji m aha Jizọs onye Pọl na-ekwusa na-agwa gị ka ị pụta.”+ 14 E nwere otu onyeisi nchụàjà ndị Juu aha ya bụ Siva. Ụmụ ya nwoke asaa na-eme ihe a. 15 Ma, e nwere ụbọchị ha gbalịrị ịchụpụ mmụọ ọjọọ, ya asị ha: “Ama m Jizọs,+ marakwa Pọl.+ Ununwa, ùnu bụ ole ndị?” 16 Nwoke ahụ mmụọ ọjọọ ji wee baa ha ọgụ, jide ha n’otu n’otu, merụchaa ha ahụ́, ha agbara ọtọ si n’ụlọ ahụ gbapụsịa. 17 Mmadụ niile wee nụ ihe a merenụ, ma ndị Juu ma ndị Grik bi n’Efesọs, egwu wee jide ha niile, aha Onyenwe anyị Jizọs ana-edekwa ude. 18 Ọtụtụ n’ime ndị ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs na-abịa na-ekwupụta mmehie ha n’ihu ọha. 19 N’eziokwu, ọtụtụ ndị na-eme anwansi chịkọtara akwụkwọ ha ma kpọọ ha ọkụ n’ihu mmadụ niile.+ Ha wee gbakọọ ego ole akwụkwọ ndị ahụ bụ, ya apụta puku mkpụrụ ego ọlaọcha iri ise (50,000). 20 Okwu Jehova* wee si otú a na-agbasa ma na-akpa ike.+

21 Mgbe ihe ndị a mechara, Pọl kpebiri na ya gachaa Masedonia+ na Akeya, na ya ga-aga Jeruselem.+ Ọ sịrị: “M gachaa ebe ahụ, m ga-agakwa Rom.”+ 22 N’ihi ya, o zigara Timoti+ na Erastọs,+ bụ́ ndị na-enyere ya aka, Masedonia. Ma yanwa nọtụkwuru ná mpaghara Eshia.

23 N’oge ahụ, e nwere ezigbo ọgba aghara+ n’ihi Ụzọ Onyenwe anyị.+ 24 E nwere otu nwoke aha ya bụ Dimitriọs, onye na-eji ọlaọcha akpụ ihe. Ọ na-eji ọlaọcha akpụ ụlọ arụsị Atemis. Ihe a ọ na-akpụ na-eme ka ya na ndị omenkà ibe ya na-enweta ezigbo ego.+ 25 Nwoke a kpọkọtara ndị ibe ya nakwa ndị omenkà ndị ọzọ wee sị ha: “Ụmụnne m, unu ma nke ọma na ọ bụ ọrụ a na-enye anyị ego. 26 Ma unu ahụla, nụkwa otú Pọl si gwa ìgwè mmadụ okwu, meekwa ka ha kweta ihe o kwuru na chi ndị e ji aka mee abụghị chi.+ Ọ bụghị naanị n’Efesọs+ ka o mere ihe a, kama, ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ ná mpaghara Eshia niile. 27 Ihe a ga-eme ka ndị mmadụ ledawa ọrụ anyị anya, meekwa ka ha were ụlọ nsọ nnukwu chi* anyị bụ́ Atemis ka ihe efu. Ndị mmadụ na-efe Atemis ná mpaghara Eshia niile na n’ụwa niile. Ma n’ihi ihe a Pọl kwuru, a gaghịzi na-asọpụrụ ya.” 28 Mgbe ha nụrụ ihe a, iwe juru ha obi, ha amalite iti mkpu, sị: “Atemis ndị Efesọs dị ike!”

29 Ihe a mere ka obodo ahụ niile na-agba aghara. Ha jikwa otu obi kworo gaa dọkpụrụ Gayọs na Arịstakọs+ banye n’ebe a na-eme ihe nkiri. Ha abụọ bụ ndị Masedonia na-eso Pọl ejegharị. 30 Ma Pọl chọrọ ịbanye ebe ndị ahụ nọ, ma, ụmụnna ekweghị ya. 31 Ụfọdụ n’ime ndị isi na-ahụ maka ememme na egwuregwu, ndị ha na ya dị ná mma, zigakwaara ya ozi, na-arịọ ya ka ọ ghara ịbanye ebe ahụ a na-eme ihe nkiri n’ihi na o nwere ike ịta isi ya. 32 N’eziokwu, ndị ahụ niile gbakọrọ nọ na-akpa aghara. Ụfọdụ nọ na-eti otu ihe ná mkpu, ndị ọzọ ana-eti ihe ọzọ, ọtụtụ n’ime ha amaghịkwa ihe mere ha ji gbakọta. 33 Ụfọdụ wee sị Alegzanda kwuo okwu, ebe ọ bụ na ndị Juu na-enu ya aka ka ọ pụta n’ihu ha. Alegzanda fekwara aka ma na-achọ ịzara ọnụ ya n’ihu ha. 34 Ma mgbe ndị ahụ gbakọtara ebe ahụ matara na ọ bụ onye Juu, ha niile tiwere mkpu ruo ihe dị ka awa abụọ, na-asị: “Atemis ndị Efesọs dị ike!”

35 Mgbe onyeisi obodo mechara mee ka ìgwè mmadụ ahụ nọrọ jụụ, ọ sịrị ha: “Ndị Efesọs, ò nwere onye na-amaghị na ọ bụ anyị, bụ́ ndị Efesọs, na-elekọta ụlọ nsọ Atemis dị ike, na-elekọtakwa arụsị a si n’eluigwe daa? 36 Ebe ọ bụ na o nweghị onye ga-asị na ya amaghị ihe a, jirinụ ya nwayọọ, unu emekwala ihe ọkụ ọkụ. 37 Ndị a unu kpọtara ebe a ezughị ohi n’ụlọ nsọ, ha ekwulughịkwa chi anyị. 38 N’ihi ya, ọ bụrụ na Dimitriọs+ na ndị omenkà ibe ya nwere onye ha na ya nwere okwu, e nwere ụbọchị e ji ekpe ikpe, nweekwa ndị gọvanọ na-achị obodo. Ha wegara ha okwu ha ka ha leba ya anya. 39 Ma, ọ bụrụ na unu na-achọ ihe ka nke ahụ, unu ga-agazi ka e leba ya anya otú iwu kwuru. 40 Ihe a mere taa nwere ike ịkpatara anyị ezigbo nsogbu. E nwere ike iji maka ihe a sị na anyị na-agba ọchịchị mgba okpuru, n’ihi na o nweghị ihe anyị ga-ekwu mere ìgwè mmadụ a ji na-akpa aghara.” 41 Mgbe o kwuchara ihe ndị a, ọ sịrị ndị ahụ zukọtara lawa.

20 Mgbe ndị mmadụ kwụsịrị ịkpa aghara, Pọl ziri ozi ka a kpọọ ndị ahụ na-eso ụzọ Jizọs. Mgbe ọ gbachara ha ume ma sị ha ka e mesịa, ọ gawara Masedonia. 2 Mgbe ọ gachara obodo ndị dị ebe ahụ ma gbaa ụmụnna ndị nọ ebe ahụ ume, ọ gawara Gris. 3 Ọ nọrọ ọnwa atọ ebe ahụ. Ma, mgbe ọ na-achọ ịba ụgbọ mmiri ga-ebuga ya Siria, ọ chọpụtara na ndị Juu akpaala nkata igbu ya.+ N’ihi ya, o kpebiziri isi Masedonia laghachi. 4 Ndị so ya bụ Sọpata nwa Pirọs onye Beria, Arịstakọs+ na Sekọndọs, bụ́ ndị Tesalonaịka, Gayọs onye Dabe, Timoti,+ nakwa Tikikọs+ na Trọfimọs,+ bụ́ ndị si ná mpaghara Eshia. 5 Ndị a bu anyị ụzọ gawa ma chere anyị na Troas. 6 Ma mgbe ụbọchị Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko gachara, anyị banyere ụgbọ mmiri na Filipaị wee gawa.+ Mgbe ụbọchị ise gachara, anyị ruru Troas ebe ha nọ. Anyị nọkwara ụbọchị asaa ebe ahụ.

7 N’ụbọchị mbụ n’izu,* mgbe anyị zukọtara iri nri, Pọl malitere ịgwa ndị gbakọtara ebe ahụ okwu, ebe ọ bụ na ọ ga-aga ebe ọzọ echi ya. O kwugidekwara okwu ruo etiti abalị. 8 E nwekwara ọtụtụ mpanaka* n’ọnụ ụlọ dị n’elu ebe anyị zukọrọ. 9 Ma mgbe Pọl nọ na-ekwu okwu, ezigbo ụra buuru otu nwa okorobịa aha ya bụ Yutikọs, onye nọ ọdụ na windo. Ọ nọ na-ehi ụra a si n’ụlọ elu ha nọ daa. O si n’okpukpu nke atọ* daa. Mgbe ndị mmadụ na-erula ebe ọ dara, ya abụrụ na ọ nwụọla. 10 Ma Pọl gbadara n’ala, hulata, makụọ ya+ wee sị: “Unu esogbuzila onwe unu, n’ihi na ọ dị ndụ.”*+ 11 Pọl gbagoziri n’elu were nri rie. Ya na ha nọkwa na-akparịta ụka chi abọọ, ya agawazie ebe ọzọ. 12 Ha wee kpọrọ nwatakịrị nwoke ahụ pụọ, na-enwe sọ aṅụrị na ọ dịzi ndụ.

13 Ma anyị banyere ụgbọ mmiri bugara anyị Asọs, Pọl ejiri ụkwụ na-abịa otú o kwuru na ọ ga-eme. Ọ gwakwara anyị na anyị ga-eburu ya n’obodo a. 14 N’ihi ya, mgbe o rutere Asọs ebe anyị nọ, anyị buuru ya gawa Mitilini. 15 N’ụbọchị sochiri ya, anyị si ebe ahụ banye ụgbọ mmiri ma kwụsị ebe dị nso na Kiọs. Ma n’echi ya, anyị kwụsịtụrụ na Semọs. Nwanne echi ya, anyị eruo Maịlitọs. 16 Pọl kpebiri ịbanye ụgbọ mmiri gafere Efesọs+ ka ọ ghara igbu oge ná mpaghara Eshia, n’ihi na ọ na-eme ngwa ngwa ka o nwee ike ịgaru Jeruselem+ n’ụbọchị Ememme Pentikọst.

17 Ma, ọ nọ na Maịlitọs zie ozi ka ndị okenye ọgbakọ Efesọs bịa hụ ya. 18 Mgbe ha bịara, ọ sịrị ha: “Unu ma nnọọ otú m si na-akpa àgwà mgbe mụ na unu nọ, malite n’ụbọchị mbụ ụkwụ m kpara ná mpaghara Eshia.+ 19 Eweturu m onwe m ala na-agbara Onyenwe anyị ohu.+ Ebere m ákwá, taakwa ahụhụ mgbe ndị Juu kpara nkata igbu m. 20 Unu makwa na ahapụghị m ịgwa unu ihe niile ga-abara unu uru ma ọ bụ izi unu ihe n’ihu ọha+ nakwa n’ụlọ n’ụlọ.+ 21 Kama, eziri m ma ndị Juu ma ndị Grik ozi ọma nke ọma ka ha chegharịa,+ fewe Chineke ma nwee okwukwe n’Onyenwe anyị Jizọs.+ 22 Ma ugbu a, mmụọ nsọ du m na-aga Jeruselem, n’agbanyeghị na amaghị m ihe ga-eme m ebe ahụ, 23 naanị na si n’obodo ruo n’obodo, mmụọ nsọ na-agbara m àmà ugboro ugboro na a ga-atụ m mkpọrọ, kpagbuokwa m.+ 24 Ka o sina dị, o nweghị ihe m ji ndụ m* kpọrọ. Ihe bụ́ mkpa m bụ ime ihe niile m kwesịrị ime+ na ịrụcha ọrụ Onyenwe anyị Jizọs nyere m. Ọrụ ahụ bụ izi ndị mmadụ ozi ọma nke ọma gbasara amara Chineke meere anyị.

25 “Ugbu a, ama m na unu niile m kwusaara ozi ọma gbasara Alaeze Chineke agaghị ahụ ihu m ọzọ. 26 Ma, ihe mere m ji kpọọ unu bụ ka unu mara na ọbara onye ọ bụla a na-azọpụtaghị adịghị m n’isi,+ 27 n’ihi na ahapụghị m ịgwa unu ihe niile Chineke zubere ime.+ 28 Na-elezinụ onwe unu na ìgwè atụrụ Chineke niile anya,+ nke mmụọ nsọ họpụtara unu ka unu bụrụ ndị na-elekọta ya,+ ka unu na-azụ ọgbakọ Chineke,+ nke o ji ọbara Ọkpara ya zụta.+ 29 Ama m na mgbe m na-anọghịzi ya, anụ ọhịa wolf ndị obi tara mmiri ga-abata ebe unu nọ.+ Ha agaghịkwa emere ìgwè atụrụ Chineke ebere. 30 Ụfọdụ ndị n’ime unu ga-ebidokwa ịna-ekwu ihe ndị na-abụghị eziokwu iji dọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs ka ha sowe ha.+

31 “N’ihi ya, mụrụnụ anya, chetakwanụ na kemgbe afọ atọ,+ akwụsịghị m iji anya mmiri na-adụ onye ọ bụla n’ime unu ọdụ, ehihie na abalị. 32 Ana m enyefe unu n’aka Chineke, na-asịkwa ka okwu gbasara amara ya chebe unu. Okwu ahụ ga-agba unu ume, meekwa ka unu nweta ihe Chineke na-enye ndị nsọ niile.+ 33 O nweghị onye ọlaọcha ya ma ọ bụ ọlaedo ya ma ọ bụ uwe ya gụrụ m agụụ.+ 34 O doro unu anya na ọ bụ aka m ka m ji akpata ihe m ji egbo mkpa m+ nakwa nke ndị mụ na ha nọ. 35 Eji m ihe ndị m na-eme gosi unu na n’ihe niile,+ unu kwesịrị inyere ndị na-adịghị ike aka. Unu kwesịkwara ịna-echeta ihe Onyenwe anyị Jizọs kwuru. Ọ sịrị: ‘A na-aka enwe obi ụtọ n’inye ihe+ karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe.’”

36 Mgbe o kwuchara ihe ndị a, ya na ndị niile nọ ebe ahụ gburu ikpere n’ala, ya ekpee ekpere. 37 N’eziokwu, ha niile malitere ibe ezigbo ákwá, ha makụkwara Pọl* ma susuo ya ọnụ,* 38 n’ihi na ihe kacha wute ha bụ na ọ sịrị na ha agaghị ahụ ihu ya ọzọ.+ Ha wee duruo ya ebe ọ bara ụgbọ mmiri.

21 Mgbe anyị jisiri ike hapụ ha banye ụgbọ mmiri, anyị gawara Kọs n’akwụsịghị akwụsị. N’echi ya, anyị gara Rods, sikwa ebe ahụ gaa Patara. 2 Mgbe anyị hụrụ otu ụgbọ mmiri na-aga Finishia, anyị banyere ya wee gawa. 3 Mgbe anyị ruru ebe anyị nọ na-ahụ agwaetiti Saịprọs n’aka ekpe, anyị gafere ma garuo Siria, wee kwụsị na Taya, n’ihi na ebe ahụ ka ụgbọ ahụ ga-ebutusị ibu o bu. 4 Anyị chọwara ndị na-eso ụzọ Jizọs nọ ebe ahụ wee chọta ha ma nọrọ ebe ahụ ruo ụbọchị asaa. Ma n’ihi ihe mmụọ nsọ mere ka ụfọdụ ụmụnna mara, ha gwara Pọl ugboro ugboro ka ọ ghara ịkpa ụkwụ na Jeruselem.+ 5 Mgbe anyị nọchara ụbọchị ole anyị chọrọ ịnọ ebe ahụ, anyị gawara ebe ọzọ. Ma ha niile, ma ụmụ nwaanyị ma ụmụaka, durutere anyị n’ụsọ osimiri dị n’azụ obodo ahụ. Anyị wee gbuo ikpere n’ala n’ụsọ osimiri ahụ, kpee ekpere 6 ma sị ibe anyị ka e mesịa. Anyị banyeziri n’ụgbọ mmiri, hanwa alaghachi n’ụlọ ha.

7 Anyị wee banye ụgbọ mmiri na Taya, ya ebute anyị Tọlemeis. Anyị kelekwara ụmụnna ndị nọ ebe ahụ ma nọnyere ha otu ụbọchị. 8 N’echi ya, anyị gawara Sizaria. Mgbe anyị ruru, anyị banyere n’ụlọ Filip onye na-ezisa ozi ọma, anyị na ya anọrọ. Filip a bụ otu n’ime ụmụ nwoke asaa ahụ+ ndịozi họpụtara na Jeruselem. 9 Nwoke a nwere ụmụ agbọghọ anọ na-alụbeghị di,* ndị na-ebu amụma.+ 10 Ma, ka anyị nọchara ebe ahụ ọtụtụ ụbọchị, otu onye amụma aha ya bụ Agabọs+ si Judia bịa. 11 Ọ bịakwutere anyị ma chịrị ájị̀* Pọl, jiri ya kee onwe ya agbụ ụkwụ na aka, sị: “Chineke ji mmụọ nsọ kwuo, sị: ‘Otú a ka ndị Juu ga-eke onye nwe ájị̀ a agbụ na Jeruselem+ ma nyefee ya n’aka ndị mba ọzọ.’”+ 12 Mgbe anyị nụrụ ihe a, ma anyịnwa ma ndị ebe ahụ malitere ịrịọ Pọl ka ọ ghara ịga Jeruselem. 13 Ma ọ sịrị: “Gịnị mere unu ji na-ebe ákwá? Gịnịkwa mere unu ji na-eme ka obi ghara isi m ike? Ka o doo unu anya na adị m njikere ka e kee m agbụ, dịkwa njikere ịnwụ na Jeruselem n’ihi aha Onyenwe anyị Jizọs.”+ 14 Mgbe anyị hụrụ na anyị agaghị agbanweli obi ya, anyị kwụsịrị ịgwa ya ka ọ ghara ịga.* Anyị sịkwara: “Ka uche Jehova* mee.”

15 Mgbe ihe a mechara, anyị jikeere gawa Jeruselem. 16 Ụfọdụ ndị na-eso ụzọ Jizọs, ndị si Sizaria, sokwa anyị gawa. Ha kpọgara anyị na nke Minesin, onye Saịprọs, onye anyị ga-anọ n’ụlọ ya. O so ná ndị mbụ ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. 17 Mgbe anyị ruru Jeruselem, ụmụnna ji ọṅụ nabata anyị. 18 Ma n’echi ya, anyị na Pọl gakwuuru Jems.+ Ndị okenye niile nọkwa ebe ahụ. 19 Pọl wee kelee ha ma kọọrọ ha ihe niile Chineke si n’ozi ọma o zisara meere ndị mba ọzọ.

20 Mgbe ha nụrụ ihe a, ha malitere ito Chineke. Ma, ha gwakwara Pọl, sị: “Nwanna anyị, ị manụ na e nwere ọtụtụ puku ndị Juu na-eso ụzọ Jizọs, nakwa na ha ji Iwu Mosis kpọrọ ihe.+ 21 Ma ha nụrụ ka ndị mmadụ na-asị: ‘Pọl na-akụziri ndị Juu niile nọ ná mba ọzọ ka ha ghara ime ihe Iwu Mosis kwuru. Ọ na-agwakwa ha ka ha ghara ibi ụmụ ha úgwù, gharakwa ime omenala anyị dị iche iche.’+ 22 Gịnịzi ka anyị ga-eme gbasara ya? O doro anya na ha ga-anụ na ị bịala ebe a. 23 N’ihi ya, mee ihe a anyị na-agwa gị: Anyị nwere ụmụ nwoke anọ ndị chọrọ imezu nkwa ha kwere Chineke. 24 Kpọrọ ụmụ nwoke ndị a gaa ka gị na ha sachaa onwe unu otú iwu kwuru, kwụọkwa ụgwọ ihe niile ọ ga-efu ha, ka e wee kpụọ ha isi.* Onye ọ bụla ga-esikwa otú a mara na ihe ahụ ndị mmadụ na-akọ banyere gị abụghị eziokwu, kama na ị na-eme ihe kwesịrị ekwesị, na-edebekwa Iwu Mosis.+ 25 Anyị ezigarala ndị mba ọzọ na-eso ụzọ Jizọs akwụkwọ ozi anyị dere ihe anyị kpebiri ka ha na-eme. Anyị gwara ha ka ha jụ ihe ọ bụla gbasara ikpere arụsị,+ ghara iri ọbara,+ ghara iri anụ a nyagburu anyagbu,*+ gharakwa ịkwa iko.”*+

26 N’echi ya, Pọl kpọọrọ ụmụ nwoke ndị ahụ gawa, ya na ha asachaa onwe ha otú iwu kwuru.+ O wee banye n’ụlọ nsọ iji mee ka a mara mgbe abalị asaa ha ga-eji sachaa onwe ha otú iwu kwuru ga-agwụ, ka onye nchụàjà wee chụọ àjà maka onye nke ọ bụla n’ime ha n’ụbọchị ahụ.

27 Ma mgbe abalị asaa ahụ na-aga ịgwụ, ndị Juu si Eshia hụrụ Pọl n’ụlọ nsọ, bido ime ka mmadụ niile nọ ebe ahụ kpawa aghara. Ha wee jide ya, 28 na-eti mkpu, sị: “Ndị Izrel, bịanụ nye aka! Onye a bụ nwoke ahụ na-akụziri ndị nọ ebe niile ka ha ghara iji ndị ala anyị na Iwu Mosis nakwa ụlọ nsọ a kpọrọ ihe. Nke ka njọ bụ na ọ kpọbatadịrị ndị Grik n’ụlọ nsọ a, merụọkwa ebe a dị nsọ.”+ 29 Ha kwuru ihe a maka na o nwere mgbe ha hụrụ ya na Trọfimọs+ onye Efesọs na Jeruselem, ha nọkwa na-eche na Pọl kpọbatara ya n’ụlọ nsọ. 30 Obodo ahụ niile malitere ịgba ghara ghara. Ndị mmadụ gbakọtakwara n’ụlọ nsọ, jide Pọl, kpụrụ ya pụọ. E mechikwara ụzọ ozugbo ha pụrụ. 31 Ka ha nọ na-achọ igbu ya, ozi ruru otu ọchịagha ntị na Jeruselem niile na-agba ghara ghara. 32 Ozugbo ahụkwa, ọ kpọọrọ ndị agha na ndị isi ha, ha agbara ọsọ gawa ebe ahụ ha nọ. Mgbe ha hụrụ ọchịagha ahụ na ndị agha ya, ha kwụsịrị iti Pọl ihe.

33 Ọchịagha ahụ bịaziri nso, nwụchie ya ma kwuo ka e kee ya agbụ ígwè abụọ.+ Ọ jụziri onye ọ bụ na ihe o mere. 34 Ma ụfọdụ ndị ahụ gbakọrọnụ malitere na-eti otu ihe ná mkpu, ndị ọzọ ana-eti ihe ọzọ. Ebe ọchịagha ahụ na-amataghị ihe na-emenụ n’ihi aghara ahụ ndị mmadụ nọ na-akpa, o kwuru ka a kpọta ya n’ogige ndị agha. 35 Ma mgbe Pọl ruru na steepụ ụlọ ahụ, ndị agha ahụ buuru ya eburu n’ihi na ìgwè mmadụ ahụ nọ na-achọ imerụ ya ahụ́. 36 Ndị mmadụ nọkwa na-eso ha, na-eti mkpu, sị: “Gbuonụ ya!”

37 Ka a na-achọ iduru Pọl baa n’ogige ndị agha, ọ sịrị ọchịagha ahụ: “M̀ nwere ike ịgwatụ gị okwu?” Ya asị: “Ị̀ na-asụ Grik? 38 Ọ́ bụghị gị bụ onye Ijipt ahụ mere ka ndị mmadụ megidewe ndị ọchịchị n’oge gara aga, durukwa puku ụmụ nwoke anọ (4,000) ndị ji daga baa n’ala ịkpa?” 39 Pọl wee sị: “N’eziokwu, abụ m onye Juu,+ onye Tasọs+ dị na Silishia, nwa amaala obodo a ma ama. N’ihi ya, biko, kwe m ka m gwa ndị a okwu.” 40 Mgbe ọ gwara ya kwuwe, Pọl eguzoro na steepụ ụlọ ahụ feere ndị mmadụ aka, ebe niile adaa jụụ, ya amalite ịgwa ha okwu n’asụsụ Hibru.+ Ọ sịrị:

22 “Ụmụnna m na ndị nna m, geenụ m ntị ka m gwa unu ihe merenụ.”+ 2 Mgbe ha nụrụ na ọ na-agwa ha okwu n’asụsụ Hibru, ha anọrọkwuo nwayọọ. O wee sị: 3 “Abụ m onye Juu+ a mụrụ na Tasọs nke dị na Silishia.+ Ma, agụrụ m akwụkwọ n’obodo a. Ọ bụkwa Gameliel+ kụziiri m ihe. A kụziiri m ka m na-esosi Iwu nna nna anyị hà soro ike.+ M na-anụkwa ọkụ n’obi n’ozi m na-ejere Chineke otú unu niile na-eme taa.+ 4 Akpagburu m ndị na-eso Ụzọ a,* gbuodị ụfọdụ n’ime ha. M na-eke ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị ha agbụ, na-atụkwa ha mkpọrọ.+ 5 Nnukwu onye nchụàjà na ndị okenye niile makwa na ihe a m na-ekwu bụ eziokwu. O nwekwara mgbe ha nyere m akwụkwọ ozi ndị m ga-enye ndị Juu ibe anyị nọ na Damaskọs, mụ agawa ka m kpụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs nọ ebe ahụ bịa Jeruselem ka a taa ha ahụhụ.

6 “Ma mgbe ọ fọrọ obere ka m ruo Damaskọs, n’ihe dị ka n’etiti ehihie, m hụrụ ìhè dị egwu si n’eluigwe nwuo gburugburu m na mberede.+ 7 M wee daa n’ala ma nụ olu sịrị m: ‘Sọl, Sọl, gịnị mere i ji na-akpagbu m?’ 8 Mụ asị ya: ‘Ị̀ bụkwanụ onye?’* Ya asị m: ‘Abụ m Jizọs onye Nazaret, onye ị na-akpagbu.’ 9 Ndị mụ na ha so hụrụ ìhè ahụ, ma ha aghọtaghị ihe onye ahụ na-agwa m okwu kwuru. 10 M kwuziri, sị: ‘Onyenwe m, gịnị ka m ga-eme?’ Onyenwe m asị m: ‘Bilie, banye Damaskọs. E nwere onye nọ ebe ahụ ga-agwa gị ihe niile e kpebiri ị ga-eme.’+ 11 Ma ìhè ahụ dị egwu mere ka m kpuo ìsì. Ndị ahụ mụ na ha so esekpụrụ m n’aka duru m ruo Damaskọs.

12 “Otu nwoke aha ya bụ Ananayas, onye na-atụ egwu Chineke otú Iwu Mosis kwuru, onye ndị Juu niile bi ebe ahụ na-ekwu okwu ọma banyere ya, 13 bịakwutere m. O guzo m n’akụkụ wee sị m, ‘Sọl, nwanna m, hụwa ụzọ.’ M hụwara ụzọ ozugbo ahụ, hụkwa ya.+ 14 Ya asị m: ‘Chineke nna nna anyị hà ahọrọla gị ka ị bịa mara uche ya, hụ Jizọs, onye ezi omume,+ nụkwa ihe o ji ọnụ ya kwuo. 15 Ọ họọrọ gị ka ị bụrụ onye àmà ya, ka ị na-akọrọ mmadụ niile ihe ị hụrụ na ihe ị nụrụ.+ 16 Gịnị mere i ji na-egbu oge? Bilie, ka e mee gị baptizim. Ọ bụrụkwa na ị na-akpọ aha Jizọs,+ Chineke ga-agbaghara gị mmehie gị.’+

17 “Ma mgbe m laghachiri Jeruselem,+ nọrọ n’ụlọ nsọ na-ekpe ekpere, ahụrụ m ọhụụ. 18 Ahụrụ m Onyenwe anyị ka ọ na-asị m: ‘Mee ngwa, si na Jeruselem pụọ ọsọ ọsọ, n’ihi na ha agaghị ekwere ihe ị ga-agwa ha gbasara m.’+ 19 M wee sị: ‘Onyenwe anyị, hanwa ma nke ọma na m na-agabu n’ụlọ nzukọ dị iche iche, na-akpụrụ ndị kweere na gị, na-atụ ha mkpọrọ, na-apịakwa ha ihe.+ 20 Anọkwa m mgbe e gburu Stivin ohu gị,* kwado ogbugbu e gburu ya. M chekwara uwe elu ndị gburu ya nche.’+ 21 Ma, ọ sịrị m: ‘Gawa, n’ihi na m ga-eziga gị ná mba ndị dị anya.’”+

22 Ha nọkwa na-ege ya ntị ruo mgbe o kwuru ihe a. Ha wee tie mkpu, sị: “Nwoke a kwesịrị ọnwụ. Gbuonụ ya!” 23 Ha nọkwa na-eti mkpu, na-eyipụ uwe elu ha, na-atụsa ha aghara aghara, na-ekpolikwa uzuzu elu.+ 24 N’ihi ya, ọchịagha ahụ kwuru ka a kpọbata Pọl n’ogige ndị agha. O kwukwara na a ga na-apịa ya ihe ma a na-agba ya ajụjụ, ka ọ mara kpọmkwem ihe mere ha ji na-eti mkpu ka e gbuo ya. 25 Ma mgbe ha gbatịrị Pọl ka a pịa ya ụtarị, ọ jụrụ onyeisi ndị agha* guzo ebe ahụ, sị: “Iwu ò nyere unu ikike ịpịa onye Rom a na-amaghị ikpe* ihe?”+ 26 Ma mgbe onyeisi ndị agha ahụ nụrụ ihe a, ọ gakwuuru ọchịagha ahụ, sị ya: “Gịnị ka ị ga-eme ugbu a, ebe ọ bụ na nwoke a bụ onye Rom?” 27 N’ihi ya, ọchịagha ahụ bịakwutere Pọl, sị ya: “Ị̀ bụ onye Rom?” Ya asị: “Ee.” 28 Ọchịagha ahụ asị ya: “Akwụrụ m ezigbo ụgwọ tupu mụ abụrụ onye Rom.” Pọl asị: “Ma, mụnwa bụ onye Rom kemgbe a mụrụ m.”+

29 N’ihi ya, ndị ahụ chọrọ ịgba ya ajụjụ si ebe ọ nọ pụọ ozugbo ahụ. Ụjọ bịakwara ọchịagha ahụ mgbe ọ chọpụtara na ọ bụ onye Rom nakwa na ya ekeela ya agbụ.+

30 N’echi ya, ọ tọpụrụ Pọl agbụ ma gwa ndị isi nchụàjà na ndị ọzọ so ná ndị Sanhedrin ka ha zukọọ, n’ihi na ọ chọrọ ịma kpọmkwem ihe ndị Juu sị na o mere. Ọ kpọtaziri Pọl n’ihu ndị ahụ zukọrọnụ.+

23 Pọl legidere ndị Sanhedrin anya, sị: “Ụmụnna m, Chineke ma na akọnuche m na-agwa m na o nweghị ihe ọjọọ ọ bụla m mere+ ruo taa.” 2 Ananayas bụ́ nnukwu onye nchụàjà wee gwa ndị guzo Pọl nso ka ha tie ya ihe n’ọnụ. 3 Pọl wee sị ya: “Mgbidi e tere nzu, Chineke ga-eti gị ihe. Ị nọ ọdụ ka i kpee m ikpe otú Iwu kwuru, ma ị na-emebi Iwu, ebe i kwuru ka e tie m ihe. Ihe a ị na-eme ọ̀ dị mma?” 4 Ndị guzo ya n’akụkụ wee sị: “Ị̀ na-akparị nnukwu onye nchụàjà Chineke?” 5 Pọl asị: “Ụmụnna m, amaghị m na ọ bụ nnukwu onye nchụàjà. N’ihi na e dere, sị, ‘Agwala onye na-achị ndị gị okwu ọjọọ.’”+

6 Ma mgbe Pọl matara na ụfọdụ n’ime ndị Sanhedrin ahụ bụ ndị Sadusii, ndị nke ọzọ abụrụ ndị Farisii, o tiri mkpu, sị ha: “Ụmụnna m, abụ m onye Farisii,+ nna nna m hà bụkwa ndị Farisii. Ihe mere e ji na-ekpe m ikpe bụ maka na m kweere na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ.” 7 N’ihi ihe a o kwuru, ndị Farisii na ndị Sadusii malitere ise okwu, ha kewakwara abụọ. 8 N’ihi na ndị Sadusii na-ekwu na a gaghị akpọlite ndị nwụrụ anwụ nakwa na e nweghị ndị mmụọ ozi ma ọ bụ mmụọ, ma ndị Farisii ekweghị n’ihe a niile ha na-ekwu.+ 9 N’ihi ya, ebe ahụ niile malitere ịgba ghara ghara, ụfọdụ ndị odeakwụkwọ ndị dụnyeere ndị Farisii úkwù malitere ịrụ ezigbo ụka, sị: “Anyị ahụghị ihe ọjọọ ọ bụla nwoke a mere. O nwere ike ịbụ na mmụọ ma ọ bụ mmụọ ozi gwara ya okwu+—.” 10 Ma mgbe esemokwu ahụ karịwara, ọchịagha ahụ tụrụ egwu na ha ga-egbu* Pọl. O wee gwa ndị agha ya ka ha gaa napụta ya n’aka ha ma kpọta ya n’ogige ndị agha.

11 Ma n’abalị ụbọchị ahụ, Onyenwe anyị guzoro n’akụkụ ya, sị ya: “Obi sie gị ike.+ N’ihi na otú ahụ ị nọ na-agba àmà nke ọma banyere m na Jeruselem, ka ị ga-agbakwa àmà banyere m na Rom.”+

12 Ma mgbe chi bọrọ, ndị Juu kpara nkata igbu Pọl, ṅụọkwa iyi, sị: “Anyị agaghị eri ihe ma ọ bụ ṅụọ ihe ọ bụla ruo mgbe anyị gburu Pọl. Ọ bụrụkwa na anyị emeghị ihe a, ka a bụọ anyị ọnụ.” 13 E nwere ihe karịrị ụmụ nwoke iri anọ kpara nkata a, ṅụọkwa iyi a. 14 Ha gakwuuru ndị isi nchụàjà na ndị okenye, sị ha: “Anyị aṅụọla iyi na anyị agaghị emetụ nri ọ bụla ọnụ ruo mgbe anyị gburu Pọl. 15 N’ihi ya, unu na ndị Sanhedrin gaa gwa ọchịagha ahụ ka ọ kpọtara unu Pọl ka à ga-asị na unu chọrọ ilebakwu anya n’okwu ya. Ma, anyịnwa ga-adị njikere igbu ya tupu ya erute.”

16 Ma, nwa nwanne Pọl* nụrụ nkata ahụ ha kpara ichechi Pọl n’ụzọ, ya abanye n’ogige ndị agha kọọrọ ya Pọl. 17 Pọl kpọziri otu n’ime ndị isi ndị agha wee sị ya: “Duru nwa okorobịa a gakwuru ọchịagha, n’ihi na o nwere ihe ọ chọrọ ịgwa ya.” 18 Onyeisi ndị agha ahụ wee kpọrọ ya gakwuru ọchịagha, sị: “Pọl, onye nọ n’ụlọ mkpọrọ, kpọrọ m ma gwa m ka m kpọtara gị nwa okorobịa a, n’ihi na o nwere ihe ọ chọrọ ịgwa gị.” 19 Ọchịagha ahụ wee sere ya n’aka gaa ebe ndị mmadụ na-anọghị ma jụọ ya, sị: “Gịnị ka ị chọrọ ịgwa m?” 20 Ya asị: “Ndị Juu ekwekọrịtala ịrịọ gị ka ị kpọtara ndị Sanhedrin Pọl echi, ka à ga-asị na ha chọrọ ilebakwu anya n’okwu ya.+ 21 Ma egela ha ntị, n’ihi na ihe karịrị ụmụ nwoke iri anọ n’ime ha bu n’obi ichechi ya n’ụzọ. Ha aṅụọkwala iyi na ha agaghị eri ihe ma ọ bụ ṅụọ ihe ọ bụla ruo mgbe ha gburu ya.+ Ha dịkwa njikere ugbu a, na-eche ka i meere ha ihe ha chọrọ.” 22 N’ihi ya, ọchịagha ahụ hapụrụ nwa okorobịa ahụ ka ọ gawa. Ma, o bu ụzọ sị ya: “Agwakwala onye ọ bụla na ị gwara m ihe a.”

23 O wee kpọọ mmadụ abụọ n’ime ndị isi ndị agha ahụ wee sị ha: “Kwadebenụ narị ndị agha abụọ (200) nakwa mmadụ iri asaa na-agba ịnyịnya na narị ndị agha abụọ (200) ji ube, ka ha gaa Sizaria, n’awa nke atọ n’abalị.* 24 Kpụtakwanụ ịnyịnya ndị ga-eburu Pọl bugara Gọvanọ Feliks n’enweghị ihe ọ bụla ga-eme ya.” 25 O wee dee akwụkwọ ozi, sị:

26 “Klọdiọs Laịsias na-edetara Onye Ukwu, bụ́ Gọvanọ Feliks, akwụkwọ: Ana m ekele gị. 27 Ndị Juu jidere nwoke a. Ọ fọkwara obere ka ha gbuo ya. Ma, akpọ m ndị agha m bịa ngwa ngwa napụta ya,+ n’ihi na m nụrụ na ọ bụ onye Rom.+ 28 Ebe ọ bụ na m chọrọ ịchọpụta ihe ha sị na o mere, akpọtaara m ya ndị Sanhedrin ha.+ 29 Achọpụtara m na ihe ndị ha sị na o mere bụ ihe gbasara Iwu ha,+ ma, o nweghị nke ọ bụla n’ime ihe ndị ahụ e kwesịrị iji maka ya gbuo ya ma ọ bụ tụọ ya mkpọrọ. 30 Ma, a gwara m nkata a kpara igbu nwoke a.+ N’ihi ya, m na-akpọtara gị ya ozugbo, m na-agwakwa ndị ahụ boro ya ebubo ka ha bịa n’ihu gị kwuo ihe ha sị na o mere.”

31 N’ihi ya, ndị agha a kpọọrọ Pọl+ otú ahụ a gwara ha kpọta ya Antipatris n’abalị. 32 N’echi ya, ndị na-agba ịnyịnya sooro ya gawa, ndị agha ndị ọzọ alaghachizie n’ogige ndị agha. 33 Ndị ahụ na-agba ịnyịnya banyere na Sizaria ma nye gọvanọ akwụkwọ ozi ahụ, kpọrọkwa Pọl kpọnye ya. 34 O wee gụọ akwụkwọ ozi ahụ ma jụọ Pọl onye ebe ọ bụ, ya asị ya na ya bụ onye Silishia.+ 35 Ya asị Pọl: “Ndị boro gị ebubo bịarute, m ga-enye gị ohere ka i kwuo ihe niile ị chọrọ ikwu.”+ O wee kwuo ka a na-eche ya nche n’obí Herọd.

24 Mgbe abalị ise gara, Ananayas bụ́ nnukwu onye nchụàjà+ bịara Sizaria, ya na ndị okenye ụfọdụ na otu onye ma otú e si ekwu okwu n’ihu ọha,* onye a na-akpọ Tetọlọs. Ha bịara ịgwa Gọvanọ Feliks ihe ha sị na Pọl mere.+ 2 Mgbe a gwara Tetọlọs ka o kwuo okwu, ọ malitere ibo Pọl ebubo n’ihu gọvanọ, sị:

“Feliks Onye Ukwu, i meela ka udo dịrị n’obodo anyị. Otú dị mma i si achị emeekwala ka anyị na-enwe ọganihu. 3 Anyị na-ekele gị mgbe niile n’ebe niile maka ihe ndị a ị na-eme. 4 Ma, ka m ghara igbukwu gị oge, biko, nwee ndidi ma gee anyị ntị ka anyị gbuo okwu anyị nkenke. 5 Anyị chọpụtara na nwoke a bụ onye ọjọọ.*+ Ọ na-eme ka ndị Juu niile nọ n’ụwa na-emegide ndị ọchịchị.+ Ọ bụkwa onye ndú òtù a na-akpọ ‘ndị Nazaret.’+ 6 Ọ nwakwara imerụ ụlọ nsọ, anyị ejide ya.+ 7* —— 8 Ị gbaa ya ajụjụ, ị ga-achọpụta na ihe a niile anyị na-ekwu bụ eziokwu.”

9 Ndị Juu sokwa na-ekwusi ike na ihe ndị a bụ eziokwu. 10 Mgbe gọvanọ ahụ kweere Pọl n’isi ka o kwuo okwu, ọ sịrị:

“Ama m nke ọma na ị na-ekpere mba a ikpe kemgbe ọtụtụ afọ. Ọ bụ ya mere obi ji dị m ụtọ ugbu a ịzara ọnụ m n’ihu gị.+ 11 Ọ karịbeghị abalị iri na abụọ m gara Jeruselem ka m fee Chineke. Ị chọọ, i nwere ike ịchọpụta ma ọ̀ bụ eziokwu.+ 12 O nweghị mgbe ha hụrụ m ka mụ na onye ọ bụla na-arụ ụka n’ụlọ nsọ ma ọ bụ ka m na-eme ka ndị mmadụ na-akpa aghara n’ụlọ nzukọ ọ bụla ma ọ bụ n’ebe ọ bụla ọzọ na Jeruselem. 13 Ha agaghịkwa egosili gị otú ebubo ndị a ha na-ebo m si bụrụ eziokwu. 14 Ma, ekwetara m na m na-eso ụzọ ahụ ha na-akpọ òtù. Ọ bụ otú m si efe Chineke nna nna m hà,+ n’ihi na m kweere ihe niile Iwu Mosis na Akwụkwọ Ndị Amụma kwuru.+ 15 Enwekwara m olileanya otú ndị a nwere, na Chineke ga-akpọlite ndị ezi omume na ndị ajọ omume nwụrụ anwụ.+ 16 Ọ bụ ya mere m ji agbasi mbọ ike mgbe niile ka akọnuche m ghara ịma m ikpe, ka m ghara imebi iwu Chineke ma ọ bụ iwu mmadụ.+ 17 Mgbe ọtụtụ afọ gachara, agara m Jeruselem ka m nye onyinye a ga-eji nyere ndị obodo m aka,+ nyekwa ihe ndị a ga-eji chụọrọ Chineke àjà. 18 Ka m nọ na-eme ihe ndị a, ha hụrụ m n’ụlọ nsọ mgbe m sacharala onwe m otú iwu kwuru,+ ma ndị mmadụ agbakọtaghị, akpataghịkwa m ọgba aghara. Ma, e nwere ụfọdụ ndị Juu si ná mpaghara Eshia bịa nọ ebe ahụ. 19 A sịkwa na o nwere ihe ọjọọ ha hụrụ m mere, ha gaara abịa n’ihu gị ugbu a kwuo ya.+ 20 Ma ọ bụkwanụ, ka ndị nọ ebe a kwuo ihe ọjọọ ndị Sanhedrin chọpụtara m mere mgbe ha na-ekpe m ikpe. 21 Naanị ihe ha ga-asị na m mere bụ na m kwuru, sị: ‘A na-ekpe m ikpe taa maka na m kweere na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ.’”+

22 Ma, ebe Feliks ma nke bụ́ eziokwu gbasara Ụzọ Onyenwe anyị,+ o yigharịrị ikpe ha wee sị: “M ga-ekpebi okwu a mgbe ọ bụla ọchịagha Laịsias bịara.” 23 Ọ gwakwara onyeisi ndị agha ahụ ka ọ kpọchie Pọl, ma, ka ọ hapụ ya ka ọ na-eme ihe ụfọdụ ọ chọrọ ime, nakwa ka o kwe ka ndị enyi ya na-abịa enyere ya aka.

24 Mgbe abalị ole na ole gara, Feliks na Drusila nwunye ya, bụ́ onye Juu, bịara. O zikwara ka a kpọọ Pọl. Mgbe o rutere, o gere ya ntị ka ọ na-agwa ya gbasara mmadụ ikwere na Kraịst Jizọs.+ 25 Ma, ka ọ na-ekwu gbasara mmadụ ime ezi omume na ijide onwe ya nakwa ikpe a ga-ekpe ndị mmadụ n’ọdịnihu,+ Feliks tụwara ụjọ ma sị ya: “Ka gawagodị. M ga-ezi ozi ka a kpọọ gị ọzọ ma m nweta ohere.” 26 Ma, ọ nọkwa na-atụ anya ka Pọl nye ya ego. N’ihi ya, ọ kpọrọ ya ugboro ugboro, ya na ya ana-akparịta ụka. 27 Ma, mgbe afọ abụọ gachara, Pọshiọs Festọs nọchiri Feliks. Ma, Feliks hapụrụ Pọl n’ụlọ mkpọrọ n’ihi na ọ chọrọ ịzụrụ ụtọ ndị Juu.+

25 Mgbe o mere abalị atọ Festọs+ malitere ịchị Judia, o si Sizaria gaa Jeruselem. 2 Ndị isi nchụàjà na ndị isi ndị Juu gwara ya ihe na-adịghị mma gbasara Pọl.+ Ha malitekwara ịgwa ya 3 na otu ihe ọma ọ ga-emere ha bụ izi ozi ka a kpọta Pọl Jeruselem. Ma, ha nọ na-achọ ichechi Pọl n’ụzọ gbuo ya.+ 4 Ma, Festọs gwara ha na a kpọchiri Pọl na Sizaria, nakwa na yanwa ga-aga ebe ahụ n’oge na-adịghị anya. 5 Ọ gwakwara ha, sị: “Ka ndị isi unu soro m gaa ma kwuo ihe o mere, ma ọ bụrụ n’eziokwu na o mere ihe na-adịghị mma.”+

6 N’ihi ya, mgbe ọ nọrọ ihe dị ka abalị asatọ ma ọ bụ abalị iri na Jeruselem, ọ gawara Sizaria. N’echi ya, ọ nọdụrụ n’oche ikpe ma kwuo ka a kpọbata Pọl. 7 Mgbe a kpọbatara ya, ndị Juu, ndị si Jeruselem, bịara guzoro ya gburugburu, na-ekwu ọtụtụ arụ ha sị na ọ kpara. Ma, ha enweghị ike igosi otú ihe ndị ahụ ha na-ekwu si bụrụ eziokwu.+

8 Ma Pọl zaara ọnụ ya. Ọ sịrị: “Emebighị m Iwu ndị Juu. Emerụghị m ụlọ nsọ, emehieghịkwa m Siza.”+ 9 Ebe Festọs chọrọ ịzụrụ ụtọ ndị Juu,+ ọ jụrụ Pọl, sị: “Ị̀ chọrọ ịga Jeruselem ka a nọrọ ebe ahụ kpee gị ikpe n’ihu m?” 10 Ma Pọl sịrị: “Eguzo m n’ihu oche ikpe Siza. Ọ bụkwa ebe e kwesịrị ikpe m ikpe. O dokwara gị anya na o nweghị ihe ọjọọ m mere ndị Juu. 11 Ma, ọ bụrụ n’eziokwu na m bụ onye ọjọọ, ọ bụrụkwa na m metere ihe e kwesịrị iji maka ya gbuo m,+ ka e gbuo m. Agaghị m arịọ ka a ghara igbu m. Ma ọ bụrụ na ihe niile ndị a na-ebo m ebubo ha abụghị eziokwu, o nweghị onye kwesịrị inyefe m n’aka ha iji zụrụ ụtọ. Achọrọ m ka Siza kpee ikpe a.”+ 12 Mgbe Festọs na ndị ndụmọdụ ya gbachara izu, o kwuru, sị: “Ebe ị sị na ị chọrọ ka Siza kpee ikpe a, ọ bụ Siza ga-ekpe ya.”

13 Ma mgbe abalị ole na ole gachara, Eze Agrịpa na Benis bịara Sizaria ka ha kelee Festọs. 14 Ebe ọ bụ na ha ga-anọ ọtụtụ ụbọchị ebe ahụ, Festọs gwara Eze Agrịpa okwu gbasara Pọl. Ọ sịrị:

“E nwere otu nwoke Feliks hapụrụ n’ụlọ mkpọrọ. 15 Mgbe m gara Jeruselem, ndị isi nchụàjà na ndị okenye ndị Juu gwara m na o mere ihe ọjọọ,+ gwakwa m ka m ma ya ikpe. 16 Ma agwara m ha na e bo mmadụ ebubo, ndị Rom anaghị enyefe onye ahụ n’aka ndị boro ya ebubo iji zụrụ ụtọ. Kama, ha ga-ebu ụzọ kpọọ onye ahụ n’ihu ndị boro ya ebubo ka ha kwuo ya ihu na ihu, onye ahụ ejiri ohere ahụ zara ọnụ ya.+ 17 N’ihi ya, mgbe ha bịara ebe a, egbughị m oge ọ bụla, kama n’echi ya, anọdụrụ m ala n’oche ikpe ma kwuo ka a kpọbata nwoke ahụ. 18 Ndị boro ya ebubo biliri na-ekwu ọtụtụ ihe ha sị na o mere. Ma, ha eboghị ya ebubo arụ ndị m chere na ha ga-asị na ọ kpara.+ 19 Ihe na-esere ha okwu bụ ihe gbasara otú ha si efe chi ha*+ nakwa gbasara otu nwoke a na-akpọ Jizọs, onye mechara nwụọ, ma Pọl nọ na-ekwusi ike na ọ dị ndụ.+ 20 Ma, ebe ọ bụ na amachaghị m otú m ga-esi doziere ha okwu a, m jụrụ Pọl ma ọ̀ chọrọ ịga Jeruselem ka a nọrọ ebe ahụ kpee ikpe ya.+ 21 Ma mgbe o kwuru ka ya chere ruo mgbe Siza ga-ekpebi ikpe ya,+ m kwuru ka a kpọchie ya ruo mgbe m ga-akpọgara ya Siza.”

22 Agrịpa wee sị Festọs: “M ga-achọ ịnụ ihe nwoke ahụ ga-ekwu.”+ Festọs asị ya: “Ị ga-anụ ya echi.” 23 N’ihi ya, n’echi ya, Agrịpa na Benis kpaara nganga banye n’ụlọ a na-anọ ekpe ikpe, ha na ndị ọchịagha na ụmụ nwoke a ma ama n’obodo ahụ. A kpọbatakwara Pọl mgbe Festọs kwuru ka a kpọbata ya. 24 Festọs wee sị: “Eze Agrịpa na unu niile ndị so anyị nọrọ ebe a, nwoke a unu na-ahụ bụ onye ndị Juu niile nọ na-agwa m, na-eti mkpu, ma na Jeruselem ma n’ebe a, na o kwesịghịzi ịdị ndụ.+ 25 Ma achọpụtara m na o meghị ihe ọ bụla a ga-eji maka ya gbuo ya.+ N’ihi ya, mgbe o kwuru ka Siza kpee ikpe ya, ekpebiri m ịkpọgara ya Siza. 26 Ma, o nweghị ihe m ma m ga-edegara Onyenwe m Siza* gbasara ya. N’ihi ya, akpọtara m ya n’ihu unu, karịchaa n’ihu gị, Eze Agrịpa, ka m nweta ihe m ga-ede mgbe i lebachara anya n’okwu ya. 27 N’ihi na echeghị m na e kwesịrị iziga onye mkpọrọ Rom n’ekwughị ihe o mere.”

26 Agrịpa+ wee sị Pọl: “I nwere ike ịzara ọnụ gị.” Pọl wee gbasaa aka ya, sị:

2 “Eze Agrịpa, obi dị m ụtọ na m nọ n’ihu gị taa na-azara ọnụ m n’okwu gbasara ebubo niile ndị Juu na-ebo m.+ 3 Ihe kacha atọ m ụtọ bụ na ị bụ ọkachamara n’okwu gbasara omenala niile nke ndị Juu, ihe na-esere ha okwu dokwara gị anya. N’ihi ya, biko, nwee ndidi ka m na-azara ọnụ m.

4 “N’eziokwu, ọtụtụ ndị Juu ma m kemgbe m bụ nwata, malite n’oge m nọ n’obodo anyị ruo n’oge m bịara Jeruselem.+ 5 Ọ bụrụkwa na ha chọrọ, ha ga-agwa gị na m bụbu onye Farisii.+ Ị makwa na ndị Farisii ka ndị Juu ndị ọzọ ekwu otú a ga-esi na-edebe iwu dị iche iche.+ 6 Ma, ihe mere e ji na-ekpe m ikpe ugbu a bụ maka na m nwere olileanya na nkwa Chineke kwere nna nna anyị hà ga-emezu.+ 7 Mmadụ niile n’ebo iri na abụọ anyị nwekwara olileanya na Chineke ga-emezu nkwa a. Ọ bụ ya mere ha ji na-efesi ya ike ehihie na abalị. Eze, ọ bụ maka na m nwere olileanya a mere ndị Juu ji na-ebo m ebubo.+

8 “Gịnị mere o ji esiri unu ike ikweta na Chineke na-akpọlite ndị nwụrụ anwụ? 9 E nwere oge m kpebiri na m ga na-emegide Jizọs onye Nazaret.* 10 Anọ m na-emegide ya na Jeruselem. Ndị isi nchụàjà nyekwara m ikike,+ mụ akpọchie ọtụtụ ndị nsọ n’ụlọ mkpọrọ.+ A chọọ igbu ha, m na-akwado ka e gbuo ha. 11 Atara m ha ahụhụ ọtụtụ ugboro n’ụlọ nzukọ niile iji manye ha ka ha kwụsị ikwere ihe ndị ha kweere. M na-agadị obodo dị iche iche na-akpagbu ha n’ihi otú m si kpọ ha asị.

12 “Otu ụbọchị, m nọ na-aga Damaskọs n’ihi na ndị isi nchụàjà nyere m ikike ka m gaa kpagbuo ha otú m na-eme. 13 Eze, ka m nọ na-aga n’okporo ụzọ n’etiti ehihie, ìhè karịrị ìhè anyanwụ si n’eluigwe nwuo gburugburu mụ na ndị so m na-aga.+ 14 Mgbe anyị niile dara n’ala, anụrụ m olu gwara m n’asụsụ Hibru, sị: ‘Sọl, Sọl, gịnị mere i ji na-akpagbu m? Ị na-emerụ onwe gị ahụ́ ma ị na-alụso m ọgụ.’* 15 Ma asịrị m, ‘Ị̀ bụkwanụ onye, Onyenwe m?’ Onyenwe anyị asị: ‘Abụ m Jizọs, onye ị na-akpagbu. 16 Ma, bilie guzoro. Ihe mere m ji pụta n’ihu gị bụ ka m họrọ gị ka ị bụrụ ohu m nakwa ka ị na-ekwusa ihe ndị ị hụrụ na ihe ndị m ga-eme ka ị hụ banyere m.+ 17 M ga-anapụta gị n’aka ndị Juu nakwa n’aka ndị mba ọzọ, ndị m na-ezi gị ka ị gakwuru.+ 18 M na-eziga gị ka i meghee anya ha,+ ka ha wee si n’ọchịchịrị+ baa n’ìhè,+ sikwa n’aka Setan+ pụọ banye n’aka Chineke, ka Chineke gbaghara ha mmehie ha.+ Ọ ga-ejikwa maka okwukwe ha nwere na m doo ha nsọ ma gọzie ha otú o meere ndị ohu ya ndị ọzọ.’

19 “N’ihi ya, Eze Agrịpa, ọ bụ ihe Jizọs gwara m n’ọhụụ ahụ ka m mere. 20 Ma, ebu m ụzọ zie ndị bi na Damaskọs+ ozi ahụ, mechaakwa zie ndị bi na Jeruselem,+ na Judia niile, nakwa ndị mba ọzọ, ka ha niile chegharịa, na-emekwa ihe gosiri na ha echegharịala+ ma lọghachikwute Chineke. 21 Ọ bụ ihe a ka ndị Juu kwo jide m n’ụlọ nsọ, chọọkwa igbu m.+ 22 Ma, n’ihi aka Chineke na-enyere m, ana m ezi ma ndị nta ma ndị ukwu ozi ọma ruo taa. Naanị ihe m na-ekwu bụ ihe Mosis na ndị amụma dere na ọ ga-eme.+ Ha dere na 23 Kraịst ga-ata ahụhụ,+ nakwa na ọ bụ onye mbụ a ga-akpọlite n’ọnwụ,+ onye ga-ekwusara mba a na ndị mba ọzọ ozi ọma, meekwa ka ìhè dị.”+

24 Ma ka Pọl na-ekwu ihe ndị a iji zara ọnụ ya, Festọs ji oké olu, sị: “Pọl, isi emebiela gị! Oké akwụkwọ ị ma na-agbazi gị ara!” 25 Ma Pọl sịrị: “Festọs Onye Ukwu, ara anaghị agba m, kama, ihe m na-ekwu bụ eziokwu, uche zukwara m okè. 26 N’eziokwu, ihe mere m ji tụsara ahụ́ na-agwa eze ihe ndị a bụ maka na ọ ma ha nke ọma. O doro m anya na o nweghị otu n’ime ihe ndị a ọ na-amaghị, n’ihi na e nweghị nke e mere na nzuzo.+ 27 Eze Agrịpa, ì kweere ihe ndị amụma kwuru? Ama m na i kweere.” 28 Ma Agrịpa sịrị Pọl: “N’oge na-adịghị anya, ị ga-eme ka m ghọọ Onye Kraịst.” 29 Pọl wee sị: “Ihe m na-arịọ Chineke bụ ka ma gị ma ndị niile na-anụ olu m taa bụrụ Ndị Kraịst otú m bụ, ma ọ̀ bụ n’oge na-adịghị anya, ma ọ bụ ma e mechaa. Ma, achọghị m ka e kee unu agbụ otú a e kere m.”

30 Eze Agrịpa na gọvanọ na Benis nakwa ndị ha na ha nọ ọdụ wee bilie. 31 Ma ka ha na-apụ, ha malitere ịgwa ibe ha, sị: “O nweghị ihe nwoke a mere a ga-eji maka ya gbuo ya ma ọ bụ tụọ ya mkpọrọ.”+ 32 Agrịpa wee sị Festọs: “E wezụga na nwoke a sị na ọ chọrọ ka Siza kpee ikpe ya, a gaara ahapụ ya.”+

27 Ebe e kpebiri na ọ bụ ụgbọ mmiri ka a ga-eji ebuga anyị Ịtali,+ ha nyefere ma Pọl ma ụfọdụ ndị mkpọrọ ọzọ n’aka otu onyeisi ndị agha aha ya bụ Juliọs, onye so n’ìgwè ndị agha a na-akpọ Ọgọstọs. 2 Anyị banyere n’otu ụgbọ mmiri nke si Adramitiọm, nke chọrọ ịga n’ọdụ ụgbọ mmiri ndị dị n’ụsọ osimiri ná mpaghara Eshia, ụgbọ mmiri ahụ eburu anyị gawa. Arịstakọs,+ onye Tesalonaịka nke dị na Masedonia, sokwa anyị. 3 N’echi ya, anyị kwụsịrị na Saịdọn. Juliọs mesoro Pọl otú dị mma. O kwekwara ka ọ gakwuru ndị enyi ya ka ha nyere ya aka.

4 Ụgbọ mmiri sizi ebe ahụ buru anyị gaa Saịprọs, bụ́ ebe anyị ruru ifufe akwụsị inye anyị nsogbu. 5 Anyị sikwa n’oké osimiri dị n’akụkụ Silishia na Pamfilia gaa kwụsị n’ọdụ ụgbọ mmiri dị na Maịra nke dị na Lishia. 6 N’ebe ahụ, onyeisi ndị agha ahụ hụrụ otu ụgbọ mmiri si Alegzandria na-aga Ịtali, ya asị anyị banye na ya, anyị abanye. 7 Ụgbọ mmiri ahụ bu anyị nọ na-aga nwayọọ nwayọọ, ma, anyị mechara ruo Kinaịdọs ka ọtụtụ ụbọchị gachara. Ebe ọ bụkwa na ifufe ekweghị anyị na-aga ebe anyị chọrọ ịga, ndị kwọ ụgbọ ahụ kwọọrọ ya gaa n’akụkụ Krit, nke dị nso na Salmoni, bụ́ ebe anyị ruru ifufe akwụsị inye anyị nsogbu. 8 Ka anyị jisikwara ike kwọrọ ụgbọ na-aga, anyị bịaruru ebe a na-akpọ Ọdụ Ụgbọ Mmiri Ọma, ebe dị nso na Lesia.

9 Ọtụtụ ụbọchị agaala. Iji ụgbọ mmiri aga ebe ọ bụla ugbu a nwekwara ike ịta isi mmadụ n’ihi na Ụbọchị Ikpuchi Mmehie+ ndị mmadụ na-ebu ọnụ agafeedịla.* N’ihi ya, Pọl tụụrụ ha aro, 10 sị: “Ka anyị cheretụnụ. Anyị gawa ije a ugbu a, ụgbọ anyị ga-ekpu. Ihe niile anyị ji ga-ala n’iyi. Anyị nwekwara ike ịnwụ.” 11 Ma, onyeisi ndị agha ahụ gere onye na-akwọ ụgbọ mmiri ahụ na onye nwe ụgbọ mmiri ahụ ntị kama ige Pọl ntị. 12 Ma ebe ọ bụ na n’oge oyi, ọ dịghị mma ịnọ n’ọdụ ụgbọ mmiri ahụ, ọtụtụ n’ime ndị nọ n’ụgbọ ahụ tụrụ aro ka a kwọrọ ụgbọ ahụ gawa, ka ha lee ma è nwere otú ha ga-esi ruo ọdụ ụgbọ mmiri Finiks nke dị na Krit ma nọrọ ebe ahụ ka oge oyi gafee. Ọdụ ụgbọ mmiri a chere ihu n’ebe ọwụwa anyanwụ.

13 Mgbe ifufe nke si n’ebe ndịda na-efe nwayọọ nwayọọ, ha chere na ha ga-eru Finiks. Ha dọlitekwara nko e ji ejide ụgbọ mmiri* ma kwọrọ ụgbọ ahụ na-aga Krit. Ha nọ na-aga mmiri ahụ akụkụ akụkụ. 14 Ma obere oge, oké ifufe a na-akpọ Yuroakwilo* malitere ife. 15 Ifufe ahụ busiwere ụgbọ mmiri ahụ ike, nke mere na o nweghịzi ike ịga ebe a chọrọ ka ọ gaa. Anyị enweghịkwa ike ime ihe ọ bụla gbasara ya. N’ihi ya, anyị hapụrụ ka ifufe ahụ buru anyị na-aga. 16 Ma, anyị ruru n’otu obere agwaetiti a na-akpọ Kọda, ebe ifufe ahụ kwụsịtụrụ inye anyị nsogbu. Ma, ibubata ụgbọ epeepe* na-adị n’azụ ụgbọ anyị siiri anyị ike. 17 Ma, mgbe anyị bubatachara ya n’ime ụgbọ mmiri ahụ, ndị na-akwọ ụgbọ ahụ ji ụdọ kesie okpuru ụgbọ ahụ ike. Ebe ha na-atụkwa ụjọ na ụgbọ mmiri ha ga-akpụ n’ala na Sietis,* ha tọturu ihe e ji eduzi ụgbọ mmiri, ifufe eburu ụgbọ anyị na-aga. 18 Ma n’echi ya, ha tụpụsịrị ihe ụfọdụ dị n’ụgbọ mmiri ahụ, n’ihi na oké ifufe ahụ nọ na-aṅagharịsi ụgbọ anyị ike. 19 N’ụbọchị nke atọ, ha tụpụsịrị ihe ndị e ji arụ ọrụ n’ụgbọ mmiri ahụ.

20 Mgbe anyanwụ ma ọ bụ kpakpando na-apụtaghị ruo ọtụtụ ụbọchị, oké ifufe mmiri ana-efekwa anyị, anyị kwụsịrị inwe olileanya na a ga-azọpụta anyị. 21 Mgbe anyị nọchara oge a niile n’erighị nri, Pọl biliri, sị: “A sị na unu gere m ntị, anyị agaraghị esi na Krit pụọ, anyị agaraghịkwa ata ahụhụ niile a anyị na-ata ma ọ bụ tụpụsịa ihe ndị ahụ anyị tụpụsịrị.+ 22 Otú o sina dị, obi sie unu ike, n’ihi na o nweghị onye* ọ bụla n’ime unu ga-ala n’iyi, naanị ụgbọ a ga-ala n’iyi. 23 N’abalị ụnyaahụ, Chineke, onye m bụ nke ya na onye m na-efe, zitere otu mmụọ ozi,+ ya abịa guzoro m nso, 24 sị: ‘Pọl, ụjọ atụla gị. Gị na Siza ga-ahụ.+ Chineke ga-azọpụta gị na ndị niile gị na ha nọ n’ụgbọ mmiri a.’ 25 N’ihi ya, obi sie unu ike maka na ekwere m na Chineke ga-eme ihe a mmụọ ozi gwara m. 26 Ma, ụgbọ anyị ga-akpọkasị, anyịnwa apụta n’ikpere mmiri n’otu agwaetiti.”+

27 Mgbe ifufe nọ na-aṅagharị ụgbọ mmiri anyị n’elu oké osimiri Edria ruo abalị iri na anọ, n’etiti abalị, ndị na-akwọ ụgbọ mmiri ahụ malitere iche na ha eruwela elu ala nso. 28 Ha wee tụọ otú ebe anyị nọ n’osimiri ahụ dịruru n’omimi ma hụ na ọ dị otu narị amaụkwụ na iri abụọ (120).* Ha agatụkwuokwa n’ihu, tụọ ya ọzọ, hụ na ọ dị amaụkwụ iri itoolu.* 29 Ma, ụjọ nọ na-atụ ndị na-akwọ ụgbọ ahụ na o nwere ike ịkụ n’elu nkume kpuo. N’ihi ya, ha si n’azụ ya tụpụ nko anọ e ji ejide ụgbọ mmiri,* obi ha niile abụrụ ka chi bọwa ngwa ngwa. 30 Ma ndị ahụ na-akwọ ụgbọ mmiri ahụ chọwara isi n’ụgbọ ahụ pụọ. Ọ bụ ya mere ha ji bido iwetu ụgbọ epeepe na mmiri ahụ. Ma, ha nọ na-eme ka à ga-asị na ha chọrọ isi n’ihu ụgbọ ahụ wedasịa nko ndị ahụ e ji ejide ụgbọ mmiri.* 31 Mgbe Pọl matara ihe a, ọ gwara onyeisi ndị agha ahụ na ndị agha ya, sị: “Ọ bụrụ na ndị a esi n’ụgbọ a pụọ, a gaghị azọpụta unu.”+ 32 Ndị agha ahụ wee gbubie ụdọ ji ụgbọ epeepe ahụ ma hapụ ya ka ọ dapụ.

33 Ma ka chi na-achọ ịbọ, Pọl gbara ha niile ume ka ha rie nri. Ọ sịrị: “Taa mere ya abalị iri na anọ unu nọ na-atụ anya ịpụta ná nsogbu a, o nwebeghịkwa ihe unu riri. 34 N’ihi ya, gbalịanụ rie nri maka ọdịmma unu. O nweghị onye n’ime unu otu ntutu isi ya ga-ala n’iyi.” 35 Mgbe o kwuchara ihe a, o weere otu ogbe achịcha, kelee Chineke n’ihu ha niile, nyawaa ya ma bido ịta ya. 36 Ihe a o mere mesiri ha obi ike, ha amalitekwa iri ihe. 37 Anyị niile nọ n’ụgbọ ahụ dị narị mmadụ* abụọ na iri asaa na isii (276). 38 Mgbe ha rijuru afọ, ha bidoro na-atụba ọka wit na mmiri ahụ ka ụgbọ ahụ dị fere fere.+

39 Mgbe chi bọrọ, ndị na-akwọ ụgbọ ahụ enweghị ike ịmata ebe anyị nọ.+ Ma ha hụrụ mbara ala nwere ọnụ mmiri, chọọkwa ịkwụsị ụgbọ ahụ ebe ahụ ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe ha omume. 40 N’ihi ya, ha gbubiri nko ndị ahụ e ji ejide ụgbọ mmiri,* hapụkwa ha ha adaba na mmiri ahụ. Ha tọpụkwara ụdọ e ji kedo ụmara ụgbọ ahụ ozugbo. Mgbe ha dọlitechara ákwà na-adị n’ihu ụgbọ mmiri ka ifufe na-ebu ya, ha gawara n’ikpere osimiri ahụ. 41 Mgbe ha kwọọrọ ụgbọ ahụ na-aga ka ha banye na mbara ala ahụ, ụgbọ ahụ kụrụ n’elu otu mkputamkpu ájá, nke mmiri na-asọ n’akụkụ ya abụọ. Ihu ya wee tọ ebe ahụ, ebili mmiri amalitekwa ịkụrisị azụ ya.+ 42 Ndị agha ahụ wee kpebie na ha ga-egbu ndị mkpọrọ ahụ, ka onye ọ bụla ghara ịwụba na mmiri ahụ, gwuru mmiri gbalaga. 43 Ma onyeisi ndị agha ahụ achọghị ka ihe ọ bụla mee Pọl. N’ihi ya, o kweghị ka ndị agha ya mee ihe ahụ ha chọrọ ime. Ọ gwara ndị ma egwu mmiri ka ha maba na mmiri buru ụzọ gwuru mmiri pụta n’elu ala. 44 Ọ gwakwara ndị ọzọ ka ha soro ha n’azụ, ka ụfọdụ jide ibé osisi aka, ndị ọzọ ejide ihe ụfọdụ si n’ụgbọ mmiri ahụ aka. Otú a ka mmadụ niile si pụta n’elu ala n’enweghị ihe mere ha.+

28 Mgbe anyị pụtachara n’enweghị ihe mere anyị, anyị chọpụtara na a na-akpọ agwaetiti ahụ Mọlta.+ 2 Ndị bi n’agwaetiti a* meere anyị ihe ọma pụrụ iche. Ha nabatara anyị niile nke ọma, kwanyekwara anyị ọkụ n’ihi mmiri na-ezo nakwa n’ihi oyi na-atụ. 3 Ma mgbe Pọl buuru otu ùkwù nkụ tụkwasị n’ọkụ ahụ, otu ajụala si na nkụ ahụ pụta n’ihi ọkụ ahụ ma gbakụọ ya n’aka. 4 Mgbe ndị ebe ahụ hụrụ agwọ ahụ gbakụrụ ya n’aka, ha malitere ịgwa ibe ha, sị: “N’eziokwu, nwoke a bụ ogbu mmadụ. Ọ bụ eziokwu na o si n’oké osimiri pụta n’enweghị ihe mere ya, ihe o metara* ga-egburịrị ya.” 5 Ma, o febara agwọ ahụ n’ime ọkụ, o nweghịkwa ihe mere ya. 6 Ma ha nọ na-atụ anya na aka ya ga-aza ma ọ bụ na ọ ga-ada na mberede nwụọ. Mgbe ha chegidere hụ na o nweghị ihe mere ya, ha gbanwere obi ha, malite ịsị na ọ bụ chi.

7 Nwoke na-achị agwaetiti ahụ bi nso ebe ahụ. Aha ya bụ Pọbliọs. O nwere ọtụtụ ala. Ọ nabatara anyị nke ọma, leekwa anyị ọbịa ụbọchị atọ. 8 Ma, nna Pọbliọs dina ala maka na ahụ́ ọkụ ji ya, afọ na-asakwa ya, ya ana-anyụ ọbara. Pọl wee banye ebe ọ nọ, kpee ekpere, bikwasị ya aka n’isi, ya agbakee.+ 9 Mgbe ihe a mechara, ndị ọzọ na-arịa ọrịa n’agwaetiti ahụ bịara ka Pọl gwọọ ha, ya agwọọkwa ha.+ 10 Ha nyere anyị ọtụtụ onyinye maka ihe Pọl meere ha. Mgbe anyị na-abakwa n’ụgbọ mmiri ga-eburu anyị pụwa, ha nyere anyị ihe niile dị anyị mkpa, bubakwa ha n’ụgbọ ahụ.

11 Mgbe anyị nọchara ebe ahụ ọnwa atọ, otu ụgbọ mmiri a tụrụ ụmụ Zus n’ahụ́ ya buuru anyị gawa. Ụgbọ mmiri a si Alegzandria ma nọrọ n’agwaetiti ahụ oge oyi agafee. 12 Mgbe anyị ruru n’ọdụ ụgbọ mmiri dị na Sirakus, anyị nọrọ ebe ahụ ụbọchị atọ. 13 Anyị si ebe ahụ gaa Rijiọm. Mgbe otu ụbọchị gara, ifufe nke si ebe ndịda malitere ife, anyị ana-aga ma rute Putiolaị n’ụbọchị nke abụọ ya. 14 Anyị hụrụ ụmụnna ebe a, ha rịọkwara anyị ka anyị na ha nọrọ ruo ụbọchị asaa. Anyị sikwa ebe ahụ gawa Rom. 15 Mgbe ụmụnna nọ na Rom nụrụ na anyị na-abịa, ha bịara ebe a na-akpọ Ụlọ Atọ* ka ha zute anyị. Ụfọdụ n’ime ha bịarudịrị n’Ahịa Apịọs. Ozugbo Pọl hụrụ ha, o kelere Chineke, obi esiekwa ya ike.+ 16 Mgbe anyị mechara ruo Rom, a hapụrụ Pọl ya ebiri ebe ọ chọrọ ibi, naanị ya na onye agha na-eche ya nche anọrọ.

17 Ma, mgbe ụbọchị atọ gachara, ọ kpọrọ ndị isi ndị Juu bi ebe ahụ ka ha bịa. Mgbe ha bịara, ọ sịrị ha: “Ụmụnne m, ọ bụ eziokwu na o nweghị ihe ọjọọ m mere ndị Juu, emebighịkwa m omenala nna nna anyị hà,+ a kpọchiri m ka onye mkpọrọ na Jeruselem, nyefeekwa m n’aka ndị Rom.+ 18 Ma, mgbe ha lebachara okwu m anya,+ ha chọrọ ịhapụ m, maka na o nweghị ihe ha chọpụtara a ga-eji maka ya gbuo m.+ 19 Ma mgbe ndị Juu nọ na-asị ka a ghara ịhapụ m, o nweghị ihe ọzọ m ma m ga-eme karịa ịsị ka e wegara Siza okwu m,+ ma ọ bụghị na o nwere ihe m ga-asị na ndị obodo anyị mere. 20 Ihe mere m ji sị na m chọrọ ịhụ unu bụ ka m kọọrọ unu ihe merenụ. Ọ bụ maka onye Izrel na-atụ anya ya ka e ji kee m agbụ ígwè a.”+ 21 Ha asị ya: “O nwebeghị akwụkwọ ozi e si Judia detara anyị banyere gị, o nwebeghịkwa onye si ebe ahụ bịa gwa anyị na o nwere ihe i mere. 22 Ma anyị bịara ka ị kọọrọ anyị ihe merenụ, n’ihi na, n’eziokwu, anyị ma na ndị mmadụ na-ekwu okwu ọjọọ gbasara òtù a+ n’ebe niile.”+

23 Ya na ha wee yie ụbọchị ha ga-ahụ ọzọ. Mgbe ụbọchị ahụ ruru, ha hikwuru nne bịa ebe o bi. Ọ kọwakwaara ha nke ọma okwu gbasara Alaeze Chineke, si n’ụtụtụ ruo anyasị. O jikwa ihe dị n’Iwu Mosis+ nakwa n’Akwụkwọ Ndị Amụma+ gwa ha okwu gbasara Jizọs+ otú ọ ga-eru ha n’obi. 24 Ụfọdụ ndị malitekwara ikwere ihe ọ na-ekwu, ma ndị ọzọ ekweghị. 25 Ebe ọ bụ na ha enweghị otu olu, ha malitere ịpụ, ma Pọl kwuru otu okwu a, sị:

“Mmụọ nsọ si n’ọnụ Aịzaya onye amụma gwa nna nna unu hà okwu a dabara adaba, 26 sị: ‘Gaa gwa ndị a, sị: “Unu ga-anụ ihe, ma unu agaghị aghọta ihe ọ bụla. Unu ga-ele anya, ma unu agaghị ahụ ihe ọ bụla.+ 27 N’ihi na obi ndị a anaghịzi anabata ihe, ha ejirikwala ntị ha nụ ihe, ma ha emeghị ihe ọ bụla. Ha emechiekwala anya ha ka ha ghara ịhụ ụzọ, mechie ntị ha ka ha ghara ịnụ ihe ọ bụla, kpọchiekwa obi ha ka ha ghara ịghọta ihe ọ bụla, gharakwa ịgbanwe, m wee gwọọ ha.”’+ 28 N’ihi ya, maranụ na a na-ezi ndị mba ọzọ ozi a nke gbasara otú Chineke ga-esi zọpụta ndị mmadụ.+ Ha ga-egekwa ntị.”+ 29* ——

30 Ọ nọgidere n’ụlọ ọ na-akwụ ụgwọ ya ruo afọ abụọ zuru ezu.+ Ọ na-anabatakwa ndị niile bịara ịhụ ya. 31 Ọ na-ekwusara ha gbasara Alaeze Chineke, na-akụzikwara ha banyere Onyenwe anyị Jizọs Kraịst n’atụghị ụjọ.+ O nweghịkwa onye ọ bụla na-egbochi ya.

Ma ọ bụ “ruokwa n’ebe ụwa sọtụrụ.”

Ma ọ bụ “Isi n’ugwu ahụ ruo Jeruselem na-ewe otu ụbọchị izu ike.” Naanị ihe dị ka otu kilomita ka onye Juu nwere ike ịga n’ụbọchị izu ike.

Ya bụ, ọrụ ilekọta ọgbakọ.

Gụọ A5.

Ma ọ bụ “asụsụ ọ na-asụ kemgbe a mụrụ ya.”

Na Grik, “ndị a tọghatara atọghata.”

Ma ọ bụ “Mmanya ọhụrụ.”

Ya bụ, ihe dị ka n’elekere itoolu nke ụtụtụ.

Ma ọ bụ “ebube.”

Gụọ A5.

Gụọ A5.

Ma ọ bụ “ebube.”

Gụọ A5.

Ma ọ bụ “ka m maa jijiji.”

Na Grik, “Anụ ahụ́ m.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”

Ma ọ bụ “na Hedis.” Gụọ Nkọwa Okwu.

Na Grik, “onye si ná mkpụrụ nke úkwù ya.”

Ma ọ bụ “na Hedis.” Gụọ Nkọwa Okwu.

Gụọ A5.

Gụọ A5.

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi ọ bụla.”

Gụọ A5.

Ya bụ, ihe dị ka n’elekere atọ nke ehihie.

Gụọ A5.

Gụọ A5.

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ọ bụla.”

Na Grik, “mkpụrụ.”

Ya bụ, na ha agaghị ụlọ akwụkwọ ndị Rabaị. Ọ pụtaghị na ha bụ ndị itibọrịbọ.

Ma ọ bụ “ana-atụgharịkwa uche n’ihe.”

Gụọ A5.

Ma ọ bụ “Kraịst.”

Gụọ A5.

Ma ọ bụ “kpesiri ekpere ike.”

Na Grik, “otu obi na mkpụrụ obi.” Gụọ Nkọwa Okwu.

Gụọ A5.

Ma ọ bụ “ihe ndina.”

Na Grik, “ndị mmụọ na-adịghị ọcha.”

Gụọ A5.

Gụọ Nkọwa Okwu.

Ma ọ bụ “ga-erubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị.”

Ma ọ bụ “ọ dụrụ ha adụ n’obi.”

Gụọ Nkọwa Okwu.

Ya bụ, Iwu Mosis.

Ma ọ bụ “kụọ.”

Gụọ Nkọwa Okwu.

Ya bụ, ụmụ nwaanyị isi mkpe ndị na-asụ Grik.

Ma ọ bụ “ụmụ nwoke asaa ndị a na-ekwu okwu ọma gbasara ha.”

Ma ọ bụ “a tọghatara atọghata.”

Gụọ Nkọwa Okwu.

Gụọ Nkọwa Okwu.

Na Grik, “mkpụrụ.”

Na Grik, “mkpụrụ.”

Ma ọ bụ “ọka.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Ma ọ bụ “Ọ makwara mma n’anya Chineke.”

Ma ọ bụ “o kpebiri.”

Ma ọ bụ “ịga lee otú ụmụnne ya mere.”

Gụọ A5.

Gụọ A5.

Ma ọ bụ “ụlọikwuu nke na-egosi na Chineke nọnyeere ha.”

Gụọ A5.

Ma ọ bụ “dụrụ ha adụ n’obi.”

Ma ọ bụ “ume.” Gụọ Nkọwa Okwu, “Mmụọ.”

Na Grik, “nabata mmụọ m.”

Gụọ A5.

Na Grik, “o hiri ụra.”

Na Grik, “ndị mmụọ na-adịghị ọcha.”

Ma ọ bụ “majik.”

Ma ọ bụ “majik.”

Gụọ A5.

Gụọ A5.

Gụọ A5.

Gụọ A5.

Na Grik, “ọnaozi.” Gụọ Nkọwa Okwu.

Gụọ A3.

Gụọ A5.

Na Grik, “ka o kee ndị niile na-akpọ aha gị agbụ.”

Na Grik, “ndị na-akpọ aha a.”

Na Grik, “ka o kee ha agbụ.”

Gụọ A5.

Ma ọ bụ “n’ihe ndina.”

Dọkas, bụ́ aha Grik, na Tabita, bụ́ aha Arameik, pụtara nne mgbada.

Ma ọ bụ “uwe elu.”

Ya bụ, onye na-emechasị akpụkpọ anụ ma sijie ya ka e jiri ya rụọ ihe dị iche iche.

Ndị agha Rom nwoke a bụ onyeisi ha dị otu narị.

Ya bụ, ihe dị ka n’elekere atọ nke ehihie.

Ya bụ, onye na-emechasị akpụkpọ anụ ma sijie ya ka e jiri ya rụọ ihe dị iche iche.

Elu ụlọ ndị a na-arụ n’oge ahụ na-adịkarị larịị. Ndị mmadụ na-anọkwa na ha eme ihe dị iche iche.

Ya bụ, n’ihe dị ka n’elekere iri na abụọ nke ehihie.

Ma ọ bụ “anụ ndị na-akpụ akpụ.”

Ma ọ bụ “mmụọ ozi dị nsọ.”

Ya bụ, ihe dị ka n’elekere atọ nke ehihie.

Ya bụ, onye na-emechasị akpụkpọ anụ ma sijie ya ka e jiri ya rụọ ihe dị iche iche.

Gụọ A5.

Na Grik, “ndị na-eso ụzọ Jizọs e biri úgwù.”

Ma ọ bụ “anụ ndị na-akpụ akpụ.”

Na Grik, “ha gbachiri nkịtị.”

Gụọ A5.

Ma ọ bụ “ịkpọpụta ya ka e kpee ya ikpe.”

Gụọ A5.

Ma ọ bụ “Kee ihe n’úkwù gị.”

Gụọ A5.

Na Grik, “Ọ bụ mmụọ ozi ya.”

Gụọ A5.

Na Grik, “onye na-elekọta ụlọ eze na-anọ ehi ụra.”

Gụọ A5.

Gụọ A5.

Gụọ A5.

Ma ọ bụ “na-enyere ha aka.”

Gụọ A5.

Gụọ A5.

Gụọ A5.

“Iwu Mosis na Akwụkwọ Ndị Amụma” pụtara Akwụkwọ Nsọ Hibru niile.

Na Grik, “ogwe aka ya dị ike.”

Na Grik, “ná mkpụrụ.”

Ma ọ bụ “lie ya n’ili ncheta.”

Ma ọ bụ “igosi unu ịhụnanya pụrụ iche.”

Ma ọ bụ “ndị a tọghatara atọghata.”

Gụọ A5.

Gụọ A5.

Gụọ A5.

Gụọ A5.

Gụọ A5.

Ma ọ bụ “Jupita.”

Ma ọ bụ “Mekuri.”

Gụọ A5.

Ya bụ, Pọl na Banabas.

Ya bụ, Pọl na Banabas.

Ya bụ, Pita.

Ma ọ bụ “ụlọ ndò; ụlọ.”

Gụọ A5.

Gụọ A5.

Grik, por·nei′a. Gụọ Nkọwa Okwu.

Ma ọ bụ “anụ a na-egbupụghị ọbara.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Ma ọ bụ “anụ a na-egbupụghị ọbara.”

Grik, por·nei′a. Gụọ Nkọwa Okwu.

Gụọ A3.

Gụọ A5.

Gụọ A5.

Gụọ A5.

Ma ọ bụ “ihe e ji esiji ákwà ka ọ na-acha pọpụl.”

Gụọ A5.

Gụọ A5.

Gụọ A5.

Ma ọ bụ “n’ekpeghị anyị ikpe.”

Ọ bụ ugwu dị n’Atens n’oge ochie, ebe ụlọikpe kacha elu na-anọkwa ekpe ikpe.

Ma ọ bụ “na-efe.”

Ya bụ, n’ụlọ nzukọ.

Gụọ A5.

Gụọ A5.

Gụọ A5.

Ya bụ, chi nwaanyị.

Ihe a na-akpọ ụbọchị a ugbu a bụ Sọnde. Ọ bụ ya bụ ụbọchị mbụ n’izu ndị Juu.

Ma ọ bụ “oriọna.”

Ma ọ bụrụ na a gụnye nke ala ala ya.

Na Grik, “mkpụrụ obi ya dị n’ime ya.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”

Na Grik, “ha dakwasịkwara Pọl n’olu.”

Otú e si ekele mmadụ n’oge ahụ bụ isusu ya ọnụ, dị ka isusu ya ọnụ na ntì.

Na Grik, “na-amaghị nwoke.”

Ya bụ, belt.

Na Grik, “anyị gbara nkịtị.”

Gụọ A5.

Ya bụ, ka ha wee mezuo nkwa ha kwere Chineke.

Ma ọ bụ “anụ a na-egbupụghị ọbara.”

Grik, por·nei′a. Gụọ Nkọwa Okwu.

Ya bụ, ndị na-eso ụzọ Kraịst.

Na Grik, “Ị̀ bụ onye, Onyenwe anyị?”

Na Grik, “onye àmà gị.”

Ya bụ, onyeisi otu narị ndị agha.

Ma ọ bụ “a na-ekpeghị ikpe?”

Na Grik, “ga-adọrisị.”

Ya bụ, nwa nwanne ya nwaanyị.

Ya bụ, ihe dị ka n’elekere itoolu nke abalị.

Ma ọ bụ “otu ọkàiwu.”

Ma ọ bụ “onye okwu na ụka.”

Gụọ A3.

Ma ọ bụ “ihe gbasara okpukpe ha.”

Na Grik, “m ga-edegara Onyenwe m.”

Na Grik, “na-emegide aha Jizọs onye Nazaret.”

Na Grik, “Ị na-emerụ onwe gị ahụ́ ma ị na-agba ndụdụ e ji achị anụ ụkwụ.”

Ihe a na-eme n’ọnwa Tishri nke bụ́ ọnwa mmiri ji ebido izo na oge oké osimiri na-akpa ike dị egwu.

Ma ọ bụ “dọlitekwara arịlịka.”

Ya bụ, ifufe si ebe ugwu ọwụwa anyanwụ.

Ọ bụ ụgbọ e nwere ike iji gụpụta onye mmiri chọrọ iri.

Gụọ Nkọwa Okwu.

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Ihe dị ka mita 36 ma ọ bụ fatọm 20. Gụọ B14.

Ihe dị ka mita 27 ma ọ bụ fatọm 15. Gụọ B14.

Ma ọ bụ “tụpụ arịlịka anọ.”

Ma ọ bụ “wedasịa arịlịka ndị ahụ.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Ma ọ bụ “gbubiri arịlịka ndị ahụ.”

Ma ọ bụ “Ndị na-anaghị asụ Grik.”

Ma ọ bụ “Ikpe Ziri Ezi.” Grik, Di′ke. O nwere ike ịbụ ihe a na-akpọ chi nwaanyị e weere ka chi na-ekpe ikpe ziri ezi.

Ọ bụ ebe a na-eri ihe, na-ezukwa ike.

Gụọ A3.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya